18 “Ihe ga-afọdụ n’ogologo ya ga-aha nnọọ ka onyinye ahụ dị nsọ,+ puku kubit iri n’ebe ọwụwa anyanwụ, puku kubit iri n’ebe ọdịda anyanwụ. Ọ ga-ahakwa kpọmkwem ka onyinye ahụ dị nsọ. Mkpụrụ ala ahụ mepụtara ga-abụ ihe ndị na-ejere obodo ozi ga na-eri.+