Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 2/1 p. 30-31
  • Shekem—Obodo Dị na Ndagwurugwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Shekem—Obodo Dị na Ndagwurugwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Geraịzim—‘N’elu Ugwu A Ka Anyị Fere Ofufe’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nkà Mmụta Ọdịdị Ụwa nke Bible Ò Ziri Ezi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ihe Jọshụa Chetara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 2/1 p. 30-31

Shekem—Obodo Dị na Ndagwurugwu

N’IME etiti ala ahụ Chineke họtaara ndị ya, n’agbata Ugwu Ịbal na Ugwu Geraịzim, ka obodo Shekem dị. Ọ bụ n’ebe a—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ anọ gara aga—ka Jehova kwere Abraham nkwa, sị: “Mkpụrụ gị ka M ga-ewere ala nke a nye.”—Jenesis 12:6, 7.

N’ikwekọ ná nkwa a, nwa nwa Abraham bụ́ Jekọb mara ụlọikwuu na Shekem ma wuo ebe ịchụàjà nke ọ kpọrọ “Chineke bụ Chineke nke Israel.” Eleghị anya Jekọb gwuru olulu mmiri n’ógbè a iji nye ezinụlọ ya na ìgwè anụ ụlọ ya mmiri, bụ́ olulu mmiri a ga-emesịa mata dị ka “isi iyi Jekọb.”—Jenesis 33:18-20, nkọwa ala ala peji NW; Jọn 4:5, 6, 12.

Otú ọ dị, ọ bụghị ndị òtù nile nke ezinụlọ Jekọb gosiri ịnụ ọkụ n’obi maka ezi ofufe. Daịna, nwa ya nwanyị, chọgara ndị enyi n’etiti ụmụ agbọghọ ndị Kenean sitere Shekem. Daịna, onye ka na-eto eto mgbe ahụ, hapụrụ nchebe nke ụlọikwuu ezinụlọ ya ma malite ime nleta n’obodo dị nso, na-eme ndị enyi n’ebe ahụ.

Olee otú ụmụ okorobịa obodo ahụ ga-esi ele nwa agbọghọ a na-amaghị nwoke nke na-eme nleta mgbe mgbe n’obodo ha anya—n’ụzọ doro anya nanị ya? Nwa nwoke onye isi ala ahụ “wee hụ ya; o kuru ya, dinanyere ya, wedaa ya n’ala.” N’ihi gịnị ka Daịna ji kotere onwe ya nsogbu site n’iso ndị Kenean na-eme omume rụrụ arụ na-akpakọrịta? Ọ̀ bụ n’ihi na o chere na ya nwere mkpa mkpakọrịta nke ụmụ agbọghọ ndị ọgbọ ya? Ọ̀ dị isi ike ma na-achọ nnwere onwe dị ka ụfọdụ n’ime ụmụnne ya ndị nwoke? Gụọ ihe ndekọ Jenesis, ma gbalịa ịghọta obi erughị ala na mmechuihu Jekọb na Lia na-aghaghị inweworị n’ihi ọdachi ndị si ná nleta ndị nwa ha nwanyị mere na Shekem pụta.—Jenesis 34:1-31; 49:5-7; leekwa Ụlọ Nche, December 15, 1985, peji nke 31.

N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 300 n’ikpeazụ, ihe ndị na-esi n’ileghara ụkpụrụ nduzi ọchịchị Chineke anya pụta gbara n’anwụ ọzọ. Na Shekem, Joshua haziri otu n’ime nzukọ kasị kwesị ncheta n’akụkọ ihe mere eme Israel. Were anya nke uche lee ọnọdụ dị na ndagwurugwu ahụ. Ihe karịrị otu nde mmadụ—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka—so n’ebo isii nke Israel na-eguzo ọtọ n’ihu Ugwu Geraịzim. N’ofe ọzọ nke ndagwurugwu ahụ ihe dị ka otu ọnụ ọgụgụ ahụ site n’ebo isii ndị ọzọ na-eguzo n’ihu Ugwu Ịbal.a N’ala ala ebe ahụkwa, n’akụkụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ na n’agbata ìgwè abụọ ahụ nke ndị Israel, ka ndị nchụàjà na Joshua na-eguzo. Lee ọdịdị ọ bụ!—Joshua 8:30-33.

N’ịbụ ndị dị elu gabiga isi oké ìgwè mmadụ a, ugwu abụọ ahụ na-egosi ọdịiche doro anya nke ịma mma na ịtọgbọrọ chakoo. Mkpọda ka elu nke Geraịzim na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma na-eme nri, ebe ndị nke Ịbal chanwụchara achanwụ ma tọgbọrọ nkịtị. Ị̀ pụrụ ịnụpere olu okwu dị ala nke oké mkpali ka ndị Israel na-echere oge mgbe Joshua ga-ekwu okwu? Ụda ọ bụla na-adaghachi ụda n’ebe a a na-ekiri ihe nke dị site n’okike.

N’ime hour anọ ruo isii nke Joshua ji gụọ ‘akwụkwọ iwu nke Mosis,’ ndị ahụ na-ekerekwa òkè. (Joshua 8:34, 35) O doro anya na ndị Israel nọ n’ihu Geraịzim na-asị Amen! ná ngwụsị ngọzi nke ọ bụla, ebe Amen! nke ndị nọ n’ihu Ịbal na-emesi ọbụbụ ọnụ nke ọ bụla ike. Eleghị anya ọdịdị ịtọgbọrọ chakoo nke Ugwu Ịbal na-echetara ndị ahụ banyere ajọ ihe na-esi ná nnupụisi apụta.

“Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye na-elelị nna ya ma ọ bụ nne ya,” ka Joshua na-adọ aka ná ntị. N’otu olu, ihe karịrị olu otu nde mmadụ na-aza, sị: “Amen.” Joshua na-echere ka nzaghachi a na-ada oké ụda dajụọ tupu ọ gaa n’ihu, sị: “Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye na-ewezụga ókèala agbata obi ya.” Ọzọkwa ebo isii ahụ, gụnyere ọtụtụ ndị ọbịa bi n’ebe ahụ, na-eti ná mkpu, sị: “Amen.” (Deuterọnọmi 27:16, 17) A sị na ị nọ n’ebe ahụ, ị̀ gaara echefuwo nzukọ ahụ e nwere n’agbata ugwu ndị ahụ mgbe ọ bụla? Ọ̀ bụ na a gaghị edekwasịworị ịdị mkpa nke nrubeisi n’uche gị n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ehichapụ?

N’oge na-adịghị anya tupu ọ nwụọ n’ihe dị ka afọ 20 ka e mesịrị, Joshua kpọkọtara mba ahụ ọzọ na Shekem ka ha wee wusie mkpebi ha ike. O debere nhọrọ nke onye ọ bụla na-aghaghị ime n’ihu ha. “Họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe,” ka o kwuru. “Ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.” (Joshua 24:1, 15) Ihe àmà na-egosi na mgbakọ ndị a na-akpali okwukwe e nwere na Shekem nwere mmetụta dị omimi. N’ihi na ọtụtụ afọ mgbe ọnwụ Joshua gasịrị, ndị Israel ṅomiri ihe nlereanya ikwesị ntụkwasị obi ya.—Joshua 24:31.

Ihe dị ka narị afọ 15 ka e mesịrị mgbe Jisọs na-ezuru ike n’okpuru onyoonyo nke Ugwu Geraịzim, mkparịta ụka na-ekpo obi ọkụ weere ọnọdụ. N’ịbụ onye ike gwụrụ n’ihi njem dị ogologo, Jisọs na-anọdụ ala n’akụkụ isi iyi Jekọb mgbe otu nwanyị Sameria bu ite mmiri rutere. O juru nwanyị ahụ anya nke ukwuu mgbe Jisọs rịọrọ ka o nye ya mmiri, ebe ọ bụ na ndị Juu adịghị ekwunyere ndị Sameria okwu, ma ya fọdụ isite n’ite ha ṅụọ mmiri. (Jọn 4:5-9) Okwu Jisọs ndị sochiri juru ya anya ọbụna karị.

“Onye ọ bụla nke na-aṅụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ: ma onye ọ bụla nke ga-aṅụ mmiri ahụ nke Mụ onwe m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi; kama mmiri ahụ nke Mụ onwe m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi mmiri na-asụpụta hie nne ruo mgbe ebighị ebi.” (Jọn 4:13, 14) Cheedị echiche banyere mmasị nwanyị ahụ nwere ná nkwa ahụ, n’ihi na isere mmiri n’isi iyi mmiri a dị omimi bụ ọrụ siri ike. Jisọs gara n’ihu kọwaa na n’agbanyeghị ịdị mkpa ha n’akụkọ ihe mere eme, ma Jerusalem ma Ugwu Geraịzim abụghị ebe ihe metụtara okpukpe ndị dị mkpa maka ịbịarute Chineke nso. Ọnọdụ obi na omume, ọ bụghị ebe, bụ ihe dị mkpa. “Ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmuọ na eziokwu,” ka o kwuru. “N’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọ ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya.” (Jọn 4:23) Lee ka okwu ndị ahụ na-aghaghị isiworị bụrụ ihe na-akasi obi! Ọzọkwa, ndagwurugwu a ghọrọ ebe a nọ gbaa ndị mmadụ ume ijere Jehova ozi.

Taa obodo ukwu Nablus dị n’akụkụ mkpọmkpọ ebe nke Shekem oge ochie. Ugwu Geraịzim na Ugwu Ịbal ka guzocha na ndagwurugwu ahụ, na-eguzo ọtọ dị ka ndị àmà gbachiri nkịtị nke ihe omume nke mgbe gara aga. A ka nwere ike ịga hụ isi iyi mmiri Jekọb, n’ụkwụ ugwu ndị a. Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe omume ndị weere ọnọdụ n’ebe ahụ, a na-echetara anyị ịdị mkpa nke ịkwado ezi ofufe, dị ka Joshua na Jisọs kụziiri anyị ime.—Tụlee Aịsaịa 2:2, 3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ebo isii nọ n’ihu Ugwu Geraịzim bụ Simeon, Livaị, Juda, Isaka, Josef, na Benjamin. Ebo isii nọ n’ihu Ugwu Ịbal bụ Reuben, Gad, Asha, Zebulun, Dan na Naftali.—Deuterọnọmi 27:12, 13.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya