Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 4/1 p. 15
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Onyeisi Ndị Agha Rom Egosi na Ya Nwere Okwukwe Dị Ukwuu
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ọchịagha Ndị Rom ahụ Nwere Obi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Olee Ụdị Mmadụ M Bụ n’Anya Jehova?
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • ‘Na-anwanụ Onwe Unu, Ma Ùnu Dị n’Okwukwe Anyị’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 4/1 p. 15

Ị̀ MAARA?

Gịnị bụ ọrụ ndị isi ndị agha Rom n’oge ochie?

Onye a a kpụrụ ebe a bụ otu n’ime ndị isi ndị agha Rom

Onye a a kpụrụ ebe a bụ onyeisi ndị agha aha ya bụ Marcus Favonius Facilis

N’Agba Ọhụrụ na Baịbụl, e nwere ebe ụfọdụ e kwuru okwu ndị isi ndị agha Rom. Onye agha ahụ guzo nso n’ebe a kpọgidere Jizọs n’osisi bụ onyeisi ndị agha. Kọnịliọs bụ́ onye Jentaịl mbụ ghọrọ Onye Kraịst bụbu onyeisi ndị agha. Onye agha a gwara ka ọ hụ na a pịara Pọl onyeozi ụtarị, nakwa Juliọs, onye a gwara ka o duru Pọl gaa Rom, bụcha ndị isi ndị agha.—Mak 15:39; Ọrụ Ndịozi 10:1; 22:25; 27:1.

Ndị a a na-akpọ ndị isi ndị agha Rom na-edu ndị agha na-eji ụkwụ aga. Ha na-edukarị ndị agha iri ise ruo otu narị aga agha. Ihe ndị so n’ọrụ ha bụ ịzụ ndị agha, ile ma uwe ha na ngwá agha ha ọ̀ dịkwa otú kwesịrị ekwesị. Ihe ọzọ ha na-emekwa bụ idu ha aga agha.

Ịbụ onyeisi ndị agha bụ ọkwá kachanụ onye agha nkịtị nwere ike iru. Ndị na-eru n’ọkwá a bụ ndị agha ma nke a na-akọ n’ịlụ agha nakwa ndị ga-eduli ndị agha nke ọma. Ọ bụ ha na-ahụ na a haziri ndị agha ndị Rom nke ọma otú ha ga-enwe ike imeri n’agha. Otu akwụkwọ kwuru na ‘ndị isi ndị agha na-abụkarị ndị aka ochie na ndị ma nke a na-akọ n’ịlụ agha.’

Olee ihe dị iche n’enyo ndị e nwere n’oge ochie na enyo ndị e nwere taa?

Ihe a bụ enyo ndị Ijipt oge ochie

Ihe a bụ enyo ndị Ijipt oge ochie

Enyo ndị e nwere n’oge ochie adịchaghị ka enyo ndị e nwere taa. Ihe a na-ejikarị arụ enyo ndị nke oge ochie bụ ọla nchara. Ma, a na-ejikwa ọlaọcha, ọlaedo, ọla kọpa, ma ọ bụ ọlaọcha na ọlaedo a gwakọtara ọnụ arụ ụfọdụ. A na-etekwa ọla ndị ahụ ihe ndị ga-eme ka ha na-egbuke egbuke. Ebe mbụ e kwutere okwu enyo na Baịbụl bụ mgbe a na-ekwu gbasara ụlọ nsọ mbụ ụmụ Izrel rụrụ maka ife Chineke. Ụmụ nwaanyị ji enyo ha nye onyinye ka e jiri rụọ efere ọla kọpa na ihe ndọkwasị ya. (Ọpụpụ 38:8) Ọ ga-abụ na a gbazere enyo ndị ahụ, jirizie ha kpụọ efere ahụ na ihe ndọkwasị ya.

N’ọtụtụ ebe ndị e gwupụtara enyo ndị oge ochie n’ala Izrel na n’ebe ndị dị nso n’Izrel, a hụkwara ihe dị iche iche ụmụ nwaanyị ji achọ mma. Enyo ndị ahụ e gwupụtara na-adịkarị okirikiri. A na-eji osisi, ọla, ma ọ bụ ọdụ́ enyí arụ aka ha. A na-achọ aka ha mma, kpụọkwa ha ka ha yie nwaanyị. A naghịkwa achọ azụ ọtụtụ enyo ndị ahụ mma.

Enyo ndị oge ochie anaghị egosicha ihe nke ọma ka enyo ndị nke oge a. Nke a nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe Pọl onyeozi na-ekwu gbasara ya mgbe ọ sịrị: “Ka ọ dị ugbu a, anyị ji enyo ígwè na-ahụ ihe inyoghi inyoghị.”—1 Ndị Kọrịnt 13:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya