Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2023 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
JULAỊ 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZRA 4-6
“Unu Akwụsịla Ọrụ Ahụ A Na-arụ”
Ị̀ Na-ahụ Ihe Zekaraya Hụrụ?
13 N’agbanyeghị na a machiri ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ, Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jeshụa (Joshụa) na Gọvanọ Zerubabel, bụ́ ndị Jehova ji na-eduzi ndị ya, “malitere ịrụghachi ụlọ Chineke.” (Ezra 5:1, 2) Ụfọdụ ndị Juu nwere ike iche na ihe a ha na-eme adabaghị adaba. O nweghị otú ha ga-esi na-arụghachi ụlọ nsọ ahụ ndị iro ha aghara ịma. Ha ga-agbalịkwa isi ụzọ ọ bụla kwụsị ha ịrụ ya. Ọ dị mkpa ka e mesie Joshụa na Zerubabel, bụ́ ndị Jehova ji na-edu ndị ya, obi ike na Jehova kwụ ha n’azụ. E mesikwara ha obi ike. Olee otú e si mee ya?
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra
N’afọ sochirinụ, ndị Izrel tọrọ ntọala ụlọ Jehova. Ndị iro nọgidere na-emegide ọrụ mwughachi ahụ ma mesịa nwee ihe ịga nke ọma n’ime ka eze nye iwu ka a kwụsị ọrụ ahụ. Ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraịa gbara ndị ahụ ume bụ́ nke mere ka ha maliteghachi iwu ụlọ nsọ ahụ n’agbanyeghị iwu ahụ e nyere ka a kwụsị ọrụ ahụ. Ụjọ imegide iwu a na-apụghị ịgbanwe agbanwe nke ndị Peshia, bụ́ nke Saịrọs nyere na mbụ, mere ka ndị iro ha kwụsị inye ha nsogbu. Nnyocha nke eze nyere iwu ka e mee mere ka a hụ iwu Saịrọs nyere banyere “ụlọ Chineke n’ime Jeruselem.” (Ezra 6:3) Ọrụ ahụ gara nnọọ n’ihu n’enweghị ihe mgbochi ruo mgbe a rụchara ya.
Ị̀ Na-ahụ Ihe Zekaraya Hụrụ?
7 E nwere ihe gbanwere nke mere ka ihe dịtụrụ ndị ahụ na-arụ ụlọ nsọ ahụ mfe. Olee ihe ọ bụ? Eze ọhụrụ aha ya bụ Darayọs nke Mbụ malitere ịchị Peshia. N’afọ nke abụọ ọ malitere ịchị, ya bụ n’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst, ọ chọpụtara na iwu akwadoghị mmachi ahụ a machiri ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Darayọs nyeziri iwu ka a maliteghachi ịrụ ụlọ nsọ ahụ ma rụchaa ya. (Ezra 6:1-3) Ihe a o kwuru tụrụ mmadụ niile n’anya. Ma o nwekwara ihe ọzọ eze ahụ mere. O nyere iwu ka ndị niile bi gburugburu ha ghara inye ha nsogbu n’ọrụ a ha na-arụ nakwa ka ha nye ha ego na ihe ndị dị ha mkpa iji rụchaa ụlọ nsọ ahụ. (Ezra 6:7-12) Ihe a mere ka ndị Juu rụchaa ụlọ nsọ ahụ n’afọ 515 Tupu Oge Ndị Kraịst, ya bụ, mgbe afọ anọ na ọnwa ole na ole gachara.—Ezra 6:15.
Ị̀ Na-ahụ Ihe Zekaraya Hụrụ?
16 Jehova na-esikwa n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” enye anyị ntụziaka. (Mat. 24:45) Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike inye anyị ntụziaka anyị na-agaghị aghọtacha. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịgwa anyị ihe anyị ga-eme iji kwadebe maka ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ma anyị nwere ike iche na ụdị ọdachi ahụ emekataghị mee n’ebe anyị bi. Anyị nwekwara ike iche na otú ha si akpachapụ anya ma e nwee ọrịa na-efe efe na-agafe ókè. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma anyị chee na ntụziaka ha nyere adabaghị adaba? Anyị nwere ike iche banyere uru ndị Izrel ritere n’ihi na ha sooro ntụziaka Joshụa na Zerubabel nyere ha. Anyị nwekwara ike iche banyere akụkọ ndị ọzọ dị na Baịbụl anyị gụrụla. E nwere oge ndị a gwara ndị Chineke ka ha mee ihe ndị ha chere na ọ dabaghị adaba, ma ime ihe ndị ahụ zọrọ ha ndụ.—Ikpe 7:7; 8:10.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Bible Obi?
E mere mkpụrụ ego ahụ na Tasọs, obodo dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke ebe bụ Turkey ugbu a. E mere mkpụrụ ego ahụ n’oge ọchịchị nke onye na-achị ala Peasia bụ́ Mazaeus na narị afọ nke anọ T.O.A. O mere ka a mara ya dị ka onye na-achị ala nke ógbè “Ofé Osimiri,” ya bụ, Osimiri Yufretis.
Ma n’ihi gịnị ka ahịrị okwu ahụ ji na-adọrọ mmasị? N’ihi na ị ga-ahụ ụdị aha ahụ n’ime Bible gị. Ezra 5:6–6:13 setịpụrụ nzirịta ozi n’etiti eze Peasia bụ́ Daraiọs na onye na-achị ala a kporọ Tatenaị. Ihe bụ isiokwu bụ ndị Juu iwughachi ụlọ nsọ ha na Jerusalem. Ezra bụ odeakụkwọ nke nwere nkà n’Iwu Chineke, ị ga-atụkwa anya ka o dee kpọmkwem ihe a chọrọ, na-ezi ezi n’ihe o dere. Ị ga-ahụ n’Ezra 5:6 na 6:13 na ọ kpọrọ Tatenaị “onye na-achị ala n’ofé Osimiri.”
Ezra dere nke ahụ n’ihe dị ka 460 T.O.A., ihe dị ka 100 afọ tupu a kpụọ mkpụrụ ego a. Oo, e nwere ndị ga-eche na aha a kpọrọ onye ọchịchị oge ochie bụ ihe ọmụma dị nta. Ma ọ bụrụ na ị pụrụ ịdabere na ndị dere Bible ọbụna n’ihe ndị dị nta otú ahụ, nke ahụ ọ́ gaghị eme ka ntụkwasị obi i nwere n’ebe ihe ndị ọzọ ha dere dị bawanye ụba?
JULAỊ 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZRA 7-8
“Àgwà Ọma Ezra Mere Ka E Too Jehova”
Ọmụmụ Ihe—Ihe Na-akwụghachi Ụgwọ Ma Na-atọ Ụtọ
8 Ee, ịhụnanya anyị nwere maka Okwu Jehova kwesịrị isi anyị n’obi, bụ́ ebe e si enwe mmetụta uche. O kwesịrị ịdị na-atọ anyị ụtọ ịtụgharị uche n’ihe ụfọdụ ndị anyị ka gụchara nnọọ. Anyị kwesịrị ichebara ihe ime mmụọ ndị miri emi echiche, tinye uche anyị na ha, ma na-atụgharị uche na ha. Nke a na-achọ iche echiche n’ụzọ dị jụụ na ekpere. Dị ka Ezra, ọ dị anyị mkpa idozi obi anyị maka ịgụ na ịmụ Okwu Chineke. E dere banyere ya, sị: “Ezra doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya, na izi ụkpụrụ Ya na ikpe Ya n’Israel.” (Ezra 7:10) Rịba ama nzube atọ Ezra ji maka ha dozie obi ya: ịmụ ihe, itinye ihe ọ mụtara n’ọrụ, na izi ihe. Anyị kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya ya.
si 75 ¶5
Akwụkwọ Baịbụl nke 13—1 Ihe E Mere
5 Ọ bụ Ezra kacha ruo eruo ide akụkọ a mere eme, nke bụ́kwa eziokwu, n’ihi na “Ezra kwadebere obi ya ịmụ Iwu Jehova na ime ihe dị na ya, nakwa ịkụzi ntụziaka ndị dị na ya na ịkụzi ikpe ziri ezi n’Izrel.” (Ezra 7:10) Jehova ji mmụọ nsọ ya nyere ya aka. Eze Peshia na-achị ụwa n’oge ahụ chọpụtara na Ezra nwere amamihe Chineke. N’ihi ya, o nyere ya ikike ịna-ekwu ihe a ga-eme n’ógbè Juda niile. (Ezra 7:12-26) Ebe ọ bụ na Ezra nwere ikike si n’ebe Chineke nọ, nweekwa ikike eze Peshia nyere ya, ọ ga-enwetali ihe ndị e dere ede kacha mma e nwere n’oge ahụ, ndị ọ ga-eji dee akụkọ nke ya.
it-1 1158 ¶4
Ịdị Umeala n’Obi; Mmadụ Iweda Onwe Ya Ala
Ọ Na-eme Ka Chineke Duzie Mmadụ. Ọ bụrụ na mmadụ eweda onwe ya ala n’ihu Chineke, Chineke ga-eduzi onye ahụ. Ezra nwere nnukwute ọrụ ọ ga-arụ. Ọ ga-edu ndị nchụàjà, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ, ụmụ nwaanyị na ụmụaka, nakwa ụmụ nwoke karịrị otu puku na narị ise (1,500) si na Babịlọn laghachi Jeruselem. Ha bukwa ọlaọcha na ọlaedo buru ezigbo ibu ha ga-eji chọọ ụlọ nsọ dị na Jeruselem mma. E kwesịrị ichebe ha ka ihe ọ bụla ghara ime ha n’ụzọ. Ma, Ezra achọghị ịrịọ eze Peshia ka ọ kpọnye ya ndị agha ga-edu ha ka ọ ghara ịdị ka ọ̀ bụ mmadụ ka ọ tụkwasịrị obi. Ihe ọzọ bụ na ọ gwabuola eze Peshia, sị: “Chineke anyị na-anọnyere ndị niile na-achọ ya.” Ezra gwaziri ndị Izrel ka ha buo ọnụ ma wetuo onwe ha ala n’ihu Jehova. Ha rịọrọ Chineke ka o chebe ha. O chebekwara ha, napụta ha n’aka ndị iro ha chechiri ha n’ụzọ. Ọkọ ọ bụla akọghị ha na njem ahụ tara akpụ. (Ezra 8:1-14, 21-32) Mgbe Daniel onye amụma nọ na Babịlọn bụ́ ebe a dọọrọ ya n’agha laa, Chineke meere Daniel amara nke ukwuu. O zitere mmụọ ozi ya ka o gosi Daniel ọhụụ n’ihi na Daniel wedara onwe ya ala n’ihu Chineke mgbe ọ na-achọ ka e duzie ya ma mee ka ọ ghọta ihe ndị ga-eme.—Dan. 10:12.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra
7:28–8:20—Gịnị mere ọtụtụ ndị Juu nọ na Babilọn ji laa azụ iso Ezra laghachi Jeruselem? N’agbanyeghị na ọ karịala afọ 60 ìgwè ndị Juu mbụ laghachiri n’ala nna ha, ọ ka bụ mmadụ ole na ole bi na Jeruselem. Ịlaghachi Jeruselem pụtara ịmaliteghachi ndụ n’isi n’ọnọdụ ndị siri ike ma dị ize ndụ. Jeruselem nke oge ahụ abụghị ebe ndị Juu, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ihe na-agara ha nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe na Babilọn, ga-anọ kpata nnukwu ego. Ihe a na-agaghị echefu bụ njem ahụ dị ize ndụ ha ga-eme iji laghachi. Ndị ahụ na-alaghachinụ aghaghị inwe okwukwe siri ike na Jehova, ịnụ ọkụ n’obi maka ezi ofufe, na obi ike iji mee njem ahụ. Ọbụna Ezra mere onwe ya ka ọ dị ike n’ihi na aka Jehova dị n’ahụ́ ya. N’ihi agbamume Ezra, otu puku na narị ezinụlọ ise—eleghị anya ndị ọnụ ọgụgụ ha dị puku mmadụ isii—sooro ya lawa. Ka e mesịrị, Ezra mekwara ihe ọzọ, ndị Livaị 38 na narị ndị Netinim abụọ na iri abụọ sonyekwaara ya.
JULAỊ 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZRA 9-10
“Ahụhụ Nnupụisi Na-akpata”
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra
9:1, 2—Olee otú ndị Izrel na ndị ala ahụ ịlụrịta di na nwunye dịruru ná njọ? Mba ahụ e weghachiri eweghachi ga-echebe ofufe Jehova ruo mgbe Mezaịa ga-abịa. Iso ndị ọzọ bi ebe ahụ alụrịta di na nwunye bụ nnọọ ihe ize ndụ nye ezi ofufe. Ọ bụrụ na ụfọdụ esoro ndị na-ekpere arụsị nwee nkekọ nke alụmdi na nwunye, mba ahụ n’ozuzu pụrụ imesị bụrụzie akụkụ nke mba ndị ahụ na-ekpere arụsị. Ofufe dị ọcha gaara apụ n’anya kpamkpam n’ụwa. Mgbe ahụ, oleezi ndị Mezaịa ahụ ga-abịakwute? Ka a sịkwa ihe mere akpata oyi jiri wụọ Ezra n’ahụ́ mgbe ọ hụrụ ihe merenụ!
Gịnị Ka Jehova Chọrọ Anyị n’Aka?
Iji obi anyị dum na-erubere ya isi ga-ewetara anyị ngọzi. Mozis dere, sị: “Debe iwu . . . ndị m na-enye gị taa, maka ọdịmma gị.” (Amaokwu 13) N’ezie, iwu niile Jehova nyere, ya bụ, ihe niile ọ chọrọ anyị n’aka, bụ maka ọdịmma anyị. Otú ahụ ka o kwesịrị ịdị. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) N’ihi ya, naanị iwu ndị ọ na-enye anyị bụ iwu ndị ga-eme ka ihe dịrị anyị ná mma ruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 48:17) Ime ihe niile Jehova chọrọ n’aka anyị ga-eme ka anyị zere ọtụtụ nsogbu ugbu a, meekwa ka anyị nweta ngọzi ebighị ebi n’ọdịnihu mgbe Alaeze ya ga-achịwa.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra
10:3, 44—Gịnị mere e ji chụlaa ndị inyom ahụ na ụmụ ha? A sị na a hapụrụ ụmụaka ndị ahụ, ọ ga-adị mfe karị ndị inyom ahụ a chụlara achụla ịlọghachi n’ihi ha. Ọzọkwa, ụmụaka na-achọkarị nlekọta nke nne ha.
JULAỊ 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NEHEMAYA 1-2
“Ozugbo Ahụ, M Kpere Ekpere”
Debe Jehova n’Ihu Gị Mgbe Niile
5 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị kpee ekpere ngwa ngwa maka enyemaka Chineke. N’otu oge, Eze Atazaksis nke Peshia chọpụtara na ihu Nehemaya, bụ́ onye na-eburu ya ihe ọṅụṅụ gbarụrụ agbarụ. Eze ahụ jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị na-achọ ka e meere gị?” “Ozugbo ahụ, [Nehemaya] kpekuru Chineke nke eluigwe ekpere.” Nehemaya ekpeghị ekpere ahụ ogologo. Ma Chineke zara ya, n’ihi na eze ahụ kwadoro ka Nehemaya gaa wughachi mgbidi Jeruselem. (Gụọ Nehemaya 2:1-8.) N’eziokwu, ekpere e kpere n’ime obi, ọ bụrụgodị na e kpeteghị ya aka, nwere ike ịrụpụta ihe.
Ikwu Okwu n’Agụghị Ya Agụ
Mgbe a chọrọ ka i nye nkọwa maka ihe ndị i kwenyere n’ebughị ụzọ mee nkwadebe, gịnị pụrụ inyere gị aka ime ka okwu gị dị irè? Ṅomie Nehemaịa, bụ́ onye kpere ekpere n’ime obi ya tupu ọ zaa ajụjụ Eze Ataksakses jụrụ ya. (Neh. 2:4) Chepụtazie n’egbughị oge, otú ị ga-esi hazie okwu gị. A pụrụ idepụta nzọụkwụ ndị bụ́ isi n’usoro a: (1) Họrọ otu isi ihe ma ọ bụ abụọ i kwesịrị ịgụnye ná nkọwa gị (ị pụrụ ikpebi iji ihe ndị dị ‘n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu’ mee ihe). (2) Kpebie akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị ga-eji kwadoo isi ihe ndị ahụ. (3) Mee atụmatụ otú ị ga-esi jiri akọ malite nkọwa gị ka onye ahụ jụrụ ajụjụ wee dị njikere ịṅa ntị. Malitezie ikwu okwu.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
“Mụrụnụ Anya Ka Unu Wee Na-ekpe Ekpere”
12 Onye ọzọ anyị ga-atụle ihe o mere bụ Nehemaya. N’ihe dị ka narị afọ anọ na iri ise Tupu Oge Ndị Kraịst, ọ bụ ya na-eburu eze ndị Peshia bụ́ Atazaksis ihe ọṅụṅụ. Nehemaya ji obi ya niile kpegara Jehova ekpere. Baịbụl kwuru na ruo ọtụtụ ụbọchị, ọ ‘nọ na-ebu ọnụ ma na-ekpe ekpere n’ihu Chineke’ n’ihi nsogbu ndị Juu bi na Jeruselem nọ na ya. (Nehe. 1:4) Mgbe Atazaksis jụrụ Nehemaya ihe mere ihu ya ji gbarụọ, Nehemaya gwara ya otú Jeruselem dị. Eze ajụọ ya, sị: “Gịnị ka ị na-achọ ka e meere gị?” ‘Ozugbo ahụ, Nehemaya kpekuru Chineke nke eluigwe ekpere.’ (Nehe. 2:2-4) Gịnịzi mere? Jehova zara ekpere ya otú baara ndị ya uru. (Nehe. 2:5, 6) Ọ ga-abụrịrị na ekpere ahụ Jehova zara ya mere ka okwukwe ya sie ike.
13 Ọ bụrụ na anyị ana-ekpe ekpere mgbe niile otú ahụ Nehemaya mere, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Obi tara Setan mmiri. Ọ na-alụsokarị anyị ọgụ mgbe anyị na-adịghị ike. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-arịa ọrịa ma ọ bụ mgbe obi na-adịghị anyị mma, anyị nwere ike ichewe na oge anyị ji ekwusa ozi ọma kwa ọnwa abaghị uru n’anya Chineke. Ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịna-echegbu onwe ha n’ihi ihe ọjọọ ndị ha mere n’oge gara aga. Setan chọrọ ime ka anyị chewe na anyị abaghị uru. Ihe mere o ji alụso anyị ọgụ na-abụkarị ka obi na-ajọ anyị njọ, nke ga-eme ka okwukwe anyị ghara isi ike. Ma, ọ bụrụ na anyị ‘amụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere,’ okwukwe anyị ga-esi ike. Baịbụl kwuru na okwukwe anyị yiri ọta ukwu ga-enyere anyị aka “imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.”—Efe. 6:16.
JULAỊ 31–ỌGỌST 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NEHEMAYA 3-4
“Ì Chere na Ị Karịala Ịrụ Ọrụ E Ji Ike Ọkpụkpụ Aka Arụ?”
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehemaịa
3:5, 27. Anyị ekwesịghị iwere ọrụ ọkpụkpụ aka ndị a na-arụ iji kwalite ezi ofufe dị ka ihe anyị toferela ịrụ, dị ka “ndị dị ebube” n’etiti ndị Tekoa mere. Kama nke ahụ, anyị pụrụ iṅomi ndị nkịtị n’etiti ndị Tekoa bụ́ ndị ji ọchịchọ obi ha dum rụọ ọrụ ahụ.
Gịnị Ka Jehova Ga-eme Ka Ị Bụrụ?
11 Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, ụmụ Shalọm ndị nwaanyị so ná ndị Jehova ji rụzie mgbidi Jeruselem. (Nehe. 2:20; 3:12) N’agbanyeghị na nna ha so ná ndị isi, ha ji obi ha niile soro rụọ ọrụ ahụ siri ike, nke nwekwara ike imerụ mmadụ ahụ́. (Nehe. 4:15-18) Ha emeghị ka ndị ukwu bụ́ ndị Tekoa, ndị ‘na-ewedaghị onwe ha ala ịrụ ọrụ’ ahụ. (Nehe. 3:5) Chegodị otú ọṅụ si ju ụmụ Shalọm ndị ahụ obi mgbe ha hụrụ na e ji naanị ụbọchị iri ise na abụọ rụchaa ọrụ ahụ. (Nehe. 6:15) N’oge anyị a, ụmụnna nwaanyị na-eji obi ụtọ enye aka n’ịrụ ọrụ pụrụ iche ná nzukọ Jehova, ya bụ, iso na-arụ ma na-elekọta ebe ndị a na-anọ efe Jehova. Nkà ha, otú ha si anụ ọkụ n’obi, na otú ha si erubere Jehova isi na-eme ka ọrụ ahụ na-aga nke ọma.
Ịzụlite Echiche Yiri nke Kraịst Banyere Ịdị Ukwuu
16 Ndị Kraịst nile, ndị na-eto eto na ndị agadi, kwesịrị ịchọ ịzụlite echiche Kraịst banyere ịdị ukwuu. N’ọgbakọ, e nwere ọrụ dịgasị iche iche a na-aghaghị ịrụ. Ya adịla mgbe ị ga-ewe iwe ma a sị gị mee ihe ndị pụrụ iyi ka hà dị ala. (1 Samuel 25:41; 2 Ndị Eze 3:11) Ndị nne na nna, ùnu na-agba ụmụ unu na ndị dị afọ iri na ụma ume iji obi ụtọ na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere ha rụọ, ma ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ebe a na-eme mgbakọ? Hà na-ahụ ka unu na-arụ ọrụ ndị dị ala? Otu nwanna nwoke, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, na-echeta nnọọ nke ọma ihe nlereanya nke ndị mụrụ ya. O kwuru, sị: “Otú ha si arụ ọrụ nke idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ụlọ mgbakọ ọcha gosiri m na ha weere ya dị ka ihe dị mkpa. Ha na-ewepụtakarị onwe ha ịrụ ọrụ ndị bụ́ maka ọdịmma nke ọgbakọ ma ọ bụ òtù ụmụnna, n’agbanyeghị otú ọrụ ndị ahụ pụrụ iyiru ihe dị ala. Àgwà a enyeworo m aka iji ọchịchọ obi anakwere ọrụ ọ bụla e nyere m na Betel ebe a.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehemaịa
4:17, 18—Olee otú mmadụ ga-esi jiri nanị otu aka na-ewughachi mgbidi? Nke a agaghị abụrụ ndị na-ebu ibu arọ nsogbu. Ozugbo ha tụkwasịrị ibu ha n’isi ma ọ bụ n’ubu ha, ọ pụrụ ịdịrị ha mfe iji otu aka jide ya ma jiri ‘aka ha nke ọzọ jide ihe agha ha.’ Ndị kwesịrị iji aka abụọ arụ ọrụ n’etiti ndị ọrụ ahụ, ‘kere nwoke ọ bụla mma agha ya n’úkwù ya, ha wee na-arụ mgbidi ahụ.’ Ha dị njikere ịlụ ọgụ ma ọ bụrụ na ndị iro ha abịa ịlụso ha ọgụ.
ỌGỌST 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NEHEMAYA 5-7
“Nehemaya Chọrọ Ijere Ndị Ọzọ Ozi, Ọ Bụghị Ka Ndị Ọzọ Jeere Ya Ozi”
Ndị Na-akwado Ezi Ofufe—N’oge ahụ na n’Oge A
Nehemaịa nyere ihe karịrị oge na nkà ime nhazi ya. O jikwa ihe onwunwe ya kwado ezi ofufe. O ji ego ya zụtaghachi ụmụnne ya bụ́ ndị Juu e renyere n’ịbụ ohu. O binyere ndị mmadụ ego n’anaghị ọmụrụ nwa. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o “bogburu” ndị Juu n’ibu site n’ịmanye ha ịdị na-akwụ ya ụgwọ ọnwa dị ka onye na-achị achị, bụ́ ihe ruuru ya. Kama nke ahụ, o ghewere ụlọ ya oghe maka inye ‘otu narị ndị ikom na iri ise, ha na ndị na-abịakwute ya site ná mba ndị dị ha gburugburu’ ihe oriri. Kwa ụbọchị, ọ na-egburu ndị ọbịa ya ‘otu ehi na atụrụ isii a họpụtara ahọpụta na ụmụ nnụnụ.’ Tụkwasị na nke ahụ, otu ugboro n’ime ụbọchị iri ọ bụla, ọ na-edoziri ha “mmanya vaịn nile ọ bụla n’ụba”—ọ bụ ya na-akwụ ụgwọ ha nile.—Nehemaịa 5:8, 10, 14-18.
‘Akụdakwala Aka’
16 Jehova mere ka Nehemaya na ndị Juu ibe ya nwee ike ịrụcha ọrụ ha nọ na-arụ. Ha ji ụbọchị iri ise na abụọ rụchaa mgbidi Jeruselem. (Nehe. 2:18; 6:15, 16) Ihe Nehemaya mere abụghị ịnọ na-ele anya ka ndị ọzọ na-arụ ọrụ ahụ. O so rụghachi mgbidi Jeruselem. (Nehe. 5:16) Ọtụtụ ndị okenye na-eme ka Nehemaya. Ha na-eso arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova ma ọ bụ na-arụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma na-edowe ya ọcha. Ha na-emekwa ka ụmụnna ndị na-echegbu onwe ha dị́ ike. Otú ha si eme ya bụ na ha na ndị nkwusa na-arụ n’ozi ọma, ha ana-agakwara ha nleta ọzụzụ atụrụ.—Gụọ Aịzaya 35:3, 4.
Olee Otú Jehova Ga-esi Cheta Gị?
Mgbe mgbe, Bible na-egosi na n’ebe Chineke nọ, “icheta” pụtara ime ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, mgbe idei mmiri rikpuru ụwa ruo ụbọchị 150, “Chineke chetara Noa . . . , Chineke wee mee ka ifufe gabiga n’elu ụwa, mmiri wee tawa.” (Jenesis 8:1) Ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, Samson, bụ́ onye ndị Filistia rụkpọrọ anya ma jiri chen kee agbụ, kpere ekpere, sị: “Jehova, biko, cheta m, biko, Chineke, meekwa m ka m dị ike nanị otu ugbo a.” Jehova chetara Samson site n’inye ya ike karịrị nke mmadụ ka o wee nwee ike ịbọrọ onwe ya ọbọ megide ndị iro Chineke. (Ndị Ikpe 16:28-30) N’akụkụ Nehemaịa, Jehova gọziri mgbalị ya, e weghachikwara ezi ofufe na Jerusalem.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
“Nọgide Jiri Ezi Ihe Na-emeri Ihe Ọjọọ”
15 Nke atọ, ndị iro Nehemaịa bịara jiri onye Izrel bụ́ onye sabo nke aha ya bụ Shemaịa nwaa ime ka Nehemaịa daa iwu Chineke. Shemaịa gwara Nehemaịa, sị: “Ka anyị zukọta n’ụlọ Chineke, n’etiti ụlọ ukwuu Chineke, ka anyị mechikwaa ụzọ nile nke ụlọ ukwuu Chineke: n’ihi na ha na-abịa igbu gị.” Shemaịa kwuru na a na-achọ igbu Nehemaịa ma na ọ bụrụ na Nehemaịa ezoo n’ụlọ nsọ, na ọ dịghị ihe ga-eme ya. Ma Nehemaịa abụghị onye nchụàjà. Izo n’ime ụlọ nsọ ga-abụrụ ya mmehie. Ọ̀ ga-ada iwu Chineke iji zọta ndụ ya? Nehemaịa gwara ya, sị: “Ònye dịkwa, nke dị ka mụ onwe m, nke ga-aba n’ụlọ ukwuu Chineke, wee dị ndụ? M gaghị aba n’ime.” Gịnị mere Nehemaịa amaghị n’ọnyà ahụ e siiri ya? Ọ bụ n’ihi na ọ maara na “ọ bụghị Chineke zitere” Shemaịa n’agbanyeghị na ọ bụ onye Izrel ibe ya. E kwuwerị, onye bụ ezigbo onye amụma Chineke agaghị anwa anwa gwa ya ka ọ daa Iwu Chineke. Nehemaịa ekwekwaghị ka ndị iro ya merie ya na nke a. Obere oge ka e mesịrị, o kwuru, sị: “E wee rụzuo mgbidi ahụ n’ụbọchị nke [iri abụọ na ise] nke ọnwa Elul, [n’ụbọchị iri ise na abụọ].”—Nehemaịa 6:10-15; Ọnụ Ọgụgụ 1:51; 18:7.
ỌGỌST 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NEHEMAYA 8-9
“Ọṅụ Jehova Bụ Ebe Unu A Rụsiri Ike”
Ihe Anyị Kwesịrị Ịmụta n’Ekpere E Chere Echiche Kpee
2 Ndị Juu wughachiri mgbidi Jeruselem otu ọnwa tupu ha enwee nzukọ ahụ pụrụ iche. (Nehe. 6:15) Ha ji naanị abalị iri ise na abụọ rụchaa ya. N’abalị mbụ n’ọnwa na-eso ya, ya bụ, n’ọnwa Tishri, ha zukọtara n’ọnụ ụzọ ámá ka Ezra na ndị Livaị ndị ọzọ gụpụtara ha Iwu Chineke ma kọwaa ya. (Lee ihe osise nke 1 dị na peeji nke 22) Ndị niile nọ n’ezinụlọ, ya bụ, “ndị niile pụrụ ige ntị wee ghọta ihe,” guzo ọtọ na-ege ntị “malite n’ụtụtụ ruo n’etiti ehihie.” Ihe ahụ ndị Izrel mere na-akụziri anyị ezigbo ihe taa. Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịna-amụ ihe n’ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche ihe ọzọ mgbe a na-amụ ihe. Ma, ndị Izrel ahụ gere ntị nke ọma, chebakwara ihe ha nụrụ echiche. Ha malitedịrị ibe ákwá mgbe ha ghọtara na ha anaghị eme ihe Iwu Chineke kwuru.—Nehe. 8:1-9.
Ị̀ ‘Ga-anọgide Na-eje Ije Site na Mmụọ Nsọ’?
9 Ọṅụ bụ oké obi ụtọ. Jehova bụ “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11; Abụ Ọma 104:31) Ọ na-atọ Ọkpara ahụ ụtọ ime uche Nna ya. (Abụ Ọma 40:8; Ndị Hibru 10:7-9) ‘Ọṅụ Jehova bụkwa ike anyị.’—Nehemaịa 8:10.
10 Ọṅụ sitere n’aka Chineke na-enye anyị afọ ojuju mgbe anyị mere uche ya ọbụna n’oge ihe isi ike, iru újú, ma ọ bụ n’oge mkpagbu. Lee nnọọ obi ụtọ “ihe ọmụma Chineke” na-enye anyị! (Ilu 2:1-5) Ọṅụ dị ukwuu mmekọrịta anyị na Chineke na-enye anyị dabeere n’ezi ihe ọmụma na okwukwe anyị nwere n’ebe ọ nọ, na n’ebe àjà mgbapụta nke Jizọs dị. (1 Jọn 2:1, 2) Ihe ọzọ na-enye anyị ọṅụ bụ na anyị nọ n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. (Zefanaịa 3:9; Hagaị 2:7) Olileanya Alaeze anyị nwere na nnukwu ihe ùgwù nke ikwusa ozi ọma na-enye anyị ọṅụ. (Matiu 6:9, 10; 24:14) Ihe ọzọkwa na-enye anyị ọṅụ bụ olileanya nke ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ebe anyị nwere olileanya dị otú ahụ magburu onwe ya, anyị kwesịrị ‘ịdị na-aṅụrị nanị ọṅụ.’—Deuterọnọmi 16:15.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 145 ¶2
Arameik
Ọtụtụ afọ ndị Juu si Babịlọn lọta, Ezra bụ́ onye nchụàjà gụpụtaara ndị Juu gbakọtara na Jeruselem akwụkwọ Iwu Chineke. Ndị Livaị kọwakwaara ha ihe ọ gụpụtara. Nehemaya 8:8 kwuru, sị: “Ha wee na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ ahụ, ya bụ, ihe dị n’Iwu ezi Chineke. Ha nọ na-akọwa ya nke ọma, na-emekwa ka o doo anya. Ha wee nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe a na-agụpụta.” Ọ ga-abụ na otú ha si na-akọwa ya nke ọma bụ na ha ji asụsụ Arameik na-ekwughachi ihe ahụ a na-agụpụta n’asụsụ Hibru. Ọ ga-abụkwa na ndị Hibru na-asụzi Arameik ha mụtara na Babịlọn. O nwekwara ike ịbụ na ụzọ ọzọ ndị Livaị si na-akọwa ihe ahụ a na-agụpụta bụ na ha nọ na-eme ka ndị Juu ghọtakwuo ya, ọ bụrụgodị na ha na-anụ asụsụ Hibru ahụ e ji na-agụpụta ya.
ỌGỌST 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NEHEMAYA 10-11
“Ha Hapụrụ Ihe Ụfọdụ Maka Jehova”
Jerusalem nke Kwekọrọ n’Aha Ya
13 “Ọgbụgba ndụ [ahụ] kwesịrị ntụkwasị obi” a kara akara n’ụbọchị Nehemaịa kwadebere ndị Chineke nke oge ochie maka ụbọchị nraranye nke mgbidi Jerusalem. Ma okwu ọzọ chọrọ ime ihe ngwa ngwa ka chọkwara ka e lebara ya anya. Ebe mgbidi ukwu nke nwere ọnụ ụzọ ama 12 gbara ya gburugburu ugbu a, Jerusalem chọrọ ka mmadụ bakwuo ụba na ya. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ụmụ Israel bi ebe ahụ, “obodo ahụ sara mbara n’aka abụọ, dịkwa ukwuu: ma ndị [mmadụ] dị ole na ole n’etiti ya.” (Nehemaịa 7:4) Iji dozie nsogbu a, ndị ala ahụ ‘fere nzà, ime ka otu onye n’ime mmadụ iri bata ibi na Jerusalem, bụ́ obodo nsọ.’ Njikere ha dị ịzaghachi ná ndokwa a kpaliri ndị mmadụ ịgọzi “ndị ikom ahụ nile ndị were afọ ofufo nye onwe ha ibi na Jerusalem.” (Nehemaịa 11:1, 2) Lee ezi ihe nlereanya ọ bụ nye ndị na-efe ezi ofufe taa bụ́ ndị ọnọdụ ha kwere ka ha gaa ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka enyemaka ndị Kraịst tozuru okè!
w86 6/1 22
Ezi Ofufe Enwee Mmeri
Ịhapụ ihe nketa nile mmadụ nwere wee kwaje Jerusalem ga-arụpụtaworị mmefu na ọghọm ụfọdụ. Ọ ga-ewetawokwara ndị ahụ nọ na Jerusalem ihe ize ndụ ụfọdụ. N’ihi ọnọdụ ndị ahụ, ndị ọzọ lere ndị ahụ nyere onwe ha n’afọ ofufo anya dị ka ndị kwesịrị ka e nye ha otuto, kpeekwa ekpere ka Jehova gọzie ha.
Ikwesị Ntụkwasị Obi Ga-eme Ka Chineke Gọzie Anyị
15 Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, anyị kwere ya nkwa na anyị ga na-eme uche ya, ihe ọ sọkwara ya bụrụ. Anyị ma mgbe ahụ na ọ gaghị adị mfe mgbe niile imezu nkwa ahụ. Ma, olee ihe anyị na-eme ma á gwa anyị mee ihe anyị na-achọghị ime? Ọ bụrụ na anyị erubere Chineke isi n’agbanyeghị na anyị achọbughị ime ya, anyị na-egosi na anyị na-emezu nkwa anyị kwere Chineke. Imezu nkwa anyị kwere Jehova nwere ike isiri anyị ezigbo ike, ma o nweghị mgbe ngọzi ya na-agaghị aka ihe ọ bụla anyị hapụrụ. (Malakaị 3:10) Ada Jefta kwanụ? Gịnị ka o mere mgbe ọ nụrụ nkwa nna ya kwere?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehemaịa
10:34—Gịnị mere e ji gwa ndị Izrel ka ha na-eweta nkụ? N’Iwu Mozis, e nyeghị iwu ka a na-eweta nkụ. Ọ bụ n’ihi mkpa e nwere mere e ji chọọ nke a. A chọrọ nnukwu nkụ iji suree àjà ndị a chụrụ n’elu ebe ịchụàjà n’ọkụ. Eleghị anya, e nweghị ndị Netinim zuru ezu, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ohu ụlọ nsọ, ndị na-abụghị ndị Izrel. N’ihi ya, a na-efe nza iji hụ na a na-enwe nkụ mgbe nile.
ỌGỌST 28–SEPTEMBA 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NEHEMAYA 12-13
“Gosi na Ị Na-akwado Jehova Mgbe Ị Na-ahọrọ Ndị Gị na Ha Ga-abụ Enyi”
it-1 95 ¶5
Ndị Amọn
Mgbe a chụpụchara Tobaya n’ụlọ nsọ, a gụpụtara iwu Chineke nyere na Diuterọnọmi 23:3-6, nke bụ́ na e nweghị onye Amọn ma ọ bụ onye Moab ga-abata n’ọgbakọ ụmụ Izrel. E mekwara ihe dị n’iwu ahụ. (Nehe. 13:1-3) E nyere ndị Izrel iwu a ihe dị ka otu puku (1,000) afọ tupu mgbe ahụ. Ihe mere e ji nye ya bụ maka na ndị Amọn na ndị Moab ekweghị enyere ndị Izrel aka mgbe ọ fọrọ obere ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Ihe iwu a pụtara bụ na a gaghị anabata ndị Amọn na ndị Moab ka ha soro n’ọgbakọ ụmụ Izrel, bụrụzie ụmụ amaala, nweekwa ikike na ihe ndị ọzọ ụmụ amaala na-enwe. Ma, ọ pụtaghị na ndị Amọn na ndị Moab enweghị ike iso ndị Izrel na-emekọ ihe ma ọ bụ soro ha biri, si otú ahụ na-enweta ngọzi Jehova na-awụkwasị ndị ya. Ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu bụ na Zilek, onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, so ná ndị dike bụ́ ndị ọchịagha Devid. Ihe ọzọ gosikwara ya bụ akụkọ Rut nwaanyị Moab.—Rut 1:4, 16-18.
E Doro Unu Nsọ
5 Gụọ Nehemaya 13:4-9. Ndị ọjọọ juru n’ụwa taa. Ha nwekwara ike ime ka anyị ghara ịdị nsọ. Baịbụl kọọrọ anyị gbasara Elayashib na otu nwoke aha ya bụ Tobaya. Elayashib bụ nnukwu onye nchụàjà, Tobaya abụrụ onye Amọn. O nwere ike ịbụ na Tobaya na-arụrụ eze ndị Peshịa ọrụ. Ya na ndị enyi ya gbasiri mbọ ike ka Nehemaya kwụsị ịrụzi mgbidi Jeruselem. (Nehe. 2:10) Jehova nyere ndị Izrel iwu na ndị Amọn ekwesịghị ịbata n’ụlọ nsọ. (Diut. 23:3) Gịnị mere Elayashib ji nye Tobaya ụlọ n’ebe a na-eri ihe n’ụlọ nsọ?
6 O nwere ihe atọ kpatara ya. Nke mbụ bụ na Tobaya na Elayashib bụ enyi. Nke abụọ bụ na Tobaya na nwa ya nwoke aha ya bụ Jehohenan lụchara ndị Juu. Ọtụtụ ndị Juu na-ekwukwa okwu ọma banyere Tobaya. (Nehe. 6:17-19) Nke atọ abụrụ na nwa nwa Elayashib lụrụ ada Sanbalat, bụ́ gọvanọ na-achị Sameria. Sanbalat na Tobaya bụkwa ezigbo enyi. (Nehe. 13:28) Ọ ga-abụ ihe ndị a mere Elayashib ji kwe ka Tobaya na-agwa ya ihe ọ ga na-eme n’agbanyeghị na Tobaya abụghị onye Izrel, na-agbakwa ndị na-arụzi mgbidi Jeruselem mgba okpuru. Ma, Nehemaya tụpụsịrị ngwongwo niile dị n’ụlọ Tobaya n’èzí. O si otú ahụ gosi na ya na-erubere Jehova isi.
Imeri Ihe Ịma Aka nke Iguzosi Ike n’Ihe
6 Ọ bụrụ na anyị na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke, anyị ga-ezere ime ndị nile bụ ndị iro ya enyi anyị. Ọ bụ ya mere Jemes onye na-eso ụzọ ji dee, sị: “Unu ndị na-akwa iko, ùnu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.” (Jemes 4:4) Anyị chọrọ inwe iguzosi ike n’ihe nke Eze Devid nyere ihe àmà ya mgbe ọ sịrị: “Ọ́ bụghị ndị na-akpọ Gị asị, Jehova, ka m na-akpọ asị? Ọ́ bụghịkwa ndị na-ebili imegide Gị ka m na-asọ oyi? Ọ bụ ịkpọasị nke zuru okè ka m ji kpọọ ha asị: ndị iro ka ha bụụrụ m.” (Abụ Ọma 139:21, 22) Anyị achọghị isoro ndị ọ bụla na-ama ụma eme mmehie na-akpakọrịta, n’ihi na o nweghị ihe jikọrọ anyị na ha. Ọ̀ bụ na iguzosi ike n’ihe nye Chineke agaghị egbochi anyị isoro ndị iro dị otú ahụ nke Jehova na-akpakọrịta, ma ọ bụ ná mmadụ ma ọ bụ site n’usoro mgbasa ozi telivishọn?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 452 ¶9
Egwú
E jighị ọrụ ịbụ abụ n’ụlọ nsọ egwu egwu. Ihe mere anyị ji kwuo otú a bụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ebe e kwuru banyere ndị na-abụ abụ n’Akwụkwọ Nsọ. Ihe ọzọ bụ na “o nweghị ọrụ ọzọ e nyere” ha otú ahụ ọ na-enweghị ọrụ ọzọ e nyere ndị Livaị ndị ọzọ, ka ha nwee ike ilekwasị anya n’ọrụ ha. (1 Ihe 9:33) Ihe gosiri na ndị a na-abụ abụ bụ ndị Livaị e nyere ọrụ pụrụ iche bụ na mgbe a na-ede aha ndị Juu si Babịlọn na-alọta, e dere aha nke hanwa iche. (Ezra 2:40, 41) Eze Peshia bụ́ Atazaksis (Lọnjimanus) nyedịrị iwu ka a ghara ịna ha na ndị ọzọ na-arụ ọrụ pụrụ iche “ụtụ isi, ụtụ ahịa, ma ọ bụ ụtụ ụzọ.” (Ezra 7:24) Mgbe e mechara, Atazaksis nyekwara iwu ka e nwee “ihe e kpebiri a ga na-enye ndị a na-abụ abụ nke ga na-ezuru ha kwa ụbọchị.” Ọ bụ eziokwu na e kwuru na ọ bụ Atazaksis nyere iwu a, ma ọ ga-abụ na ọ bụ Ezra nyere ya n’ihi na Atazaksis nyere ya ikike ime otú ahụ. (Nehe. 11:23; Ezra 7:18-26) N’ihi ya, n’agbanyeghị na ndị a na-abụ abụ bụkwa ndị Livaị, e nwere ezigbo ihe mere Baịbụl ji kwuo ihe gosiri na ha bụ ndị pụrụ iche mgbe o kwuru “ndị na-abụ abụ, na ndị Livaị.”—Nehe. 7:1; 13:10.