Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/15 p. 10-15
  • Jehova Kwesịrị Inweta Otuto Ebighị Ebi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Kwesịrị Inweta Otuto Ebighị Ebi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Dịghị Ngwupụta Ala Dịịrị Ịdị Ukwuu Jehova
  • Jaa Ọrụ Jehova Nile Mma
  • Too Jehova maka Ịdị Mma Ya
  • Jehova Nwere Obi Ebere
  • Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe Na-agọzi Jehova
  • A Pụghị Ịmatacha Ịdị Ukwuu Jehova Amatacha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Gọzie Aha Nsọ Jehova!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Toonụ Jehova, Bụ́ Chineke Anyị!
    Bụkuo Jehova Abụ
  • “Jehova Dị Ukwuu, Kwesịkwa Nnọọ Ka E Too Ya”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/15 p. 10-15

Jehova Kwesịrị Inweta Otuto Ebighị Ebi

‘Kwa ụbọchi ka m ga-agọzi gị; m ga-etokwa aha gị ruo mgbe nile ehighị ebi.’—ABỤ ỌMA 145:2.

1. N’ihi gịnị ka Devid ji nwee ọtụtụ ihe mere ọ ga-eji too Jehova?

OHU Jehova nke na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ Devid nwere ọtụtụ ihe mere ọ ga-eji too Chineke. Eze Israel oge ochie nke a a maara nke ọma maara banyere ịdị ukwuu na ịdị mma nke Jehova, ghọtakwa na ọbụbụeze ya na-adịru mgbe ebighị ebi. Onye ahụ Kasị Ihe Nile Elu kwesịrị inweta otuto maka inye ihe nile dị ndụ ihe na-akpa ha nakwa igosi ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ebere,

2. (a) Olee otú e si hazie Abụ Ọma 145? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị ga-atụle?

2 Devid nyere Chineke otuto dị otú ahụ n’Abụ Ọma nke 145. Amaokwu ọ bụla nke abụ ọma nke a nke a haziri n’usoro mkpụrụ akwụkwọ ji otu mkpụrụ akwụkwọ dị n’asụsụ Hibru malite, ọ bụ ezie na a mafere otu mkpụrụ akwụkwọ bụ (nun). Ọ pụrụ ịbụworị na nhazi a haziri ya n’usoro mkpụrụ akwụkwọ mere ihe iji nye aka icheta ya. Abụ Ọma 145 na-ebuli Jehova elu, dị ka n’okwu ndị ahụ bụ: ‘Kwa ụbọchị ka m ga-agọzi gị; m ga-etokwa aha gị ruo mgbe nile ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 145:2) Ma olee otú abụ ọma nke a pụrụ isi metụta anyị? Gịnị ka ọ pụrụ imere mmekọrịta dị n’etiti anyị na Chineke? Iji chọpụta, ka anyị buru ụzọ tụlee Ọma 145 amaokwu 1 ruo 10.

Ọ Dịghị Ngwupụta Ala Dịịrị Ịdị Ukwuu Jehova

3. Dị ka Devid, ụgwọ gini ka anyị ji ‘Chineke anyị bụ Eze,’ ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

3 Devid bụ eze, ma ọ nakweere ịbụ ọkaaka nke Jehova bụụrụ ya, na-asị: ‘M ga-eme gi ka ị dị elu, Chineke m, bú Eze; m ga-agọzikwa aha gị ruo mgbe nile ebighi ebi.’ (Abụ Ọma 145:1) Site ná nsọpụrụ dị omimi dị otú a, Ndịàmà Jehova na-ebuli aha Chineke elu, na-etokwa ya gburugburu ụwa dum. A na-eme ka ndụ anyị baa uru karị mgbe anyị na-ekere òkè n’ọrụ dị otú ahụ. Dị ka Devid, anyị ji Jehova ụgwọ nrubeisi na ido onwe anyị n’okpuru ya dị ka ‘Chineke na Eze anyị.’ Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka anyị na-agaghị eme otú ahụ? Ọ bụ ‘Eze nke mgbe ebighị ebi.’ (Mkpughe 15:3, NW) Karịsịa, Devid ahụ ka ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, onye nọworo na-achị achị site n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe kemgbe 1914, na-enye anyị ezi ihe nlereanya nke ido onwe onye n’okpuru Jehova, bụ́ Eze Mgbe Ebighị Ebi.

4. Olee ụzọ anyị pụrụ isi ‘gọzie aha Chineke’?

4 Devid kwuru na ya ‘ga-agọzi aha Chineke.’ Olee otú nke a ga-esi kwe mmadụ nkịtị omume? Ee, tinyere ihe ndị ọzọ, ịgọzi mmadụ gụnyere ikwu okwu ọma banyere ya. Ịgọzi aha Chineke pụtara na anyị nwere ịhụnanya siri ike n’ebe ọ nọ nakwa n’ebe aha nsọ ya, bụ́ Jehova, dị. Ọ dịghị mgbe anyị na-eme mkpesa banyere Chineke, ọ dịghị mgbe anyị na-achọpụta mmejọ ya, ọ dịghị mgbe anyị na-arụ ụka banyere ịdị mma ya. Ọ gwụlakwa ma ànyị nwere àgwà dị otu ahụ, rara onwe anyị nye ya, nọgidekwa n’iguzosi ike n’ezi ihe dị ka Ndịàmà ya meworo baptism, ka anyị pụrụ iso Devid kwuo na anyị ‘ga-agọzi aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi.’ Ọ bụrụ na anyị anọgide n’ịhụnanya Chineke, anyị ga-anata onyinye nke ndụ ebighị ebi wee si otu a nwee ike ịgọzi aha Jehova ruo mgbe ebighị ebi.—Jud 20, 21.

5. Ọchịchọ ịgọzi Jehova ‘kwa ụbọchị’ kwesịrị inwe mmetụta dị aṅaa n’ahụ anyị?

5 Ọ bụrụ na anyị hụrụ Onye Na-enye anyị Ndụ n’anya n’ezie, anyị ga-esoro Devid kwuo, sị: ‘Kwa ụbọchi ka m ga-agọzi gi; m ga-etokwa aha gị ruo mgbe nile ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 145:2) Lee nnọọ ka ụbọchị ga-esi bụrụ ihe tọgbọrọ n’efu ma ọ bụrụ na anyị etoghị Chineke! Ka a gharakwa inwe mgbe anyị ga-eji ọrụ n’aka nke ukwuu ma ọ bụkwanụ nwee oké nchegbu banyere ihe onwunwe nke na anyị agaghị ekwu okwu ọma banyere Nna anyị nke eluigwe ma ọ bụ kpekuo ya ekpere kwa ụbọchị. Jisọs gosiri na anyị kwesịrị ikpe ekpere kwa ụbọchị mgbe o kwuru n’ekpere nlereanya ya, sị: ‘Na-enye anyị nri kwa ụbọchị nke ga-ezuru anyị n’ụbọchị taa.’ (Luk 11:3) Ọtụtụ ndị nọ n’ozi oge nile na-eto Chineke kwa ụbọchị ka ha na-ekere òkè n’ije ozi ndị Kraịst. Ma, n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ anyị, obi anyị kwesịrị ịkpali anyị ịchọta otu ụzọ anyị ga-esi too Chineke kwa ụbọchị. Cheekwa nnọọ echiche banyere ya! Dị ka Ndịàmà Jehova raara onwe ha nye, ndị nwere olileanya ndụ ebighị ebi, anyị nwere olileanya ahụ dị ebube nke ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi.—Jọn 17:3.

6. N’ihi gịnị ka Jehova ji bụrụ ‘onye a na-eto nke ukwuu’?

6 N’ezie, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji too Chineke kwa ụbọchị, n’ihi na Devid kwukwara, sị: ‘Onye ukwu ka Jehova bụ, ọ bụkwa onye a na-eto nke ukwuu; ọ dịghịkwa ngwupụta ala dịịrị ịdị ukwuu ya.’ (Abụ Ọma 145:3) Jehova dị nnọọ ukwuu nke na ọ dịghị ihe a pụrụ iji tụnyere ya, ịbụ ọkaaka ya bụkwa nke a na-apụghị ịma aka. Eze Babilọn bụ Nebukadneza mesịrị kweta, sị: ‘Ọ dịghịkwa onye ga-eti aka [Chineke] ihe, sị ya, Gịnị ka i meworo?’ (Daniel 4:34, 35) Jehova bụ ‘onye a na-atụ egwu ya n’elu chi nile ọzọ.’ (Abụ Ọma 96:4) Ka a sịkwa ihe mere na ọ bụ ‘onye a na-eto nke ukwuu.’ Ee, ọ dịghị okwu inye otuto a ga-asị na ọ karịrị iji jaa Jehova mma! O kwesịrị inweta otuto ebighị ebi nke a na-akparaghị ókè ọ bụla.

7. Gịnị na-anwapụta na ‘ọdịghị ngwupụta ala dịịrị ịdị ukwuu’ Chineke?

7 ‘Ọ dịghịkwa ngwupụta ala dịịrị ịdị ukwuu’ Jehova. N’agbanyeghị otú ọ hà n’ibu, ịdị ukwuu ya dabeere n’ụdị Chineke ọ bụ. Ee, ihe ndị o kere eke dị ebube nke ukwuu na anyị apụghị ịghọta ha, anyị onwe anyị bụkwa ndị ‘e meworo n’ụzọ dị ebube.’ (Abụ Ọma 139:14; Job 9:10; 37:5) Karịsịa, lee nnọọ ka Jehova Chineke si eduzi onwe ya n’ụzọ dị ebube! Ọ na-eji ikwesị ntụkwasị obi na-emezu nkwa ya nile, jirikwa ịhụnanya na-ekpughe nzube ya nile. Ma, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla anyị ga-amatacha ihe nile banyere Chineke. Ruo mgbe nile ebighị ebi, anyị ga-enwe ike ịdị na-eto eto n’ihe ọmụma banyere ya, ihe okike ya, na nzube ya nile.—Ndị Rom 11:33-36.

Jaa Ọrụ Jehova Nile Mma

8. (a) Olee ụzọ ‘ọgbọ dị iche iche’ siworo jaa ọrụ nile nke Jehova mma? (b) Ọ bụrụ na anyị ezi ụmụ anyị ihe banyere ọrụ na ihe omume nile nke Jehova, olee ụzọ o yiri ka hà ga-esi ele ofufe ya anya? (c) Dị ka ‘ọgbọ’ nke nwere ọṅụ, gịni ka ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ meworo?

8 A pụrụ ikwu ihe dị ukwuu iji too Chineke anyị nke a na-apụghị igwupụta ala ịdị ukwuu ya nke na a kpaliri Devid ikwu, sị: ‘Otu ọgbọ ga-aja ọrụ gị nile ná ntị ọgbọ ọzọ, wee gosi ịdị ike gị nile.’ (Abụ Ọma 145:4) Ọgbọ dị iche iche nke ihe a kpọrọ mmadụ ajawo ọrụ nile nke Jehova mma, kọọkwa akụkọ banyere ọrụ ya dị iche iche dị ike. Lee nnọọ ihe ùgwù ọ bụ ịkọrọ ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible ihe ndị a! Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịgwa ha na ọ bụ Chineke kere ihe nile. (Jenesis 1:1-2:25; Mkpughe 4:11) Anyị pụrụ ikwu okwu banyere ọrụ ya dị ike n’oge mgbe ọ napụtara ụmụ Israel site n’ịbụ ohu n’Ijipt, nyere ha aka imeri ndị iro ha bụ ndị Kenean, chebe ha pụọ ná mgbukpọ na Peasia oge ochie, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. (Ọpụpụ 13:8-10; Ndị Ikpe 4:15; Esta 9:15-17) Ọ̀ bụkwa na a dịghị akpali anyị ịkọrọ ụmụ anyị banyere ọrụ na ihe omume dị iche iche nke Jehova? Ọ bụrụ na anyị enye ụmụ anyị ọzụzụ dị otú ahụ, ọ bụrụkwa na ha na-ahụ ka anyị ji ọṅụ na-ejere Chineke ozi, o yikarịrị ka hà ga-ele ife ya ofufe anya dị ka ihe obi ụtọ, tolitekwa, na-enwe ‘ọṅụ Jehova dị ka ike ha.’ (Nehemaịa 8:10; Abụ Ọma 78:1-4) Ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ mejupụtara otu ‘ọgbọ’ nwere ọṅụ nke Ndịàmà Jehova ndị na-aja ọrụ Chineke mma gwa ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ, bụ́ akụkụ nke ọgbọ ahụ nke gaje iketa Paradaịs elu ala.—Mkpughe 7:9.

9. Ka anyị na-atụgharị uche n’ọrụ na ihe omume dị iche iche dị ike nke Chineke, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka?

9 Ka anyị na-atụgharị uche n’ọrụ na ihe omume nile dị ike nke Chineke, ọ na-edo anyị anya ọbụna karị na ‘Jehova agaghị ahapụ ndị ya n’ihi aha ukwu ya.’ (1 Samuel 12:22; Abụ Ọma 94:14) Mgbe anyị na-eche ọnwụnwa, ihe isi ike, na mkpagbu ihu, anyị pụrụ ịdị jụụ, na-enwe obi ike na ‘udo nke Chineke’ ga-eche obi na echiche uche anyị nche. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ya mere, lee nnọọ ka o si kwesị ekwesị ka anyị na-agwa ndị ọzọ okwu banyere Nna anyị nke eluigwe nke na-ahụ n’anya, na-echebekwa anyị!

10. ‘Oké ọrụ nile’ nke Jehova gụnyere gịnị, oleekwa ụzọ anyị na-esi erite ụrụ site n’ịtụgharị uche na ha?

10 Anyị kwesịrị iwepụta oge iji tụgharịa uche n’ịdị ebube na ọrụ nile nke Jehova, n’ihi na Devid kwukwara, sị: ‘N’ịma mma nke nsọpụrụ nke ebube gị, na n’oké ọrụ gị nile, ka m ga-atụgharị uche.’ (Abụ Ọma 145:5) Ịdị ebube nke Chineke na-akpali egwu, ọ bụkwa nke na-enweghị atụ. (Job 37:22; Abụ Ọma 148:13) Otú a, Devid mere ka ịma mma nke nsọpụrụ nke ebube Chineke bụrụ ihe ọ na-atụgharị n’uche. Onye ọbụ abụ ahụ tụgharịkwara uche banyere ‘oké ọrụ nile’ nke Chineke. Ndị a gụnyere iji ikpe ziri ezi nke Chineke mee ihe n’ibibi ndị mmehie na ichebe ndị na-atụ egwu Chineke, dị ka e mere n’Iju Mmiri ahụ. (Jenesis 7:20-24; 2 Pita 2:9) Ịtụgharị uche n’ihe ndị dị otú ahụ na-ewusi mmekọrịta anyị na Jehova ike, na-emekwa ka anyị nwee ike ịgwa ndị ọzọ banyere ịdị ebube na oké ọrụ ya nile. N’ime 40 ụbọchị ọ nọrọ n’ime ọzara, e wusiri Jisọs ike imeri ọnwụnwa site na ya ịtụgharị uche n’ihe ndị ahụ eluigwe nke e megheworo mere ka ọ mata. (Matiu 3:13-4:11) Ya mere, ọ kọọrọ ndị ọzọ banyere ịdị ebube nke Jehova na oké ọrụ ya nile.

11. (a) N’ihi gịnị ka egwu jiri dakwasị ndị bi na Jeriko? (b) Mmụọ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-eji ekwu okwu banyere ‘ọrụ nile dị egwu’ na ‘ịdị ukwuu’ nke Chineke?

11 Mgbe anyị na-ekwu okwu banyere ịdị ebube na oké ọrụ nile nke Jehova, anyị na-akpalikwa ndị ọzọ ikwu okwu banyere ha. Devid sịrị: ‘Ọ bụkwa ike nke ọrụ gị nile dị egwu ka ha ga-ekwupụta; ọ bụkwa ịdị ukwuu gị ka m ga-akọ akụkọ ya.’ (Abụ Ọma 145:6) Rehab kọrọ banyere egwu nke dakwasịrị ndị bi na Jeriko mgbe ha nụrụ otú Jehova siworo napụta ndị Israel n’Osimiri Uhie ahụ, nakwa otú o siworo mee ka ha merie ndị eze Amọraịt abụọ. A ghaghị ịnọworịị na-ekwu okwu dị ukwuu banyere ‘ọrụ nile dị egwu’ dị otú ahụ na Jeriko. (Joshua 2:9-11) O dokwara anya na ‘mkpagbu ukwu’ ahụ nke ga-abịa n’isi nso ga-adị egwu. (Matiu 24:21) Ma ihe ndị na-eyi ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ egwu na-akpali n’ime ndị nwere obi eziokwu ‘egwu Jehova,’ bụ́ egwu kwesịrị ekwesị nke a na-atụ ya n’ụzọ nsọpụrụ. (Ilu 1:7) Site ná mmụọ nsọpụrụ dị omimi dị otú ahụ, Ndịàmà Jehova na-ekwu okwu banyere ngosipụta dị iche iche nke ike Chineke. Ee, Onye Ọrụ Ebube ahụ dị ukwuu bụ isiokwu bụ isi nke nkwurịta okwu n’etiti ndị ahụ e tere mmanụ na ndị enyi ha n’elu ala! Ọbụna mkpagbu adịghị egbochi ha ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị a na ‘ịdị ukwuu’ nke Jehova.—Ọrụ 4:18-31; 5:29.

Too Jehova maka Ịdị Mma Ya

12. Olee ụzọ ịdị mma Jehova na-esi eme ka anyị ‘kwuwaa okwu’?

12 Chineke kwesịrị inweta otuto, ọ bụghị nanị n’ihi ịdị ukwuu ya, kamakwa n’ihi ịdị mma na ezi omume ya. Ya mere, Devid sịrị: ‘Ncheta nke ịba ụba nke ịdị mma gi ka ha ga-ekwuwa, ọ bukwa ezi omume gị ka ha ga-eti mkpu ọṅụ banyere ya.’ (Abụ Ọma 145:7) Ịdị mma Jehova hiri nne nke ukwuu nke na anyị na-eji ọṅụ ‘na-ekwuwa okwu’ banyere ya. N’asụsụ Hibru, echiche dị n’okwu ahụ bụ nke mmiri si n’isi iyi na-asụpụta. Ya mere, ka anyị sụpụta otuto obi ekele nye Chineke dị ka iyi na-eru eru. (Ilu 18:4) Israel chefuru ịdị mma Jehova, bụ́ nke wetaara ha oké mmerụahụ n’ụzọ ime mmụọ. (Abụ Ọma 106:13-43) Kama, ka obi anyị jubiga Ókè n’ekele nke na ndị ọzọ na-echegharị mgbe ha matara otú Jehova siworo gosi ịdị mma n’ebe Ndịàmà ya raara onwe ha nye ya nọ.—Ndị Rom 2:4.

13. Ngosipụta dị iche iche nke ikpe ziri ezi na ezi omume Chineke kwesịrị inwe mmetụta dị aṅaa n’ahụ anyị?

13 Ka ngosipụta nke ikpe ziri ezi na ezi omume Chineke kpaliekwa anyị iti mkpu ọṅụ. Ya bụrụ na anyị enwee mmetụta dị otú ahụ, anyị ga-ebu ụzọ chọọ, ọ bụghị nanị Alaeze Chineke, kama anyị ga-achọkwa ezi omume ya. Anyị ga na-achọ ka àgwà anyị na-ewetara Jehova otuto mgbe nile. Ee, anyị ga-abụ ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze mgbe nile, na-arụsikwa ọrụ ike n’ijere Chineke ozi. Ọ dịghị mgbe ọ bụla a ga-eli otuto anyị na-enye Jehova n’ime ili nke ekwughị okwu.—Matiu 6:33; 1 Ndị Kọrint 15:58; Ndị Hibru 10:23.

Jehova Nwere Obi Ebere

14. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere nke na-egosi na ‘onye dị amara na onye nwere obi ebere ka Jehova bụ’?

14 N’ihota àgwà Chineke ndị ọzọ kwesịrị otuto, Devid sịrị ‘Onye dị amara na onye nwere obi ebere ka Jehova bụ; ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ dịkwa ukwuu n’ebere.’ (Abụ Ọma 145:8) Chineke dị amara n’echiche nke bụ na ọ dị nnọọ mma n’akụkụ nile, bụrụkwa onye na-emesapụ aka. (Matiu 19:17; Jemes 1:5) Ọ na-eme ihe ọma ọbụna nye ndị na-adịghị efe ya. (Ọrụ 14:14-17) Jehova bụkwa onye nwere obi ebere, na-enwe mmetụta, ‘na-echeta na ájá ka anyị bụ.’ Ọ dịghị eleda obi e gwepịara egwepịa anya ma ọ bụkwanụ na-emeso anyị ihe dị ka mmehie anyị nile si dị, kama o nwere obi ebere nke ukwuu karịa nna ọ bụla bụ mmadụ nke na-ahụ n’anya. (Abụ Ọma 51:17; 103:10-14) Ee, ná ngosipụta kasị ukwuu nke obi ebere, o zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka ọ nwụọrọ anyị ọnwụ ka e wee mee ka anyị na Chineke dịghachi ná mma, ka anyị detụkwa amara ya ọnụ n’ezie!—Ndị Rom 5:6-11.

15. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jehova Chineke ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,’ ma ‘dịkwa ukwuu n’ebere’?

15 Nna anyị nke eluigwe adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ. Ọ dịghị awụsa ọnụma ya n’ahụ ndị na-adịghị ihe ha mere. Jehova ‘dịkwa ukwuu n’ebere.’ N’ebe a, asụsụ Hibru ahụ na-egosi obi ebere nke gbanyere mkpọrọgwụ n’ịhụnanya, na-arapagidesikwa ike n’ihe. Ọ na-eme otú ahụ ruo mgbe e mezuru nzube o nwere banyere ihe ahụ. Ụzọ ọzọ a pụrụ isi dee ya bụ ‘ịhụnanya nke na-anọgidesi ike n’ihe.’ Gụnyere ihe ndị ọzọ, a na-egosipụta ebere ịhụnanya Chineke ma ọ bụ ịhụnanya ya nke na-anọgidesi ike n’ihe n’ọrụ nnapụta, nchekwa, nchebe, nnapụta site ná nsogbu dị iche iche, pụtakwa ná mmehie site n’àjà mgbapụta ahụ. (Abụ Ọma 6:4; 25:7; 31: 16, 21; 40:11; 61:7; 119:88, 159; 143:12; Jọn 3:16) Eziokwu ahụ nke bụ na Jehova ewetaghị Amagedọn ozugbo a lụsịrị ‘agha ahụ n’eluigwe’ mere ka ọtụtụ ìgwè mmadụ nwee ike inweta nzọpụta, nke bụ oké ngosipụta nke ịhụnanya obi ebere Chineke.—Mkpughe 12:7-12; 2 Pita 3:15.

16. Olee ụzọ Jehova siworo gosipụta onwe ya ‘onye dị mma n’ebe ihe nile e kere eke dị’?

16 N’iburu ebere Chineke n’uche, a pụrụ ikwu na o nwere obi sara mbara. Devid kwupụtara, sị: ‘Jehova dị mma n’ebe ihe nile e kere eke dị; obi ebere ya nile dịkwasịkwa n’ọrụ ya nile.’ (Abụ Ọma 145:9) Ee, Chineke mesoro ndị Israel ihe n’ụzọ dị mma. Ọbụna na ‘ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi mmadụ na ndị ajọ omume.’ (Matiu 5:43-45) N’Iden, Jehova kwere nkwa ‘mkpụrụ’ nke gaje ịbụ ihe ngọzi. O mesịrị gwa Abraham, sị: ‘Ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.’ (Jenesis 3:15; 22:18) Ịdị mma Chineke dịkwa ukwuu n’ime ‘mgbe ọgwụgwụ’ nke a nke na onye ọ bụla pụrụ ‘ịbịa nara mmiri nke ndụ n’efu.’ (Daniel 12:4; Mkpughe 22:17) Jehova dị njikere imere ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi ihe ọma, ịdị mma ya kwesịkwara ịdọta anyị nso ebe ọ nọ.

17. N’echiche dị aṅaa ka ‘obi ebere [Jehova] si dịkwasị n’ọrụ ya nile’?

17 ‘Obi ebere [Jehova] nile dịkwasịkwa n’ọrụ ya nile’ n’echiche nke bụ na ọ na-enye ma mmadụ ma anụmanụ ihe n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụ ya ‘na-enye anụ ahụ nile nri.’ (Abụ Ọma 136:25; 147:9) Chineke adịghị akwanyere ndị ọgaranya ùgwù ma na-akwa ndị e wedara n’ala emo, na-ebuli ndị mpako elu ma na-eleda ndị dị umeala n’obi anya, na-eweli ndị nzuzu elu ma na-eweda ndị maara ihe. Ndị na-emehie emehie na-eme otú ahụ, ma Nna anyị nke eluigwe nke nwere obi ebere adịghị eme otú ahụ. (Abụ Ọma 102:17; Zefanaịa 3:11, 12; Eklisiastis 10:5-7) Leekwa nnọọ ka obi ebere, ịdị mma, na ịhụnanya obi ebere Chineke si dị ukwuu n’ime ka o kwe omume inweta nzọpụta site n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya!—1 Jọn 4: 9, 10.

Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe Na-agọzi Jehova

18. (a) Olee ụzọ ọrụ nile nke Chineke si ‘na-ekele’ ya? (b) Olee mgbe e kwesịrị ịkpali anyị ikele Jehova?

18 Chineke kwesịrị inweta otuto site n’akụkụ nile. Dị ka Devid si kwuo ya: ‘Ọrụ gị nile na-ekele gị Jehova; ndị [gị na-eguzosi ike n’ihe, NW] na-agọzikwa gị.’ (Abụ Ọma 145:10) Ọrụ ihe okike nile nke Chineke ‘na-ekele’ ya, ọbụna ụlọ e wuru nke ọma na-enye onye wuru ya otuto, ite mara mma na-enyekwa onye ọkpụite nwere nkà otuto. (Tụlee Ndị Hibru 3:4; Aịsaịa 29:16; 64:8.) Ọrụ ihe okike nile nke Jehova dị ebube nke ukwuu nke na ha akpaliwo ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ inye ya otuto. Ndị mmụọ ozi bụ ụmụ Chineke jiri ọṅụ tie mkpu mgbe ọ tọrọ ntọala ụwa. (Job 38:4-7) Devid kwuru na ‘eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka ya ka mbara eluigwe na-egosi.’ (Abụ Ọma 19:1-6) Anyị pụkwara ikele Jehova mgbe anyị hụrụ ka égbé na-efegharị na mbara igwe ma ọ bụ mgbe ele na-amagharị n’elu ugwu nke jupụtara n’ahịhịa ndụ. (Job 39:26; Abụ Nke Abụ 2:17) O kwesịrị ekwesị inye otuto mgbe anyị wetara ihe ubi ma ọ bụ mgbe anyị na ndị enyi anyị so risịa nri. (Abụ Ọma 72:16; Ilu 15:17) Ahụ anyị nke a haziri n’ụzọ dị ebube pụkwara ịkpali anyị ikwupụta okwu inye ekele n’ụzọ otuto nye Chineke.—Abụ Ọma 139:14-16.

19. Olee ndị bụ ‘ndị na-eguzosi ike n’ihe,’ gịnịkwa ka ha na-eme?

19 Taa, ndị Jehova e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ́ ‘ndị ya na-eguzosi ike n’ihe,’ na-agọzi ya. Ha na-ekwu okwu ọma banyere ya, ọ na-agụsikwa ha agụụ ike ịhụ ka e mere ihe ọ na-achọ n’elu ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe. (Matiu 6:9, 10) Ka ndị ahụ e tere mmanụ na-agwa ndị ọzọ banyere ọrụ nile dị ebube nke Jehova, oké ìgwè mmadụ ahụ na-azaghachi n’ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba. Ha so ndị ahụ e tere mmanụ, bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ihe, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi dị ka ndị mkpọsa Alaeze. Obi ekele ọ̀ na-akpali gị ikerechi okè anya n’ọrụ nke a nke na-ewetara Chineke otuto?

20. (a) Olee ụzọ a ga-esi doo aha Jehova nsọ? (b) N’ihe banyere Abụ Ọma 145, ajụjụ dịgasị aṅaa fọdụrụ maka ntụle?

20 Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị yiri Devid, n’inye Chineke otuto. Nye anyị, ido aha nsọ Jehova nsọ na inye ya otuto bụ ihe ndị dị oké mkpa. Ebe ọ bụ na Alaeze Chineke ga-edo aha Chineke nsọ, ozizi Bible nke a banyere Alaeze ahụ bụ akụkụ dị mkpa nke ozi ọma ahụ anyị na-agbasa. Abụ Ọma 145 ọ̀ na-enye ìhè ime mmụọ n’ihe banyere nke a? Gịnị ka ntụle anyị nke akụkụ fọdụrụ n’abụ ọma nke a ga-ekpughe? N’ụzọ ndị ọzọ dị aṅaa ka o si na-anwapụta na Jehova kwesịrị inweta otuto ebighị ebi?

Gịnị BỤ Azịza Gị?

◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi gọzie aha Jehova?

◻ Gịnị bụ ọrụ Chineke ụfọdụ a pụrụ ịja mma?

◻ Olee ụzọ anyị ga-esi mee omume ma ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka ịdị mma Jehova?

◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka e siworo gosipụta obi ebere Chineke?

[Foto dị na peeji nke 12]

Ị̀ na-agwa ụmụ gi banyere ọrụ nile dị ike nke Jehova, dị ka ndị mụrụ ụmụ, bú ndị na-atụ egwu Chineke mere n’lsrael oge ochie?

[Foto dị na peeji nke 15]

Dị ka ụlọ e wuru nke ọma na-ewetara onye wuru ya otuto, otú a ka ọrụ ihe okike nile nke Jehova na-ewetara Ya otuto

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya