Job
37 “Obi kụwara m kpum kpum,
Obi mapụkwara m.
2 Geenụ ntị nke ọma ka unu nụ mkpọtụ olu ya na-eme
Na ụda si n’ọnụ ya apụta nke na-ada ka égbè eluigwe.
4 O gbuchaa, a na-anụ oké ụda.
Olu ya na-ada ụda ka égbè eluigwe,+
Ọ naghịkwa ejichi àmụ̀mà mgbe olu ya na-ada ụda.
5 Otú olu Chineke si ada ụda+ dị ebube.
Ọ na-eme nnukwu ihe ndị anyị na-enweghị ike ịghọta.+
7 Chineke na-akwụsị ọrụ niile mmadụ na-arụ,
Ka mmadụ efu ọ bụla wee mata ọrụ ya.
8 Anụ ọhịa na-abanye n’ebe ha bi,
Ha anaghịkwa apụta n’ebe ha na-ezo.
11 N’eziokwu, ọ na-eme ka mmiri na-anyịgbu urukpuru.
Ọ na-eme ka àmụ̀mà ya+ gbuo n’ebe niile n’ígwé ojii.
12 Ha na-aga okirikiri n’ebe ọ na-agwa ha ka ha gaa.
Ha na-eme ihe ọ bụla o nyere iwu+ ka ha mee n’ụwa.
13 Ọ na-eji urukpuru eweta ahụhụ,+ jiri ya na-eme ka mmiri zoo n’ala,
Ma ọ bụ jiri ya gosi ịhụnanya ya.+
14 Job, gee ntị n’ihe a.
Cheregodị ka i chee echiche nke ọma banyere ọrụ ndị dị ebube Chineke na-arụ.+
16 Ị̀ ma otú ígwé ojii si erugharị?+
Ihe ndị a bụ ọrụ ndị dị ebube Onye ma ihe niile na-arụ.+
19 Gwa anyị ihe anyị ga-agwa ya.
Anyị enweghị ike ịsa ya ihe ọ bụla n’ihi na anyị nọ n’ọchịchịrị.
20 M̀ kwesịrị ịgwa Chineke na m chọrọ ịgwa ya okwu?
Ka è nweela onye kwuru ihe e kwesịrị ịgwa ya?+
N’agbanyeghị na ọ na-achasi ike na mbara igwe,
Ruo mgbe ifufe fere wee mee ka mbara igwe gbachapụ.
22 Ìhè nke na-enwu ka ọlaedo na-esi n’ebe ugwu abịa.
Ebube Chineke+ dị egwu.
23 Anyị enweghị ike ịghọta ihe niile banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+
Ike ya dị ukwuu,+
E nweghịkwa mgbe ọ na-anaghị ekpe ikpe ziri ezi+ ma ọ bụ mgbe ọ na-anaghị eme ihe dị mma.+
24 Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji kwesị ịtụ egwu ya.+
N’ihi na ọ naghị enwe mmasị n’ebe ndị chere na ha ma ihe nọ.”+