Jehova Adịghị Eleda Obi Tiwara Etiwa Anya
“Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, ị dịghị eleda ya anya.”—ABỤ ỌMA 51:17.
1. Olee otú Jehova si ele ndị na-efe ya ofufe mere oké mmehie ma bụrụ ndị chegharịrị anya?
JEHOVA pụrụ ‘iwere igwe ojii kpuchie onwe ya, ka ekpere wee ghara ịgabiga.’ (Abụ Ákwá 3:44) Ma ọ chọrọ ka ndị ya nwee ike ịbịakwute ya. Ọbụna ma a sị na otu n’ime ndị na-efe ya ofufe adahie n’ụzọ dị oké njọ ma bụrụ onye nwere nchegharị, Nna anyị nke eluigwe na-echeta ihe ọma onye ahụ meworo. N’ihi ya, Pọl onyeozi pụrụ ịgwa ndị Kraịst ibe ya, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha ya dị.”—Ndị Hibru 6:10.
2, 3. Gịnị ka ndị okenye bụ ndị Kraịst kwesịrị ịtụle mgbe ha na-emeso ndị kwere ekwe ibe ha dahiere?
2 Ndị okenye bụ́ ndị Kraịst kwesịkwara ịtụle afọ ole nke ije ozi ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke nke ndị kwere ekwe ibe ha jeworo. Nke a na-agụnye ozi dị nsọ n’akụkụ ndị nwere nchegharị bụ́ ndị zọhieworo ụkwụ ma ọ bụ ọbụna ndị meworo ajọ mmehie. Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-achọ ọdịmma ime mmụọ nke ndị nile n’ìgwè atụrụ Chineke.—Ndị Galetia 6:1, 2.
3 Onye mmehie nwere nchegharị nwere mkpa maka ebere Jehova. Ma, a chọrọ ihe karịrị nke ahụ. Okwu ndị Devid kwuru n’Abụ Ọma 51:10-19 na-eme ka nke ahụ doo anya.
A Chọrọ Obi Dị Ọcha
4. N’ihi gịnị ka Devid ji kpee ekpere maka obi dị ọcha na mmụọ dị ọhụrụ?
4 Ọ bụrụ na onye Kraịst raara onwe ya nye nọ n’ọnọdụ ọjọọ n’ụzọ ime mmụọ n’ihi mmehie, gịnị pụrụ ịdị ya mkpa e wezụga ebere na mgbaghara Jehova? Devid rịọrọ, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.” (Abụ Ọma 51:10) O yiri ka Devid ọ rịọrọ arịrịọ nke a n’ihi na ọ ghọtara na ikike nke ime mmehie dị oké njọ ka dị n’ime obi ya. Ọ pụrụ ịbụ na anyị etinyebedịghị aka n’ụdị mmehie ndị matara Devid n’ọnyá n’ihe banyere Batsheba na Uraịa, ma enyemaka Jehova dị anyị mkpa iji zere ịdaba n’ọnwụnwa itinye aka n’àgwà ọ bụla nke mmehie dị oké njọ. Ọzọkwa, enyemaka Chineke pụrụ ịdị anyị mkpa n’onwe anyị iji wepụ n’obi anyị àgwà mmehie ndị dị ka ntaji anya na ịkpọasị—mpụ ndị yiri izu ohi na igbu mmadụ.—Ndị Kọlọsi 3:5, 6; 1 Jọn 3:15.
5. (a) Gịnị ka inwe obi dị ọcha pụtara? (b) Gịnị ka Devid chọsiri ike mgbe ọ rịọrọ maka mmụọ dị ọhụrụ?
5 Jehova chọrọ ka ndị na-ejere ya ozi nwee “obi dị ọcha,” ya bụ, ịdị ọcha nke nzube ma ọ bụ ebumnobi. N’ịmata na ya egosipụtabeghị ịdị ọcha dị otú ahụ, Devid kpere ekpere ka Chineke mee ka obi ya dị ọcha ma mee ka o kwekọọ n’ụkpụrụ nile nke Chineke. Onye ọbụ abụ ahụ chọkwara mmụọ, ma ọ bụ mkpali uche, dị ọhụrụ, nke ziri ezi. Ọ chọrọ mmụọ nke ga-enyere ya aka iguzogide ọnwụnwa ma rapagidesie ike n’iwu na ụkpụrụ nile nke Jehova.
Mmụọ Nsọ Dị Oké Mkpa
6. N’ihi gịnị ka Devid ji rịọ Jehova ka ọ ghara ịnapụ ya mmụọ nsọ ya?
6 Mgbe anyị nọ n’obi nkoropụ n’ihi ihie ụzọ ma ọ bụ ngahie anyị, ọ pụrụ ịdị anyị ka Chineke ọ̀ na-achọ ịkụchapụ anyị n’akụkụ ma wepụ mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ ya, n’ebe anyị nọ. Otú ahụ ka ọ dịrị Devid, n’ihi na ọ rịọrọ Jehova, sị: “Atụpụla m n’ihu gị; anarakwala m mmụọ nsọ gị.” (Abụ Ọma 51:11) Devid nke na-enwe mwute n’ihi mmehie ya na nke wedara onwe ya ala chere na mmehie ya nile emewo ka ọ ghara iru eru ijere Jehova ozi. Ịbụ onye a tụpụrụ site n’ihu Chineke ga-apụta ịtụfu amara, nkasi obi, na ngọzi ya. Ọ bụrụ na a ga-eweghachi Devid n’ụzọ ime mmụọ, mmụọ nsọ Jehova dị ya mkpa. Ọ bụrụ na ọ dịkwasị ya, eze ahụ pụrụ iji ekpere chọọ nduzi Chineke ka o wee mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, nwee ike izere mmehie, ma nwee ike iji amamihe na-achị. N’ịmata banyere mmehie ya nile megide Onye Na-enye mmụọ nsọ, Devid rịọrọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị ka Jehova ghara iwepụ ya n’ebe ọ nọ.
7. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji kpee ekpere maka mmụọ nsọ ma nọrọ na nche megide ịkpasu ya iwe?
7 Gịnị banyere anyị? Anyị kwesịrị ikpe ekpere maka mmụọ nsọ, anyị aghaghịkwa ịnọ na nche megide ịkpasu ya iwe site n’ịhapụ ịgbaso nduzi ya. (Luk 11:13; Ndị Efesọs 4:30) Ma ọ bụghị otú ahụ, anyị pụrụ ịtụfu mmụọ ahụ, wee ghara inwe ike igosipụta mkpụrụ ya ndị sitere n’aka Chineke ndị bụ́ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè. Jehova Chineke ga-anapụ anyị mmụọ nsọ ya karịsịa ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-emehie megide ya n’enweghị nchegharị.
Obi Ụtọ nke Nzọpụta
8. Ọ bụrụ na anyị emehie ma chọọ inwe ọṅụ nke nzọpụta, gịnị ka ọ dị anyị mkpa ime?
8 Onye mmehie chegharịrịnụ nke e weghachiri n’ime mmụọ pụrụ ịṅụrị ọṅụ ọzọ ná ndokwa Jehova mere maka nzọpụta. N’ihi ịchọsi nke a ike, Devid kpọkusiri Chineke ike, sị: “Nyeghachi m obi ụtọ nke nzọpụta gị: werekwa mmụọ nke amara aha ya kwagide m.” (Abụ Ọma 51:12) Lee ka o si bụrụ ihe dị ebube inwe obi ụtọ n’olileanya ahụ e ji n’aka nke nzọpụta site n’aka Jehova Chineke! (Abụ Ọma 3:8) Mgbe o mehiesịrị megide Chineke, Devid chọrọ mweghachi nke ọṅụ nke nzọpụta Ya. Mgbe e mesịrị, Jehova mere ndokwa maka nzọpụta site n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya, Jisọs Kraịst. Ọ bụrụ na anyị, dị ka ndị raara onwe ha nye bụ́ ndị na-ejere Chineke ozi, emee mmehie jọrọ oké njọ kama chọọ ka e weghachiri anyị ọṅụ nke nzọpụta, ọ dị anyị mkpa inwe àgwà nchegharị, anyị agaghịkwa ejiri mmehie anyị gaa n’ihu ruo n’ókè nke imehie megide mmụọ nsọ.—Matiu 12:31, 32; Ndị Hibru 6:4-6.
9. Gịnị ka Devid na-arịọ mgbe ọ rịọrọ Chineke ka ọ kwadoo ya ọbụna site na “mmụọ nke amara aha ya”?
9 Devid rịọrọ ka Jehova kwado ya “ọbụna site na mmụọ nke amara aha ya.” O doro anya na nke a na-ezo aka, ọ bụghị n’ịdị njikere nke Chineke inye aka ma ọ bụ na mmụọ nsọ ya, kama ná mkpali uche nke na-arụgide Devid ime ihe. Devid chọrọ ka Chineke kwado ya site n’inye ya mmụọ dị njikere ime ezi ihe ọ bụghị ịdabakwa ná mmehie ọzọ. Jehova Chineke na-anọgide na-akwado ndị na-ejere ya ozi, na-ekulitekwa ndị na-eruda ala site n’ule dị iche iche. (Abụ Ọma 145:14) Lee ka o si bụrụ ihe nkasi obi ịmata nke a, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị adahiewo ma na-enwe mwute ma chọọ ijere Jehova ozi mgbe nile ọzọ n’ikwesị ntụkwasị obi!
Kụziere Ndị Njehie Gịnị?
10, 11. (a) Gịnị ka Devid pụrụ ịkụziri ndị Israel na-ejehie ejehie? (b) Devid pụrụ ịkụziri ndị mmehie ihe nanị mgbe o meworo gịnị n’onwe ya?
10 Ọ bụrụ na Chineke ga-ekwe, Devid chọrọ isite n’achọghị ọdịmma onwe ya nanị mee ihe nke ga-egosipụta obi ekele ya maka ebere Jehova na nke ga-enyere ndị ọzọ aka. Site n’okwu ekpere ndị na-emetụ n’obi bụ́ ndị a gwara Jehova, eze ahụ chegharịrị echegharị kwuzịrị: “M ga-ezi ndị njehie ụzọ gị nile; ndị mmehie ga-alaghachikwutekwa gị.” (Abụ Ọma 51:13) Olee otú Devid na-eme mmehie pụrụ isi kụziere ndị njehie Iwu Chineke? Gịnị ka ọ pụrụ ịg̣wa ha? Ihe ọma dị aṅaa ka nke a pụrụ ịrụzu?
11 Mgbe ọ na-egosi ndị Israel na-ejehie ejehie ụzọ Jehova n’olileanya nke ichigharị ha pụọ n’ụzọ ajọ omume, Devid pụrụ igosipụta otú mmehie si bụrụ ihe ọjọọ, ihe nchegharị pụtara, na ụzọ isi nata ebere Chineke. Ebe o nweworo ihe mgbu nke enweghị ihu ọma Jehova na akọ na uche nọ n’ikpe ọmụma, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Devid ga-abụ onye ozizi dị ọmịiko nye ndị mmehie chegharịrịnụ, ndị obi ha tiwara etiwa. Ee, ọ pụrụ iji ihe nlereanya nke ya kụziere ndị ọzọ ihe nanị mgbe ya onwe ya nakwerewooro ụkpụrụ Jehova ma nata mgbaghara Ya, n’ihi na ndị jụrụ ido onwe ha n’okpuru ihe Chineke chọrọ erughị eru ‘ịkọ ụkpụrụ Chineke nile.’—Abụ Ọma 50:16, 17.
12. Olee otú Devid si rite uru site n’ịmara na Chineke anapụtawo ya site n’ikpe ọmụma ọbara?
12 N’ikwughachi ebumnobi ya n’ụdị ọzọ, Devid sịrị: “Napụta m n’aka ikpe ọmụma ọbara dị iche iche, Chineke, bụ́ Chineke nke nzọpụta m; ire m ga-eti mkpu ọṅụ banyere ezi omume gị.” (Abụ Ọma 51:14) Ikpe ọmụma ọbara ji ọmụma ikpe nke ọnwụ bịa. (Jenesis 9:5, 6) Ya mere ihe ọmụma nke na Chineke nke nzọpụta ya anapụtawo ya site n’ikpe ọmụma ọbara n’ihe banyere Uraịa ga-enye Devid udo nke obi na uche. Ire ya pụrụ mgbe ahụ ịbụ abụ n’ọṅụ banyere ezi omume Chineke, ọ bụghị nke ya. (Eklisiastis 7:20; Ndị Rom 3:10) Devid apụghị ihichapụ omume rụrụ arụ ya ma ọ bụ weghachite Uraịa site n’ili, ọbụna dị ka mmadụ nke oge a na-apụghị iweghachi ịdị ọcha nke onye ọ ghọgburu ma ọ bụ kpọlite onye o gbuworo. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iche echiche banyere nke ahụ mgbe a nwara anyị? Leekwa ka anyị kwesịrị isi nwee obi ekele nke ukwuu karị maka ebere Jehova e gosiri anyị n’ezi omume! N’ezie, obi ekele kwesịrị ịkpali anyị iduzi ndị ọzọ gaa n’Isi Mmiri Iyi nke a nke ezi omume na mgbaghara.
13. Ọ̀ bụ nanị n’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka egbugbere ọnụ onye mmehie pụrụ imeghe n’izi ezi n’otuto Jehova?
13 Ọ dịghị onye mmehie pụrụ izi ezi imeghe egbugbere ọnụ ya n’ito Jehova ọ gwụla ma Chineke o ji ebere meghee ha, dị ka a pụrụ ikwu ya, iji kwuo eziokwu Ya nile. Ya mere Devid bụrụ abụ, sị: “Onyenwe anyị, ị ga-emeghe egbugbere ọnụ m abụọ; ọnụ m ga-egosikwa otuto gị.” (Abụ Ọma 51:15) Ebe e meworo ka akọ na uche ya nwee udo n’ihi mgbaghara Chineke, a ga-akwali Devid ịkụziri ndị njehie ụzọ nile nke Jehova, ọ pụkwara inwere onwe ya ibuli Ya elu. Ndị nile a gbagharawooro mmehie ha dị ka a gbaghaara Devid kwesịrị inwe ekele maka amara Jehova, ha kwesịkwara iji ohere ọ bụla dapụtara kpọsaa eziokwu Chineke ma ‘gosi otuto ya.’—Abụ Ọma 43:3.
Àjà Ndị Chineke Na-anakwere
14. (a) Àjà ndị dị aṅaa ka a chọrọ dị ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ si dị? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji zie ezi iche na anyị pụrụ iji ime ihe ọma ụfọdụ kwụọ ụgwọ ịnọgide na-agahie?
14 Devid enwetawo nghọta miri emi nke mere o ji kwuo, sị: “N’ihi na àjà adịghị atọ gị [Jehova] ụtọ; ka m wee nye ya: àjà nsure ọkụ adịghị atọ gị ụtọ.” (Abụ Ọma 51:16) Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ chọrọ ka a na-achụrụ Chineke àjà ụmụ anụ. Ma mmehie Devid nke ịkwa iko na igbu mmadụ, ndị ọnwụ bụ ntaramahụhụ ha, bụ ndị àjà ndị dị otú ahụ na-apụghị ịkachapụ. Ma ọ bụghị otú ahụ, ọ dịghị ihe gaara akwụsị ya ịchụrụ Jehova àjà ụmụ anụ. Ma e nweghị nchegharị si n’obi, àjà abaghị uru ọ bụla. Ya mere ọ gaghị ezi ezi iche na anyị pụrụ iji ime ihe ọma ụfọdụ kwụọ ụgwọ ịnọgide na-agahie.
15. Gịnị bụ àgwà nke onye raara onwe ya nye nke nwere mmụọ tiwara etiwa?
15 Devid kwukwara, sị: “Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, ị dịghị eleda ya anya.” (Abụ Ọma 51:17) N’akụkụ nke onye mmehie chegharịrịnụ, ‘àjà nile nke Chineke na-anakwere bụ mmụọ tiwara etiwa.’ Onye dị otú ahụ enweghị àgwà esemokwu. Obi nke onye raara onwe ya nye nke nwere mmụọ tiwara etiwa na-enwe mwute dị omimi n’ihi mmehie ya, na-ehuda ala n’ihi inwe mmetụta nke amamikpe Chineke, dịkwa njikere ime ihe ọ bụla iji nweghachi amara Chineke. Anyị apụghị inye Chineke ihe ọ bụla bara uru ruo mgbe anyị chegharịrị site ná mmehie nile anyị wee nye ya obi anyị site n’inyefe ya onwe anyị dum.—Nehum 1:2.
16. Olee otú Chineke si ele onye obi ya tiwara etiwa n’ihi mmehie ya anya?
16 Chineke adịghị ajụ àjà dị ka obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa. Ya mere, n’agbanyeghị ihe isi ike ọ bụla anyị zutere dị ka ndị ya, ka anyị ghara ikwe ka obi nkoropụ rikpuo anyị. Ọ bụrụ na anyị asụwo ngọngọ n’ụzọ nke ndụ ahụ n’ụzọ ụfọdụ nke na-eme ka obi anyị na-ebe ákwá maka ebere Chineke, olileanya ka dị. Ọbụna ma ọ bụrụ na anyị emewo mmehie dị oké njọ ma chegharịa, Jehova agaghị elelị obi anyị tiwara etiwa. Ọ ga-agbaghara anyị ná ndabere nke àjà mgbapụta Kraịst, ọ ga-eweghachikwa anyị n’amara Ya. (Aịsaịa 57:15; Ndị Hibru 4:16; 1 Jọn 2:1) Otú ọ dị, dị ka Devid, ekpere anyị kwesịrị ịbụ maka mweghachi nke amara Chineke ọ bụghị maka ịgbanahụ ịdọ aka ná ntị ma ọ bụ mgbazi olu nke dị mkpa. Chineke gbaghaara Devid, ma ọ takwara ya ahụhụ.—2 Samuel 12:11-14.
Nchegbu Maka Ofufe Dị Ọcha
17. E wezụga ịrịọ maka mgbaghara Chineke, gịnị ka ndị mmehie kwesịrị ime?
17 Ọ bụrụ na anyị emewo ajọ mmehie, ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a ga-adị oké arọ n’uche anyị, obi nke na-akwa ụta ga-akwalikwa anyị ịrịọ maka mgbaghara Chineke. Ka o sina dị, ka anyị kpekwaara ndị ọzọ ekpere. Ọ bụ ezie na Devid lepụrụ anya maka ifekwa Chineke ofufe ọzọ n’ụzọ ọ na-anakwere, abụ ọma ya ahapụghị ndị ọzọ n’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Ọ gụnyere arịrịọ nke a a rịọrọ Jehova: “Meere Zaịọn mma dị ka o si dị gị ụtọ: ị ga-arụ mgbidi nile nke Jerusalem.”—Abụ Ọma 51:18.
18. N’ihi gịnị ka Devid nwere nchegharị ji kpeere Zaịọn ekpere?
18 Ee, Devid lepụrụ anya maka mweghachi ya gaa n’amara Chineke. Otú ọ dị, ọ bụkwa ekpere ọbụ abụ ahụ wedara onwe ya ala ka ‘Chineke meere Zaịọn mma dị ka o si dị ya ụtọ,’ bụ́ isi obodo Israel, Jerusalem, ebe Devid nwere olileanya iwu ụlọ nsọ Chineke. Ajọ mmehie ndị Devid mere eyiwo mba ahụ dum egwu, n’ihi na mmadụ nile ahụ gaara atawo ahụhụ n’ihi ngahie eze ahụ. (Tụlee 2 Samuel, isi nke 24.) Ya bụ na mmehie ya nile mere ka “mgbidi nile nke Jerusalem” ghara ịdịkwa ike, nke na ugbu a ọ dị mkpa ka e wughachi ha.
19. Ọ bụrụ na anyị emehiewo e wee gbaghara anyị, maka gịnị ka ọ ga-ekwesị ekwesị ka anyị kpee ekpere?
19 Ọ bụrụ na anyị emewo mmehie dị oké njọ ma natawo mgbaghara Chineke, ọ ga-ekwesị ekwesị ikpe ekpere ka o dozie n’ụzọ ụfọdụ ihe ọ bụla àgwà anyị mebiworo. Anyị pụrụ iwetaworo aha nsọ ya nkọcha, nwee ike mewo ka ọgbakọ ghara isikwa ike, nweekwa ike iwetaworo ezinụlọ anyị mwute. Nna anyị nke eluigwe nke na-ahụ n’anya pụrụ iwepụ nkọcha ọ bụla e wetaara aha ya, nwee ike iwuli ọgbakọ ahụ elu site ná mmụọ nsọ ya, nweekwa ike ịkasi ndị anyị hụrụ n’anya obi, bụ́ ndị hụrụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi. N’ezie, ma e mere mmehie ma ọ bụ na e meghị mmehie, ido aha Jehova nsọ na ọdịmma nke ndị ya kwesịrị ịbụ nchegbu anyị mgbe nile.—Matiu 6:9.
20. N’okpuru ọnọdụ ndị aṅaa ka Jehova ga-enwe obi ụtọ n’àjà nile nke Israel?
20 Ọ bụrụ na Jehova ewughachi mgbidi nile nke Zaịọn, gịnị ọzọ ga-eme? Devid bụrụ abụ, sị: “Mgbe ahụ ka àjà nile nke ezi omume, bụ́ àjà nsure ọkụ na àjà nsụresị ọkụ, ga-atọ gị [Jehova] ụtọ: mgbe ahụ ka ha ga-achụ ọtụtụ oké ehi n’elu ebe ịchụàjà gị.” (Abụ Ọma 51:19) Devid chọsiri ike ka ya na mba ahụ nwee amara Jehova ka ha wee nwee ike ife Ya n’ụzọ ọ na-anakwere. Mgbe ahụ Chineke ga-enwe obi ụtọ n’àjà nsure ọkụ na àjà nsuresị ọkụ ha. Nke a ga-adị otú ahụ n’ihi na ndị a ga-abụ àjà ezi omume nke ndị raara onwe ha nye, nwere obi eziokwu, ndị chegharịrịnụ, na-enwe amara Chineke, chụrụ. Site n’ekele maka ebere Jehova, n’elu ebe ịchụàjà ya ka ha ga-achụ ọtụtụ oké ehi—àjà ndị kasị mma ma dị oké ọnụ ahịa karịsịa. Taa, anyị na-asọpụrụ Jehova site n’iwetara ya ihe kasị mma anyị nwere. Àjà anyị gụnyekwara “egbugbere ọnụ anyị, dị ka oké ehi,” àjà otuto nye Chineke anyị dị ebere, bụ́ Jehova.—Hosea 14:2; Ndị Hibru 13:15.
Jehova Na-anụ Ákwá Anyị
21, 22. Abụ Ọma nke 51 nwere ihe mmụta ndị dị aṅaa maka abamuru anyị?
21 Ekpere Devid sitere n’obi nke e dekọrọ n’Abụ Ọma nke 51 na-egosi anyị na anyị kwesịrị iji mmụọ nke ezigbo nchegharị meghachi omume n’ebe mmehie anyị dị. Abụ ọma nke a nwekwara ihe mmụta ndị doro anya maka abamuru anyị. Iji maa atụ, ọ bụrụ na anyị emehie ma nwee nchegharị, anyị pụrụ ịtụkwasị ebere Chineke obi. Otú ọ dị, ka anyị nwee nchegbu n’ụzọ bụ isi banyere nkọcha ọ bụla anyị pụrụ iwetaworo aha Jehova. (Amaokwu nke 1-4) Dị ka Devid, anyị pụrụ ịkpọku Nna anyị nke eluigwe maka ebere ná ndabere nke mmehie e ketara eketa. (Amaokwu nke 5) Anyị kwesịrị ịdị na-ekwu eziokwu, ọ dịkwa anyị mkpa ịchọ amamihe site n’aka Chineke. (Amaokwu nke 6) Ọ bụrụ na anyị emehiewo, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova maka ime ka anyị dị ọcha, obi dị ọcha, na mmụọ nke na-eguzosi ike.—Amaokwu nke 7-10.
22 Site n’Abụ Ọma nke 51 anyị pụkwara ịhụ na anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla ikwere ka mmehie sie anyị ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Jehova ga-anapụ anyị mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ, ya. Otú ọ dị, site na mmụọ Chineke ịdịkwasị anyị, anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịkụziri ndị ọzọ ụzọ ya. (Amaokwu nke 11-13) Ọ bụrụ na anyị adahie ma chegharịa, Jehova ga-ekwere ka anyị nọgide na-eto ya n’ihi na ọ dịghị mgbe ọ ga-eleda obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, anya. (Amaokwu nke 14-17) Abụ ọma nke a gosikwara na ekpere anyị ekwesịghị ịdabere nanị n’ebe anyị onwe anyị nọ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ngọzi na ọdịmma ime mmụọ nke ndị nile na-ekere òkè n’ofufe Jehova nke dị ọcha.—Amaokwu nke 18, 19.
23. N’ihi gịnị ka Abụ Ọma nke 51 kwesịrị iji kwalie anyị inwe obi ike na olileanya?
23 Abụ ọma Devid nke a na-emetụ n’obi kwesịrị ịkpali anyị inwe obi ike na olileanya. Ọ na-enyere anyị aka ịmata na ọ bụghị iwu na anyị ga-eche na olileanya adịkwaghị ọbụna ma anyị sụọ ngọngọ banye ná mmehie. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na anyị echegharịa, ebere Jehova pụrụ ịzọpụta anyị site n’obi nkoropụ. Ọ bụrụ na anyị nwere mwute ma nyefee Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya onwe anyị kpam kpam, ọ na-anụ ákwá anyị maka enyemaka. Leekwa ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na Jehova adịghị eleda obi tiwara etiwa anya!
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ji nwee mkpa maka obi dị ọcha na mmụọ nsọ Chineke?
◻ Gịnị ka onye nwere nchegharị pụrụ ịkụziri ndị njehie nke iwu Jehova?
◻ Olee otu Jehova si ele obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa anya?
◻ Ihe mmụta ndị dị aṅaa ka a na-achọta n’Abụ Ọma nke 51?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ị̀ na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ ma na-anọ na nche megide ịkpasu ya iwe?
[Foto dị na peeji nke 17]
Gosi ekele maka amara Jehova site n’ịkpọsa eziokwu ya