Iji Iguzosi Ike n’Ihe Soro Nzukọ Jehova Na-eje Ozi
“N’ebe onye na-eguzosi ike n’ihe nọ ị ga-eme ihe n’ụzọ iguzosi ike n’ihe.”—2 SAMUEL 22:26, NW.
1, 2. Gịnị bụ ụfọdụ ihe atụ nke iguzosi ike n’ihe ndị anyị nile pụrụ ịhụ n’ime ọgbakọ?
’OTU abalị otu okenye nọ na-akwadebe okwu maka nzukọ ndị Kraịst. Ọ ga-achọ ịkwụsị ma zuru ike; kama nke ahụ, ọ nọgidere na-arụ ọrụ, na-achọ ihe ilereanya na ihe atụ Akwụkwọ Nsọ ndị ga-eru n’obi ma gbaa ìgwè atụrụ ahụ ume. N’abalị nzukọ ahụ, nne na nna ike gwụsịrị n’otu ọgbakọ ahụ gaara eji otu mgbede kporie ndụ n’ụlọ; kama nke ahụ, ha na-eji ndidi jikere ụmụ ha ma gaa nzukọ ahụ. Mgbe nzukọ gasịrị, otu ìgwè nke ndị Kraịst nọ na-ekwurịta banyere ihe omume onye okenye ahụ. Ọ fọrọ nke nta ka otu nwanyị kwuo na otu nwanna nwoke ahụ kpasuru ya iwe n’otu oge; kama nke ahụ, o ji ikpo ọkụ na-ekwu banyere otu n’ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ o kwuru. Ị̀ na-ahụ otu isi ihe na-agazu ihe omume ndị a?
2 Isi ihe ahụ bụ iguzosi ike n’ihe. Onye okenye ahụ ji iguzosi ike n’ihe na-arụ ọrụ ijere ìgwè atụrụ Chineke ozi; nne na nna ahụ ji iguzosi ike n’ihe na-aga nzukọ ọgbakọ; nwanna nwanyị ahụ ji iguzosi ike n’ihe na-akwado ndị okenye. (Ndị Hibru 10:24, 25; 13:17; 1 Pita 5:2) Ee, n’akụkụ nile nke ndụ, anyị na-ahụ ndị Chineke kpebisiri ike iji iguzosi ike n’ihe soro nzukọ Jehova na-eje ozi.
3. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa nke ukwuu ka anyị nọgide na-eguzosi ike n’ihe nye nzukọ elu ala nke Jehova?
3 Mgbe Jehova na-elekwasị anya n’elu ụwa a rụrụ arụ, iguzosi ike n’ihe ọ na-ahụ dị nnọọ nta. (Maịka 7:2) Lee ka obi ya na-aghaghị isi ṅụrịa ọṅụ mgbe ọ na-ahụ iguzosi ike n’ihe nke ndị ya! Ee, iguzosi ike n’ihe nke gị na-atọ ya ụtọ. Otú ọ dị, ọ na-akpasu Setan iwe, bụ́ onye mbụ nupụrụ isi, ma na-anwapụta ya ịbụ onye ụgha. (llu 27:11; Jọn 8:44) Tụọ anya na Setan ga-agbalị imebi iguzosi ike n’ihe gị nye Jehova na nye nzukọ elu ala Ya. Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ Setan si eme nke a. Anyị pụrụ isi otú ahụ hụ n’ụzọ ka mma otú anyị pụrụ isi nọgide na-eguzosi ike n’ihe ruo ọgwụgwụ.—2 Ndị Kọrint 2:11.
Ilekwasị Anya n’Ezughị Okè Pụrụ Ibibi Iguzosi Ike n’Ihe
4. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mfe ịkatọ ndị ikike dị n’aka? (b) Olee otú Kora si gosipụta eguzosighị ike n’ihe nye nzukọ Jehova?
4 Mgbe nwanna nwoke nwere ibu ọrụ, mmejọ ya pụrụ ịpụta ìhè karị. Lee ka o si dị mfe ịkatọ ‘irighiri ahịhịa dị n’anya nwanna anyị ma na-eleghara ntụhie nke dị n’anya nke anyị anya’! (Matiu 7:1-5) Otú ọ dị, ilekwasị anya ná mmejọ pụrụ ịkpata eguzosighị ike n’ihe. Iji maa atụ, tụlee ọdịiche dị n’etiti Kora na Devid. Kora nwere ibu ọrụ dị ukwuu, eleghịkwa anya o guzosiwo ike n’ihe ruo ọtụtụ afọ, ma ọ ghọrọ onye nwere oké ọchịchọ. Ịbụisi Mosis na Erọn, bụ́ ụmụ nwanne ya, were ya iwe. N’agbanyeghị na Mosis dị umeala karịa ndị ikom nile, o doro anya na Kora malitere ile ya anya nkatọ. O yiri ka ọ hụrụ mmejọ n’ebe Mosis nọ. Ma, mmejọ ndị ahụ emeghị ka eguzosighị ike n’ihe Kora nye nzukọ Jehova zie ezi. E bibiri ya pụọ n’etiti mkpọkọta ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 12:3; 16:11, 31-33.
5. N’ihi gịnị ka Devid pụrụ iji bụrụ onye a nwara inupụrụ Sọl isi?
5 Devid, n’aka nke ọzọ, jere ozi n’okpuru Eze Sọl. Onye bụ eze ọma n’otu oge, Sọl aghọwo onye ajọ omume n’ezie. Okwukwe, ntachi obi, na ọbụna ịdịtụ akọ dị Devid mkpa iji lanarị mwakpo nke Sọl na-ekwo ekworo. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe Devid nwere ohere imegwara, ọ sịrị na ọ bụ ‘ihe arụ, site na Jehova,’ ya ime omume eguzosighị ike n’ihe megide onye Jehova teworo mmanụ.—1 Samuel 26:11.
6. Ọbụna a sị na anyị achọpụta adịghị ike na mmejọ n’ebe ndị okenye nọ, gịnị ka anyị na-agaghị anwa anwa ime?
6 Mgbe ụfọdụ ndị na-edu ndú n’etiti anyị yiri ka ha kpejọrọ ikpe, kwuo okwu n’olu ike, ma ọ bụ yie ka ha na-emelara mmadụ ihe, ànyị ga-eme mkpesa banyere ha, ikekwe na-atụnye ụtụ ná mmụọ nkatọ n’ime ọgbakọ? Ànyị ga-ahapụ ịga nzukọ ndị Kraịst iji gosipụta mkpasu iwe? Ọ dịghị ma ọlị! Dị ka Devid, anyị agaghị ekwe mgbe ọ bụla ka mmejọ nke onye ọzọ kpalie anyị ịbụ ndị na-eguzosighị ike n’ihe nye Jehova na nzukọ ya!—Abụ Ọma 119:165.
7. Gịnị bụ ụfọdụ omume rụrụ arụ bilitere n’ihe banyere ụlọ nsọ dị na Jerusalem, oleekwa mmetụta Jisọs nwere banyere nke a?
7 Ihe nlereanya mmadụ kasịnụ nke iguzosi ike n’ihe bụ Jisọs Kraịst, onye a kọwara n’ụzọ amụma dị ka “onye na-eguzosi ike n’ihe” nye Jehova. (Abụ Ọma 16:10, NW) Iji ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, nke rụrụ arụ, aghaghị imewo ka iguzosi ike n’ihe bụrụ ihe ịma aka. Jisọs maara na ọrụ onyeisi nchụàjà na àjà ndị ahụ sere onyinyo ije ozi na ọnwụ ịchụàjà ya, ọ makwaara otú o si dị mkpa ka ndị mmadụ site ná ndị a mụta ihe. Ya mere o jupụtara n’iwe ezi omume mgbe ọ hụrụ na ụlọ nsọ ahụ aghọwo “ọ́gbà ndị na-apụnara mmadụ ihe.” Site n’ikike Chineke nyere ya, o mere ihe ugboro abụọ iji mee ka ọ dị ọcha.a—Matiu 21:12, 13; Jọn 2:15-17.
8. (a) Olee otú Jisọs si gosi iguzosi ike n’ihe nye ndokwa ụlọ nsọ ahụ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na ọ masịrị anyị isoro nzukọ Jehova dị ọcha na-efe ya ofufe?
8 Ma, Jisọs ji iguzosi ike n’ihe kwadoo ndokwa ụlọ nsọ ahụ. Site na nwata, ọ gara ememe dị iche iche n’ụlọ nsọ ahụ, o zikwara ihe ugboro ugboro n’ebe ahụ. Ọbụna na ọ kwụrụ ụtụ isi ụlọ nsọ—ọ bụ ezie na iwu ejighị ya n’ezie ime otú ahụ. (Matiu 17:24-27) Jisọs jara nwanyị ahụ di ya nwụrụ bụ́ ogbenye mma maka itinye “ihe nile nke o nwere” n’ime igbe ego ụlọ nsọ ahụ. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, Jehova jụrụ ụlọ nsọ ahụ kpam kpam. Ma tupu mgbe ahụ, Jisọs guzosiri ike n’ihe nye ya. (Mak 12:41-44; Matiu 23:38) Nzukọ elu ala Chineke taa dị nnọọ ukwuu karịa usoro ihe ndị Juu na ụlọ nsọ ya. Ee, o zughị okè; nke ahụ mere e ji eme mgbanwe mgbe ụfọdụ. Ma ọ bụghị nke ịkpa àgwà na-ezighị ezi zuru ahụ, Jehova Chineke anaghịkwa aga idochi ya. Anyị ekwesịghị ma ọlị ikwe ka ezughị okè ọ bụla anyị hụrụ n’ime ya kpasuo anyị iwe ma ọ bụ kpalie anyị inwe mmụọ na-adịghị mma, nke ime nkatọ. Kama nke ahụ, ka anyị ṅomie iguzosi ike n’ihe nke Jisọs Kraịst.—1 Pita 2:21.
Ezughị Okè nke Anyị
9, 10. (a) Olee otú usoro ihe Setan si eji aghụghọ jiri ezughị okè anyị eme ihe iji raba anyị n’àgwà eguzosighị ike n’ihe? (b) Gịnị ka onye meworo mmehie dị oké njọ kwesịrị ime?
9 Setan na-agbalịkwa ịkwalite eguzosighị ike n’ihe site n’iji aghụghọ eji ezughị okè anyị eme ihe. Usoro ihe ya na-eji adịghị ike anyị eme ihe, na-anwa anyị ime ihe dị njọ n’anya Jehova. N’ụzọ dị mwute, kwa afọ ọtụtụ puku na-adaba n’omume rụrụ arụ. Ụfọdụ na-atụkwasị ihe n’eguzosighị ike n’ihe nke a site n’ibi ụdị ndụ abụọ, na-anọgide n’ụzọ ime ihe ọjọọ ebe ha na-eme ka à ga-asị na ha bụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. Ná nzaghachi nye isiokwu ndị dị n’okwu a n’isiokwu “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .” dị na magazin Teta!, otu nwa agbọghọ dere, sị: “Isiokwu ndị ahụ bụ akụkọ ndụ m.” Ná nzuzo, ọ zụlitewo ọbụbụenyi n’ebe ndị ntorobịa na-ahụghị Jehova n’anya nọ. Gịnị si na ya pụta? Ọ na-ede, sị: “Ndụ m retọrọ nnọọ eretọ, etinyekwara m aka n’omume rụrụ arụ, a ghaghịkwa ịdọ m aka ná ntị. Mmekọrịta mụ na Jehova mebiri, ndị mụrụ m na ndị okenye enwekwaghị ntụkwasị obi n’ebe m nọ.”b
10 Nwa agbọghọ a nwetara enyemaka site n’aka ndị okenye ma maliteghachi iji iguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọtụtụ na-ata ahụhụ ihe ndị ka njọ ọ rụpụtara, ụfọdụkwa adịghị alọghachi n’ọgbakọ ọzọ. Lee ka o si ka mma iguzosi ike n’ihe ma guzogide ọnwụnwa n’ụwa ọjọọ nke a! Nụrụ ịdọ aka ná ntị sitere na magazin Ụlọ Nche na Teta! n’okwu ndị dị ka iso ndị ụwa akpakọrịta na ntụrụndụ ndị na-emerụ emerụ. Adabala mgbe ọ bụla n’àgwà eguzosighị ike n’ihe. Ma ọ bụrụ na ị daba, anwala ime ka a sị na ị bụ ihe ị na-abụghị. (Abụ Ọma 26:4) Kama nke ahụ, nweta enyemaka. Nke ahụ bụ ihe mere ndị nne na nna na ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ji nọrọ n’ebe ahụ.—Jemes 5:14.
11. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji dị njọ iwere onwe anyị dị ka ndị ọjọọ na-agaghị ekwe mmeta, ụkpụrụ Bible dịkwa aṅaa pụrụ inyere anyị aka ịgbazi echiche anyị?
11 Ezughị okè anyị pụrụ itinye anyị n’ihe ize ndụ n’ụzọ ọzọ. Ụfọdụ ndị mere omume eguzosighị ike n’ihe na-akwụsị ịgbalị ime ihe na-atọ Jehova ụtọ. Cheta, Devid mere mmehie ndị dị oké njọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ogologo oge mgbe Devid nwụsịrị, Jehova chetara ya dị ka ohu kwesịrị ntụkwasị obi. (Ndị Hibru 11:32; 12:1) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ dịghị mgbe ọ kwụsịrị ịgbalị ime ihe na-atọ Jehova ụtọ. Ilu 24:16 na-asị: “Ugbo asaa ka onye ezi omume na-ada, biliekwa ọzọ.” N’ezie, ọ bụrụ na anyị adaba ná mmehie ndị na-adịghị oké njọ—ee ugboro ugboro—n’ihi adịghị ike ụfọdụ anyị na-agbaso mgba, anyị ka pụrụ ịbụ ndị ezi omume n’anya Jehova ma ọ bụrụ na anyị anọgide ‘na-ebili’—ya bụ, chegharịa site n’ezi obi ma maliteghachi iji iguzosi ike n’ihe na-eje ozi.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 2:7.
Kpachara Anya Maka Ụdị Ndị Dị Aghụghọ nke Eguzosighị Ike n’Ihe!
12. N’ihe banyere ndị Farisii, olee otú echiche ịgbasoru iwu n’isi n’emeghị mgbanwe si duga n’eguzosighị ike n’ihe?
12 Eguzosighị ike n’ihe na-abịakwa n’ụdị ndị dị aghụghọ karị. Ọ pụrụ ọbụna ịdị ka ọ bụ iguzosi ike n’ihe! Dị ka ihe atụ, ikekwe ndị Farisii nke ụbọchị Jisọs lere onwe ha anya dị ka ndị na-eguzosi nnọọ ike n’ihe.c Ma ha enweghị ike ịhụ ọdịiche dị n’ịdị na-eguzosi ike n’ihe na ịbụ onye na-agbaso iwu ndị mmadụ mere, n’ihi na ha adịghị eme mgbanwe, na-ekpekwa ndị ọzọ ikpe obi ọjọọ. (Tụlee Eklisiastis 7:16.) Ha bụ n’ezie ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe na nke a—nye ndị ha kwesịrị ịdị na-ejere ozi, nye nzube nke Iwu ahụ ha zọọrọ na ha na-akụzi, nyekwa Jehova n’onwe ya. N’adịghị ka ha, Jisọs guzosiri ike nye nzube nke Iwu ahụ, bụ́ nke dabeere n’ịhụnanya. N’ihi ya o wuliri ndị mmadụ elu ma gbaa ha ume, dị ka amụma banyere Mesaịa ahụ buworo ụzọ kwuo.—Aịsaịa 42:3; 50:4; 61:1, 2.
13. (a) Olee otú nne na nna bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi ghara iguzosi ike n’ihe? (b) N’ihi gịnị ka nne na nna kwesịrị iji zere ịdị aka ike, ime nkatọ, ma ọ bụ ileghara inye ụmụ ha ahụhụ anya gabiga ókè?
13 Ndị Kraịst nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ikike na-erite uru nke ukwuu site n’ihe ilereanya Jisọs n’akụkụ a. Dị ka ihe atụ, nne na nna na-eguzosi ike n’ihe maara na ha aghaghị inye ụmụ ha ahụhụ. (Ilu 13:24) Ma ha na-ejide n’aka na ha adịghị eji oké ahụhụ e nyere n’iwe ma ọ bụ na-eji mwụkwasị nke nkatọ a na-eme mgbe mgbe akpasu ụmụ ha iwe. Ụmụ ndị chere na ọ dịghị mgbe ha ga-eme ihe dị ndị mụrụ ha ụtọ ma ọ bụ ndị chere na o yiri nanị ka ofufe ndị mụrụ ha na-eme ka ha bụrụ ndị na-achọ mmejọ na ndị na-eme nkatọ pụrụ nnọọ ịbụ ndị dara mbà n’obi, n’ihi ya kwa, mesịa si n’ezi okwukwe ahụ pụọ.—Ndị Kọlọsi 3:21.
14. Olee otú ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ pụrụ isi na-eguzosi ike n’ihe nye ìgwè atụrụ ha na-ejere ozi?
14 N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-elebara nsogbu na ihe ize ndụ ìgwè atụrụ ahụ na-eche ihu anya. Dị ka ndị ọzụzụ atụrụ na-eguzosi ike n’ihe, ha na-enye ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa, na-ejide n’aka na ha bu ụzọ ghọtazuo ọnọdụ dịnụ ma jiri nlezianya na-eme ka ihe ha na-ekwu dabere na Bible na ná mbipụta nke Society. (Abụ Ọma 119:105; Ilu 18:13) Ọzọ, ha maara na atụrụ ahụ na-adabere na ha maka mwuli elu na inye nri ime mmụọ. Ya mere ha na-achọ iṅomi Jisọs Kraịst, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ. Ha na-eji iguzosi ike n’ihe ejere atụrụ ahụ ozi site n’izu ruo n’izu ná nzukọ ndị Kraịst—n’etidaghị ha, kama, iwuli ha elu na iwusi okwukwe ha ike.—Matiu 20:28; Ndị Efesọs 4:11, 12; Ndị Hibru 13:20, 21.
15. Olee otú ụfọdụ ndị na narị afọ mbụ si gosi na ha guzosiri ike n’ihe n’ụzọ hiere ụzọ?
15 Ụdị ọzọ dị aghụghọ nke eguzosighị ike n’ihe bụ iguzosi ike n’ihe hiere ụzọ. Ezi iguzosi ike n’ihe n’echiche Bible adịghị enye ohere maka ibute nrubeisi ọ bụla ụzọ tupu iguzosi ike n’ihe anyị nye Jehova Chineke. Ọtụtụ ndị Juu na narị afọ mbụ ji isi ọnwụ rapara n’Iwu Mosis na n’usoro ihe nke ndị Juu. Ma oge Jehova eruwo iwepụ ngọzi ya ná mba ahụ na-enupụ isi wee wega ya ná mba Israel ime mmụọ. Nanị ole na ole nnọọ guzosiri ike n’ihe nye Jehova ma kwekọọ ná mgbanwe a dị mkpa. Ọbụna n’etiti ezi ndị Kraịst, ụfọdụ ndị okpukpe ndị Juu siri ọnwụ na ha ga-agaghachi “n’ihe ozizi mbụ na-adịghị ike na-enweghịkwa ihe ọ bụla” nke Iwu Mosis, bụ́ nke e mezuworo n’ime Kraịst.—Ndị Galetia 4:9; 5:6-12; Ndị Filipaị 3:2, 3.
16. Olee otú ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe si anabata mgbanwe?
16 N’ụzọ dị iche, ndị Jehova n’oge a egosiwo na ha na-eguzosi ike n’ihe n’ime oge mgbanwe. Ka ìhè nke eziokwu e kpughere ekpughe nọgidere na-enwupụta, a na-eme mgbanwe dị iche iche. (Ilu 4:18) N’oge na-adịbeghị anya, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” enyeworo anyị aka ịkpụzi nghọta anyị banyere okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” e ji mee ihe na Matiu 24:34 na banyere oge a ga-ekpe “atụrụ” na “ụmụ ewu” ikpe e kwuru banyere ya na Matiu 25:31-46, tinyekwara echiche anyị n’ihe metụtara ụdị ụfọdụ nke ọrụ obodo. (Matiu 24:45) Obi abụọ adịghị ya na obi gaara atọ ụfọdụ ndị si n’ezi ofufe dapụ ụtọ ma a sị na ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova rapagidesiri ike ná nghọta e nweburu banyere isiokwu ndị dị otú ahụ ma jụ ịga n’ihu. Ụdị ihe ahụ emeghị. N’ihi gịnị? Ndị Jehova na-eguzosi ike n’ihe.
17. Olee otú ndị a hụrụ n’anya nwere ike isi tinye iguzosi ike n’ihe anyị n’ule mgbe ụfọdụ?
17 Otú ọ dị, okwu banyere iguzosi ike n’ihe hiere ụzọ nwere ike imetụta anyị. Mgbe ezi enyi ma ọ bụ ọbụna onye òtù ezinụlọ anyị họọrọ ụzọ na-emebi ụkpụrụ Bible, ọ pụrụ ịdị ka anyị amaghị iguzosi ike n’ihe nke anyị ga-ahọrọ. Dị ka ihe e bu pụta ụwa si dị, anyị na-achọ iguzosi ike n’ihe nye ndị ezinụlọ anyị. Ma anyị ekwesịghị ma ọlị ibute ịkwado ha ụzọ tupu nguzosi ike n’ihe anyị nye Jehova! (Tụlee 1 Samuel 23:16-18.) Anyị agaghịkwa enyere ndị mere ihe ọjọọ aka ikpuchi mmehie dị oké njọ ma ọ bụ dụnyere ha úkwù megide ndị okenye bụ́ ndị na-agbalị ‘ime ka ha guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ.’ (Ndị Galetia 6:1) Ime otú ahụ ga-abụ eguzosighị ike n’ihe nye Jehova, nzukọ ya, na onye a hụrụ n’anya. E kwuwerị, igbochi onye mmehie ịnara ahụhụ dị ya mkpa bụ, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, igbochi ngosipụta nke ịhụnanya Jehova iru ya. (Ndị Hibru 12:5-7) Ọzọ, cheta na “ihe kwesịrị ntụkwasị obi ka ogbugbu mma nile nke onye na-ahụ gị n’anya bụ.” (Ilu 27:6) N’ikwu eziokwu, ndụmọdụ ịhụnanya nke dabeere n’Okwu Chineke nwere ike imetụta ùgwù onwe onye nke onye a hụrụ n’anya mere mmehie, ma ọ pụrụ ịbụ ihe na-azọpụta ndụ ma e mesịa!
Iguzosi Ike n’Ihe Na-anagide Mkpagbu
18, 19. (a) Gịnị ka Ehab chọrọ n’aka Nebọt, n’ihi gịnịkwa ka Nebọt jiri jụ? (b) Iguzosi ike n’ihe Nebọt ò ruru ihe o furu? Kọwaa.
18 Mgbe ụfọdụ mwakpo Setan na-awakpo iguzosi ike n’ihe anyị na-abụ ihu na ihu. Tụlee ihe banyere Nebọt. Mgbe Eze Ehab rụgidere ya ka o ree ubi vine ya, ọ zaghachiri, sị: “Ya bụụrụ m ihe arụ sitere na Jehova, bụ́ inye gị ihe nketa nna m hà.” (1 Ndị Eze 21:3) Ọ bụghị na Nebọt dị isi ike; ọ na-eguzosi ike n’ihe. Iwu Mosis kwuru ka onye Israel ọ bụla ghara ire ala bụ́ ihe nketa ruo mgbe ebighị ebi. (Levitikọs 25:23-28) Nebọt maara nke ọma na ajọ eze a nwere ike ime ka e gbuo ya, n’ihi na Ehab ekweworị ka nwunye ya, bụ́ Jezebel, gbuo ọtụtụ n’ime ndị amụma Jehova! Ma Nebọt kwụụrụ chịm.—1 Ndị Eze 18:4.
19 Mgbe ụfọdụ iguzosi ike n’ihe na-efu ihe. Jezebel, site n’enyemaka ụfọdụ ‘ndị ikom jọgburu onwe ha,’ gbagidere Nebọt akaebe ụgha maka mpụ ọ na-emeghị. N’ihi ya, e gburu ya na ụmụ ya ndị ikom. (1 Ndị Eze 21:7-16; 2 Ndị Eze 9:26) Nke ahụ ọ̀ pụtara na iguzosi ike n’ihe Nebọt hiere ụzọ? Ee e! Nebọt so n’ime ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị ‘dị ndụ’ ná ncheta Jehova ugbu a, na-ehi ụra n’enweghị nsogbu n’ime ili ruo oge mbilite n’ọnwụ.—Luk 20:38; Ọrụ 24:15.
20. Olee otú olileanya pụrụ isi nyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe?
20 Otu nkwa ahụ na-enye ndị Jehova na-eguzosi ike n’ihe taa obi ike. Anyị maara na iguzosi ike n’ihe anyị nwere ike ifu anyị oké ihe n’ụwa a. Jisọs Kraịst ji ndụ ya kwụọ ụgwọ iguzosi ike n’ihe ya, ọ gwakwara ụmụazụ ya na a gaghị emeso ha n’ụzọ ka mma. (Jọn 15:20) Dị ka olileanya ya maka ọdịnihu kwagidere ya, otú ahụ ka nke anyị na-akwagide anyị. (Ndị Hibru 12:2) N’ihi ya anyị pụrụ ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe n’ihu ụdị mkpagbu ọ bụla.
21. Obi ike dị aṅaa ka Jehova na-enye ndị ya na-eguzosi ike n’ihe?
21 N’eziokwu, ole na ole n’ime anyị nnọọ ka a na-awakpo nguzosi ike n’ihe anyị ihu na ihu otú ahụ. Ma ndị Chineke nwere ike izute mkpagbu ka ukwuu tupu ọgwụgwụ abịa. Olee otú anyị ga-esi jide n’aka nguzosi ike n’ihe anyị? Site n’anyị iguzosi ike n’ihe ugbu a. Jehova enyewo anyị ọrụ dị ukwuu—ime nkwusa na izi ihe banyere Alaeze ya. Ka anyị jiri iguzosi ike n’ihe nọgide n’ọrụ a dị mkpa. (1 Ndị Kọrint 15:58) Ọ bụrụ na anyị ajụ ikwe ka ezughị okè mmadụ bibie iguzosi ike n’ihe anyị nye nzukọ Jehova, ọ bụrụkwa na anyị anọrọ na nche megide ụdị ndị dị aghụghọ nke eguzosighị ike n’ihe dị ka iguzosi ike n’ihe hiere ụzọ, mgbe ahụ anyị ga-adị njikere karị ma ọ daba na a ga-ele iguzosi ike n’ihe anyị ule n’ụzọ siri ike karị. Otú o sina dị, anyị pụrụ inwe obi ike mgbe nile na Jehova na-eguzosi ike n’ihe n’ụzọ na-adịghị ada ada nye ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe. (2 Samuel 22:26) Ee, ọ ga-echebe ndị ya na-eguzosi ike n’ihe!—Abụ Ọma 97:10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Jisọs nwere obi ike ịwakpo ebe azụmahịa uru dị otú ahụ. Dị ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, a ghaghị iji otu ụdị mkpụrụ ego ochie nke ndị Juu kwụọ ụtụ isi ụlọ nsọ. N’ihi nke a, ọ ga-adịworị ọtụtụ ndị ọbịa n’ụlọ nsọ ahụ mkpa ịgbanwe ego ha ka ha wee nwee ike ịkwụ ụtụ isi ahụ. E nyere ndị ahụ na-agbanwe ego ohere iji ego ole a kpọrọ aha eme mgbanwe ahụ, nke a mekwara ka a na-erite ego buru ibu n’uru.
b Lee Teta! nke December 22, 1993 (Bekee); April 8, 1994; na May 8, 1994.
c Ịrọ òtù ha sitere na nke ndị òtù Hasid, bụ́ ìgwè bilitere ọtụtụ narị afọ bu ụzọ ịgbaso mmetụta ndị Gris mgba. Ndị òtù Hasid nwetara aha ha site n’okwu Hibru bụ́ chasi·dhimʹ, nke pụtara “ndị na-eguzosi ike n’ihe” ma ọ bụ “ndị na-eme nsọ nsọ.” Ikekwe ha chere na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-akpọtụ “ndị na-eguzosi ike n’ihe” nke Jehova aha na-ekwu banyere ha n’ụzọ ụfọdụ pụrụ iche. (Abụ Ọma 50:5) Ha, na ndị Farisii sochiri ha, bụ ndị bu okpukpe n’isi, ndị họpụtara onwe ha ịgbachitere Iwu ahụ ruo n’isi.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi zere ikwe ka ezughị okè ndị ọzọ duje anyị n’eguzosighị ike n’ihe?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ezughị okè anyị nwere ike iduje anyị n’àgwà eguzosighị ike n’ihe?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi guzogide ọchịchọ nke ime ka iguzosi ike n’ihe anyị hie ụzọ?
◻ Gịnị ga-enyere anyị aka ijigide iguzosi ike n’ihe anyị ọbụna n’oge mkpagbu?
[Igbe dị na peeji nke 9]
Iji Iguzosi Ike n’Ihe Na-eje Ozi na Betel
“Ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.” Otú ahụ ka Pọl onyeozi dere. (1 Ndị Kọrint 14:40) Pọl maara na ka ọgbakọ wee na-arụ ọrụ, a ga-enwe mkpa maka “usoro,” maka nhazi. N’otu aka ahụ taa, ndị okenye aghaghị ime mkpebi n’okwu ndị kwesịrị ekwesị, dị ka ikenyegasị ndị òtù ọgbakọ ebe ọmụmụ akwụkwọ dị iche iche, idokwa maka nzukọ ije ozi ubi, na ileba anya n’otú e si arụzu ókèala. Mgbe ụfọdụ ndokwa ndị dị otú ahụ pụrụ ile iguzosi ike n’ihe ule. Ha abụghị iwu ndị Chineke nyere site n’ike mmụọ nsọ, ha apụghịkwa imezu ọchịchọ nke onye ọ bụla n’otu n’otu.
Ị̀ na-ahụ ya mgbe ụfọdụ dị ka ihe ịma aka ịbụ onye na-eguzosi ike n’ihe nye ụfọdụ n’ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị a na-eme n’ọgbakọ ndị Kraịst? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịchọpụta ihe ilereanya nke Betel ịbụ ihe na-enye aka. Aha ahụ bụ́ Betel, okwu Hibru pụtara “Ụlọ Chineke,” ka a na-enye alaka 104 nke Watch Tower Society, gụnyere isi ụlọ ọrụ dị na United States.* Ndị ọrụ afọ ofufo bi ma na-arụ ọrụ n’ogige Betel na-achọ ka ebe ndị a na-egosi Jehova nsọpụrụ ofufe na egwu. Nke a chọrọ iguzosi ike n’ihe n’akụkụ nke onye ọ bụla.
Ndị na-eleta Betel na-ekwukarị okwu banyere ịdị n’usoro na ịdị ọcha ha na-ahụ n’ebe ahụ. A haziri ndị na-arụ ọrụ ahazi, obi dịkwa ha ụtọ; okwu, àgwà, na ọbụna ọdịdị ha na-egosipụta akọ na uche ndị Kraịst tozuru okè, e ji Bible zụọ. Ndị nile so n’ezinụlọ Betel ji iguzosi ike n’ihe na-agbaso ụkpụrụ nke Okwu Chineke.
Tụkwasị na nke a, Òtù Na-achị Isi na-enye ha otu akwụkwọ aha ya bụ́ Dwelling Together in Unity, nke ji obiọma na-esetịpụ ndokwa ụfọdụ kwesịrị ekwesị dị mkpa ka ezinụlọ buru ibu otú a wee nwee ike ịrụkọ ọrụ nke ọma. (Abụ Ọma 133:1) Dị ka ihe atụ, ọ na-ekwu banyere ụlọ obibi, ihe oriri, ịdị ọcha, uwe na ejiji, na okwu ndị yiri ha. Ndị òtù ezinụlọ Betel ji iguzosi ike n’ihe na-akwado ma na-agbaso ndokwa ndị dị otú ahụ, ọbụna mgbe nhọrọ onwe onye ha nwere ike iduga ha n’ebe dị iche. Ha na-ewere akwụkwọ a, ọ bụghị dị ka ụkpụrụ nduzi na iwu nchịkwa na-adịghị agbanwe agbanwe, kama dị ka ìgwè ụkpụrụ ntụzi ndị e mere iji kwalite ịdị n’otu na nkwekọ. Ndị nlekọta na-eguzosi ike n’ihe n’ịkwalite ụkpụrụ ndị a dabeere na Bible, ha na-ejikwa ha eme ihe n’ụzọ dị mma iwuli ezinụlọ Betel elu na ịgba ha ume ije ozi Betel ha dị nsọ.
* Ụlọ obibi akwụkwọ, ọfịs, na ụlọ ndị e bi ebi ndị a abụghị oké ụlọ nsọ, ma ọ bụ ụlọ, ime mmụọ nke Chineke. Ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke bụ ndokwa ya maka ofufe dị ọcha. (Maịka 4:1) N’ihi ya, ọ bụghị ihe owuwu ọ bụla a na-ahụ anya n’elu ala.
[Igbe dị na peeji nke 10]
Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe na Onye Na-agbasoru Iwu n’Isi
Laa azụ na 1916, akwụkwọ bụ́ Encyclopædia of Religion and Ethics kwuru na “a pụrụ ịchọta ọdịiche a dị n’agbata onye na-eguzosi ike n’ihe na onye na-agbasoru iwu n’isi n’oge nile na n’ebe nile.” Ọ kọwara, sị: “E nwere onye na-agbasoru iwu n’isi bụ́ onye na-eme ihe a gwara ya, na-adịghị ada iwu; ọ na-arapara n’okwu e dere ede, nke a pụkwara ịgụ agụ. E nwere onye na-eguzosi ike n’ihe bụ́ onye na-eme nke a ma nwee ike . . . ịbụ onye a na-adabere na ya maka ihe ka ukwuu, onye na-etinye uche ya dum n’ọrụ ya, onye na-akpụzi mmụọ ya ikwekọ ná mmụọ nke nzube a ga-arụzu.” E mesịa, otu akwụkwọ a kwuru, sị: “Ịbụ onye na-eguzosi ike n’ihe karịrị irubere iwu isi nke ukwuu. . . . Onye na-eguzosi ike n’ihe dị iche n’ebe onye na-erubere iwu isi nọ dị ka onye ji obi na uche dum na-eje ozi . . . Ọ dịghị ahapụ onwe ya ịma ụma mee mmehie n’ihi ihe o mere, ihe ọ na-emeghị, ma ọ bụ nke amaghị ihe.”