Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—N’ụzọ Dị Aṅaa, n’Ebee, Olee Mgbe?
ONYE Okike na Onye Na-enye Ndụ nke mmadụ na-enye mmesi obi ike ya na ọnwụ mmadụ adịchaghị eweta ndụ ná ngwụsị ruo mgbe ebighị ebi. Ọzọkwa, Chineke na-emesi anyị obi ike na ọ ga-ekwe omume ọ bụghị nanị ịdị ndụ ruo ogologo ndụ ọzọ a kpaara ókè kama ịdị ndụ n’olileanya nke echeghị ọnwụ ihu ọzọ ma ọlị! Pọl onyeozi tinyere ya n’ụzọ dị mfe, ma n’obi ike, sị: “O [Chineke] nyekwara mmadụ nile ihe ha ga-eji kwere nke a, ebe O mere ka O [Kraịst Jisọs] si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ọrụ 17:31.
N’ezie, nke a ka na-ahapụ ajụjụ atọ bụ isi n’azaghị ha aza: Olee otú onye nwụrụ anwụ pụrụ isi dịghachi ndụ? Olee mgbe nke a ga-eme? Olee ebe ndụ ọhụrụ ahụ ga-adị? N’ụwa nile, e nyewo azịza dị iche iche n’ajụjụ ndị a, ma isi ihe dị n’ikpebi eziokwu dị n’okwu ahụ bụ ịghọta n’ụzọ ziri ezi ihe na-eme ụmụ mmadụ mgbe ha nwụrụ.
Anwụghị Anwụ Ọ̀ Bụ Azịza Ya?
Echiche e nwere ebe nile bụ na otu akụkụ nke ụmụ mmadụ nile adịghị anwụ anwụ na ọ bụkwa nanị ahụ ha na-anwụ. N’ezie ị nụwo nzọrọ dị otú ahụ. A na-ezo aka n’akụkụ a a sị na ọ dịghị anwụ anwụ n’ụzọ dịgasị iche iche dị ka “mkpụrụ obi” ma ọ bụ “mmụọ.” A na-ekwu na ọ na-alanarị ọnwụ nke ahụ ma nọgide na-adị ndụ n’ebe ọzọ. N’eziokwu, nkwenkwe dị otú ahụ esiteghị na Bible. N’eziokwu, ndị ochie e kwuru maka ha na Bible Hibru legara anya ná ndụ mgbe a nwụsịrị, ma ọ bụghị site ná nlanarị nke akụkụ ahụ ha na-adịghị anwụ anwụ. Ha ji obi ike lega anya ná nlaghachi ná ndụ elu ala site n’ọrụ ebube nke mbilite n’ọnwụ n’ọdịnihu.
Nna ochie bụ́ Abraham bụ ihe nlereanya dị ịrịba ama nke onye nwere okwukwe ná mbilite n’ọnwụ ọdịnihu nke ndị nwụrụ anwụ. N’ịkọwa njikere Abraham dị iji nwa ya bụ́ Aịsak chụọ àjà, Ndị Hibru 11:17-19 na-agwa anyị, sị: “Mgbe a na-anwa Abraham, ọ bụ okwukwe ka o ji chee Aịsak n’ihu Chineke dị ka àjà: . . . ebe ọ na-agụ na Chineke pụrụ ime ka o si ọbụna ná ndị nwụrụ anwụ bilie; nke ọ naghachikwaara ya site n’ebe ahụ n’ime ilu,” ebe Chineke na-achọghị ka e jiri Aịsak chụọ àjà. N’ịgbakwu akaebe ná nkweta oge gboo dị n’etiti ndị Israel na ha ga-abịaghachi ná ndụ ọzọ n’oge dị n’ihu (kama inweta ndịgide nke ndụ n’ógbè ndị bụ mmụọ ozugbo), Hosea onye amụma dere, sị: “N’aka [Sheol, NW; ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ] ka M ga-esi gbapụta ha; n’aka ọnwụ ka m ga-eme ka ha si pụọ nwere onwe ha.”—Hosea 13:14.
Ya mere ole mgbe ka echiche anwụghị anwụ e ketara eketa nke mmadụ batara n’echiche na nkwenkwe ndị Juu? Akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Judaica na-ekweta na “ma eleghị anya ọ bụ n’okpuru mmetụta ndị Gris ka ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi batara n’okpukpe ndị Juu.” Ka o sina dị, ndị Juu ji okpukpe kpọrọ ihe rute n’oge Kraịst ka kwenyere ma na-elega anya ná mbilite n’ọnwụ ọdịnihu. Anyị pụrụ ịhụ nke a nke ọma site ná mkparịta ụka Jisọs na Mata nwere n’oge nwanne Mata bụ́ Lazarọs nwụrụ: “Ya mere Mata sịrị Jisọs, Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ị nọrịị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị. . . . Jisọs sị ya, Nwanne gị nwoke ga-esi n’ọnwụ bilie. Mata sị Ya, Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”—Jọn 11:21-24.
Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ
N’ebe a kwa, ọ dịghị mkpa ịkọ nkọ n’okwu ahụ. Eziokwu dị mfe nke Bible bụ na ndị nwụrụ anwụ nọ “n’ụra,” n’amaghị ihe, n’enweghị mmetụta ma ọ bụ ihe ọmụma ọ bụla. E kwupụtaghị eziokwu dị otú ahụ n’ime Bible n’ụzọ dị mgbagwoju anya, nke siri ike nghọta. Tụlee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a dị mfe nghọta: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.” (Eklisiastis 9:5, 10) “Atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”—Abụ Ọma 146:3, 4.
Mgbe ahụ o kwere nghọta ihe mere Jisọs Kraịst ji zoo aka n’ebe ọnwụ dị dị ka ụra. Jọn onyeozi dekọrọ mkparịta ụka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nwere: “Ọ sị ha, Enyi anyị Lazarọs adawo n’ụra; ma ana m aga, ka M wee kpọtee ya n’ụra. Ya mere ndị na-eso ụzọ Ya sịrị Ya, Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ dawo n’ụra, a ga-azọpụta ya. Ma Jisọs kwururịị okwu banyere ọnwụ ya: ma ndị ahụ chere na Ọ na-ekwu okwu banyere ịda n’ụra efu. Ya mere Jisọs gwawara ha okwu mgbe ahụ, sị, Lazarọs nwụrụ anwụ.”—Jọn 11:11-14.
Onye ahụ Dum Na-anwụ
Usoro nke ọnwụ mmadụ na-agụnye onye ahụ dum, ọ bụghị nanị ọnwụ nke ahụ. Dị ka okwu doro anya nke Bible si dị, anyị aghaghị ikwubi na mmadụ enweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke pụrụ ịlanarị ọnwụ nke ahụ ya. Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya na mkpụrụ obi pụrụ ịnwụ. “Lee, mkpụrụ obi nile, Mụ nwe ha; dị ka mkpụrụ obi nna si dị, otú a ka mkpụrụ obi nwa ya dịkwa, Mụ nwe ha; mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Ọ dịghị ebe ọ bụla e kwuru banyere okwu bụ́ “anwụghị anwụ” dị ka nke ihe a kpọrọ mmadụ ketara.
Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-enye ihe ọmụma a na-adọrọ mmasị banyere okwu Hibru na Grik a sụgharịrị “mkpụrụ obi” n’ime Bible: “Mkpụrụ obi n’ime OT [Agba Ochie] bụ nepeš, na NT [Agba Ọhụrụ] [psy·kheʹ]. . . . Nepeš si n’okwu mbụ nke pụtara ma eleghị anya iku ume, n’ihi ya kwa . . . ebe ọ bụ na ume na-eme ka e nwee ọdịiche n’etiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ, nepeš bịara pụta ndụ ma ọ bụ onwe onye ma ọ bụ nanị ndụ mmadụ. . . . E nweghị ịkpa ókè [ikewa ụzọ abụọ] nke ahụ na mkpụrụ obi n’ime OT. Onye Israel hụrụ ihe n’ụzọ a pụrụ imetụ aka, n’ozuzu ha, n’ihi ya kwa o weere ụmụ mmadụ dị ka ndị, ọ bụghịkwa dị ka ihe e ji akụkụ dị iche iche mejupụta. Okwu bụ́ nepeš, ọ bụ ezie na e ji okwu anyị bụ́ mkpụrụ obi sụgharịa ya, adịghị mgbe ọ pụtara mkpụrụ obi dị iche n’ahụ ma ọ bụ onye ahụ. . . . Okwu bụ́ [psy·kheʹ] bụ okwu NT nke ya na nepeš na-ekwekọ. Ọ pụrụ ịpụta ụkpụrụ nke ndụ, ndụ n’onwe ya, ma ọ bụ onye ahụ dị ndụ.”
N’ihi ya ị pụrụ ịchọpụta na n’oge ọnwụ, onye ahụ dịbu ndụ, ma ọ bụ mkpụrụ obi ahụ dị ndụ, na-akwụsị ịdị adị. Ahụ na-alaghachi ‘n’ájá’ ma ọ bụ n’ihe ndị dị n’ala, nwayọọ nwayọọ site n’olili na imesịa ree ure ma ọ bụ mee ka ọ gaa ngwa ngwa site n’isu ozu ọkụ. Jehova gwara Adam: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:19) Mgbe ahụ, olee otú ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị pụrụ isi kwe omume? Ọ bụ n’ihi na Chineke nwere ikike ncheta ihe nke ya banyere onye ahụ nwụrụnụ. Jehova nwere ike na ikike ọrụ ebube ikepụta ụmụ mmadụ, ya mere o kwesịghị ịbụ ihe ijuanya na ọ pụrụ n’ikike ncheta ya ichekwa ihe ndekọ nke usoro ibi ndụ onye ahụ. Ee, olileanya nile maka onye ahụ ịdị ndụ ọzọ dị Chineke n’aka.
Nke a bụ echiche nke okwu bụ́ “mmụọ,” nke e kwuru banyere ya dị ka nke na-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya. N’ịkọwa ihe a ga-esi na ya pụta, onye e nyere ike mmụọ nsọ nke dere akwụkwọ Eklisiastis na-akọwa, sị: “Ájá ewee laghachi n’ala dị ka o si dịrị, mmụọ alaghachikwurukwa Chineke Onye nyere ya.”—Eklisiastis 12:7.
Nanị Chineke pụrụ ime ka mmadụ dị ndụ. Mgbe Chineke kere mmadụ n’Iden, kunyekwa n’oghere imi ya “ume ndụ,” tụkwasị n’iji ikuku mejuo akpa ume Adam, Jehova mere ka ike ndụ ahụ nye mkpụrụ ndụ nile dị ya n’ahụ ike. (Jenesis 2:7) N’ihi na a pụrụ isite n’aka nne na nna nyefee ụmụaka ike ndụ a site n’usoro nke ịtụrụ ime na ịmụ nwa, a pụrụ ikwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ndụ mmadụ si n’aka Chineke ọ bụ ezie na e si n’aka nne na nna nweta ya.
Mbilite n’Ọnwụ—Oge Obi Ụtọ
E kwesịghị iche na mbilite n’ọnwụ bụ ịlọ ụwa, bụ́ nke na-enweghị mgbakwasị ụkwụ ọ bụla n’Akwụkwọ Nsọ. Ịlọ ụwa bụ nkwenkwe na mgbe mmadụ nwụsịrị, a na-amụghachi ya otu ma ọ bụ ọtụtụ ugboro ọzọ. A na-ekwu na nke a na-abụ n’ọkwá ka elu ma ọ bụ n’ọkwá ka ala nke ịdị adị ma e jiri ya tụnyere ndụ mbụ mmadụ dịrị, na-adabere n’ihe ndekọ e chere na o mere n’oge ndụ mbụ ahụ. Dị ka nkwenkwe a si dị, a pụrụ “ịmụghachi” mmadụ dị ka mmadụ ma ọ bụ dị ka anụmanụ. Nke ahụ na-emegide nnọọ ihe Bible na-akụzi.
Okwu bụ́ “mbilite n’ọnwụ” bụ nke a sụgharịtara site n’okwu Grik bụ́ a·naʹsta·sis, bụ nke pụtara n’ụzọ nkịtị “iguzo ọtọ ọzọ.” (Ndị Hibru na-asụgharị okwu Grik ahụ asụgharịwo a·naʹsta·sis na-eji okwu Hibru bụ́ techi·yathʹ ham·me·thimʹ, nke pụtara “ntụte onye nwụrụ anwụ.”) Mbilite n’ọnwụ gụnyere ịmaliteghachi ụzọ ndụ nke onye ahụ, usoro ibi ndụ nke Chineke debere n’ikike ncheta ya. N’ikwekọ n’uche Chineke banyere onye ahụ, a na-eweghachi onye ahụ n’ahụ mmadụ ma ọ bụ n’ahụ mmụọ; ma ọ ka na-ejigide ihe e ji mara ya, na-enwe otu ọdịdị mmadụ na ikike ncheta ahụ o nwere mgbe ọ nwụrụ.
Ee, Bible na-ekwu banyere ụdị mbilite n’ọnwụ abụọ. Otu bụ mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe n’ahụ mmụọ; nke a bụ maka mmadụ ole na ole. Jisọs Kraịst nwetara ụdị mbilite n’ọnwụ ahụ. (1 Pita 3:18) O gosikwara na ndị a họọrọ n’etiti ndị na-eso ụzọ ya ga-enweta ụdị ahụ, malite ná ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị o kwere nkwa, sị: “Ana m aga idoziri unu ebe. . . . Agaje m ịbịa ọzọ, M ga-anarakwa unu nye Onwe m; ka unu onwe unu wee nọrọkwa ebe Mụ onwe m nọ.” (Jọn 14:2, 3) Bible na-ezo aka na nke a dị ka “mbilite n’ọnwụ mbụ,” nke mbụ n’oge na n’ọkwá. Akwụkwọ Nsọ na-akọwa ndị e si otú a kpọlite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe dị ka ndị bụ ndị nchụàjà Chineke na dị ka ndị so Kraịst Jisọs na-achị dị ka eze. (Mkpughe 20:6) “Mbilite n’ọnwụ mbụ” a dịịrị ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè, Akwụkwọ Nsọ n’onwe ha na-ekpughe na ọ bụ nanị 144,000 ka a ga-esi n’etiti ndị ikom na ndị inyom na-ekwesị ntụkwasị obi were. Ha ga-egosiworị iguzosi ike n’ezi ihe ha nye Jehova Chineke na Kraịst Jisọs ruo n’ọnwụ ha, ebe ha nọworo na-arụsi ọrụ ike n’ịgbara ndị ọzọ àmà banyere okwukwe ha.—Mkpughe 14:1, 3, 4.
N’enweghị obi abụọ, mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ bụ oge oké obi ụtọ maka ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe. Ma obi ụtọ ahụ akwụsịghị n’ebe ahụ, n’ihi na e kwekwara nkwa mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ n’elu ala ebe a. Ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-esonyere ọnụ ọgụgụ a na-akparaghị ókè ndị ga-alanarị ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a. Mgbe ọ hụsịrị ọnụ ọgụgụ ahụ dị nta bụ́ ndị ruru eru maka mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe, e nyere Jọn onyeozi ọhụụ banyere “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” Lee oge obi ụtọ nke ahụ ga-abụ mgbe ọtụtụ nde, ikekwe ijeri, bịaghachiri ná ndụ n’ebe a n’elu ala!—Mkpughe 7:9, 16, 17.
Olee Mgbe Ọ Ga-abụ?
Ọṅụ na obi ụtọ ọ bụla agaghị adịte anya ma ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ alaghachite n’ụwa nke jupụtara n’esemokwu, mwụfu ọbara, mmetọ, na ime ihe ike—dị ka ọ dị taa. Ee e, mbilite n’ọnwụ aghaghị ichere nguzobe nke “ụwa ọhụrụ.” Cheedị, mbara ụwa ebe a na-agaghị enwe ndị mmadụ na òtù ndị rute ugbu a yiri ka ha kpebisiri ike imebi ụwa na imebi ịma mma ịdị ọcha ya, ka a gharazie ikwuwe banyere oké nhụsianya ha wetawooro ndị bi n’ime ya.—2 Pita 3:13; Mkpughe 11:18.
N’ụzọ doro anya, oge maka mbilite n’ọnwụ nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya ka dị n’ihu. Ma ozi ọma dị ya bụ na ọ dịghị anya. N’eziokwu, ọ ghaghị ichere maka ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a. Otú ọ dị, ihe àmà bara ụba na-egosi na oge maka ntiwapụ mberede nke “mkpagbu ukwu” ahụ dị nso, na-abịa ná njedebe ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile’—nke a na-ezokarị aka na ya dị ka Amagedọn. (Matiu 24:3-14, 21; Mkpughe 16:14, 16) Nke a ga-eweta mwepụ nke ajọ omume nile pụọ na mbara ụwa a mara mma, bụ́ Ụwa. Mgbe nke ahụ gasịrị Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst Jisọs ga-abịa, mgbe a ga-eji nwayọọ nwayọọ weta ụwa n’ọnọdụ paradaịs.
Bible na-ekpughe na n’oge ọchịchị Narị Afọ Iri a, mbilite n’ọnwụ nke ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ ga-ewere ọnọdụ. Mgbe ahụ ka a ga-emezu nkwa Jisọs kwere mgbe ọ nọ n’elu ala: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa . . . ná mbilite n’ọnwụ.”—Jọn 5:28, 29.
Mmetụta nke Olileanya Mbilite n’Ọnwụ
Lee olileanya dị ebube maka ọdịnihu nke olileanya mbilite n’ọnwụ a bụ—oge mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-abịaghachi ná ndụ! Lee ka o si agba anyị ume ka anyị na-ezute ihe isi ike nile nke ime agadi, ọrịa, ọdachi na iru újú ndị a na-atụghị anya ha, na nrụgide na nsogbu nile nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị! Ọ na-ewepụ ihe ọgbụgba nke ọnwụ—ọ bụghị iwepụ iru újú kpam kpam kama ikewapụ anyị iche pụọ ná ndị na-enweghị olileanya maka ọdịnihu. Pọl onyeozi kwetara mmetụta a na-akasi obi nke olileanya mbilite n’ọnwụ n’okwu ndị a: “Anyị achọghị ka unu ghara ịmara ihe banyere ndị na-ada n’ụra ọnwụ, ụmụnna anyị; ka o wee ghara iwute unu, ọbụna dị ka ọ na-ewute ndị fọdụrụ, ndị na-enweghị olileanya. N’ihi na a sị na anyị kwere na Jisọs nwụrụ sikwa n’ọnwụ bilie, otú a ndị e mere ka ha daa n’ụra ọnwụ site n’aka Jisọs, ọ bụkwa ndị a ka Chineke ga-ekuru ka ha soo Ya bịa.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:13, 14.
Anyị pụrụ ịhụworị ịbụ eziokwu nke nchọpụta ọzọ nke onye Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ́ Job mere: “Mmadụ na-apụ n’anya dị ka ihe rere ure, dị ka uwe nlá riri. Mmadụ nwanyị mụrụ na-adịru ụbọchị ole na ole ma jupụta ná nsogbu. Ọ na-etolite dị ka okooko osisi ma kpọnwụọ; dị ka onyoonyo nke na-apụ n’anya ngwa ngwa, ọ dịghị adịte aka.” (Job 13:28–14:2, New International Version) Anyị onwe anyị kwa maara banyere ejighị n’aka nke ndụ na ịbụ eziokwu na “mgbe na ihe ndapụta” pụrụ ịdakwasị onye ọ bụla n’ime anyị. (Eklisiastis 9:11) N’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị na-enwe mmasị n’echiche nke iche usoro ịnwụ ọnwụ ihu. Ma, olileanya e ji n’aka nke mbilite n’ọnwụ na-enye aka iwepụ oké egwu nke ọnwụ.
Mgbe ahụ, nwee obi ike! Lee anya gabiga ụra ọnwụ nke pụrụ ịdabara anyị gaa n’ịbịaghachi ná ndụ site n’ọrụ ebube nke mbilite n’ọnwụ. Jiri obi ike lega anya n’ihu n’olileanya nke ndụ ọdịnihu n’enweghị ọgwụgwụ, tụkwasịkwa na nke a ọṅụ nke ịmata na oge obi ụtọ dị otú ahụ dị nso.