Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ—Ị̀ Ga-ahụ Ha Ọzọ?
JOHN dị nanị afọ itoolu mgbe nne ya nwụrụ. E mesịa, o chetara ihe mere n’ebe a nọ mee ememe ili ozu ahụ: “Eseere m ya otu ihe osise ma dee otu obere ihe na ya na-agwa ya ka o chere anyị nile n’eluigwe. M nyere ya Papa ka o tinye ya n’igbe ozu ahụ, n’agbanyeghịkwa na ọ nwụrụ anwụ, ọ na-amasị m iche na o nwetara ozi ikpeazụ ahụ sitere n’aka m.”—How It Feels When a Parent Dies, nke Jill Krementz dere.
A pụghị ịrụ ụka na John hụrụ nne ya n’anya nke ukwuu. Mgbe ọ kọwasịrị àgwà ọma ya dị iche iche, ọ sịrị: “Ma eleghị anya ọ bụ nanị na achọghị m icheta ihe ndị dị njọ, ma apụghị m icheta ihe ọjọọ ọ bụla banyere ya. Ọ bụ nwaada kasị mma m hụtụworo ná ndụ m nile.”
Dị ka John, ọtụtụ na-enwe ncheta ọma banyere ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ma na-ekweta inwe mkpa mmetụta uche maka ịhụ ha ọzọ. Edith, onye nwa ya nwoke dị 26 afọ nwụrụ site n’ọrịa cancer, sịrị: “Ọ dị m mkpa ikweta na e nwere ebe nwa m nwoke nọ ma amaghi m ebe ọ bụ. M̀ ga-ahụ ya ọzọ? Amaghị m, ma ana m enwe olileanya na m ga-ahụ ya.”
N’ezie, Onye Okike na-ahụ n’anya nke mmadụ abụghị onye na-adịghị enwe mmetụta banyere ọchịchọ nke a sitere n’okike nke mmadụ. Ọ bụ ya mere o ji kwee nkwa na oge ga-abịa mgbe a ga-ejikọghachi ọtụtụ nde mmadụ ha na ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Okwu Chineke nwere ọtụtụ ntụaka gaa ná nkwa nke a nke mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ na-abịanụ.—Aịsaịa 26:19; Daniel 12:2, 13; Hosea 13:14; Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:12, 13.
Olè Ndị A Kpọlitere Gaa n’Eluigwe?
Ka anyị tụlee olileanya John nke na nne ya ọ hụrụ n’anya na-echere ya n’eluigwe. Ọtụtụ ndị na-aga chọọchị nwere olileanya ma ọ bụ nkwenkwe nke a. Ná mgbalị iji kwado echiche dị otú ahụ, ndị ụkọchukwu na ụfọdụ ndị ọrụ obi ebere na-akọwahie ihe odide dị iche iche sitere na Bible.
Dị ka ihe atụ, otu ọkachamara n’inyere ndị mmadụ nwụnahụrụ aka, Dr. Elisabeth Kübler-Ross, kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ On Children and Death, sị: “Ịnwụ pụtara nanị na anyị na-ewezụga anụ ahụ anyị dị ka anyị pụrụ iwezụga n’ụsọ kotu kara nká, ma ọ bụ si n’otu ọnụ ụlọ banye n’ọzọ. N’Eklisiastis, 12:7, anyị na-agụ, sị: ‘Mgbe ahụ ka uzuzu na-alaghachi n’ájá dị ka ọ dịbu; mmụọ ga-alaghachikwara Chineke onye nyere ya.’ Jisọs sịrị: ‘M na-aga ịkwadebere unu ebe ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.’ Nyekwa onye ohi ahụ nọ n’elu obe: ‘Taa ị ga-eso m nọrọ na paradaịs.’”
Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị n’elu hà pụtara n’ezie na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ dị ndụ ugbu a ma na-echere anyị n’eluigwe? Ka anyị jirikwuo nlezianya tụlee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ, na-amalite n’Eklisiastis 12:7. O doro anya na onye amamihe dere okwu ndị ahụ ebughị n’uche imegide ihe o kwuwororịị n’otu akwụkwọ Bible ahụ: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Ọ na-atụle ọnwụ nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha. Ezi uche ọ̀ dị n’ikwere na ndị nile siri ọnwụ na Chineke adịghị na ndị ome mpụ obi kpọrọ nkụ na-alaghachikwuru Chineke mgbe ha nwụrụ? Ọ dịghị ma ọlị. N’ezie, a pụghị ikwu nke ahụ banyere onye ọ bụla n’ime anyị, n’agbanyeghị ma anyị na-ewere onwe anyị dị ka ndị ọma ma ọ bụ ndị ọjọọ. Ebe ọ bụ na ọ dịbeghị onye ọ bụla n’ime anyị soworo Chineke nọrọ n’eluigwe, olee otú a pụrụ isi kwuo na anyị na-alaghachikwuru ya?
Mgbe ahụ, gịnị ka onye ahụ so dee Bible bu n’uche n’ịsị na mgbe a nwụrụ, ‘mmụọ na-alaghachikwuru Chineke’? N’iji okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “mmụọ” mee ihe, ọ dịghị ezo aka n’ihe pụrụ iche nke na-eme ka mmadụ dị iche site n’onye ọzọ. Kama nke ahụ, n’Eklisiastis 3:19, otu onye ahụ ji ike mmụọ nsọ soro dee Bible na-akọwa na ma mmadụ ma anụmanụ, “otu mmụọ ka ha nile nwere.” Ihe àmà na-egosi na ihe o bu n’uche bụ na “mmụọ” ahụ bụ ike ndụ dị ná mkpụrụ ndụ ndị mejupụtara anụ ahụ nile nke mmadụ na anụmanụ. Anyị anataghị mmụọ nke a kpọmkwem site n’aka Chineke. E bufeere anyị ya site n’aka nne na nna anyị bụ mmadụ mgbe a tụụrụ ime anyị ma mesịa mụọ anyị. Ọzọkwa, mmụọ nke a adịghị eme njem n’ụzọ nkịtị gabiga mbara igwe ma laghachikwuru Chineke mgbe a nwụrụ. Okwu ahụ, ‘mmụọ na-alaghachikwuru ezi Chineke,’ bụ atụmatụ okwu nke pụtara na atụmanya maka ndụ n’ọdịnihu nke onye nwụrụ anwụ dị n’aka Chineke ugbu a. Ọ dịịrị ya ikpebi onye ọ ga-echeta ma mesịa kpọlite n’ọnwụ. Rịba ama n’onwe gị ụzọ Bible si na-egosi nke a n’ụzọ doro anya n’Abụ Ọma 104:29, 30.
Jehova Chineke ezubewo na a ga-akpọlite ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè nke ndị na-ekwesị ntụkwasị obi na-eso ụzọ Kraịst, na-eru ngụkọta nke nanị 144,000, gaa ná ndụ eluigwe dị ka ụmụ Chineke ndị bụ́ mmụọ. (Mkpughe 14:1, 3) Ndị a mejupụtara gọọmenti eluigwe ha na Kraịst maka ngọzi nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụwa.
Ndị mbụ matara banyere nke a bụ ndị ozi Jisọs na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ọ gwara, sị: “N’ụlọ Nna m ọtụtụ ebe obibi dị; ọ bụrụ na ọ bụghị otú a, M ga-agwoworị unu; n’ihi na ana m aga idoziri unu ebe. Ọ bụrụkwa na Mụ agaa idoziri unu ebe, agaje m ịbịa ọzọ, M ga-anarakwa unu nye Onwe m; ka unu onwe unu wee nọọkwa ebe Mụ onwe m nọ.” (Jọn 14:2, 3) Ndị ozi ndị ahụ na ndị Kraịst mbụ ndị ọzọ nwụrụ, ha aghaghịkwa ichere n’amaghị ihe ọ bụla n’ọnwụ ruo ọbịbịa Jisọs iji mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe nyeghachi ha ụgwọ ọrụ. Ọ bụ ya mere anyị ji na-agụ na onye Kraịst mbụ e gburu n’ihi okwukwe ya, bụ́ Stifen, ‘dara n’ụra.’—Ọrụ 7:60; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:13.
Mbilite n’Ọnwụ Gaa ná Ndụ n’Elu Ụwa
Ma gịnị banyere nkwa Jisọs nye onye ome mpụ ahụ nwụrụ n’akụkụ ya? Dị ka ọtụtụ ndị Juu nke oge ahụ, nwoke a kwetara na Chineke ga-ezite Mesaịa onye ga-eguzobe otu alaeze ma weghachi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nye mba Juu n’elu ụwa. (Jiri 1 Ndị Eze 4:20-25 tụnyere Luk 19:11; 24:21 na Ọrụ Ndị Ozi 1:6.) Ọzọkwa, onye mmebi iwu ahụ gosipụtara okwukwe na Jisọs bụ kpọmkwem Onye ahụ Chineke họpụtara ịbụ Eze. Ma, n’oge ahụ kpọmkwem, ọnwụ na-eru nso nke Jisọs dị ka onye a mara ikpe mere ka nke a yie ihe na-apụghị ịbụ eziokwu. Ọ bụ ya mere Jisọs ji mesighachi onye ome mpụ ahụ obi ike site n’iwebata nkwa Ya n’okwu ndị a: “N’ezie asị m gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:42, 43, NW.
Nsụgharị Bible ndị na-etinye rịkọm tupu okwu ahụ bụ́ “taa” na-akpatara ndị mmadụ chọrọ ịghọta okwu Jisọs nsogbu. Jisọs agaghị paradaịs ọ bụla n’otu ụbọchị ahụ. Kama nke ahụ, o dinara n’amaghị ihe ọ bụla n’ọnwụ ruo ụbọchị atọ ruo mgbe Chineke kpọlitere ya. Ọbụna mgbe a kpọlitesịrị Jisọs n’ọnwụ, ọ laghachikwa n’eluigwe, ọ ghaghị ichere n’aka nri Nna ya ruo mgbe oge ruru ka ọ chịa dị ka Eze n’isi ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Hibru 10:12, 13) N’isi nso, ịchịisi Alaeze Jisọs ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ahụ efe ma gbanwee ụwa dum ịghọ paradaịs. (Luk 21:10, 11, 25-31) Mgbe ahụ ọ ga-emezu nkwa ahụ o kwere onye ome mpụ ahụ site n’ịkpọlite ya bịa ná ndụ n’elu ụwa. Jisọs ga-anọnyekwara nwoke ahụ n’echiche nke na Ọ ga-enyere nwoke ahụ aka ná mkpa ya nile, gụnyere mkpa ime ka ụzọ ndụ ya kwekọọ n’iwu ezi omume nile nke Chineke.
Mbilite n’Ọnwụ nke Ọtụtụ Ndị
Dị ka ọ dị n’ihe banyere onye ome mpụ ahụ chegharịrịnụ, mbilite n’ọnwụ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ewere ọnọdụ n’elu ụwa ebe a. Nke a kwekọrọ ná nzube Chineke n’ike mmadụ. E tinyere nwoke na nwanyị mbụ n’ubi paradaịs ma gwa ha ka ha buda ụwa n’okpuru onwe ha. A sị na ha nọgidere na-erubere Chineke isi, ha agaraghị aka nká ma nwụọ. N’oge Chineke kara aka, a ga-ebudaworị ụwa dum n’okpuru, mee ya otu paradaịs zuru ụwa ọnụ site n’aka Adam na ụmụ ya ndị zuru okè.—Jenesis 1:28; 2:8, 9.
Otú ọ dị, n’ihi na Adam na Iv kpachara anya mehie, ha wetaara onwe ha na ụmụ ha ga-amụ n’ọdịnihu ọnwụ. (Jenesis 2:16, 17; 3:17-19) Ọ bụ ya mere Bible ji na-asị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”—Ndị Rom 5:12.
E nwewo nanị otu mmadụ a mụrụ n’enweghị mmehie ọ bụla e ketara eketa. Onye ahụ bụ Nwa zuru okè nke Chineke, Jisọs Kraịst, onye e bufere ndụ ya site n’eluigwe gaa n’akpa nwa nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ onye Juu, bụ́ Meri. Jisọs nọgidere n’enweghị mmehie, o kwesịghịkwa ka e mee ka ọ nwụọ. Ya mere, ọnwụ ya nwere ọnụ ahịa mgbapụta n’ọnọdụ nke “mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29; Matiu 20:28) Ọ bụ ya mere Jisọs pụrụ iji kwuo, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.”—Jọn 11:25.
Ya mere, ee, ị pụrụ ịdị na-enwe olileanya nke ịbụ onye e jikọghachiri gị na ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, ma nke a na-achọ ka i gosipụta okwukwe na Jisọs dị ka Onye Mgbapụta gị ma rubere ya isi dị ka Eze Chineke họpụtara. N’isi nso Alaeze Chineke ga-azachapụ ihe ọjọọ nile n’ụwa nke a. A ga-ebibi ụmụ mmadụ nile jụrụ ido onwe ha n’okpuru ịchịisi ya. Otú ọ dị, ndị Alaeze Chineke ga-achị ga-alanarị ma jide ọrụ n’aka n’ọrụ ịgbanwe ụwa a ka ọ ghọọ paradaịs.—Abụ Ọma 37:10, 11; Mkpughe 21:3-5.
Mgbe ahụ oge ahụ na-akpali akpali ga-abịa ka mbilite n’ọnwụ ahụ malite. Ị̀ ga-anọ ya ịnabataghachi ndị nwụrụ anwụ? Ọ dabeere nanị n’ihe ị na-eme ugbu a. Ngọzi ndị dị ebube na-echere ndị nile doro onwe ha ugbu a n’okpuru ịchịisi nke Alaeze Jehova n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst.