Nara Nkwa Nile Nke Chineke Site N’igosipụta Okwukwe
‘O [Jehova Chineke] enyewo n’aka anyị nkwa nile ahụ dị oké ọnụ ahịa dịkwa ukwuu hie nne.’—2 PITA 1:4.
1. Gịnị na-enyere anyị aka igosipụta ezi okwukwe?
JEHOVA chọrọ ka anyị gosipụta okwukwe ná nkwa ya nile. Ma, “ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Àgwà nke a bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Chineke. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ya mere, ọ bụ nanị ndị mmụọ Jehova na-edu pụrụ igosipụta okwukwe.
2. Olee ụzọ Pọl onyeozi si kọwaa “okwukwe”?
2 Ma gịnị bụ okwukwe? Pọl onyeozi kpọrọ ya “nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” Ihe àmà nke nnwapụta ndị a a na-adịghị ahụ anya siri oké ike nke na e ji okwukwe tụnyere ya. A sịkwara na okwukwe bụ “ndabere nke ihe a na-ele anya” n’ihi na ndị nwere àgwà nke a nwere ihe mgbakwasị ụkwụ nke na ihe ọ bụla Jehova Chineke kwere ná nkwa bụ nke e ji nnọọ n’aka nke na o yiri ka o mezuwo.—Ndị Hibru 11:1.
Okwukwe na Nkwa Nile nke Jehova
3. Gịnị ka ndị Kraịst e tere mmanụ ga-enwe ahụmahụ ya ma ọ bụrụ na ha egosipụta okwukwe?
3 Iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, anyị aghaghị igosipụta okwukwe ná nkwa ya nile. Pita onyeozi gosipụtara nke a n’akwụkwọ ozi ya nke abụọ o dere n’ike mmụọ nsọ, nke e dere n’ihe dị ka 64 O.A. Ọ rụtụrụ aka na ọ bụrụ na ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ egosipụta okwukwe, ha ga-ahụ mmezu nke “nkwa nile ahụ dị oké ọnụ ahịa dịkwa ukwuu hie nne” nke Chineke. N’ihi nke ahụ, ha ‘ga-aghọ ndị na-enwekọ ihe o jiri bụrụ Chineke’ dị ka ndị ga-eso Jisọs Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe. Site n’okwukwe na enyemaka Jehova Chineke, ha agbanarịwo ịbụ ndị nọ n’agbụ nke àgwà na omume mmetọ nke ụwa nke a. (2 Pita 1:2-4) Cheekwa echiche! Ndị na-egosipụta ezi okwukwe na-enweta otu ụdị nnwere onwe ahụ dị oké ọnụ ahịa taa.
4. Àgwà ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị inyezu okwukwe anyị?
4 Okwukwe ná nkwa nile nke Jehova na obi ekele maka nnwere onwe Chineke nyeworo kwesịrị ịkpali anyị ime ike anyị nile iji ghọọ ndị Kraịst bụ ihe nlereanya. Pita kwuru, sị: “N’akụkụ unu tụkwasịnụ ịnụ ọkụ n’obi nile, nyezukwaanụ ịdị mma n’okwukwe unu; nyezukwa ihe ọmụma n’ịdị mma unu; nyezukwa ijisi onwe unu ike n’ihe ọmụma unu; nyezukwa ntachi obi n’ijisi onwe unu ike; nyezukwa nsọpụrụ Chineke n’ime ntachi obi unu; nyezukwa ịhụnanya ụmụnna n’ime nsọpụrụ Chineke unu; nyezukwa ịhụnanya n’ime ịhụnanya ụmụnna unu.” (2 Pita 1:5-7) Pita si otú a nye anyị ihe ndepụta nke ọ ga-adị mma ka anyị buru n’isi. Ka anyị tụlee àgwà ndị a n’ụzọ dị omimi karị.
Isi Ihe Ndị Dị Mkpa n’Okwukwe
5, 6. Gịnị bụ ịdị mma, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi nyezuo ya n’okwukwe anyị?
5 Pita sịrị na a ga-enyezu ịdị mma, ihe ọmụma, ijisi onwe onye ike, ntachi obi, nsọpụrụ Chineke, ịhụnanya ụmụnna, na ịhụnanya n’ebe onye ọ bụla dị nakwa n’okwukwe anyị. Anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji mee ka àgwà ndị a bụrụ isi ihe ndị dị mkpa n’okwukwe anyị. Dị ka ihe atụ, ịdị mma abụghị àgwà nke anyị na-egosipụta n’enweghị okwukwe. Onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ W. E. Vine na-arụtụ aka na na 2 Pita 1:5, “a gụnyekọrọ ịdị mma dị ka àgwà dị mkpa n’igosipụta okwukwe.” Nke ọ bụla n’ime àgwà ndị ọzọ Pita hotara ga-abụkwa isi ihe nke dị n’okwukwe anyị.
6 Nke mbụ, anyị aghaghị inyezu ịdị mma n’okwukwe anyị. Ịbụ ndị dị mma pụtara ime ihe dị mma n’anya Chineke. Maka okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ịdị mma,” ụfọdụ nsụgharị ji “ịma mma” mee ihe. (New International Version; The Jerusalem Bible; Today’s English Version) Ịdị mma na-akpali anyị izere ime ihe ọjọọ ma ọ bụ ịkpatara ụmụ mmadụ ibe anyị mmerụ ahụ. (Abụ Ọma 97:10) Ọ na-akpalikwa omume obi ike n’ime ihe ọma maka abamuru ime mmụọ, anụ ahụ, na nke mmetụta uche nke ndị ọzọ.
7. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nyezuo ihe ọmụma n’okwukwe na ịdị mma anyị?
7 N’ihi gịnị ka Pita ji gbaa anyị ume inyezu ihe ọmụma n’okwukwe na ịdị mma anyị? Ee, ebe anyị na-ezute ihe ịma aka ndị ọhụrụ nye okwukwe anyị, ihe ọmụma dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-ama ọdịiche dị n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ. (Ndị Hibru 5:14) Site n’ọmụmụ Bible na ahụmahụ n’itinye Okwu Chineke n’omume nakwa n’igosipụta amamihe dị irè ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị, anyị na-amụba ihe ọmụma anyị. Mgbe ahụ, nke a na-enyere anyị aka ijigide okwukwe na ịnọgide na-eme ihe dị mma mgbe anyị nọ n’okpuru ọnwụnwa.—Ilu 2:6-8; Jemes 1:5-8.
8. Gịnị bụ ijisi onwe onye ike, oleekwa ụzọ e si jikọta ya na ntachi obi?
8 Iji nyere anyị aka iji okwukwe nagide ọnwụnwa, ọ dị mkpa anyị inyezu ijisi onwe onye ike n’ihe ọmụma. Okwu Grik maka “ijisi onwe onye ike” pụtara ikike nke ịchịkwa onwe anyị. Mkpụrụ nke a nke mmụọ nsọ Chineke na-enyere anyị aka igosipụta mgbochi n’echiche, okwu, na omume. Site n’ịnọgide na-egosipụta njide onwe onye, anyị na-enyezu ya ntachi obi. Okwu Grik maka “ntachi obi” na-egosi iguzosi ike n’obi ike, ọ bụghị iji ihu mgbarụ nakwere ihe isi ike nke a na-apụghị ịgbanahụ. Ọ bụ n’ihi ọṅụ nke e setịpụrụ ya n’ihu ka Jisọs ji tachie obi n’osisi ịta ahụhụ. (Ndị Hibru 12:2) Ume nke Chineke na-enye tinyere ntachi obi na-akwalite okwukwe anyị ma na-enyere anyị aka ịṅụrị ọṅụ ná mkpagbu, iguzogide ọnwụnwa, na izere imebi okwukwe anyị mgbe a na-akpagbu anyị.—Ndị Filipaị 4:13.
9. (a) Gịnị bụ nsọpụrụ Chineke? (b) N’ihi gịnị ka a ga-eji nyezuo ịhụnanya ụmụnna ná nsọpụrụ Chineke anyị? (ch) Olee ụzọ anyị pụrụ isi nyezuo ịhụnanya n’ịhụnanya ụmụnna anyị?
9 N’ebe ntachi obi anyị dị anyị aghaghị inyezu nsọpụrụ Chineke—nraranye, ofufe na ije ozi nye Jehova. Okwukwe anyị na-amụba ka anyị na-eme omume nsọpụrụ Chineke ma na-ahụ ụzọ Jehova si emeso ndị ya ihe. Ma, iji gosipụta nsọpụrụ Chineke, ịhụnanya ụmụnna dị anyị mkpa. E kwuwerị, “onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, ọ pụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụghị mgbe ọ bụla.” (1 Jọn 4:20) Obi anyị kwesịrị ịkpali anyị igosipụta ezi ịhụnanya maka ndị ohu ndị ọzọ nke Jehova ma chọọ ụzọ ime ihe maka ọdịmma ha n’oge nile. (Jemes 2:14-17) Ma n’ihi gịnị ka e ji gwa anyị ka anyị nyezuo ịhụnanya n’ịhụnanya ụmụnna anyị? Ihe àmà na-egosi na Pita bu n’uche na anyị aghaghị igosi ịhụnanya maka ihe nile a kpọrọ mmadụ, ọ bụghị nanị nye ụmụnna anyị. A na-egosi ịhụnanya nke a karịsịa site n’ikwusa ozi ọma na inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ ime mmụọ.—Matiu 24:14; 28:19, 20.
Mmetụta Ndị Dị Iche
10. (a) Olee ụzọ anyị ga-esi mee omume ma ọ bụrụ na e nyezuo ịdị mma, ihe ọmụma, ijisi onwe onye ike, ntachi obi, nsọpụrụ Chineke, ịhụnanya ụmụnna, na ịhụnanya n’okwukwe anyị? (b) Gịnị na-eme ma ọ bụrụ na onye kpọrọ onwe ya onye Kraịst enweghị àgwà ndị a?
10 Ọ bụrụ na anyị enyezuo ịdị mma, ihe ọmụma, ijisi onwe onye ike, ntachi obi, nsọpụrụ Chineke, ịhụnanya ụmụnna, na ịhụnanya n’okwukwe anyị, anyị ga-eche echiche, kwuo okwu, ma mee omume n’ụzọ ndị Chineke nwapụtara. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na onye kpọrọ onwe ya onye Kraịst adaa n’igosipụta àgwà ndị a, ọ na-ekpu ìsì n’ụzọ ime mmụọ. Ọ ‘na-ekpuchi anya ya pụọ n’ìhè’ sitere n’aka Chineke ma na-echezọ na ya abụwo onye a sachara pụọ ná mmehie ndị o mere n’oge gara aga. (2 Pita 1:8-10, NW; 2:20-22) Ka anyị ghara ịda mgbe ọ bụla n’ụzọ dị otú ahụ wee si otú ahụ ghara inwe okwukwe ná nkwa nile nke Chineke.
11. Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya n’ụzọ ziri ezi n’aka ndị e tere mmanụ na-anọgidesi ike n’ihe?
11 Ndị Kraịst e tere mmanụ na-eguzosi ike n’ihe nwere okwukwe ná nkwa nile nke Jehova ma na-agbalịsi ike ime ka ọkpụkpọ ọ kpọrọ ha na nhọpụta ha bụrụ eziokwu. N’agbanyeghị ihe mkpọbi ụkwụ ọ bụla nọchiri ha ụzọ, anyị pụrụ ịtụ anya ka ha gosipụta àgwà Chineke nile. Nye ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi, ‘a ga-enyezu ha n’akụ mbata ha ga-abata n’alaeze ebighị ebi nke Jisọs Kraịst’ site ná mbilite n’ọnwụ ha gaa ná ndụ mmụọ n’eluigwe.—2 Pita 1:11.
12. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi ghọta okwu ndị dị na 2 Pita 1:12-15?
12 Pita ghọtara na ya gaje ịnwụ n’oge na-adịghị anya, ọ tụkwara anya ịnata mbilite n’ọnwụ ma e mesịa gaa ná ndụ eluigwe. Ma ruo oge nile ọ dị ndụ “n’ụlọ ikwuu a”—anụ ahụ mmadụ ya—ọ gbalịrị iwulite okwukwe nke ndị kwere ekwe ibe ya ma kpalie mmụọ ha site n’ichetara ha ihe ndị dị mkpa iji nweta amara Chineke. Mgbe ọ nwụsịrị, ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ nke Pita pụrụ ịkwalite okwukwe ha site n’icheta okwu ya.—2 Pita 1:12-15.
Okwukwe n’Okwu Amụma
13. Olee ụzọ Chineke si wepụta ihe àmà na-emesi okwukwe ike banyere ọbịbịa Kraịst?
13 Chineke n’onwe ya nyere ihe àmà nke na-ewusi okwukwe ike banyere izi ezi nke ọbịbịa Jisọs “n’ike na oké ebube.” (Matiu 24:30; 2 Pita 1:16-18) N’enweghị ihe àmà, ndị nchụàjà na-agọ mmụọ kọrọ akụkọ ifo ụgha banyere chi ha, ebe Pita, Jemes, na Jọn ji anya ha hụ ịdị ebube nke Kraịst n’oge nnwogha. (Matiu 17:1-5) Ha hụrụ ka e mere ka ọ dị ebube ma nụ ụda nke olu Chineke n’onwe ya ka ọ na-anakwere Jisọs dị ka Ọkpara Ya ọ hụrụ n’anya. Nnakwere ahụ na ọdịdị na-egbuke egbuke e nyere Kraịst n’oge ahụ bụ onyinye nke otuto na ebube n’ebe ọ nọ. N’ihi mkpughe nke a sitere n’aka Chineke, Pita kpọrọ ebe ahụ, eleghị anya ebe mkpọli nke Heamọn, “ugwu ahụ dị nsọ.”—Tụlee Ọpụpụ 3:4, 5.
14. Olee ụzọ nnwogha Jisọs kwesịrị isi metụta okwukwe anyị?
14 Olee ụzọ nnwogha Jisọs kwesịrị isi metụta okwukwe anyị? Pita sịrị: “E mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị; nke unu na-eme nke ọma n’ịṅa ntị ya, dị ka oriọna mgbe ọ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọ, kpakpando chi ọbụbọ wee tibe n’obi unu.” (2 Pita 1:19) O doro anya na “okwu amụma ahụ” gụnyere ọ bụghị nanị amụma nile nke Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere Mesaịa kamakwa okwu Jisọs nke na ya ga-abịa “n’ike na oké ebube.” Olee ụzọ e si mee ka okwu ahụ ‘guzosie ike karị’ site ná nnwogha ahụ? Ihe omume ahụ wepụtara eziokwu nke okwu amụma ahụ banyere ọbịbịa dị ebube nke Kraịst n’ike Alaeze.
15. Gịnị ka ịṅa ntị n’okwu amụma gụnyere?
15 Iji mesie okwukwe anyị ike, anyị aghaghị ịṅa ntị n’okwu amụma. Nke a gụnyere ịmụ okwu ahụ, ịtụle ya ná nzukọ nile nke ndị Kraịst, na itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ. (Jemes 1:22-27) Anyị aghaghị ikwere ka ọ bụrụ ‘oriọna nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị,’ na-enye ìhè n’ebe obi anyị. (Ndị Efesọs 1:18) Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ọ ga-eduzi anyị ruo mgbe ‘chi ọbụbọ,’ ma ọ bụ “kpakpando chi ọbụbọ,” bụ́ Jisọs Kraịst, ga-ekpughe onwe ya n’ebube. (Mkpughe 22:16) Mkpughe ahụ ga-apụta mbibi nye ndị na-enweghị okwukwe na ngọzi nye ndị na-egosipụta okwukwe.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10.
16. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee okwukwe na nkwa amụma nile dị n’Okwu Chineke ga-emezu?
16 Ndị amụma Chineke abụghị nnọọ ndị ikom nwere nkà bụ́ ndị ji amamihe buo amụma, n’ihi Pita sịrị: “Ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’Akwụkwọ Nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya. N’ihi na ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe mmụọ nsọ na-eme ka ha kwuo.” (2 Pita 1:20, 21) Dị ka ihe atụ, Devid sịrị: “Mmụọ nke Jehova kwuru site n’ọnụ m.” (2 Samuel 23:1, 2) Pọl dekwara, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’Akwụkwọ Nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” (2 Timoti 3:16) Ebe ọ bụ na ndị amụma Chineke bụ ndị a kpaliri site ná mmụọ ya, anyị pụrụ inwe okwukwe na nkwa nile dị n’ime Okwu ya ga-emezu.
Ha Nwere Okwukwe ná Nkwa Nile nke Chineke
17. Nkwa dị aṅaa bụ ndabere nke okwukwe Ebel?
17 Nkwa nile nke Jehova bụ ihe ndabere maka okwukwe nke ‘oké igwe ojii’ nke ndịàmà dịrị ndụ tupu oge ndị Kraịst. (Ndị Hibru 11:1–12:1) Dị ka ihe atụ, Ebel nwere okwukwe ná nkwa Chineke banyere “mkpụrụ” nke ga-echipịa “agwọ ahụ” n’isi. E nwere ihe àmà nke mmezu ọmụma ikpe Chineke n’isi ndị mụrụ Ebel. Mgbe ha pụrụ n’Iden, Adam na ezinụlọ ya riri achịcha n’ọsụsọ ihu ha n’ihi na ala ahụ a bụrụ ọnụ mepụtara ogwu na uke. O yikarịrị ka Ebel hụrụ ọchịchọ Iv maka di ya, hụkwa na Adam na-achị ya. N’ezie o kwuru banyere ihe mgbu nke afọ ime ya. Ndị cherub na ire ọkụ nke mma agha na-echekwa ụzọ mbata nke ubi Iden ahụ nche. (Jenesis 3:14-19, 24) Ihe ndị a nile mejupụtara “nnwapụta” nke na-emesi Ebel obi ike na mgbapụta ga-abịa site ná Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. N’ime ihe n’okwukwe, Ebel chụụrụ Chineke àjà nke ghọrọ ihe dị oké ọnụ ahịa karịa nke Ken.—Ndị Hibru 11:1, 4.
18, 19. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Abraham na Sera si gosipụta okwukwe?
18 Ndị nna ochie ahụ bụ́ Abraham, Aịsak, na Jekọb nwekwara okwukwe ná nkwa nile nke Jehova. Abraham gosipụtara okwukwe ná nkwa Chineke nke na ezinụlọ nile nke ala ga-agọzi onwe ha site na ya, na a ga-enyekwa mkpụrụ ya otu ala. (Jenesis 12:1-9; 15:18-21) Nwa ya nwoke bụ́ Aịsak na nwa nwa ya bụ́ Jekọb bụ “ndị soro ya na-eketakọ otu nkwa ahụ.” Site n’okwukwe, Abraham “biri dị ka ọbịa n’ala nke e kwere ya rịị ná nkwa,” cherekwa maka “obodo ahụ nke nwere ntọala,” Alaeze eluigwe Chineke nke a ga-akpọlite ya n’ime ya n’ọnwụ gaa ná ndụ n’elu ala. (Ndị Hibru 11:8-10) Ì nwere okwukwe yiri nke ahụ?
19 Nwunye Abraham, bụ́ Sera, dị ihe dị ka afọ 90 ma gafeekwa afọ ịmụ nwa mgbe o gosipụtara okwukwe ná nkwa Chineke, e wee nye ya ike “ịmụ nwa,” o wee mụọ Aịsak. Otú a, site n’Abraham ahụ dị 100 afọ, onye “dịkwa ka onye nwụrụ anwụ” n’ihe banyere ịmụ nwa, ka e mesịrị ‘mụta ụmụ bara ụba dị ka kpakpando nke eluigwe.’—Ndị Hibru 11:11, 12; Jenesis 17:15-17; 18:11; 21:1-7.
20. Ọ bụ ezie na ndị nna ochie ahụghị mmezu zuru ezu nke nkwa nile Chineke kwere ha, gịnị ka ha mere?
20 Ndị nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ n’ahụghị mmezu zuru ezu nke nkwa nile Chineke kwere ha. Ma, “ha hụrụ [ihe ndị ahụ e kwere ná nkwa] sikwa n’ebe dị anya kelee ha, wee kwupụta na ha bụ ndị ọbịa na ndị nọ dị ka ọbịa n’elu ụwa.” Ọtụtụ ọgbọ gabigara tupu Ala Nkwa ahụ aghọọ ihe onwunwe nke ụmụ Abraham. Otú ọ dị, n’oge nile ha dị ndụ, ndị nna ochie ahụ na-atụ egwu Chineke gosipụtara okwukwe ná nkwa nile nke Jehova. N’ihi na ọ dịghị mgbe ha na-enweghị okwukwe, n’oge na-adịghị anya a ga-akpọlite ha gaa ná ndụ n’ógbè elu ala nke “obodo” ahụ Chineke kwadebeere ha, bụ́ Alaeze Mesaịa ahụ. (Ndị Hibru 11:13-16) N’otu aka ahụ, okwukwe pụrụ ime ka anyị nọgidesie ike n’ihe nye Jehova ọbụna ma ọ bụrụ na anyị ahụghị mmezu nke nkwa ya nile dị ebube ozugbo. Okwukwe anyị ga-akpalikwa anyị irubere Chineke isi, ọbụna dị ka Abraham mere. Dịkwa ka o nyefere ihe nketa ime mmụọ n’aka ụmụ ya, otú ahụ ka anyị pụrụ inyere ụmụ anyị aka igosipụta okwukwe ná nkwa nile dị oké ọnụ ahịa nke Jehova.—Ndị Hibru 11:17-21.
Okwukwe Dị Mkpa nye Ndị Kraịst
21. Iji bụrụ ndị Chineke na-anakwere taa, gịnị ka a na-aghaghị ịgụnye n’anyị igosipụta okwukwe?
21 Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ihe okwukwe gụnyere karịa inwe obi ike ná mmezu nke nkwa nile nke Jehova. N’ime akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ, ọ dịwo mkpa igosipụta okwukwe na Chineke n’ụzọ dị iche iche ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta nnwapụta ya. Pọl rụtụrụ aka na “a sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ [Jehova] Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na ọ dị, na ọ na-egosikwa onwe ya onye na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Iji bụrụ ndị Jehova na-anakwere taa, mmadụ aghaghị igosipụta okwukwe na Jisọs Kraịst nakwa n’àjà mgbapụta ahụ Chineke wetaworo site na ya. (Ndị Rom 5:8; Ndị Galetia 2:15, 16) Ọ bụ dị ka Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. Onye kwere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; ma onye na-ekweghị Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ, kama iwe Chineke na-anọgide n’ahụ ya.”—Jọn 3:16, 36.
22. Alaeze Mesaịa ahụ ga-eweta mmezu nke nkwa dị aṅaa?
22 Jisọs na-ekere òkè dị mkpa ná mmezu nke nkwa nile nke Chineke banyere Alaeze ahụ nke ndị Kraịst na-ekpe ekpere maka ya. (Aịsaịa 9:6, 7; Daniel 7:13, 14; Matiu 6:9, 10) Dị ka Pita gosipụtara, nnwogha ahụ wepụtara eziokwu nke okwu amụma banyere ọbịbịa Jisọs n’ike na ebube Alaeze. Alaeze Mesaịa ahụ ga-eweta mmezu nke nkwa ọzọ nke Chineke, n’ihi na Pita dere, sị: “Dị ka nkwa ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) E mezuru otu amụma yiri nke ahụ mgbe e weghachiri ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babilọn n’ala ha n’afọ 537 T.O.A. n’okpuru ọchịchị dị n’aka Zerubabel dị ka onye ọchịchị nakwa Joshua dị ka onye isi nchụàjà. (Aịsaịa 65:17) Ma Pita rụtụrụ aka n’oge ọdịnihu mgbe “eluigwe ọhụrụ”—Alaeze eluigwe nke Mesaịa—ga-achị “ụwa ọhụrụ,” bụ́ ọha mmadụ ezi omume ndị na-adị ndụ n’elu ala nke a.—Tụlee Abụ Ọma 96:1.
23. Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere ịdị mma ka a ga-atụle ọzọ?
23 Dị ka ndị ohu Jehova na-anọgidesi ike n’ihe nakwa ndị na-eso ụzọ nke Ọkpara ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs Kraịst, ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa na-agụsi anyị agụụ ike. Anyị maara na ọ dị nso, anyị nwekwara okwukwe na nkwa nile dị oké ọnụ ahịa nke Jehova ga-emezu. Iji na-ejegharị n’ụzọ Chineke na-anakwere, anyị aghaghị imesi okwukwe anyị ike site n’inyezu ya ịdị mma, ihe ọmụma, ijisi onwe onye ike, ntachi obi, nsọpụrụ Chineke, ịhụnanya ụmụnna, na ịhụnanya.a Ugbu a, a pụrụ ịjụ, sị, Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta ịdị mma? Oleekwa ụzọ anyị ịbụ ndị dị mma ga-esi baara anyị na ndị ọzọ uru, karịsịa ndị Kraịst anyị na ha na-akpakọrịta, bụ́ ndị narawooro nkwa nile nke Chineke site n’igosipụta okwukwe?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A tụlere okwukwe na ịdị mma ná mbipụta nke a nke Ụlọ Nche. A ga-atụlekwa ihe ọmụma, njide onwe onye, ntachi obi, nsọpụrụ Chineke, ịhụnanya ụmụnna, na ịhụnanya n’ụzọ zuru ezu ná mbipụta ndị dị n’ihu.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Olee ụzọ a pụrụ isi kọwaa “okwukwe”?
◻ Dị ka 2 Pita 1:5-7 si kwuo, àgwà ndị dị aṅaa ka a ga-enyezu okwukwe anyị?
◻ Mmetụta dị aṅaa ka nnwogha Jisọs kwesịrị inwe n’okwukwe anyị?
◻ Ihe nlereanya dị aṅaa nke okwukwe ka Ebel, Abraham, Sera, na ndị oge ochie ndị ọzọ nyere?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ị̀ maara ụzọ nnwogha Jisọs pụrụ isi metụta okwukwe mmadụ?