Ụwa Ọhụrụ Dị Ezi Nso!
NDỊ ọchịchị ekwuwo ihe dị ukwuu banyere ọnọdụ ụwa ọhụrụ nke ha onwe ha ga-emepụta. Ha na-ekwu okwu banyere iwepụsị egwu na ihe nile na-egbochi inwe mmekọrịta n’etiti ndị mmadụ na mba dị iche iche. Ma ọ̀ bụ ụmụ mmadụ ka ọ dịịrị iweta ụwa ọhụrụ?
Ihe a kpọrọ mmadụ enwewo ọtụtụ narị afọ iji guzobe ụwa nke nwere udo na nke nọ ná ntụkwasị obi. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ ndị ejiwo obi eziokwu mee ihe ná mgbalị ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ụdị ọchịchị dị iche iche ụmụ mmadụ chepụtaworo iji mezuo nzube ndị dị otú ahụ, okwu Bible ahụ abụwo eziokwu, bụ́: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.
E Kwere Nkwa Ụwa Ọhụrụ
Ma n’agbanyeghị nke ahụ, otu Okwu Chineke ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-enye ihe mere ọ ga-eji bụrụ ihe e ji n’aka na a gaje inwe ụwa ọhụrụ. Mgbe o busịrị amụma banyere ọgwụgwụ nke otu usoro ihe ochie, onye Kraịst bụ Pita onyeozi kwupụtara, sị: “Dị ka nkwa ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:10-13.
Ònye kwere nkwa nke a? Ọ dịghị onye ọzọ kwere ya ma ọ bụghị Jehova, bụ́ “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18) Ọ ga-emezu ihe ụmụ mmadụ na-apụghị imezu. Ee, Jehova Chineke ga-eweta ụwa ọhụrụ. Ma ọ̀ bụ òle mgbe?
Ụwa Ọhụrụ Dị Oké Nso!
Tupu ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa aghọọ ihe dị adị n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu, “ụwa” ma ọ bụ ‘usoro ihe’ nke dị ugbu a aghaghị ịbịaru ná njedebe ya. Banyere nke a, ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst jụrụ, sị: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-abụ? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọbịbịa gị, na nke ọgwụgwụ ụwa?” (Matiu 24:3, King James Version) Dị ka nsụgharị ahụ ziri ezi karị, bụ́ New World Translation si dee ya, ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ ya, sị: “Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a?”
Ná nzaghachi, Jisọs buru amụma banyere ọtụtụ akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ nke ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya dị ka onye bụ mmụọ n’ike Alaeze eluigwe. (1 Pita 3:18) Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” Site ná “mmalite ihe mgbu” na 1914, “ọgbọ a” nke Jisọs zoro aka na ya enwewo ahụmahụ ibu agha nke nọgideworo na-aga n’ihu, ụkọ nri, na ala ọma jijiji dị ka akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ nke ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya.—Matiu 24:7, 8, 34.
Ịlụ agha abịakwasịwo ọgbọ nke a n’ụzọ na-enweghị atụ kemgbe afọ 1914. Agha Ụwa Mbụ gburu ihe e chere na o ruru nde mmadụ 14. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, e gburu 55 nde ndị agha na ndị nkịtị. Ee, kemgbe 1914, ihe karịrị 100 nde mmadụ anwụwo n’agha! N’ezie, nke a na-aka akara akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ nke ọnụnọ Jisọs.
Ụkọ nri, nke Jisọs bukwara amụma ya, wakwasịrị ọtụtụ ala mgbe nke ọ bụla n’ime agha ụwa abụọ ndị ahụ gasịrị. N’agbanyeghị ọganihu e nweworo na nkà mmụta sayensị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi n’ụwa nọ n’agụụ taa. Kwa afọ, ọtụtụ nde ụmụntakịrị na ndị ọzọ na-anwụ n’ihi erighị ihe ndị na-edozi ahụ. Akwụkwọ ahụ bụ The World Book Encyclopedia na-asị: “Ihe ka ọtụtụ ná mba ndị ka na-emepe emepe n’Africa, Asia, na Latin America na-ejisi ike enweta nri ga-ezuru ndị ala ha. Ọtụtụ nde mmadụ ná mba ndị a nọ n’agụụ. Mgbe imepụta ihe oriri ma ọ bụ isi mba ndị ọzọ na-ebubata ha dalata n’ihi ihe ọ bụla, ụnwụ nri pụrụ ịdapụta, ọtụtụ puku ma ọ bụ ọtụtụ nde mmadụ pụkwara ịnwụ.”
Ala ọma jijiji egbuwo ọtụtụ mmadụ n’ime ọgbọ nke a nke na-aka “mgbe ọgwụgwụ” ahụ akara. (Daniel 12:4) Ọnụ ọgụgụ ndị e nwere banyere ndị nwụrụ n’ala ọma jijiji ndị merenụ dị iche iche. Ma kemgbe 1914, mbibi ala ọma jijiji kpatara amụbawo gburugburu ụwa, ndị a egbuwokwa ọtụtụ narị puku mmadụ. N’ikwu okwu banyere nanị abụọ n’ime ndị a, akwụkwọ akụkọ Yorkshire Post nke October 19, 1989, kwuru, sị: “Na 1920, otu ala ọma jijiji e nwere n’ógbè Jiangsu nke China gburu 180,000 mmadụ, na July 28, 1976, China tara ahụhụ ala ọma jijiji kasị njọ e nweworo n’akụkọ ihe mere eme ya nke oge ọgbara ọhụrụ. Ya dịkarịa ala, 240,000 mmadụ nwụrụ mgbe obodo ahụ dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ bụ Tangshan fọrọ nke nta ka ọ dakpọọ kpam kpam site n’otu ala ọma jijiji nke ruru 7.8 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ a na-akparaghị ókè, bụ́ Richter scale.” Akwụkwọ akụkọ ahụ depụtara ihe karịrị 30 ala ọma jijiji ukwu ndị ọzọ ndị meworo n’ime narị afọ nke 20 nke a.
E bukwara amụma banyere ọrụ nkwusa Alaeze dị ka otu akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ nke ọnụnọ Jisọs a na-adịghị ahụ anya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ndị ahụ na-ajụ ya ajụjụ, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Dị ka Jisọs buru n’amụma, ihe karịrị 4,000,000 Ndịàmà Jehova nọ ugbu a na-arụ ọrụ nkwusa nke a gburugburu ụwa na 212 ala dị iche iche.
Mmezu nke oge a nke ndị a na amụma ndị ọzọ na-egosi na n’ezie, anyị na-ebi n’ime “mgbe ikpeazụ” ahụ. (2 Timoti 3:1-5) “Mkpagbu ukwu” ahụ nke Jisọs Kraịst bukwara amụma ya dị nnọọ nso n’ihu anyị. N’ịbụ nke ga-ejedebe ‘n’agha ahụ nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke onye pụrụ ime ihe nile’ na Ha–Magedọn, ọ ga-eweta ajọ usoro ihe dị ugbu a n’ọgwụgwụ ya. (Matiu 24:21; Mkpughe 16:14-16) Mgbe ahụ, ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere nkwa ya ga-abụ ihe dị adị n’ezie.a
Ngọzi Ndị Ụmụ Mmadụ Na-apụghị Iweta
Ndị ọchịchị na-anya isi banyere ọnọdụ ụwa ọhụrụ nke ha onwe ha ga-emepụta. Ma Jehova, bụ́ Chineke nke eluigwe na ala, adịghị mgbe ọ bụla ọ gwara ụmụ mmadụ ka ha jiri ụwa ọhụrụ dochie anya usoro ihe dị ugbu a. Ya onwe ya ga-eme nke ahụ n’ụbọchị na n’oge hour nke nanị ya maara. (Matiu 24:34, 36) Jọn onyeozi ahụ meworo agadi ebuworị ụzọ hụ ihe Chineke, ọ bụghị mmadụ, gaje ime:
“M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị; oké osimiri adịghịkwa ọzọ. M wee hụ obodo nsọ ahụ, bụ́ Jerusalem ọhụrụ, ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, site n’ebe Chineke nọ, e doziwo ya dị ka nwanyị a na-alụ ọhụrụ nke a chọworo ya mma nye di ya. M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọ ikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo. Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”—Mkpughe 21:1-5.
“Eluigwe ọhụrụ” ahụ bụ Alaeze eluigwe nke Jisọs Kraịst. “Ụwa ọhụrụ” ahụ abụghị mbara ala ọzọ bụ ụwa, kama ọ bụ òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ ndị bi n’elu mbara ala nke a—ha nile bụ ndị na-erube isi, ndị nọ n’okpuru Alaeze Kraịst, n’enweghị nkewa ọ bụla nke agbụrụ, mba, ma ọ bụ asụsụ. (Tụlee Abụ Ọma 96:1.) Eluigwe na ala nke dị ugbu a n’ụzọ ihe atụ—usoro ihe nke Ekwensu na nhazi ọchịchị ya nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eduzi—ga-abụ nke e bibiwororịị. (1 Jọn 5:19) Ọ bụ ezie na oké osimiri nkịtị ga-adịgide, oké osimiri ihe atụ ahụ nke ajọ ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ọgba aghara ga-apụ n’anya. Ndị ahụ ha na Jisọs ga-achị achị n’eluigwe bụ ha mejupụtara Jerusalem Ọhụrụ ahụ, sitekwa n’iso ya jikọọ aka, ha mejupụtara òtù ahụ bụ isi nke ga-achị usoro ụmụ mmadụ ndị ezi omume. Chineke ‘ga-ebinyere’ ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi n’ụzọ ihe atụ mgbe a nọ na-eme ka ha na ya dịghachi ná mma site na Kraịst n’ime Ụbọchị Ikpe ahụ nke ga-adị otu puku afọ.—Mkpughe 14:1-4; 20:6.
N’okpuru ọchịchị Alaeze, a ga-enwe ọtụtụ ihe mere a ga-eji nwee obi ụtọ. Iru újú, ịkwa ákwá, na ahụ ụfụ ndị na-esite n’ọrịa, mwute, na ihe ndị yiri ha ga-abụ ahụmahụ ndị gabigaworonụ. Ọbụna ọnwụ nke gbasazuuru ihe a kpọrọ mmadụ site ná nna anyị mbụ, bụ́ Adam onye mmehie, agaghị adịkwa ọzọ. (Ndị Rom 5:12) Lee nnọọ ọṅụ ga-ejupụta ebe nile mgbe ihe ahụ na-akpata anya mmiri gburugburu ụwa ga-apụworị n’anya ruo mgbe ebighị ebi!
Ọ bụghị ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ, kama ọ bụ Chineke n’onwe ya na-enye ihe a ga-eji kwere n’ihe banyere ngọzi ndị a. Ọ bụ ya bụ Onye na-asị: “Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” Ee, Jehova Chineke gwakwara Jọn onyeozi, sị: “Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”
Imezu Mkpa Ndị Bụ Isi
N’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke Chineke ga-eme ka ọ dịrị, mbara ala ga-emesịa ghọọ paradaịs. Nke a bụ ihe e ji n’aka, n’ihi na Jisọs kwere otu onye ajọ omume nwere nchegharị nke a kpọgburu n’akụkụ ya nkwa, sị: “N’ezie asị m gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43, NW) N’ime ọnọdụ paradaịs, a ga-egbo mkpa ụmụ mmadụ ndị dị ka ihe oriri na ebe obibi n’ụzọ zuru ezu.
Ụkọ nri na-egbu ọtụtụ nde mmadụ taa. N’agbanyeghị otú e si buru ezi ihe n’uche na-eme mgbalị inye ndị agụụ na-agụ nri, anyaukwu na ihe ndị ọzọ na-egbochi ụmụ mmadụ igbo mkpa ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Saturday Star, bụ́ akwụkwọ akụkọ a na-ebi na Johannesburg, South Africa, kọrọ, sị: “Nrụrịta ụka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọnụ ahịa dị elu nke mmanụ ụgbọ ala na ike ọgwụgwụ n’ihi mburịta agha ndị Africa nke yiri ihe na-agaghị agwụsị agwụsị na-ejikọ aka ime ka ihe enyemaka ghara irute n’oge . . . Na Sudan, bụ́ otu n’ime mba ndị kasị nọrọ n’agụụ, site na nde mmadụ 5 ruo nde 6 na-eche agụụ ngụgbu ihu na 1991.” Ma ụnwụ nri ga-abụ ihe e chefuru echefu n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke. N’okpuru ọchịchị Alaeze, ‘a gaje inwe ọtụtụ ọka n’elu ala; n’elu oké ugwu di iche iche, a gajekwa inwe njubiga ókè.’—Abụ Ọma 72:16.
Ebe obibi bụ mkpa ọzọ nke mmadụ nke a na-egbobeghị n’ụzọ zuru ezu ma ọlị nye ọtụtụ ndị n’oge anyị a. Ọtụtụ nde mmadụ na-ebi ná mkpọmkpọ ebe obibi dị iche iche ma ọ bụkwanụ na ha enweghị ebe obibi ma ọlị. Dị ka akwụkwọ akụkọ The New York Times si kọọ, n’otu mba dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, “n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta ihe ndị dị ka redio . . . , ndị ọrụ gbara 20 afọ na-echere ndepụta aha ga-adịru 73 afọ iji nweta ebe obibi,” otu akụkọ ndị gọọmenti bipụtara na-egosikwa na ụfọdụ ndị aghaghị ibi “n’ime ụlọ nkwakọba ihe, ọfịs, ma ọ bụ ọbụna n’ime ụlọ mposi.” Ma lee nnọọ ka ihe ga-esi dị iche n’ime ụwa ọhụrụ ahụ! N’ime Paradaịs ọdịnihu ahụ, “ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị m họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.”—Aịsaịa 65:21, 22.
Nsogbu ndị metụtara gburugburu ebe obibi ga-apụ kpam kpam n’ime ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa. Mmetọ ikuku ndị na-eyi ahụ ike egwu, ndị na-emebikwa ihe ọkụkụ agaghị adịkwa ọzọ. Mmetọ ikuku na mmiri na mbibi ebe obibi nke na-etinye ọtụtụ ụdị ihe ọkụkụ na anụmanụ n’ihe ize ndụ ugbu a agaghị abụkwa ihe ize ndụ n’oge ahụ. Ihe ndị dị ka ntalata nke ihe mkpuchi ozone agaghị etinyekwa ndụ n’elu ala n’ihe ize ndụ. Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova Chineke ga-egbo mkpa ndị a nile, n’ihi na Okwu ya na-ekwe anyị nkwa na n’oge na-adịghị anya, ọ gaje “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.”—Mkpughe 11:18.
N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ịlụ agha ga-abụkwa ihe mgbe gara aga, kama ọ bụghị n’ihi na ndị ọchịchị enwewo ihe ịga nke ọma n’ịnapụsị mba dị iche iche ngwá agha. Kama nke ahụ, Chineke ga-eme ihe n’ebe ndị ọchịchị na-enwebeghị ike ime ihe. Ọ ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi udo n’ikwekọ n’okwu ndị a nke onye ọbụ abụ ahụ: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova, onye doworo ihe iju anya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; ọ na-esure ụgbọ ala nile n’ọkụ.” (Abụ Ọma 46:8, 9) N’ime ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa nke dị ezi nso ugbu a, ụmụ mmadụ agaghị ebukwa agha ọzọ kama ha ga-enwe ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi.—Maịka 4:2-4.
Ị̀ Ga-anọ n’Ebe Ahụ?
Ị pụrụ inwe obi ike n’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke Jehova Chineke kweworo ná nkwa. Ọ dịghị ekwu okwu ụgha. (Ndị Hibru 6:17, 18) Okwu ya, bụ́ Bible, bụ eziokwu, ihe o kwere ná nkwa na-emezukwa mgbe nile.—Jọn 17:17.
Ozi ọma nke ngọzi ndị dị ebube nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi bụ ihe Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike iso ndị nile nwere obi eziokwu na-ekerịta. I kwesịrị ime mgbalị ugbu a iji nweta ihe ọmụma banyere nzube Chineke, meekwa ihe n’ịdabere ná nkwa ndị ahụ dị ebube a na-achọta n’ime Akwụkwọ Nsọ. Ime ihe dị otú a pụrụ iduje ná ndụ ebighị ebi, n’ihi na Jisọs sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihe ùgwù nke inweta ọṅụ n’oge obi ụtọ ahụ dị ezi nso n’ihu, n’ihi na ụwa ọhụrụ nke Chineke dị ezi nso!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isi 17 na 18 nke akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.