IHE ỌMỤMỤ NKE 36
A Kọwapụtara Isiokwu
NDỊ ọkà okwu nwere ahụmahụ maara uru inwe isiokwu bara. Mgbe ha na-akwadebe okwu ha, isiokwu ahụ na-enyere ha aka ilekwasị anya n’otu ihe ọmụma kpọmkwem na ichemikwu echiche na ya. Ihe ọ na-arụpụta bụ na kama ikwu okwu elu elu n’ọtụtụ ihe, ha na-ekwu okwu ha n’ụzọ ga-abara ndị na-ege ntị uru karị. Mgbe e jikọtara isi ihe nke ọ bụla na isiokwu ahụ kpọmkwem, mgbe ọ na-enyekwa aka ịkọwa ya, a na-enyere ndị na-ege ntị aka icheta isi ihe ndị ahụ na ịghọta mkpa ha dị.
Ị ga-ahụ na okwu gị ga na-adị mma karị ma i were ya na isiokwu gị bụ otu akụkụ nke i si na ya na-akọwa ihe ị na-ekwu maka ya. Alaeze, Bible, na mbilite n’ọnwụ bụ ihe ndị sara mbara a pụrụ ikwu okwu na ha. A pụrụ inwe ọtụtụ isiokwu dabeere n’ihe ndị a. Ndị a bụ ụfọdụ ihe atụ: “Alaeze ahụ, Ọchịchị Dị Adị n’Ezie,” “Alaeze Chineke Ga-eme Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs,” “Bible Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke,” “Bible Bụ Ihe Nduzi Bara Uru Maka Oge Anyị,” “Mbilite n’Ọnwụ Na-eme Ka Ndị Na-eru Újú Nwee Olileanya,” na “Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Na-enyere Anyị Aka Iguzosi Ike Mgbe Mkpagbu Na-eche Anyị Ihu.” Isiokwu a nile ga-achọ ka a kọwapụta ha n’ụzọ dịgasị nnọọ iche.
N’ikwekọ n’isiokwu nke Bible, nkwusa Jizọs Kraịst mere n’oge ọ na-eje ozi n’elu ala mere ka ọ pụta ìhè bụ́ isiokwu bụ́: “Alaeze nke eluigwe eruwo nso.” (Mat. 4:17) Olee otú e si kọwapụta isiokwu ahụ? E zoro aka n’Alaeze ahụ ihe karịrị ugboro 110 n’Oziọma anọ ahụ. Ma ihe Jizọs mere abụghị nanị ikwughachi okwu bụ́ “alaeze” ugboro ugboro. Ma site n’ihe ọ kụziri ma site n’ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, Jizọs mere ka o doo anya na ya, bụ́ onye nọ n’ebe ahụ, bụ Ọkpara Chineke, Mezaịa ahụ, onye Jehova ga-enye Alaeze ahụ. Jizọs gosikwara na e si n’aka ya na-emeghere ndị ọzọ ụzọ ikere òkè n’Alaeze ahụ. O mere ka a mata àgwà nke ndị a ga-enye ihe ùgwù ahụ na-aghaghị igosipụta. Site n’ihe ndị ọ kụziri nakwa ọrụ dị ike ndị ọ rụrụ, o mere ka ihe Alaeze Chineke ga-apụta ná ndụ ndị mmadụ doo anya, ọ kọwapụtakwara na nchụpụ ọ chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike mmụọ nsọ Chineke bụ ihe àmà na-egosi na “alaeze Chineke abịakwasịwo” ndị na-ege ya ntị n’ezie. (Luk 11:20) Ọ bụ Alaeze ahụ ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gbaa àmà maka ya.—Mat. 10:7; 24:14.
Iji Isiokwu Kwesịrị Ekwesị Eme Ihe. A sịghị gị kọwaa otu isiokwu ruo n’ókè Bible kọwara ya, kama inwe isiokwu kwesịrị ekwesị dịkwa mkpa.
Ọ bụrụ na ọ bụ gị ga-eji aka gị họrọ isiokwu gị, buru ụzọ tụlee ebumnobi nke okwu gị. Mgbe ahụ, ka ị na-ahọrọ isi ihe ndị ga-adị n’ihe ndepụta gị, jide n’aka na n’ezie ha na-akwado isiokwu ahụ ị họọrọ.
Ọ bụrụ na e kenyere gị isiokwu, jiri nlezianya tụlee ihe ọ na-egosi banyere otú ị ga-esi kwadebe okwu gị. Ọ pụrụ ịchọ mgbalị iji ghọta uru isiokwu dị otú ahụ bara na ihe ndị ọ gụnyere. Ọ bụrụ na ọ bụ gị ga-ahọrọ ihe ndị ị ga-eji kọwaa isiokwu ahụ e kenyere gị, jiri nlezianya họrọ ha ka isiokwu ahụ wee pụta ìhè. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na e nyere gị ihe ị ga-ekwu, ọ ka dịkwa gị mkpa ịtụle otú ị ga-esi jiri ya mee ihe n’ikwekọ n’isiokwu ahụ. Ọ dịkwa mkpa ka ị tụlee ihe mere ihe ọmụma ahụ ji dị ndị na-ege gị ntị mkpa na ihe kwesịrị ịbụ ebumnobi i ji na-ekwu ya. Nke a ga-enyere gị aka ikpebi ihe ị ga-emesi ike mgbe ị na-ekwu okwu gị.
Ụzọ Isi Mesie Isiokwu ahụ Ike. Iji mesie isiokwu ahụ ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ị ghaghị ịtọ ntọala ya mgbe ị na-ahọrọ ma na-ahazi ihe ị ga-ekwu. Ọ bụrụ na i jiri nanị ihe ndị na-akwado isiokwu gị mee ihe, ọ bụrụkwa na ị gbasoo ụkpụrụ ndị dị n’ịkwadebe ihe ndepụta dị mma, ọ ga-afọ nke nta ka ọ bụrụ na ị ga-emesi isiokwu ahụ ike n’etinyeghị mgbalị.
Ikwughachi ihe pụrụ inye aka n’imesi isiokwu ahụ ike. N’egwú ụfọdụ, isiokwu egwú bụ okwu ndị dị n’egwú bụ́ nke a na-agụghachi ugboro ugboro nke na a na-eji ha amara egwú ahụ dum. A dịghị eji otu olu ahụ agụghachi ha mgbe nile. Mgbe ụfọdụ, a na-agụ otu nkebi ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ, mgbe ụfọdụ a na-agụ ya n’ụzọ ọzọ, ma otú ọ sọrọ ya dịrị, onye gụrụ ya na-eji nkà ewebata okwu egwú ndị ahụ ugboro ugboro ruo mgbe ha jupụtara n’egwú ahụ dum. Ọ bụ otú ahụ ka o kwesịrị ịdị banyere isiokwu nke okwu gị. Ikwughachi okwu ndị bụ́ isi dị n’isiokwu ahụ yiri okwu ndị dị n’egwú nke a na-agụghachi ugboro ugboro. Iji okwu ndị ha na okwu ndị a pụtara otu ihe eme ihe ma ọ bụ ikwughachi isiokwu ahụ n’ụdị ọzọ na-eme ka a gbanwetụ isiokwu ahụ. Iji ụzọ dị otú a eme ihe ga-eme ka isiokwu ahụ bụrụ echiche bụ́ isi nke ndị na-ege gị ntị ga na-echeta.
Ụkpụrụ ndị a na-emetụta ọ bụghị nanị okwu ndị a nọ n’ikpo okwu na-ekwu kamakwa mkparịta ụka ndị a na-enwe n’ozi ubi. Mkparịta ụka nke dịtụ mkpirikpi na-aghọ nke dị mfe icheta karị ma ọ bụrụ na isiokwu ya apụta ìhè. A ga-echeta ntụziaka e nyere n’ọmụmụ Bible ngwa ngwa karị ma ọ bụrụ na e mesiri otu isiokwu ike. Mgbalị ị na-etinye n’ịhọrọ na n’ịkọwapụta isiokwu ndị kwesịrị ekwesị ga-eme nnọọ ka ị dịkwuo irè dị ka ọkà okwu na dị ka onye ozizi nke Okwu Chineke.