Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • tp isi 4 p. 34-42
  • Mbibi Ụwa Gasịa—E Nwee Udo Zuru Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mbibi Ụwa Gasịa—E Nwee Udo Zuru Ụwa
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Bible Buru n’Amụma Na-enye Olileanya
  • Ihe Mere Usoro nke a Ga-eji Gabiga Ka Ezi Udo Wee Bịa
  • Uru Ndị Ọ Ga-eweta
  • Olee Ndị Ga-abụ Ndị Lanarịrị?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ụwa A Ọ̀ Na-aga Ịgwụ n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Buru Ụbọchị Jehova n’Uche
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
tp isi 4 p. 34-42

Isi 4

Mbibi Ụwa Gasịa—E Nwee Udo Zuru Ụwa

1-3. (a) Gịnị bụ mbibi ụwa nke ndị ndú bụ mmadụ na-adọ aka ná ntị banyere ya? (b) Gịnị mere na nke ahụ abụghị ihe Bible na-ezo aka na ya dị ka mbibi ụwa nke ga-emeghe ụzọ maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi na-adịgide adịgide?

DỊ KA amụma Bible si kwuo, tupu ụmụ mmadụ enwee ike inweta udo na-adịgide adịgide, aghaghị ibu ụzọ nwee mbibi nke ụwa. (2 Pita 3:5-7) Ma gịnị mere nke ahụ ji dị mkpa? N’ole ebe ka mbibi ahụ ga-esi bịa? Gịnị ka ọ ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’elu ala nke a?

2 Na mbụ, anyị kwesịrị ịghọta na mbibi ụwa nke Bible buru amụma ya abụghị otu ihe ahụ dị ka mbibi ahụ nke ọtụtụ ndị ndú ụwa, ndị ọkà mmụta sayensi na ndị ọzọ na-adọ aka ná ntị banyere ya. Mbibi nke ha na-ekwu banyere ya ga-abịa n’ụdị ọdachi ụfọdụ nke mmadụ kpatara, nke ihe butere ya bụ ihe ndị dị ka mmetọ mbara, ma ọ bụ ịsọ mpi ná mmepụta ngwa agha nuklia, ma ọ bụkwanụ ha abụọ. Ma, otú ọ dị, ụdị mbibi nke a agaghị ahapụ olileanya ọ bụla maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi na-adịgide adịgide n’elu ala nke a.

3 Ụwa agaghị adịkwa mma maka ihe ndị dị ndụ. Dị ka ihe atụ, ụzarị nuklia ma ọ bụ “oyi nuklia” nke a na-atụ anya ya agaghị ahapụ ndị lanarịrị alanarị n’ọnọdụ ka mma—ma ọ bụrụ na ọ bụghị na nke ka njọ—karịa nke ndị nwụrụ anwụ. Nlanarị ga-abụ nnọọ ihe ndabara n’ụzọ ka ukwuu, ọ bụ ezie na ndị ogbenye ga-eso na ndị mbụ ga-ata ahụhụ. Olileanya dị aṅaa ka ị̀ ga-enwe na ị ga-eso ná ndị ga-alanarị ụdị mbibi nke a? Ọ bụrụgodi na ị lanarị, olileanya dị aṅaa ka a ga-enwe na ndụ agaghị alaghachikwa azụ n’otu ụdị nke oké esemokwu a na-amaghị ama jupụtara ebe nile ugbu a?

Ihe Bible Buru n’Amụma Na-enye Olileanya

4. Olee ndị a ga-ebibi ná mbibi ụwa nke Bible na-ekwu maka ya?

4 Ihe mere mbibi ụwa nke Bible na-ekwu ji dị iche bụ na ọ ga-akpa ókè, nweekwa nzube. Ọ gaghị abụ ụdị mbibi nke na-abịa dị ka njedebe nke ihe ndị a na-emezighị emezi nke mmadụ mere. Kama igbu ndị mmadụ n’ụzọ a na-akparaghị ókè, ọ ga-ewepụ pụọ n’ụwa nanị ndị ahụ kwesịrị nnọọ mbibi. Ụdị mbibi nke a nke ụwa kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke dị n’Ilu 2:21, 22: “N’ihi na ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”

5, 6. (a) Olee ihe ga-eme ala n’onwe ya n’oge mbibi ụwa ahụ? (b) N’ụzọ dị otú a, ọ̀ ga-esi aṅaa bụrụ “dị ka ụbọchị Noa dịrị”?

5 Ya mere, gịnị ka a ga-ebibi? Ọtụtụ na-eche na Bible na-ebu amụma nke isuresị mbara ala bụ Ụwa na ihe nile nọ n’elu ya n’ọkụ. Ma ọ dịghị otú ahụ. Jisọs Kraịst n’onwe ya sịrị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) N’ezie, ‘ihe nketa’ ahụ agaghị abụ ụwa e suchapụrụ n’ọkụ nke ndụ na-adịghịkwa na ya! Bible na-enyekwa okwu imesi obi ike doro anya nke Chineke na ụwa ga-adị ruo mgbe ebighị ebi dị ka ebe ụmụ mmadụ ga-ebi.—Abụ Ọma 104:5; Aịsaịa 45:18; Matiu 6:9, 10.

6 N’ikwekọ na nke a, Bible na-ekwu banyere ndị ga-alanarị ma fọdụ n’elu ala mgbe “mkpagbu ukwu” ahụ gasịrị. Jisọs Kraịst kwuru na “dị ka ụbọchị Noa dịrị, otú a ka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ga-adị.” Mgbe e nwere mbibi nke ụwa nile n’oge Noa, e nwekwara ndị lanarịrị.—Matiu 24:21, 37; 2 Pita 2:5, 9; Mkpughe 7:9, 10, 13, 14.

7. Gịnị bụ ihe ga-abịa ná njedebe ya n’oge ahụ?

7 Gịnị ka a ga-ebibi? Ọ bụ usoro ihe dị iche iche gburugburu ụwa nke ụmụ mmadụ wuworo n’elu ala—tinyere ndị nile na-akwado ya kama ilegara Chineke na ọchịchị ya e kwere ná nkwa maka ụwa anya. (Abụ Ọma 73:27, 28) Ọ bụ ya mere na a sụgharịrị okwu ahụ bụ “ọgwụgwụ ụwa” nke a na-ahụta ná nsụgharị ụfọdụ nke Bible nke ọma karị na Bible ndị ọzọ dị ka “ngwụcha nke ọgbọ” (NE), “ọgwụgwụ nke ọgbọ” (Ro), “ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a” (NW).—Matiu 24:3.

8. (a) Site n’ole ebe ka mbibi ahụ ga-esi bịa? (b) Nke a aghaghị ime tupu usoro ihe dị ugbu a nke ụwa eruo ọnọdụ dị aṅaa?

8 Isi iyi nke mbibi ụwa na-abịa—agaghị abụ ụmụ mmadụ—kama Jehova Chineke. Mmetụta ọjọọ nile nke oge ugbu a nke mmetọ mbara, ụnwụ nri, oké egwu nuklia na ihe ndị yiri ha, ndị sitere n’enweghị amamihe, emezighị ihe, na ịrụ arụ nke mmadụ, abụghị ihe ga-akpata mbibi ahụ. Kama nke ahụ, ndị a bụ ihe ndị na-egosipụta ọchịchọ onwe nanị na ịkpụ afọ n’ala nke usoro ihe nke oge a. Ha na-enye ezi ihe mere Jehova ga-eji zachapụ usoro ahụ kpam kpam. O kwere nkwa ime ihe dị otú ahụ tupu ụwa ugbu a a na-eru ma ọlị n’ọnọdụ nke ndakpọ ma ọ bụ weta mbibi nke onwe ya. (Mkpughe 11:17, 18) Ma nanị ime ihe nke oké mgbanwe a ọ̀ bụ nanị ụzọ dịnụ n’ezie?

Ihe Mere Usoro nke a Ga-eji Gabiga Ka Ezi Udo Wee Bịa

9, 10. Olee otú akụkọ ihe mere eme nke ụmụ mmadụ si egosi na a chọrọ ihe omume siri ike nke ukwuu karịa nanị imezigharị ụwa dị ugbu a?

9 Ụfọdụ pụrụ iche na o kwesịrị ka Chineke mee nanị mgbanwe ụfọdụ n’ime usoro ihe nke a, kama ibibi ya. Ma Bible na-egosi na Chineke matara na n’ụzọ ọ ga-ekwe omume, o nwekwaghị mmekwata.

10 Tụlee n’onwe gị ọtụtụ mgbanwe ndị ụmụ mmadụ meworo kemgbe ọtụtụ narị afọ. Chee echiche banyere ụdị ọchịchị dị iche iche nile nke ụmụ mmadụ wepụtaworo. E nwewo ọchịchị ime ime obodo, ọchịchị onyeeze, ọchịchị onye kwuo uche ya, ọchịchị nke kọmunist na ọchịchị ọha na eze, na ọchichị aka ike. Cheta otú a na-eji ọchịchị ọhụrụ ọtụtụ ugbo dochie onye na-achị isi ma ọ bụ ọchịchị nke dị n’oge ahụ—site ná ntụli aka, ịgba mgba okpuru n’aka ike ma ọ bụ site ná nkwatu ọchịchị. Ma e nwebeghị ihe ngwọta na-adịgide adịgide nye nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọbụna ndị mmadụ chọsiri ike ịnwa imeziwanye ọnọdụ nke mmadụ na-abụ ndị e mere ka mgbalị nile ha kpuo ihu n’ala n’usoro ihe nke a kpọchinyere ha n’ime ya. Dị ka otu onye ọchịchị oge ochie nke nwere amamihe chọpụtara, site ná mgbalị nile nke mmadụ nanị, “ihe nke gbagọrọ agbagọ, a pụghị ime ka ọ dịzie.”—Eklisiastis 1:14, 15.

11-13. (a) Gịnị na-egbochi ndị mmadụ ime mgbanwe n’usoro ihe dị ugbu a maka ọdịmma nke ihe nile a kpọrọ mmadụ? (b) Ya mere, olee otú a pụrụ isi maa atụ ókè nke mgbanwe a chọrọ?

11 Obodo ukwu nile nke ụwa, dị ka ihe atụ, jupụtara ná nsogbu. Ma mmadụ apụghị ịkwatusi ha ma malite n’isi. Otu ihe ahụ dị n’usoro nile nke akụ na ụba na ọrụ mmepụta ihe nke ụwa. Ọdịmma onwe nanị na ịhụ mba n’anya na-emegide ma na-egbochikwa ezi mgbanwe ihe maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ ka ha hà.

12 Usoro ihe nile siri otú a dị ka ụlọ e wukwasịrị ná ntọala ọjọọ, na-eji ụkpụrụ iwu ụlọ na-adịghị mma, jirikwa ngwa ọrụ ndị na-adịghị mma wuo. Olee uru ọ bara ịkwazigharị arịa ụlọ dị n’ime ya ma ọ bụ chọgharịa ya mma? Ruo ogologo oge ọ na-eguzo, nsogbu ya nile ga na-aga n’ihu, ụlọ ahụ ga na-emebiwanyekwa. Nanị ihe ọ bụ amamihe ime bụ ịkwatu ụlọ ahụ ma wuo ọzọ, n’elu ntọala dị mma.

13 Jisọs Kraịst jiri otu ilu yitụrụ ya wee na-asị na ndị mmadụ anaghị “agbanyekwa mmanya vine ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie.” Mmanya vine ọhụrụ ahụ ga-agbọwa karama ochie ahụ. (Matiu 9:17) Ya mere, ọ nwaghị imezighachi usoro ihe dị iche iche nke ndị Juu nke ọ dịrị ndụ n’okpuru ya. Kama nke ahụ, o kwusara Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya e nwere maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. (Luk 8:1; 11:2; 12:31) Ya mere, n’oge anyị a kwa, Jehova Chineke agajeghị nanị imezigharị usoro ihe dị iche iche nke oge ugbu a n’ihi na nke ahụ agaghị eweta uru ọ bụla na-adịgide adịgide.

14. Inye iwu ndị ọhụrụ ọ̀ ga-eme ka ndị mmadụ hụ ezi omume n’anya?

14 Okwu Chineke na-emesi eziokwu ahụ ike nke bụ na ọ pụghị ikwe mee ịkụnye ezi omume n’obi ndị mmadụ. Ọ bụrụ na ha enweghị ịhụnanya maka ihe ziri ezi, ọ dịghị ókè nke imebe iwu ga-etinye ya n’ebe ahụ. N’Aịsaịa 26:10 anyị na-agụ, sị: “A sị na e meere onye na-emebi iwu amara, ọ gaghị amụta ezi omume; n’ala nke izi ezi nile ọ ga-eme ajọ omume, ma ọ gaghị ahụ ịdị elu nke Jehova.”—Tụlee Ilu 29:1.

15, 16. N’ụzọ dị aṅaa ka enweghị ezi ịhụnanya na ezi omume nke ọtụtụ ndị si apụta ìhè ná mmeghachi omume ha banyere uche Chineke?

15 Ihe bụ eziokwu nke dị ilu bụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-ahọrọ ịnọgide n’usoro ihe nke a n’agbanyeghị ọdịda na ihe ọjọọ ya nile. Ha achọghị ichigharịkwute ezi omume ma nọrọkwa n’okpuru ịchịisi sitere n’aka Chineke. Ha pụrụ ịhụ ịrụ arụ nke usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa nke a, abaghị uru nke agha ya, ihu abụọ nke okpukpe ya nile, na ihe àmà doro anya nke na nkà na ụzụ ya ewetawo ọtụtụ nsogbu karịa ka ọ gwọtaworo. Ma n’agbanyeghị ihe ndị a nile, ọtụtụ na-ahọrọ ka a raba ha n’echiche hiere ụzọ nke ịnọ ná ntụkwasị obi site n’aka ndị ndú okpukpe na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị mmasị ha dabeere n’ịhụ na ihe na-aga dị ka ọ dị na mbụ. Ha dị ka ndị Israel ahụ Chineke kwuru banyere ha, sị: “Ndị amụma ebuwo amụma ụgha, ndị nchụàjà na-azọdakwa ndị m site n’aka ha; ndị m ahụwokwa ihe dị otú a n’anya: ma gịnị ka unu ga-eme n’ikpeazụ ya?”—Jeremaịa 5:31; Aịsaịa 30:12, 13.

16 Ị ghaghị ịmataworị ndị mmadụ ndị nwere omume na-etinye ahụ ike nke ha onwe ha na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ezinụlọ ha n’ihe ize ndụ. Ma ha na-eguzogide mgbalị nile a na-eme iji nyere ha aka ịgbanwe. Ma mgbe ndị mmadụ guzogidere ndụmọdụ na nduzi Chineke, ọnọdụ ha na-adị njọ karị nke ukwuu. Ndị na-eme nke a na-egosi n’ezie na ha ahụghị eziokwu na ezi omume n’anya. Banyere ndị dị otú ahụ, Jisọs sịrị: “N’ihi na obi ndị nke a mara abụba, ntị ha kpọchikwara, ha kpuchikwara anya ha; ka ha ghara iwere anya ha hụ ụzọ ma eleghị anya, gharakwa iwere ntị ha nụ ihe, gharakwa iwere obi ha ghọta, gharakwa ichigharị, ka [Chineke] gharakwa ime ka ahụ dị ha ike.”—Matiu 13:15.

17. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na Chineke enweghị mmasị n’iweta mbibi nye ihe a kpọrọ mmadụ, n’ihi gịnị ka ọ ga-eji weta ya?

17 N’ụzọ ziri ezi, ndidi na obi ebere Chineke nwere njedebe. Ma ọ bụghị ya, olee ebe ịhụnanya ya maka ndị ezi omume ga-adị? Ọ pụghị ikwuchi ntị ghara ịnụ arịrịọ ha nile maka nnapụta pụọ n’ahụhụ nke mmebi iwu na-eweta n’elu ala nke a. (Luk 18:7, 8; Ilu 29:2, 16) Ya mere, ọnọdụ ndị dịnụ chọrọ mbibi ụwa. Ha na-akwali Chineke ime ihe ma ọ bụrụ na ọ ga-anọgide na-eme ihe ziri ezi na ọ bụrụkwa na ọ ga-egosi ebere nye ndị ahụ hụkwara ihe ziri ezi n’anya. Ọ bụghị na Chineke nwere mmasị n’iwetara ụmụ mmadụ mbibi. “Ọ̀ na-atọ m ụtọ ma ọlị, bụ́ ọnwụ nke onye na-emebi iwu? (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta): ọ́ dịghị atọ m ụtọ mgbe o si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ? . . . Ya bụ chigharịanụ, wee dị ndụ.”—Ezikiel 18:23, 32.

18. Ụgwọ dị aṅaa ka a na-aghaghị ịkwụ iji gbapụta ndị hụrụ ezi ihe n’anya pụọ n’anọghị ná ntụkwasị obi?

18 Ya mere, mbibi nke ndị ahụ họọrọ usoro ihe dị iche iche nke a bụ ụgwọ a na-aghaghị ịkwụ iji gbapụta ndị hụrụ ihe ziri ezi n’anya pụọ n’enweghị ịnọ ná ntụkwasị obi na ahụhụ. Nke a kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible nke bụ́: “Ihe mgbapụta ịgbapụta onye ezi omume ka onye na-emebi iwu bụ.”—Ilu 21:18; tụlee Aịsaịa 43:1, 3, 4.

Uru Ndị Ọ Ga-eweta

19. Ihe mgbochi ndị dị aṅaa megide udo zuru ụwa ọnụ ka a ga-ewepụ site ná mbibi nke usoro ihe dị iche iche nke a?

19 Mbibi nke usoro ihe nke a na ndị nkwado ya ga-enye ohere maka usoro ihe ọhụrụ nke ezi omume gburugburu ụwa, bụ́ ebe ndị lanarịrịnụ ga-enwe ike ịrụkọ ọrụ n’ịdị n’otu, ọ bụghị n’ịma aka ọchịchọ onwe onye nanị. A ga-etidasị ịkpa ókè ala nke mba nile na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ekewasị ndị mmadụ. Oké ibu arọ nile nke ihe a na-emefu n’ihi agha agaghị adịkwa ọzọ. Ịkpa ókè ọha mmadụ nke gbochiworo ụmụ mmadụ ịbụ otu ezinụlọ dị n’otu agaghị adịkwa ọzọ. Otu ihe dị mkpa dị n’ihe a nile ga-abụ na onye ọ bụla dị ndụ mgbe ahụ ga-asụ ‘otu asụsụ ahụ dị ọcha’ nke eziokwu otu onye na ibe ya, na-efe Onye Okike ahụ ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” Nke a ga-eme ka ha nwere onwe ha pụọ n’ịtụ ụjọ efu nke okpukpe, omenala dị iche iche na nkwenkwe ndị mmadụ guzobere, bụ́ ndị na-akpata nkewa.—Zefanaịa 3:8, 9; Jọn 4:23, 24.

20. Dị ka Abụ Ọma 72 gosiri, ọnọdụ ndị dị aṅaa ga-adị gburugburu ụwa?

20 Site n’ọchịchị Chineke n’aka Ọkpara ya bụ Kraịst Jisọs ịchị isi n’elu ala nile nanị ya, a ga-enwe mmezu nke Abụ Ọma ochie ahụ nke Bible nke bụ: “Onye ezi omume ga-amakwa akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị. Ya nweekwa ike n’ahụ mmadụ site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa.”—Abụ Ọma 72:7, 8.

21. Ụwa n’onwe ya ọ̀ ga-esi aṅaa rite uru site ná mbibi ụwa nke na-abịa?

21 Ala ga-erite uru site ná mbibi ụwa nke na-abịa. Ndị anya ukwu na-emetọ ya na ndị mmebi ihe obi tara mmiri agaghị emebikwa ya ọzọ. Ezu nile, osimiri nile, oké osimiri nile, na ikuku ga-enwere onwe ha pụọ n’ihe a jụrụ ajụ nile a wụnyere n’ime ha, ma jiri nwayọọ nwayọọ mee onwe ha ka ha dị ọcha. Chineke ga-esi otú a gosipụta na ya agbakụtabeghị nzube ya nke inwe mbara ala dị ka ubi, nke dị ọcha, nke jupụtara ná mmadụ ndị na-egosipụta àgwà nile dị ụtọ nke Onye Kere ha, azụ.—Jenesis 1:26-28; Aịsaịa 45:18; 55:10, 11.

22. Olee otú mweta mbibi dị otú a si kwekọọ na Chineke ịbụ ‘Chineke nke udo’?

22 Ya mere, Chineke iweta mbibi ụwa emegideghị ya ịbụ “Chineke nke udo.” O megideghịkwa ọbụbụ Jisọs bụ “Onyeisi Udo.” Ọ bụ n’ihi ịhụnanya ha hụrụ udo na ikpe ziri ezi ka ha na-eme ihe a iji weghachi ụwa n’ọnọdụ dị ọcha nke ezi omume.—1 Ndị Kọrint 14:33; Aịsaịa 9:6, 7.

23, 24. Ọ bụrụ na anyị ga-enwe ọdịnihu nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, gịnị dị mkpa ugbu a ka anyị mee n’otu n’otu?

23 Ya mere, gịnị ka o kwesịrị ka anyị mee n’otu n’otu? Jisọs gosiri na ndị na-elelị ndụmọdụ Chineke na-ewu olileanya ha maka ọdịnihu n’elu “ájá,” nakwa na ụdị ihe owuwu ahụ agaghị alanarị ma ọlị oké ikuku mbibi na-abịanụ. O gosiri oké mkpa ọ dị iwukwasị olileanya anyị ná nrubeisi nye Okwu Chineke ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta ọdịnihu udo na ịnọ ná ntụkwasị obi.—Matiu 7:24-27.

24 Ma gịnị mere Chineke ji na-echere ọtụtụ oge ndị a tupu o weta mmebi iwu na ahụhụ ná njedebe? Bible zakwara ajụjụ nke a, ọ na-egosikwa ihe Chineke na-emerị kemgbe ọtụtụ narị afọ ndị gafeworonụ iji rụzuo nzube ya.

[Foto dị na peeji nke 37]

Dị nnọọ ka ndị mmadụ lanarịrị Iju Mmiri ahụ, a ga-enwekwa ndị ga-alanarị “mkpagbu ukwu” ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya