Gịnị Meworo Ịhụnanya Maka Ndị Agbata Obi?
ỌTỤTỤ nde mmadụ na-enwe mmetụta nke amaghị ihe a ga-eme, ịtụ ụjọ, na nhụsianya, n’enweghị ebe ha ga-agbaga. “Ana m eri nri nanị m, na-agagharị nanị m, na-ehi ụra nanị m ma na-agwa onwe m okwu,” ka otu onye kwara n’arịrị. Ole na ole dị njikere ịgakwuru na imere ndị nọ ná mkpa ihe n’ụzọ ịhụnanya.
Otu nwanyị bụ́ ọchụ ntá ego laworo ezumike nká kwuru, sị: ‘Otu mgbede otu nwanyị di ya nwụrụ mụ na ya bi n’otu okpukpu ụlọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m ma kwuo na owu na-ama ya. Eji m ire ọma gwa ya n’ezoghị ọnụ na m ji ọrụ n’aka. Ọ rịọrọ mgbaghara maka inye m nsogbu wee pụọ.’
Nwanyị ahụ gara n’ihu kwuo, sị: ‘Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu n’ihi na ekweghị m ka onye dị otú ahụ na-agwụ mmadụ ike nweta m. Ná mgbede echi ya otu enyi m kpọrọ m na fon ma jụọ ma m maara nwanyị ahụ mụ na ya bi n’otu ụlọ nke gburu onwe ya n’abalị ụnyaahụ. Ọ bụrụ na ị kọtabeghị onye ọ bụ, ọ bụ nwanyị ahụ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m.’ Mgbe e mesịrị, nwanyị ahụ bụ́ ọchụ ntá ego kwuru na ya enwetawo “ihe mmụta dị ike.”
O doro anya na ụmụ ọhụrụ a na-egosighị ịhụnanya pụrụ ịnwụ. Ndị mere okenye karị pụkwara ịnwụ ma ọ bụrụ na ha enwetaghị ịhụnanya. N’otu ihe otu onye gburu onwe ya dere, otu nwatakịrị mara mma nke dị afọ 15 dere, sị: “Ịhụnanya bụ abụkwaghị onye owu na-ama.”
Ọdachi nke Oge A
Ka ọ na-ekwu n’afọ ole na ole gara aga banyere ịkpọasị agbụrụ, Newsweek kọrọ, sị: “‘Kpọọ onye agbata obi gị asị’ yiri ka ọ bụ ụkpụrụ nduzi nke afọ a.” N’oge a na-alụ ọgụ na Bosnia na Herzegovina, nke bụbu akụkụ Yugoslavia, a chụpụrụ ihe karịrị otu nde mmadụ n’ebe obibi ha, gbuokwa ọtụtụ iri puku. Olee ndị mere ya? “Ndị agbata obi anyị,” ka otu nwatakịrị nwanyị a chụpụworo n’obodo nta ha kwara n’arịrị. “Anyị ma ha.”
“Anyị na-ebikọbu ọnụ n’udo,” ka otu nwanyị kwuru banyere ndị Hutu na ndị Tutsi 3,000 bi n’obodo nta bụ́ Ruganda. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru, sị: “Akụkọ banyere obodo nta a bụ otu akụkọ ahụ banyere Rwanda: ndị Hutu na ndị Tutsi ibikọ ọnụ, ịlụkọrịta di na nwunye, n’enweghị nchegbu ma ọ bụ ọbụna n’amaghị onye bụ onye Hutu na onye bụ onye Tutsi. Mgbe ahụ ihe gbanwere n’otu ntabi anya,” ‘ogbugbu ndị ahụ malitekwara.’
N’otu aka ahụ, ndị Juu na ndị Arab nọ n’Israel bikọta ọnụ, ma ọtụtụ kpọrọ ibe ha asị. Na narị afọ nke 20 a nile, ọnọdụ ndị yiri ha ebilitewo na Northern Ireland, n’India na Pakistan, na Malaysia na Indonesia, na n’etiti agbụrụ ndị dị na United States—ee, gburugburu ụwa anyị bi n’ime ya.
Mmadụ pụrụ ịga n’ihu na-ehota ihe atụ dị iche iche nke ịkpọasị agbụrụ na nke okpukpe. Ọ dịtụbeghị n’akụkọ ihe mere eme mgbe ịhụnanya na-adịghị n’ụwa otú a.
Ònye Ka Ụta Dịịrị?
Dịkwa ka ịhụnanya, a na-akụzi ịkpọasị akụzi. Otu egwú a ma ama na-ekwu na a ‘na-akụziri ụmụaka tupu oge agafee/Tupu i ruo afọ isii ma ọ bụ asaa ma ọ bụ asatọ/Ịkpọ ndị nile ndị ikwu gị kpọrọ asị asị.’ A na-akụzi ịkpọasị taa karịsịa. Chọọchị dị iche iche karịsịa akụzibeghịrị ndị òtù ha ịhụ n’anya.
Akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Monde jụrụ, sị: “Olee otú mmadụ pụrụ isi kwụsị iche na ndị Tutsi na ndị Hutu ndị na-eburịta agha na Burundi na Rwanda bụ ndị otu ndị ozi ala ọzọ nke ndị Kraịst nyere ọzụzụ, bụrụkwa ndị na-eje otu chọọchị ahụ?” N’ezie, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ National Catholic Reporter si kwuo, Rwanda bụ “mba nke 70% n’ime ya bụ ndị Katọlik.”
Ná mmalite narị afọ a, mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe chigharịkwuuru Ọchịchị Kọmunist nke na-ekweghị na Chineke. N’ihi gịnị? Na 1960, onyeisi nke otu ngalaba mmụta okpukpe na Prague, Czechoslovakia, kwuru, sị: “Ọ bụ anyị, nanị anyị bụ́ ndị Kraịst, ka ụta dịịrị maka Ọchịchị Kọmunist. . . . Cheta na ndị Kọmunist nwere mgbe ha bụ ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ha ekweghị na e nwere Chineke nke na-ekpe ikpe ziri ezi, ònye ka o si n’aka?”
Tụlee ihe chọọchị dị iche iche mere n’oge Agha Ụwa Mbụ. Onye Britain bụ́ brigadier general Frank Crozier kwuru banyere agha ahụ, sị: “Chọọchị ndị Kraịst bụ ndị kasị akpalite ọchịchọ ịkwafu ọbara anyị nwere, anyị jikwa ha mee ihe nke ọma.” Ka e mesịrị, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, The New York Times kwuru, sị: “N’oge gara aga òtù ndị ụkọchukwu Katọlik nọ n’ebe dị iche iche anọgidewo na-akwado ihe ka ọtụtụ n’agha nile nke mba ha, na-agọzi ndị agha ma na-ekpe ekpere maka inwe mmeri, ebe òtù ndị bishọp nọ n’akụkụ nke ọzọ kpeworo ekpere n’ihu ọha ka nke ahụ ghara ime.”
Ma, Jisọs Kraịst gosipụtara ịhụnanya n’ihe nile o mere, Pọl onyeozi dekwara, sị: “Unu onwe unu bụ ndị Chineke ziworo ịhụrịta ibe unu n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:9, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) “Ezi ndị Kraịst bụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị n’ime Jisọs Kraịst,” ka otu onye ọrụ edemede maka akwụkwọ akụkọ bụ́ Sun nke Vancouver kwuru. “Ọ dịghị mgbe ha ga-ama ụma merụọ ibe ha ahụ.”
N’ụzọ doro anya, ụta dị ukwuu dịịrị chọọchị dị iche iche maka enweghị ịhụnanya dị taa. Otu ihe odide e bipụtara na magazin bụ́ India Today kwuru, sị: “E mewo mpụ ndị kasị njọ n’aha okpukpe.” Otú ọ dị, e nwere ihe bụ́ isi mere e jiworo jiri ụdị enweghị nchebara echiche nke obi ịta mmiri dị otú ahụ banyere ndị ọzọ mara ọgbọ anyị.
Ihe Mere Ịhụnanya Jiworo Jụọ Oyi
Onye Okike anyị na-enye azịza ya. Okwu ya, bụ́ Bible, na-akpọ oge anyị bi n’ime ya “mgbe ikpeazụ.” Amụma Bible na-egosi na nke a bụ oge mgbe ndị mmadụ ga-abụ “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ.” Banyere “oge dị oké egwu” ndị a, nke a kpọkwara “ọgwụgwụ oge a” n’Akwụkwọ Nsọ, Jisọs Kraịst buru amụma na “ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.”—2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3, 12.
Ya mere, enweghị ịhụnanya dị taa so n’ihe àmà na-egosi na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke ụwa a. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ pụtakwara na ụwa ọhụrụ ezi omume nke ịhụnanya ga-achị n’ime ya ga-anọchi anya ụwa a nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’isi nso.—Matiu 24:3-14; 2 Pita 3:7, 13.
Ma ànyị nwere n’ezie ihe mere anyị ga-eji kwenye na mgbanwe dị otú ahụ ga-ekwe omume—na anyị ga-enwe ike ibi n’ime ụwa ebe mmadụ nile ga-ahụ ibe ha n’anya ma na-ebikọ ọnụ n’udo?