Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp20 nke 2 p. 8-10
  • Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OLEE IHE NDỊ JIZỌS KWURU NA HA GA NA-EME?
  • OLEE OTÚ IHE NDỊ A NA-EMENỤ SI GBASA ANYỊ?
  • Olee Mgbe Mbibi Ụwa E Buru Amụma Ya Ga-abịa?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ogologo Oge Ha Aṅaa Ka Usoro Ihe Nke A Ga-adịru?
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Mata na Amagedọn Dị Nso
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
wp20 nke 2 p. 8-10
Ebe Onyeàmà Jehova na-enye otu nwaanyị bịara n’ebe anyị na-edosa akwụkwọ akwụkwọ ịkpo òkù.

Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?

Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-achọ ịma mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị. Jizọs gwara ha na ha agaghị amatali kpọmkwem mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa. (Ọrụ Ndịozi 1:6, 7) Ma tupu mgbe ahụ, Jizọs agwala ha na ọ bụrụ na ha ahụ ka ihe dị iche iche na-eme n’ụwa n’otu oge, na ha ga-eji ya ‘mara na Alaeze Chineke dị nso,’ nakwa na oge ọ ga-amalite ịchị eruola.​—Luk 21:31.

OLEE IHE NDỊ JIZỌS KWURU NA HA GA NA-EME?

Jizọs sịrị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha. A ga-enwe oké ala ọma jijiji, ụkọ nri na ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:10, 11) Ọ bụrụ na ihe ndị a niile ana-eme n’otu mgbe, ha ga-egosi n’eziokwu na “Alaeze Chineke dị nso.” Ihe ndị a hà emewela ugbu a n’otu mgbe, hà na-emekwa n’ụwa niile? Lee ihe ndị a chọpụtara.

1. AGHA

Ihe ndị a bụ ụgbọelu na-atụ bọmbụ, ụgbọala na-atụ bọmbụ, na mgbọ ogbunìgwè.

N’afọ 1914, agha a na-ahụtụbeghị ụdị ya dara. Ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na-ekwukarị na ọ bụ n’afọ 1914 ka ọtụtụ ihe gbanwere n’ụwa n’ihi na ọ bụ n’afọ ahụ ka a lụrụ agha mbụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụ n’agha ahụ ka a malitere iji ọtụtụ ngwá agha ndị jọgburu onwe ha alụ agha, dị ka ụgbọala na-atụ bọmbụ, ụgbọelu na-atụ bọmbụ, égbè na-awụpụ mgbọ, kemikal ọjọọ a na-agbanye n’ikuku, na ngwá agha ọjọọ ndị ọzọ. E mechakwara lụọ agha ụwa nke abụọ, nke a nọ na ya mepụta ngwá agha ọgwụrụ mba ma jiri ya gbuo ọtụtụ ndị. Kemgbe afọ 1914, ụmụ mmadụ ka na-alụ agha n’ebe dị iche iche. Agha ndị ahụ ataakwala isi ọtụtụ nde mmadụ.

2. ALA ỌMA JIJIJI

Ebe ala ọma jijiji na-eme, ụlọ ana-agbawasị.

Otu akwụkwọ a na-akpọ Britannica Academic kwuru na n’afọ ọ bụla, a na-enwe ihe dị ka otu narị ala ọma jijiji ndị nwere ike “imebi ihe buru ibu.” Otu nchọpụta e mere n’Amerịka kwukwara na “ihe ndị merela eme (kemgbe ihe dị ka afọ 1900) gosiri na a ga na-enwe ihe dị ka oké ala ọma jijiji iri na isii n’afọ ọ bụla.” Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na ihe mere o ji dị ka à na-enwezi ọtụtụ ala ọma jijiji bụ n’ihi na e nweela ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị e ji amata gbasara ala ọma jijiji. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na n’ụwa niile, oké ala ọma jijiji na-akpatara ọtụtụ ndị ahụhụ, na-atakwa isi ọtụtụ ndị karịa otú ọ na-emebu.

3. ỤKỌ NRI

Ihe a bụ chaatị gosiri otú ihe ndị a na-akọpụta n’ugbo si na-ebelata.

A na-enwe ụkọ nri n’ụwa niile n’ihi agha, mpụ, nrụrụ aka, ụkọ ego, ileghara ọrụ ugbo anya, ma ọ bụkwanụ ileghara ihe ndị nwere ike ịkpata ọdachi anya. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ihe Oriri kwuru ihe ha chọpụtara banyere ụkọ nri n’afọ 2018. Ha sịrị: “N’ụwa niile, narị nde mmadụ asatọ na iri abụọ na otu (821,000,000) na-anọ agụụ. Otu narị nde na iri abụọ na anọ (124,000,000) n’ime ha anaghịdị ahụ tụrụ rachaa.” Erighị ezigbo nri so n’ihe na-akpata ọnwụ ụmụaka dị ihe dị ka nde atọ na otu narị puku (3,100,000) kwa afọ. N’afọ 2011, ọ bụ otu erighị ezigbo nri a kpatara ọnwụ ihe dị ka ọkara ụmụaka niile nwụrụ n’ụwa niile.

4. ỌRỊA NA-EFE EFE

Ihe a nọchiri anya ụmụ nje dị iche iche.

Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru, sị: “Malite n’afọ 2000, ọtụtụ ajọ ọrịa na-efe efe bụzi okwu a kpụ n’ọnụ. Ọrịa ndị a rịara n’oge gara aga, dị ka ọgbụgbọ na ọnyụnyụ na ịba ọcha n’anya alọghachila, ndị nke ọhụrụ apụtakwala, dị ka ọrịa mmịnwụ, oké ahụ́ ọkụ, ọrịa MERS, Ebola na ọrịa Zika.” Nke kacha ọhụrụ n’ime ha bụ ọrịa koronavaịrọs. Ọ bụ eziokwu na ndị sayensị na ndị dọkịta amatala ọtụtụ ihe banyere ọrịa dị iche iche, ma ha enwebeghị ike ịgwọ ọrịa niile.

5. OZI ỌMA A NA-EKWUSA N’ỤWA NIILE

Ebe e gosiri ụwa nakwa Baịbụl e mepere emepe.

Jizọs kwuru ihe ọzọ so n’ihe ndị a ga-eji ama na Alaeze Chineke adịla nso. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ka a na-enwe nsogbu dị iche iche n’ụwa, ihe karịrị nde mmadụ asatọ (8,000,000) si ná mba niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke na narị mba abụọ na iri anọ (240). Ha na-ekwusa ya n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Ụdị ihe a emetụbeghị mbụ.

OLEE OTÚ IHE NDỊ A NA-EMENỤ SI GBASA ANYỊ?

Ihe ndị ahụ niile Jizọs sị na a ga-eji ama na Alaeze Chineke adịla nso na-emecha taa. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji chebara ihe ndị a echiche? Ọ bụ maka na Jizọs kwuru, sị: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na Alaeze Chineke dị nso.”​—Luk 21:31.

Ebe Jizọs nọ ọdụ n’ocheeze n’eluigwe mgbe ụwa ghọrọ paradaịs.

N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa

Ihe ndị ahụ Jizọs kwuru a ga-eji ama na Alaeze Chineke dị nso na oge Baịbụl kwuru ihe ndị ahụ ga-eji eme na-enyere anyị aka ịmata na Chineke mere ka Alaeze ya malite ịchị n’eluigwe n’afọ 1914.a N’oge ahụ, o mere ka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst bụrụ Eze. (Abụ Ọma 2:2, 4, 6-9) N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa, ọ ga-ebibi ọchịchị ndị ọzọ niile ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs, ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.

Jizọs gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) N’oge na-adịghị anya, ihe a ọ gwara anyị na-ekpe n’ekpere ga-emezu. Ma, gịnị ka Alaeze Chineke na-eme kemgbe ahụ ọ malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914? Oleekwa ihe ndị anyị na-atụ anya na Alaeze ahụ ga-eme mgbe ọ ga-amalite ịchị ụwa?

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere afọ 1914, gụọ isi nke 32 n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya