Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 24 p. 62-p. 63 para. 7
  • Jizọs Ezisakwuo Ozi Ọma na Galili

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Ezisakwuo Ozi Ọma na Galili
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Jisọs Ji Bịa n’Ụwa
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • A7-C Ihe Ndị Mere n’Oge Jizọs Nọ n’Ụwa—Otú Jizọs Si Jesie Ozi Ike na Galili (Nke 1)
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Ịnụ Ọkụ n’Obi Maka Ofufe Jehova
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Mesaya Mezuru Amụma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 24 p. 62-p. 63 para. 7
Mgbe Pita, Andru, Jems, na Jọn hụrụ Jizọs

ISI NKE 24

Jizọs Ezisakwuo Ozi Ọma na Galili

MATIU 4:23-25 MAK 1:35-39 LUK 4:42, 43

  • JIZỌS NA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA ANỌ EJEE OZI GBURUGBURU GALILI

  • ỌTỤTỤ NDỊ AMATA GBASARA OZI ỌMA Ọ NA-EKWUSA NA ỌRỤ EBUBE NDỊ Ọ NA-ARỤ

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya anọ ahụ ezughị ike ụbọchị ahụ ha nọ na Kapaniọm. Ná mgbede ya, ndị Kapaniọm kpọtaara ya ndị ahụ́ na-adịghị ka ọ gwọọ ha. Jizọs enweghị ohere mee ihe ndị ọzọ dị ya mkpa.

Ma, n’isi isi ụtụtụ echi ya, Jizọs biliri pụọ èzí naanị ya. Ọ chọtara ebe o nwere ike ịnọ naanị ya kpegara Nna ya ekpere. Ma Jizọs anọteghị aka ebe ahụ naanị ya. Mgbe “Saịmọn na ndị ya na ha so” chọpụtara na ọ nọghị ya, ha chọsiwere ya ike. O yiri ka ọ̀ bụ Pita butere ụzọ n’ihi na ọ bụ n’ụlọ ya ka Jizọs nọbu.—Mak 1:36; Luk 4:38.

Mgbe ha chọtara Jizọs, Pita sịrị ya: “Mmadụ niile na-achọgharị gị.” (Mak 1:37) O doro anya ihe mere ndị Kapaniọm achọghị ka Jizọs si n’obodo ha pụọ. Ihe ndị ọ na-eme tọgburu ha atọgbu. N’ihi ya, ha gbalịrị “igbochi ya ka ọ ghara isi n’ebe ha nọ pụọ.” (Luk 4:42) Ma, ihe bụ́ isi mere Jizọs ji bịa n’ụwa ọ̀ bụ ịna-agwọ ndị mmadụ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube? Ọ̀ bụkwa sọọsọ n’ebe a ka ọ ga-eje ozi ya? Gịnị ka o kwuru banyere nke a?

Ebe Jizọs na-atụ otu obodo dị́ nso aka n’oge ọ na-agwa Pita, Andru, Jems, na Jọn okwu

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gaa ebe ọzọ, n’obodo nta ndị dị nso, ka m wee kwusaakwa ozi ọma n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ n’ihi nzube a ka m ji bịa.” Jizọs gwadịrị ndị ahụ chọrọ ka ọ nọgide ebe ahụ, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.”—Mak 1:38; Luk 4:43.

N’eziokwu, ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ otu n’ime isi ihe mere Jizọs ji bịa n’ụwa. Alaeze ahụ ga-edo aha Nna ya nsọ, meekwa ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ niile ha na-ata. Jizọs gwọrọ ndị mmadụ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube iji gosi na ọ bụ Chineke zitere ya. Mozis mekwara ihe yiri nke ahụ ọtụtụ narị afọ tupu Jizọs abịa n’ụwa. Ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche iji gosi na ọ bụ Chineke zitere ya.—Ọpụpụ 4:1-9, 30, 31.

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya anọ ahụ hapụziri Kapaniọm gawa izi ozi ọma n’obodo ndị ọzọ. Ha anọ bụ Pita na nwanne ya nwoke bụ́ Andru, tinyere Jọn na nwanne ya nwoke bụ́ Jems. O ruola otu izu ugbu a Jizọs kpọrọ ha ka ha bụrụ ndị mbụ so ya na-ezisa ozi ọma.

Ozi ọma mbụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya zisara na Galili gara nnọọ nke ọma. Akụkọ gbasara Jizọs zuru ebe niile. “Akụkọ banyere ya gazuru Siria dum,” ruo n’ógbè ahụ dị obodo iri a na-akpọ Dikapọlis, ruokwa n’ofe Osimiri Jọdan. (Matiu 4:24, 25) Oké ìgwè mmadụ ndị si ebe ndị ahụ, nakwa ndị si Judia, sooro Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. Ọtụtụ ndị kpọtaara ya ndị chọrọ ka a gwọọ ha ihe na-arịa ha. Jizọs mekwaara ha ihe ha chọrọ. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ndị ha ji.

  • Gịnị mere n’isi isi ụtụtụ ụbọchị sotere ụbọchị ahụ ndị mmadụ na-ekweghị Jizọs zuru ike na Kapaniọm?

  • Gịnị mere e ji zite Jizọs n’ụwa, oleekwa ihe ọrụ ebube ndị ọ rụrụ gosiri?

  • Olee ndị so Jizọs ga zisaa ozi ọma na Galili, gịnịkwa ka ndị mmadụ mere mgbe ha hụrụ ihe ndị ọ na-eme?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya