Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 3 p. 9
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha ma Rubere Chineke Isi Ruo Ọnwụ
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha, Rubekwara Chineke Isi Ruo Ọnwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ọ Nakweere Nduzi Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 3 p. 9

Ị̀ Maara?

Ònye bụ nna Josef?

Joseph teaches Jesus to be a carpenter

Josef bụ ọkwá nkà n’obodo Nazaret. Ọ bụ ya bụ nna Jizọs n’ụwa. Ma, ònye bụ nna Josef? Mgbe Matiu na Luk na-ede ezinụlọ Jizọs si, Matiu dere na nna Josef bụ Jekọb, ma, Luk dere na Josef bụ “nwa Hilaị.” Gịnịzi mere ihe Matiu dere ji dị iche n’ihe Luk dere?—Luk 3:23; Matiu 1:16.

Matiu dere, sị: “Jekọb amụọ Josef.” N’asụsụ Grik, ihe a o dere gosiri na ọ bụ Jekọb mụrụ Josef. Ihe ọ pụtara bụ na Matiu si n’ezinụlọ ndị nna nna Josef, bụ́ ezinụlọ Eze Devid, kpọrọ aha onye mụrụ onye ọ mụrụ rute na Jizọs. O si otú ahụ gosi na Jizọs ruru eru iketa ocheeze Devid.

Ma, Luk dere, sị: “Josef, nwa Hilaị.” Mgbe ụfọdụ, nna nwunye mmadụ hụ “ọgọ ya nwoke,” ya akpọọ ya “nwa” ya. Ọ bụ ụdị ihe ahụ ka anyị ga-agụta na Luk 3:27. E dere ebe ahụ na Shieltiel bụ “nwa Niraị.” Ma, nna mụrụ Shieltiel bụ Jekonaya. (1 Ihe E Mere 3:17; Matiu 1:12) Ọ ga-abụ na Shieltiel lụrụ nwa Niraị Baịbụl na-akpọghị aha ya, ya na ya abụrụzie ọgọ. Ọ bụkwa otú ahụ ka Josef si bụrụ “nwa” Hilaị, n’ihi na ọ lụrụ Meri nwa Hilaị. Ọ pụtara na Luk si n’ezinụlọ ndị nna nna Meri, bụ́ nne Jizọs “dị ka anụ ahụ́ si dị,” kpọrọ aha onye mụrụ onye ọ mụrụ rute na Jizọs. (Ndị Rom 1:3) Ihe ọ pụtara bụ na Baịbụl gwara anyị gbasara ezinụlọ e si mụta Jizọs, ma ndị ezinụlọ nna ya n’ụwa ma ndị ezinụlọ nne ya.

Olee ụdị ákwà na ihe e ji esiji ákwà e nwere n’oge ochie?

Ajị anụ e sijiri esiji a hụrụ n’ọgba dị́ nso n’Oké Osimiri Nnu. E dere na e sijiri ya tupu afọ 135

Ajị anụ e sijiri esiji a hụrụ n’ọgba dị́ nso n’oké osimiri nnu. e dere na e sijiri ya tupu afọ 135

N’Izrel oge ochie na ná mba ndị gbara ya gburugburu, a na-eji ajị atụrụ, ajị ewu na ajị kamel emepụta ákwà. Ma, nke a kacha eji emepụta ákwà n’oge ahụ bụ ajị atụrụ. N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e kwuru gbasara atụrụ, ịkpacha ajị, nakwa uwe e ji ajị mee. (1 Samuel 25:2; 2 Ndị Eze 3:⁠4; Job 31:20) Ahịhịa e ji emepụta ákwà linin dị n’Ijipt nakwa n’Izrel. (Jenesis 41:42; Jọshụa 2:⁠6) Ọ ga-abụ na ndị Izrel anaghị akọ ogho. Ma, Baịbụl kwuru na ndị Peshia na-eji ogho eme ihe dị iche iche. (Esta 1:⁠6) Ákwà silk ­na-ada oké ọnụ, o yikwara ka ọ̀ bụ naanị ndị ahịa sí Eshia na-ere ya.​—⁠Mkpughe 18:​11, 12.

Otu akwụkwọ a kpọrọ Jesus and His World, kwuru, sị: “Ajị anụ na-enwe ụcha dị iche iche. E nwere ndị na-acha ọcha, nweekwa ndị tụrụ àgwà.” A na-esijikarịkwa ajị anụ esiji. A na-esi n’ụfọdụ eju enweta ihe na-acha odo odo e ji esiji ákwà. Ọ na-adakwa oké ọnụ. A na-esikwa n’osisi dị iche iche, mgbọrọgwụ, mkpá akwụkwọ, na ụmụ ahụhụ dị iche iche enweta ihe e ji esiji ákwà ka o jiwe oji, chawa ọbara ọbara, odo odo, ma ọ bụ anụnụ anụnụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya