Job
31 “Mụ na anya m agbaala ndụ.+
Gịnịzi mere m ga-eji lewe nwaanyị ọzọ* anya otú na-ekwesịghị ekwesị?+
2 Oleezi ihe m ga-enweta n’aka Chineke bi n’eluigwe?
Gịnị ka m ga-eketa n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile bụ́ onye nọ n’elu?
3 Ọ̀ bụ na ọ bụghị mbibi ka a ga-ebibi onye na-eme ihe ọjọọ?
Ọ̀ bụkwa na ọdachi agaghị adakwasị ndị arụrụala?+
5 È nwetụla mgbe m sooro ndị na-anaghị ekwu eziokwu?
È nwetụla mgbe m gara ije ngwa ngwa ka m ghọọ aghụghọ?+
6 Ka Chineke jiri ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe tụọ m.+
Ọ ga-achọpụta na m kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.+
7 Ọ bụrụ na m hapụrụ iso ezigbo ụzọ,+
Ma ọ bụ na ihe anya m hụrụ gụwara obi m agụụ,+
Ma ọ bụ na aka m adịghịzi ọcha,
8 Ka onye ọzọ rie mkpụrụ m kụrụ,+
Ka e fopụkwa ihe m kụrụ.*
9 Ọ bụrụ na obi m dị n’ebe nwaanyị ọzọ nọ,+
Ọ bụrụkwa na m gara zoo n’ọnụ ụzọ onye agbata obi m maka na m na-achọ nwunye ya,+
10 Ka nwunye m gweere nwoke ọzọ nri,
11 N’ihi na m mee otú ahụ, ọ ga-abụ ihe ihere,
Bụrụkwa ihe ọjọọ nke ndị ikpe ga-eji maka ya taa m ahụhụ.+
13 Ọ bụrụ na emereghị m ndị ohu m ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwaanyị ihe m kwesịrị imere ha
Mgbe ha kwuru na e nwere ihe m mere na-adịghị ha mma,*
Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ ga-achọ ka m zaa ya ajụjụ?+
15 Ọ̀ bụ na ọ bụghị Onye kere m n’ime akpa nwa nne m kere ha?+
Ọ̀ bụ na ọ bụghị otu Onye ahụ kere anyị tupu a mụọ anyị?*+
16 Ọ bụrụ na ekweghị m enye ogbenye ihe ọ chọrọ+
Ma ọ bụkwanụ mee ka nwaanyị di ya nwụrụ gharazie inwe olileanya,*+
17 Ọ bụrụ na ọ bụ naanị m na-eri nri m,
Ọ bụrụ na anaghị m enyetụ ụmụ na-enweghị nne na nna,+
18 (N’ihi na malite mgbe m bụ okorobịa, m na-elekọta nwa na-enweghị nne na nna ka à ga-asị na m bụ nna ya.
M na-enyekwara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ aka malite mgbe m bụ nwata.*)
19 Ọ bụrụ na m hụrụ onye ọ bụla oyi na-atụgbu maka na o nweghị uwe
Ma ọ bụ ogbenye na-enweghị ákwà ọ ga-eji kpuchie onwe ya,+
20 Ọ bụrụ na mụ enyeghị ya ajị anụ a kpachapụtara n’atụrụ m ka o jiri kpuchie onwe ya,
Ya agọzie m,+
21 Ọ bụrụ na m ji iwe tụọ nwa na-enweghị nne na nna aka+
Mgbe ọ nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo na-achọ ka m nyere ya aka,*+
22 Ka aka m si n’ubu m kwokapụ,
Ka aka m gbajiekwa n’ikpere aka m.
23 Ma emeghị m nke ọ bụla n’ihe ndị a maka na ụjọ tụrụ m na Chineke ga-eme ka ọdachi dakwasị m,
Agaghịkwa m eguzoli n’ihu ya n’ihi otú o si dị ebube.
24 Ọ bụrụ na m tụkwasịrị ọlaedo obi
Ma ọ bụ na m sịrị ezigbo ọlaedo, ‘Ọ bụ gị bụ obi ike m,’+
25 Ọ bụrụ na ihe na-eme m obi ụtọ bụ nnukwu akụnụba m,+
Maka na akụ̀ m kpatara karịrị akarị,+
26 Ọ bụrụ na m hụrụ ka anwụ na-acha*
Ma ọ bụ hụ ka ọmarịcha ọnwa na-aga na mbara igwe,+
27 Obi m wee duhie m,
Mụ esusuo aka m ọnụ iji fee ha ofufe,+
28 Ọ ga-abụ ihe ọjọọ nke ndị ikpe ga-eji maka ya taa m ahụhụ,
N’ihi na ọ pụtara na mụ agọnahụla ezi Chineke bi n’elu.
29 È nwetụla mgbe m ṅụrịrị ọṅụ maka na e bibiri onye iro m+
Ma ọ bụkwanụ nwee obi ụtọ maka na ihe ọjọọ mere ya?
31 Ọ̀ bụ na ndị bi n’ụlọikwuu m ajụbeghị, sị,
‘Ònye ga-achọtali onye na-eribeghị nri Job, rijuo afọ?’+
32 E nweghị onye mbịarambịa m hapụrụ ka ọ rahụ n’èzí.+
M ghewere ọnụ ụzọ m oghe maka ndị njem.
34 È nwetụla mgbe m tụrụ ụjọ ihe ìgwè mmadụ ga-eme?
Ma ọ bụ, è nwetụla mgbe m tụrụ ụjọ maka otú ezinụlọ ndị ọzọ ga-esi leda m anya,
Ya emee ka m gba nkịtị, ụjọ ịpụ n’èzí ana-atụkwa m?
Ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile za m.+
A sị nnọọ na onye na-ebo m ebubo dere ebubo ndị o boro m n’akwụkwọ,
36 M gaara eburu akwụkwọ ahụ n’ubu m,
M gakwaara ekpuru ya n’isi m ka okpueze.
37 M gaara akọrọ Chineke ije m niile.
M gaara eji obi ike gakwuru ya otú onyeisi si eme.
38 Ọ bụrụ na ala m ga-ebe ákwá maka na m zuru ya ezu,
Ebe niile a kọrọ akọ na ya ebeekwa ákwá,
39 Ọ bụrụ na m riri mkpụrụ si na ya n’akwụghị ụgwọ,+
Ma ọ bụ, ọ bụrụ na m mere ka ndị nwe ya* sụọ ude,+
40 Ka ogwu puoro m kama ọka wit ga-epuru m,
Ka ahịhịa na-esi ísì ọjọọ puokwara m kama ọka bali ga-epuru m.”
N’ebe a ka okwu Job gwụrụ.