Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 9/15 p. 13-18
  • Mmụọ Jehova Na-edu Ndị Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmụọ Jehova Na-edu Ndị Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Rịọ Chineke Maka Mmụọ Ya
  • Jehova Dị Njikere Inye Aka
  • Ụzọ Mmụọ ahụ Si Enye Aka
  • “Weere Ịsụ Ude A Na-apụghị Ikwu”
  • Emekwala Ihe Ga-ewute Mmụọ Nsọ
  • Nọgidenụ Na-ekpe Ekpere Maka Mmụọ Nsọ
  • ‘N’aha nke Mmụọ Nsọ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ije Ije Site na Mmụọ Nsọ Na-eme Ka Anyị Na-ebi Ndụ Kwekọrọ ná Nrara Anyị Raara Onwe Anyị Nye Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Otú Mmụọ Chineke Si Duo Ndị Kraịst Na Narị Afọ Mbụ Na Otú O si Edu Ndị Kraịst Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Èmewo M ka Mmụọ Nsọ Bụrụ Ihe Inyeaka M?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 9/15 p. 13-18

Mmụọ Jehova Na-edu Ndị Ya

“Mmụọ gị dị mma; ka o duru m gaa n’ala nke ezi omume.” —ABỤ ỌMA 143:10, NW.

1, 2. Gịnị pụrụ ịkpatara ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe mkpagbu?

‘ANA m ada mbà nke ukwuu! Ebee ka m pụrụ inweta nkasi obi? Chineke ọ̀ gbahapụwo m?’ Ị̀ na-anọkata nwee mmetụta dị otú ahụ? Ọ bụrụ na ị na-enwe, ọ bụghị nanị gị. Ọ bụ ezie na ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe na-ebi na paradaịs ime mmụọ ahụ na-enwe ọganihu, mgbe ụfọdụ ha na-ezute nsogbu, ule na ọnwụnwa ndị na-emekpa ahụ bụ́ ndị na-adakwasị ihe a kpọrọ mmadụ.—1 Ndị Kọrint 10:13.

2 Ma eleghị anya, ule ụfọdụ na-adịgide adịgide ma ọ bụ ihe ụfọdụ na-akpata oké ihe isi ike adakwasịwo gị. Ị pụrụ ịdị na-eru újú nke ọnwụ onye ị hụrụ n’anya, ị pụkwara iche na ọ bụ nanị gị. Ma ọ bụ ọrịa nke na-arịa otu ezigbo enyi gị pụrụ ịdị na-enye gị nsogbu n’obi. Ọnọdụ ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị na-anapụ gị ọṅụ na udo, ọ pụkwara ọbụna ịdị na-eyi okwukwe gị egwu. Gịnị ka i kwesịrị ime?

Rịọ Chineke Maka Mmụọ Ya

3. Ọ bụrụ na ọ dị ihe nke na-anapụ gị àgwà ndị ahụ dị ka udo na ọṅụ, gịnị ga-abụ ihe amamihe dị na ya ime?

3 Ọ bụrụ na ọ dị ihe na-anapụ gị udo, ọṅụ, ma ọ bụ àgwà ụfọdụ nke Chineke, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ikpe ekpere maka mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ọrụ ya. N’ihi gịnị? N’ihi na mmụọ Jehova na-amịpụta ezi mkpụrụ nke na-enyere onye Kraịst aka ịnagide nsogbu, ule na ọnwụnwa nile. Mgbe ọ dọsịrị aka ná ntị megide “ọrụ nile nke anụ ahụ,” Pọl onyeozi dere, sị: “Ma mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi [“okwukwe,” NW], ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè [“njide onwe onye,” NW]: ọ dịghị iwu na-emegide ihe nile dị otú a.”—Ndị Galetia 5:19-23.

4. Mgbe mmadụ zutere ule ma ọ bụ ọnwụnwa ụfọdụ, n’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji kwesị ekwesị mmadụ ikwu ya kpọmkwem n’ekpere ya?

4 N’ihi ụdị ule ị na-eche ihu, ị pụrụ ịghọta na ị nọ n’ihe ize ndụ nke ịtụfu ịdị nwayọọ, ma ọ bụ ịdị umeala n’obi gị. Mgbe ahụ, kwuo kpọmkwem ihe bụ mkpa gị site n’ikpegara Jehova Chineke ekpere maka mkpụrụ nke mmụọ nsọ nke ịdị nwayọọ. Ọ bụrụ na i chee ọnwụnwa ụfọdụ ihu, mkpụrụ nke njide onwe onye dị mkpa karịsịa. Otú ọ dị, ọ ga-ekwesịkwa ekwesị ikpe ekpere maka enyemaka Chineke iji guzogide ọnwụnwa ahụ, maka mgbapụta site n’aka Setan, na maka amamihe dị mkpa iji tachie obi n’ule ahụ.—Matiu 6:13; Jemes 1:5, 6.

5. Ọ bụrụ na ọnọdụ ndị ị nọ na ha na-emekpa gị ahụ nke ukwuu nke na ị maghị mkpụrụ nke mmụọ nsọ ị ga-ekpe ekpere maka ya, gịnị ka a pụrụ ime?

5 Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ọnọdụ pụrụ ịbụ nke na-emekpa ahụ ma ọ bụ nke dị mgbagwoju anya nke ukwuu nke na ị maghị mkpụrụ nke mmụọ nsọ dị gị mkpa. N’ezie, ọṅụ, udo, ịdị nwayọọ, na àgwà ndị ọzọ nke Chineke pụrụ ịbụ ndị nọ n’ihe ize ndụ. Mgbe ahụ gịnị ka a ga-eme? Gịnị ma ị rịọ Chineke maka mmụọ nsọ n’onwe ya ma kwere ka o mee ka mkpụrụ ndị dị mkpa baa ụba n’ọnọdụ nke gị? Mkpụrụ ndị dị mkpa pụrụ ịbụ ịhụnanya ma ọ bụ ọṅụ ma ọ bụ udo ma ọ bụ njikọ nke mkpụrụ nile nke mmụọ nsọ. Ọzọkwa, kpee ekpere ka Chineke nyere gị aka ime ihe kwekọrọ ná nduzi nke mmụọ ya, n’ihi na ọ na-eji ya edu ndị ya.

Jehova Dị Njikere Inye Aka

6. Olee ụzọ Jisọs si mee ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta mkpa ọ dị ikpe ekpere n’esepụghị aka?

6 Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst chọrọ ntụziaka banyere ekpere, ná mkpirikpi ọ gbara ha ume ikpe ekpere maka mmụọ Chineke. Jisọs bu ụzọ jiri otu ihe atụ mee ihe bụ́ nke a haziri iji kpalie ha ikpe ekpere n’esepụghị aka. Ọ sịrị: “Ònye n’ime unu ga-enwe enyi, ga-ejekwurukwa ya n’etiti abalị, sị ya, Enyi m, binye m ógbè achịcha atọ; n’ihi na otu enyi m esiwo n’ije bịakwute m, ma enweghị m ihe ọ bụla m ga-edebe n’ihu ya; ma onye ahụ ga-esi n’ime ụlọ zaa, sị, Esogbula m: e mechiwo ụzọ ugbu a, mụ na ụmụntakịrị m na-edinakwa n’ihe ndina anyị; apụghị m ibili inye gị? Asị m unu, ọ bụrụkwa na ọ gaghị ebili inye ya n’ihi na ọ bụ enyi ya, ma n’ihi arịrịọ ya na-enweghị ihere [“ịnọgide jiri obi ike na-arịọ,” NW] ọ ga-ebili nye ya ka ihe dị ya mkpa hà.”—Luk 11:5-8.

7. Gịnị ka okwu Jisọs nke dị na Luk 11:11-13 pụtara, nkwa dịkwa aṅaa ka ha na-ekwe anyị banyere Chineke na mmụọ ya?

7 Jehova dị njikere inyere onye ọ bụla n’ime ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi raara onwe ha nye ya aka, ọ na-anụkwa arịrịọ ha. Ma ọ bụrụ na onye dị otú a ‘anọgide na-arịọ,’ dị ka Jisọs gbara ume, nke a na-egosi ọchịchọ sitere n’ala ala obi, ọ bụkwa ngosipụta nke okwukwe. (Luk 11:9, 10) Kraịst kwukwara, sị: “Ònye n’etiti unu, bụ́ nna, ka nwa ya ga-arịọ ógbè achịcha, o nye ya nkume? ma ọ bụ azụ, o nye ya agwọ n’ọnọdụ azụ? Ma ọ bụ à sị na ọ ga-arịọ àkwá ọkụkọ, ọ̀ ga-enye ya akpị? Ya mere, ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu jọrọ njọ, ma unu na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị mmụọ nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ ya?” (Luk 11:11-13) Ọ bụrụ na onye bụ nne ma ọ bụ nna elu ala, ọ bụ ezie na ọ jọrọ njọ n’akụkụ ka ukwuu n’ihi mmehie e bu pụta ụwa, na-enye nwa ya ezi ihe, n’ezie Nna anyị nke eluigwe ga-anọgide na-enye onye ọ bụla n’ime ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe mmụọ nsọ ya bụ́ onye ji ịdị umeala n’obi na-arịọ maka ya.

8. Olee ụzọ Abụ Ọma 143:10 si mezuo n’ọnọdụ Devid, Jisọs, na ndị ohu Chineke oge ugbu a?

8 Iji rite uru site ná mmụọ Chineke, anyị aghaghị ịdị njikere ịgbaso idu ndú ya dị ka Devid mere. O kpere ekpere, sị: “Zie m ime uche gị, n’ihi na ị bụ Chineke m. Mmụọ gị dị mma; ka o duru m gaa n’ala ezi omume.” (Abụ Ọma 143:10, NW) Devid, bụ́ onye eze Israel bụ́ Sọl kwuru na ọ dawo iwu, chọrọ ka mmụọ Chineke duo ya ka o wee jide n’aka na ụzọ ya bụ nke ziri ezi. N’oge na-adịghị anya, Abaịata ji ephod nke onye nchụàjà wee bịa, bụ́ nke e ji eme ihe ịjụta ihe bụ uche Chineke. Dị ka onye nchụàjà na-anọchi anya Chineke, Abaịata nyere Devid ntụziaka banyere ụzọ ọ ga-agbaso iji wee mee ihe ga-atọ Jehova ụtọ. (1 Samuel 22:17–23:12; 30:6-8) Dị ka Devid, mmụọ Jehova duru Jisọs, nke a abụwokwa eziokwu banyere ndị na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ dị ka otu òtù. N’afọ 1918-1919, ha nọ n’ọnọdụ ndị e kewapụrụ iche n’ihu òtù ụmụ mmadụ, ndị iro ha bụ́ ndị okpukpe chere na ha pụrụ ibibi ha. Ndị ahụ e tere mmanụ kpere ekpere maka ụzọ isi pụta n’ọnọdụ ha nke arụghị ọrụ, na 1919, Chineke zara ekpere ha, gbapụta ha, meekwa ka ha malite ịrụ ọrụ ọzọ n’ozi ya. (Abụ Ọma 143:7-9) N’ezie, mmụọ Jehova na-enyere ndị ya aka ma na-edu ha mgbe ahụ, dị ka ọ na-eme ruo n’oge a kpọmkwem.

Ụzọ Mmụọ ahụ Si Enye Aka

9. (a) Olee ụzọ mmụọ nsọ si arụ ọrụ dị ka “onye inyeaka”? (b) Olee ụzọ anyị si mara na mmụọ nsọ abụghị onye? (Lee ntụaka ala ala peji.)

9 Jisọs Kraịst kpọrọ mmụọ nsọ “onye inyeaka.” Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ onwe m ga-ekpekwara Nna m, ọ ga-enyekwa unu onye nkasi obi [“onye inyeaka,” NW] ọzọ, ka ọ nọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu: onye ụwa na-apụghị ịnara; n’ihi na ọ dịghị ahụ ya, ọ dịghị amakwa ya: unu onwe unu maara ya; n’ihi na ya na unu na-anọgide, ọ ga-anọkwa n’ime unu.” Gụnyere ihe ndị ọzọ, “onye inyeaka” ahụ ga-abụ onye ozizi, n’ihi na Kraịst kwere nkwa, sị: “Onye nkasị obi [“onye inyeaka,” NW] ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, onye Nna m ga-ezite n’aha m, onye ahụ ga-ezi unu ihe nile, meekwa ka unu cheta okwu nile mụ onwe m gwara unu.” Mmụọ nsọ ahụ ga-agbakwa àmà banyere Kraịst, o mesikwara ndị na-eso ụzọ ya obi ike, sị: “Ọ bụ ihe baara unu uru ka mụ onwe m laa: n’ihi na a sị na alaghị m, onye nkasi obi [“onye inyeaka,” NW] ahụ agaghị abịakwute unu; ma ọ bụrụ na ala m, m ga-ezite ya nye unu.”—Jọn 14:16, 17, 26; 15:26; 16:7.a

10. N’ụzọ ndị dịgasị aṅaa ka mmụọ nsọ siworo ghọọ onye inyeaka?

10 Site n’eluigwe, Jisọs wụsara mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa n’isi ndị na-eso ụzọ ya n’ụbọchị Pentikọst na 33 O.A. (Ọrụ 1:4, 5; 2:1-11) Dị ka onye inyeaka, mmụọ nsọ ahụ nyere ha nghọta hiri nne nke uche na nzube Chineke ma mepeere ha Okwu amụma ya. (1 Ndị Kọrint 2:10-16; Ndị Kọlọsi 1:9, 10; Ndị Hibru 9:8-10) Onye inyeaka ahụ mekwara ka ndị na-eso ụzọ Jisọs nwee ike ịbụ ndịàmà ya n’ụwa nile. (Luk 24:49; Ọrụ 1:8; Ndị Efesọs 3:5, 6) Taa, mmụọ nsọ pụrụ inyere onye Kraịst raara onwe ya nye aka ito eto n’ihe ọmụma ma ọ bụrụ na o jiri ndokwa ime mmụọ nke Chineke na-ewepụta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-eme ihe. (Matiu 24:45-47) Mmụọ Chineke pụrụ iwepụta enyemaka site n’inye obi ike na ume dị mkpa iji gbaa àmà dị ka otu n’ime ndị ohu Jehova. (Matiu 10:19, 20; Ọrụ 4:29-31) Otú ọ dị, mmụọ nsọ na-enyekwara ndị Chineke aka n’ụzọ ndị ọzọ.

“Weere Ịsụ Ude A Na-apụghị Ikwu”

11. Ọ bụrụ na ọnwụnwa eyie nke na-erikpu mmadụ, gịnị ka onye Kraịst kwesịrị ime?

11 Ọ bụrụ na ọnwụnwa nke yiri ka ọ na-erikpu onye Kraịst adakwasị ya, gịnị ka o kwesịrị ime? Ee, kpee ekpere maka mmụọ nsọ, kwerekwa ka ọ rụọ ọrụ ya! “Mmụọ nsọ naenyekwara adịghị ike anyị aka,” ka Pọl kwuru, “n’ihi na anyị amataghị ihe anyị ga-ekpe n’ekpere dị ka anyị na-aghaghị ikpe; kama mmụọ nsọ onwe ya weere ịsụ ude a na-apụghị ikwu na-arịọrọ anyị arịrịọ; ma onye ahụ nke na-enyocha obi anyị matara ihe mmụọ nsọ na-atụkwasị uche na ya, n’ihi na ọ na-arịọrọ ndị nsọ arịrịọ dị ka Chineke si chọọ.”—Ndị Rom 8:26, 27.

12, 13. (a) Olee ụzọ Ndị Rom 8:26, 27 si metụta ekpere ndị a na-ekpe karịsịa n’ọnọdụ ndị na-etinye mmadụ n’ule? (b) Gịnị ka Pọl na ndị ya na ha so mere mgbe ha nọ n’oké mkpagbu n’ógbè Esia?

12 Ndị nsọ ahụ bụ́ ndị mmụọ Chineke naarịọrọ arịrịọ bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs e tere mmanụ, ndị nwere olileanya eluigwe. Ma, ma ì nwere ọkpụkpọ eluigwe ma ọ bụ olileanya elu ala, dị ka onye Kraịst, ị pụrụ inweta enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke. Mgbe ụfọdụ, Jehova na-aza kpọmkwem ihe e kpere n’ekpere. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ na mkpagbu gị dị ukwuu nke na i nweghị ike ikwupụta ihe bụ mmetụta gị, na ị pụrụ nanị ịrịọ Jehova arịrịọ site n’ịsụ ude a na-ekwupụtaghị ekwupụta. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ị maghị ihe kasị mma nye gị, ị pụkwara ọbụna ịrịọ maka ihe na-ezighị ezi nanị ma i kpee ekpere maka mmụọ nsọ. Chineke maara na ị chọrọ ka e mee uche ya, ọ makwaara banyere ihe dị gị mkpa n’ezie. Ọzọkwa, site ná mmụọ nsọ ya, o mere ka e dekọọ ọtụtụ ekpere n’Okwu ya, ekpere ndị a bụkwa maka ọnọdụ ndị na-etinye mmadụ n’ule. (2 Timoti 3:16, 17; 2 Pita 1:21) Ya mere, Jehova pụrụ iwere mmetụta ụfọdụ e kwupụtara n’ekpere ndị dị otú ahụ si n’ike mmụọ nsọ ịbụ ihe ndị ị ga-achọ ikwu dị ka otu n’ime ndị ohu ya, ọ pụkwara ịza ha n’ihi gị.

13 Ọ pụrụ ịbụ na Pọl na ndị ya na ha so amaghị ihe ha ga-ekpe ekpere maka ya mgbe ha na-enwe mkpagbu n’ógbè nke Esia. N’ịbụ ndị ‘nọ n’oké mkpagbu karịrị ike ha, ha nwere obi abụọ ma hà ka ga-adịkwa ndụ.’ Ma ha rịọrọ maka ekpere nke ndị ọzọ, tụkwasịkwa obi na Chineke, bụ́ onye pụrụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, ọ napụtakwara ha. (2 Ndị Kọrint 1:8-11) Lee ihe nkasi obi ọ bụ na Jehova Chineke na-anụ ma na-eme ihe banyere ekpere nke ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi!

14. Ihe ọma dị aṅaa pụrụ isi na ya pụta ma ọ bụrụ na Jehova ekwere ka ọnwụnwa dịgide ruo oge ụfọdụ?

14 Ndị Chineke na-abụkarị ndị ọnwụnwa dị iche iche na-adakwasị dị ka otu òtù. Dị ka a rịbara ama na mbụ, a kpagburu ha n’oge Agha Ụwa Mbụ. Ọ bụ ezie na mgbe ahụ ha enweghị nghọta doro anya nke ihe bụ ọnọdụ ha, ya mere, ha amaghịkwa kpọmkwem ihe ha ga-ekpe ekpere maka ya, Okwu Jehova nwere ekpere amụma ndị ọ zara n’ihi ha. (Abụ Ọma 69, 102, 126; Aịsaịa, isi nke 12) Ma gịnị ma ọ bụrụ na Jehova ekwere ka ọnwụnwa nọgide ruo oge ụfọdụ? Nke a pụrụ ịrụpụta ịgba àmà, pụrụ ịkpali ụfọdụ ịnata eziokwu ahụ, na-enyekwa ndị Kraịst ohere igosipụta ịhụnanya ụmụnna site n’ikpe ekpere maka ndị kwere ekwe ibe ha na-ahụju anya ma ọ bụkwanụ na-enyere ha aka. (Jọn 13:34, 35; 2 Ndị Kọrint 1:11) Cheta na Jehova na-edu ndị ya site ná mmụọ nsọ ya, na-emere ha ihe kasị mma, ma na-eme ka ihe gaa mgbe nile n’ụzọ nke ga-enye aha nsọ ya otuto, dookwa ya nsọ.—Ọpụpụ 9:16; Matiu 6:9.

Emekwala Ihe Ga-ewute Mmụọ Nsọ

15. Ndị Kraịst pụrụ ịdabere ná mmụọ Jehova maka ime gịnị n’ihi ha?

15 Ya mere, ọ bụrụ na ị bụ ohu Jehova, kpee ekpere maka mmụọ nsọ n’oge ọnwụnwa nakwa n’oge ndị ọzọ. Mgbe ahụ, jide n’aka na ị gbasoro nduzi ya, n’ihi na Pọl dere, sị: “Unu emekwala ihe ga-ewute mmụọ nsọ nke Chineke, bụ́ nke e ji kaa unu akara maka ụbọchị ntọhapụ site n’ihe mgbapụta.” (Ndị Efesọs 4:30, NW) Mmụọ Chineke abụwo, bụrụkwa akara, ma ọ bụ ‘ihe e ji amara ihe gaje ime,’ maka ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi e tere mmanụ—ya bụ, ndụ anwụghị anwụ nke eluigwe. (2 Ndị Kọrint 1:22; Ndị Rom 8:15; 1 Ndị Kọrint 15:50-57; Mkpughe 2:10) Ma ndị Kraịst e tere mmanụ ma ndị ahụ nwere olileanya elu ala pụrụ ịdabere ná mmụọ Jehova ime ọtụtụ ihe n’ihi ha. Ọ pụrụ iduzi ha ná ndụ nke ikwesị ntụkwasị obi ma nyere ha aka izere ọrụ mmehie ndị na-eduga n’enweghị nkwado Chineke, enweghị mmụọ nsọ ya, na enwetaghị ndụ ebighị ebi.—Ndị Galetia 5:19-21.

16, 17. Olee ụzọ onye Kraịst pụrụ isi mee ihe ga-ewute mmụọ nsọ?

16 Olee ụzọ onye Kraịst pụrụ isi, site n’ịma ama ma ọ bụ n’amaghị ama, mee ihe ga-ewute mmụọ nsọ? Ọ dị mma, Jehova na-eji mmụọ ya eme ihe ịkwalite ịdị n’otu na ịhọpụta ndị ikom ruru eru n’ọgbakọ. Ya mere, ọ bụrụ na onye òtù ọgbakọ atamuo ntamu megide ndị okenye a họpụtara ahọpụta, gbasaa àsị̀rị̀ na-emebi aha, na ihe ndị ọzọ, ọ ga-abụ onye na-adịghị agbaso idu ndú nke mmụọ Chineke n’ebe udo na ịdị n’otu dị. N’ozuzu ya, ọ ga-abụ onye na-eme ihe na-ewute mmụọ nsọ.—1 Ndị Kọrint 1:10; 3:1-4, 16, 17; 1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13; Jud 16.

17 N’idegara ndị Kraịst nọ n’Efesọs akwụkwọ, Pọl dọrọ aka ná ntị megide inwe àgwà nke ikwu okwu ụgha, ibu ọnụma n’obi ruo ogologo oge, izu ohi, ikwu okwu na-ekwesịghị ekwesị, inwe mmasị na-adịghị mma n’ịkwa iko, ime omume ihere, na ikwu okwu rụrụ arụ. Ọ bụrụ na onye Kraịst ahapụ onwe ya ịdaba n’ihe ndị dị otú ahụ, ọ ga-abụ onye na-eme ihe megidere ndụmọdụ Bible ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ. (Ndị Efesọs 4:17-29; 5:1-5) Ee, ruokwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ọ ga-abụ onye na-eme ihe na-ewute mmụọ Chineke.

18. Gịnị pụrụ ime onye Kraịst ọ bụla nke malitere ileghara ndụmọdụ nke Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ anya?

18 N’ezie, onye Kraịst ọ bụla nke malitere ileghara ndụmọdụ nke Okwu Jehova sitere n’ike mmụọ nsọ anya pụrụ ịmalite ịzụlite àgwà ma ọ bụ omume ndị pụrụ ịkpata ilezi anya mee mmehie na ịtụfu ihu ọma Chineke. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị eme mmehie ugbu a, ọ pụrụ ịdị na-aga n’akụkụ ahụ. Onye Kraịst dị otú ahụ nke na-eme ihe megidere idu ndú nke mmụọ nsọ ga-abụ onye na-eme ihe na-ewute ya. Ọ ga-esikwa otú ahụ bụrụ onye na-eguzogide ma na-eme ihe na-ewute Jehova, bụ́ Isi Iyi nke mmụọ nsọ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla onye hụrụ Chineke n’anya ga-achọ ime nke ahụ!

Nọgidenụ Na-ekpe Ekpere Maka Mmụọ Nsọ

19. N’ihi gịnị ka ndị Jehova ji nwee mkpa nke mmụọ ya karịsịa n’oge a?

19 Ọ bụrụ na ị bụ ohu Jehova, nọgide na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ ya. Karịsịa ná “mgbe ikpeazụ” ndị a, ya na oge ha dị oké egwu, enyemaka nke mmụọ Chineke dị ndị Kraịst mkpa. (2 Timoti 3:1-5) Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ́ ndị a chụpụrụ n’eluigwe na ndị nọkwa ugbu a n’ógbè elu ala, na-eme omume ihe ike megide nzukọ Jehova. Ya mere, ugbu a, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ndị Chineke nọ ná mkpa nke mmụọ ya idu, ma ọ bụ iduzi, ha na ime ka ha nwee ike ịtachi obi n’ihe isi ike nile na mkpagbu.—Mkpughe 12:7-12.

20, 21. N’ihi gịnị ka a ga-eji na-agbaso nduzi nke Okwu, mmụọ nsọ, na nzukọ Jehova?

20 Nọgide na-egosipụta ekele mgbe nile maka enyemaka Jehova Chineke na-ewepụta site ná mmụọ nsọ ya. Na-agbaso nduzi nke Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. Na-enye nzukọ elu ala Chineke nke mmụọ nsọ na-edu nkwado zuru ezu. Ya adịla mgbe ị ga-ekwe ka ị gbanwee gaa n’ụzọ na-adabereghị n’Akwụkwọ nsọ bụ́ nke ga-abụ otu ihe ahụ dị ka ime ihe ga-ewute mmụọ nsọ, n’ihi na nke a pụrụ imesị duga n’ịnapụ gị ya, sikwa otú ahụ duga n’ọdachi ime mmụọ.—Abụ Ọma 51:11.

21 Ịbụ onye mmụọ Jehova na-edu bụ nanị ụzọ isi mee ihe na-atọ ya ụtọ ma nwee ndụ udo, nke na-enye ọṅụ. Chetakwa na Jisọs kpọrọ mmụọ nsọ “onye inyeaka,” ma ọ bụ “onye nkasi obi.” (Jọn 14:16) Site na ya, Chineke na-akasi ndị Kraịst obi, na-emekwa ka ha dị ike ịnagide ọnwụnwa ha. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Mmụọ nsọ na-enye ndị Jehova ike ikwusa ozi ọma, na-enyekwara ha aka icheta isi ihe ndị dị n’Akwụkwọ nsọ bụ́ ndị dị mkpa iji gbaa àmà dị mma. (Luk 12:11, 12; Jọn 14:25, 26; Ọrụ 1:4-8; 5:32) Site n’ekpere na nduzi nke mmụọ nsọ, ndị Kraịst pụrụ imeri ule nile nke okwukwe site n’amamihe nke eluigwe. Ya mere, n’ọnọdụ nile nke ndụ, ha na-anọgide na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ Chineke. N’ihi nke a, mmụọ Jehova na-edu ndị ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na e mere ka o yie onye dị ka “onye inyeaka,” mmụọ nsọ abụghị onye, n’ihi na nnọchiaha Grik na-egosi ihe na-abụghị oké ma ọ bụ nwunye (nke e ji “ọ” sụgharịa) bụ nke e ji mee ihe maka mmụọ nsọ. Nnọchiaha Hibru maka nwunye bụkwa nke e ji mee ihe maka amamihe e mere ka o yie onye. (Ilu 1:20-33; 8:1-36) Ọzọkwa, a “wụsara” mmụọ nsọ, bụ́ nke a na-apụghị iji onye mee.—Ọrụ 2:33.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ N’ihi gịnị ka a ga-eji kpee ekpere maka mmụọ nsọ Jehova?

◻ Olee ụzọ mmụọ nsọ si bụrụ onye inyeaka?

◻ Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ime ihe ga-ewute mmụọ nsọ, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi zere ime otú ahụ?

◻ N’ihi gịnị ka a ga-eji nọgide na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ, na-agbasokwa idu ndú ya?

[Foto dị na peeji nke 15]

Dị ka nna na-ahụ n’anya na-enye nwa ya ihe ọma, otú ahụ ka Jehova na-enye ndị ohu ya mmụọ nsọ, bụ́ ndị na-ekpe ekpere maka ya

[Foto dị na peeji nke 17]

Ị̀ maara ụzọ mmụọ Chineke si arịọ arịrịọ maka ndị Kraịst na-ekpe ekpere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya