Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 2/1 p. 8-13
  • Onyinye Mmụọ Nsọ nke Jehova Na-enye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onyinye Mmụọ Nsọ nke Jehova Na-enye
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ike nke Mmụọ Nsọ
  • Ọrụ Ebube Dị Iche Iche
  • Ihe Ndị E Ji Ike Mmụọ Nsọ Dee
  • Ịdabere na Mmụọ Nsọ
  • Mmụọ Chineke na Narị Afọ Mbụ
  • Rite Uru Site na Mmụọ Nsọ Chineke
  • ‘N’aha nke Mmụọ Nsọ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Otú Mmụọ Chineke Si Duo Ndị Kraịst Na Narị Afọ Mbụ Na Otú O si Edu Ndị Kraịst Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ịmata Mmụọ Nsọ Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ije Ije Site na Mmụọ Nsọ Na-eme Ka Anyị Na-ebi Ndụ Kwekọrọ ná Nrara Anyị Raara Onwe Anyị Nye Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 2/1 p. 8-13

Onyinye Mmụọ Nsọ nke Jehova Na-enye

“Nna unu nke eluigwe gà-esi aṅaa ghara iwere karị mmụọ nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ ya?”—LUK 11:13.

1, 2. (a) Olee nkwa Jisọs kwere banyere mmụọ nsọ, gịnịkwa ka nke a ji na-akasi obi n’ezie? (b) Gịnị bụ mmụọ nsọ?

N’OGE mgbụsị akwụkwọ osisi nke afọ 32 O.A., mgbe Jisọs na-ekwusa ozi ọma na Judia, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu banyere mmesapụ aka Jehova. O ji ihe atụ ụfọdụ dị ike mee ihe, wee kwee nkwa dị ebube, na-asị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu jọrọ njọ, ma unu na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị mmụọ nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ ya?”—Luk 11:13.

2 Lee ihe nkasi obi okwu ndị ahụ bụ! Ka anyị na-atachi obi n’ọgba aghara nke mgbe ikpeazụ nke ụwa nke a, na-eche ibu iro Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ihu, na-alụsokwa ọchịchọ ndị na-ezighị ezi nke onwe anyị ọgụ, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ n’ezie ịmara na Chineke ga-enye anyị ume site na mmụọ ya. N’ezie, ntachi obi site n’ikwesị ntụkwasị obi bụ ihe a na-apụghị ime eme ma e nweghị nkwado ahụ. Ì nwewo mmetụta nke ike mmụọ nke a, nke bụ ike ọrụ Chineke n’onwe ya? Ị̀ ghọtara ókè hà aṅaa ọ pụrụ inyere gị aka? Ị̀ na-eji ya eme ihe n’ụzọ zuru ezu?

Ike nke Mmụọ Nsọ

3, 4. Nye ihe atụ ike nke mmụọ nsọ.

3 Buru ụzọ tụlee ike nke mmụọ nsọ. Cheghachi echiche azụ n’afọ 1954. Ọ bụ mgbe ahụ ka a kpakepụrụ ike otu bọmbụ hydrogen n’agwaetiti Bikini Atoll nke dị na South Pacific. Ozugbo bọmbụ ahụ gbawasịrị, oké ọkụ nwukeere n’agwaetiti ahụ mara mma, ike mgbawa ruru ike nke ịkpake nde tọn 15 TNT mara ya jijiji. Olee ebe ike mbibi ahụ nile sitere? Ọ bụ ihe sitere n’ịgbanwe akụkụ dị nta nke uranium na hydrogen nke mejupụtara etiti bọmbụ ahụ ka ha ghọọ ike ọrụ. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ndị ọkà mmụta sayensị pụrụ ime ihe dị iche site n’ihe ha rụzuru na Bikini? A sịkwanụ na ha pụrụ ịchịkọta ike ọrụ ahụ dum nwuru ọkụ ma gbanwee ha ịbụ pound ole na ole nke uranium na hydrogen. Lee oké ihe nke ahụ ga-abụ! Ma, Jehova mere ihe yiri nke ahụ kama ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka nnọọ ukwuu mgbe “ná mbụ [o] kere eluigwe na ụwa.”—Jenesis 1:1.

4 Jehova nwere nkwakọba bara ụba nke ike ọrụ dị ukwuu. (Aịsaịa 40:26) N’oge okike ihe, ọ ghaghị ijikọtaworii ụfọdụ n’ime ike ọrụ ahụ mgbe o mere ihe nile mejupụtara eluigwe na ụwa. Gịnị ka o ji mee ihe n’ọrụ okike nke a? Mmụọ nsọ. Anyị na-agụ, sị: “Okwu Jehova ka e jiri mee eluigwe; e jikwara iku ume nke ọnụ ya mee usuu ha nile.” (Abụ Ọma 33:6) Ihe ndekọ Jenesis banyere okike na-agụkwa, sị: “Mmụọ [nsọ] Chineke na-erugharịkwa n’elu mmiri.” (Jenesis 1:2) Lee aha ike dị ukwuu mmụọ nsọ ahụ bụ!

Ọrụ Ebube Dị Iche Iche

5. N’ụzọ ndị dị aṅaa dị ebube ka mmụọ nsọ si arụ ọrụ?

5 Mmụọ nsọ ka na-arụ ọrụ n’ụzọ ndị dị nnọọ ebube. Ọ na-eduzi ma na-agbazi nzukọ Jehova nke eluigwe. (Ezikiel 1:20, 21) Dị ka ike ọrụ ahụ e wepụtara site na bọmbụ hydrogen ahụ, a pụrụ iji ya bibie ihe n’imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị iro Jehova, ma ọ rụwokwa ọrụ n’ụzọ ndị ọzọ na-ewetara anyị ihe ijuanya.—Aịsaịa 11:15; 30:27, 28; 40:7, 8; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:8.

6. Olee otú mmụọ nsọ si kwadoo Mosis na ụmụ Israel n’ihe mere n’etiti ha na Ijipt?

6 Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka 1513 T.O.A., Jehova zigara Mosis ka ọ gaa guzoo n’ihu Fero nke Ijipt iji rịọ ka o mee ka ụmụ Israel nwere onwe ha. N’ime 40 afọ tupu mgbe ahụ, Mosis abụwo onye ọzụzụ atụrụ na Midian, ya mere n’ihi gịnị ka Fero ga-eji ṅaa onye ọzụzụ atụrụ ntị? N’ihi na Mosis ji aha nke nanị ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova bịa. Iji gosipụta nke a, Jehova nyere ya ike ịrụ ọrụ ebube ụfọdụ. Ọrụ ndị a dị ukwuu nke na ọbụna ndị dibịa afa Ijipt bụ ndị a manyere ikweta, sị: “Mkpịsị aka Chineke ka nke a bụ!”a (Ọpụpụ 8:19) Jehova tiri Ijipt ihe otiti iri, nke ikpeazụ ya manyekwara Fero ikwere ka ndị Chineke hapụ Ijipt. Mgbe Fero gbara isi akwara chịrị ndị agha ya chụsoo ha, ndị Israel gbanahụrụ ya mgbe e si n’ụzọ ọrụ ebube meghee ụzọ n’etiti Osimiri Uhie ahụ. Ndị agha Ijipt sochiri ha, osimiri ahụ wee gbagbuo ha.—Aịsaịa 63:11-14; Hagaị 2:4, 5.

7. (a) Gịnị bụ ihe ụfọdụ mere mmụọ nsọ ji rụọ ọrụ ebube? (b) Ọ bụ ezie na a dịghịkwa enwe ọrụ ebube ndị mmụọ nsọ ahụ kpaliri, n’ihi gịnị ka ihe ndekọ ha n’ime Bible ji na-akasi obi?

7 Ee, site na mmụọ ya, Jehova rụrụ ọrụ ebube ndị dị ike n’ihi ndị Israel n’oge Mosis, nakwa n’oge ndị ọzọ. N’ihi gịnị ka e ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ? Ha mere ka nzube Jehova na-aga n’ihu, mee ka a mara aha ya, gosipụtakwa ike ya. Mgbe ụfọdụkwa, dị ka ọ dị n’ebe Mosis nọ, ha na-egosipụta n’ụzọ a na-apụghị ịrụ ụka na mmadụ nwere nkwado Jehova. (Ọpụpụ 4:1-9; 9:14-16) Otú ọ dị, ọrụ ebube ndị e ji mmụọ nsọ rụọ adịwo ụkọ n’akụkọ nile nke ihe mere eme.b O yiri ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’etiti ndị biri ndụ n’oge Bible adịghị mgbe ha hụrụ otu, taakwa ha adịghị ewerekwa ọnọdụ. Ka o sina dị, ka anyị na-agbaso nsogbu dị iche iche mgba taa, bụ́ ndị pụrụ iyi ihe a na-apụghị imeri emeri, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe nkasi obi ịmara na ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova n’okwukwe, ọ ga-enye anyị otu mmụọ ahụ nke kwadoro Mosis n’ihu Fero ma megheere ndị Israel ụzọ n’etiti Osimiri Uhie ahụ?—Matiu 17:20.

Ihe Ndị E Ji Ike Mmụọ Nsọ Dee

8. Olee òkè mmụọ nsọ keere n’inye Iwu Iri ahụ?

8 Mgbe a gbapụtasịrị ha site n’Ijipt, Mosis duuru ndị Israel gaa n’Ugwu Saịnaị, ebe Jehova nọ soro ha gbaa ndụ ma nye ha Iwu ya. Akụkụ bụ isi nke Iwu ahụ e nyere site n’aka Mosis bụ Iwu Iri ahụ, a kanyekwara ndị mbụ n’ime ndị a n’elu mbadamba nkume. N’ụzọ dị aṅaa? Site na mmụọ nsọ. Bible na-ekwu, sị: “Mgbe [Jehova] kpanyesịịrị Mosis ụka n’ugwu Saịnaị, o wee nye ya mbadamba nkume abụọ nke ihe àmà ahụ, nke e weere mkpịsị aka Chineke dee ihe n’elu ha.”—Ọpụpụ 31:18; 34:1.

9, 10. Olee otú mmụọ nsọ si bata n’ọrụ n’ide Akwụkwọ Nsọ Hibru, oleekwa otú nke a si pụta ìhè n’okwu ndị ndị na-eso ụzọ Jisọs ji mee ihe?

9 Tinyere Iwu Iri ahụ, site na mmụọ ya Jehova nyere Israel ọtụtụ narị iwu na ụkpụrụ dị iche iche iji duzie ndụ nke ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi. A ka ga-enyekwa ọtụtụ n’ọdịnihu. Ọtụtụ narị afọ mgbe ụbọchị Mosis gasịrị, ndị Livaị gbara àmà n’otu ekpere ihu ọha nye Jehova, sị: “Ma ị na-eme ka ọtụtụ afọ dị ogologo n’isi [ndị Israel], i wee were mmụọ gị gbaa àmà megide ha site n’aka ndị amụma gị.” (Nehemaịa 9:5, 30) E dekọrọ ọtụtụ amụma ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ndị ndị amụma buru. Ọzọkwa, mmụọ nsọ kpaliri ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi idetu akụkọ ndị dị nsọ nke ihe mere eme na abụ otuto ndị sitere n’obi.

10 Pọl na-ekwu banyere ihe ndị a nile e dere ede mgbe ọ sịrị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” (2 Timoti 3:16; 2 Samuel 23:2; 2 Pita 1:20, 21) N’ezie, mgbe ha na-ehota akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a, ndị na-eso ụzọ Jisọs na narị afọ mbụ jiri okwu ndị dị ka “mmụọ nsọ kwuru . . . site n’ọnụ Devid,” “mmụọ nsọ wee site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma gwa . . . ha okwu nke ọma,” ma ọ bụ nanị “mmụọ nsọ na-asị,” mee ihe. (Ọrụ 1:16; 4:25; 28:25, 26; Ndị Hibru 3:7) Lee aha ngọzi ọ bụ na otu mmụọ nsọ ahụ nke mere ka e dee Akwụkwọ Nsọ echekwawo ha ka ha wee duzie ma kasie anyị obi taa!—1 Pita 1:25.

Ịdabere na Mmụọ Nsọ

11. Ọrụ dị aṅaa nke mmụọ ahụ ka a na-ahụta n’ihe banyere iwu ụlọ nsọ ahụ?

11 Ka ndị Israel mara ụlọ ikwuu n’ihu Ugwu Saịnaị, Jehova nyere ha iwu iwu ụlọ nsọ dị ka ebe a na-efe ezi ofufe. Olee otú a pụrụ isi rụzuo nke a? “Mosis wee sị ụmụ Israel, Leenụ, Jehova akpọwo Bezalel n’aha, bụ́ nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda; O mejuwokwa ya na mmụọ nke Chineke, n’amamihe, na n’ime nghọta, na n’ihe ọmụma, na n’ije ozi ọ bụla.” (Ọpụpụ 35:30, 31) Mmụọ nsọ mesikwuru nkà ọ bụla Bezalel nwere site n’ọmụmụ ike, ọ ga-enwekwa ike inwe ihe ịga nke ọma n’ilekọta owuwu nke ihe owuwu ahụ dị ịrịbara ama.

12. Olee otú mmụọ ahụ si nye ndị mmadụ ike n’ụzọ pụrụ iche mgbe oge Mosis gasịrị?

12 N’oge ọzọ mgbe e mesịrị, mmụọ Jehova rụrụ ọrụ n’ahụ Samson, na-enye ya ike karịrị nke mmadụ iji nyere ya aka ịgbapụta Israel site n’aka ndị Filistia. (Ndị Ikpe 14:5-7, 9; 15:14-16; 16:28-30) Mgbe oge ụfọdụ gatụkwara, e nyere Solomọn amamihe pụrụ iche dị ka eze nke ndị Chineke họrọworo. (2 Ihe Emere 1:12, 13) N’okpuru ya, Israel nwere ọganihu otú ha na-enwebeghị na mbụ, ọnọdụ obi ụtọ ya ghọrọ ihe atụ nke ngọzi ndi Chineke ga-enwe n’okpuru Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst Jisọs, bụ́ Solomọn Ka Ukwuu.—1 Ndị Eze 4:20, 25, 29-34; Aịsaịa 2:3, 4; 11:1, 2; Matiu 12:42.

13. Olee otú ihe ndekọ mmụọ ahụ inye Bezalel, Samson, na Solomọn ike si agba anyị ume taa?

13 Lee aha ngọzi ọ bụ na Jehova na-eme ka otu ụdị mmụọ ahụ ruo anyị aka taa! Mgbe o yiri anyị ka anyị erughị eru ịrụzu ọrụ e kenyere anyị ma ọ bụ kere òkè n’ọrụ nkwusa, anyị pụrụ ịrịọ Jehova ka o nye anyị otu ụdị mmụọ ahụ o nyere Bezalel. Mgbe anyị na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-enweta mkpagbu, otu mmụọ ahụ nyere Samson ike pụrụ iche ga-eme ka anyị sie ike—ọ bụ ezie na ọ gaghị abụ n’ụzọ ọrụ ebube. Mgbe anyị chekwara nsogbu ndị siri ike ihu ma ọ bụ ọ dị mkpa ka anyị mee mkpebi ndị dị mkpa, anyị pụrụ ịrịọ Jehova, bụ́ onye nyere Solomọn amamihe pụrụ iche, ka o nyere anyị aka ime ihe n’ụzọ amamihe. Mgbe ahụ, dị ka Pọl, anyị ga-asị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime onye ahụ nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Nkwa Jemes ga-abụkwa eziokwu n’ọnọdụ anyị: “Ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe, ya rịọ n’aka Chineke, onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta; a ga-ewerekwa ya nye ya.”—Jemes 1:5.

14. Olee ndị ka mmụọ nsọ kwadoworo n’oge ochie na n’oge a?

14 Mmụọ Jehova dịkwasịkwara Mosis n’ọrụ ya nke ikpere mba ahụ ikpe. Mgbe a họpụtara ndị ọzọ inyere ya aka, Jehova sịrị: “M ga-anarakwa ụfọdụ n’ime mmụọ ahụ nke dịkwasị gị, tụkwasị ha; ha ga-esokwa gị buo ibu ndị Israel, ka i wee ghara ibu ya, nanị gị onwe gị.” (Ọnụ Ọgụgụ 11:17) Otú a, ndị ikom ndị ahụ agaghị eme ihe n’ike nke ha. Mmụọ nsọ kwadoro ha. Anyị gụrụ na n’oge ọzọ, mmụọ Jehova dịkwasịrị ndị ọzọ. (Ndị Ikpe 3:10, 11; 11:29) Mgbe Samuel tere Devid mmanụ dị ka eze Israel n’ọdịnihu, ihe ndekọ ahụ na-asị: “Samuel wee were mpí mmanụ ahụ, tee ya n’etiti ụmụnne ya: mmụọ nke Jehova wee na-adakwasị Devid n’ike site n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.” (1 Samuel 16:13) Ndị nwere oké ibu ọrụ taa—nke ezinụlọ, ọgbakọ, ma ọ bụ nzukọ—pụrụ ịbụ ndị a kasiri obi ịmata na mmụọ Chineke ka na-akwado ndị na-ejere ya ozi ka ha na-elekọta ihe ndị dịịrị ha ime.

15. N’ụzọ dị aṅaa ka mmụọ nsọ siworo nye nzukọ Jehova ike (a) n’ụbọchị Hagaị na Zekaraịa? na (b) taa?

15 Ihe dị ka ọtụtụ puku afọ mgbe ụbọchị Mosis gasịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi site n’etiti ụmụ Israel lọgachiri na Jerusalem site na Babilọn na-enwe ọrụ nke iwughachi ụlọ nsọ ahụ. (Ezra 1:1-4; Jeremaịa 25:12; 29:14) Otú ọ dị, ihe mgbochi ndị siri ike bilitere, ha nwekwara nkụda mmụọ ruo ọtụtụ afọ. N’ikpeazụ, Jehova mere ka ndị amụma bụ Hagaị na Zekaraịa bilie ịgba ndị Juu ahụ ume ka ha hapụ ịdabere n’ike nke ha. Ma olee otú a ga-esi rụzuo ọrụ ahụ? “Ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na mmụọ m, ka Jehova nke usuu ndị agha sịrị.” (Zekaraịa 4:6) Sitekwa ná nkwado mmụọ Chineke, e wuru ụlọ nsọ ahụ. Ndị Chineke taa arụzuwokwa ihe dị ukwuu n’otu aka ahụ. Nkwusa nke ozi ọma ahụ amụbawo gburugburu ụwa. A na-enye ọtụtụ nde mmadụ ọzụzụ n’eziokwu na n’ezi omume. A na-ahazi mgbakọ dị iche iche. A na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. E mewo akụkụ dị ukwuu n’ihe ndị a mgbe a na-enwe mmegide dị ilu. Ma Ndịàmà Jehova adabeghị mbà n’obi, ebe ha maara na otu mkpụrụ ihe ọ bụla ha rụzuworo abụwo site na mmụọ Chineke, ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ma ọ̀ bụ n’ike mmadụ.

Mmụọ Chineke na Narị Afọ Mbụ

16. Ahụmahụ dị aṅaa ka ndị na-ejere Jehova ozi tupu oge ndị Kraịst nwere banyere ọrụ nke mmụọ Chineke?

16 Dị ka anyị hụworo, ndị na-ejere Chineke ozi tupu oge ndị Kraịst matara ike mmụọ Chineke nke ọma. Ha dabeere na ya inyere ha aka imezu ihe ndị dị arọ dịịrị ha ime na imezu uche Chineke. Ha matakwara na Iwu ahụ na ihe ndị ọzọ dị nsọ e dere ede sitere na mmụọ nsọ, na e dere ha n’okpuru mmetụta nke mmụọ Jehova, ha wee si otú a bụrụ ‘Okwu Chineke.’ (Abụ Ọma 119:105) Otú ọ dị, oleekwanụ banyere oge ndị Kraịst?

17, 18. Olee ngosipụta ụfọdụ site n’ọrụ ebube nke mmụọ ahụ n’oge ndị Kraịst, gịnịkwa bụ nzube ha?

17 Narị afọ mbụ nke Oge Anyị hụkwara ọrụ ndị dị ebube nke mmụọ Chineke. E nwere ibu amụma ndị mmụọ ahụ kpaliri. (1 Ndị Kọrint 14:1, 3) Ná mmezu nke nkwa Jisọs nke na mmụọ nsọ ga-echetara ndị na-eso ụzọ ya ihe nile o kwuworo nakwa na ọ ga-akụzikwuru ha akụkụ ndị ọzọ nke eziokwu ahụ, e dere akwụkwọ ụfọdụ n’okpuru mmetụta mmụọ nsọ. (Jọn 14:26; 15:26, 27; 16:12, 13) A rụkwara ọrụ ebube, dị ka a ga-akọwa n’ụzọ sara mbara karị n’isiokwu anyị na-esonụ. N’ezie, e ji ọrụ ebube dị ịrịba ama malite narị afọ mbụ ahụ. N’ihe dị ka n’afọ 2 T.O.A., a gaje ịmụ otu nwa pụrụ iche, dịkwa ka ihe ịrịba ama, nne ya bụ onye ka na-eto eto gaje ịbụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Olee otú ọ ga-esi dị otú ahụ? Site na mmụọ nsọ. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ma ọmụmụ Jisọs Kraịst dị otú a: Mgbe e kwererịị na Josef ga-alụ nne ya Meri, mgbe ha a ka edinakọtaghị a hụrụ na ọ dị ime site na mmụọ nsọ.”—Matiu 1:18; Luk 1:35, 36.

18 Mgbe Jisọs tolitere, ọ chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ, gwọọ ndị ọrịa, ọbụna kpọlite ndị nwụrụ anwụ site n’ike mmụọ nsọ. Ụfọdụ n’ime ụmụ azụ ya rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ndị dị ike. Ikike ndị a pụrụ iche bụ onyinye dị iche iche nke mmụọ. Gịnị bụ nzube ha? Dị ka ọrụ ebube ndị bu ụzọ mere, ha mere ka nzube Chineke gaa n’ihu, gosipụtakwa ike ya. Ọzọkwa, ha gosipụtara izi ezi nke nzọrọ Jisọs na-eme na ọ bụ Chineke zitere ya; na mgbe e mesịrị, ha gosipụtara na ọgbakọ ndị Kraịst na narị afọ mbụ bụ mba nke Chineke họọrọ.—Matiu 11:2-6; Jọn 16:8; Ọrụ 2:22; 1 Ndị Kọrint 12:4-11; Ndị Hibru 2:4; 1 Pita 2:9.

19. Olee otú ihe ndekọ Bible nke ọrụ ebube ndị Jisọs na ndị ndị ozi ya rụrụ si emesi okwukwe anyị ike?

19 Otú ọ dị, Pọl onyeozi kwuru na ngosipụta ọrụ ebube ndị dị otú ahụ nke mmụọ ahụ dịịrị oge ọgbakọ ahụ bụ nwata nakwa na ọ ga-agabiga, ya mere taa anyị adịghị ahụ ọrụ ebube ndị dị otú ahụ bụ́ ndị mmụọ nsọ na-akpali. (1 Ndị Kọrint 13:8-11) Ma, ọrụ ebube ndị Jisọs na ndị ndị ozi ya rụrụ metụtara ihe karịrị akụkọ ihe mere eme. Ha gbara okwukwe anyị ume ná nkwa Chineke nke na ọrịa na ọnwụ agaghị enwe ọnọdụ n’okpuru ịchịisi Jisọs n’ụwa ọhụrụ.—Aịsaịa 25:6-8; 33:24; 65:20-24.

Rite Uru Site na Mmụọ Nsọ Chineke

20, 21. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ndokwa mmụọ nsọ mee ihe n’ụzọ bara uru?

20 Lee aha ikike dị ike mmụọ nke a bụ! Ma olee otú ndị Kraịst pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ụzọ bara uru taa? Nke mbụ, Jisọs sịrị na anyị kwesịrị ịrịọ maka ya, ya mere gịnị mere ị gaghị eme nnọọ nke ahụ? Kpegara Jehova ekpere ka o nye gị onyinye nke a dị ebube ọ bụghị nanị n’oge nrụgide kama n’oge nile. Tinyere nke ahụ, gụọ Bible ka mmụọ nsọ wee nwee ike ịgwa gị okwu. (Tụlee Ndị Hibru 3:7.) Tụgharịa uche n’ihe ị na-agụ ma tinye ya n’ọrụ ka mmụọ nsọ wee nwee ike inwe mmetụta ná ndụ gị. (Abụ Ọma 1:1-3) Ọzọ, soro ndị ọzọ—n’otu n’otu, n’ọgbakọ, na ná mgbakọ—bụ́ ndị na-adabere na mmụọ Chineke, na-akpakọrịta. Leekwa ka mmụọ nsọ si na-emesi ndị ahụ ike n’ụba bụ́ ndị na-agọzi Chineke ha “n’ime mkpọkọta nile”!—Abụ Ọma 68:26.

21 Ọ̀ bụ na Jehova abụghị Chineke na-emesapụ aka? Ọ sịrị na nanị ihe anyị ga-eme bụ ịrịọ maka mmụọ nsọ, ọ ga-enyekwa anyị ya. Lee ka o si bụrụ ihe nzuzu ịdabere n’amamihe na ike nke onwe anyị mgbe aka anyị pụrụ iru enyemaka dị ike otú a! Otú ọ dị, e nwere ihe ndị ọzọ banyere mmụọ Chineke bụ́ ndị na-emetụta anyị dị ka ndị Kraịst, a ga-atụlekwa ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Okwu ahụ bụ “mkpịsị aka Chineke” na-ezokarị aka n’ebe mmụọ nsọ dị.—Tụlee Luk 11:20 na Matiu 12:28.

b Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ọrụ ebube ndị e dekọrọ n’ime Bible weere ọnọdụ n’oge Mosis na Joshua, Elaịja na Elaịsha, na Jisọs na ndị ozi ya.

Ị̀ Pụrụ Ịza Ajụjụ Ndị Na-esonụ?

◻ Olee otú Jehova si kee ihe nile dị n’eluigwe na n’ala?

◻ Olee ụzọ ụfọdụ mmụọ nsọ si rụọ ọrụ n’oge ndị dịrị tupu oge ndị Kraịst?

◻ Olee otú o si enye anyị nkasi obi taa ịmara ihe mmụọ nsọ rụzuru n’oge ochie?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi jiri ndokwa nke mmụọ nsọ mee ihe n’ụzọ bara uru?

[Foto dị na peeji nke 10]

Mmụọ ahụ nke nyere Samson ike karịrị nke mmadụ pụrụ inye anyị ike n’ihe nile

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya