À Pụrụ Ịtụkwasị Akwụkwọ A Obi?
“M na-ahụ akara ndị e ji n’aka nke ịbụ eziokwu n’ime Bible karịa n’akụkọ ihe mere eme ọ bụla nke ụwa.”—Sir Isaac Newton, ọkà mmụta sayensị a ma ama bụ́ onye England.1
À PỤRỤ ịtụkwasị akwụkwọ a—Bible—obi? Ọ̀ na-ezo aka n’ebe ndị dịrị ndụ n’ezie nọ, n’ebe ala ndị dịrị adị n’ezie, na ihe ndị mere eme n’ezie dị? Ọ bụrụ otú ahụ, e kwesịrị inwe ihe àmà na ọ bụ ndị na-elezi anya, na-ekwu eziokwu dere ya. E nwere ihe nnwapụta. A chọtawo ihe dị ukwuu n’ime ya n’ebe e liri ha n’ime ala, e nwekwara ọbụna ihe ka ukwuu n’ime akwụkwọ ahụ n’onwe ya.
Igwupụta Ihe Àmà Ahụ
Nchọpụta nke ihe mgbe ochie ndị e liri n’ala ndị dị na Bible akwadowo izi ezi nke akụkọ na ọdịdị ala nke Bible. Tụlee nanị ụfọdụ ihe àmà ndị ọkà mmụta ihe ochie gwupụtaworo.
Ndị na-agụ Bible maara Devid nke ọma, bụ́ onye ọzụzụ atụrụ ahụ nwere obi ike nke mesịrị ghọọ eze Israel. Aha ya pụtara ugboro 1,138 n’ime Bible, okwu bụ “Ụlọ Devid”—nke na-ezokarị aka n’usoro eze ya—pụtakwara ugboro 25. (1 Samuel 16:13; 20:16) Ma, ruo mgbe na-adịbeghị anya gara aga, e nweghị ihe àmà ọ bụla doro anya e wezụga Bible nke na Devid dịrị adị. Devid ọ̀ bụ nanị onye e chepụtara echepụta?
Na 1993 otu ìgwè ndị ọkà mmụta ihe ochie, nke Prọfesọ Avraham Biran bụ onye ndú ya, mere nchọpụta na-atụ n’anya, bụ́ nke a kọrọ n’akwụkwọ Israel Exploration Journal. N’ebe e nwere mkputamkpu oge ochie a na-akpọ Tel Dan, n’akụkụ ebe ugwu nke Israel, ha kpupere otu nkume basalt. Ihe a kanyere ná nkume ahụ bụ okwu ndị bụ́ “Ụlọ Devid” na “Eze Israel.”2 Ihe ahụ e dere, nke dị laa azụ na narị afọ nke itoolu T.O.A., ka a sịrị na ọ bụ akụkụ nke ihe ncheta mmeri ndị Aram—ndị iro Israel bụ́ ndị biri n’akụkụ ọwụwa anyanwụ—guzobere. N’ihi gịnị ka ihe a e dere ji dị oké ịrịba ama?
Na-adabere n’akụkọ Prọfesọ Biran na onye òtù ya, bụ́ Prọfesọ Joseph Naveh nyere, otu isiokwu dị na Biblical Archaeology Review kwuru, sị: “Nke a bụ nke mbụ a chọtaworo aha ahụ bụ́ Devid n’ihe odide oge ochie na-abụghị Bible.”3a Ihe ọzọ kwesịkwara ịrịba ama banyere ihe ahụ e dere. E dere okwu bụ́ “Ụlọ Devid” dị ka otu okwu. Ọkà asụsụ bụ́ Prọfesọ Anson Rainey na-akọwa, sị: “A na-amafekarị ihe nkewa okwu . . . , karịsịa ma ọ bụrụ na njikọta ahụ bụ ezigbo aha a maara nke ọma. ‘Ụlọ Devid’ bụ n’ezie aha ọchịchị na nke ebe dị adị n’etiti narị afọ nke itoolu T.O.A.”5 Ya mere ihe àmà na-egosi na Eze Devid na usoro ndị eze ya bụ ndị a maara nke ọma n’ụwa oge gboo.
Nineve—obodo ukwu nke Asiria a kpọrọ aha na Bible—ọ̀ dịrị adị n’ezie? N’oge na-adịbeghị anya dị ka ná mmalite narị afọ nke 19, ụfọdụ ndị nkatọ Bible jụrụ ikwere na ọ dịrị. Ma na 1849, Sir Austen Henry Layard gwupụtara mkpọmkpọ ebe nke obí Eze Senakerib dị na Kuyunjik, ógbè e gosipụtara na ọ bụ akụkụ nke Nineve ochie. E si otú a pịchie ndị nkatọ ahụ ọnụ n’okwu ahụ. Ma mkpọmkpọ ebe ndị a ka nwere akụkọ. N’elu ájá nke otu nkuku e chekwara nke ọma, e nwere ihe ngosi nke mmeri nke obodo e wusiri nnọọ ike, tinyere ndị a dọọrọ n’agha a na-akpụpụta n’ihu eze ahụ wakporo ya. N’elu eze ahụ e nwere ihe a e dere: “Senakerib, eze ụwa, eze Asiria, nọdụrụ n’ocheeze nîmedu wee nyochaa ihe a lụtara n’agha (e wetara) site na Lekish (La-ki-su).”6
Ihe ngosi na ihe odide a, nke a pụrụ ikiri n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie na Britain, kwekọrọ n’akụkọ Bible nke mmeri Senakerib meriri obodo Juda bụ́ Lekish, bụ́ nke e dekọrọ ná 2 Ndị Eze 18:13, 14. N’ikwu banyere ịdị ịrịba ama nke nchọpụta ahụ, Layard dere, sị: “Ònye gaara ekwerewo na ọ pụrụ ime eme, tupu e mee nchọpụta ndị a, na n’okpuru mkputamkpu ala na ihe ndị e kpofuru ekpofu nke kara akara ebe Nineve dịrị, na a ga-achọta akụkọ ihe mere eme nke agha ndị a lụrụ n’etiti Hezekaịa [eze Juda] na Senakerib, nke Senakerib n’onwe ya dere kpọmkwem n’oge ha weere ọnọdụ, ma na-emesi ọbụna ihe ndị dịkarịsịrị nta n’ihe ndekọ Bible ike?”7
Ndị ọkà mmụta ihe ochie egwupụtawo ọtụtụ ọrụ nkà ochie ndị ọzọ—ite, mkpọmkpọ ụlọ, mbadamba nkume, mkpụrụ ego, ihe odide, ihe ncheta, na okwu ndị a kanyere n’ihe—na-akwado izi ezi nke Bible. Ndị na-egwu ala ekpupewo obodo ndị Kaldea bụ́ Ua, isi obodo azụmahịa na okpukpe bụ́ ebe Abraham biri.8 (Jenesis 11:27-31) Ihe Ndekọ Nabonidus, nke e gwupụtara na narị afọ nke 19, na-akọwa ọdịda Babilọn n’aka Saịrọs Onye Ukwu na 539 T.O.A., ihe omume a kọrọ akụkọ ya na Daniel isi nke 5.9 Ihe a kanyere n’ihe (nke e chekwara iberibe ya n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie na Britain) nke a chọtara n’ụzọ gabigara otu ogidi na Tesalọnaịka oge ochie nwere aha ndị ọchịchị obodo a kọwara dị ka “politarch,” okwu a na-amaghị n’akwụkwọ ndị Grik oge ochie ma bụrụ nke Luk so dee Bible jiri mee ihe.10 (Ọrụ 17:6, nkọwa ala ala peji, NW) E si otú a nwapụta izi ezi Luk n’okwu a—dị ka e mewororịị n’ihe ndị ọzọ.—Tụlee Luk 1:3.
Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta ihe ochie adịghị ekwekọrịta mgbe nile, ma ya bụrụzie ikwenyere Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, Bible nwere n’ime onwe ya ihe àmà dị ike nke na ọ bụ akwụkwọ a pụrụ ịtụkwasị obi.
E Dere Ya n’Ụzọ Ezoghị Ọnụ
Ndị ọkọ akụkọ na-ekwu eziokwu ga-edekọ ọ bụghị nanị mmeri ha meriri (dị ka ihe e dere banyere mmeri Senakerib meriri Lekish) kamakwa mmeri e meriri ha, ọ bụghị nanị ihe ịga nke ọma kamakwa ọdịda, ọ bụghị nanị ike kamakwa adịghị ike. Akụkọ ihe mere eme ole na ole ndị nke ụwa na-egosipụta ikwu eziokwu dị otú ahụ.
Banyere ndị ọkọ akụkọ Asiria, Daniel D. Luckenbill na-akọwa, sị: “Ọtụtụ mgbe ọ na-edo anya na nganga ndị eze na-achọ ka a gwagbuo izi ezi nke akụkọ ihe mere eme.”11 Iji maa atụ “nganga ndị eze” dị otú ahụ, ihe ndekọ Eze Ashurnasirpal nke Asiria na-etu ọnụ, sị: “Adị m ngala, abụ m oké mmadụ, e buliri m elu, abụ m onye ukwu, a na-asọpụrụ m, adị m ebube, abụ m onye kasị pụta ìhè, adị m ike, enwere m ume, enwere m obi ike ka ọdụm, abụkwa m onye mmeri!”12 Ị̀ ga-anakwere ihe nile ị gụrụ n’ihe ndekọ dị otú a dị ka akụkọ ihe mere eme nke ziri ezi?
N’ụzọ dị iche, ndị dere Bible gosipụtara ezoghị ọnụ na-eme ka obi ruo ala. Mosis, onye ndú Israel, kọrọ hoo haa emezighị emezi nke nwanne ya nwoke, bụ́ Erọn, nke nwanne ya nwanyị bụ́ Miriam, nke ụmụ nwanne ya bụ́ Nedab na Abaịhu, na nke ndị ya, nakwa mmejọ ndị nke ya. (Ọpụpụ 14:11, 12; 32:1-6; Levitikọs 10:1, 2; Ọnụ Ọgụgụ 12:1-3; 20:9-12; 27:12-14) E kpuchighị ajọ mmejọ ndị nke Eze Devid kama e deturu ha—meekwa otú ahụ mgbe Devid ka na-achị dị ka eze. (2 Samuel, isi nke 11 na 24) Matiu, onye dere akwụkwọ na-aza aha ya, na-akọ otú ndị ozi ahụ (nke ọ bụ otu n’ime ha) si see okwu banyere ịdị mkpa onwe onye ha na otú ha si gbahapụ Jisọs n’abalị e jidere ya. (Matiu 20:20-24; 26:56) Ndị dere akwụkwọ ozi ndị nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nabatara n’ezoghị ihe ọ bụla nsogbu, gụnyere mmekọahụ rụrụ arụ na nkewa, ndị dị n’ọgbakọ ụfọdụ nke ndị Kraịst oge mbụ. Ha ezoghịkwa ọnụ n’ikwu banyere nsogbu ndị ahụ.—1 Ndị Kọrint 1:10-13; 5:1-13.
Ịgbape ọnụ kọọ ihe n’ezoghị ọnụ otú ahụ na-egosi ezi nchegbu maka eziokwu. Ebe ndị dere Bible dị njikere ịkọ ihe ndị na-ekwesịghị ịja mma banyere ndị ha hụrụ n’anya, ndị nke ha, na ọbụna ha onwe ha, ọ̀ bụ na e nweghị ezi ihe mere a ga-eji tụkwasị ihe ha dere obi?
Izi Ezi n’Ihe E Dere
Mgbe a na-ekpe ikpe, a pụrụ ịchọpụta mgbe mgbe izi ezi nke akaebe onye àmà ná ndabere nke ụmụ irighiri ihe mere. Nkwekọrịta n’ụmụ irighiri ihe pụrụ ịnwapụta akaebe ahụ dị ka nke ziri ezi na nke eziokwu, ebe ajọ enweghị nkwekọ pụrụ ikpughe ya dị ka nkata a kpara akpa. N’aka nke ọzọ, akụkọ dị n’usoro gabiga ókè—nke a haziri mkpụrụ ihe ọ bụla a kọrọ nke ọma—pụkwara ikpughe na ọ bụ akaebe ụgha.
Olee ọnọdụ “akaebe” nke ndị dere Bible n’akụkụ nke a? Ndị deturu Bible gosipụtara nkwenyekọ dị ịrịba ama. E nwere ezi nkwekọ ọbụna banyere ụmụ irighiri ihe. Otú ọ dị, a kpachaghị anya hazie nkwekọ ahụ, na-akpali inyowe enyo ma a kpara ya akpa. O doro anya na e bughị ụzọ kpaa nkata ihe ndabakọ ndị ahụ, ndị ahụ dere ha na-ekwekọkarị n’amaghị ụma. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
Matiu so dee Bible dere, sị: “Mgbe Jisọs batasịrị n’ụlọ Pita, O wee hụ nne nwunye ya ka ọ tọgbọrọ n’ahụ ọkụ.” (Matiu 8:14, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ebe a Matiu kwuru ihe na-akpali mmasị ọ bụ ezie na ọ dịghị mkpa: Pita lụrụ nwanyị. Ihe nta a bụ nke Pọl kwadoro, bụ́ onye dere, sị: “Ọ̀ bụ na mụ erughị eru ịdị na-akpọgharị onye Kraịst bụ́ nwunye, dị ka ndị ozi ndị ọzọ na . . . Sifas?”b (1 Ndị Kọrint 9:5, The New English Bible) Okwu gbara ya gburugburu na-egosi na Pọl na-agbachitere onwe ya megide nkatọ na-ekwesịghị ekwesị. (1 Ndị Kọrint 9:1-4) N’ụzọ doro anya, Pọl ewebataghị ihe nta a—Pita ịlụ nwanyị—iji kwado izi ezi nke akụkọ Matiu kama e kwuru ya ná ndaba.
Ndị dere Oziọma anọ ahụ dum—Matiu, Mak, Luk, na Jọn—dekọrọ na n’abalị e jidere Jisọs, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya mịịrị mma agha gbuo ya ohu onye isi nchụàjà, na-ebepụ ntị nwoke ahụ. Nanị Oziọma Jọn kọrọ otu ntakịrị ihe yiri ihe na-adịghị mkpa: “Aha ohu ahụ bụ Malkọs.” (Jọn 18:10, 26) N’ihi gịnị ka nanị Jọn ji nye aha nwoke ahụ? N’amaokwu ole na ole n’ihu akụkọ ahụ kwuru otu ihe nta a na-ekwughị n’ebe ọ bụla ọzọ: “Onye isi nchụàjà maara” Jọn. Ezinụlọ onye isi nchụàjà makwaara ya; ndị na-eje ozi makwa ya, ọ makwa ha. (Jọn 18:15, 16) Mgbe ahụ o kwesịrị nnọọ ekwesị na Jọn kpọrọ aha nwoke ahụ e merụrụ ahụ, ebe ndị ọzọ dere Oziọma, ndị na-amaghị nwoke ahụ, na-emeghị otú ahụ.
Mgbe ụfọdụ, a na-ahapụ nkọwa sara mbara n’otu akụkọ ma nye ya n’ebe ndị ọzọ site n’okwu ndị e kwukanyere ekwukanye. Dị ka ihe atụ, akụkọ Matiu banyere ikpe Jisọs n’ihu Sanhedrin ndị Juu na-ekwu na ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ ‘pịara Ya ihe, sị, Buoro anyị amụma, Kraịst: ònye bụ onye ahụ nke tiri Gị aka?’ (Matiu 26:67, 68) N’ihi gịnị ka ha ga-eji gwa Jisọs ka o ‘buo amụma’ onye tiri ya aka, mgbe onye tiri ya aka guzo kpọmkwem n’ihu ya? Matiu akọwaghị. Ma abụọ n’ime ndị ọzọ dere Oziọma kwuru ihe a hapụrụ: ndị na-akpagbu Jisọs kpuchiri ya ihu tupu e tie ya aka. (Mak 14:65; Luk 22:64) Matiu kọrọ akụkọ ya n’echegbughị ma e tinyere ihe nile ọ bụla.
Oziọma Jọn kọrọ banyere oge mgbe otu oké ìgwè mmadụ gbakọrọ ịṅa Jisọs ntị ka ọ na-ezi ihe. Dị ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu, mgbe Jisọs hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, “Ọ sị Filip, Olee ebe anyị ga-azụta ogbe achịcha, ka ndị a wee rie ihe?” (Jọn 6:5, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) N’etiti ndị nile na-eso ụzọ nọ ebe ahụ, n’ihi gịnị ka Jisọs ji jụọ Filip ebe ha pụrụ ịzụta achịcha? Onye edemede ahụ ekwughị. Ma, n’akụkọ ya na ya bụ otu, Luk kọrọ na ihe ahụ mere weere ọnọdụ na nso Betsaịda, obodo dị n’ụsọ ebe ugwu nke Osimiri Galili, na mbụ kwa n’Oziọma Jọn ọ na-ekwu na “Filip bụ onye Betsaịda.” (Jọn 1:44; Luk 9:10) Ya mere Jisọs n’ezi uche jụrụ onye obodo ya dị nso. Nkwekọ dị n’etiti ụmụ irighiri ihe ndị ahụ dị ịrịba ama, ọ bụ ezie na o doro anya na ọ bụ n’amaghị ụma.
N’ọnọdụ ụfọdụ nhapụ nke ihe ụfọdụ nanị na-agbakwụnye ihe n’ikwu eziokwu nke onye ahụ so dee Bible. Dị ka ihe atụ, onye dere 1 Ndị Eze na-akọ banyere otu oké ụkọ mmiri ozuzo n’Israel. Ọ dị oké njọ nke na eze apụghị inweta mmiri zuru ezu na ahịhịa iji debe ịnyịnya na ịnyịnya ibu ya ndụ. (1 Ndị Eze 17:7; 18:5) Ma, otu ihe ndekọ ahụ kọrọ na Elaịja onye amụma nyere iwu ka e kutere ya mmiri zuru ezu n’Ugwu Kamel (iji mee ihe n’ịchụ àjà) iji wụjuo olulu obosara ya ruru ihe dị ka ma eleghị anya square mita 1,000. (1 Ndị Eze 18:33-35) N’oge ụkọ mmiri ozuzo ahụ, olee ebe mmiri nile ahụ si bịa? Onye dere 1 Ndị Eze enyeghị onwe ya nsogbu ịkọwawa. Otú ọ dị, onye ọ bụla bi n’Israel maara na Kamel dị n’ụsọ Osimiri Mediterranean, dị ka okwu e kwuru ná ndaba mgbe e mesịrị n’akụkọ ahụ na-egosi. (1 Ndị Eze 18:43) N’ihi ya, ọ ga-adịworị mfe inweta mmiri oké osimiri. A sị na akwụkwọ a na-enyezu nnọọ nkọwa bụ nanị akụkọ e chepụtara echepụta nke e mere ka o yie eziokwu, n’ihi gịnị ka onye dere ya, onye n’ọnọdụ ahụ ga-abụ onye ụgha dị akọ, ga-eji hapụ ihe a yiri ihe isi ike n’ihe odide ahụ?
Ya mere à pụrụ ịtụkwasị Bible obi? Ndị ọkà mmụta ihe ochie egwupụtawo ihe zuru ezu iji nwapụta na Bible na-ezo aka n’ebe ndị dịrị ndụ n’ezie nọ, n’ebe obodo ndị dịrị adị n’ezie dị, na n’ebe ihe ndị mere eme n’ezie dị. Ma, ihe dị ike ọbụna karị bụ ihe àmà a na-achọta n’ime Bible n’onwe ya. Ndị dere ihe n’ezoghị ọnụ emeghịrị onye ọ bụla ebere—ọbụnadị onwe ha—n’idekọ kpọmkwem ihe ndị merenụ. Nkwenyekọ dị n’ime nke ihe ndị e dere, gụnyere ndabakọ a na-ebughị ụzọ mee ndokwa ya, na-enye “akaebe” ahụ akara doro anya nke eziokwu. N’inwe “akara ndị e ji n’aka nke ịbụ eziokwu,” Bible bụ, n’ezie, akwụkwọ ị pụrụ ịtụkwasị obi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Mgbe nchọpụta ahụ gasịrị, Prọfesọ André Lemaire kọrọ na nrụzigharị ọhụrụ nke akara e mebiri emebi n’elu okwute Mesha (nke a na-akpọkwa Nkume Moab), nke a chọpụtara na 1868, na-ekpughe na o nwekwara ihe na-ezo aka ‘n’Ụlọ Devid.’4
[Foto dị na peeji nke 15]
Iberibe nkume Tel Dan ahụ
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Ihe a kpụrụ n’elu mgbidi Asiria nke na-egosi nnọchibido nke Lekish, nke e zoro aka ná 2 Ndị Eze 18:13, 14