-
Ònye Bụ Jizọs?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
1. Ònye bụ Jizọs?
Jizọs bụ mmụọ ozi dị ike bi n’eluigwe. Jehova Chineke kere ya tupu ya ekewe ihe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Baịbụl kpọrọ Jizọs “Ọkpara [Chineke] mụrụ naanị ya” maka na ọ bụ naanị ya ka Jehova kere n’onwe ya. (Jọn 3:16) Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova rụkọrọ ọrụ, Jizọs enyere ya aka kee ihe ọzọ niile. (Gụọ Ilu 8:30.) Jehova na Jizọs ka na-arụkọ ọrụ ruo taa. Jizọs ji obi ya niile na-ekwuchite ọnụ Chineke, ya bụ, ọ na-akụziri ndị mmadụ ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “Okwu ahụ.”—Jọn 1:14.
-
-
Olee Otú Ọnwụ Jizọs Ga-esi Zọpụta Anyị?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 27
Olee Otú Ọnwụ Jizọs Ga-esi Zọpụta Anyị?
Anyị na-emehie, na-ata ahụhụ, na-anwụkwa anwụ maka na di na nwunye mbụ, bụ́ Adam na Iv, nupụụrụ Chineke isi.a Ma, anyị nwere olileanya. Jehova haziri otú ọ ga-esi si n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Baịbụl kwuru na Jizọs nwụrụ iji gbapụta anyị. Ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ iji gbapụta mmadụ. Ụgwọ Jizọs kwụrụ ka a gbapụta anyị bụ ndụ ya zuru okè o ji chụọ àjà. (Gụọ Matiu 20:28.) Jizọs ruru eru ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ma, o ji obi ya niile kweta ka e gbuo ya. Ihe a o mere ga-eme ka anyị nwee ike inweta ihe niile Adam na Iv tụfuru. Jizọs gosikwara anyị na otú ya na Jehova si hụ anyị n’anya enweghị atụ. Isiokwu a ga-eme ka i jiri ọnwụ Jizọs nwụrụ kpọrọkwuo ihe.
1. Olee otú ọnwụ Jizọs si abara anyị uru ugbu a?
Anyị na-eme ọtụtụ ihe na-adịghị Jehova mma maka na anyị bụ ndị mmehie. Ma, ọ bụrụ na mmehie anyị mere ewute anyị, anyị esi n’aka Jizọs rịọ Jehova mgbaghara, gbaakwa mbọ ka anyị ghara ime mmehie ahụ ọzọ, anyị na Chineke ga-adị n’ezigbo mma. (1 Jọn 2:1) Baịbụl kwuru, sị: “Kraịst, bụ́ onye ezi omume, nwụrụ naanị otu ugboro n’ihi ndị mmehie ka o duga unu ebe Chineke nọ.”—1 Pita 3:18.
2. Olee otú ọnwụ Jizọs ga-esi baara anyị uru n’ọdịnihu?
Jehova zitere Jizọs Kraịst ka o jiri ndụ ya zuru okè chụọ àjà “ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na [Jizọs], kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) N’ihi ihe a Jizọs mere, ọ gaghị adị anya Jehova emezie ihe niile isi Adam nupụrụ mebiri. Ọ pụtara na ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ, anyị ga-enwe ike inwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs.—Aịzaya 65:21-23.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụtakwuo ihe mere Jizọs ji jiri ndụ ya chụọ àjà nakwa otú àjà ahụ ga-esi baara gị uru.
3. Ọnwụ Jizọs napụtara anyị n’aka mmehie na ọnwụ
Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ihe Adam tụfuru mgbe o nupụụrụ Chineke isi?
Gụọnụ Ndị Rom 5:12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ihe mmehie Adam kpataara gị?
Gụọnụ Jọn 3:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere Jehova ji zite Ọkpara ya n’ụwa?
Adam bụ mmadụ zuru okè. N’ihi mmehie o mere, ụmụ mmadụ na-emehie, na-anwụkwa anwụ
Jizọs bụ mmadụ zuru okè. N’ihi otú o si rubere Chineke isi, ụmụ mmadụ ga-ezu okè, dịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi
4. Ọnwụ Jizọs nwere ike ịbara mmadụ niile uru
Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ọnwụ otu onye ga-esi baara mmadụ niile uru?
Gụọnụ 1 Timoti 2:5, 6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Adam bụ mmadụ zuru okè, ma n’ihi mmehie o mere, mmadụ niile na-emehie, na-anwụkwa anwụ. Jizọs bụkwa mmadụ zuru okè. Olee otú o si “nye ihe dabara adaba a ga-eji agbapụta mmadụ niile”?
5. Àjà Jizọs chụrụ bụ onyinye Jehova nyere gị
Ndị enyi Jehova na-ewere àjà ahụ Jizọs chụrụ ka onyinye Jehova nyere ha. Dị ka ihe atụ, gụọnụ Ndị Galeshia 2:20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú Pọl onyeozi si gosi na o weere àjà ahụ Jizọs chụrụ ka onyinye Chineke nyere ya?
Mgbe Adam mehiechara, a mara ya na ụmụ ọ ga-amụta ikpe ọnwụ. Ma Jehova zitere Ọkpara ya ka ọ bịa nwụọ, nke mere na i nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi.
Ka ị na-agụ amaokwu ndị a, chegodị otú ọ ga-abụ na obi dị Jehova mgbe Ọkpara ya nọ na-ata ahụhụ. Gụọnụ Jọn 19:1-7, 16-18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú obi dị gị maka ihe Jehova na Jizọs meere gị?
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ma otu onye ọ̀ ga-anwụli maka mmadụ niile.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Ọnwụ Jizọs mere ka Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị, meekwa ka o kwe omume na anyị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?
Olee otú o si bụrụ na ndụ Jizọs nke zuru okè bụ ihe mgbapụta dabara adaba?
Olee otú ọnwụ Jizọs nwere ike isi baara gị uru?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe mere e ji kpọọ àjà Jizọs ji ndụ ya zuru okè chụọ ihe mgbapụta.
“Olee Otú Àjà Jizọs Chụrụ Si Bụrụ ‘Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ’?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
Chọpụta ihe anyị ga-eme ka a zọpụta anyị.
Jehova ò nwere ike ịgbaghara onye mere mmehie jọrọ ezigbo njọ?
Chọpụta otú ịmụta na Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà si nyere otu nwoke aka ịgbanwe otú o si ebi ndụ.
“Anaghịzi M Agbara Tigbuo Zọgbuo Ohu” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
a Mmehie abụghị naanị mgbe mmadụ mere ihe ọjọọ. Otú ime ihe ọjọọ si agụ anyị agụụ maka na anyị bụ ụmụ Adam na Iv bụkwa mmehie.
-
-
Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Jehova na Jizọs Meere GịNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
1. Olee otu n’ime ụzọ anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Chineke na Kraịst meere anyị?
Baịbụl kwere anyị nkwa na “onye ọ bụla nwere okwukwe na [Jizọs]” ga-adị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Gịnị ka inwe okwukwe pụtara? Inwe okwukwe abụghị naanị ikwere na Jizọs. Anyị na-esikwa n’ihe ndị anyị na-ekpebi na ihe ndị anyị na-eme egosi ma ànyị nwere okwukwe. (Jems 2:17) Ọ bụrụ na anyị esi n’ihe ndị anyị na-eme na ihe ndị anyị na-ekwu gosi na anyị nwere okwukwe, anyị na Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova, ga-adị n’ezigbo mma.—Gụọ Jọn 14:21.
-