“Chineke Hụrụ Anyị n’Anya Otú A”
“Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otú a, anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta onwe anyị n’anya.”—1 JỌN 4:11.
1. Na March 23 mgbe anyanwụ dasịrị, n’ihi gịnị ka ọtụtụ nde ndị mmadụ ga-eji zukọọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na ebe nzukọ ndị ọzọ gburugburu ụwa?
NA Sunday, March 23, 1997, mgbe anyanwụ dasịrị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-enwe ihe karịrị mmadụ 13,000,000 n’ụwa nile ndị ga-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na ebe ndị ọzọ Ndịàmà Jehova na-enwe nzukọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ngosipụta kasị ukwuu nke Chineke gosipụtara ịhụnanya ya n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ emetụwo obi ha. Jisọs Kraịst lekwasịrị anya n’ihe àmà ahụ magburu onwe ya nke ịhụnanya Chineke, na-asị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
2. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị nile pụrụ ịjụ onwe anyị n’ụzọ bara uru banyere nzaghachi anyị nye ịhụnanya Chineke?
2 Ka anyị na-atụle ịhụnanya nke Chineke gosiworo, anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ nwere ekele n’ezie n’ihe Chineke meworo? Otú m si na-eji ndụ m eme ihe ọ̀ na-enye ihe àmà nke ekele ahụ?’
“Chineke Bụ Ịhụnanya”
3. (a) N’ihi gịnị ka ngosipụta nke ịhụnanya na-ejighị bụrụ ihe pụrụ iche n’ebe Chineke nọ? (b) Olee otú ike na amamihe si pụta ìhè n’ọrụ ya nke okike?
3 Igosipụta ịhụnanya abụghị n’onwe ya oké ihe n’ebe Chineke nọ n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ịhụnanya bụ njimara ya bụ isi. Mgbe ọ na-akwadebe ụwa maka obibi mmadụ, ya iweli ugwu na ịgbakọba mmiri n’ime ọdọ mmiri na n’oké osimiri bụ ngosipụta dị ịtụnanya nke ike. (Jenesis 1:9, 10) Mgbe Chineke mere ka nrugharị mmiri na nrugharị ikuku oxygen na-arụ ọrụ, mgbe o mere ihe ndị dị ndụ anya na-adịghị ahụ na ihe ọkụkụ dị iche iche iji gbanwee ọgwụ ndị dị n’ala ka ha ghọọ ụdị nke ndị mmadụ pụrụ ịmịkọrọ iji nọrọ ndụ, mgbe ọ hịziri klọọkụ usoro ndụ anyị ikwekọ n’ogologo ụbọchị na ọnwa n’elu mbara Ụwa, nke a gosipụtara amamihe dị ukwuu. (Abụ Ọma 104:24; Jeremaịa 10:12) Ma, ọbụna ihe pụtara ìhè karị n’ihe e kere eke a na-ahụ anya bụ ihe àmà nke ịhụnanya Chineke.
4. N’ihe okike a na-ahụ anya, ihe àmà dị aṅaa nke ịhụnanya Chineke ka anyị nile kwesịrị ịhụ ma nwee ekele?
4 Okpo ọnụ anyị na-agwa anyị banyere ịhụnanya Chineke mgbe anyị tabiiri mkpụrụ osisi chara acha, dị ụtọ nke o doro anya na e mere ọ bụghị nanị iji mee ka anyị dịgide ndụ kamakwa iji wetara anyị obi ụtọ. Anya anyị na-ahụ ihe àmà doro anya banyere ya n’ọdịda anyanwụ ndị dị ịtụnanya, eluigwe nke jupụtara na kpakpando n’abalị gbachapụrụ agbachapụ, ụdị dị iche iche na àgwà na-egbuke egbuke nke okooko osisi, egwuregwu nke obere ụmụ anụmanụ, na mmụmụ ọnụ ọchị ịhụnanya nke ndị enyi. Imi anyị na-eme ka anyị mara ya mgbe anyị kuuru ísì ụtọ nke okooko osisi n’oge opupu ihe ubi. Ntị anyị na-anụ ya ka anyị na-ege ntị n’ụda nke nruda mmiri, ukwe nnụnụ, na ụda olu nke ndị a hụrụ n’anya. Ọ na-emetụ anyị n’ahụ mgbe onye a hụrụ n’anya makuru anyị n’ịhụnanya. E nyere ụfọdụ ụmụ anụmanụ ikike ịhụ, ịnụ, ma ọ bụ ịnụ ísìsì ihe ndị mmadụ na-apụghị ịnụ. Ma ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ ndị e mere n’onyinyo Chineke, nwere ikike ịmata ịhụnanya Chineke n’ụzọ ọ na-enweghị anụmanụ pụrụ ịmata.—Jenesis 1:27.
5. Olee otú Jehova si gosi ịhụnanya dị ukwuu n’ebe Adam na Iv nọ?
5 Mgbe Jehova Chineke kere ụmụ mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, o ji ihe àmà nke ịhụnanya ya gbaa ha gburugburu. Ọ kụwo ubi a gbara ogige, paradaịs, ma mee ka ụdị osisi nile too n’ime ya. O mepụtawo osimiri iji nye ya mmiri ma mee ka nnụnụ na anụmanụ ndị na-adọrọ mmasị jupụta na ya. O nyere Adam na Iv ihe ndị a nile dị ka ebe obibi ha. (Jenesis 2:8-10, 19) Jehova mesoro ha dị ka ụmụ ya, akụkụ nke ezinụlọ eluigwe na ala ya. (Luk 3:38) Ebe o nyeworo Iden dị ka ihe ilereanya, Nna eluigwe nke nwoke na nwanyị mbụ ahụ setịpụrụ n’ihu ha ọrụ na-eju afọ nke ịgbasapụ Paradaịs ahụ ka o zuo ụwa. Ụmụ ha gaje ibijupụta ụwa nile.—Jenesis 1:28.
6. (a) Gịnị ka ị na-eche banyere ụzọ nnupụisi nke Adam na Iv weere? (b) Gịnị pụrụ igosi na anyị amụtawo ihe site n’ihe mere n’Iden nakwa na anyị eritewo uru site n’ihe ọmụma ahụ?
6 Otú ọ dị, nwa mgbe nta, Adam na Iv chere ule nke nrubeisi ihu, ule nke iguzosi ike n’ihe. Na mbụ otu onye, e mesịzie onye nke ọzọ egosighị ekele maka ịhụnanya nke a wụkwasịworo n’ahụ ha. Ihe ha mere na-awụ akpata oyi n’ahụ. A pụghị ịgọpụ ya! N’ihi ya, ha tụfuru mmekọrịta ha na Chineke, bụrụ ndị a chụpụrụ n’ezinụlọ ya, chụpụkwa ha n’Iden. Anyị ka na-enwe mmetụta nke mmehie ha taa. (Jenesis 2:16, 17; 3:1-6, 16-19, 24; Ndị Rom 5:12) Ma anyị ọ̀ mụtawo ihe site n’ihe merenụ? Olee otú anyị si na-azaghachi n’ịhụnanya Chineke? Mkpebi ndị anyị na-eme kwa ụbọchị hà na-egosi na anyị nwere ekele maka ịhụnanya ya?—1 Jọn 5:3.
7. N’agbanyeghị ihe Adam na Iv mere, olee otú Jehova si gosi ịhụnanya maka ụmụ ha?
7 Ọbụna ajọ enweghị ekele nke nne na nna anyị mbụ gosiri maka ihe nile Chineke mewooro ha egbochighị ịhụnanya Chineke. N’ihi ọmịiko maka ndị mmadụ a na-amụbeghị mgbe ahụ—gụnyere anyị ndị nọ ndụ taa—Chineke kwere ka Adam na Iv zụlite ezinụlọ tupu ha anwụọ. (Jenesis 5:1-5; Matiu 5:44, 45) A sị na o meghị nke ahụ, ọ dịghị onye n’ime anyị a gaara amụ. Site ná mkpughe a na-ekpughe uche ya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, Jehova nyekwara ihe ndabere maka olileanya ụmụ Adam nile ga-egosipụta okwukwe. (Jenesis 3:15; 22:18; Aịsaịa 9:6, 7) Ndokwa ya gụnyere ụzọ ndị nke mba nile pụrụ isi nwetaghachi ihe Adam tụfuru, ya bụ, ndụ zuru okè dị ka ndị òtù a nwapụtara anwapụta nke ezinụlọ eluigwe na ala nke Chineke. O mere nke a site n’inye ihe mgbapụta.
N’ihi Gịnị Ka Ihe Mgbapụta Ji Dị Mkpa?
8. N’ihi gịnị ka Chineke na-apụghị iji nye nnọọ iwu na ọ bụ ezie na Adam na Iv ga-anwụrịrị, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ ya na-erube isi ga-anwụ?
8 Ọ̀ dị mkpa n’ezie ka a kwụọ ụgwọ ihe mgbapụta n’ụdị nke ndụ mmadụ? Ọ̀ bụ na Chineke apụghị inye nnọọ iwu na ọ bụ ezie na Adam na Iv ga-anwụrịrị maka nnupụisi ha, ụmụ ha nile ndị ga-erubere Chineke isi pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi? Site n’echiche mmadụ na-adịghị ahụ ihe dị anya, nke ahụ pụrụ iyi ihe ezi uche dị na ya. Otú ọ dị, Jehova “na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya.” (Abụ Ọma 33:5) Ọ bụ nanị mgbe Adam na Iv ghọrọ ndị mmehie ka ha mụrụ ụmụ; ya mere ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ụmụ ahụ a mụrụ dị ka onye zuru okè. (Abụ Ọma 51:5) Ha nile nwere ihe nketa nke mmehie, ntaramahụhụ maka mmehie bụkwa ọnwụ. A sị na Jehova leghaararị nke a anya, olee ụdị ihe nlereanya nke ahụ ga-esetịpụrụ ndị òtù nke ezinụlọ eluigwe na ala ya? Ọ pụghị ileghara ụkpụrụ ezi omume ya anya. Ọ kwanyeere ihe ndị ikpe ziri ezi chọrọ ùgwù. Ọ dịtụghị onye ọ bụla pụrụ inwe ihe ziri ezi ọ ga-eji katọọ ụzọ Chineke siri mee ihe banyere ihe iseokwu ndị o metụtara.—Ndị Rom 3:21-23.
9. N’ikwekọ n’ụkpụrụ ikpe ziri ezi nke Chineke, ụdị ihe mgbapụta dị aṅaa ka a chọrọ?
9 Oleezi otú a pụrụ isi enye ihe ndabere kwesịrị ekwesị maka ịgbapụta ụmụ Adam ndị ga-egosipụta nrubeisi ịhụnanya nye Jehova? Ọ bụrụ na mmadụ zuru okè ga-anwụ ọnwụ ịchụ àjà, ikpe ziri ezi pụrụ ikwe ka uru nke ndụ ahụ zuru okè weta ihe mkpuchi maka mmehie nke ndị ga-anakwere ihe mgbapụta ahụ n’okwukwe. Ebe ọ bụ na mmehie nke otu onye, bụ́ Adam, mere ka ezinụlọ nile nke mmadụ bụrụ ndị mmehie, ọbara nke mmadụ ọzọ zuru okè a wụfuru, n’ịbụ nke uru ya hà ka nke ahụ, pụrụ ime ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ikpe ziri ezi nọrọ n’ezi nhazi. (1 Timoti 2:5, 6) Ma olee ebe a pụrụ ịchọta ụdị onye ahụ?
Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Ọnụ Ahịa Ya Dị Ukwuu?
10. N’ihi gịnị ka ụmụ Adam na-enweghị ike iweta ihe mgbapụta ahụ a chọrọ?
10 N’ime ụmụ Adam onye mmehie, ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ inye ihe dị mkpa iji zụtaghachi olileanya ndụ nke Adam tụfuworo. “Ọ dịghị onye ọ bụla ga-agbapụta nwanne ya ma ọlị, ọ gaghị enye Chineke ihe mgbapụta ya: (n’ihi na mgbapụta mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ ahịa, ọ ga-arakwa ya aka ruo mgbe ebighị ebi:) ka o wee dịgide ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ghara ịhụ mbibi anya.” (Abụ Ọma 49:7-9) Kama ịhapụ ihe a kpọrọ mmadụ n’enweghị ụzọ mgbapụ ọ bụla, Jehova n’onwe ya ji ebere mee ndokwa.
11. Site n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si weta ndụ mmadụ zuru okè dị mkpa maka ihe mgbapụta kwesịrị ekwesị?
11 Jehova eziteghị otu mmụọ ozi n’ụwa ime dị ka a ga-asị na ọ nwụrụ site n’ịtọgbọ ahụ a na-ahụ anya ma ka dịgide ndụ dị ka mmụọ. Kama nke ahụ, site n’ịrụ ọrụ ebube nke nanị Chineke, Onye Okike, pụrụ ịhaziworị, o bufere ike ndụ na ụkpụrụ ọdịdị nke otu nwa eluigwe n’akpa nwa otu nwanyị, bụ́ Meri nwa nwanyị Hili, nke agbụrụ Juda. Ike ọrụ Chineke, mmụọ nsọ ya, chebere ntolite nke nwa ahụ n’akpa nwa nne ya, a mụkwara ya dị ka mmadụ zuru okè. (Luk 1:35; 1 Pita 2:22) Mgbe ahụ onye a nwere ụgwọ ahụ dị mkpa iji nye ihe mgbapụta nke ga-emezu ihe ikpe ziri ezi Chineke chọrọ.—Ndị Hibru 10:5.
12. (a) N’echiche dị aṅaa ka Jisọs bụ ‘Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya’? (b) Olee otú nzite Chineke zitere onye a iji nye ihe mgbapụta ahụ si mee ka ịhụnanya Ya maka anyị pụta ìhè?
12 Ònye n’ime ọtụtụ miriad nke ụmụ ndị ikom eluigwe ya ka Jehova nyere ọrụ a? Ọ bụ onye a kọwara n’Akwụkwọ Nsọ dị ka “Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya.” (1 Jọn 4:9) E ji okwu a akọwa, ọ bụghị ihe ọ ghọrọ mgbe a mụrụ ya dị ka mmadụ, kama ihe ọ bụ tupu mgbe ahụ n’eluigwe. Ọ bụ nanị onye Jehova ji aka ya kee n’enweghị onye ọzọ tinyere aka. Ọ bụ Onye E Buru Ụzọ Mụọ n’ihe nile e kere eke. Ọ bụ onye Chineke ji mee ihe n’ime ka ihe ndị ọzọ e kere eke dịrị. Ndị mmụọ ozi bụ ụmụ ndị ikom nke Chineke, dị ka Adam bụ nwa Chineke. Ma a kọwara Jisọs dị ka onye nwere “otuto dị ka otu nwa nwoke a mụrụ nanị ya na-anata n’aka nna ya.” A sịrị na ọ “na-adabere n’obi Nna Ya.” (Jọn 1:14, 18) Mmekọrịta ya na Nna ya bụ nke chiri anya, dịịrị nanị ha, dị nro. O nwere ụdị ịhụnanya Nna ya nwere maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ilu 8:30, 31 na-ekwu mmetụta Nna ya nwere banyere Ọkpara a na mmetụta Ọkpara ahụ na-enwe banyere ihe a kpọrọ mmadụ: “M wee bụrụ ihe na-atọ [Jehova] ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwu n’ihu Ya mgbe nile; . . . ihe na-atọ m [Jisọs, Onye Ọkà Ọrụ Jehova, amamihe n’onwe ya] ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” Ọ bụ Ọkpara a a hụrụ n’anya karịsịa ka Chineke zitere n’ụwa inye ihe mgbapụta ahụ. Ya mere, lee ka okwu Jisọs ahụ si nwee ihe ọ pụtara: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya”!—Jọn 3:16.
13, 14. Gịnị ka ihe ndekọ Bible banyere mgbalị Abraham mere ịchụ Aịsak n’àjà ga-enyere anyị aka ịghọta banyere ihe Jehova mere? (1 Jọn 4:10)
13 Iji nyere anyị aka ịghọtatụ ihe nke ahụ pụtara, ogologo oge tupu Jisọs abịa n’ụwa, Chineke nyere Abraham ntụziaka, ihe dị ka afọ 3,890 gara aga, sị: “Biko, were nwa gị nwoke nke i nwere nanị ya, onye ị hụrụ n’anya, bụ́ Aịsak, jee ala Moraịa; suree ya n’ebe ahụ, ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ, n’elu otu n’ime ugwu ahụ nke M ga-asị gị jee.” (Jenesis 22:1, 2) N’okwukwe, Abraham rubere isi. Tinye onwe gị n’ọnọdụ Abraham. Gịnị ma a sị na ọ bụ nwa gị nwoke, nanị nwa nwoke ị mụrụ nanị ya nke ị hụrụ n’anya nke ukwuu? Mmetụta dị aṅaa ka ị ga-enwe ka ị na-awa nkụ maka àjà nsure ọkụ, na-eme njem were ọtụtụ ụbọchị aga n’ala Moraịa, ma na-atụkwasị nwa gị nwoke n’elu ebe nchụàjà?
14 N’ihi gịnị ka nne ma ọ bụ nna dị ọmịiko ji enwe mmetụta dị otú ahụ? Jenesis 1:27 na-ekwu na Chineke mere mmadụ n’onyinyo Ya. Mmetụta ịhụnanya na ọmịiko anyị nwere na-egosipụta n’ụzọ dị nnọọ nta ịhụnanya na ọmịiko Jehova. N’ọnọdụ Abraham, Chineke gbochiri ya, nke na a chụghị Aịsak n’àjà n’ezie. (Jenesis 22:12, 13; Ndị Hibru 11:17-19) Otú ọ dị, n’ọnọdụ nke ya, Jehova akwụsịghị ozugbo oge ruru inye ihe mgbapụta ahụ, ọ bụ ezie na e mere ya n’ọnụ ahịa buru ibu nye ma ya onwe ya ma Ọkpara ya. Ihe e mere abụghị n’ihi ibu ọrụ ọ bụla dị n’ubu Chineke, kama nke ahụ, dị ka ngosipụta nke ebere na-erughịrị mmadụ nke pụrụ iche. Ànyị nwere ekele maka ya n’ụzọ zuru ezu?—Ndị Hibru 2:9.
Ihe O Mere Ka O Kwe Omume
15. Olee otú ihe mgbapụta ahụ siworo metụta ọtụtụ ndụ ọbụna n’usoro ihe a dị ugbu a?
15 Ndokwa ịhụnanya ahụ nke Chineke mere nwere mmetụta dị ukwuu ná ndụ nke ndị na-anakwere ya n’okwukwe. Ha bụbu ndị ala ọzọ n’ebe Chineke nọ n’ihi mmehie. Dị ka Okwu ya na-ekwu, ha bụ ‘ndị iro n’echiche uche ha n’ime ajọ ọrụ nile.’ (Ndị Kọlọsi 1:21-23) Ma ha ghọrọ ndị “e sitere n’ọnwụ Ọkpara Ya mee ka [ha] na Chineke dị n’otu.” (Ndị Rom 5:8-10) Ebe ha gbanweworo ụzọ ndụ ha ma nakwere mgbaghara nke Chineke na-eme ka o kwee omume nye ndị na-egosipụta okwukwe n’àjà Kraịst, a na-enye ha akọ na uche dị ọcha.—Ndị Hibru 9:14; 1 Pita 3:21.
16. Ngọzi ndị dị aṅaa ka e nyere ìgwè atụrụ nta ahụ n’ihi okwukwe ha n’ihe mgbapụta ahụ?
16 Jehova enyewo ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè n’ime ndị a, bụ́ ìgwè atụrụ nta, ihu ọma na-erughịrị ha nke isoro Ọkpara ya n’Alaeze eluigwe ahụ, n’ebumnobi nke ịrụzu nzube mbụ nke Chineke maka ụwa. (Luk 12:32) Ndị a abụwo ndị a kpọpụtara site “n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla . . . ka ha bụrụ alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị; ha bụkwa eze n’elu ụwa.” (Mkpughe 5:9, 10) Nye ndị a, Pọl onyeozi dere, sị: “Unu natara Mmụọ nke ido ka nwa nwoke, Nke anyị na-eti mkpu n’ime Ya, sị, Aba, Nna. Mmụọ Nsọ onwe ya sooro mmụọ anyị na-agba àmà, na anyị bụ ụmụ Chineke: ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa; ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraịst na-ekekọ.” (Ndị Rom 8:15-17) N’ịbụ ndị Chineke doro dị ka ụmụ ya, e nyere ha mmekọrịta dị mma nke Adam tụfuru; ma a ga-enye ụmụ a ihe ùgwù ọzọ nke ije ozi eluigwe—ihe ọ na-adịghị mgbe Adam nwere. Ka a sịkwa ihe mere Jọn onyeozi ji sị: “Leenụ aha ịhụnanya nke a bụ nke Nna anyị nyeworo anyị, ka e wee kpọọ anyị ụmụ Chineke”! (1 Jọn 3:1) Nye ndị dị otú ahụ Chineke na-egosipụta, ọ bụghị nanị ịhụnanya nke ụkpụrụ na-eduzi (a·gaʹpe), kamakwa mmetụta ịhụnanya dị nro (phi·liʹa), bụ́ ihe e jiri mara nkekọ nke dị n’etiti ezi ndị enyi.—Jọn 16:27.
17. (a) Nye ndị nile na-egosipụta okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, ohere dị aṅaa ka e nyere? (b) Gịnị ka “inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke” pụtaara ha?
17 Nyekwa ndị ọzọ—ndị nile na-egosi okwukwe ná ndokwa mmesapụ aka nke Chineke maka ndụ site na Jisọs Kraịst—Jehova na-emeghe ohere iji nweta mmekọrịta ahụ dị oké ọnụ ahịa nke Adam tụfuru. Pọl onyeozi kọwara, sị: “Olileanya siri ike nke ihe nile e kere eke [ihe e kere eke bụ́ mmadụ sitere n’Adam] na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike [ya bụ, ha na-echere oge mgbe ọ pụtara ìhè nke ọma na ụmụ ndị ikom Chineke ndị ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe na-eme ihe pụtara ìhè maka ihe a kpọrọ mmadụ]. N’ihi na e doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu [a mụnyere ha n’ime mmehie n’atụmanya nke ọnwụ, ọ dịghịkwa ụzọ ha pụrụ isi tọhapụ onwe ha], ọ bụghị na ọ chọrọ ya, kama n’ihi Onye ahụ Nke doro ya n’okpuru ya n’olileanya [nke Chineke nyere]; n’ihi na a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:19-21) Gịnị ka nnwere onwe ahụ ga-apụta? Na a tọhapụwo ha site n’agbụ nke mmehie na ọnwụ. Ha ga-enwe izu okè nke uche na ahụ, Paradaịs dị ka ebe obibi ha, na ndụ agwụghị agwụ ebe ha ga-anụ ụtọ izu okè ha ma gosipụta ekele ha nye Jehova, nanị ezi Chineke ahụ. Oleekwa otú e si mee ka nke a nile kwee omume? Site n’àjà mgbapụta nke Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya.
18. Na March 23 mgbe anyanwụ dasịrị, gịnị ka anyị ga na-eme, n’ihi gịnịkwa?
18 Na Nisan 14, 33 O.A., n’ụlọ elu dị na Jerusalem, Jisọs guzobere Ememe Ncheta nke ọnwụ ya. Ememe ncheta nke ọnwụ ya a na-eme kwa afọ abụrụwo ihe omume dị mkpa ná ndụ nke ezi ndị Kraịst nile. Jisọs n’onwe ya nyere iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Na 1997 a ga-eme Ememe Ncheta a mgbe anyanwụ dasịrị na March 23 (nke bụ mgbe Nisan 14 na-amalite). N’ụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe ọzọ pụrụ ịdị mkpa karịa ịnọ ya maka Ememe Ncheta a.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Chineke gosiworo ịhụnanya dị ukwuu maka ihe a kpọrọ mmadụ?
◻ N’ihi gịnị ka ndụ mmadụ zuru okè ji dị mkpa iji gbapụta ụmụ Adam?
◻ N’oké ọnụ ahịa dị aṅaa ka Jehova nyere ihe mgbapụta ahụ?
◻ Gịnị ka ihe mgbapụta ahụ mere ka o kwe omume?
[Foto dị na peeji nke 10]
Chineke nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya