Isi 11
Ndị Lanarịrị Agaghị Abụ “Akụkụ nke Ụwa”
1, 2. (a) Gịnị ka Jisọs kwuru banyere mmekọrịta ndị na-eso ụzọ ya na ụwa? (b) Gịnị ka nke ahụ na-apụtaghị, n’ihi gịnịkwa?
GỊNỊ ka Jisọs bu n’uche n’ikwu na ndị na-eso ụzọ ya nọ “n’ụwa,” ma ha agaghị ‘abụ akụkụ nke ụwa’? (Jọn 17:11, 14) Iji soro ná ndị ga-alanarị ibi ndụ n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke, anyị kwesịrị ịghọta nke a.
2 Na mbụ tụlee ihe ‘abụghị akụkụ nke ụwa’ na-apụtaghị. Ọ pụtaghị na anyị ga-anọpụ iche dị ka ndị bi nanị ha n’ime ọgba ma ọ bụ wezuga onwe anyị n’ebe obibi nke ndị ụkọ ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ dịpụrụ adịpụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, n’abalị tupu ọnwụ ya Jisọs kpekuru Nna ya ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, na-asị: “Adịghị m arịọ gị ka i wepụ ha n’ụwa, kama ka ị na-eche ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị akụkụ nke ụwa, ọbụna dị ka mụ onwe m na-abụghị akụkụ nke ụwa.”—Jọn 17:15, 16, NW.
3, 4. (a) N’ihe omume ndị dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka ndị Kraịst na ndị ụwa mekọrịta ihe? (b) Ma gịnị ka ha na-aghaghị izere?
3 Kama izopụ ha pụọ n’ebe ndị mmadụ nọ, e ‘zigara ndị na-eso ụzọ Jisọs n’ime ụwa’ ime ka a mara eziokwu. (Jọn 17:18) N’ime otú ahụ, ha dị ka “ìhè nke ụwa,” na-eme ka ìhè nke eziokwu nwuo iji mee ka ụmụ mmadụ hụ otú eziokwu Chineke si emetụta ndụ ndị mmadụ maka ọdịmma ha.—Matiu 5:14-16.
4 Ndị Kraịst na ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe mmekọrịta mgbe ha na-arụ ọrụ iji kwado onwe ha na ezinụlọ ha nakwa mgbe ha na-ewegara ndị mmadụ ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ya mere, dị ka Pọl onyeozi gosiri, a tụghị anya na ha ga-esi “n’ụwa pụọ” n’ụzọ nkịtị. Ha apụghị kpam kpam ịghara iso ndị ụwa ‘mekọọ ihe.’ Ma ha pụrụ, ha aghaghịkwa izere omume ọjọọ nile nke ihe ka n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ .—1 Ndị Kọrint 5:9-11.
5. È si aṅaa nye ihe atụ nke nnọpụiche a chọrọ site n’ụwa n’ọnọdụ Noa na ezinụlọ ya?
5 Ọnọdụ ahụ yiri nke ụbọchị Noa mgbe Chineke hụtara na “mmadụ nile ebiwo ndụ rere ure n’ụwa.” (Jenesis 6:12, The New English Bible) Ma Noa na ezinụlọ ya biri ndụ n’ụzọ dị iche. Site n’ịjụ isonye n’omume rụrụ arụ gbara ya gburugburu na site n’ikwusa ezi omume, Noa ‘mara ụwa ikpe.’ O gosiri na o nweghị ihe ngọpụ ọ bụla mere na o kwekọghị ná nzube Chineke. (Ndị Hibru 11:7; 2 Pita 2:5) Ọ bụ ya mere na mgbe Iju Mmiri wetara ụmụ mmadụ na-adịghị asọpụrụ Chineke ná ngwụsị, ya na ezinụlọ ya lanarịrị. Ha nọ “n’ụwa” ma n’otu mgbe ahụ ha ‘abụghị akụkụ nke ụwa.’—Jenesis 6:9-13; 7:1; Matiu 24:38, 39.
Gịnị Bụ Ịhụnanya Kwesịrị Ekwesị maka Ndị Ụwa?
6. Ò kwesịrị ekwesị igosi ịhụnanya ọ bụla n’ebe ndị ụwa nọ?
6 Mmadụ abụghị ‘akụkụ nke ụwa’ ọ̀ ga-apụtakwa ịbụ onye na-akpọ ndị mmadụ asị? Ime otú ahụ ga-etinye mmadụ n’ọnọdụ ọjọọ n’ebe Jehova Chineke nọ, onye Ọkpara ya bụ́ Jisọs sịrị na ọ “hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Ya mere obi ọma na ebere Chineke n’ebe ụdị mmadụ nile nọ bụụrụ anyị ihe nlereanya ịgbaso.—Jọn 3:16; Matiu 5:44-48.
7, 8. (a) Olee ihe Bible kwuru banyere ịhụ ụwa n’anya? (b) Olee ụwa nke anyị na-aghaghị ịnọpụ iche pụọ na ya? (ch) Gịnị mere anyị na-aghaghị iji zere ụwa na ọchịchọ ya nile?
7 Ma Jọn onyeozi ọ́ gwaghị anyị sị, “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya”? Ọ bụrụ na Chineke n’onwe ya hụrụ ụwa n’anya, gịnị mere onyeozi ahụ ji kwuo nke a?—1 Jọn 2:15.
8 Bible gosiri na Chineke hụrụ ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’anya nanị dị ka ndị mmadụ ndị nọ n’ọnọdụ ezughị okè, ndị na-anwụ anwụ ma nọrọ n’oké mkpa nke enyemaka. N’aka nke ọzọ, Setan achịkọtawo ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ mmadụ imegide Chineke. Ọ bụ “ụwa” ahụ—òtù ụmụ mmadụ ndị e wezugara n’ebe Chineke nọ, nke nọkwa n’okpuru nchịkwa Setan—ka ezi ndị Kraịst ga-anọpụ iche site na ya. (Jemes 1:27) Okwu Chineke na-adọ anyị aka ná ntị megide ịhụ ọchịchọ na omume ọjọọ nile nke ụwa ahụ n’anya: “N’ihi na ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị na Nna anyị, kama o sitere n’ụwa. Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:15-17.
9, 10. (a) À pụrụ isi aṅaa kwuo na ọchịchọ ndị a ‘sitere n’ụwa’? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ọchịchọ ndị a nweworo n’ebe ụmụ mmadụ nọ?
9 Ee, ọchịchọ anụ ahụ ndị ahụ na nke anya nakwa mbuli onwe onye elu ‘sitere n’ụwa.’ Ha bụ ihe ndị pulitere n’ime nne na nna mbụ nke ihe a kpọrọ mmadụ wee dubakwa ha n’ịchọ inwere onwe ha pụọ n’ebe Chineke nọ iji gbasoo ọchịchọ onwe onye ha. Ịgbaso ọchịchọ ndị a nke onwe onye nke ụwa dubara n’imebi iwu Chineke.—Jenesis 3:1-6, 17.
10 Tụlee ihe ị na-ahụ gburugburu gị. Ọ̀ bụ na ihe ka ukwuu n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ ewughị ndụ ha gburugburu ọchịchọ nke anụ ahụ na nke anya na “oké okwu nke ibi obi”? Ọ́ bụghịkwa ihe ndị a na-ekpebi olileanya na mmasị ha, na-achịkwa ụzọ ha si eme ihe ma na-emeso ndị ọzọ? N’ihi nke a, akụkọ nke mmadụ bụ ogologo ihe ndekọ nke adịghị n’otu na agha, nke omume rụrụ arụ na imempụ, azụmahịa oké uru na mmegbu, nke ime okomoko, na nke nchụso ịbụ onye a ma ama na ike.
11. Ya mere, gịnị mere na ịhụnanya Chineke maka ụwa ekwekọghị n’ihe Okwu ya megidere?
11 Ya mere, anyị pụrụ ịhụta na ịhụ ụwa n’anya dị ka Chineke si hụ ya dị nnọọ iche pụọ n’ịhụ agụụ ihe ọjọọ na omume ọjọọ n’anya, bụ́ ndị ọ machibidoro iwu. Ịhụnanya Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ emeghewo ụzọ nke inwere onwe site n’ọchịchọ mmehie ndị ahụ na ihe ọjọọ ha na-akpata, tinyere ọnwụ n’onwe ya. O gosipụtara ịhụnanya nke a site n’inye Ọkpara ya ka ọ gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ àjà ahụ nọgidekwa ná nnupụisi, Bible na-asị na “iwe Chineke na-anọgide n’ahụ ya.”—Jọn 3:16, 36; Ndị Rom 5:6-8.
Inwere Onwe Pụọ ná Nchịkwa nke “Onyeisi Ụwa Nke a”
12. Ànyị ga-esi aṅaa kpebie ma ịhụnanya anyị pụrụ inwe maka ụmụ mmadụ ndị ụwa ọ̀ na-atọ Chineke ụtọ ma ọ bụ na ọ dịghị atọ ya?
12 Mgbe ahụ, gịnị banyere anyị? Ànyị nwere “ịhụnanya” n’ebe ndị mmadụ nke ụwa nọ, n’echiche nke ịchọ n’ezie inyere ha aka ịchọta ụzọ na-enye ndụ n’ihu ọma Chineke? Ka ànyị hụrụ ihe ndị ahụ na-egbochi ha ịghọ ndị ohu Chineke n’anya—mmụọ ha nke inwere onwe, ngosipụta nke ihe ha nwere, obi ike ha n’ịdị mkpa nke onwe ha na ebube ha? Ọ bụrụ na anyị enwee mmasị ịnọnyere ndị mmadụ n’ihi ụdị àgwà ndị ahụ, mgbe ahụ anyị na-ahụ ụwa n’anya n’ụzọ onyeozi ahụ megidere.
13. Ịhụ ụwa n’anya ọ̀ pụrụ isi aṅaa dọghachi mmadụ azụ ijere Chineke ozi?
13 Ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị Jisọs hụrụ ụzọ nke ụwa n’anya. Ya mere ha hapụrụ iguzosi ike dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs. Ha achọghị ịtụfu iwu ewu ha na ọnọdụ ha n’etiti ndị mmadụ n’ihe omume mmekọrịta mmadụ na ibe ya nakwa n’okpukpe. Ha hụrụ otuto ndị mmadụ n’anya karịa ịja mma Chineke. (Jọn 12:42, 43) N’eziokwu, ụfọdụ rụrụ ọrụ afọ ọma dị iche iche, rụọkwa ọrụ ndị ọzọ nke okpukpe. Ma ha mere ihe ndị ahụ n’ụzọ bụ isi n’ihi na ha chọrọ ka ndị mmadụ na-elegara ha anya. (Matiu 6:1-6; 23:5-7; Mak 12:38-40) Ọ̀ bụ na ị dịghị ahụ ndị mmadụ ka ha na-egosipụta otu ụdị ịhụnanya nke a maka ụzọ ọjọọ nke ụwa taa? Ma, Bible na-egosi na ụdị “ịhụnanya” nke a pụrụ iduba nanị ná mbibi.
14. Ònye tinyere Jisọs n’ọnwụnwa mgbe ọ nọ n’ụwa, gịnịkwa si na ya pụta?
14 E dokwara Ọkpara Chineke n’onwe ya n’okpuru ọnwụnwa n’ihi otu ihe ndị a. E mere mgbalị iji kpalie n’ime ya ọchịchọ onwe onye ime ngosipụta nke ihe o ji biri nke ga-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ọ nọ—ka ọ dị ka ụwa. E nyere ya ọbụna ịchịisi nke mba nile tinyere ebube ha. Ma ọ jụrụ kpam kpam ihe ndọrọ mmasị nke ọchịchọ onwe nanị ndị ahụ. Ha sitere n’aka onye mbụ ahụ mara ọkaaka Jehova Chineke aka, bụ́ Setan Ekwensu.—Luk 4:5-12.
15. Gosi site na Bible gị onye bụ “onyeisi ụwa nke a.”
15 Ịmata banyere onyinye nke ịchịisi Setan nyere Jisọs dị mkpa n’ịghọta ihe mere na anyị ‘agaghị abụ akụkụ nke ụwa.’ Ọ na-egosi na ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya, tinyere ịchịisi ya, nwere Onyeiro Chineke dị ka onye na-achịkwa ya nke a na-adịghị ahụ anya. Jisọs n’onwe ya kpọrọ Setan “onyeisi ụwa nke a.” (Jọn 12:31; 14:30; 2 Ndị Kọrint 4:4) Pọl onyeozi hotakwara “ndị agha mmụọ nke ajọ ihe,” bụ́ ndị mmụọ ọjọọ nọ n’okpuru nduzi Setan dị ka ndị bụ “ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a.” Pọl dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị banyere mkpa nke ihe okike agha nke ime mmụọ iji guzogide ndị “onwe ụwa” ndị a.—Ndị Efesọs 6:10-13.
16. Ókè ụwa hà aṅaa ka Setan duhieworo, ókè hà aṅaa nọkwa n’okpuru ya?
16 Nanị mmadụ ole na ole nwerewooro onwe ha pụọ ná nduzi nke onye na-achị isi nke a nke a na-adịghị ahụ anya na ndị agha ya. Ya mere, “ụwa,” ya bụ ìgwè mmadụ ndị e wezugara n’ebe Chineke nọ, “na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” Site n’ike ndị mmụọ ọjọọ ‘ọ na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi’ tinyere ndị ọchịchị ụwa, na-anyagharị ha imegide Chineke na Alaeze ya.—1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:9; 16:13, 14; 19:11-18.
17. (a) Gịni ka àgwà nke ụwa nke a na-egosipụta na-agba àmà ya banyere onye na-edu ụmụ mmadụ? (b) Ọ̀ ga-atọ Onye Okike ụtọ ma ọ bụrụ na anyị egosipụta mmụọ dị otú ahụ?
17 Nke a pụrụ isi ike ikweta. Ma, ọ̀ bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ n’ụwa nke a adịghị egosipụta omume na ọrụ nke Onyeiro Chineke? N’ụwa dum anyị na-ahụ ikwu okwu ụgha, ịkpọasị, omume aka ike, na igbu mmadụ nke na-egosipụta ndị ahụ ‘sitere n’Ekwensu,’ na-enwe ya dị ka “nna” ime mmụọ ha. (1 Jọn 3:8-12; Jọn 8:44; Ndị Efesọs 2:2, 3) N’ezie mmụọ nke a adịghị esite n’Onye Okike Na-ahụ n’Anya.
18. Olee otú omume anyị banyere ịchịisi si egosi ma ànyị nweere onwe anyị pụọ ná nduzi nke “onyeisi ụwa nke a”?
18 Ọzọkwa, ọ̀ bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ụmụ mmadụ atụkwasịghị obi ha n’atụmatụ ụmụ mmadụ iweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi? Mmadụ ole ka ị maara na-elegara Chineke na Alaeze ya anya n’ezie dị ka ihe ngwọta nye nsogbu nile nke ụmụ mmadụ? Ma ntụkwasị obi ha nwere n’usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụmụ mmadụ ezighị ezi, dị ka Jisọs kwuru: “Alaeze m abụghị akụkụ ọ bụla nke ụwa nke a.” Alaeze ya “esiteghị” n’ụwa nke a, n’ihi na ọ bụghị ndị mmadụ guzobere ya, ọ bụghịkwa ha na-edebe ya n’ọkwá. Ọ bụ ndokwa Chineke n’onwe ya. (Jọn 18:36, NW; Aịsaịa 9:6, 7) Ya mere, iji soro ná ndị ahụ nwere olileanya ịlanarị mgbe Alaeze ahụ ga-abịa imegide ndị iro ya nile, ọ dị anyị mkpa ịmata eziokwu ahụ siri ike nke bụ na Setan na-achị ụwa nke a na usoro ihe ya. Nke ahụ gụnyere ndokwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya dị ka United Nations. Anyị aghaghị inwere onwe anyị pụọ n’ihe a nile site ná nguzosi ike anyị maka ọchịchị ezi omume Jehova site n’aka Kraịst Jisọs.—Matiu 6:10, 24, 31-33.
19. Dị ka e gosiworo n’akụkọ ihe mere eme, n’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị Kraịst oge gboo siri gosi na ha ‘abụghị akụkụ nke ụwa?
19 Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ndị Kraịst oge gboo bụ ndị na-enye ndị ọzọ nsọpụrụ, ndị na-edebe iwu. Ma ha kpebisiri ike na ha agaghị ‘abụ akụkụ nke ụwa,’ ọ bụ ezie na nke a wetaara ha mkpagbu. Anyị na-agụ ihe odide dị ka ndị a:
“Iso Ụzọ Kraịst n’oge mbụ bụ nke a na-aghọtachaghị, bụrụkwa nke ndị na-achị ụwa ndị ọgọ mmụọ lere anya ọjọọ. . . . Ndị Kraịst jụrụ itinye aka n’ọrụ ụfọdụ nke ụmụ amaala Rome. . . . Ha agaghị anara ọkwá ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla.”—On the Road to Civilization, A World History.57
“Ha jụrụ ikere òkè pụtara ìhè n’ọchịchị obodo ma ọ bụ ná ndị agha nchebe nke alaeze ahụ. . . . Ọ bụ ihe a na-apụghị ime eme na ndị Kraịst, n’ahapụghị ozi dị nsọ karị, pụrụ ịrụ ọrụ dị ka ndị agha, ndị ọkàikpe, ma ọ bụ ndị eze.”—History of Christianity.58
“Origen [onye biri na narị afọ nke abụọ na nke atọ nke Oge Anyị] . . . kwuru na ‘Chọọchị Ndị Kraịst apụghị ibu agha megide mba ọ bụla. Ha amụtawo site n’aka onyendú ha na ha bụ ụmụ nke udo.’ N’oge ahụ ọtụtụ ndị Kraịst ka e gburu n’ihi ịjụ ije agha.”—Treasury of the Christian World.59
20. Iji nwere onwe anyị pụọ ná nduzi nke “onyeisi ụwa nke a,” n’ihe omume ndị na-akpata nkewa dị aṅaa nke ụwa ka ndị ohu Jehova na-ewezuga onwe ha?
20 Site n’izere ịgwakọta onwe ha n’ihe ndị a na-eme n’ụwa, ndị ozi Jehova adịghị atụnye ihe ná nkewa ya nke ịhụ mba n’anya, ịkpọasị agbụrụ na ọgba aghara nke ọha mmadụ ya. Àgwà ha nke Chineke na-eduzi na-eweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi n’etiti ụdị mmadụ nile. (Ọrụ 10:34, 35) Ndị ga-alanarị “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ ga-esite n’ezie ná “mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile,” pụta.—Mkpughe 7:9, 14.
Ànyị Bụ Ndị Enyi Ụwa ka ọ bụ Ndị Enyi Chineke?
21. Gịnị mere na onye na-agbaso Bible agaghị atụ anya na ụwa ga-ahụ ya n’anya?
21 Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu sitere n’ụwa, ụwa ga-ahụ ihe nke aka ya n’anya: Ma n’ihi na unu esiteghị n’ụwa, kama mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị. . . . Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu.” (Jọn 15:19, 20) Eziokwu doro anya bụ na nanị ụzọ e si enweta ịbụenyi nke ụwa bụ ịdị ka ya—iso ya nwekọọ ọchịchọ ya, agụụ ịbụ onye a ma ama, na ịkpa ókè ya, inwe mmasị n’echiche na nchepụta ya nile, na ịgbaso omume na ụzọ ya nile. Ma ndị na-akwado ụwa nke a na-ewe iwe ma e kpughee mmejọ ha ma ọ bụ dọọ ha aka ná ntị n’ihi ihe ize ndụ nke ụzọ ndụ ha na-eduga. Ọ bụ ya mere na ọ bụrụ na mmadụ agbasoo ozizi Bible banyere omume na ụzọ ibi ndụ ma na-ekwu okwu n’ịkwado ya, ọ pụghị ma ọlị ịgbanarị ịkpọasị nke ụwa.—Jọn 17:14; 2 Timoti 3:12.
22. Nhọrọ dị aṅaa banyere ịbụenyi na-eche anyị ihu n’otu n’otu?
22 Ya mere, Bible na-egosi na anyị ga-eme nhọrọ doro anya. Na Jemes 4:4 anyị na-agụ, sị: “Ùnu amataghị na ịbụenyi nke ụwa bụ ịbụ onyeiro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onyeiro nke Chineke.” Chineke nwekwara ụkpụrụ nke ya maka ịbụenyi, ha ekwekọghịkwa na ndị ahụ nke ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ ndị na-emehie emehie.—Abụ Ọma 15:1-5.
23. (a) Gịnị ga-egosi na mmadụ bụ enyi nke ụwa? (b) Ànyị pụrụ isi aṅaa gosi na anyị bụ ndị enyi Chineke?
23 Anyị inweta ịbụenyi nke Chineke dabeere n’ihe karịrị nnọọ anyị ịnọ ma ọ bụ ghara ịnọ n’òtù ụfọdụ nke ụwa. Ọ bụrụ na anyị egosipụta mmụọ nke ụwa, kere òkè n’ụzọ o si ele ndụ anya, mgbe ahụ anyị na-egosipụta onwe anyị dị ka ndị enyi nke ụwa, ọ bụghị nke Chineke. Mmụọ nke ụwa na-arụpụta “ọrụ nile nke anụ ahụ” dị ka “ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ ịkwa iko, ikpere arụsị, ịgwọ nsí, ibu iro, esemokwu, ekworo, ọnụma, ịkpa iche iche, nkewa, ịrọ òtù, ịkpọasị, ịṅụbiga mmanya ókè, [oriri oké mkpọtụ, NW] na ihe yiri ihe ndị a.” Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na “ndị na-eme ihe dị otú a agaghị eketa alaeze Chineke.” N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị bụ ndị enyi Chineke, anyị ga-enwe mmụọ ya tinyere mkpụrụ ya nke “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.”—Ndị Galetia 5:19-23.
24. (a) Gịnị mere o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị ya iṅomi mmadụ ndị ụwa na-akwanyere ùgwù? (b) Olee otú àgwà anyị metụta ihe onwunwe ga-esi gosi onye anyị na-achọ ịbụ enyi ya n’ezie?
24 Ya mere, ànyị na-egosipụta mmụọ nke onye? Nke ahụ ga-enyere anyị aka ikpebi onye anyị bụ enyi ya n’ezie. N’ịdị ndụ otú anyị si adị, ná mmetụta nke ụwa ọjọọ nke dị ugbu a, ọ gaghị abụrụ anyị ihe ịtụnanya ịchọpụta mkpa ọ dị ime mgbanwe ná ndụ anyị iji mee ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Dị ka ihe atụ, ndị ụwa na-enye ndị oké ọchịchọ ha maka ịbụ ndị a ma ama dubara n’inwe akụ dị ukwuu, ike ma ọ bụ aha, otuto, na-akwanyekwara ha ùgwù. Ndị mmadụ na-eme onwe ha ịdị ka ndị dike na chi nke ụwa ndị dị otú a, na-eṅomi ha n’okwu, n’omume, n’ọdịdị, na n’ike ekike. Ị̀ ga-achọ ka e gosipụta gị dị ka onye ụdị mmadụ ndị a na-adọrọ mmasị ya? Ihe ndị ha mepụtara bụ nnọọ nanị ihe megidere ihe Okwu Chineke na-agba anyị ume ime dị ka ihe mgbaru ọsọ anyị ná ndụ. Bible na-eduzi anyị gaa n’ịbụ ọgaranya na inwe ike na ùgwù ime mmụọ nke ije ozi dị ka ndị nnọchianya Chineke na onye nkwupụta ya n’ụwa. (1 Timoti 6:17-19; 2 Timoti 1:7, 8; Jeremaịa 9:23, 24) Mkpọsa azụmahịa nke ụwa na-echigharị ndị mmadụ ihu gaa n’ịhụ akụ n’anya, ka ha na-ekwere na obi ụtọ dabeere n’ihe onwunwe. Ya mere, ha na-ewerekarị ihe ndị a n’ihe ndị dị mkpa karịa inwe uru nke ime mmụọ. Ee, ịgbaso ụzọ nke ụwa ga-ewetara gị ịbụenyi nke ụwa. Ma ọ ga-egbubipụ gị pụọ n’ịbụenyi nke Chineke. Olee nke ka gị mkpa? Olee nke ga-eduga n’obi ụtọ na-adịgide adịgide nke ka ukwuu?
25. (a) Gịnị ka anyị ga-atụ anya ya site n’ụwa mgbe anyị gbakụtara ụzọ ya nile azụ? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ‘ime ka uche anyị dị ọhụrụ’ n’ezie iji na-ele ihe anya n’ụzọ Chineke si ele ha?
25 Ọ dị mfe ịnakwere ụzọ nke ụwa. N’ihi àgwà ọjọọ ya, ndị na-akwado ụwa nke a ga-ewe iwe ma ọ bụrụ na i soo ụzọ dị iche. (1 Pita 4:3, 4) A ga-arụgide gị ka i kwekọọ, kwee ka òtù mmadụ nke ụwa kpụgharịa gị n’ụdị ya. Amamihe ụwa, nchepụta ya dị iche iche metụta ihe ga-eweta ihe ịga nke ọma ná ndụ, ka a ga-eji mee ihe ná mgbalị ịchịkwa echiche gị. Ya mere, ọ na-ewe mgbalị na okwukwe siri ike ime ka ‘uche gị dị ọhụrụ’ ịhụ ihe n’ụzọ Chineke si ele ihe anya, na-aghọta ihe mere na ‘amamihe nke ụwa bụ nzuzu n’anya ya.’ (Ndị Rom 12:2; 1 Ndị Kọrint 1:18-20; 2:14-16; 3:18-20) Site n’ịmụsi Okwu Chineke ike, anyị pụrụ ịhụta amamihe ụgha nke ụwa. Anyị pụrụ ịhụta mmerụ ahụ ndị na-esite n’ụdị “amamihe” dị otú ahụ na-apụta ugbu a, na ọgwụgwụ mbibi ọ na-aghaghị iduba na ya. Mgbe ahụ anyị ga-enwekwa ike ịghọta nke ọma amamihe nke ụzọ Chineke na ngọzi e ji n’aka ọ na-enye.
Ọ Baghị Uru Inye Ụwa Na-agabiga Agabiga Ndụ na Ike
26. Ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya itinye onwe anyị n’òtù ndị ọrụ ebere dị iche iche nke ụwa ná nzube nke imeziwanye ọnọdụ?
26 Ụfọdụ pụrụ ịsị: ‘Ma ọtụtụ n’ime òtù dị iche iche nke ụwa na-eme ihe ọma, na-arụ ọrụ maka nchebe, ahụ ike, agụmakwụkwọ, na inwere onwe nke ndị mmadụ.’ Ọ bụ ezie, òtù ụfọdụ na-enye nnapụta na-adịru nwa oge pụọ ná nsogbu ole na ole nke ụmụ mmadụ. Ma ha nile bụkwa akụkụ nke ụwa e wezugara n’ebe Chineke nọ. Ha na-echigharịkwa ndị mmadụ ihu gaa n’ime ka usoro ihe nke dị ugbu a dịtekwuo aka. Ọ dịghị n’ime ha nke na-akpọsa ọchịchị Chineke maka elu ala, bụ́ Alaeze ya site n’aka Ọkpara ya. E kwuwerị, ọbụna ndị omekome ụfọdụ pụrụ inwe ezinụlọ, na-egboro ha mkpa ha, rụọrọ ndị obodo ha ọtụtụ ọrụ ọma. Ma nke a ọ̀ ga-eme ka o zie ezi anyị inye òtù ndị omempụ dị iche iche nkwado n’ụzọ ọ bụla?—Tụlee 2 Ndị Kọrint 6:14-16.
27. Gịnị bụ nanị ụzọ anyị pụrụ isi nyere ndị mmadụ n’ụwa a aka isonye ná ndị ga-alanarị baa n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke?
27 Ànyị pụrụ n’ezie igosipụta ịhụnanya maka ihe a kpọrọ mmadụ site n’isonye n’atụmatụ ọ bụla nke ụwa, na-enye ha oge na ike anyị? Ọ bụrụ na ị chọrọ inyere onye ọrịa ma ọ bụ onye ahụ na-adịghị ike aka, ị̀ ga-eme otú ahụ site n’ịnọketa ya oké nso nke na ị ga-ebute otu ọrịa ahụ ma ọ bụ ahụ esighị ike ahụ? Ka ọ bụ na ọ̀ gaghị akachasị bụrụ ihe enyemaka ma ọ bụrụ na gị onwe gị anọgide n’ahụ ike ma gbalịa inyere onye ahụ aka ịchọta ụzọ isi nwee ahụ ike? Òtù ụmụ mmadụ dị ugbu a nọ n’ọrịa na ahụ esighị ike nke ime mmụọ. O nweghị onye n’ime anyị pụrụ ịzọpụta ya, n’ihi na Okwu Chineke gosiri na ọrịa ya na-eduba n’ọnwụ ya. (Tụlee Aịsaịa 1:4-9.) Ma anyị pụrụ inyere ndị mmadụ n’otu n’otu ndị nọ n’ime ụwa aka ịchọta ụzọ nke ahụ ike ime mmụọ nakwa ịlanarị banye n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ nke Chineke—ma ọ bụrụhaala na anyị onwe anyị anọpụ iche n’ụwa. (2 Ndị Kọrint 6:17) Ya mere, n’ụzọ amamihe dị ya, zeere ịgwakọta onwe gị n’atụmatụ nile nke ụwa. Jisie ike ghara ịbụ onye mmụọ nke ụwa metụtara, jụkwa iṅomi ụzọ mmebi iwu ya. Echefukwala: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.