“Ìhè ahụ Abịawo n’Ụwa”
“Nke a bụ ikpe ahụ, na ìhè ahụ abịawo n’ụwa, ma mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya kama ìhè ahụ.”—JỌN 3:19.
1. N’ihi gịnị ka mmadụ nile kwesịrị iji chegbuo onwe ha banyere ikpe Chineke?
IHE ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ taa adịghị echegbu onwe ha banyere ikpe Chineke. Ụfọdụ ndị na-eche na ọ bụ eziokwu na Chineke ga-ele ha anya dị mma ma ọ bụrụ na ha na-ejechi chọọchị anya, ghara ime ndị agbata obi ha ihe ọjọọ. Nye ọtụtụ ndị, ozizi Krisendọm banyere ọkụ ala mmụọ na pọgatrị emewo ka echiche dum banyere ikpe Chineke yie ihe na-abụghị eziokwu. Ma enweghị mmasị gbasazuru ebe nile na okwu ụgha nile nke Krisendọm apụghị ịgbanwe eziokwu ahụ nke bụ na Chineke ga-emesịa kpee mmadụ nile ikpe n’otu n’otu. (Ndị Rom 14:12; 2 Timoti 4:1; Mkpughe 20:13) Ihe dị ukwuu ga-adaberekwa n’ikpe nke a. Ndị ahụ a na-amaghị ikpe ga-enweta onyinye Chineke nke ndụ ebighị ebi, ebe ndị ikpe mara ga-enweta ụgwọ ọrụ zuru ezu nke mmehie: ọnwụ.—Ndị Rom 6:23.
2. Gịnị bụ ihe ndabere nke ikpe Chineke?
2 N’ihi nke a, ezi ndị Kraịst na-echegbu onwe ha banyere ikpe Chineke, ha na-agbalịsikwa ike ime ihe na-atọ ya ụtọ. Olee ụzọ ha pụrụ isi mee nke a? Na Jọn 3:19, Jisọs na-enye anyị isi ihe dị mkpa. Ọ na-asị: “Nke a bụ ikpe ahụ, na ìhè ahụ abịawo n’ụwa, ma mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya kama ìhè ahụ; n’ihi na ọrụ ha jọrọ njọ.” Ee, ikpe Chineke ga-adabere n’eziokwu ahụ nke bụ ma ànyị hụrụ ìhè n’anya kama ịhụ ọchịchịrị n’anya.
“Chineke Bụ Ìhè”
3. Gịnị bụ ọchịchịrị ahụ, gịnịkwa bụ ìhè ahụ?
3 N’echiche nke ime mmụọ, ọchịchịrị metụtara amaghị ihe na enweghị olileanya nke dị n’etiti ebe Setan na-achị—ọ bụ ezie na ọtụtụ mgbe, Setan na-eme onwe ya ka o yie “mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 4:4; 11:14; Ndị Efesọs 6:12) N’aka nke ọzọ, ìhè metụtara inwe nghọta na echiche doro anya nke na-abịa site n’aka Jehova Chineke. Pọl kwuru okwu banyere ìhè ahụ mgbe o dere, sị: “N’ihi na ọ bụ Chineke, onye sịrị, Ìhè ga-esi n’ime ọchịchịrị nwupụta, bụ onye nwubara n’ime obi anyị, iweta inye ìhè nke ọmụma nke ebube nke Chineke n’ihu nke Jisọs Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 4:6) E nwere njikọ chiri anya nke ukwuu n’etiti ìhè ime mmụọ na Jehova Chineke nke na Jọn onyeozi dere, sị: “Chineke bụ ìhè.”—1 Jọn 1:5; Mkpughe 22:5.
4. (a) Olee ụzọ Jehova siworo mee ka ìhè dịrị? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya maka ìhè ahụ?
4 Jehova emewo ka ìhè dị site n’okwu ya, bụ́ nke dị mfe nnweta taa n’ụdị e dere ede n’ime Bible Nsọ. (Abụ Ọma 119:105; 2 Pita 1:19) N’ihi ya, ọ bụ n’ezie ịhụnanya ya ka onye ọbụ abụ ahụ na-ekwupụta maka ìhè ahụ mgbe o dere, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche. Mkpụrụ obi m edebewo ihe àmà gị nile; ana m ahụkwa ha n’anya nke ukwuu.” (Abụ Ọma 119:97, 167) Ị̀ hụrụ ìhè ahụ n’anya n’ókè ahụ ihe àmà gosiri na onye ọbụ abụ ahụ hụrụ ya n’anya? Ị̀ na-agụ Okwu Chineke mgbe nile, na-atụgharị uche na ya, na-agbalịsikwa ike itinye ihe o kwuru n’ọrụ? (Abụ Ọma 1:1-3) Ya bụrụ otú ahụ, ị na-achọ ịbụ onye a na-amaghị ikpe n’ihu Jehova.
“Abụ M Ìhè nke Ụwa”
5. N’ebe ònye nọ ka ìhè nke Chineke na-elekwasị anya?
5 Ìhè na-enye ndụ nke sitere n’aka Jehova na-elekwasị anya n’ahụ Jisọs Kraịst. N’okwu mmeghe nke Oziọma Jọn, anyị na-agụ, sị: “N’ime [Jisọs] ka ndụ dịrị; ndụ ahụ bụrụkwa ìhè nke mmadụ. Ìhè ahụ wee na-amụ n’ọchịchịrị; ọchịchịrị ahụ ejideghịkwa ya.” (Jọn 1:4, 5) N’eziokwu, Jisọs nwere mmekọrịta chiri anya nke ukwuu ya na ìhè ahụ nke na a kpọrọ ya ‘ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọ bụla ìhè.’ (Jọn 1:9) Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m nọ n’ụwa, abụ m ìhè nke ụwa.”—Jọn 9:5.
6. Gịnị ka mmadụ na-aghaghị ime ka o wee bụrụ onye a na-amaghị ikpe, bụ́ nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi?
6 N’ihi ya, ndị ahụ hụrụ ìhè n’anya hụrụ Jisọs n’anya, nweekwa okwukwe n’ebe ọ nọ. Ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ịbụ onye a na-amaghị ikpe ma ọ bụghị site na Jisọs. Ee, ọ bụ nanị site n’ilegara ya anya dị ka ụzọ Chineke họpụtaworo maka nzọpụta ka anyị pụrụ ịbụ ndị a na-amaghị ikpe. Jisọs sịrị: “Onye kweere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; ma onye na-ekwenyeghị Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ, kama iwe Chineke na-anọgide n’ahụ ya.” (Jọn 3:36) Ma, gịnị ka ọ pụtara, bụ́ inwe okwukwe na Jisọs?
7. Inwe okwukwe na Jisọs pụtara inwe okwukwe n’ebe onye ọzọ dị aṅaa nọ?
7 Nke mbụ, Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Onye kweere na mụ, ọ bụghị na [“nanị,” NW] mụ ka o kwere, kama [ọ bụkwa] n’onye zitere m. Onye na-ahụ m na-ahụkwa onye zitere m. Mụ onwe m abịawo n’ụwa ịbụ ìhè, ka onye ọ bụla nke kwere na mụ wee ghara ịnọgide n’ọchịchịrị.” (Jọn 12:44-46) Ndị hụrụ Jisọs n’anya, nweekwa okwukwe na ya aghaghịkwa inwe ịhụnanya dị omimi maka Chineke na Nna nke Jisọs, bụ́ Jehova, nweekwa okwukwe na ya. (Matiu 22:37; Jọn 20:17) Ndị ọ bụla nke na-eji aha Jisọs eme ihe n’ofufe ha ma ghara inye Jehova nsọpụrụ ka ukwuu adịghị egosipụta ezi ịhụnanya n’ebe ìhè ahụ dị.—Abụ Ọma 22:27; Ndị Rom 14:7, 8; Ndị Filipaị 2:10, 11.
‘Onye Isi’ nke Chineke Doworo
8. Olee ụzọ ìhè nke Chineke si lekwasị anya n’ahụ Jisọs ọbụna tupu a mụọ ya dị ka mmadụ?
8 Inwe okwukwe n’ebe Jisọs nọ pụtakwara ịnakwere n’ụzọ zuru ezu ọrụ ọ na-arụ ná nzube nile nke Jehova. E mere ka ịdị mkpa nke ọrụ nke a pụta ìhè mgbe mmụọ ozi ahụ gwara Jọn, sị: “Àmà nke Jisọs bụ mmụọ nke amụma.” (Mkpughe 19:10; Ọrụ 10:43; 2 Ndị Kọrint 1:20) Malite kpọmkwem n’amụma nke mbụ e buru n’Iden, amụma nile ndị sitere n’ike mmụọ Chineke metụtachara Jisọs na ọnọdụ ya n’imezu nzube nile nke Chineke. N’otu aka ahụ, Pọl gwara ndị Galetia bụ ndị Kraịst na ọgbụgba ndụ Iwu ahụ bụ “onye ozizi anyị ikuru anyị bịakwute Kraịst.” (Ndị Galetia 3:24) Ọgbụgba ndụ Iwu oge ochie ahụ bụ nke e dokwara ịkwadebe mba ahụ maka ọbịbịa nke Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. Ya mere, ọbụna tupu a mụọ ya dị ka mmadụ, ìhè sitere n’ebe Jehova nọ elekwasịwo Jisọs anya.
9. Gịnị ka ịhụ ìhè ahụ n’anya metụtaworo kemgbe afọ 33 O.A.?
9 Na 29 O.A., Jisọs wepụtara onwe ya ka e mee ya baptism, e jikwa mmụọ nsọ tee ya mmanụ, o wee si otú a ghọọ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Na 33 O.A., ọ nwụrụ dị ka mmadụ zuru okè, e wee kpọlite ya n’ọnwụ, ọ lagoo n’eluigwe, wee nọrọ n’ebe ahụ nyefee uru nke ndụ ya n’ihi mmehie anyị nile. (Ndị Hibru 9:11-14, 24) Usoro ihe omume ndị a kara akara oge oké mgbanwe n’ụzọ Chineke si emeso ụmụ mmadụ ihe. Ugbu a, Jisọs bụ “Onye ahụ nke na-eduba mmadụ ná ndụ,” ‘Onye na-eduba mmadụ ná nzọpụta,’ “Onye ndú na Onye mmezu nke okwukwe anyị.” (Ọrụ 3:15; Ndị Hibru 2:10; 12:2; Ndị Rom 3:23, 24) Malite na 33 O.A. gaa n’ihu, ndị hụrụ ìhè n’anya amatawo, nakwerekwa, na e wezụga Jisọs, “nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ: n’ihi na aha ọzọ dị iche adịghịkwa n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.”—Ọrụ 4:12.
10. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ige ntị n’okwu Jisọs na irubere ha isi?
10 Inwe okwukwe na Jisọs pụtakwara ịnakwere ya dị ka “Okwu ahụ,” na ‘Onye Ndụmọdụ ahụ Dị Ebube.’ (Jọn 1:1; Aịsaịa 9:6) Ihe Jisọs kwuru na-eme ka eziokwu nke Chineke na-apụta ìhè mgbe nile. (Jọn 8:28; Mkpughe 1:1, 2) Ige ya ntị bụ okwu metụtara ọnwụ na ndụ. Jisọs gwara ndị Juu nke oge ya, sị: “Onye na-anụ okwu m, nke na-ekwerekwa onye zitere m, o nwere ndụ ebighị ebi, ọ bịaghịkwa n’ikpe, kama o sitewo n’ọnwụ baa ná ndụ.” (Jọn 5:24) N’ime narị afọ mbụ O.A., a napụtara ndị mere ihe kwekọrọ n’okwu Jisọs pụọ n’ọchịchịrị nke ụwa Setan, ha wee bata ná ndụ, dị ka a pụrụ ikwu ya. A gụrụ ha ná ndị ezi omume, na-enwe olileanya nke ịbụ ndị ha na ya ga-eketakọ ihe n’Alaeze eluigwe ya. (Ndị Efesọs 1:1; 2:1, 4-7) Taa, irubere okwu Jisọs isi na-emeghere ọtụtụ ndị ụzọ ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume, na-enwe olileanya nke ịlanarị Amagedọn na inweta ndụ mmadụ zuru okè n’ime ụwa ọhụrụ.—Mkpughe 21:1-4; tụlee Jemes 2:21, 25.
‘Onye Isi n’Elu Ihe Nile’
11. Ike dị elu dị aṅaa ka e nyere Jisọs n’afọ 33 O.A.?
11 Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, Jisọs kpugheere ndị na-eso ụzọ ya otu akụkụ ọzọ nke ìhè ahụ. Ọ sịrị: “E werewo ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa nye m.” (Matiu 28:18) E si otú a bulie Jisọs elu gaa n’ọnọdụ kasị elu ná nzukọ eluigwe na ala nke Jehova. Pọl nyekwuru nkọwa mgbe ọ sịrị: “[Chineke] mere ka [Jisọs] si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, meekwa ka ọ nọdụ n’aka nri ya n’ebe dị n’eluigwe, kachasị ha nile elu, bụ́ ịbụ onye isi, na ịchịisi, na ike, na ịbụ onye nwe mmadụ, na aha ọ bụla a na-akpọ ya aha, ọ bụghị nanị n’oge a, kama ọ bụkwa n’oge nke gaje ịbịa: o dokwara ihe nile n’okpuru ụkwụ ya abụọ, ọ bụkwa ya onwe ya ka o mere ka ọ bụrụ isi n’elu ihe nile n’ebe nzukọ ya nọ, nke bụ ahụ ya.” (Ndị Efesọs 1:20-23; Ndị Filipaị 2:9-11) Kemgbe 33 O.A., ịhụ ìhè ahụ n’anya agụnyewo ịnakwere ọnọdụ dị elu nke Jisọs.
12. Gịnị ka ndị Kraịst e tere mmanụ jiworo obi ụtọ nakwere site ná mmalite, oleekwa ụzọ ha siworo gosipụta nke a n’ụzọ a hụrụ anya?
12 Mgbe e mesịrị, ihe nile a kpọrọ mmadụ aghaghị ịnakwere ike dị elu nke Jisọs. (Matiu 24:30; Mkpughe 1:7) Otú ọ dị, ndị hụrụ ìhè ahụ n’anya ejiriwo obi ụtọ nakwere ya site ná mmalite. Ndị e tere mmanụ nọ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst nakweere Jisọs dị ka ‘isi nke ahụ, nke bụ nzukọ ya.’ (Ndị Kọlọsi 1:18; Ndị Efesọs 5:23) Mgbe ha ghọrọ akụkụ nke ahụ ahụ, a ‘na-anapụta ha site n’ike nke ọchịchịrị, wee webata ha n’ime alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya Chineke.’ (Ndị Kọlọsi 1:13) Site mgbe ahụ gaa n’ihu, ha na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-agbaso idu ndú nke Jisọs n’akụkụ nile nke ndụ ha, n’ime oge anyị a kwa, ha akụziworo “atụrụ ọzọ” ahụ ime otu ihe ahụ. (Jọn 10:16) Ịnakwere ịbụ isi nke Jisọs bụ isi ihe dị mkpa a chọrọ maka ịbụ onye a na-amaghị ikpe.
13. Olee mgbe Jisọs malitere iji ike ọchịchị Alaeze ya eme ihe, gịnịkwa sochiworo n’elu ala ebe a?
13 Mgbe ọ lagoro n’eluigwe n’afọ 33 O.A., Jisọs emeghị ihe ozugbo ahụ iji ike o nwere mee ihe n’ụzọ kasị zuo ezu. Ọ bụ ezie na ọ bụ Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst, o cheere ruo oge kwesịrị ekwesị iji ikike zuru ezu o nwere mee ihe n’ebe ihe nile a kpọrọ mmadụ nọ. (Abụ Ọma 110:1; Ọrụ 2:33-35) Oge ahụ bịara na 1914, mgbe Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze Chineke, “mgbe ikpeazụ” ahụ nke ụwa nke a wee malitekwa. (2 Timoti 3:1) Kemgbe 1919, nchịkọta nke ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ agawo n’ihu ruo ozuzu ya. Karịsịa malite na 1935, Jisọs anọwo na-ekewa ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’òtù ndị bụ “atụrụ,” ndị ga-eketa “alaeze nke e doziwooro [ha],” nakwa ndị bụ “ụmụ ewu,” ndị ‘ga-apụ baa ná mbipụ ebighị ebi.’—Matiu 25:31-34, 41, 46.
14. Olee ụzọ oké ìgwè mmadụ siworo gosipụta ịhụnanya maka ìhè ahụ, gịnịkwa ka nke ahụ ga-arụpụtara ha?
14 Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na atụrụ ndị ahụ adịwo nnọọ ọtụtụ n’ime ụbọchị ikpeazụ ndị a. Oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ndị ahụ ndị ọnụ ọgụgụ ha ruru ọtụtụ nde apụtawo n’ime ụwa “[site] ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile.” Dị ka ndị ha na ha na-akpakọ, bụ́ ndị ahụ e tere mmanụ, ndị a yiri atụrụ hụrụ ìhè ahụ n’anya. Ha “[asawo] uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ,” ha jikwa oké olu na-eti mkpu, sị: “Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ.” N’ihi nke a, oké ìgwè mmadụ ahụ, dị ka otu òtù ga-abụ ndị a na-amaghị ikpe. Ndị so na ya “na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta,” na-alanarị mbibi ahụ a ga-ebibi ndị hụrụ ọchịchịrị n’anya n’Amagedọn.—Mkpughe 7:9, 10, 14.
“Ụmụ nke Ìhè”
15. N’ụzọ dị aṅaa ka ihe omume anyị si egosi otú anyị si doo onwe anyị n’okpuru Eze ahụ bụ Jisọs Kraịst?
15 Ma, olee ụzọ ndị hụrụ ìhè n’anya, ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma ọ bụ atụrụ ọzọ ahụ, na-esi eme ihe a hụrụ anya iji doo onwe ha n’okpuru Jisọs dị ka onye Chineke dokwasịworo n’ocheeze dị ka Eze na onye nọ dị ka Onye Ikpe. Otu ụzọ bụ site n’ịgbalị ịbụ ụdị ndị ahụ Jisọs na-akwado. Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs gosiri mmasị maka àgwà ndị dị ka inwe obi eziokwu, iji obi dum eme ihe, na ịnụ ọkụ n’obi maka eziokwu ahụ, ya onwe ya gosipụtakwara ihe atụ nke àgwà ndị a. (Mak 12:28-34, 41-44; Luk 10:17, 21) Ọ bụrụ na anyị na-achọ ịbụ ndị a na-amaghị ikpe, anyị aghaghị iwulite àgwà ndị dị otú ahụ.
16. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị wepụchasịa ọrụ nile ndị dịịrị ọchịchịrị?
16 Nke a bụ eziokwu karịsịa kemgbe ọchịchịrị nke ụwa Setan na-agbachiwanye ka ọgwụgwụ na-eru nso. (Mkpughe 16:10) N’ihi ya, okwu ndị ahụ Pọl degaara ndị Rom kwesịrị nnọọ ekwesị: “Chi ejimiwo, chi ọbụbọ dịkwa nso: ya mere ka anyị yipụ ọrụ nile nke ọchịchịrị, ma ka anyị yikwasị ihe agha nke ìhè. Ka anyị na-ejegharị dị ka o kwesịrị anyị, dị ka n’ehihie; ọ bụghị n’ite egwú [“oriri oké mkpọtụ,” NW] na ịṅụbiga mmanya ókè, ọ bụghị n’ịkwa iko na agụụ ịkwa iko, ọ bụghị n’esemokwu na ekworo.” (Ndị Rom 13:12, 13) Ọ bụ ezie na ndụ ebighị ebi bụ onyinye sitere n’aka Chineke, izi ezi nke okwukwe anyị na ịhụnanya anyị hụrụ ìhè ahụ na-apụta ìhè n’ihe ndị anyị na-eme. (Jemes 2:26) N’ihi ya, otú a ga-esi kpee anyị ikpe ga-adabere ruo n’ókè dị ukwuu n’ókè anyị na-arụ ezi ọrụ, ma na-agbakụta ajọ ọrụ azụ.
17. Gịnị ka ọ pụtara bụ ‘iyikwasị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst’?
17 Mgbe o nyesịrị ndụmọdụ ya ná Ndị Rom 13:12, 13, Pọl onyeozi mechiri okwu ya site n’ịsị: “Yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, unu ebukwala ụzọ na-echere ahụ, ime ihe ọjọọ na-agụ ya.” (Ndị Rom 13:14) Gịnị ka ọ pụtara, bụ́ ‘iyikwasị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst’? Ọ pụtara na ndị Kraịst kwesịrị ịgbasochi Jisọs anya, na-eyikwasị onwe ha, dị ka a pụrụ ikwu ya, ihe nlereanya ya na ọdịdị ya, na-agbalị ịbụ ndị yiri Kraịst. Pita sịrị, “N’ihi na a kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ ya nile.”—1 Pita 2:21.
18. Oké mgbanwe dịgasị aṅaa ka ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị mee ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị a na-amaghị ikpe?
18 Ọtụtụ mgbe, nke a emetụtawo oké mgbanwe dị iche iche ná ndụ onye Kraịst. “N’ihi na unu bụrịị ọchịchịrị n’oge gara aga,” ka Pọl sịrị, “ma unu bụ ìhè ugbu a n’ime Onyenwe anyị: na-ejegharịnụ dị ka ụmụ nke ìhè (n’ihi na mkpụrụ nke ìhè ahụ dị n’ịdị mma na ezi omume na eziokwu nile).” (Ndị Efesọs 5:8, 9) Ndị ọ bụla na-arụ ọrụ nke ọchịchịrị abụghị ndị hụrụ ìhè n’anya, ha ga-abụkwa ndị a mara ikpe ọ gwụlakwa ma ha mere mgbanwe.
“Unu Onwe Unu Bụ Ìhè nke Ụwa”
19. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka onye Kraịst pụrụ isi gosipụta ìhè ahụ?
19 Ná mmechi, ịhụ ìhè ahụ n’anya pụtara igosipụta ìhè ahụ ka ndị ọzọ wee hụ ya, wee bụrụkwa ndị a dọtara n’ebe ọ nọ. “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa,” ka Jisọs sịrị. O kwukwara, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:14, 16) Ọrụ ọma nile nke onye Kraịst gụnyere igosipụta ụdị ọ bụla nke ịdị mma na ezi omume na eziokwu, ebe àgwà ọma dị otú ahụ na-agbara eziokwu ahụ àmà siri ike. (Ndị Galetia 6:10; 1 Pita 3:1) Karịsịa, ha gụnyere ịgwa ndị ọzọ okwu banyere eziokwu ahụ. Taa, nke a pụtara ikere òkè ná mkpọsa ahụ zuru ụwa ọnụ nke ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” Ọ pụtakwara iji ndidi na-ejeghachi n’ụlọ ndị nwere mmasị, soro ha na-amụ Bible, na-enyere ha aka, ka ha onwe ha malitekwa ịrụ ọrụ ndị dịịrị ìhè.—Matiu 24:14; 28:19, 20.
20. (a) N’ọ̀tụ̀tụ̀ dị aṅaa ka ìhè ahụ na-enwu taa? (b) Ngọzi dịgasị aṅaa ka ndị na-anakwere ìhè ahụ na-enwe taa?
20 N’oge anyị a, n’ihi ịnụ ọkụ n’obi nke ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ji na-arụ ọrụ nkwusa ha, a na-anụ ozi ọma ahụ n’ihe karịrị 200 ala dị iche iche, ìhè ahụ na-enwukwa dị ka ọ na-enwubeghị na mbụ. Jisọs sịrị: “Mụ onwe m bụ ìhè nke ụwa: onye na-eso m agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” (Jọn 8:12) Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ ikere òkè ná mmezu nke nkwa nke a! Ndụ anyị juru nnọọ eju ugbu a karị, ebe anyị na-anọkwaghị n’ahụhụ n’ime ọchịchịrị nke ụwa Setan. Olileanya anyị bụkwa ihe ebube n’ezie ka anyị na-elepụ anya ịbụ ndị Onye Ikpe ahụ Jehova họpụtara na-amaghị ikpe. (2 Timoti 4:8) Lee nnọọ oké ihe ọdachi ọ gaara abụ ma a sị na, mgbe anyị bịasịworo n’ìhè ahụ, anyị adaghachi azụ banye n’ọchịchịrị, wee bụrụ ndị a mara ikpe! N’ime isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ụzọ anyị pụrụ isi guzosie ike n’okwukwe ahụ.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị bụ ihe ndabere maka ikpe Chineke?
◻ Ọrụ dị aṅaa bụ isi ka Jisọs nwere n’ihe banyere nzube Chineke?
◻ Olee ụzọ anyị na-esi egosipụta na anyị doro onwe anyị n’okpuru Jisọs dị ka onye Jehova dokwasịworo n’ocheeze dị ka Eze?
◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta onwe anyị ịbụ “ụmụ nke ìhè”?
◻ N’ime ọchịchịrị nke ụwa nke a, olee ụzọ ìhè ahụ si na-enwu dị ka ọ na-enwutụbeghị na mbụ?
[Foto dị na peeji nke 10]
E mesịa, ihe nile a kpọrọ mmadụ aghaghị ịnakwere ike nke Jisọs
[Foto dị na peeji nke 12]
Anyị na-egosi ịhụnanya maka ìhè ahụ mgbe anyị na-egosipụtara ya ndị ọzọ