Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 18 p. 46-p. 47 para. 6
  • Jizọs Na-eto Eto, Jọn Ana-atalata Atalata

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Na-eto Eto, Jọn Ana-atalata Atalata
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jọn Na-ebelata, Jisọs Na-amụbawanye
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jọn Chọrọ Ịnụ n’Ọnụ Jizọs Ma Ọ̀ Bụ Yanwa Bụ Mesaya Ahụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jọn Onye Na-eme Baptizim Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ọ̀ Bụ na Jọn Enweghị Okwukwe?
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 18 p. 46-p. 47 para. 6
Ebe Jọn Onye Na-eme Baptizim na ndị na-eso ụzọ ya na-akparịta ụka

ISI NKE 18

Jizọs Na-eto Eto, Jọn Ana-atalata Atalata

MATIU 4:12 MAK 6:17-20 LUK 3:19, 20 JỌN 3:22–4:3

  • NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS NA-EME NDỊ MMADỤ BAPTIZIM

  • A TỤỌ JỌN ONYE NA-EME BAPTIZIM MKPỌRỌ

Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya mechara Ememme Ngabiga nke afọ 30, ha si na Jeruselem pụọ. Ma, o nweghị onye n’ime ha lawara n’ụlọ ha na Galili. Ha gawara Judia. Ha mekwara ọtụtụ mmadụ baptizim ebe ahụ. Jọn Onye Na-eme Baptizim nọ na-arụ ụdị ọrụ a kemgbe ihe dị ka otu afọ. Ya na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ka nọ. Ọ ga-abụkwa na ha ka nọ na ndagwurugwu Osimiri Jọdan.

O nweghị onye Jizọs ji aka ya mee baptizim. Ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya nọ na-eme ndị mmadụ baptizim otú ọ gwara ha. N’oge ahụ, ndị Jizọs na Jọn nọ na-akụziri ihe bụ ndị Juu chegharịrị ná mmehie ha mere megide ọgbụgba ndụ Iwu Chineke. Ọ bụ maka na ha echegharịala mere e ji mee ha baptizim.—Ọrụ Ndịozi 19:4.

Ma, ndị na-eso Jọn nọ na-enwe anyaụfụ. Ha bịara kpesara Jọn banyere Jizọs, sị: “Nwoke ahụ [Jizọs] gị na ya nọ . . . na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwurukwa ya.” (Jọn 3:26) Ma, Jọn emereghị Jizọs anyaụfụ. Obi dị ya ụtọ na ozi Jizọs na-aga nke ọma. Ọ chọkwara ka ndị na-eso ụzọ ya soro ya na-enwe obi ụtọ. Jọn chetaara ha ihe ọ gwaburu ha. Ọ sịrị ha: “Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, Abụghị m Kraịst, kama, e zitere m ka m buru ya ụzọ bịa.” Ọ kọwara okwu a otú ha niile ga-aghọta ya. Ọ sịrị: “Onye nwe nwaanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nwoke na-alụ ya. Otú ọ dị, mgbe enyi nke nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ guzo ọtọ wee nụ olu ya, ọ na-enwe oké ọṅụ n’ihi olu nwoke ahụ nke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Ya mere, e mewo ka ọṅụ a m nwere zuo ezu.”—Jọn 3:28, 29.

Jọn dị ka enyi nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Ọ ṅụrịrị ọṅụ ọnwa ole na ole gara aga mgbe ọ na-akọwara ndị na-eso ụzọ ya onye Jizọs bụ. Ụfọdụ n’ime ha sooro Jizọs. Ka oge na-agakwa, a ga-eji mmụọ nsọ tee ha mmanụ. Jọn chọkwara ka ndị a na-eso ụzọ ya sowe Jizọs. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe Jọn kwo bịa bụ ịkwadebe ụzọ maka ozi Kraịst ga-abịa ije. Jọn kọwara ihe ga-emecha mee. Ọ sịrị: “Onye ahụ ga na-eto eto, ma mụ onwe m ga na-atalata atalata.”—Jọn 3:30.

Jọn ọzọ, bụ́ onye so ná ndị mbụ ahụ malitere iso Jizọs, mechara dee gbasara ebe Jizọs si bịa nakwa ọrụ dị mkpa ọ ga-arụ nke ga-eme ka a zọpụta ụmụ mmadụ. Ọ sịrị: “Onye ahụ nke si n’elu bịa ka ndị ọzọ niile. . . . Nna m hụrụ Ọkpara ya n’anya, o nyefewokwa ihe niile n’aka ya. Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ, kama ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.” (Jọn 3:31, 35, 36) Ihe a bụ eziokwu dị mkpa ndị mmadụ kwesịrị ịma.

Mgbe a tụbara Jọn Onye Na-eme Baptizim n’ụlọ mkpọrọ

Ọ dịghị anya Jọn Onye Na-eme Baptizim kwuchara na ọrụ ya ga-ebelata, Herọd anwụchie ya. Herọd kpọọrọ nwunye Filip nwanne ya nwoke lụwa. Mgbe Jọn gbara omume arụrụala ya ahụ n’anwụ, Herọd jidere ya tụkpuo n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe Jizọs nụrụ na aka akparala Jọn, ọ kpọọrọ ụmụazụ ya si na Judia pụọ ‘banye Galili.’—Matiu 4:12; Mak 1:14.

  • Gịnị mere Jọn ji mee ndị mmadụ baptizim? Tupu Jizọs anwụọ, gịnịkwa mere o ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee ndị mmadụ baptizim?

  • Olee otú Jọn si gosi na ndị na-eso ụzọ ya ekwesịghị imere Jizọs anyaụfụ n’ihe ọ na-eme?

  • Gịnị mere e ji tụkpuo Jọn n’ụlọ mkpọrọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya