Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 65 p. 154-p. 155 para. 3
  • Jizọs Ana-akụzi Ihe Ka Ha Na-aga Jeruselem

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Ana-akụzi Ihe Ka Ha Na-aga Jeruselem
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Njem E Ji Nzuzo Jee Jerusalem
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • “Oge Awa Ya Aka-abịaghị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ememe Ndị Dị Ịrịba Ama n’Akụkọ Israel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • N’Ememe Ụlọ Ikwuu
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 65 p. 154-p. 155 para. 3
Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-aga Jeruselem

ISI NKE 65

Jizọs Ana-akụzi Ihe Ka Ha Na-aga Jeruselem

MATIU 8:19-22 LUK 9:51-62 JỌN 7:2-10

  • OTÚ UMUNNE JIZỌS SI WERE YA

  • OLEE OTÚ IKWUSA OZI ỌMA ALAEZE CHINEKE DỊRURU NÁ MKPA?

Jizọs nọtụrụ ogologo oge na Galili bụ́ ebe ndị mmadụ na-ege ya ntị karịa otú ha si ege ya na Judia. E wezụgakwa nke ahụ, mgbe ọ gwọrọ otu nwoke ahụ́ na-adịghị na Jeruselem n’Ụbọchị Izu Ike, “ndị Juu malitere ịchọsi ike ka ha gbuo ya.”—Jọn 5:18; 7:1.

A nọzi n’ọnwa Septemba ma ọ bụ Ọktoba n’afọ 32, oge a ga-eji eme Ememme Ụlọ Ndò eruwekwala. A na-eme ememme a abalị asaa, nwezie mgbakọ dị nsọ n’abalị nke asatọ ya. Ememme a na-egosi na oge ọrụ ubi nke afọ ahụ agwụla. Ọ bụkwa oge e ji aṅụrị ọṅụ nakwa oge e ji enye Chineke ekele.

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya aha ha bụ Jems na Jọn

Ụmụnne Jizọs, ya bụ, Jems, Saịmọn, Josef, na Judas gwara ya, sị: “Hapụ ebe a gawa Judia.” Jeruselem bụ ebe ndị mmadụ na-agbakọta efe ofufe na Judia. N’oge ememme atọ ndị Juu na-eme kwa afọ, Jeruselem na-ejupụta na mmadụ. Ụmụnne Jizọs gwara ya, sị: “Ọ dịghị onye na-eme ihe ọ bụla na nzuzo mgbe ọ chọrọ ka ọha mara ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”—Jọn 7:3, 4.

N’eziokwu, ụmụnne Jizọs a “enweghị okwukwe” na Jizọs bụ Mesaya. Ma, ha chọrọ ka ndị ga-agbakọta maka ememme ahụ hụ ọrụ ebube ndị Jizọs na-arụ. Ma, Jizọs ma nsogbu ihe ahụ ha na-asị ya mee nwere ike ịkpatara ya. Ọ gwara ha, sị: “Ụwa enweghị ihe mere ọ ga-eji kpọọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị, n’ihi na m na-agba àmà banyere ya na ọrụ ya dị njọ. Gawanụ ememme ahụ; agawabeghị m ememme a, n’ihi na oge m a kara aka eruchabeghị.”—Jọn 7:5-8.

Ụmụnne Jizọs mechara soro ndị ọzọ na-aga Jeruselem gawa. Mgbe abalị ole na ole gachara, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si ụzọ ọzọ ebe ndị mmadụ na-agaghị ahụ ha gawa. Ha si ụzọ Sameria, kama isi ụzọ nke dị nso n’Osimiri Jọdan, nke ndị mmadụ na-esikarị. Jizọs zipụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwadebere ha ebe ha ga-anọ na Sameria n’ihi na ha ga-anọbọ chi n’ebe ahụ. Ma, ndị ebe ahụ jụrụ ịnabata ha n’ihi na ha chọpụtara na Jizọs na-aga Jeruselem maka ime ememme ndị Juu. Ihe a mere ka iwe bịa Jems na Jọn, ha ajụwa Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ chọrọ ka anyị gwa ọkụ ka o si n’eluigwe daa wee laa ha n’iyi?” (Luk 9:54) Ma, Jizọs baara ha mba maka ikwudị ụdị ihe ahụ ekwu.

Ka ha nọkwa na-aga, otu onye odeakwụkwọ bịakwutere Jizọs, sị ya: “Onye Ozizi, m ga-eso gị gaa ebe ọ bụla ị chọrọ ịga.” Jizọs sịrị ya: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ ga-atọgbọ isi ya.” (Matiu 8:19, 20) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na odeakwụkwọ ahụ ga-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịghọ onye na-eso ụzọ ya. Ma, ọ dị ka odeakwụkwọ ahụ dị okomoko. Ọ gaghị achọ ịta ahụhụ dị́ n’ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ihe a kwesịrị ime ka onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘M̀ ji obi m niile chọọ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs?’

1. Ebe nkịta ọhịa nọ n’ọgba; 2. Ebe nnụnụ nọ n’akwụ́ ya

Jizọs gwara nwoke ọzọ ha hụrụ n’ụzọ, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” Nwoke ahụ zara ya, sị: “Hapụ m ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” Ma, Jizọs ma nke bụ́ eziokwu gbasara nwoke ahụ. Ọ bụ ya mere o ji sị ya: “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị ha nwụrụ anwụ, ma gị onwe gị, gaa kwusaa alaeze Chineke n’ebe niile.” (Luk 9:59, 60) Ọ ga-abụ na nna nwoke ahụ anwụbeghị n’ihi na a sị na ọ nwụọla, ọ ga-esi ike nwa ya nwoke ịnọ ebe a, ya na Jizọs ana-akparịta ụka. O doro anya na nwoke a adịbeghị njikere ime ka ihe gbasara Alaeze Chineke bụrụ ihe kacha ya mkpa ná ndụ.

Ka ha na-agakwa, nwoke ọzọ bịakwutere Jizọs sị ya: “M ga-eso gị, Onyenwe anyị; ma hapụgodị m ka m sị ndị ezinụlọ m ka e mesịa.” Ma, Jizọs sịrị ya: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke jidere aka n’ọ́gụ̀ ma na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ nke kwesịrị nnọọ ekwesị maka alaeze Chineke.”—Luk 9:61, 62.

Onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị itinye uche ya niile n’ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na onye ji ọ́gụ̀ na-akọ ihe ana-ele anya ebe ọzọ, ihe ahụ ọ na-akọ nwere ike ọ gaghị adị mma n’anya. Ọ bụrụkwa na o dowe ọ́gụ̀ ya ma lewe anya n’azụ, ọrụ ya ga-agbawa ọnyụpa. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye ọ bụla na-ele anya n’azụ ka ọ hụ ihe dị n’ụwa ochie a. Onye ahụ ga-esi n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ kpafuo.

  • Olee otú ụmụnne Jizọs si were ya?

  • Gịnị mere ndị Sameria ji jụ ịnabata Jizọs, gịnịkwa ka Jems na Jọn chọrọ ime?

  • Ka Jizọs na ndịozi ya na-aga Jeruselem, gịnị ka ya na ụmụ nwoke atọ ha hụrụ n’ụzọ kwurịtara, gịnịkwa ka Jizọs mere ka a mata gbasara ozi Chineke?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya