Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 11/1 p. 10-15
  • Agụmakwụkwọ n’Oge Bible

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Agụmakwụkwọ n’Oge Bible
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agụmakwụkwọ Ndị Nna Ochie
  • Usoro Agụmakwụkwọ n’Israel
  • Ụzọ Dị Iche Iche nke Izi Ihe
  • Ihe Ndị A Na-akụzi
  • Ndị Nchụàjà, Ndị Livaị, na Ndị Amụma
  • Agụmakwụkwọ n’Oge Ndọrọ n’Agha na Mgbe Ọ Gasịrị
  • Ụlọ Akwụkwọ Ndị Rabaị
  • Agụmakwụkwọ—Jiri Ya Nye Jehova Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ụzọ Ndịàmà Jehova Si Ele Agụmakwụkwọ Anya
    Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ
  • Agụmakwụkwọ nke Nwere Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Bible Ọ̀ Na-akatọ Agụmakwụkwọ?
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 11/1 p. 10-15

Agụmakwụkwọ n’Oge Bible

“Unu ga-ezi ụmụ unu ha.”—DEUTERỌNỌMI 11:19.

1. Gịnị na-egosi na Jehova nwere mmasị n’agụmakwụkwọ nke ndị na-ejere ya ozi?

JEHOVA bụ Onye Nkụzi Akwụkwọ Ukwu. Ọ dịbeghị mgbe ọ hapụrụ ndị na-ejere ya ozi n’ọnọdụ amaghị ihe. Ọ dịwo njikere mgbe nile iso ha kerịta ihe ọmụma. Ọ na-ezi ha uche ya na ụzọ ya nile. N’ọtụtụ puku afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ Ọkpara ya nọ n’akụkụ ya, na-amụ ihe mgbe nile dị ka “onye ọkà” Chineke. (Ilu 8:30) Mgbe ọ nọ n’elu ala Jisọs kwuru, sị: “Di ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.” (Jọn 8:28) N’izo aka n’ebe Chineke nọ dị ka Onye Nkụzi Akwụkwọ Na-enweghị Atụ, Elaịhu jụrụ, sị: “Ònye bụ onye ozizi dị ka ya?” (Job 36:22) Aịsaịa onye amụma kwuru banyere Jehova ịbụ “Onye Ozizi Ukwu” nke ndị Ya wee buo amụma, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 30:20; 54:13) Ajụjụ ọ bụla adịghị ya na Jehova chọrọ ka ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi bụrụ ndị maara ihe a na-akọ na ndị a kụziiri akwụkwọ nke ọma.

Agụmakwụkwọ Ndị Nna Ochie

2, 3. (a) Olee otú ndị nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi si lee agụmakwụkwọ ụmụ ha anya, ntụziaka dịkwa aṅaa ka Jehova nyere Abraham? (b) Nzube dị ebube dị aṅaa dị ná ntụziaka ahụ nke inye ụmụ Abraham ọzụzụ?

2 Otu n’ime ikike ndị bụ isi e nyere onye isi ezinụlọ n’oge ndị nna ochie bụ ọzụzụ nke ụmụ ya na ezinụlọ ya. Nye ndị na-ejere Chineke ozi, agụmakwụkwọ nke ụmụ ha bụ ọrụ okpukpe. Jehova kwuru banyere Abraham na-ejere ya ozi, sị: “Amawo m ya, ka o wee nye ụmụ ya na ụlọ ya, ndị ga-anọchi ya, iwu, ka ha wee debe ụzọ Jehova, ime ezi omume na ihe e kpere n’ikpe; ka Jehova wee weta n’isi Abraham ihe o kwuru banyere ya.”—Jenesis 18:19.

3 Okwu Chineke nke a na-egosi na Jehova lere agụmakwụkwọ anya dị ka ihe dị oké mkpa. Chineke chọrọ ka Abraham, Aịsak, na Jekọb kụziere ezinụlọ ha ihe n’ụzọ Ya nile nke ezi omume na ihe e kpere n’ikpe ka ọgbọ ndị na-abịa n’ihu wee nọrọ n’ọnọdụ nke idebe ụzọ Jehova. Otú a, Jehova ga-emezu nkwa ya nile banyere mkpụrụ Abraham na ngọzi nke “mba nile nke ụwa.”—Jenesis 18:18; 22:17, 18.

Usoro Agụmakwụkwọ n’Israel

4, 5. (a) Gịnị mere ka usoro agụmakwụkwọ ndị Israel dị iche pụọ na nke ndị mba ndị ọzọ? (b) Olee ọdịiche ọzọ dị mkpa nke e depụtara n’akwụkwọ Encyclopaedia Judaica, gịnịkwa ka ihe ịrụ ụka na-adịghị na ya na ọ bụ ya kpatara ọdịiche nke a?

4 Akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Judaica na-asị: “Bible bụ isi iyi bụ isi maka nghọta nke usoro agụmakwụkwọ n’Israel oge ochie.” Jehova jiri Mosis mee ihe dị ka onye nkụzi mbụ bụ mmadụ n’Israel. (Deuterọnọmi 1:3, 5; 4:5) Mosis kpọsara okwu ndị Jehova nyere ya. (Ọpụpụ 24:3) Ya mere, n’ikwu eziokwu, Chineke bụ Onye Nkụzi Akwụkwọ bụ isi nke Israel. Nke a n’onwe ya mere ka usoro agụmakwụkwọ n’Israel dị iche site na nke ndị mba ọzọ.

5 Otu akwụkwọ ntụaka ahụ kwupụtara, sị: “Agụmakwụkwọ dị elu ma ọ bụ ọmụmụ ihe na Mesọpọtamia na Ijipt bụ nke a na-eme n’ụlọ akwụkwọ, ọ dịkwaara nanị ndị odeakwụkwọ, nke na-eyighị ka ọ dị otú ahụ n’Israel. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọdịiche ahụ bụ n’ihi usoro mkpụrụ okwu ndị ka mfe bụ́ nke ndị Hibru ji eme ihe. . . . Ịdị mkpa nke iji mkpụrụ okwu na-ede ihe maka akụkọ ihe mere eme nke agụmakwụkwọ bụ nke a na-apụghị ileghara anya ma ọlị. O webatara nkwụsị nke usoro ọdịnala nke ndị odeakwụkwọ nke Ijipt, Mesọpọtamia, na Kenean nke puku afọ nke abụọ. Ịma akwụkwọ abụkwaghị ihe e ji amata na nke dịịrị nanị ìgwè ndị odeakwụkwọ bụ́ ọkà na ndị nchụàjà, ndị maara agụ ihe odide ndị e ji mkpụrụ okwu ndị dị ka mkpọ na ihe osise dee bụ́ ndị na-esi ike nghọta.”

6. Ihe àmà Bible dị aṅaa ka e nwere na site ná mmalite akụkọ ihe mere eme ha, ndị Israel bụ ndị maara akwụkwọ?

6 Bible na-enye ihe àmà nke na ndị Israel bụ ndị maara akwụkwọ. Tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, a gwara ha ka ha dee iwu nile nke Jehova n’awara ụzọ na n’ọnụ ụzọ ámá ha. (Deuterọnọmi 6:1, 9; 11:20; 27:1-3) Ọ bụ ezie na ihe nke a e nyere n’iwu bụ n’ụzọ ihe atụ, ọ garaghị enwe nnọọ uru ọ bara nye onye Israel nkịtị ma ọ bụrụ na ọ maghị ka e si agụ na ka e si ede. Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Joshua 18:9 na Ndị Ikpe 8:14 na-egosi na ndị ọzọ e wezụga ndị ndú dị ka Mosis na Joshua maara ede ihe ogologo oge tupu e guzobe usoro ndị eze n’Israel.—Ọpụpụ 34:27; Joshua 24:26.

Ụzọ Dị Iche Iche nke Izi Ihe

7. (a) Dị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, ònye nyere ụmụaka ndị Israel agụmakwụkwọ ha bụ isi? (b) Ihe ọmụma dị aṅaa ka onye France bụ onye mmụta Bible na-enye?

7 N’Israel, a na-akụziri ụmụaka ihe site na mgbe ha dị nnọọ ná nwata site n’aka ma nne ma nna ha. (Deuterọnọmi 11:18, 19; Ilu 1:8; 31:26) N’akwụkwọ Dictionnaire de la Bible e dere n’asụsụ French, onye mmụta Bible bụ́ E. Mangenot dere, sị: “Ngwa ngwa o nwere ike ikwu okwu, nwatakịrị na-amụ akụkụ ihe odide ole na ole site n’Iwu ahụ. Nne ya ga na-agụghachi otu amaokwu; mgbe ọ mụtara ya, ọ ga-enye ya ọzọ. E mesịa, a ga-etinye ihe odide nke amaokwu ndị ahụ ha nweworo ike ịgụ site n’isi n’aka ha. Otú a, a na-eme ka ha malite ịgụ ihe, mgbe ha mekwara okenye karị, ha pụrụ ịga n’ihu n’ozizi okpukpe ha site n’ịgụ ihe na ịtụgharị uche n’iwu nke Onyenwe anyị.”

8. (a) Ụzọ nkụzi ihe dị aṅaa bụ isi ka e jiri mee ihe n’Israel, ma nwee ihe dị mkpa dị aṅaa e ji mara ya? (b) Olee ihe ndị e ji mee ihe bụ́ ndị na-enye aka icheta ihe?

8 Nke a na-atụ aro na ụzọ bụ isi e ji mee ihe bụ ịmụ ihe site n’iburu ha n’isi. Ihe ndị a mụtara banyere iwu nile nke Jehova na ụzọ o si emeso ndị ya ga-abami n’ime obi. (Deuterọnọmi 6:6, 7) A ga-atụgharị uche banyere ha. (Abụ Ọma 77:11, 12) Iji nyere ụmụaka na ndị okenye aka iburu ihe n’isi, e jiri ihe dị iche iche na-enye aka iburu ihe n’isi mee ihe. Ndị a gụnyere usoro mkpụrụ okwu, ahịrịokwu ndị na-esote onwe ha n’abụ, bụ́ ndị na-eji mkpụrụ okwu dị iche na-amalite, n’usoro mkpụrụ okwu nile (dị ka Ilu 31:10-31); okwu mgbawa ọnụ (okwu ndị ji otu mkpụrụ okwu ma ọ bụ ụda olu malite); na iji nọmba na-eme ihe, dị ka ndị e jiri mee ihe n’ọkara nke ikpeazụ nke Ilu isi nke 30. Ọ dị mma ịmara na ụfọdụ ndị mmụta lere Gezer Calendar, otu n’ime ihe atụ ndị kasị ochie nke ihe odide Hibru oge ochie, anya dị ka ihe nwa akwụkwọ ji amụ ibu ihe n’isi.

Ihe Ndị A Na-akụzi

9. (a) Gịnị bụ akụkụ dị mkpa nke usoro ọmụmụ ihe maka ụmụaka ndị Israel? (b) Gịnị ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible na-ekwu banyere nkụzi e mere n’oge ememe ndị a na-eme kwa afọ?

9 Agụmakwụkwọ n’Israel ejedebeghị n’ịmụ ịgụ ihe na ide ihe. Otu isi ihe ọmụmụ dị mkpa a na-akụzi bụ akụkọ ihe mere eme. Ịmụ banyere ihe ebube ndị Jehova na-eme maka ndị ya bụ akụkụ dị mkpa nke ihe ndị a na-akụzi. A ghaghị ịkụzi ihe akụkọ ndị a mere eme site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ. (Deuterọnọmi 4:9, 10; Abụ Ọma 78:1-7) Ime ememe ndị a na-eme kwa afọ na-enye ohere mara mma maka onye isi ezinụlọ izi ụmụ ya ihe. (Ọpụpụ 13:14; Levitikọs 23:37-43) Banyere nke a akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia na-asị: “Site n’ihe nna na-ezi n’ebe obibi na ná nkọwa ndị ọ na-enye banyere ịdị mkpa nke ememe ndị ahụ, a kụziiri ụmụaka bụ ndị Hibru ụzọ Chineke siworo gosipụta onwe Ya nye ha n’oge gara aga, ụzọ ha ga-esi bie ndụ mgbe ahụ, na ihe bụ nkwa Chineke banyere ọdịnihu nke ndị Ya.”

10. Ọzụzụ ime ihe eme dị aṅaa ka e nyere ụmụ nwanyị? ụmụ nwoke?

10 Agụmakwụkwọ ndị nne na nna na-enye gụnyere ime ihe eme. A kụziiri ụmụ nwanyị nkà ọrụ ụlọ. Isiakwụkwọ ikpeazụ nke Ilu na-egosi na ndị a dị ọtụtụ ma dị iche iche; ha gụnyere ịtụ ogho, ịkpa ákwà, isi nri, ịzụ ahịa, na nlekọta ezinụlọ. A na-akụzikarịrị ụmụ nwoke ọrụ ego nna ha na-arụ, ma ọ bụ n’ọrụ ugbo ma ọ bụ ọrụ aka ma ọ bụ nkà ọzọ. N’oge ndị sochiri, ndị rabaị ndị Juu nwere àgwà nke ịdị na-ekwu, sị: “Onye na-akụzirighị nwa ya nwoke ọrụ aka bara uru na-azụlite ya ịbụ onye ohi.”

11. Gịnị na-egosi nzube bụ isi nke agụmakwụkwọ n’Israel, ihe ndị dị aṅaa ka nke a na-akụziri ndị na-eto eto taa?

11 Ịdị omimi ime mmụọ nke ụzọ nile nke izi ihe e ji mee ihe n’Israel na-apụta ìhè n’akụkụ nile nke akwụkwọ Ilu. Ọ na-egosi na nzube ya bụ izi “ndị na-enweghị uche” ihe ndị dị elu dị ka amamihe, ịdọ aka ná ntị, nghọta, ezi uche, ezi ikpe, ịma ihe, ihe ọmụma, na izuzu—ihe a dum ‘n’egwu Jehova.’ (Ilu 1:1-7; 2:1-14) Ọ na-emesi ike ebumnobi kwesịrị ịkwali otu n’ime ndị na-ejere Chineke ozi taa imeziwanye agụmakwụkwọ ya.

Ndị Nchụàjà, Ndị Livaị, na Ndị Amụma

12. Olee ndị ma e wezụga ndị nne na nna na-ekere òkè n’ịkụziri ndị Israel akwụkwọ, gịnịkwa bụ isi ihe nke okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “iwu” pụtara?

12 Ebe ndị nne na nna na-enye ọzụzụ bụ isi, Jehova kụzikwuuru ndị ya ihe site n’aka ndị nchụàjà, ndị Livaị na-abụghị ndị nchụàjà, na ndị amụma. Ná ngọzi ikpeazụ ya n’isi agbụrụ Livaị, Mosịs kwuru, sị: “Ha ga-ezi Jekọb ikpe gị nile, iwu gị ka ha ga-ezikwa Israel.” (Deuterọnọmi 33:8, 10) N’ụzọ pụtara ìhè, okwu ahụ bụ “iwu” na Hibru (toh·rahʹ) sitere n’okwu nke ngwaa ya pụtara “igosi,” “ịkụzi,” “izi.” Akwụkwọ Encyclopaedia Judaica na-asị: “Ya mere okwu ahụ bụ [torah] pụtara ‘nkụzi,’ ‘nkwenkwe,’ ma ọ bụ ‘ozizi.’”

13. N’ihi gịnị ka Iwu Israel ji dị iche site n’usoro iwu nke mba ndị ọzọ?

13 Nke a kwa guzopụrụ Israel iche site ná mba ndị ọzọ na ọbụna site ná mba ndị dị n’oge a. Mba ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị taa nwere ọtụtụ iwu nke ụba mmadụ n’ozuzu ha maara nanị ole na ole. Mgbe ndị mmadụ mebiri iwu, ha na-akwụ ndị ọkà iwu ụgwọ dị elu iji kpepụta ha. Ụlọ akwụkwọ dị iche iche maka ịmụ iwu bụ maka ndị ọkachamara. Ma n’Israel, Iwu ahụ bụ ụzọ Chineke nwere isi gwa ndị ya otú ọ chọrọ ka ha si fee ya ma bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya. N’adịghị ka ụkpụrụ iwu ndị ọzọ, ọ gụnyere ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi. (Levitikọs 19:18; Deuterọnọmi 6:5) Iwu ahụ abụtụghị akwụkwọ ụkpụrụ ndị ebere na-adịghị ya. O nyere nkwenkwe, nkụzi, na ozizi banyere ụzọ ndụ nke a na-aghaghị ịmụta.

14. Olee otu ihe mere Jehova ji jụ ndị nchụàjà bụ ndị Livaị? (Malakaị 2:7, 8)

14 Mgbe ha na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị nchụàjà na ndị Livaị na-emezu ibu ọrụ ha nke ịkụziri ndị ahụ ihe. Ma ọtụtụ mgbe karị, ndị nchụàjà leghaara ọrụ dịịrị ha nke inye mba ahụ ọzụzụ anya. Enyeghị ọzụzụ nke a n’Iwu Chineke gaje inwe mmetụta ọjọọ n’ahụ ma ndị nchụàjà ma ndị ahụ. Na narị afọ nke asatọ T.O.A., Jehova buru amụma, sị: “E mewo ka ndị m laa n’iyi site n’enweghị ọmụma Chineke: n’ihi na gị onwe gị ajụwo ọmụma ahụ, m ga-ajụkwa gị, i wee ghara ịbụrụ m onye nchụàjà: i chezọwokwa iwu nke Chineke gị, m ga-echezọkwa ụmụ gị, ọbụna mụ onwe m.”—Hosea 4:6.

15. (a) Tinyere ndị nchụàjà, olee ndị ka Jehova kpọlitere dị ka ndị nkụzi n’Israel, gịnịkwa ka otu onye mmụta Bible dere banyere ọrụ ha dị ka ndị na-akụzi akwụkwọ? (b) Gịnị mesịrị mee Israel na Juda n’ihi na ha jụrụ ihe ọmụma Jehova na ụzọ ya nile?

15 Tinyekwara ndị nchụàjà, Jehova welitere ndị amụma dị ka ndị na-akụzi ihe. Anyị na-agụ, sị: “Jehova wee gbara Israel àmà, gbakwaara Juda, site n’aka onye amụma ọ bụla, na onye ọhụ ụzọ ọ bụla, sị, Sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu laghachi, debe ihe nile m nyere n’iwu, na ụkpụrụ m nile, dị ka iwu ahụ nile si dị nke m nyere nna unu ha n’iwu, nke m zitekwaara unu n’aka ndị ohu m, bụ́ ndị amụma.” (2 Ndị Eze 17:13) Banyere ọrụ ndị amụma dị ka ndị na-akụzi ihe, onye France bụ́ onye mmụta Bible bụ́ Roland de Vaux dere, sị: “Ndị amụma kwa, nwere ọrụ nke izi ndị ahụ ihe; nke a bụkwa ọrụ e kenyere ha dịkwa ka ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Mmụọ ibu amụma na-enyekwa nkwusa ha ikike nke okwu Chineke. O doro anya na n’okpuru usoro ndị eze, ndị amụma bụ ndị na-akụziri ndị ahụ ihe n’ihe banyere okpukpe na omume; anyị pụkwara ịgbakwụnye na ha bụ ndị nkụzi kasị mma, ma ọ bụrụ na ha abụghị ndị a kasị aṅa ntị mgbe nile.” Site ná ndị nchụàjà na ndị Livaị ịhapụ ịkụzi ihe kwesịrị ekwesị na tinyere ịda ada n’idebe okwu ndị amụma Jehova, ndị Israel hapụrụ ụ zọ nile nke Jehova. Sameria dabara n’aka ndị Asiria na 740 T.O.A., ndị Babilọn bibikwara Jerusalem na ụlọ nsọ ya na 607 T.O.A.

Agụmakwụkwọ n’Oge Ndọrọ n’Agha na Mgbe Ọ Gasịrị

16, 17. (a) Usoro agụmakwụkwọ dị aṅaa ka a manyere Daniel na ndị enyi ya atọ inweta? (b) Gịnị nyeere ha aka ịgafere agụmakwụkwọ ndị Babilọn nke a ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova?

16 Ihe dị ka afọ iri tupu mbibi Jerusalem, Eze Nebukadneza dọọrọ Eze Jehoịakin na otu ìgwè ndị isi na ndị a maara aha ha laa Babilọn. (2 Ndị Eze 24:15) N’etiti ha e nwere Daniel na ụmụ okorobịa atọ ndị ọzọ a maara aha ha. (Daniel 1:3, 6) Nebukadneza nyere ha anọ iwu ka ha nweta ọzụzụ pụrụ iche ruo afọ atọ n’ide “akwụkwọ na asụsụ ndị Kaldea.” Ọzọ, e nyere ha “òkè nke ụbọchị ọ bụla n’ụbọchị ya site n’ihe oriri ọma nke eze, na site ná mmanya vine nke ọ na-aṅụ.” (Daniel 1:4, 5) Nke a bụ ihe ize ndụ n’ihi ọtụtụ ihe. O yiri ka usoro ozizi ihe ahụ abụghị nanị nkụzi afọ atọ nke asụsụ. Okwu ahụ bụ “ndị Kaldea” n’akụkụ ihe odide a ka ụfọdụ na-eche na ọ na-egosi, “ọ bụghị ndị Babilọn dị ka otu ndị, kama ndị gụrụ akwụkwọ.” (The Soncino Books of the Bible) Ná nkọwa ya nke Daniel, C. F. Keil na-asị: “A ga-enye Daniel na ndị enyi ya ọzụzụ n’amamihe ndị nchụàjà na ndị gụrụ akwụkwọ bụ́ ndị Kaldea, bụ́ nke a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ndị dị na Babilọn.” Nri eze ahụ kpughepụkwara ha nye imebi mgbochi ndị Iwu Mosis nyere banyere ihe oriri. Olee otú ihe si gaara ha?

17 Dị ka ọnụ na-ekwuchitere ndị Juu anọ ahụ a maara aha ha bụ́ ndị na-eto eto, Daniel mere ka ọ pụta ìhè site ná mmalite na ha agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe nke ga-emebi akọ na uche ha. (Daniel 1:8, 11-13) Jehova gọziri nguzo nke a siri ike ma mee ka obi onye isi Babilọn ahụ na-elekọta ha dị nro. (Daniel 1:9, 14-16) Banyere ọmụmụ ihe ha, ihe ndị mesịrị mee ná ndụ ndị Hibru anọ ahụ na-eto eto nwapụtara n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na agụmakwụkwọ afọ atọ a manyere ha amanye n’omenala ndị Babilọn emeghị ka ha si ná nrapagidesi ike ha rapagidere n’ebe Jehova na ofufe ya dị ọcha nọ pụọ. (Daniel, isi nke 3 na nke 6) Jehova nyeere ha aka ịgụsi akwụkwọ afọ atọ nke a manyere ha amanye ịgụ n’ọgụgụ akwụkwọ dị elu nke Babilọn n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla. “Ma ụmụ okoro anọ ndị a, Chineke nyere ha ọmụma ihe na uche n’akwụkwọ na amamihe nile: Daniel ghọtakwara ọhụụ na nrọ nile. Ma n’okwu ọ bụla nke amamihe nke nghọta, nke eze chọrọ n’aka ha, ọ hụrụ na ha ka ndị odeakwụkwọ dị nsọ nile na ndị dibịa nile ndị nọ n’alaeze ya nile mma ugbo iri.”—Daniel 1:17, 20.

18. Usoro agụmakwụkwọ dị aṅaa ka e nwere na Juda mgbe ndọrọ n’agha ndị Babilọn gasịrị?

18 Mgbe ndọrọ n’agha ndị Babilọn gasịrị, Ezra, onye nchụàjà “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya, na izi ụkpụrụ ya na ikpe ya n’Israel” rụrụ oké ọrụ ịkụzi ihe. (Ezra 7:10) Ndị Livaị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị “mere ka ndị ahụ ghọta iwu ahụ,” nyeere ya aka na nke a. (Nehemaịa 8:7) Ezra bụ onye mmụta Bible na “odeakwụkwọ” ma ọ bụ ọkà n’ide ihe odide. (Ezra 7:6) Ọ bụ n’ụbọchị ya ka ndị odeakwụkwọ ghọrọ ndị a ma ama dị ka otu ìgwè.

Ụlọ Akwụkwọ Ndị Rabaị

19. Òtù ndị nkụzi dị aṅaa biliteworo n’Israel mgbe Jisọs bịara n’ụwa, n’ihi ihe dị aṅaa dị mkpa ka ya na ndị na-eso ụzọ ya ji ghara inweta agụmakwụkwọ dị elu nke ndị Juu?

19 Mgbe Jisọs bịara n’ụwa, ndị odeakwụkwọ aghọwo òtù ndị nkụzi nọ n’ọkwá dị elu, na-arapara n’omenala karịa n’ezi ozizi nke Okwu Chineke. Ọ na-amasị ha ka a na-akpọ ha “Rabaị,” nke ghọworo utu aha nkwanye ùgwù nke pụtara “Onye Ukwu (Ọma) M.” (Matiu 23:6, 7) N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a na-ejikọkarị ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, nke ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nkụzi nke Iwu ahụ. (Ọrụ 5:34) Jisọs boro òtù abụọ ahụ ebubo nke ime ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi omenala ha na ịkụzi “ihe mmadụ nyere n’iwu ka ọ bụrụ ozizi ha.” (Matiu 15:1, 6, 9) Ka a sịkwa ihe mere na ma Jisọs ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ ya adịghị nke a zụrụ n’ụlọ akwụkwọ ndị rabaị.—Jọn 7:14, 15; Ọrụ 4:13; 22:3.

20. Gịnị ka ntụleghachi nke a nke agụmakwụkwọ n’oge Bible gosiworo anyị, gịnịkwa na-egosi na ndị na-ejere Jehova ozi nwere mkpa nke agụmakwụkwọ?

20 Nkọwa nke a nke agụmakwụkwọ n’oge Bible egosiwo na Jehova bụ Onye Ozizi Ukwu nke ndị ya. Site n’aka Mosis, Chineke haziri usoro dị irè nke ịkụzi ihe n’Israel. Ma mgbe ogologo oge gafere, usoro agụmakwụkwọ dị elu nke ndị Juu bilitere bụ́ nke kụziri ihe ndị na-emegide Okwu Chineke. Ọ bụ ezie na Jisọs agaghị ụlọ akwụkwọ ndị Juu, ka o sina dị, ọ bụ Onye Ozizi na-enweghị atụ. (Matiu 7:28, 29; 23:8; Jọn 13:13) O nyekwara ndị na-eso ụzọ ya ọrụ izi ihe, ọbụna ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. (Matiu 28:19, 20) Iji mee nke a ha aghaghị ịbụ ezi ndị nkụzi, n’ihi ya kwa ha ga-enwe mkpa ịnata ọzụzụ. Ya mere olee otú ezi ndị Kraịst kwesịrị isi lee agụmakwụkwọ anya taa? A ga-atụle ajụjụ nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ule Ncheta Ihe

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova nwere mmasị n’agụmakwụkwọ ndị na-ejere ya ozi?

◻ N’akụkụ dịgasị aṅaa ka usoro agụmakwụkwọ ndị Israel si dị iche na nke mba ndị ọzọ?

◻ Agụmakwụkwọ dị aṅaa ka ụmụaka ndị Israel nwetara?

◻ Ụzọ izi ihe ndị dị aṅaa ka e jiri mee ihe n’Israel?

◻ N’ihi gịnị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ji ghara ịga ụlọ akwụkwọ ndị Juu naenye ọzụzụ dị elu?

[Foto dị na peeji nke 14]

Agụmakwụkwọ a manyere amanye na Babilọn emeghị ka Daniel na ndị enyi ya gbakụta Jehova azụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya