Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 5/1 p. 23-28
  • Gosipụta Okwukwe maka Ndụ Ebighị Ebi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gosipụta Okwukwe maka Ndụ Ebighị Ebi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olileanya nke Ndụ Ebighị Ebi
  • Mbilite n’Ọnwụ—Gaa n’Ebee?
  • Anwụghị Anwụ
  • “Ọ Gaghị Anwụ Ma Ọlị ruo Mgbe Ebighị Ebi”
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Nkwenye Gị ná Mbilite n’Ọnwụ Siruru n’Ike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—N’ụzọ Dị Aṅaa, n’Ebee, Olee Mgbe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Olileanya E Ji n’Aka
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 5/1 p. 23-28

Gosipụta Okwukwe maka Ndụ Ebighị Ebi

“Na-enwe okwukwe ruo ichebe mkpụrụ obi.”—NDỊ HIBRU 10:39, NW.

1. Gịnị ka otu ensaịklopidia ndị Katọlik kwetara banyere otú Bible si eji okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi” eme ihe?

Ọ DỊGHỊ ebe ọ bụla Bible kwuru na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-alanarị mgbe ahụ nwụrụ ma nọgide na-adị ndụ ruo ebighị ebi n’ebe ndị bụ mmụọ. Ọbụna New Catholic Encyclopedia kwetara, si: “Echiche nke mkpụrụ obi ịlanarị mgbe mmadụ nwụsịrị abụghị nke a pụrụ ịhụta ngwa ngwa n’ime Bible. . . . Mkpụrụ obi n’A[gba] O[chie] pụtara ọ bụghị akụkụ nke mmadụ, kama mmadụ ahụ n’ozuzu ya—mmadụ dị ka ihe dị ndụ. N’otu aka ahụ n’A[gba] Ọ[hụrụ] ọ na-egosipụta ndụ mmadụ: ndụ nke mmadụ.” Ya mere ụmụ mmadụ enweghị mkpụrụ obi, ha bụ mkpụrụ obi.

2. (a) Ebee ka nkwenkwe mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ si malite? (b) Gịnị bụ eziokwu banyere ọnọdụ mmadụ mgbe ọ nwụsịrị?

2 Dị ka isiokwu bu ụzọ kọwapụtara, nkwenkwe mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ bụ nchepụta ndị na-ekpere arụsị nke a pụrụ isoro laghachi azụ gaa ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme. Onye welitere ya bụ onye megidere nkwupụta doro anya nke Chineke na ‘mmadụ aghaghị ịnwụ’ n’ihi nnupụisi. (Jenesis 2:17) Ọ bụ onye mmegide ahụ, bụ́ Setan Ekwensu, bụ́ onye sịrị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ.” (Jenesis 3:4) Nke ahụ bụkwa ụgha. (Jọn 8:44) E mesịa, Setan kwalitere ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ. Ma ihe bụ eziokwu banyere ọnọdụ mmadụ mgbe ọnwụ gasịrị bụ dị ka Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ kwuru n’Eklisiastis 9:5, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.”—Leekwa Ndị Rom 5:12.

Olileanya nke Ndụ Ebighị Ebi

3. Banyere olileanya dị aṅaa ka Bible nwere ọtụtụ ihe ikwu?

3 Ọ bụ ezie na Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ dịghị ihe dị ka mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, o kwuru ọtụtụ ihe banyere ndụ ebighị ebi. Olileanya nke ndụ na-agaghị agwụ agwụ bụ ozizi bụ isi nke Jisọs. Ọ sịrị: “Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Banyere ndị gosipụtara okwukwe na Chineke na Kraịst, Jisọs kwuru: “Mụ onwe m na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi.” (Jọn 10:28) N’obi ike zuru ezu, ọ sịrị: “Onye na-ekwere na-enwe ndụ ebighị ebi. . . . Ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Jọn 6:47, 51) Ya onwe ya kpọsakwara, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

4. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere olileanya maka ọdịnihu?

4 Ebe ọ bụ na e nweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-alanarị ọnwụ, olee otú a ga-esi mezuo nkwa Bible nke ndụ ebighị ebi? Jisọs nyekwuru ihe ọmụma banyere nke a mgbe o letara Mata na Meri mgbe nwanne ha nwoke bụ Lazarọs nwụsịrị. Ọ gwara Mata, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na m, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” Ọ jụrụ Mata, sị: “Ì kwere nke a?” Mata zara, sị: “Ee, Onyenwe anyị: mụ onwe m ekwerewo na gị onwe gị bụ Kraịst anyị, Ọkpara Chineke.”—Jọn 11: 25-27.

5, 6. Gịnị ka mkpọlite Jisọs kpọlitere Lazarọs bịa ná ndụ ọzọ na-egosipụta?

5 Iji gosipụta na e nyere ya, dị ka Ọkpara Chineke, ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ bịa ná ndụ ọzọ, Jisọs gara n’ili Lazarọs. Lazarọs anwụwo eri ụbọchị anọ, ahụ ya amalitewokwa ire ure. N’agbanyeghị nke ahụ, “[Jisọs] weere oké olu tie mkpu, si, Lazarọs pụta n’èzí. Onye nwụrụrịị anwụ pụtara, e wereworị ákwà ozu kee ya ụkwụ na aka; werekwa ịchafụ kechie ya ihu. Jisọs sị ha, Tọpụnụ ya, gharakwa ya ka ọ laa.” (Jọn 11:43, 44) Ọ kpọghachiwo Lazarọs ahụ nwụrụ anwụ bịa ná ndụ!

6 E sighị n’eluigwe ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ nke ebe ndị bụ mmụọ kpọghachite Lazarọs. Ọ gabeghị n’ebe ndị bụ mmụọ mgbe ọ nwụsịrị kama ọ nọwo n’amaghị onwe ya n’ime ili, ebe ndị nile nwụrụ anwụ nọ. (Abụ Ọma 146:4; Jọn 3:13; Ọrụ 2:34) Ezi uche agaghị adị ya iche na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke Lazarọs nọ na-enwe obi ụtọ nke eluigwe, mgbe ahụ na e sikwa n’eluigwe kpụrụ mkpụrụ obi ahụ n’ike iji jikọghachi ya na ahụ ya na-ezughị okè n’elu ụwa ka o bie ndụ ọzọ n’ụwa nke jupụtara ná ntaramahụhụ, ọrịa, na ọnwụ. Ma ebe ọ bụ na ọ nọghị n’eluigwe, mweghachi e weghachitere ya ná ndụ wetara ọṅụ, n’ihi na ọ pụtara na o nwekwuru afọ ole na ole ọzọ ịdị adị na ịbụ onye e jikọghachiri ya na ndị ọ hụrụ n’anya. E mesịa, ọ ga-anwụ ọzọ.

7, 8. (a) N’ọnọdụ ndị ọzọ dị aṅaa ka Jisọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ? (b) Gịnị mere Jisọs ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ nke iweghachite ndị mmadụ ná ndụ?

7 Mgbe Jisọs kpọlitere otu nwa agbọghọ nke nwụworo anwụ, “ibubo wee nwụbiga” ndị mụrụ ya ókè. (Mak 5:42) Ma, nwa agbọghọ ahụ mesịkwara nwụọ ọzọ. Mgbe Jisọs kpọlitere nwa nwoke nke nwanyị di ya nwụrụ bụ́ onye Nain, “mmadụ nile wee tụọ egwu: ha wee nye Chineke otuto.” (Luk 7:16) Ma nwoke ahụ mesiri nwụọ ọzọ. Banyere ọrụ ebube ndị a, akwụkwọ The New International Dictionary of New Testament Theology na-ekwusi ike, sị; “Ndị Kraịst kpọlitere n’oge ije ozi elu ala ya aghaghị ịnwụ, ebe ọ bụ na mkpọlite ndị a enyeghị ha anwụghị anwụ.”

8 Gịnị mere Jisọs ji wee kpọlite ndị a site ná ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụghị inye ha ndụ ebighị ebi n’oge ahụ, kama iji gosipụta na ya bụ Mesaịa ahụ na iji gosipụta ihe Chineke nyeworo ya ikike ime. O wulitere okwukwe n’olileanya nke mbilite n’ọnwụ na ndụ ebighị ebi n’okpuru ịchịisi ọdịnihu nke Alaeze eluigwe nke Chineke nke dị n’aka Kraịst.—Matiu 6: 9, 10; Jọn 11:41, 42.

9. Olee otú Mata na Pọl si ghọta n’ụzọ ziri ezi ozizi Jisọs banyere olileanya nke mbilite n’ọnwụ?

9 Mata matara banyere olileanya ahụ site ná mkpakọrịta ya na Jisọs, n’ihi na ọ gwawo ya tupu mgbe ahụ banyere Lazarọs, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:24) Ọ matara na mbilite n’ọnwụ ahụ ga-abụ, ọ bụghị n’ụbọchị ikpeazụ ya (nke Lazarọs), kama n’ọdịnihu, “n’ụbọchị ikpeazụ”—Ụbọchị Ikpe, mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’okpuru ịchịisi Ala-eze Chineke. Pọl onyeozi matakwara nke ahụ n’ihi na o kwuru: “[Chineke debere] otu ụbọchị, nke ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya.” (Ọrụ 17:31) Pọl kwukwara, sị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) O kwughị na mbilite n’ọnwụ ahụ amaliteworị iwere ọnọdụ, kama na ọ “gaje ịdị” n’ọdịnihu—n’okpuru ịchịisi Alaeze.

10. Gịnị ka otu prọfesọ bụ onye France kwuru banyere nkwenkwe Krisendọm nke mbilite n’ọnwụ ma e jiri ya tụnyere ozizi Bible nke doro anya?

10 N’akwụkwọ bụ Immortality of the Soul or Resurrection of the Dead? prọfesọ ndị Protestant nke France bụ Oscar Cullmann dere, sị: “E nwere oké ọdịiche dị n’etiti olileanya ndị Kraịst nke mbilite n’ọnwụ na nkwenkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi nke ndị Grik. . . . Ọ bụ ezie na Iso Ụzọ kraịst mesịrị mee ka e nwee njikọ n’etiti nkwenkwe abụọ ndị a, taa onye Kristian nkịtị na-enwekwa mgbagwoju anya banyere ha kpam kpam, ahụghị m ihe mere m ga-eji zochie ihe mụ onwe m na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị ọkà mmụta lere anya dị ka ihe bụ eziokwu. . . . Ndụ na echiche nke Agba Ọhụrụ bụ nke okwukwe ná mbilite n’ọnwụ mejupụtara karịsịa. . . . Mmadụ ahụ n’ozuzu ya, nke nwụrụ anwụ n’ezie, ka e weghachiri ná ndụ site n’ọrụ okike ọhụrụ nke Chineke.”

Mbilite n’Ọnwụ—Gaa n’Ebee?

11, 12. (a) Gịnị bụ nzube Chineke maka ụmụ mmadụ na elu ala nke a? (b) Olee otú Jisọs si gosipụta na nzube Chineke maka elu ala agbanwebeghị?

11 Mgbe Chineke kere ụmụ mmadụ, o nyere ha ụwa dị ka ebe obibi ha ruo mgbe ebighị ebi ma nwee nzube nke iji agbụrụ mmadụ nke ndị ezi omume mejupụta mbara ụwa nke a. (Jenesis 1:26-28; Abụ Ọma 115:16) Bible na-ekwu banyere Jehova dị ka “onye kpụworo ụwa, mee ya; Ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka o kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka ọ kpụrụ ya.”—Aịsaịa 45:18.

12 N’agbanyeghị ọtụtụ puku afọ nke ezughị okè na ọnwụ kemgbe nnupụisi mmadụ, ọ ka bụkwa nzube ya ka ụwa bụrụ ebe obibi mmadụ ruo mgbe ebighị ebi: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Otú a, mgbe Jisọs weghachiri ndị nwụrụ anwụ ná ndụ, ọ kpọghachitere ha kpọmkwem n’ebe a n’ụwa, ndị ọzọ matakwara ha ozugbo dị ka ndị ahụ nwụworo anwụ. Nke a mesiri ya ike na n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ a ga-akpọghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ bịa n’elu ụwa ka ha nwee ohere ibi ndụ ebighị ebi n’elu ya. (Mkpughe 20:12, 13) Nke a ga-emezu nzube Chineke maka ụmụ mmadụ na maka elu ala.—Aịsaịa 46: 9-11; 55:11; Taịtọs 1:1, 2.

13. Nsogbu siri ike di aṅaa na-eche chọọchị nile nke Krisendọm ihu, oleekwa otú ha si anwa idozi ya?

13 Otú ọ dị, ebe chọọchị nile nke Krisendọm kwenyere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, nke a na-etinye ha ná nsogbu siri ike: Olee otú ha ga-esi mee ka mbilite n’ọnwụ nke “mmadụ ahụ n’ozuzu ya,” dị ka Jisọs gosipụtara kwekọọ ná nkwenkwe ha nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, nke nọ ugbu a na-adi adi n’eluigwe ma ọ bụ na hell? The Catholic Encyclopedia na-ekwu n’ụzọ siri ike, si: “Nzukọ nke Anọ nke e mere na Lateran na-akuzi na mmadụ nile, ma hà bụ ndị a họpụtara ahọpụta ma ọ bụ ndị a jụrụ ajụ, ‘ga-ebilite ọzọ n’anụ ahụ nke ha, bụ́ nke ha nwere ugbu a.’” O kwukwasịrị: “Ebe ahụ na-esonye n’imempụ nile nke mkpụrụ obi, na onye ibe nke ezi àgwà ya nile, ezi ikpe nke Chineke yiri ka ọ na-achọ ka ahụ soro kere òkè ná ntaramahụhụ na ụgwọ ọrụ nke mkpụrụ obi.” Dị ka nkwenkwe nke a na-egosi, a na-ejikọghachi ahụ na mkpụrụ obi n’eluigwe ma ọ bụ na hell. Ruo ogologo oge hà aṅaa? Akwụkwọ ahụ na-ekwu, sị: “A ga-enye ahụ ndị ahụ e mere ka ha bilite n’ọnwụ, ma ndị nsọ ma ndị mmehie, anwụghị anwụ.”

14. Olee otú otu onye Jesuit na-ede ihe si nwaa ime ka echiche ndị Krisendọm nke mbilite n’ọnwụ nke ahụ doo anya?

14 N’akwụkwọ bụ The Future Life nke onye Jesuit bụ J. C. Sasia dere, anyị na-agụ, sị: “Ya mere ndụ nke eluigwe ga-abụ nke obi ụtọ sitekwa n’echiche ndị e mere ka ha dị ebube [nke ijikọghachi ahụ na mkpụrụ obi].” Banyere ahụ ndị e jikọghachiri ha na mkpụrụ obi ha na hell, akwụkwọ ahụ na-ekwu, sị: “Na hell, mgbe mbilite n’ọnwụ [nke ahụ] ga-sịrị, echiche nile nke ahụ mmadụ ga-enwe ntaramahụhụ pụrụ iche nke onwe ya . . . A ga-ata ikike nke inwe mmetụta ahụhụ karịsịa, n’ihi na ọ bụ site ná mmehie nke anụ ahụ karịsịa ka ndị a jụrụ ajụ siworo mejọọ Chineke. . . . Njikọ ha na ahụ ha ga-abụrụ ha ihe ọzọ a ga-eji nye ha ahụhụ ma kpagbuo ha.”

15. Gịnị mere o ji bụrụ nkwulu izi na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ na hell ruo mgbe ebighị ebi?

15 Otú a, ịnakwere echiche ndị ọgọ mmụọ nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi meghere ụzọ nye Krisendọm ịnakwerekwa echiche ndị ọgọ mmụọ nke oké ntaramahụhụ nke mkpụrụ obi—ọbụna nke ahụ—na hell ruo mgbe ebighị ebi. Ma, banyere ihe omume oge ochie ahụ nke isure ụmụ ntakịrị n’ọkụ dị ka àjà nye chi ụgha dị iche iche, Jehova kwuru, sị: “Ha . . . [esurewo] ụmụ ha ndị ikom n’ọkụ ka ha bụrụ àjà nsure ọkụ a na-achụrụ Beal; nke m na-enyeghị n’iwu, ekwughịkwa m ya, ọ bataghịkwa n’obi m.” (Jeremaịa 19:5) Ya mere ọ bụ nkwulu izi na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi, mgbe Okwu ya na-egosipụta n’ụzọ doro anya na a ga-ebibi ndị mmehie na-enweghị nchegharị, mee ka ha ghara ịdịkwa adị. “A ga-ebibi kpam kpam mkpụrụ obi ọ bụla nke na-aṅaghị Onye amụma ahụ [Jisọs] ntị.”—Ọrụ 3: 23, NW; leekwa Matiu 10:28; Luk 17:27; Jọn 3:16; 2 Pita 2:12; Jud 5.

Anwụghị Anwụ

16. Gịnị ka Bible na-ezi banyere anwụghị anwụ?

16 Otú ọ dị, ọ̀ bụ na Bible akuzighị na a ga-akpọje ndị mmadụ n’eluigwe ibi ndụ anwụghị anwụ n’ebe ahụ? Ee, o mere otú ahụ. Ma ọ dịghị njikọ ọ bụla nke a na mkpụrụ obi mmadụ ndị na-adịghị anwụ anwụ nwere. Anwụghị anwụ na-esite ná mmadụ ịbụ onye a kpọlitere dị ka onye e kere eke bụ mmụọ (dị ka Jisọs), ọ bụghịkwa site na ya inwe mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke lanarịworo ọnwụ. Ụgwọ ọrụ ọdịnihu nke anwụghị anwụ ka e setịpụụrụ ụfọdụ ndị yiri Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi, a ga-enwetakwa ya nanị mgbe Kraịst batara n’ike Alaeze ahụ n’eluigwe, ọ bụghị ngwa ngwa mgbe Kraịst lagosịrị n’eluigwe na narị afọ nke mbụ.—Abụ Ọma 110:1; 1 Ndị Kọrint 15: 53, 54.

17. Mmadụ ole ga-enweta anwụghị anwụ, òkè dị aṅaa ka ha na-ekerekwa ná nzube Chineke maka elu ala?

17 Ọzọkwa, e setịpụụrụ ọnụ ọgụgụ dị nta nke ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ olileanya ahụ. Jisọs kpọrọ ndị a “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) Ìgwè nke a, nke dị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ, ka a ga-akpọlite gaa ná ndụ eluigwe dị ka ndị mmụọ e kere eke ndị na-apụghị ịnwụ anwụ isoro Kraịst n’Alaeze eluigwe ya chịa isi n’elu ụwa. (2 Pita 3:13; Mkpughe 7:4; 14:1, 4; 20:4) Mgbe oge na-aga, ụmụ mmadụ e mere ka ha zuo okè, ga-ebijupụta elu ụwa ha ga-achị isi na ya, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ha ga-abụ ọtụtụ puku nde mmadụ. Ọtụtụ n’ime ndị mmadụ ahụ ga-abụ ndị ga-alọghachi n’elu ụwa site ná “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ma, a ga-enwe ndị ọzọ nwetara ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ e wezuga ndị ahụ a kpọlitere site n’ọnwụ. Olee ndị ka ndị ọzọ a bụ?

“Ọ Gaghị Anwụ Ma Ọlị ruo Mgbe Ebighị Ebi”

18. Tinyere olileanya mbilite n’ọnwụ maka ndị nwụrụ anwụ, ihe dị ebube dị aṅaa ka Jisọs buru n’amụma?

18 Ebe olileanya e ji n’aka maka ndị nwụrụ anwụ bụ mbilite n’ọnwụ, ọ dị olileanya ọzọ dị ebube e nwere n’oge anyị. O metụtara ihe Jisọs gara n’ihu ịgwa Mata. Mgbe o kwusịrị, sị: “Onye na-ekwere na m, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ [ná mbilite n’ọnwụ],” Jisọs kwukwasịrị, “ọzọ onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na m, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.” (Jọn 11:25, 26) N’okwu ikpeazụ nke a, Jisọs buru amụma ihe di ebube: Oge ga-abịa mgbe ọ na-agaghị adịkwa mkpa ka ndị di ndụ nwụọ! Ma ole mgbe nke ahụ ga-abụ?

19. (a) N’oge dị aṅaa ka a ga-emezu olileanya nke anwụghị anwụ ma ọlị? (b) Olee otú Bible si akọwa ndị nwere olileanya nke anwụghị anwụ ma ọlị?

19 Ugbu a—ụbọchị anyị—bụ oge maka nkwa ahụ imezu! Ihe àmà nile na-egosi na anyị nọ oké nso ọgwụgwụ nke ụwa ọjọọ nke a. (Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5, 13) N’ihi ya, ndị mmadụ ndị na-etinye okwukwe na Chineke na n’Ọkpara ya n’oge a nwere olileanya na-akpali akpali nke ịlanarị ọgwụgwụ usoro ihe ọjọọ nke a na ịnọgide na-adị ndụ banye n’ụwa ọhụrụ Chineke—n’anwụghịkwa anwụ ma ọlị! E kwuru banyere ndị a ná Mkpughe 7:9, 14 dị ka “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị’ nile, na asụsụ nile, pụta, . . . [bụ́ ndị] na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta,” ndị Chineke chebere n’ihi ha igosipụta okwukwe. Jisọs kwuru okwu banyere mbibi nke usoro ihe ọjọọ nke dị ugbu a dị ka “mkpagbu ukwu . . . nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe ahụ, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” —Matiu 24:21; leekwa Ilu 2:21, 22; Abụ Ọma 37:10, -11, 34.

20, 21. Olee otú ọtụtụ nde mmadụ taa si egosipụta okwukwe na Chineke na Kraịst, gịnịkwa ka ọtụtụ n’ime ha na-agaghị enwe mkpa ya?

20 Gburugburu ụwa, ọtụtụ nde mmadụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ ndị chọrọ ibi ndụ ebighị ebi n’elu ụwa anọworị na-egosipụta okwukwe ná nkwa nile nke Chineke na n’onye ahụ nke o nyeworo ikike ịbụ “mbilite n’ọnwụ na ndụ,” bụ́ Jisọs Kraịst. Ha ararawokwa onwe ha nye Chineke, na-egosipụta nke a site na baptism ime mmiri. (Matiu 28:19, 20) Ha na-aghọta na nzọpụta ha dabeere kpam kpam na “Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, [na] Nwa Atụrụ ahụ,” bụ́ Jisọs Kraist.—Mkpughe 7:10.

21 Mbilite n’ọnwụ adịghị ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ nke lanarịrị ọgwụgwụ ụwa nke a mkpa n’ihi na ha ‘agaghị anwụ anwụ ma ọlị’! Ị̀ na-eme ihe iji soro n’ìgwè mmadụ a? Ọ bụrụ otú ahụ, lee oké ihe ùgwù nke pụrụ iche nke na-emeghere gị—bụ nke ịlanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe ọjọọ Setan na ịbụ onye e webara n’ime ọgbọ ọhụrụ nke ezi omume nke ga-ewetara gị ahụ ike zuru okè na ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala! (Luk 23:43; Mkpughe 21:4, 5) Site n’ịmụta ihe bụ uche Chineke na ịnọgidesi ike n’ime ya, ị ga-enwe ike igosipụta na ị dịghị “n’etiti ndị wezugara onwe ha ịla n’iyi.” Gị onwe gị pụkwara ‘inwe okwukwe gaa n’inweta mkpụrụ obi gị.’—Ndị Hibru 10:39; 1 Jọn 2:15-17; Mkpughe 7:15.

Ajụjụ maka Ntụleghachi

◻ Gịnị bụ ezi olileanya maka ndị nwụrụ anwụ?

◻ N’ihi gịnị ka nkwenkwe Krisendọm nke mbilite n’ọnwụ nke ahụ ji bụrụ inye Chineke mkparị?

◻ Gịnị ka Bible na-ezi banyere anwụghị anwụ?

◻ Olee olileanya dị ebube nke ndị mmadụ pụrụ inwe taa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya