Isi nke Anọ
Onye Ndị Amụma Nile Gbara Àmà Banyere Ya
1. Gịnị ka ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ịdị adị Jizọs tupu ya aghọọ mmadụ na-egosi banyere mmekọrịta ya na Jehova?
“NNA m nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe Ọkpara ya nọ, na-egosikwa ya ihe nile ya onwe ya na-eme.” (Jọn 5:20) Lee mmekọrịta ịhụnanya Ọkpara ahụ na Nna ya, bụ́ Jehova, nwere! Ichi anya nke mmekọrịta ahụ malitere n’oge e kere ya, ọtụtụ puku afọ tupu a mụọ ya dị ka mmadụ. Ọ bụ Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, nanị onye Jehova ji aka ya kee kpọmkwem. E si n’aka Ọkpara ahụ e bu ụzọ mụọ, onye a hụrụ n’anya nke ukwuu, kee ihe ndị ọzọ nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) O jekwara ozi dị ka Okwu Chineke, ma ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru ya, bụ́ Onye e sitere n’ọnụ ya gwa ndị ọzọ uche Chineke. Onye a, bụ́ Ọkpara nke Chineke hụrụ n’anya n’ụzọ pụrụ iche, ghọrọ nwoke ahụ bụ́ Jizọs Kraịst.—Ilu 8:22-30; Jọn 1:14, 18; 12:49, 50.
2. Ruo n’ókè ha aṅaa ka amụma ndị dị na Bible zoworo aka n’ebe Jizọs nọ?
2 Tupu a tụrụ ime Ọkpara Chineke e bu ụzọ mụọ n’ụzọ ọrụ ebube dị ka mmadụ, e deturu ọtụtụ amụma ndị sitere n’ike mmụọ nsọ banyere ya. Pita onyeozi gbaara Kọniliọs àmà, sị: “Ọ bụ ya ka ndị amụma nile na-agba àmà banyere ya.” (Ọrụ 10:43) E kwuru okwu banyere ọrụ Jizọs n’ime Bible ruo n’ókè nke na otu mmụọ ozi gwara Jọn onyeozi, sị: “Ịgba àmà banyere Jizọs bụ ihe na-akpali ibu amụma.” (Mkpughe 19:10) Amụma ndị ahụ mere ka a mata ya n’ụzọ doro anya dị ka Mezaịa ahụ. Ha dọọrọ uche gaa n’ọrụ dịgasị iche iche ọ ga-arụ n’imezu nzube Chineke. Ihe a nile kwesịrị ịdọrọ mmasị anyị nke ukwuu taa.
Ihe Amụma Dị Iche Iche Kpughere
3. (a) N’amụma ahụ dị na Jenesis 3:15, ole ndị ka agwọ ahụ, “nwanyị ahụ,” na ‘mkpụrụ nke agwọ ahụ’ na-anọchite anya ha? (b) N’ihi gịnị ka ‘ichifịa agwọ ahụ n’isi’ ji na-adọrọ mmasị nke ndị ohu Jehova nke ukwuu?
3 E buru nke mbụ n’ime amụma ndị dị otú ahụ mgbe nnupụisi ahụ nke weere ọnọdụ n’Iden gasịrị. Jehova sịrị agwọ ahụ: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Ọ bụ Setan n’ezie, bụ́ onye agwọ ahụ nọchiri anya ya, ka e buuru amụma ahụ. “Nwanyị ahụ” bụ nzukọ eluigwe na-eguzosi ike n’ihe nke Jehova n’onwe ya, bụ́ nke yiri nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. ‘Mkpụrụ nke agwọ ahụ’ na-agụnye ndị mmụọ ozi nile nakwa ụmụ mmadụ nile bụ́ ndị na-egosipụta mmụọ nke Setan, ndị na-emegide Jehova na ndị Ya. ‘Ichifịa agwọ ahụ n’isi’ pụtara mbibi a ga-emesịa bibie onye nnupụisi ahụ bụ́ Setan, bụ́ onye kwutọrọ Jehova ma wetara ihe a kpọrọ mmadụ oké nhụsianya. Ma ònye bụ akụkụ bụ́ isi nke “mkpụrụ” ahụ, bụ́ onye ga-echifịa agwọ ahụ n’isi? Ruo ọtụtụ narị afọ, nke ahụ nọgidere na-abụ ‘ihe nzuzo dị nsọ.’—Ndị Rom 16:20, 25, 26.
4. Olee otú usoro ọmụmụ Jizọs si enye aka n’ime ka a mata ya dị ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa?
4 Mgbe ihe dị ka afọ 2,000 nke akụkọ ihe mere eme mmadụ gasịrị, Jehova nyekwuru nkọwa banyere nke a. O kwuru na Mkpụrụ ahụ ga-esite n’usoro ọmụmụ ezinụlọ Ebreham. (Jenesis 22:15-18) Otú ọ dị, usoro ọmụmụ nke Mkpụrụ ahụ ga-esite na ya ga-adabere, ọ bụghị n’usoro ọmụmụ anụ ahụ́, kama n’onye Chineke họọrọ. N’agbanyeghị otú Ebreham hụruru nwa ya nwoke bụ́ Ishmael, nke Hega mụọrọ ya n’anya, Jehova kwuru, sị: “Ọgbụgba ndụ m ka M ga-eme ka o guzosie ike n’ebe [Aịzik] nọ, bụ́ nke Sera ga-amụrụ gị.” (Jenesis 17:18-21) Ka oge na-aga, e mesiri ọgbụgba ndụ ahụ ike, ọ bụghị nye diọkpara Aịzik, bụ́ Ịsọ, kama nye Jekọb, bụ́ onye mụrụ ebo 12 nke Izrel. (Jenesis 28:10-14) Ka oge na-aga, e kwuru na a ga-amụ Mkpụrụ ahụ n’ebo Juda, n’usoro ọmụmụ Devid.—Jenesis 49:10; 1 Ihe E Mere 17:3, 4, 11-14.
5. Mgbe Jizọs malitere ozi ya n’elu ala, olee ihe mere ka o doo anya na ọ bụ ya bụ Mezaịa ahụ?
5 Olee ihe ndị ọzọ e kwuru a ga-eji amata onye bụ Mkpụrụ ahụ? Ihe karịrị afọ 700 tupu oge eruo, Bible kpọrọ Betlehem aha dị ka ebe a ga-amụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa dị ka mmadụ. O kpughekwara na Mkpụrụ ahụ dịrịị adị “site n’ụbọchị nile nke mgbe ebighị ebi gara aga,” eri oge e kere ya n’eluigwe. (Maịka 5:2) Site n’ọnụ Daniel onye amụma, e bukwara amụma kpọmkwem oge ọ ga-abịa n’ụwa dị ka Mezaịa. (Daniel 9:24-26) Mgbe e jikwa mmụọ nsọ tee Jizọs mmanụ, o wee ghọọ n’ezie Onye Jehova E Tere Mmanụ, olu Chineke nke sitere n’eluigwe kọwara ya n’ụzọ doro anya dị ka Ọkpara Ya. (Matiu 3:16, 17) E kpughewo onye Mkpụrụ ahụ bụ! Ya mere, Filip pụrụ iji nkwenye siri ike kwuo, sị: “Anyị ahụwo onye ahụ nke Mozis, n’ime Iwu ahụ, na Ndị Amụma dere banyere ya, bụ́ Jizọs.”—Jọn 1:45.
6. (a) N’ikwekọ n’ihe e dere na Luk 24:27, gịnị ka ụmụazụ Jizọs bịara ghọta? (b) Ònye bụ akụkụ bụ́ isi nke ‘mkpụrụ nwanyị ahụ,’ gịnịkwa ka ya ichifịa agwọ ahụ n’isi pụtara?
6 Mgbe e mesịrị, ụmụazụ Jizọs bịara ghọta na n’ụzọ nkịtị, e mewo ka ọtụtụ amụma ndị na-ezo aka n’ebe ọ nọ ghọọ akụkụ nke Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ. (Luk 24:27) Ọ bịara ọbụna dokwuo anya na Jizọs bụ akụkụ bụ́ isi nke ‘mkpụrụ nwanyị ahụ,’ onye ga-echifịa agwọ ahụ n’isi, gwepịa Setan ka ọ ghara ịdịkwa. Site n’aka Jizọs, a ga-emezu nkwa nile Chineke kwere ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ ihe nile na-agụsi anyị agụụ ike.—2 Ndị Kọrint 1:20.
7. Tụkwasị n’ịmata Onye ahụ e zoro aka na ya n’amụma ndị ahụ, gịnị ọzọ ka ọ bara uru ịmata?
7 Olee otú ịmara nke a kwesịrị isi emetụta anyị? Bible na-akọ banyere otu ọnaozi Etiopia, bụ́ onye gụrụ ụfọdụ n’ime amụma ndị a banyere Onye Mgbapụta na Mezaịa ahụ na-abịanụ. N’ịbụ onye nọ ná mgbagwoju anya, ọ jụrụ onye ahụ na-ezisa ozi ọma bụ́ Filip, sị: “Banyere ònye ka onye amụma ahụ na-ekwu nke a?” Ma mgbe a zara ya ajụjụ ya, ọnaozi ahụ ekweghị ka okwu ahụ jedebe ebe ahụ. Mgbe ọ ṅasịrị ntị nke ọma ná nkọwa Filip nyere, nwoke ahụ matara na inwe ekele maka amụma a mezurunụ chọrọ ka o mee ihe. Ọ ghọtara na ọ dị mkpa ka e mee ya baptizim. (Ọrụ 8:32-38; Aịsaịa 53:3-9) Ànyị na-emeghachi omume otú ahụ?
8. (a) Gịnị ka mgbalị Ebreham mere ịchụ Aịzik n’àjà sere onyinyo ya? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji gwa Ebreham na mba nile ga-agọzi onwe ha site ná Mkpụrụ ahụ, oleekwa otú nke a si emetụta anyị taa?
8 Cheekwa echiche banyere ihe ndekọ ahụ na-emetụ n’ahụ́ banyere mgbalị Ebreham mere ịchụ Aịzik, bụ́ nanị nwa Sera mụọrọ ya, n’àjà. (Jenesis 22:1-18) Nke ahụ sere onyinyo ihe Jehova ga-eme—ịchụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’àjà: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Nke a na-eme ka anyị nwee obi ike na dị nnọọ ka Jehova nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya iji mezuo nzube Ya, Ọ ‘ga-ejikwa obiọma nye anyị ihe nile ọzọ.’ (Ndị Rom 8:32) Gịnị ka a chọrọ anyị n’aka? Dị ka e dekọrọ na Jenesis 22:18, Jehova gwara Ebreham na mba nile ga-agọzi onwe ha site ná Mkpụrụ ahụ, “n’ihi na [Ebreham egewo] ntị n’olu [Chineke].” Ọ dịkwa anyị onwe anyị mkpa ige Jehova na Ọkpara ya ntị: “Onye na-egosipụta okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ, kama ọnụma nke Chineke na-adịkwasị ya.”—Jọn 3:36.
9. Ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka olileanya ndụ ebighị ebi nke àjà Jizọs mere ka o kwe omume, gịnị ka anyị ga-eme?
9 Ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka olileanya ndụ ebighị ebi nke àjà Jizọs mere ka o kwe omume, anyị ga-achọ ime ihe Jehova gwara anyị site n’ọnụ Jizọs. E jikọtara ihe ndị a na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi anyị nọ. (Matiu 22:37-39) Jizọs gosiri na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-akpali anyị ịkụziri ndị ọzọ “ka ha debe ihe nile [Jizọs] nyeworo [anyị] n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Anyị kwesịkwara iso ndị anyị na ha na-ejekọrọ Jehova ozi na-ekerịta ịhụnanya ahụ site n’anyị na ha ịdị na-enwe “nzukọ nke anyị onwe anyị” mgbe nile. (Ndị Hibru 10:25; Ndị Galeshia 6:10) Ọzọkwa, n’ige Chineke na Ọkpara ya ntị, anyị ekwesịghị iche na ha na-achọ izu okè n’aka anyị. Ndị Hibru 4:15 na-ekwu na Jizọs, dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà anyị, pụrụ “imetara anyị ebere n’adịghị ike anyị.” Lee ihe nkasi obi nke ahụ bụ, karịsịa mgbe anyị na-ekpegara Chineke ekpere maka enyemaka iji merie adịghị ike anyị site n’aka Kraịst!—Matiu 6:12.
Gosi Okwukwe na Kraịst
10. N’ihi gịnị ka nzọpụta na-adịghị ma e wezụga Jizọs Kraịst?
10 Mgbe ọ kọwasịịrị ụlọikpe ukwu nke ndị Juu dị na Jeruselem na amụma Bible emezuwo n’ahụ́ Jizọs, Pita onyeozi ji nkwenye siri ike kwubie, sị: “Nzọpụta adịghị n’onye ọ bụla ọzọ, n’ihi na aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyeworo n’etiti ụmụ mmadụ bụ́ nke a na-aghaghị isi na ya zọpụta anyị.” (Ọrụ 4:12) Ebe ọ bụ na ụmụ Adam nile bụcha ndị mmehie, ọnwụ ha abaghị uru ọ bụla nke ịbụrụ onye ọ bụla ihe mgbapụta. Ma Jizọs zuru okè, ndụ ya bakwara uru ịbụ àjà. (Abụ Ọma 49:6-9; Ndị Hibru 2:9) O nyere Chineke ihe mgbapụta nke ya na ndụ ahụ zuru okè nke Adam tụfuru hà kpọmkwem n’ọnụ ahịa. (1 Timoti 2:5, 6) Nke a megheere anyị ụzọ inweta ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.
11. Kọwaa otú àjà Jizọs pụrụ isi baara anyị uru nke ukwuu.
11 Ihe mgbapụta ahụ meghekwaara anyị ụzọ inweta uru ndị ọzọ, ọbụna ugbu a. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na anyị bụ ndị mmehie, àjà Jizọs mere ka o kwe omume anyị inwe akọ na uche dị ọcha n’ihi mgbaghara nke mmehie. Nke a karịrị nnọọ ihe ọ bụla àjà ụmụ anụmanụ ahụ nke Iwu Mozis kwuru ka a na-achụ meere ụmụ Izrel. (Ọrụ 13:38, 39; Ndị Hibru 9:13, 14; 10:22) Otú ọ dị, inweta mgbaghara mmehie dị otú ahụ na-achọ ka anyị jiri obi eziokwu mata otú àjà Kraịst dịruru anyị ná mkpa: “Ọ bụrụ na anyị ekwuo, sị: ‘Anyị enweghị mmehie,’ anyị na-eduhie onwe anyị, eziokwu adịghịkwa n’ime anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, ọ na-ekwesị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume iji wee gbaghara anyị mmehie anyị ma mee ka anyị dị ọcha pụọ n’ajọ omume nile.”—1 Jọn 1:8, 9.
12. N’ihi gịnị ka ịbụ onye e mikpuru n’ime mmiri ji bụrụ ihe dị mkpa n’inweta ezi akọ na uche n’ebe Chineke nọ?
12 Olee otú ndị mmehie pụrụ isi gosipụta okwukwe na Kraịst na n’àjà ya? Mgbe ndị mmadụ nọ na narị afọ mbụ ghọrọ ndị kwere ekwe, ha gosipụtara ya n’ihu ọha. N’ụzọ dị aṅaa? E mere ha baptizim. N’ihi gịnị? N’ihi na Jizọs nyere iwu ka e mee ndị nile na-eso ụzọ ya baptizim. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 8:12; 18:8) Mmadụ agaghị ahapụli ime ihe mgbe onyinye ahụ Jehova ji ịhụnanya nye site n’aka Jizọs kpaliri obi ya n’ezie. Ọ ga-eme mgbanwe ọ bụla dị mkpa ná ndụ ya, rara onwe ya nye Chineke n’ekpere, ma gosipụta nraranye ya site n’ịbụ onye e mikpuru n’ime mmiri. Ọ bụ site n’igosipụta okwukwe n’ụzọ dị otú a ka onye ahụ ‘na-arịọ Chineke arịrịọ maka ezi akọ na uche.’—1 Pita 3:21.
13. Ọ bụrụ na anyị amata na anyị emewo mmehie, gịnị ka anyị kwesịrị ime banyere ya, n’ihi gịnịkwa?
13 Otú ọ dị, ọbụna mgbe nke a gasịrị, anyị ka ga na-eme mmehie. Gịnịzi ka a ga-eme? Jọn onyeozi sịrị: “M na-edetara unu ihe ndị a ka unu wee ghara ime mmehie. Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye inyeaka nọ n’ebe Nna ahụ nọ, bụ́ Jizọs Kraịst, onye ezi omume. Ọ bụkwa àjà ime udo maka mmehie anyị.” (1 Jọn 2:1, 2) Nke a ọ̀ pụtara na n’agbanyeghị ihe anyị mere, ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere rịọ Chineke maka mgbaghara, na okwu agwụla? Ọ bụchaghị otú ahụ. Isi ihe dị mkpa iji nweta mgbaghara mmehie bụ ezi nchegharị. A pụkwara ịchọ enyemaka nke ndị mere okenye karị, ndị nwere ahụmahụ karị, ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Anyị aghaghị ikweta ịdị njọ nke ihe anyị mere ma nwee mwute sitere n’obi maka ya ka anyị wee nwee ike ime ezigbo mgbalị iji zere ime ya ọzọ. (Ọrụ 3:19; Jems 5:13-16) Ọ bụrụ na anyị emee nke a, anyị pụrụ ijide n’aka na anyị ga-enweta enyemaka Jizọs nakwa na a ga-eme ka anyị nwetaghachi ihu ọma Jehova.
14. (a) Kọwaa otu ụzọ dị mkpa àjà Jizọs siworo baara anyị uru. (b) Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe n’ezie, gịnị ka anyị ga-eme?
14 Àjà Jizọs emegheworo “ìgwè atụrụ nta,” bụ́ akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ ahụ e hotara na Jenesis 3:15 ụzọ maka ịdị ndụ agwụghị agwụ n’eluigwe. (Luk 12:32; Ndị Galeshia 3:26-29) O meghewokwara ọtụtụ ijeri ndị ọzọ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ ụzọ maka ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 20:11, 12; 21:3, 4) Ndụ ebighị ebi bụ “onyinye nke Chineke na-enye . . . site na Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23; Ndị Efesọs 2:8-10) Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe n’onyinye ahụ ma nwee ekele maka ụzọ e si mee ka o kwe omume, anyị ga-egosipụta ya. N’ịghọta otú Jehova siworo jiri Jizọs mee ihe n’ụzọ magburu onwe ya n’imezu uche Ya nakwa otú o si dị mkpa na anyị nile gbasochiri nzọụkwụ Jizọs anya, anyị ga-eme ije ozi Ndị Kraịst otu n’ime ihe omume kasị mkpa anyị na-eme ná ndụ anyị. Okwukwe anyị ga-apụta ìhè site ná nkwenye anyị ji na-agwa ndị ọzọ banyere onyinye a dị ebube nke sitere n’aka Chineke.—Ọrụ 20:24.
15. Olee otú inwe okwukwe na Jizọs Kraịst si eme ka a dị n’otu?
15 Lee mmetụta dị mma, nke na-eme ka a dị n’otu, okwukwe dị otú ahụ nwere! Site na ya, a na-adọtakwu anyị nso n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ, nakwa n’ebe ndị ibe anyị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, nọ. (1 Jọn 3:23, 24) Ọ na-eme ka anyị ṅụrịa ọṅụ na Jehova ejiriwo obiọma nye Ọkpara ya “aha nke dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ [e wezụga aha Chineke], ka ikpere ọ bụla wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’elu ụwa ma nke ndị nọ n’okpuru ala, ire ọ bụla ekwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.”—Ndị Filipaị 2:9-11.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Mgbe Mezaịa ahụ bịara, gịnị mere ndị kwenyere n’ezie n’Okwu Chineke ji mata onye ọ bụ n’ụzọ doro anya?
• Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị kwesịrị ime iji gosipụta ekele anyị nwere maka àjà Jizọs?
• N’ụzọ dịgasị aṅaa ka àjà Jizọs siwororịị baara anyị uru? Olee otú nke a si enyere anyị aka mgbe anyị na-ekpegara Jehova ekpere maka mgbaghara mmehie?
[Foto dị na peeji nke 36]
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ịkụziri ndị ọzọ ka ha debe ihe ndị Chineke nyere n’iwu