Jehova Bụ Onye Na-achị Anyị!
“Anyị aghaghị ikwenyere Chineke (dị ka onye na-achị achị, NW) karị mmadụ.”—ỌRỤ 5:29.
1, 2. Ọnọdụ dị aṅaa nke ndị ozi ka Ndịàmà Jehova na-ewere taa mgbe ụmụ mmadụ na-achọ ka ha mee ihe ndị megidere nzube Chineke?
JEHOVA CHINEKE ekwerewo ka a kpọrọ ndị ikom iri na abụọ jee n’ihu otu ụlọikpe dị elu. Ọ bụ n’afọ 33 O.A., ụlọikpe ahụ bụkwa Sanhedrin nke ndị Juu. Ndị a na-ekpe ikpe bụ ndị ozi Jisọs Kraịst. Gee ntị! Onyeisi nchụaja ahụ kwuru, sị, “Anyị nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izi ihe n’aha nke a, ma lee, unu ewerewo ozizi unu mejuo Jerusalem.” Mgbe ahụ, Pita na ndị ozi ahụ kwuru, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke [dị ka onye na-achị achị, NW] karị mmadụ.” (Ọrụ 5:27-29) Isi ihe nke ihe ha kwuru bụ: “Jehova bụ Onye Na-achị anyị!”
2 Ee, Jehova bụ Onye Na-achị ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs. E mere ka nke a pụta ìhè n’akwụkwọ Bible ahụ bụ Ọrụ Ndị Ozi, nke “Luk, bụ́ dibia nke a hụrụ n’anya” nọrọ na Rom dee n’ihe dị ka afọ 61 O.A. (Ndị Kọlọsi 4:14) Dị ka ndị ozi ahụ, ndị Jehova n’oge a na-erubere Onye Na-achị ha nke bi n’eluigwe isi mgbe ụmụ mmadụ kwuru ka ha mee ihe megidere nzube ya. Ma gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịmụta site n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi? (Mgbe ị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, anyị na-atụ aro ka ị gụọ akụkụ akwụkwọ ahụ ndị e depụtara ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo.)
Jisọs Ezipụ Ndịàmà
3. Mgbe ‘e mere ha baptism ná mmụọ nsọ,’ gịnị bụ nchegbu bụ isi nke ndị na-eso ụzọ Jisọs?
3 Ndị ozi ahụ pụrụ ịdịnyesiri Chineke ike n’ihi na a gbawo ha ume n’ụzọ ime mmụọ. Kraịst nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ, ma ha maara na a kpọlitewo ya site n’ọnwụ. (1:1-5) Jisọs ‘gosipụtara onwe ya ná ndụ,’ kuziekwa eziokwu Alaeze n’anụ ahụ ndị e nwoghatara enwoghata n’ime iri ụbọchị anọ dum. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha chere na Jerusalem ka e wee ‘jiri mmụọ nsọ’ mee ha baptism. Mgbe ahụ, ikwusa ozi ọma ga-abụ ọrụ kasị dị ha mkpa, dịkwa ka ọ dị Ndịàmà Jehova taa. —Luk 24:27, 49; Jọn 20:19-21:24.
4. Gịnị gaje ime mgbe mmụọ nsọ ahụ bịakwasịrị ndị na-eso ụzọ Jisọs?
4 Mgbe a na-ejibeghị mmụọ nsọ mee ha baptism, ndị ozi ahụ nwere echiche na-ezighị ezi nke bụ na a ga-eji ọchịchị elu ala weta ọchịchị ndị Rom ná njebede mgbe ha jụrụ, sị: “Onye nwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka ị na-enyeghachi Israel alaeze?” (1:6-8) Ná nchịkọta, Jisọs sịrị ee e, n’ihi na ‘ọ bụghị ihe dịịrị ha ịma oge ma ọ bụ ụbọchị’ ọ ga-abụ. ‘Mgbe mmụọ nsọ bịakwasịrị ha,’ ọ ga-enye ha ike ịgba àmà banyere Alaeze eluigwe Chineke, ọ bụghị nke dị n’elu ala ebe a. Ha ga-ekwusa ozi ọma na Jerusalem, Judia, na Sameria, “ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” Site n’enyemaka nke mmụọ ahụ, Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ dị otú ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ n’ime mgbe ikpeazụ ndị a.
5. Jisọs ga-esi aṅaa bịa n’otu ụzọ ahụ o si laa?
5 Jisọs ka nyesịrị iwu nkwusa ozi ọma zuru ụwa ọnụ nke a mgbe ọ malitere ịrịgo n’eluigwe. Nrịgo ahụ malitere site n’ịbụ onye e bugoro nke nta nke nta pụọ n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, o jekwuuru Onye ahụ Na-achị ya nke bi n’eluigwe, wee malitekwa ịrụ ọrụ n’ógbè ebe ndị bụ mmụọ. (1:9-11) Mgbe igwe ojii mere ka ndị ozi ya ghara ịhụkwa Jisọs anya, o nwoghara wee hapụ anụ ahụ mmadụ nke o nweburu. Ndị mmụọ ozi abụọ pụtara wee kwuo na ọ ‘ga-abịakwa n’otu ụzọ ahụ.’ Otú ahụkwa ka ọ dịworo. Ọ bụ nanị ndị na-eso ụzọ Jisọs hụrụ ka ọ na-apụ, dịkwa ka ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova na-amata nlọghachi ya nke a na-adịghị ahụ anya.
Jehova Emee Nhọrọ
6. È si aṅaa họpụta onye ga-anọchi anya Judas Iskariọt?
6 N’oge na-adịghị anya ndị ozi ahụ laghachiri na Jerusalem. (1:12-26) N’ime otu ụlọ dị n’elu ụlọ (ma eleghị anya n’ụlọ nne Mak, bụ́ Meri), ndị ozi iri na otu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nọgidere na-ekpe ekpere, ha na ndị ahụ otu nne ji ha na Jisọs, ndị ozi ya ndị ọzọ, na nne ya, bụ́ Meri. (Mak 6:3; Jemes 1:1) Ma ọ̀ bụ onye ka a ga-enye “ọrụ nlekọta” nke Judas? (Abụ Ọma 109:8) Ihe dị ka 120 ndị na-eso ụzọ nọ ya mgbe Chineke họpụtara otu nwoke iji dochie anya onye ahụ raara Jisọs nye, bụ́ Judas, wee na-eweghachi ọnụ ọgụgụ ndị ozi ahụ ịbụ iri na abụọ. Onye a họpụtara aghaghị ịbụ onye na-eso ụzọ Jisọs n’oge mgbe Jisọs jere ozi, onye hụkwara mbilite n’ọnwụ ya. N’ezie, onye ahụ aghaghịkwa ịnakwere Jehova dị ka Onye Na-achị ya. Mgbe e kpesịrị ekpere, e fere nzà n’etiti Mataịas na Josef Basabas. Chineke mere ka nzà ahụ maa Mataịas.—Ilu 16:33.
7. (a) Olee otú o si bụrụ na Judas “sitere n’ụgwọ ọrụ nke ajọ omume ya nata otu iberibe ala”? (b) Olee ụzọ Judas si nwụọ?
7 O doro anya na Judas Iskariọt anakwereghị Jehova dị ka Onye Na-achị ya. Ee, ọ rarawo Ọkpara Chineke nye n’ihi iri ego ọlaọcha atọ! Judas weghachiiri ndị isi nchụaja ego ahụ, ma Pita sịrị na onye nrafu ahụ “sitere n’ụgwọ ọrụ nke ajọ omume ya nata otu iberibe ala.” Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ee, ọ bụ ya wetara ego, meekwa ihe kpatara e ji zụta “Iberibe Ala Ọbara,” dị ka a kpọrọ ya. E mewo ka a mara na ọ dị n’otu ala dị larịị n’ebe ndịda nke Ndagwurugwu Hinọm. Ebe e mebiworo mmekọrịta dị n’etiti ya na Onye ahụ Na-achị achị nke bi n’eluigwe kpam kpam, Judas ‘jere kwụgbuo onwe ya.’ (Matiu 27:3-10) Ma eleghị anya, ụdọ ahụ dọbiri ma ọ bụ na ngalaba osisi ahụ gbajiri, nke mere na ọ ‘dara sụọ isi n’ala, tipuo afọ ya’ mgbe ọ dakwasịrị nkume ndị kapụsịrị ọnụ. Ka onye ọ bụla n’ime anyị ghara ịbụ nwanna ụgha!
Ndị Jupụtara ná Mmụọ Nsọ!
8. Olee mgbe e jiri mmụọ nsọ mee ndị na-eso ụzọ Jisọs baptism, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke a nwere?
8 Gịnị banyere baptism ahụ e kwere nkwa na a ga-eme ha n’ime mmụọ nsọ? E mere ya na Pentikọst nke afọ 33 O.A., ụbọchị iri mgbe Jisọs lagosịrị n’eluigwe. (2:1-4) Lee nnọọ oké ihe omume na-akpali akapli baptism ahụ bụ! Jiri anya nke uche gị hụrụ ihe merenụ. Ihe dị ka 120 ndị na-eso ụzọ nọ n’ime ụlọ ahụ dị n’elu mgbe, “na mberede ụzụ, dị ka nke oké ifufe nke na-efesi ike, [sitere] n’eluigwe, o wee jupụta ụlọ ahụ dum.” Ọ bụghị ifufe nkịtị, kama ụda ya yiri nke ifufe. Ire, “dị ka nke ọkụ,” dịkwasịrị nke ọ bụIa n’ime ndị na-eso ụzọ na ndị ozi ahụ. “Ha nile wee jupụta ná mmụọ nsọ, ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche [iche].” Mgbe e mesịrị baptism ahụ, ha ghọrọ ndị a mụtara site ná mmụọ nsọ, ndị e tere mmanụ, ndị a kakwara akara dị ka ihe àmà nke ihe nketa ime mmụọ.—Jọn 3:3, 5; 2 Ndị Kọrint 1:21, 22; 1 Jọn 2:20.
9. Gịnị ka ndị ahụ na-eso ụzọ, bụ ndị jupụtara ná mmụọ nsọ kwuru okwu banyere ya?
9 Ihe omume nke a metụtara ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu bi na Jerusalem, bụ́ “ndị si ná mba nile dị n’okpuru eluigwe bịa.” (2:5-13) N’ịbụ ndị nwere ihe ijuanya, ha jụrụ, sị: “Anyị onwe anyị sikwa aṅaa nụ n’otu n’otu n’asụsụ nke aka anyị, nke a mụrụ anyị n’ime ya?” Ọ pụrụ ịbụ asụsụ nke ebe ndị dị ka Midia, (n’ọwụwa anyanwụ Judia), Frijia (n’Asia Minor), na Rom (n’ime Europe). Ka ndị ahụ na-eso ụzọ na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche “banyere oké ọrụ nile nke Chineke,” ibubo nwụrụ ọtụtụ ndị na-ege ntị n’ahụ, ma ndị na-akwa emo tụrụ aro na ọ ga-abụ na mmanya na-egbu ha.
Pita Agbaa Àmà Na-akpali Akpali
10. Olee amụma ihe ahụ mere na Pentikọst nke 33 O.A. mezuru, ọ̀ dịkwa ihe kwekọrọ na nke ahụ n’oge anyị a?
10 Pita malitere ịgba àmà site n’igosi na elekere itoolu nke ụtụtụ bụbigara isi ụtụtụ ókè nke na oge erubeghị mgbe mmanya ji egbu ndị mmadụ. (2:14-21) Kama nke ahụ, ihe omume nke a bụ mmezu nke nkwa Chineke ịwụpụ mmụọ nsọ n’isi ndị ya. Chineke kpaliri Pita izo aka n’oge anyị a site n’ijikwa okwu ndị ahụ bụ “na mgbe ikpeazụ” na “ha ga-ebukwa amụma” mee ihe. (Joel 2:28-32) Jehova ga-arụ ọrụ ebube dị iche iche n’eluigwe, nyekwa ihe àmà dị iche iche n’elu ala tupu oké ụbọchị ya abịa, ọ bụkwa nanị ndị ahụ na-eji okwukwe akpọku aha ya ka a ga-azọpụta. Mwụpụ dịkwa otú ahụ nke mmụọ nsọ n’isi ndị e tere mmanụ n’oge a emewo ka ha nwee ike iji ike na nkà dị ukwu ‘buo amụma’ n’oge anyị a.
11. N’ihe banyere Jisọs, gịnị ka ndị Juu mere, gịnịkwa ka Chineke mere?
11 Ihe ọzọ Pita mere bụ ime ka a mara onye Mesaịa ahụ bụ. (2:22-28) Chineke gbara akaebe banyere ọbụbụ Mesaịa nke Jisọs site n’ime ka o nwee ike ịrụ ọrụ dị iche iche ndị dị ike, igosi ihe ịrịba ama dị iche iche nakwa ịrụ ọrụ ebube dị iche iche. (Ndị Hibru 2:3, 4) Ma ndị Juu sitere “n’aka ndị na-amaghị iwu” kpọgide ya n’elu osisi, ebe ọ bụ na ndị Rom adịghị erubere iwu Chineke isi. Jisọs bụ onye “e weere ya nye site n’izu a kara aka nke Chineke na ọmụma ihe Chineke buru ụzọ mara” n’echiche nke bụ na nke a bụ nzube Chineke. Otú ọ dị, Chineke kpọlitere Jisọs n’ọnwụ, wee wepụ anụ ahụ mmadụ ya n’ụzọ nke mere ka ọ ghara ịhụ ire ure.—Abụ Ọma 16:6-11.
12. Gịnị ka Devid buru ụzọ hụ, ọ̀ bụkwa na gịnị ka nzọpụta dabeere?
12 E mesikwuru amụma metụtara Mesaịa ike ka àmà ahụ Pita na-agba gara n’ihu. (2:29-36) O kwuru na Devid buru ụzọ hụta mbilite n’ọnwụ nke nwa ya kasị ukwuu, Jisọs, bụ́ Mesaịa ahụ. Site n’ebe e buliri elu n’aka nri nke Chineke n’eluigwe, Jisọs awụpụwo mmụọ nsọ ahụ nke ọ natara site n’aka Nna ya. (Abụ Ọma 110:1) Ndị na-ege Pita ntị ‘hụrụ ma nụkwa’ ihe banyere ịrụ ọrụ ya mgbe ha hụrụ ire yiri nke ọkụ ka ọ na-adịkwasị n’isi ndị ahụ na-eso ụzọ, nụkwa asụsụ dị iche iche nke ndị mba ọzọ ha na-asụ. O gosikwara na nzọpụta dabeere n’ịnakwere Jisọs dị ka Onyenwe anyị na Mesaịa. —Ndị Rom 10:9; Ndị Filipaị 2:9-11.
Jehova Eweta Ịba Ụba
13. (a) Iji wee bụrụ ndị e mere baptism n’ụzọ ziri ezi, gịnị ka ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu na-aghaghị ime? (b) Mmadụ ole ka e mere baptism, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke a nwere na Jerusalem?
13 Lee nnọọ ka okwu Pita si bụrụ ihe dị irè! (2:37-42) Ọ dụpuru ndị na-ege ya ntị n’ime obi ha n’ihi ikwere ka e gbuo Mesaịa ahụ. Ya mere, ọ gbara ha ume, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa unu nile baptism n’otu n’otu n’aha Jisọs Kraịst ka e wee gbaghara mmehie nile unu; unu ga-anatakwa onyinye a, bụ́ mmụọ nsọ.” Ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu adịlarị mbụ nakwere Jehova dị ka Chineke, matakwa mkpa ọ dị ha inweta mmụọ ya. Ugbu a, ọ dị mkpa ka ha chegharịa ma nakwere Jisọs dị ka Mesaịa ahụ ka e wee mee ha baptism n’aha (ya bụ ịmata ọkwá ma ọ bụ ọrụ) nke Nna ahụ, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ. (Matiu 28:19, 20) Site n’ịgbara ndị Juu na ndị ahụ na-eso ụzọ ndị Juu àmà, Pita jiri mkpịsị ugodi ime mmụọ nke mbụ ahụ Jisọs nyere ya mee ihe imeghere ndị Juu kwere ekwe ụzọ nke ihe ọmụma na ohere ịbanye n’Alaeze eluigwe ahụ. (Matiu 16:19) N’ụbọchị ahụ, e mere 3,000 mmadụ baptism! Cheedị echiche ihe ọ ga-adị ka ya ọtụtụ ndịàmà Jehova dị otú ahụ ịnọ na-ekwusa ozi ọma n’ókèala ahụ dị nta nke Jerusalem!
14. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ndị kwere ekwe si ‘nwekọọ ihe nile’?
14 Ọtụtụ ndị si n’ebe dị anya bịa enweghị ihe ndị ha ga-eji lekọta onwe ha iji wee nọọ ogologo oge ma ha nwere ọchịchọ ịmụtakwu ihe banyere okwukwe ọhụrụ ha na ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. Ya mere, ndị mbụ na-eso ụzọ Jisọs jiri ịhụnanya nyerịtara ibe ha aka, ọbụna dị ka Ndịàmà Jehova na-emekwa taa. (2:43-47) Ruo nwa mgbe, ndị kwere ekwe “nwekọkwara ihe nile.” Ụfọdụ ndị rere ihe onwunwe ha, e kesakwaara ndị nọ ná mkpa ego ahụ. Nke a mere ka ọgbakọ ahụ nwee mmalite dị mma ka ‘Jehova na-atụkwasịrị ha kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.’
Otu Ọgwụgwọ na Ihe Ndị Ọ Rụpụtara
15. Gịnị mere mgbe Pita na Jọn banyere n’ụlọ ukwu ahụ, gịnị bụkwa mmeghachi omume nke ndị mmadụ?
15 Jehova kwadoro ndị na-eso ụzọ Jisọs site ‘n’ihe ịrịba ama dị iche iche.’ (3:1-10) Otú a, ka Pita na Jọn na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ n’elekere atọ nke ehihie maka oge awa nke ekpere, nke e jikọtara ya na àjà ahụ a na-achụ n’uhuruchi, otu nwoke nke bụ onye ngwụrọ site n’afọ nne ya nọ nso Ọnụ Ụzọ Ọmà ahụ na-arịọ “onyinye ebere.” Pita sịrị, “Ọ dịghị ọlaọcha na ọlaedo m nwere; ma ihe m nwere, nke ahụ ka m na-enye gị. N’aha Jisọs Kraịst onye Nazaret, jee ije.” A gwọrọ nwoke ahụ ozugbo ahụ! Mgbe ọ banyere n’ụlọ nsọ ahụ, “na-eje ije, na-awụlikwa, na-etokwa Chineke,” ‘ibubo nwụbigara ndị ahụ ókè n’ahụ.’ Ma eleghị anya ụfọdụ ndị chetara okwu ahụ bụ: “Onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele.” —Aịsaịa 35:6.
16. Olee ụzọ ndị ozi ahụ si nwee ike ịgwọ otu nwoke dara ngwụrọ?
16 Ndị ahụ nwere ihe ijuanya gbakọtara n’ị̀bà Solomọn, bụ́ ụlọ sara mbara nke e kpuchiri elu ya ekpuchi nke dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọ ukwu ahụ. N’ebe ahụ, Pita gbara àmà. (3:11-18) Ọ gosiri na Chineke nyere ndị ozi ya ike ịgwọ onye ngwụrọ ahụ site n’aka Ohu Ya e meworo ka ọ dị ebube bụ Jisọs. (Aịsaịa 52:3-53:12) Ndị Juu jụrụ “onye nsọ na onye ezi omume ahụ”; ma Jehova kpọlitere ya site n’ọnwụ. Ọ bụ ezie na ndị ahụ na ndị na-achị ha amaghị na ọ bụ Mesaịa ahụ ka ha na-egbu, Chineke si otú a mezuo okwu amụma ahụ nke bụ na “Kraịst ya ga-ahụ ahụhụ.”—Daniel 9:26.
17. (a) Gịnị ka ọ dị mkpa ka ndị Juu ahụ mee? (b) Gịnị meworo eri mgbe ‘e zipụrụ Kraịst’ n’oge anyị a?
17 N’ihi mmeso ha mesoro Mesaịa ahụ, Pita gosipụtara ihe ndị Juu kwesịrị ime. (3:19-26) Ọ dị mkpa ka ha ‘chegharịa,’ ma ọ bụ nwee mwute maka mmehie ha nile, ‘chigharịakwa,’ ma ọ bụ bụrụ ndị a tọghatara, na-agbaso ụzọ megidere nke ha na-agbaso na mbụ. Ọ bụrụ na ha egosipụta okwukwe n’ebe Jisọs nọ dị ka Mesaịa ahụ, na-anakwere àjà mgbapụta ahụ, ha ga-enweta ume ndụ site n’ebe Jehova nọ dị ka ndị a gbagharaworo mmehie ha. (Ndị Rom 5:6-11) E chetaara ndị Juu na ha bụ ụmụ nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke sooro ndị nna ha ochie mee, na-agwa Abraham, sị: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka a ga-agọzi agbụrụ nile nke ụwa.” Ya mere, Chineke buru ụzọ zipụ Mesaịa onye na-ejere ya ozi ịnapụta ndị Juu nwere nchegharị. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na eri mgbe e ‘zipụrụ Kraịst’ n’ike Alaeze n’eluigwe n’afọ 1914, e nwewo mweghachi na-enye ume ọhụrụ nke eziokwu na usoro nhazi ọchịchị Chineke n’etiti Ndịàmà Jehova.—Jenesis 12:3; 18:18; 22:8.
Ha Agaghị Akwụsị!
18. “Nkume” dị aṅaa ka “ndị na-ewu ụlọ” bụ ndị Juu jụrụ ajụ, ọ̀ bụkwa nanị n’ime onye ka e nwere nzọpụta?
18 N’ịbụ ndị a kpasuru iwe n’ihi na Pita na Jọn kwusara mbilite n’ọnwụ nke Jisọs, ndị isi nchụaja, ọchịagha nke ụlọ ukwu ahụ, na ndị Sadusii tụbara ha n’ụlọ mkpọrọ (4:1-12) Ndị Sadusii ekweghị ná mbilite n’ọnwụ ahụ, ma ọtụtụ ndị ọzọ ghọrọ ndị kwere ekwe, ọnụ ọgụgụ nke nanị ndị ikom dị 5,000. Mgbe a jụrụ ha ajụjụ n’ihu ụlọikpe ukwu dị na Jerusalem, Pita kwuru na a gwọrọ onye ngwụrọ ahụ “n’aha Jisọs Kraịst onye Nazaret,” bụ́ onye ha kpọgburu n’osisi ma bụrụ onye Chineke kpọlitere n’ọnwụ. “Nkume” nke a nke “ndị na-ewu ụlọ” bụ ndị Juu jụrụ ajụ, aghọwo “isi nkuku ụlọ.” (Abụ Ọma 118:22) Pita kwukwara, sị: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ.”
19. Mgbe e nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, gịnị ka ndị ozi ahụ zaghachiri?
19 E mere mgbalị ịkwụsị okwu dị otú ahụ. (4:13-22) Ebe nwoke ahụ nke e mererịị ka ahụ dị ya ike nọ n’ebe ahụ, ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ịgọpụ ‘ihe ịrịba ama nke a a maara nke ọma’ ma e nyere Pita na Jọn iwu “ka ha ghara ikwu okwu ma ọlị ma ọ bụ izi ihe n’aha Jisọs.” Gịnị bụ nzaghachi ha? “Anyị apụghị ịghara ikwu ihe nile anyị hụrụ nụkwa.” Ha rubeere Jehova isi dị ka Onye Na-achị ha!
A Zara Ekpere Ha!
20. Gịnị ka ndị ahụ na-eso ụzọ kpere n’ekpere, gịnị sikwa na nke a pụta?
20 Dị ka Ndịàmà Jehova na-ekpe ekpere ná nzukọ ha di iche iche, otú ahụ ka ndị ahụ na-eso ụzọ kpere ekpere mgbe ndị ozi ahụ a tọhapụworo kọọrọ ha ihe meworo ha. (4:23-31) E hotara ya na ndị ọchịchị bụ Herọd Antipas na Pọntịọs Paịlat, ha na ndị Rom bụ́ ndị Jentaịl na ndị Israel, ejikọtawo onwe ha n’otu imegide Mesaịa ahụ. (Abụ Ọma 2:1, 2; Luk 23:1-12) N’azịza nye ekpere ahụ, Jehova mere ka ndị ahụ na-eso ụzọ wee jupụta ná mmụọ nsọ, nke na ha ji nkwuwa okwu kwuo okwu Chineke. Ha arịọghị Onye ahụ na-achị ha ka o mee ka mkpagbu ahụ kwụsị, kama ka o nyere ha aka iji nkwuwa okwu na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ya.
21. Ònye bụ Banabas, oleekwa àgwà ndị o nwere?
21 Ndị kwere ekwe nọgidere na-enwekọ ihe nile ọnụ, ọ dịghịkwa onye ọ bụla nọ ná mkpa. (4:32-37) Otu n’ime ndị tụnyere ihe bụ onye Livaị ahụ aha ya bụ Josef onye Saịprọs. Ndị ozi ahụ kpọrọ ya aha ahụ bụ Banabas, nke pụtara “Nwa nke Nkasi Obi,” ma eleghị anya n’ihi na ọ bụ onye na-enyere mmadụ aka, onye nwekwara obi ọma. O doro anya na ọ ga-amasị anyị nile ịbụ ụdị onye ahụ.—Ọrụ 11:22-24.
E Kpughere Ndị Na-ekwu Okwu Ụgha
22, 23. Gịnị bụ mmehie nke Ananaịas na Safaịra, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe mere ha?
22 Otú ọ dị, Ananaịas na nwunye ya, bụ́ Safaịra, kwụsịrị ịnakwere Jehova dị ka Onye Na-achị ha. (5:1-11) Ha rere otu ibe ala ma debere onwe ha ụfọdụ n’ime ego ahụ ma mee ka à ga-asị na ha nyechara ndị ozi ahụ ihe nile ha retara. Ihe ọmụma nke mmụọ Chineke nyere mere ka Pita nwee ike ịchọpụta omume ihu abụọ ha, bụ́ nke dujere n’ọnwụ ha. Lee nnọọ ịdọ aka ná ntị nke a bụ nye ndị ahụ Setan na-anwa ịbanye n’omume aghụghọ!—Ilu 3:32; 6: 16-19.
23 Mgbe ihe a mesịrị, ọ dịghịkwa onye nwere nzube ọjọọ nke nwere obi ike isonyere ndị ahụ na-eso ụzọ. Ndị ọzọ ghọrọ ndị kwere ekwe. (5:12-16) Ọzọkwa, ka ndị na-arịa ọrịa na ndị mmụọ dị iche iche na-adịghị ọcha na-enye nsogbu tinyere okwukwe ha n’ebe ike Chineke dị, ‘e mere ka ahụ ha nile n’otu n’otu dị ike.’
Kwenyere Chineke Karị Mmadụ
24, 25. N’ihi gịnị ka ndị isi ndị Juu ji kpagbuo ndị ozi ahụ, ma ihe nlereanya dị aṅaa ka ndị a kwesịrị ntụkwasị obi setịpụụrụ ndị ohu Jehova nile?
24 Ugbu a, onyeisi nchụaja na ndị Sadusii gbalịrị igbochi ito uto ahụ dị ebube site n’ịtụba ndị ozi ahụ nile n’ụlọ mkpọrọ. (5:17-25) Ma n’anyasị ahụ, mmụọ ozi Chineke tọhapụrụ ha. N’isi ụtụtụ, ha nọkwa na-ezi ihe n’ụlọ ukwu ahụ! Mkpagbu apụghị ịkwụsị ndị ohu Jehova.
25 Ma, e wetaara ha nrụgide mgbe a kpọọrọ ndị ozi ahụ jee n’ihu Sanhedrin. (5:26-42) Otú ọ dị, mgbe e nyere ha iwu ka ha kwụsị izi ihe, ha sịrị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke [dị ka onye na-achị achị, NW] karị mmadụ.” Nke a setịpụrụ ihe nlereanya nye ndị na-eso ụzọ Jisọs, bụ́ nke Ndịàmà Jehova na-agbasokwa taa. Mgbe onye ozizi Iwu ahụ bụ Gamaliel dọsịrị ha aka ná ntị, ndị ndú ahụ tiri ndị ozi ahụ ihe, wee nye ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, wee tọhapụ ha.
26. N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi jiri ije ozi nke ndị ozi ahụ tụnyere nke ndị Ndịàmà Jehova na-eje taa?
26 Ndị ozi ahụ nwere ọṅụ n’ihi na a gụwo ha ná ndị kwesịrị ka e mee ha ihe ihere n’ihi aha Jisọs. “Ma kwa ụbọchị, n’ụlọ ukwu Chineke na n’ụlọ nke aka ha, ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma.” Ee, ha bụ ndị ozi na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otú ahụkwa ka Ndịàmà Chineke nke oge a na-eme, bụ́ ndị natawokwara mmụọ ya n’ihi na ha na-erubere ya isi, na-asịkwa, “Jehova bụ Onye Na-achị anyị!”
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ Ọrụ dị aṅaa e nyere ha ka ndị na-eso ụzọ Jisọs na-aghaghị ịrụzu ma n’oge gara aga ma n’oge ugbu a?
◻ Gịnị mere n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.A.?
◻ Òle mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Pita si jiri nke mbụ n’ime mkpịsị ugodi ime mmụọ ndị ahụ Jisọs nyere ya mee ihe?
◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe mere Ananaịas na Safaịra?
◻ Mgbe e nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ihe nlereanya dị aṅaa ka ndị ozi ahụ setịpụụrụ Ndịàmà Jehova nile?