Gịnị Dị Mkpa Iji Nwee Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma?
Ị̀ ga-ahọrọ ịmabanye n’osimiri n’ebughị ụzọ mụta otú e si egwu mmiri? Omume nzuzu dị otú ahụ pụrụ imerụ ahụ—ọbụna ọ pụrụ ịkpata ọnwụ. Otú ọ dị, chee echiche banyere otú ọtụtụ mmadụ si abanye n’alụmdi na nwunye na-enwe ihe ọmụma dị nta banyere otú a pụrụ isi buru ibu ọrụ ndị dị na ya.
JISỌS sịrị: “Ònye n’ime unu, nke na-achọ iwu ụlọ elu, n’ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe, ma ò nwere ego ọ ga-eji rụzuo ya?” (Luk 14:28) Otú ọ dị n’ihe banyere iwu ụlọ bụkwa otú ọ dị n’iwulite alụmdi na nwunye. Ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị iji nlezianya gụkọọ ihe alụmdi na nwunye ga-efu iji jide n’aka na ha pụrụ imezu ihe ndị ọ chọrọ.
Ileba Anya n’Alụmdi na Nwunye
Inwe di ma ọ bụ nwunye bụ́ onye a ga-eso kerịta ọṅụ na iru újú nile nke ndụ bụ ngọzi n’ezie. Alụmdi na nwunye pụrụ imejupụta oghere nke owu ọmụma na obi nkoropụ kpatara. Ọ pụrụ imejụ ọchịchọ dị anyị n’ọbara maka ịhụnanya, inwe ndị enyi, na mkpachi anya. N’inwe ezi ihe kpatara ya, Chineke kwuru mgbe o kesịrị Adam, sị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya; M ga-emere ya onye inyeaka kwesịrị ya.”—Jenesis 2:18; 24:67; 1 Ndị Kọrint 7:9.
Ee, ịlụ di ma ọ bụ nwunye pụrụ idozi nsogbu ụfọdụ. Ma ọ ga-ewetakwa ndị ọhụrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na alụmdi na nwunye bụ njikọta nke ụdị mmadụ abụọ dị iche bụ́ ndị kwekọrọ ma eleghị anya ma ha eyighị ma ọlị. N’ihi ya, ọbụna di na nwunye kwekọrọ nke ọma ga-enwe esemokwu mgbe ụfọdụ. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere na ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ga-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ ha”—ma ọ bụ dị ka The New English Bible si kwuo ya, “ihe mgbu na iru újú ná ndụ anụ ahụ a.”—1 Ndị Kọrint 7:28.
Pọl ọ̀ nọ na-egosipụta enweghị nchekwube? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe ọ na-eme bụ nanị ịgba ndị na-atụle ịlụ di ma ọ bụ nwunye ume ka ha bụrụ ndị na-ele ihe anya otú ha dị n’ezie. Oké obi ụtọ nke ịbụ onye dọọrọ mmasị mmadụ abụghị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi nke ihe alụmdi na nwunye ga-adị ka ya n’ọnwa na afọ ndị ga-esochi ụbọchị agbamakwụkwọ ahụ. Alụmdi na nwunye ọ bụla nwere ihe ịma aka na nsogbu ndị pụrụ iche. Ajụjụ abụghị ma hà ga-ebilite kama otú a ga-esi chee ha ihu mgbe ha bilitere.
Nsogbu na-enye di na nwunye ohere igosipụta ịbụ eziokwu nke ịhụnanya ha n’ebe ibe ha nọ. Iji maa atụ: Ụgbọ pụrụ ịdị nnọọ ebube mgbe ọ nọ otu ebe, n’osisi e kedoro ya. Otú ọ dị, ọ bụ n’osimiri ka a na-anwapụta otú o siruru ike ịgba ná mmiri—ikekwe ọbụna n’ime ebili mmiri nke oké ifufe. N’otu aka ahụ, a naghị ekpebi otú nkekọ alụmdi na nwunye siruru ike nanị n’oge ihe dị mma ná mmekọrịta ịhụnanya. Mgbe ụfọdụ, a na-anwapụta ya n’okpuru ọnọdụ ndị siri ike mgbe di na nwunye na-anagide oké nsogbu.
Iji mee otú ahụ, nraranye dị di na nwunye mkpa, n’ihi na Chineke zubere na nwoke ‘ga-arapara n’ahụ nwunye ya,’ nakwa na mmadụ abụọ ahụ ‘ga-aghọ otu anụ ahụ.’ (Jenesis 2:24) Echiche nke nraranye na-atụ ọtụtụ mmadụ egwu taa. Ma, ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya na mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n’anya n’ezie ga-achọ ikwe nkwa siri ike ibikọ ọnụ. Nraranye na-enye alụmdi na nwunye ahụ ùgwù. Ọ na-enye ihe ndabere maka obi ike na, ihe ọ sọrọ ya mee, di na nwunye ga-akwado ibe ha.a Ọ bụrụ na ị dịghị njikere maka nraranye dị otú ahụ, ị dịghị njikere n’ezie maka alụmdi na nwunye. (Tụlee Eklisiastis 5:4, 5.) Ọ pụrụ ịdị ọbụna ndị lụworo alụ mkpa ịghọtakwu otú nraranye dịruru ná mkpa n’alụmdi na nwunye na-adịte anya.
Ileru Onwe Gị Anya
Obi abụọ adịghị ya na ị pụrụ idepụta àgwà ndị ị ga-achọ n’aka onye ị ga-alụ. Otú ọ dị, o siri nnọọ ike karị ileru onwe gị anya iji chọpụta otú ị pụrụ isi tụnye ụtụ n’alụmdi na nwunye. Nnyocha onwe onye dị mkpa, ma tupu ma mgbe e kwesịrị nkwa ọlụlụ. Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị ajụjụ ndị na-esonụ.
• Adị m njikere ime nraranye ga-adịru ogologo ndụ m nile nye onye òtù ọlụlụ m?—Matiu 19:6.
N’ụbọchị onye amụma Bible bụ́ Malakaị, ọtụtụ ndị bụ́ di gbahapụrụ nwunye ha, ikekwe iji lụrụ ụmụ agbọghọ. Jehova sịrị na e ji anya mmiri nke ndị nwunye ahụ di ha gbahapụrụ kpuchie ebe ịchụàjà ya, ọ katọkwara ndị ikom si otú ahụ ‘ghọgbuo’ nwunye ha.—Malakaị 2:13-16.
• Ọ bụrụ na m na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye, àgafewo m oge ntorobịa bụ́ mgbe mmetụta mmekọahụ na-adị nnọọ ike, nweekwa ike imegharị mmadụ uche?—1 Ndị Kọrint 7:36.
“Ọ dị nnọọ ize ndụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye mgbe mmadụ ka bụ nnọọ nwata,” ka Nikki, bụ́ onye dị afọ 22 mgbe ọ lụrụ di, na-ekwu. Ọ na-adọ aka ná ntị, sị: “Mmetụta, ihe mgbaru ọsọ, na ihe ndị na-amasị gị ga-anọgide na-agbanwe site n’oge ị nọ ná ngwụsị afọ iri na ụma gị ruo mgbe ị nọ n’etiti ngwụsị afọ ndị 20 gị.” N’ezie, apụghị iji nanị afọ ndụ kpebie ịdị njikere maka alụmdi na nwunye. Ka o sina dị, ịlụ di ma ọ bụ nwunye mgbe mmadụ na-agafebeghị oge ntorobịa bụ́ mgbe mmetụta mmekọahụ na-adị ọhụrụ ma na-adị ike karịsịa pụrụ imeghasị echiche mmadụ ma mee ka mmadụ ghara ịhụ nsogbu ndị pụrụ ibilite.
• Àgwà ndị dị aṅaa ka m nwere bụ́ ndị ga-enyere m aka ịtụnye ụtụ n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma?—Ndị Galetia 5:22, 23.
Pọl onyeozi degaara ndị Kọlọsi akwụkwọ, sị: “Yikwasịnụ obi ebere, obiọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Ndụmọdụ a dabara adaba nye ndị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye nakwa nye ndị lụworo alụ.
• Ènwere m ntozu okè dị mkpa iji kwadoo onye òtù ọlụlụ m n’oge ndị siri ike?—Ndị Galetia 6:2.
“Mgbe nsogbu bilitere,” ka otu dọkịta na-ekwu, “ihe a na-eme bụ ịta onye òtù ọlụlụ ụta. Onye a ga-ata ụta abụghị ihe kasị mkpa. Kama nke ahụ, ọ bụ otú ma di ma nwunye pụrụ isi jikọta aka mee ka mmekọrịta alụmdi na nwunye ha ka mma.” Okwu Eze Solomọn maara ihe na-emetụta ndị di na nwunye. “Abụọ dị mma karịa otu,” ka o dere, “n’ihi na ọ bụrụ na [otu] adaa, otu n’ime ha ga-eme ka ibe ya bilie: ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke nanị ya dị mgbe ọ na-ada, ọ dịghịkwa onye abụọ o nwere ime ka o bilie.”—Eklisiastis 4:9, 10.
• Àna m enwekarị ihu ọchị na nchekwube, ka àna m enwekarị ihu mgbarụ na àgwà na-ezighị ezi?—Ilu 15:15.
Onye nwere àgwà na-ezighị ezi na-elekarị ụbọchị ọ bụla anya dị ka ụbọchị ọjọọ. Alụmdi na nwunye adịghị agbanwe àgwà a n’ụzọ ọrụ ebube! Onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, bụ́ onye na-emekarị nkatọ ma ọ bụ na-enweghị nchekwube, ga-aghọ nnọọ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye nke na-emekarị nkatọ ma ọ bụ nke na-enweghịkwa nchekwube. Echiche na-ezighị ezi dị otú ahụ pụrụ iweta ihe isi ike dị egwu n’alụmdi na nwunye.—Tụlee Ilu 21:9.
• M̀ na-anọ jụụ mgbe m nọ ná nrụgide, ka m̀ na-ewe oké iwe?—Ndị Galetia 5:19, 20.
E nyere ndị Kraịst iwu ịbụ ndị ‘na-adịghị ngwa n’iwe iwe.’ (Jemes 1:19) Tupu alụmdi na nwunye na n’ime alụmdi na nwunye, nwoke ma ọ bụ nwanyị kwesịrị ịzụlite ikike nke ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ndụmọdụ a: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.”—Ndị Efesọs 4:26.
Ileru Onye Ị Na-aga Ịlụ Anya
“Onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya,” ka otu ilu Bible na-ekwu. (Ilu 14:15) Nke a bụ nnọọ eziokwu mgbe ị na-ahọrọ onye ị ga-alụ. Ịhọrọ onye a ga-alụ bụ otu n’ime mkpebi ndị kasị mkpa nwoke ma ọ bụ nwanyị ga-eme. Ma, a chọpụtawo na ọtụtụ ndị na-etinye oge ka ukwuu n’ikpebi ụgbọala nke ha ga-azụ ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ nke ha ga-eje karịa onye ha ga-alụ.
N’ime ọgbakọ ndị Kraịst, a ‘na-ebu ụzọ nwalee’ ndị a na-enyefe ibu ọrụ. (1 Timoti 3:10) Ọ bụrụ na ị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye, i kwesịrị ijide n’aka ‘iru eru’ nke onye nke ọzọ. Dị ka ihe atụ, tụlee ajụjụ ndị na-esonụ. Ọ bụ ezie na e dere ha ka ọ̀ bụ nwanyị na-ajụ ha, ọtụtụ n’ime ụkpụrụ ndị a metụtakwara nwoke. Ọbụna ndị lụworo alụ pụkwara ịtụle isi ihe ndị a n’ụzọ ga-abara ha uru.
• Aha dị aṅaa ka o nwere?—Ndị Filipaị 2:19-22.
Ilu 31:23 na-akọwa di nke ‘a maara n’ọnụ ụzọ ámá, mgbe ọ na-anọdụ n’etiti ndị okenye ala.’ Ndị okenye obodo ahụ na-anọdụ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ikpe ikpe. N’ihi ya, ihe àmà na-egosi na ọ nọ n’ọkwá ebe ọha na eze tụkwasịrị ya obi. Otú ndị ọzọ si ele mmadụ anya na-ekwu okwu banyere àgwà ya. Ọ bụrụ na ọ dabara adaba, tụleekwa otú ndị nọ n’okpuru ya si ele ya anya. Nke a pụrụ igosi otú gị onwe gị, dị ka nwunye ya, ga-esi na-ele ya anya ka oge na-aga.—Tụlee 1 Samuel 25:3, 23-25.
• Omume ndị dị aṅaa ka o nwere?
Amamihe Chineke “buru ụzọ dị ọcha.” (Jemes 3:17) Onye ị na-aga ịlụ ò nwere mmasị ná mmejụ ọchịchọ mmekọahụ ya karịa n’ọnọdụ gị na ya n’ihu Chineke? Ọ bụrụ na ọ dịghị agbalị ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke banyere omume ọma ugbu a, ihe ndabere dị aṅaa ka e nwere iji kwere na ọ ga-eme otú ahụ mgbe unu lụsịrị?—Jenesis 39:7-12.
• Olee ụzọ o si emeso m?—Ndị Efesọs 5:28, 29.
Akwụkwọ Bible bụ́ Ilu na-ekwu banyere otu di bụ́ onye ‘tụkwasịworo nwunye ya obi.’ Ọzọkwa, ‘ọ na-eto ya.’ (Ilu 31:11, 28) Ọ dịghị ekwo ekworo gabiga ókè, ọ dịghị egosikwa enweghị ezi uche n’atụmanya ya. Jemes dere na amamihe si n’elu bịa “dị udo, nwee [ezi uche], . . . jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ.”—Jemes 3:17.
• Olee ụzọ o si emeso ndị òtù ezinụlọ ya?—Ọpụpụ 20:12.
Ịkwanyere nne na nna ùgwù abụghị ihe a chọrọ nanị n’aka ụmụaka. Bible na-ekwu, sị: “Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi.” (Ilu 23:22) N’ụzọ na-akpali mmasị, Dr. W. Hugh Missildine dere, sị: “A pụrụ izere ọtụtụ ihe isi ike na ekwekọghị ekwekọ ndị a na-enwe n’alụmdi na nwunye—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ a pụrụ ibu ụzọ hụ ha—ma ọ bụrụ na onye ahụ na-aga ịlụ di ma ọ bụ nwunye emee nleta a na-eyighị eyi n’ụlọ onye nke ọzọ ma chọpụta mmekọrịta dị n’etiti ‘onye ahụ ọ chọrọ ịlụ’ na nne na nna ya. Ụzọ o si na-ele nne na nna ya anya ga-emetụta ụzọ ọ ga-esi ele onye òtù ọlụlụ ya anya. Mmadụ aghaghị ịjụ, sị: ‘Àchọrọ m ka o mesoo m otú o si emeso nne na nna ya?’ Ụzọ nne na nna ya si emesokwa ya ga-abụ ezi ihe ngosipụta nke otú ọ ga-esi emeso onwe ya na otú ọ ga-atụ anya ka i mesoo ya—mgbe ezumike nke di na nwunye ọhụrụ gasịrị.”
• Ọ̀ na-ewekarị iwe ọkụ ma ọ bụ na-ekwu okwu na-adịghị mma?
Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 4:31) Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị banyere ụfọdụ ndị Kraịst bụ́ ndị “ọrịa banyere ajụjụ na esemokwu n’ihi okwu efu [ga na-arịa],” bụ́ ndị ga-adabakwa ‘n’ekworo, esemokwu, nkwulu, ajọ echiche, na ịrụ ụka.’—1 Timoti 6:4, 5.
Tụkwasị na nke a, Pọl dere na onye ruru eru maka ihe ùgwù ndị pụrụ iche n’ọgbakọ kwesịrị ịbụ “onye na-adịghị eti mmadụ aka”—dị ka ọ dị n’asụsụ Grik mbụ e ji mee ihe, “na-adịghị esu ọkpọ.” (1 Timoti 3:3, ntụaka ala ala peji nke NW) Ọ pụghị ịbụ onye na-eti ndị mmadụ ihe n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ n’okwu. Onye nwere àgwà nke ime ihe ike n’oge iwe abụghị onye òtù ọlụlụ kwesịrị ekwesị.
• Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ya?
Ụfọdụ na-achụso akụ̀ na ụba ma na-enwetakwa ihe ndị ga-esirịrị na ya pụta. (1 Timoti 6:9, 10) Ndị ọzọ na-agagharị ná ndụ n’enweghị nzube, n’enweghị ihe mgbaru ọsọ. (Ilu 6:6-11) Otú ọ dị, onye na-atụ egwu Chineke ga-egosipụta otu mkpebisi ike ahụ dị ka Joshua gosipụtara, bụ́ onye sịrị: “Mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.”—Joshua 24:15.
Ụgwọ Ọrụ na Ibu Ọrụ
Alụmdi na nwunye bụ ihe Chineke hiwere. Ọ bụ Jehova Chineke nyere ikike ya ma guzobe ya. (Jenesis 2:22-24) O mere ndokwa alụmdi na nwunye ka ọ bụrụ nkekọ na-adịgide adịgide n’etiti nwoke na nwanyị ka ha wee nwee ike inyerịtara ibe ha aka. Mgbe e tinyere ụkpụrụ Bible n’ọrụ, di na nwunye pụrụ ịtụ anya ọnọdụ ha ná ndụ ịbụ nke obi ụtọ.—Eklisiastis 9:7-9.
Otú ọ dị, a ghaghị ịghọta na anyị na-ebi n’ime “oge dị oké egwu.” Bible buru amụma na n’oge a, ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, . . . ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, . . . ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu.” (2 Timoti 3:1-4) Àgwà ndị a pụrụ inwe mmetụta dị ike n’alụmdi na nwunye mmadụ. N’ihi ya, ndị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị iji anya doro edo gụkọọ ihe ọ ga-efu. Ndị lụworo alụ ugbu a kwesịrị ịnọgide na-arụ ọrụ n’ime ka njikọ ha ka mma site n’ịmụ na itinye nduzi Chineke a na-achọta na Bible n’ọrụ.
Ee, ndị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ime nke ọma ile anya gabiga ụbọchị agbamakwụkwọ ahụ. Mmadụ nile kwesịkwara ịtụle ọ bụghị nanị ịbanye n’alụmdi na nwunye kamakwa ndụ nke ịbụ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Legara Jehova anya maka nduzi ka i wee nwee ike iche echiche n’ụzọ ezi uche dị na ya kama ịbụ nanị n’ụzọ mmetụta ịhụnanya. Site n’ime otú ahụ, o yikarịrị ka ị ga-enwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Bible na-enye nanị otu ihe ndabere maka ịgba alụkwaghịm nke ga-enye ohere maka nlụgharị, nke ahụ bụkwa “ịkwa iko”—mmekọahụ na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye.—Matiu 19:9.
[Foto dị na peeji nke 6]
Ọbụna ndị lụworo di na nwunye ruo ogologo oge pụrụ ime ka ihe nkekọ alụmdi na nwunye ha sikwuo ike
[Foto dị na peeji nke 7]
Olee ụzọ o si emeso nne na nna ya?