Ngọzi Ma Ọ Bụ Nkọcha—Ihe Atụ Nye Anyị Taa
“Ihe ndị a na-emerị ndị ahụ n’ụzọ ihe atụ; e wee dee ha n’akwụkwọ nsọ ka ha wee bụrụ ihe ịdụ anyị ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo.”—1 NDỊ KỌRINT 10:11.
1. Ọbụna dị ka mmadụ na-enyocha ngwá ọrụ, nnyocha dị aṅaa ka anyị kwesịrị ime?
N’ỊBỤ ihe e ji ágbá techie, nchara pụrụ ịmalite irikasị ngwá ọrụ e ji ígwè mee. Ọ pụrụ iwetụ oge tupu nchara ahụ apụta ìhè. N’otu aka ahụ, àgwà na ọchịchọ dị iche iche nke obi mmadụ pụrụ ịmalite imebi ogologo oge tupu nke a akpata ihe dị oké njọ ma ọ bụ ọbụna tupu ndị ọzọ ahụ ya. Dị ka anyị ga-eji amamihe nyochaa ngwá ọrụ iji lee ma ọ na-ata nchara, otú a ka ezi nnyocha nke obi na nlekọta e mere n’oge kwesịrị ekwesị pụrụ ichekwa iguzosi ike n’ezi ihe ndị Kraịst anyị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, anyị pụrụ ịnata ngọzi Chineke ma nwee ike izere nkọcha Chineke. Ụfọdụ pụrụ iche na ngọzi na nkọcha e kwupụtara n’isi Israel oge ochie nwere ntakịrị ihe ọ pụtaara ndị na-eche ọgwụgwụ nke usoro ihe a ihu. (Joshua 8:34, 35; Matiu 13:49, 50; 24:3) Otú ọ dị, ọ dịghị otú ahụ. Anyị pụrụ irite uru dị ukwuu site n’ihe atụ ịdọ aka ná ntị metụtara Israel, dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrint isi nke 10.
2. Gịnị ka 1 Ndị Kọrint 10:5, 6 na-ekwu banyere ahụmahụ Israel n’ọzara?
2 Pọl onyeozi ji ndị Israel nọ n’okpuru Mosis tụnyere ndị Kraịst n’okpuru Kraịst. (1 Ndị Kọrint 10:1-4) Ọ bụ ezie na ndị Israel gaara abanye n’Ala Nkwa ahụ, “ihe ndị karị n’etiti ha adịghị Chineke ezi mma: n’ihi na a kwaturu ha n’ọhịa.” Ya mere Pọl gwara ndị Kraịst ibe ya, sị: “Ma ihe ndị a ghọrọ ihe atụ nye anyị, ka anyị wee ghara ịbụ ndị agụụ ihe ọjọọ na-agụ, dị ka agụụ ihe ọjọọ gụkwara ndị ahụ.” (1 Ndị Kọrint 10:5, 6, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) A na-azụlite ọchịchọ n’obi, ya mere ọ dị anyị mkpa ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị Pọl hotara.
Ịdọ Aka ná Ntị Megide Ikpere Arụsị
3. Olee otú ndị Israel si mehie n’ihe metụtara nwa ehi ọlaedo ahụ?
3 Ịdọ aka ná ntị mbụ nke Pọl bụ: “Unu aghọkwala ndị na-ekpere arụsị, dị ka ụfọdụ n’etiti ha ghọrọ; dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ndị Israel nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe, ha wee bilie igwu egwú.” (1 Ndị Kọrint 10:7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ihe atụ ịdọ aka ná ntị a bụ nlaghachi ndị Israel laghachiri n’ụzọ nke ndị Ijipt na ime nwa ehi ọlaedo e ji ekpere arụsị. (Ọpụpụ, isi nke 32) Stifen onye na-eso ụzọ gosiri ihe kpatara nsogbu ahụ, sị: “[Mosis, onye nnọchiteanya Chineke] onye nna anyị ha na-achọghị ịṅa ntị, kama ha nupụrụ ya n’ebe ha nọ, wee laghachi azụ n’Ijipt n’obi ha, na-asị Erọn, Meere anyị chi ndị ga-eje n’ihu anyị n’ihi na Mosis a, onye dupụtara anyị n’ala Ijipt, anyị amataghị ihe mere ya. Ha wee kpụọ nwa ehi n’ụbọchị ahụ, wee butere arụsị ahụ ihe ịchụ àjà, wee ṅụrịa n’ọrụ aka ha.” (Ọrụ 7:39-41) Rịba ama na ụmụ Israel ahụ kpafuworonụ bu ọchịchọ ọjọọ ndị dujere n’ikpere arụsị “n’obi ha.” “Ha wee kpụọ nwa ehi . . . wee butere arụsị ahụ ihe ịchụ àjà.” Ọzọkwa, ha “wee ṅụrịa n’ọrụ aka ha.” E nwere egwú, ịgụ egwú, ịgba egwú, iri ihe, na ịṅụ ihe. N’ụzọ doro anya, ikpere arụsị ahụ na-adọrọ adọrọ ma na-enye ntụrụndụ.
4, 5. Omume ikpere arụsị dịgasị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa izere?
4 Ijipt ihe atụ—ụwa Setan—na-efe ntụrụndụ ofufe. (1 Jọn 5:19; Mkpughe 11:8) O ji ndị na-eme ihe nkiri, ndị na-agụ egwú, na ndị ọkà n’egwuregwu, nakwa ịgba egwú ha, egwú ha, echiche ha banyere ihe ụtọ na ikpori ndụ mere chi. A nwawo ọtụtụ ndị imikpu onwe ha n’ihe ntụrụndụ mgbe ha ka na-azọrọ ife Jehova ofufe. Mgbe a na-aghaghị ịdọ onye Kraịst aka ná ntị maka ajọ omume, ọtụtụ mgbe a pụrụ ịchọpụta na ọnọdụ ime mmụọ ya na-esikwaghị ike sitere n’ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, ịgba egwú, na ikpori ndụ n’ụzọ ụfọdụ nke pụrụ ịdị nso n’ikpere arụsị. (Ọpụpụ 32:5, 6, 17, 18) Ụfọdụ ntụrụndụ dị mma ma na-enye obi ụtọ. Ma, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke egwú, ịgba egwú, ihe nkiri sịnịma, na ihe nkiri vidio nke ndị ụwa na-emeju ọchịchọ anụ ahụ rụrụ arụ.
5 Ezi ndị Kraịst adịghị adaba n’ofufe arụsị. (2 Ndị Kọrint 6:16; 1 Jọn 5:21) Ka onye ọ bụla n’ime anyị kpachara nnọọ anya iji ghara ịghọ onye ntụrụndụ ikpere arụsị riri ahụ wee nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịta ahụhụ ihe ọjọọ ndị ga-esi n’imikpu n’ikpori ndụ n’ụzọ nke ụwa pụta. Ọ bụrụ na anyị edoo onwe anyị n’okpuru mmetụta nke ụwa, ọ ga-afọ nke nta ka ọ bụrụ na ọchịchọ na àgwà ndị na-emerụ ahụ pụrụ ibiri n’uche na obi anyị n’ụzọ a na-adịghị achọpụta. Mgbe a na-edozighị ya, n’ikpeazụ ndị a pụrụ ịkpata ịbụ onye ‘a kwaturu n’ọzara’ nke usoro ihe Setan.
6. Ihe ziri ezi dị aṅaa ka ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ime banyere ntụrụndụ?
6 Dị ka Mosis n’oge ihe banyere nwa ehi ọlaedo ahụ, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ekwu, sị: “Ònye dịịrị Jehova? ya bịakwute m.” Ime ihe ziri ezi iji gosi na anyị guzosiri ike maka ezi ofufe pụrụ ịzọpụta ndụ. Ebo nke Mosis bụ́ Livaị mere ihe ngwa ngwa iji kpochapụ mmetụta ndị na-emerụ emerụ. (Matiu 24:45-47; Ọpụpụ 32:26-28) Ya mere, jiri nlezianya nyochaa ntụrụndụ, egwú, ihe nkiri vidio, na ihe ndị yiri ha ndị ị na-ahọrọ. Ọ bụrụ na ọ rụrụ arụ n’ụzọ ụfọdụ, were nguzo gị n’akụkụ Jehova. Site n’iji ekpere dabere na Chineke, mee mgbanwe ná ntụrụndụ na egwú ị na-ahọrọ, ma bibie ihe ndị na-emerụ ahụ n’ụzọ ime mmụọ, ọbụna dị ka Mosis bibiri nwa ehi ọlaedo ahụ.—Ọpụpụ 32:20; Deuterọnọmi 9:21.
7. Olee otú anyị pụrụ isi chebe obi ihe atụ?
7 Olee otú anyị pụrụ isi gbochie nrikasị nke obi? Site n’iji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, na-ekwe ka eziokwu ya nile bamie n’uche na obi anyị. (Ndị Rom 12:1, 2) N’ezie, anyị kwesịrị ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya. (Ndị Hibru 10:24, 25) A pụrụ iji ágbá e tere n’ebe tara nchara tụnyere ịga nzukọ n’ekereghị òkè. Nke a pụrụ ime ka anyị gbukepụ ruo nwa oge, ma ọ dịghị agwọta nsogbu kpatara ya. Kama nke ahụ, site n’ibu ụzọ kwadebe, ntụgharị uche, na ikeresi òkè ike ná nzukọ, anyị ga-eji ike wepụ ihe ndị na-akpata nrikasị ahụ bụ́ ndị pụrụ ịnọte anya n’akụkụ zoro ezo nke obi ihe atụ anyị. Nke a ga-enyere anyị aka ịrapagidesi ike n’Okwu Chineke, ọ ga-ewusikwa anyị ike ịtachi obi n’ule nke okwukwe ma “dizuokwa mma.”—Jemes 1:3, 4; Ilu 15:28.
Ịdọ Aka ná Ntị Megide Ịkwa Iko
8-10. (a) Ihe atụ ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka e zoro aka na ya ná 1 Ndị Kọrint 10:8? (b) Olee otú a pụrụ isi tinye okwu Jisọs dị na Matiu 5:27, 28 n’ọrụ n’ụzọ bara uru?
8 N’ihe atụ ọzọ nke Pọl, e nyere anyị ndụmọdụ, sị: “Ka anyị gharakwa ịkwa iko, dị ka ụfọdụ n’etiti ha kwara, wee daa nwụọ n’otu ụbọchị, [iri puku mmadụ abụọ na puku atọ].”a (1 Ndị Kọrint 10:8) Onyeozi ahụ na-ezo aka n’oge mgbe ndị Israel kpọrọ isiala nye chi ụgha dị iche iche ma ‘soro ụmụ ndị inyom Moab kwaa iko.’ (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9) Mmekọahụ rụrụ arụ na-eweta ọnwụ! Ikwe ka echiche rụrụ arụ nọgide n’achịkwaghị ya yiri ikwe ka obi “taa nchara.” Jisọs kwuru, sị: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Akwala iko: ma Mụ onwe m sị unu, na nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.”—Matiu 5:27, 28.
9 Ihe na-agba akaebe maka ihe ndị na-esite ‘n’ile nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ nwoke’ pụta bụ ihe echiche rụrụ arụ nke ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi tupu Iju Mmiri nke ụbọchị Noa rụpụtara. (Jenesis 6:1, 2) Chetakwa na a kpalitere otu n’ime ihe ndị kasị weta ọdachi ná ndụ Eze Devid site na ya ịnọgide na-ele nwanyị anya n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. (2 Samuel 11:1-4) N’ụzọ dị iche, nwoke ezi omume ahụ lụrụ nwunye bụ́ Job ‘na anya ya abụọ gbara ndụ ka ọ ghara ilekwasị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke anya,’ si otú ahụ na-ezere omume rụrụ arụ ma na-egosi na ya bụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe. (Job 31:1-3, 6-11) A pụrụ iji anya tụnyere window nke obi. Ọ bụkwa site n’obi rụrụ arụ ka ọtụtụ ihe ọjọọ na-esi apụta.—Mak 7:20-23.
10 Ọ bụrụ na anyị etinye okwu Jisọs n’omume, anyị agaghị enye echiche ọjọọ ohere site n’ile ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ma ọ bụ site n’inwe echiche rụrụ arụ banyere onye Kraịst ibe anyị, onye ọrụ ibe anyị, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ. A naghị ewepụ ịta nchara n’ígwè site nanị n’ihichapụ nrikasị ahụ. Ya mere, akpala echiche ma ọ bụ àgwà ndị rụrụ arụ aka elu elu dị ka a ga-asị na ha batụrụ uru. Mee ihe ndị siri ike iji wepụ ọchịchọ ndị rụrụ arụ n’ebe ị nọ. (Tụlee Matiu 5:29, 30.) Pọl na-agba ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjoọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị; ọ bụkwa n’ihi ihe ndị a ka iwe Chineke na-abịakwasị ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye.” Ee, n’ihi ụdị ihe ndị ahụ dị ka mmekọahụ rụrụ arụ, ‘ka iwe Chineke na-abịa’ dị ka ngosipụta nke nkọcha ya. Ya mere ọ dị anyị mkpa ime ka ihe nile dị anyị n’ahụ metụta ihe ndị a “nwụọ.”—Ndị Kọlọsi 3:5, 6.
Ịdọ Aka ná Ntị Megide Mkpesa Nnupụisi
11, 12. (a) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka e nyere ná 1 Ndị Kọrint 10:9, ihe omume dịkwa aṅaa ka e zoro aka na ya? (b) Olee otú ịdọ aka ná ntị Pọl kwesịrị isi emetụta anyị?
11 Ọzọ, Pọl na-adọ aka ná ntị, sị: “Ka anyị gharakwa ịnwa Onyenwe anyị, dị ka ụfọdụ n’etiti ha nwara, agwọ wee laa ha n’iyi.” (1 Ndị Kọrint 10:9) Mgbe ha ji ụkwụ na-aga n’ọzara ná nso ókèala Edọm, ndị Israel “wee kwuo okwu megide Chineke, megidekwa Mosis, sị, N’ihi gịnị ka unu meworo ka anyị si n’Ijipt rịgota ịnwụ n’ọzara nke a? n’ihi na achịcha adịghị, mmiri adịghịkwa; ike agwụsịwokwa mkpụrụ obi anyị n’achịcha nke a dị mfe,” manna ahụ e nyere n’ụzọ ọrụ ebube. (Ọnụ Ọgụgụ 21:4, 5) Cheedị nnọọ echiche! Ndị Israel ahụ “wee kwuo okwu megide Chineke,” na-akpọ onyinye ya ihe na-abaghị uru!
12 Site ná mkpesa ha, ndị Israel na-anwa ndidi Jehova. E jichighị ntaramahụhụ, n’ihi na Jehova zijere agwọ ọjọọ n’etiti ha, ọtụtụ nwụkwara site n’arụ agwọ. Mgbe ndị ahụ chegharịsịrị, Mosis rịọchitekwara ha arịrịọ, e wetara ihe otiti ahụ ná njedebe. (Ọnụ Ọgụgụ 21:6-9) N’ezie ihe omume a kwesịrị ije ozi dị ka ịdọ aka ná ntị nye anyị ịghara igosipụta mmụọ nnupụisi, nke ime mkpesa, karịsịa megide Chineke na ndokwa ya nile nke ọchịchị Chineke.
Ịdọ Aka ná Ntị Megide Ịtamu Ntamu
13. Megide gịnị ka 1 Ndị Kọrint 10:10 na-adọ aka ná ntị, nnupụisi dịkwa aṅaa ka Pọl bu n’uche?
13 N’ihota ihe atụ ikpeazụ ya nke metụtara ndị Israel n’ọzara, Pọl na-ede, sị: “Unu atamukwala, dị ka ụfọdụ n’etiti ha tamuru, onye mbibi ahụ wee laa ha n’iyi.” (1 Ndị Kọrint 10:10) Nnupụisi tiwapụtara mgbe Kora, Detan, Abaịram, na ndị òtù ha mere omume n’ụzọ na-abụghị nke ọchịchị Chineke ma maa ikike nke Mosis na Erọn aka. (Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3) Mgbe e bibichara ndị nnupụisi ahụ, ndị Israel malitere ịtamu. Nke a bụ n’ihi na ha malitere iche na mbibi nke ndị nnupụisi ahụ ezighị ezi. Ọnụ Ọgụgụ 16:41 na-ekwu, sị: “Nzukọ nile nke ụmụ Israel tamuru ntamu n’echi ya megide Mosis megidekwa Erọn, sị, Unu onwe unu emewo ka ndị nke Jehova nwụọ.” N’ihi ha ịkatọ ụzọ e si mezuo ikpe ziri ezi n’oge ahụ, 14,700 ndị Israel lara n’iyi site n’ihe otiti nke Chineke zipụrụ.—Ọnụ Ọgụgụ 16:49.
14, 15. (a) Gịnị bụ otu n’ime mmehie nke “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” gbebara n’ọgbakọ? (b) Gịnị ka a pụrụ ịmụta site n’ihe omume metụtara Kora?
14 Na narị afọ mbụ O.A., “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” bụ́ ndị gbebatara n’ọgbakọ ndị Kraịst ghọrọ ndị na-ezi ozizi ụgha nakwa ndị ntamu. Ndị ikom a nọ ‘na-ajụ ịbụ onye nwe mmadụ, kwuluokwa ndị nọ n’ebube,’ bụ́ ndị ikom e tere mmanụ e nyere nlekọta ime mmụọ nke ọgbakọ n’aka mgbe ahụ. Banyere ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke dapụrụ n’ezi ofufe, Jud onye na-eso ụzọ kwukwara, sị: “Ndị a bụ ndị ntamu, ndị na-ata Chineke ụta, na-ejeso agụụ ihe ọjọọ nile ha.” (Jud 3, 4, 8, 16) Taa, ụfọdụ ndị na-aghọ ndị ntamu n’ihi na ha na-ekwe ka àgwà na-erikasị ihe n’ụzọ ime mmụọ tolite n’obi ha. Ọtụtụ mgbe ha na-elekwasị anya n’ezughị okè nke ndị nọ n’ọnọdụ nlekọta n’ọgbakọ ma malite ịtamu ntamu megide ha. Ntamu na mkpesa ha pụrụ ọbụna ịgaru n’ịkatọ mbipụta dị iche iche nke ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.’
15 O kwesịrị ekwesị ịjụ ajụjụ ndị sitere n’ezi obi banyere isiokwu Akwụkwọ Nsọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na anyị azụlite àgwà na-ezighị ezi nke gosipụtara onwe ya ná nkwurịta okwu nkatọ n’etiti ndị ezi enyi? Anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe anyị, sị, ‘Gịnị ka nke a yiri ka ọ ga-arụpụta? Ọ̀ bụ na ọ́ gaghị aka nnọọ mma ịkwụsị ịtamu ntamu ma kpee ekpere n’obi umeala maka amamihe?’ (Jemes 1:5-8; Jud 17-21) Kora na ndị kwadoro ya, bụ́ ndị nupụrụ isi megide ikike Mosis na Erọn, nwere ike ịbụ ndị ji nnọọ n’aka na otú ha si ele ihe anya ziri ezi nke na ha enyochaghị ebumnobi ha. Otú o sina dị, ha ezighị ezi ma ọlị. Otú ahụkwa ka ọ dị ndị Israel ahụ tamuru ntamu banyere mbibi nke Kora na ndị nnupụisi ndị ọzọ. Lee otú o si bụrụ ihe amamihe ikwe ka ihe atụ ndị dị otú a kpalie anyị inyocha ebumnobi anyị, wepụ ịtamu ntamu ma ọ bụ ime mkpesa, ma kwee ka Jehova nụchaa anyị!—Abụ Ọma 17:1-3.
Mụta Ihe, Nwetakwa Ngọzi Ya
16. Gịnị bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ n’agbamume dị ná 1 Ndị Kọrint 10:11, 12?
16 N’okpuru ike mmụọ nsọ Chineke, Pọl na-emechi ndepụta nke ozi ịdọ aka ná ntị ahụ site n’agbamume a: “Ma ihe ndị a na-emerị ndị ahụ n’ụzọ ihe atụ; e wee dee ha n’akwụkwọ nsọ ka ha wee bụrụ ihe ịdụ anyị ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo. Ya mere, onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Ndị Kọrint 10:11, 12) Ka anyị ghara ileda nguzo anyị n’ọgbakọ ndị Kraịst anya.
17. Ọ bụrụ na anyị achọpụta ebumnobi na-ekwesịghị ekwesị n’obi anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
17 Dị ka ígwè pụrụ ịta nchara, otú ahụkwa anyị bụ ụmụ Adam mere mmehie eketawo ọchịchọ ime ihe ọjọọ. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 5:12) Ya mere, anyị ekwesịghị inwe nkụda aka ma ọ bụrụ na anyị ahụta ebumnobi na-ekwesịghị ekwesị n’obi anyị. Kama nke ahụ, ka anyị mee ihe ngwa ngwa. Mgbe e kpughere ígwè nye ikuku dị mmiri mmiri ma ọ bụ gburugburu ebe na-erikasị ihe, a ga-eme ka o rikasịa oké ngwa ngwa. Ọ dị anyị mkpa izere ikpughe onwe anyị nye “ikuku” nke ụwa Setan, ya na ajọ ntụrụndụ ya, omume rụrụ arụ dị ebe nile, na ọchịchọ na-ezighị ezi nke uche.—Ndị Efesọs 2:1, 2.
18. Gịnị ka Jehova meworo banyere ọchịchọ ọjọọ nke ihe a kpọrọ mmadụ?
18 Jehova enyewo ihe a kpọrọ mmadụ ihe ha ga-eji gbochie àgwà dị njọ nke anyị ketaworo. O nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ka ndị nwere okwukwe na ya nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Ọ bụrụ na anyị agbasoo nzọụkwụ Jisọs n’ụzọ chiri anya ma gosipụta ọdịdị àgwà yiri nke Kraịst, anyị ga-abụ ngọzi nye ndị ọzọ. (1 Pita 2:21) Anyị ga-anatakwa, ọ bụghị nkọcha, kama ngọzi Chineke.
19. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịtụle ihe atụ Akwụkwọ Nsọ?
19 Ọ bụ ezie na anyị taa nwere ike ijehie dị ka ndị Israel oge ochie, anyị nwere Okwu Chineke zuru ezu e dere ede idu anyị. Site na peji ya nile anyị na-amụta banyere mmeso Jehova na-emeso ihe a kpọrọ mmadụ nakwa àgwà ya nile Jisọs mere ihe atụ ha, onye bụ́ ‘nnwupụ nke ebube Chineke na onyinyo nke ụdị Ya.’ (Ndị Hibru 1:1-3; Jọn 14:9, 10) Site n’ekpere na iji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ, anyị pụrụ inwe “uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 2:16) Mgbe anyị zutere ọnwụnwa na ule ndị ọzọ nke okwukwe anyị, anyị pụrụ irite uru site n’ịtụle ihe atụ oge ochie nke Akwụkwọ Nsọ na karịsịa ihe atụ magburu onwe ya nke Jisọs Kraịst. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị agaghị enweta mmezu nke nkọcha Chineke. Kama nke ahụ, anyị ga-enweta ihu ọma Jehova taa na ngọzi ya ruo mgbe ebighị ebi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Pọl ịghara ịbụ ndị na-ekpere arụsị n’ọrụ?
◻ Gịnị ka anyị pụrụ ime iji ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nke onyeozi ahụ megide ịkwa iko?
◻ N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izere ịtamu ntamu na ime mkpesa?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi nata ngọzi Chineke, ọ bụghị nkọcha?
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ngọzi Chineke, anyị aghaghị izere ikpere arụsị
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Ọbụna dị ka ọ dị mkpa iwepụ ịta nchara, ka anyị mee ihe ziri ezi iji wepụ ọchịchọ na-ekwesịghị ekwesị n’obi anyị