Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 6/1 p. 13-18
  • Ịmata Ezi Okpukpe ahụ na Ibu Ọrụ Na-eso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmata Ezi Okpukpe ahụ na Ibu Ọrụ Na-eso
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú I Si Emeghachi Omume n’Ebe Okwu Chineke Dị?
  • Nrara Ị Raara Onwe Gị Nye Jehova Ò Zuru Ezu?
  • Ruo n’Ókè Ha Aṅaa Ka Ịhụnanya Kraịst Na-emetụta Gị?
  • Ịnọpụ Iche n’Ụwa​—⁠Ruo n’Okè Ha Aṅaa?
  • Ruo Oké Ha Aṅaa Ka Ịhụnanya Gị Na-eru?
  • Ịgba Àmà Alaeze​—⁠Ruo Oké Ha Aṅaa ka Ọ Di Mkpa Nye Gị?
  • Ị̀ Chọtawo Ezi Okpukpe Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ofufe Chineke Na-anakwere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-efe Chineke
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 6/1 p. 13-18

Ịmata Ezi Okpukpe ahụ na Ibu Ọrụ Na-eso

“Ngọzi na-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, debekwa ya.”​—⁠LUK 11:28.

1. Ozugbo ha chọtara ezi okpukpe ahụ, ụdị ndị dị aṅaa na-ewukwasị ndụ ha gburugburu ya?

NANỊ ịmata ezi okpukpe ahụ ezughị. Ọ bụrụ na anyị bụ ndị hụrụ ihe ziri ezi na eziokwu n’anya, anyị ga-ewulite ndụ anyị gburugburu ya ozugbo anyị chọtara ya. Ezi okpukpe ahụ abụghị nkà ihe ọmụma ụbụrụ isi efu; ọ bụ ụzọ e si ebi ndụ.​—⁠Abụ Ọma 119:105; Aịsaịa 2:3; tụlee Ọrụ 9:2.

2, 3. (a) Olee otú Jisọs si mesie ịdị mkpa nke ime uche Chineke ike? (b) Olee ibu ọrụ na-adịkwasị onye ọ bụla maara ezi okpukpe ahụ?

2 Jisọs Kraịst mesịrị mkpa ọ dị ike ime ihe Chineke kpugheworo dị ka nzube Ya. N’imechi ihe a maara ugbu a dị ka Ozizi Elu Ugwu, Jisọs mere ka a mara na ọ bụghị ndị nile na-akpọ ya Onyenwe anyị (si otú ahụ na-azọrọ ịbụ ndị Kraịst) ga-aba n’Alaeze ahụ; kama nanị ndị na-eme ihe Nna ya na-achọ. O kwuru na a ga-ajụ ndị ọzọ dị ka “ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.” N’ihi gịnị ka o ji bụrụ mmebi iwu? N’ihi na dị ka Bible si kwuo, emeghị uche Chineke bụ mmehie, mmehie nile bụkwa mmebi iwu. (Matiu 7:21-⁠23; 1 Jọn 3:4; tụlee Ndị Rom 10:​2, 3.) Mmadụ pụrụ ịma ezi okpukpe ahụ, ọ pụrụ ija ndị na-akụzi ya mma, ọ pụkwara ikwu okwu ọma banyere ndị na-ekpe ya, ma, o nwekwara ibu ọrụ nke iji ya mee ihe ná ndụ nke onwe ya. (Jemes 4:17) Ọ bụrụ na ọ nakwere ibu ọrụ ahụ, ọ ga-achọpụta na ndụ ya ga-aka mma, ọ ga-enwekwa ọṅụ nke na-enweghị ụzọ ọzọ ọ ga-esi bịa.

3 N’isiokwu bu ụzọ, anyị tụlere ihe isii e ji amata ezi okpukpe ahụ. Nke ọ bụla n’ime ha abụghị nanị na ọ na-enyere anyị aka ịmata ezi okpukpe ahụ kamakwa ọ na-eche n’ihu anyị n’otu n’otu ihe ịma aka na ohere dị iche iche. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

Olee Otú I Si Emeghachi Omume n’Ebe Okwu Chineke Dị?

4. (a) Ka ndị ọhụrụ na-amalite isonyere Ndịàmà Jehova, gịnị ka ha na-achọpụta ngwa ngwa banyere ojiji Ndịàmà ahụ na-eji Bible eme ihe? (b) Olee otú ịbụ ndị na-eriju afọ n’ụzọ ime mmụọ si emetụta ndị ohu Jehova?

4 Ka Ndịàmà Jehova so ndị ọhụrụ na-enwe mmasị na-amụ Bible, ọtụtụ n’ime ndị ọhụrụ ndị a na-aghọta ngwa ngwa na ihe a na-akụziri ha sitere na Bible. N’iji zaa ajụjụ ha dị iche iche, adịghị ezoro ha aka n’ozizi dị iche iche nke chọọchị, omenala ụmụ mmadụ, ma ọ bụ n’echiche nke ndị a ma ama. Okwu Chineke n’onwe ya bụ ebe ihe ha na-ezi sitere. Mgbe ha jere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha na-ahụ na Bible bụ akwụkwọ bụ isi e ji eme ihe n’ebe ahụkwa. Ọ dịghị ewe ndị ji obi eziokwu na-achọ eziokwu ogologo oge ịchọpụta na ihe bụ isi kpatara ọṅụ ahụ nke ha na-ahụ n’etiti Ndịàmà Jehova bụ eziokwu ahụ bụ na ha na-eriju afọ n’ụzọ ime mmụọ site n’Okwu Chineke.​—⁠Aịsaịa 65:​13, 14.

5. (a) Olee ihe ịma aka a na-eche ndị ahụ na-ekiri Ndịàmà Jehova n’ihu? (b) Olee otú ha pụrụ isi kere òkè n’ọṅụ nke Ndịàmà ahụ?

5 Ọ bụrụ na ị mata nke a, olee otú i si emeghachi omume na ya? Ọ bụrụ na ị ghọta isi ya, ị pụghị ịbụ nanị onye nkiri efu, ị kwesighịkwa ịchọ ịbụ ya. Bible na-egosi na ndị ahụ “na-anụ nanị” ma ha abụghị “ndị na-eme okwu ahụ” ‘ji echiche na-ezighị ezi na-arafu onwe ha.’ (Jemes 1:22) Ha na-arafu onwe ha n’ihi na ha adịghị amata na n’agbanyeghị ihe ọ bụla ha pụrụ ikwu, ha ịghara irubere Chineke isi na-egosi na ha ahụghị ya n’anya n’ezie. Nzọrọ inwe okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ okwukwe nwụrụ anwụ. (Jemes 2:​18-⁠26; 1 Jọn 5:3) N’ụzọ megidere nke ahụ, onye ịhụnanya maka Jehova kpalịrị ịbụ “onye na-eme eme nke na-arụ ọrụ” “ga-abụ onye ngọzi n’omume ya.” Ee, dị ka Jisọs Kraịst kọwara, “ngọzi na-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, debekwa ya.”​—⁠Jemes 1:25; Luk 11:28; Jọn 13:17.

6. Ọ bụrụ na anyị nwere ekele n’ezie maka Okwu Chineke, ohere dịgasị aṅaa ka anyị ga-agbalị iji mee ihe n’onwe anyị?

6 Ọṅụ ahụ ga-adịwanye omimi ka ị na-eto n’ihe ọmụma nke uche Chineke ma na-etinye ihe ndị ọzọ ị na-amụta n’ọrụ. Mgbalị ha aṅaa ka ị ga-etinye iji mụọ Okwu Chineke? Ọtụtụ iri puku ndị mmadụ ndị na-amaghị akwụkwọ arụsiwo ọrụ ike iji mụta òtù e si agụ ihe, na-eme nke a kpọmkwem ka ha wee nwee ike ịgụ Akwụkwọ Nsọ na ịkụziri ya ndị ọzọ. Ndị ọzọ na-ebili n’isi ụtụtụ ọ bụla ka ha wee nwee ike itinye oge ụfọdụ kwa ụbọchị n’ịgụ Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị dị ka Ụlọ Nche. Ka ị na-enwe ọgụgụ Bible nke ọ bụla n’onwe gị ma ọ bụ na-achọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara n’ihe ọmụmụ ndị ọzọ, jiri nlezianya rịba iwu na ụkpụrụ nile nke Jehova ama, na-achọkwa ịghọta ọtụtụ ụkpụrụ ndị dị n’ime ya maka iduzi anyị. Tụgharịa uche n’ihe akụkụ ọ bụla na-ekpughe banyere Chineke, nzube ya, na mmeso ọ na-emeso ihe a kpọrọ mmadụ. Nye oge ka nke a kpụzie obi gị. Tụlee ma ọ dị ụzọ ndị ị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Bible ahụ n’ọrụ ná ndụ gị n’ụzọ zuru ezu karị.​—⁠Abụ Ọma 1:1, 2; 19:7-⁠11; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:1.

Nrara Ị Raara Onwe Gị Nye Jehova Ò Zuru Ezu?

7. (a) Olee otú ozizi Atọ n’Ime Otu siworo metụta mgbalị ndị mmadụ ife Chineke ofufe? (b) Gịnị pụrụ ime mgbe mmadụ mụtara eziokwu banyere Jehova?

7 Nye ọtụtụ nde mmadụ, ọ bụrụwo ihe na-eme ka obi jụrụ ha ịmụta na ezi Chineke ahu abụghi Atọ n’Ime Otu. Nkọwa ahụ bụ “ọ bụ ihe omimi” adịghị mgbe o juru ha afọ. Olee otú ha pụrụ isi bịa Chineke a na-apụghị ịghọta aghọta nso? N’ihi nkụzi ahụ, ha na-elegharakarị Nna ahụ anya (onye ha na-anụtụbeghị ka a kpọrọ aha ya na chọọchị) na ife Jisọs ofufe dị ka Chineke ma ọ bụ iche ofufe ha ihu n’ebe Meri nọ (onye a kụziiri ha na ọ bụ “Nne nke Chukwu”). Ma obi ha na-eji obi ụtọ anabata ya mgbe otu onye n’ime Ndịàmà Jehova mepere Bible ma gosi ha aha Chineke n’onwe ya, bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Otu nwanyị onye Venezuela nwere obi ụtọ nke ukwuu n’ịbụ onye e gosiri aha Chineke nke na ọ makụrụ Onyeàmà ahụ na-eto eto nke sooro ya kerịta eziokwu ahụ dị oké ọnụ ahịa, o kwetakwara inwe ọmụmụ Bible ebe obibi. Mgbe ndị dị otú ahụ mụtara na Jisọs kwuru banyere Nna ya dị ka “Chineke m na Chineke unu” nakwa na Jisọs kpọrọ Nna ya ‘nanị ezi Chineke ahụ,’ ha na-aghọta na ihe Bible na-akụzi banyere Chineke abụghị ihe a na-apụghị ịghọta aghọta. (Jọn 17:3; 20:17) Ka ha na-amụta àgwà dị iche iche nke Jehova, ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a dọtara nso n’ebe ọ nọ, malite ikpegara ya ekpere, chọọkwa ime ihe ga-atọ ya ụtọ. Gịnị ka ọ na-arụpụta?

8. (a) N’ihi ịhunanya ha maka Jehova na ọchịchọ ha ime ihe ga-atọ ya ụtọ, gịnị ka ọtụtụ nde mmadụ meworo? (b) N’ihi gịnị ka baptism ndị Kraịst ji dị oké mkpa?

8 N’ime afọ iri gara aga, 2,528,524 mmadụ na kọntinentị isii na n’ọtụtụ agwaetiti ararawo ndụ ha nye Jehova mgbe ahụkwa gosipụta nraranye nke a site na baptism ime mmiri. Ị̀ bụ otu n’ime ha, ka ị̀ na-ejikere ugbu a ịbụ onye e mere baptism? Baptism bụ oké ihe ná ndụ nke ezi onye Kraịst ọ bụla. Jisọs nyere ndị na-ezo ụzọ ya ọrụ ime ndị nke mba nile ndị na-eso ụzọ nakwa ime ha baptism. (Matiu 28:​19, 20) O kwesikwara ịrịba àmà na ọ bụ ozugbo e mesịrị Jisọs baptism ka Jehova n’onwe ya sitere n’eluigwe kwuo okwu, sị: “Gị onwe gị bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya; ihe Gị dị m ezi mma.”​—⁠Luk 3:​21, 22.

9. Iji nọgide soro Jehova na-enwe mmekọrịta a nwapụtara anwapụta, gịnị ka a chọrọ anyị n’aka?

9 Iso Jehova nwee mmekọrita a nwapụtara anwapuṭa bụ ihe e kwesịrị ichekwa. Ọ bụrụ na ị banyewo ná mmekọrịta dị otú ahụ site ná nraranye na baptism, zere ihe ọ bụla ga-emebi ya. Ekwela ka nchegbu nke ndụ na nchekasị banyere ihe onwunwe kwazụga ya gaa n’ọnọdụ nke na-adịchaghị mkpa. (1 Timoti 6:​8-⁠12) Na-ebi ndụ n’ezie n’ụzọ kwekọrọ na ndụmọdụ ahụ dị n’Ilu 3:6: “N’ụzọ gị nile mara [Jehova], ya onwe ya ga-emekwa ka okporo gị nile zie ezi.”

Ruo n’Ókè Ha Aṅaa Ka Ịhụnanya Kraịst Na-emetụta Gị?

10. N’ihi gịnị ka anyị ife Jehova ofufe na-ejighị eme ka anyị leghara Jisọs anya?

10 Otú ọ dị, ekele kwesịrị ekwesị nye Jehova dị ka nanị ezi Chineke adịghị eme ka mmadụ leghara Jisọs Kraịst anya. N’ụzọ megidere nke ahụ, Mkpughe 19:10 na-asị: “Àmà nke Jisọs bụ mmụọ nke amụma.” Site na Jenesis ruo Mkpughe, amụma ndị e buru n’ike mmụọ nsọ na-enye nkọwa sara mbara banyere òkè Jisọs Kraịst ná nzube nke Jehova. Ka mmadụ na-amata nkọwa ndị ahụ sara mbara, onyinyo na-adọrọ mmasị na-apụta ìhè, bụ́ nke na-enweghị mgbagwoju anya na echiche na-ezighị ezi dị iche iche ndị sitere n’ozizi ụgha dị iche iche nke Krisendọm.

11. Olee otú ịmụta ihe Bible na-akụzi n’ezie banyere Ọkpara Chineke si metụta otu nwanyị na Poland?

11 Ịghọta eziokwu banyere Ọkpara Chineke pụrụ inwe mmetụta dị omimi n’ahụ mmadụ. Nke ahụ bụ ihe mere otu nwanyị na Poland bụ́ Danuta. O sowo Ndịàmà Jehova na-emekọ ihe ruo afọ asatọ, na-enwe mmasị n’ihe ha na-akụzi, ma ọ dịghị eme ka eziokwu ahụ bụrụ ụzọ nke ndụ ya. Mgbe ahụ ọ natara akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, nke gosiri ndụ Kraịst n’ụzọ dị mfe ịghọta.a Ná mgbede ya, o mepere akwụkwọ ahụ, buru n’uche ịgụ nanị otu isiakwụkwọ. Otú ọ dị, o dorughị ya ala ruokwa n’isi ụtụtụ mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ahụ. Ọ malitere ibe ákwá. “Jehova, gbaghara m,” ka ọ rịọrọ. N’ihi ihe ọ gụtara, ọ hụrụ n’ụzọ doro anya karịa ka ọ hụtụrụla, ịhụnanya nke Jehova na Ọkpara ya gosiri. Ọ ghọtara na ruo afọ asatọ, ọ nọwo na-ewezụga onwe ya n’enyemaka Chineke ji ndidi na-eche ya n’ihu n’ụzọ na-egosi enweghị ekele. Na 1993, e mere ya baptism ná ngosipụta nke nrara ọ raara onwe ya nye Jehova ná ndabere nke okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ.

12. Olee otú ezi ihe ọmụma banyere Jisọs Kraịst si emetụta ndụ anyị?

12 E jikọtara “ịmazu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst” na ịbụ onye Kraịst na-arụsi ọrụ ike nke na-amị mkpụrụ. (2 Pita 1:8) Ruo n’okè ha aṅaa ka ị ga-ekere òkè n’ọrụ dị otú ahụ, na-esoro ndị ọzọ ekerịta ozi Alaeze ahụ? Ọtụtụ ọnọdụ na-emetụta òkè ndị mmadụ n’otu n’otu ga-enwe ike ikere. (Matiu 13:​18-⁠23) Anyị apụghị ịgbanwe ọnọdụ ụfọdụ; anyị pụrụ ịgbanwe ndị ọzọ. Gịnị ga-akwali anyị ịchọpụta na ime mgbanwe ndị a pụrụ ime? Onyeozi bụ́ Pọl dere, sị: “Ịhụnanya Kraịst na-arụgide anyị”; n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ịhụnanya o gosiri n’ịtọgbọ ndụ ya n’ihi anyị pụrụ iche nke na, ka ekele anyị maka ya na-eto, a ga-akpali obi anyị n’ụzọ dị omimi. N’ihi nke ahụ, anyị na-aghọta na ọ ga-abụ ihe na-ekwesighị ekwesi ma ọlị anyị ịnọgide na-achụso ihe mgbaru ọsọ onwe onye dị iche iche na ibi ndụ n’ụzọ bụ isi maka imejụ ọchịchọ onwe onye. Kama nke ahụ, anyị na-edozi ihe omume anyị nile iji bute ọrụ ahụ Kraịst kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ịrụ ụzọ.​—⁠2 Ndị Kọrint 5:​14, 15.

Ịnọpụ Iche n’Ụwa​—⁠Ruo n’Okè Ha Aṅaa?

13. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesighị iji chọọ òkè ọ bụla n’okpukpe nke meworo onwe ya akụkụ nke ụwa?

13 O sighị ike ịhụ ihe ndekọ Krisendọm na okpukpe ndị ọzọ nwere n’ihi na ha chọrọ ịbụ akụkụ nke ụwa. E jiwo ego chọọchị mee ihe ịkwado ihe omume mgbanwe. Ndị ụkọchukwu aghọwo ndị agha nzuzo. Kwa ụbọchị, akwụkwọ akụkọ dị iche iche na-akọ banyere òtù okpukpe ndị kewapụrụ ekewapụ n’akụkụ ụwa dị iche iche ndị na-alụsorịta ibe ha ọgụ. Ọbara na-atasịsị ha n’aka. (Aịsaịa 1:15) Gburugburu ụwa kwa, ndị ụkọchukwu anọgidewo na-agbalị ịchịkwa ọgbọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Aka ndị na-efe ezi ofufe adịghị na nke a.​—⁠Jemes 4:​1-⁠4.

14. (a) Gịnị ka anyị na-aghaghị izere n’onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-anọpụ n’ụwa? (b) Gịnị pụrụ inyere anyị aka izere ịbụ ndị àgwà na omume nke ụwa matara n’ọnyà?

14 Ma ịnọpụ iche n’ụwa gụnyere ihe karịrị nke ahụ. Ihe e ji mara ụwa bụ ịhụ ego na ihe ego pụrụ ịzụta n’anya, ọchịchọ ịbụ onye a ma ama, na oké nchụso nke ihe ụtọ, tinyere ihe ndị dị ka enweghị ezi nchegbu maka ndị ọzọ, ịgha ụgha na okwu nkwulu, inupụrụ ọchịchị isi, na enweghị njide onwe onye. (2 Timoti 3:2-⁠5; 1 Jọn 2:​15, 16) N’ihi ezughị okè nke onwe anyị, anyị pụrụ mgbe ụfọdụ igosipụta ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ n’ụzọ ụfọdụ. Gịnị pụrụ inyere anyị aka na mgba anyị na-agba izere ọnyà ndị ahụ? Ọ dị anyị mkpa ịdị na-echetara onwe anyị onye nọ ihe ahụ nile n’azụ. “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) N’agbanyeghị otú ịgbaso ụzọ ụfọdụ pụrụ isi yie ihe na-adọrọ adọrọ, n’agbanyeghị mmadụ ole na-ebi ndụ n’ụzọ dị otú ahụ, mgbe anyị hụrụ onye iro bụ isi nke Jehova, bụ́ Setan bụ Ekwensu ka ọ nọ n’azụ ya, anyị ga-aghọta otú ọ jọruru ná njọ n’ezie.​—⁠Abụ Ọma 97:10.

Ruo Oké Ha Aṅaa Ka Ịhụnanya Gị Na-eru?

15. Olee otú ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nke ị hụrụ si nyere gị aka ịmata ezi okpukpe ahụ?

15 Mgbe mbụ ị malitere isonyere Ndịàmà Jehova, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịhụnanya dị n’etiti ha masịrị gị n’ihi ịdị iche ya n’ebe mmụọ nke ụwa dị. Imesi ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị ike na-eme ka ezi ofufe nke Jehova dị iche n’ebe ụdị ofufe ndị ọzọ nile dị. Ọ pụrụ ịbụ na nke a bụ ihe mere ka i kweta na Ndịàmà Jehova na-ekpe ezi okpukpe ahụ n’ezie. Jisọs Kraịst n’onwe ya kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”​—⁠Jọn 13:35.

16. Ohere dịgasị aṅaa pụrụ ịdịrị anyị n’otu n’otu ịgbasapụwanye n’ịhụnanya anyị?

16 È ji àgwà ahụ amatakwa gị dị ka otu n’ime ndị na-eso ụzọ Kraịst? Ị̀ pụrụ ịgbasapụwanye n’ụzọ ọ bụla n’igosipụta ịhụnanya gị? Ihe ịrụ ụka adịghị ya, anyị nile pụrụ. E nwere ihe ndị ọzọ ọ gụnyere karị imeso ndị ọzọ omume enyi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụkwa na anyị ga na-egosi nanị ndị hụrụ anyị n’anya ịhụnanya, anyị si aṅaa dị iche n’ebe ụwa dị? “Nke bụ isi ihe nile meenụ ka ịhụnanya ahụ unu na-ahụrịta onwe unu dị ike,” ka Bible na-agba ume ya. (1 Pita 4:8) Ònye ka anyị pụrụ igosi ịhụnanya ka ukwuu? Ọ̀ bụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị bụ onye Kraịst onye ọnọdụ ya dị iche na nke anyị, onye ụzọ o sikwa eme ihe ụfọdụ na-akpasu anyị iwe? Ọ̀ bụ onye na-enwebeghị ike ịbịachi ọmụmụ ihe anya n’ihi ọrịa ma ọ bụ ime agadi? Ọ̀ bụ di ma ọ bụ nwunye anyị? Ka ọ̀ bụ ma eleghị anya, ndị mụrụ anyị meworo agadi? Ụfọdụ ndị na-eme nke ọma n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ahụ, gụnyere ịhụnanya, chere na ha na-amụgharị ihe ndị a ọzọ mgbe ọnọdụ ndị siri oké ike, ndị pụrụ ibilite n’inye onye òtù ezinụlọ na-enwekwaghị ike ime ihe ọ bụla nlekọta zuru ezu chere ha ihu. Otú ọ dị, ọbụna mgbe ọnọdụ ndị a chere anyị ihu, ịhụnanya anyị kwesikwara ịgabiga ezinụlọ anyị.

Ịgba Àmà Alaeze​—⁠Ruo Oké Ha Aṅaa ka Ọ Di Mkpa Nye Gị?

17. Ọ bụrụ na anyị eritewo uru n’onwe anyị site ná nleta nke Ndịàmà Jehova, gịnị ka e kwesịrị ịkwali anyị ime ugbu a?

17 Otu ụzọ dị mkpa anyị si egosipụta ịhụnanya maka mmadụ ibe anyị bụ site n’ịgbara ha àmà banyere Alaeze Chineke. Ọ bụ nanị otu ìgwè na-arụ ọrụ nke a Jisọs buru amụma ya. (Mak 13:10) Ọ bụ Ndịàmà Jehova. Anyị eritewo uru n’onwe anyị site na ya. Ugbu a ọ bụ ihe ùgwù anyị nwere inyere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na anyị nwere echiche Chineke n’okwu ahụ, ọrụ a ga-ebute ụzọ ná ndụ anyị.

18. Olee otú anyị ịgụ akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses​—⁠Proclaimers of God’s Kingdom pụrụ isi metụta okè anyị na-ekere n’onwe anyị n’ịgba àmà Alaeze?

18 A kọrọ akụkọ na-akpali akpali nke otú e siworo buru ozi Alaeze ahụ gaa n’akụkụ kasị dị anya nke elu ala n’oge ikpeazụ ndị a n’akwụkwọ ahụ bụ́ Jehovah’s Witnesses​—⁠Proclaimers of God’s Kingdom. Ọ bụrụ na ị maara agụ bekee, ahapụla ịgụ ya. Ka ị na-emekwa otú ahụ, rịba ama n’ụzọ pụrụ iche, ụzọ nile ndị mmadụ n’otu n’otu siworo kere okè n’ịgba àmà banyere Alaeze ahụ. È nwere ndị ị pụrụ ịṅomi ihe nlereanya ha? E nwere ọtụtụ ohere ndị ghere oghe nye anyị nile. Ka ịhụnanya anyị maka Jehova kpalie anyị iji ha mee ihe n’ụzọ dị mma.

19. Olee otú anyị si erite uru mgbe anyị nakweere ibu ọrụ nke ya na ịmata ezi okpukpe ahụ na-eso?

19 Mgbe anyị si otú a mikpuo onwe anyị n’ime uche Jehova, anyị na-achọta azịza nye ajụjụ ahụ bụ́, Gịnị bụ nzube nke ndụ? (Mkpughe 4:11) Anyị adịkwaghị asọgharị ìsì, ndị a hapụrụ ná mmetụta nke ịtọgbọ chakoo. Ọ dịghị ọrụ nke ị pụrụ ịrara onwe gị nye na ya nke pụrụ iweta afọ ojuju ka ukwuu karịa nke iji obi dum mikpuo onwe gị n’ozi Jehova Chineke pụrụ iweta. Leekwa ọdịnihu dị ebube nke o nwere inye! Ndụ na-eju afọ nke na-adịghị agwụ agwụ n’ime ụwa ọhụrụ ya, ebe anyị ga-enwe ike iji ikike anyị nile mee ihe n’ụzọ zuru ezu n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ịhụnanya ahụ Chineke ji n’ihi ya kee ihe a kpọrọ mmadụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ndị bipụtara ya bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị óké mkpa nye okpukpe ịnakwere Bible dị ka Okwu Chineke ma na-asọpụrụ Jehova dị ka ezi Chineke ahụ?

◻ Gịnị ka ezi okpukpe na-akụzi banyere okè Jisọs dị ka Onye Mgbapụta?

◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ga-eji nọpụ iche n’ụwa ma na-egosi ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye?

◻ Olee ọrụ ịgba àmà Alaeze na-arụ n’ezi okpukpe?

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Baptism bụ nzọụkwụ dị óké mkpa n’ịnakwere ibu ọrụ dị iche iche nke ezi ofufe. Kwa ọnwa, ihe dị ka 25,000 mmadụ gburugburu ụwa na-ewere nzọụkwụ ahụ

Russia

Senegal

Papua New Guinea

U.S.A.

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Isoro ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu nile nke Bible bụ akụkụ nke ezi ofufe

U.S.A.

Brazil

U.S.A.

Hong Kong

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya