Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Dị ka Ndị Galetia 6:8 ná nsụgharị “New World Translation” na-ekwu, “onye na-eburu anụ ahụ ya n’uche na-agha mkpụrụ ga-esite n’anụ ahụ ya weta mmebi dị ka ihe ubi, ma onye na-eburu mmụọ n’uche na-agha mkpụrụ ga-esite na mmụọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.” Olee “mmụọ” nke e bu n’uche, oleekwa otú anyị pụrụ isi site na ya weta ndụ dị ka ihe ubi?
Okwu Hibru na Grik ndị a kpọrọ “mmụọ” nwere ihe dị iche iche ha pụtara, dị ka: (1) ike ọrụ Chineke, (2) ike ndụ dị n’ime ụmụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ, (3) ike mkpali uche mmadụ, na (4) onye bụ́ mmụọ, ma ọ bụ mmụọ ozi. Nke mbụ n’ime ndị a—ike ọrụ Chineke—bụ nghọta anyị na-ahụ ná Ndị Galetia 6:8.
Iji ghọta ihe a na-ekwu, rịba ama Ndị Galetia 3:2 (NW), ebe anyị hụtara ojiji mbụ e ji okwu ahụ bụ́ “mmụọ” mee ihe n’akwụkwọ Ndị Galetia. Pọl jụrụ ndị Kraịst, sị: “Ùnu natara mmụọ ahụ n’ihi ọrụ nile nke iwu ka ọ bụ n’ihi ọnụnụ ntị site n’okwukwe?” E mesịa, ná Ndị Galetia 3:5 (NW), o jikọtara “mmụọ” ahụ na ịrụ ọrụ ndị dị ike. Ya mere “mmụọ” nke ọ na-akpọtụ uche n’ebe a bụ mmụọ nsọ, ike ọrụ Chineke a na-adịghị ahụ anya.
E mesịa, ná Ndị Galetia 5:16 (NW), Pọl gosiri ọdịiche dị n’etiti mmụọ na anụ ahụ. Anyị na-agụ: “Asị m, Na-ejegharịnụ site na mmụọ, unu agaghị emezukwa agụụ nke anụ ahụ ma ọlị.” N’ikwu “agụụ nke anụ ahụ” o bu n’uche anụ ahụ mmadụ na-eme mmehie. Ya mere, ná Ndị Galetia 5:19-23 (NW), o depụtara “ọrụ nile nke anụ ahụ” n’ụzọ igosi ọdịiche ya na “mkpụrụ nke mmụọ.”
Ya mere, ná Ndị Galetia 6:8, onye nke “na-eburu anụ ahụ ya n’uche na-agha mkpụrụ” aghaghị ịbụ onye kwere ka ọchịchọ nile nke mmehie nke mmadụ na-edu ya, na-emikpu ‘n’ọrụ nile nke anụ ahụ.’ Ọ pụrụ inwe ahụmahụ nke mmetụta na-emerụ emerụ nke àgwà dị otú ahụ, ọ bụrụkwa na ọ gbanweghị, o doro anya na ọ gaghị enweta ndụ n’ime ma ọ bụ n’okpuru Alaeze Chineke.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
Dị ka ndị Kraịst ji ihe kpọrọ ihe anyị kwesịrị ịchọ ịdị ‘na-eburu mmụọ Chineke n’uche na-agha mkpụrụ.’ Nke ahụ gụnyere ibi ndụ kwekọrọ n’ụzọ na-enyere mmụọ nsọ ohere inwere onwe ya ịrụ ọrụ ná ndụ anyị, na-enyere anyị aka igosipụta mkpụrụ ya. Anyị kwesịrị iburu nke ahụ n’uche mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-agụ ma ọ bụ ihe omume telivishọn nke anyị ga-ekiri. Anyị na-agha mkpụrụ nye mmụọ ka anyị na-aṅa ntị ná nzukọ nile nke ọgbakọ ma na-agbalị itinye ndụmọdụ nke ndị okenye e ji mmụọ họpụta n’ọrụ.—Ọrụ 20:28.
N’ụzọ na-akpali mmasị, Ndị Galetia 6:8 mechiri ná nkwa bụ na ka anyị na-eme ihe ndị dị otú ahụ, anyị ga-anọ n’ọnọdụ ‘isite ná mmụọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.’ Ee, ná ndabere nke ihe mgbapụta Kraịst, Chineke ga-eme ka e nwee ndụ agwụghị agwụ site n’ọrụ nke mmụọ nsọ.—Matiu 19:29; 25:46; Jọn 3:14-16; Ndị Rom 2:6, 7; Ndị Efesọs 1:7.