Ikike Ndọrọ—Ịja Mma Nye Mmadụ Ka Ọ Bụ Otuto Nye Chineke?
“ONYE ọchịchị kwesịrị ịka ndị ọ na-achị ọ bụghị nanị n’ihe banyere ịka ha mma n’ezie, kama na o kwesịkwara ịkụ ha otu ụdị ọgwụ,” ka Xenophon, bụ́ ọchịagha Gris a ma ama, dere. Taa, ọtụtụ ga-akpọ ụdị “ọgwụ” ahụ ikike ndọrọ.
Otú ọ dị, ọ bụghị ndị ọchịchị nile bụ́ mmadụ nwere ikike ndọrọ. Ma ndị nwere ya na-eji ikike ha na-akpali nsọpụrụ ma na-eme ka ìgwè mmadụ na-eme ihe masịrị ha. Ikekwe ihe atụ kasị njọ e nwere na nso nso a bụ Adolf Hitler. “[Na 1933] nye ihe ka ọtụtụ ná ndị Germany Hitler nwere—ma ọ bụ nwa mgbe nta ga-enwe—ọdịdị nke ezi onye ndú na-adọrọ adọrọ,” ka William L. Shirer na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ The Rise and Fall of the Third Reich. “Ha gaje iso ya n’ìsì, dị ka a ga-asị na o nwere echiche Chineke, ruo afọ iri na abụọ ọzọ juru n’ọgba aghara.”
Akụkọ ihe mere eme nke okpukpe jupụtakwara ná ndị ndú na-adọrọ adọrọ bụ́ ndị kpaliri ndị mmadụ ịrara onwe ha nye ha ma bụrụ ndị wetaara ụmụazụ ha ọdachi. “Kpachara anya ka mmadụ ọ bụla ghara iduhie gị,” ka Jisọs dọrọ aka ná ntị, “n’ihi na ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m na-asị ‘Abụ m Kraịst ahụ’, ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị.” (Matiu 24:4, 5, Phillips) Ndị Kraịst ụgha na-adọrọ adọrọ apụtaghị nanị na narị afọ mbụ. N’afọ ndị 1970, Jim Jones kpọrọ onwe ya “mesaịa nke People’s Temple.” A kọwara ya dị ka “onye chọọchị na-adọrọ adọrọ” nke nwere “ike dị egwu n’ahụ ndị mmadụ,” na 1978 kwa ọ kpaliri otu n’ime ìgwè mmadụ igbu onwe ha kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme.a
N’ụzọ doro anya, ikike ndọrọ pụrụ ịbụ onyinye dị ize ndụ. Otú ọ dị, Bible na-ekwu banyere ụdị onyinye ndị dị iche, site n’aka Chineke, bụ́ ndị mmadụ nile pụrụ inweta maka abamuru mmadụ nile. Okwu Grik maka onyinye a bụ khaʹri·sma, ọ pụtakwara ugboro 17 na Bible. Otu ọkà mmụta Grik na-akọwa ya dị ka ‘onyinye e nyere n’efu na nke na-erughịrị mmadụ, ihe e nyere mmadụ nke ọ na-arụghị ọrụ maka ya ma ghara ikwesị ya, ihe sitere n’amara Chineke nakwa nke mgbalị mmadụ na-apụtụghị ịrụta ma ọ bụ inweta.’
Ya mere site n’echiche Akwụkwọ Nsọ, khaʹri·sma bụ onyinye a natara anata, n’ebere Chineke na-erughịrị mmadụ. Olee ụfọdụ n’ime onyinye ndị a Chineke jiworo obiọma nye anyị? Oleekwa otú anyị pụrụ isi jiri ha mee ihe iji nye ya otuto? Ka anyị tụlee atọ n’ime onyinye ọma ndị a.
Ndụ Ebighị Ebi
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na onyinye kasị ukwuu bụ onyinye nke ndụ ebighị ebi. Pọl degaara ọgbakọ dị na Rom akwụkwọ, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye amara [khaʹri·sma] nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) O kwesịrị ịrịba ama na “ụgwọ ọrụ” ahụ (ọnwụ) bụ ihe anyị rụtaworo, ọ bụ ezie na ọ bụghị ọchịchọ anyị, site n’ọdịdị mmehie anyị. N’aka nke ọzọ, ndụ ebighị ebi nke Chineke na-enye bụ ihe na-erughịrị mmadụ ma ọlị nke ọ na-adịghị mgbe anyị pụrụ ịrụta ya n’onwe anyị.
E kwesịrị iji onyinye nke ndụ ebighị ebi kpọrọ oké ihe ma kerịta ya. Anyị pụrụ inyere ndị mmadụ aka ịmara Jehova, ijere ya ozi ma si otú ahụ bụrụ ndị e gosiri ihu ọma site n’onyinye nke ndụ ebighị ebi. Mkpughe 22:17 na-asị: “Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”
Olee otú anyị pụrụ isi duje ndị ọzọ ná mmiri a na-enye ndụ? N’ụzọ bụ isi site n’iji Bible eme ihe na-aba uru n’ozi anyị. Ọ bụ eziokwu na n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, o siri ike ndị mmadụ ịgụ ma ọ bụ iche echiche banyere ihe ime mmụọ; ka o sina dị, mgbe nile e nwere ohere ‘ịkpọte ntị’ mmadụ. (Aịsaịa 50:4) Banyere nke a, anyị pụrụ inwe obi ike n’ike na-akpali akpali nke Bible, “n’ihi na okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Ma ọ bụ ezi amamihe nke Bible, nkasi obi na olileanya ọ na-enye, ma ọ bụ nkọwa ya banyere nzube nke ndụ, Okwu Chineke pụrụ imetụ obi ma tinye ndị mmadụ n’ụzọ nke ndụ.—2 Timoti 3:16, 17.
Tụkwasị na nke ahụ, akwụkwọ ndị dabeere na Bible pụrụ inyere anyị aka ịsị “Bịa.” Aịsaịa onye amụma kwuru na n’oge ọchịchịrị ime mmụọ a, “Jehova ga-awa dị ka anyanwụ” n’ahụ ndị ya. (Aịsaịa 60:2) Mbipụta dị iche iche nke Watch Tower Society na-egosipụta ngọzi a sitere n’aka Jehova, afọ nile kwa ha na-eduje ọtụtụ puku mmadụ n’ebe Jehova nọ, bụ́ Isi Iyi nke nghọta ime mmụọ. Na peji ha nile, a dịghị eme ka ndị mmadụ pụta ìhè. Dị ka okwu mmalite nke Ụlọ Nche na-akọwa, “nzube Ụlọ Nche bụ ibuli Jehova Chineke elu dị ka Eze Onyenwe eluigwe na ala. . . . Ọ na-agba ume inwe okwukwe n’ime Eze Chineke ahụ nke na-achị achị ugbu a, bụ́ Jisọs Kraịst, onye ọbara ya a wụsịrị megheere ihe a kpọrọ mmadụ ụzọ inweta ndụ ebighị ebi.”
Onye Kraịst na-eje ozi oge nile, bụ́ onye ruo ọtụtụ afọ nweworo ihe ịga nke ọma dị ịrịba ama n’ozi ya, na-ekwu banyere uru nke Ụlọ Nche na Teta! n’inyere ndị mmadụ aka ịbịarute Chineke nso: “Mgbe ndị m na-amụrụ Bible malitere ịgụ na ịnụ ụtọ Ụlọ Nche na Teta!, ha na-enwe ọganihu dị ngwa. M na-ahụ magazin ndị ahụ dị ka ihe enyemaka bara oké uru n’inyere ndị mmadụ aka ịbịa mara Jehova.”
Ihe Ùgwù Ije Ozi
Timoti bụ onye Kraịst na-eso ụzọ nke e nyere onyinye ọzọ kwesịrị ka e lebara ya anya pụrụ iche. Pọl onyeozi gwara ya, sị: “Elefula onyinye amara [khaʹri·sma] ahụ nke dị n’ime gị anya, nke e sitere n’ibu amụma, ya na ibikwasị aka n’isi nke ndị bụ okenye, nye gị.” (1 Timoti 4:14) Gịnị bụ onyinye a? Ọ gụnyere nhọpụta Timoti dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ihe ùgwù ije ozi nke ọ ga-elekọta nke ọma. N’otu akụkụ okwu ahụ, Pọl gbara Timoti ume, sị: “Na-aṅa ntị ọgụgụ akwụkwọ gị na ịdụ ọdụ gị na ozizi gị. Rịba onwe gị na ozizi gị ama. Na-anọgide n’ihe ndị a; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.”—1 Timoti 4:13, 16.
Ọ dịkwa ndị okenye taa mkpa iji ihe ùgwù ije ozi ha kpọrọ ihe. Dị ka Pọl rụtụrụ aka, otu ụzọ ha pụrụ isi mee nke a bụ site ‘n’ịṅa ntị n’ozizi ha.’ Kama iṅomi ndị ndú ụwa na-adọrọ adọrọ, ha na-adọrọ uche gaa n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị n’ebe ha onwe ha nọ. Jisọs, bụ́ Onye Nlereanya ha, bụ onye ozizi pụrụ iche onye ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na o nwere ọdịdị na-adọ adọ, ma o ji obi umeala nye Nna ya otuto. “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke Onye zitere m,” ka o kwuru.—Jọn 5:41; 7:16.
Jisọs nyere Nna ya nke eluigwe otuto site n’iji Okwu Chineke eme ihe dị ka ebe o si enweta ozizi ya. (Matiu 19:4-6; 22:31, 32, 37-40) N’otu aka ahụ Pọl mesiri ike mkpa ọ dị ndị nlekọta ‘ijide okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi nke dị ka ozizi ha si dị.’ (Taịtọs 1:9) Site n’ime ka okwu ha daberesie ike n’Akwụkwọ Nsọ, ndị okenye, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ga na-asị dị ka Jisọs sịrị: “Okwu Mụ onwe m na-agwa unu ekwughị m n’Onwe m.”—Jọn 14:10.
Olee otú ndị okenye pụrụ isi ‘jide okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi’? Site n’ihiwe okwu ha na ihe omume nzukọ ha isi n’Okwu Chineke, na-akọwa ma na-emesi akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ha ji na-eme ihe ike. Ihe atụ na-akpali akpali ma ọ bụ ụka bụ ilu na-atọ ọchị, karịsịa ọ bụrụ na e mebiga ha ókè, pụrụ ịdọpụ uche ndị na-ege ntị n’Okwu Chineke ma dọrọ uche gaa n’ikike nke ọkà okwu ahụ. N’aka nke ọzọ, amaokwu Bible bụ ihe ga-eru n’obi ma kpalie ndị na-ege ntị. (Abụ Ọma 19:7-9; 119:40; tụlee Luk 24:32.) Okwu ndị dị otú ahụ adịghị adọrọcha uche gaa n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ọ na-enyekwukwa Chineke otuto.
Ụzọ ọzọ ndị okenye pụrụ isi ghọọ ndị ozizi ka irè bụ site n’ịmụta ihe n’aka ibe ha. Dị ka Pọl nyeere Timoti aka, otú a ka otu okenye pụrụ isi nyere okenye ọzọ aka. “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” (Ilu 27:17; Ndị Filipaị 2:3) Ndị okenye na-erite uru site n’ikerịta echiche na aro. Otu okenye a họpụtara n’oge na-adịbeghị anya kọwara: “Otu okenye nweworo ahụmahụ wepụtara oge igosi m otú ọ na-esi ahazi okwu ihu ọha. Ná nkwadebe ya, ọ na-agbakwụnye ajụjụ ndị na-akpali echiche, ihe atụ, ihe nlereanya, ma ọ bụ ahụmahụ ndị dị mkpirikpi, nakwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị o jiworo nlezianya nyochaa. Amụtawo m n’aka ya otú m ga-esi etinye ihe dị iche iche n’okwu m iji zere ikwu okwu na-agbụ agbụ, nke na-agwụ ike.”
Ọ dị anyị nile bụ́ ndị nwere ihe ùgwù ije ozi mkpa, ma ànyị bụ ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi, ma ànyị bụ ndị ọsụ ụzọ, iji onyinye anyị kpọrọ oké ihe. Nwa mgbe nta tupu ọnwụ ya, Pọl chetaara Timoti ‘ime ka onyinye amara [khaʹri·sma] nke Chineke nwuru ọkụ, bụ́ nke dị n’ime ya,’ nke n’ọnọdụ Timoti gụnyere ụfọdụ onyinye pụrụ iche nke mmụọ nsọ. (2 Timoti 1:6) N’ebe obibi ndị Israel, ọkụ na-abụkarị nanị icheku na-eke ọkụ. O kwere omume ‘ime ka ha nwuru ọkụ’ iji mepụta ire ọkụ na okpomọkụ ka ukwuu. Otú a a na-agba anyị ume itinye obi na ume anyị n’ọrụ e kenyere anyị, na-afụnwu dị ka ọkụ onyinye ime mmụọ ọ bụla e nyeworo anyị.
Onyinye Ime Mmụọ Ndị A Ga-ekerịta
Ịhụnanya Pọl nwere maka ụmụnna ya nọ na Rom kpaliri ya ide, sị: “Ịhụ unu anya na-agụsi m ike, ka m wee mee ka unu keta onyinye amara [khaʹri·sma] ụfọdụ nke Mmụọ Nsọ, ka e wee mee ka unu guzosie ike; nke ahụ bụ, ka e wee kasie mụ na unu obi n’etiti unu, site n’okwukwe anyị kwekọrọ, ma nke unu ma nke mụ onwe m.” (Ndị Rom 1:11, 12) Pọl weere ikike anyị nwere ime ka okwukwe ndị ọzọ sie ike site n’anyị ịgwa ha okwu dị ka onyinye ime mmụọ. Inyerịta ụdị onyinye ime mmụọ dị otú ahụ ga-arụpụta ịkwagide okwukwe na ịgbarịta ume.
Nke a dịkwa mkpa n’ezie. N’ajọ usoro ihe a nke anyị bi n’ime ya, anyị nile na-ezute nchegbu n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Otú ọ dị, ịgbarịta ume mgbe nile pụrụ inyere anyị aka ịtachi obi. Echiche nke inyerịta ihe—ma inye enye ma ịnara anara—dị mkpa iji nọgide na-enwe ume ime mmụọ. N’eziokwu, agbamume dị anyị nile mkpa site n’oge ruo n’oge, ma anyị nile nwekwara ike iwulite ibe anyị elu.
Ọ bụrụ na anyị mụ anya ịmata ndị kwere ekwe ibe anyị nwere nkụda obi, anyị ‘pụrụ isite ná nkasi obi nke Chineke ji kasie anyị onwe anyị obi kasie ndị ahụ obi bụ́ ndị nọ ná mkpagbu ọ bụla.’ (2 Ndị Kọrint 1:3-5) Okwu Grik maka nkasi obi (pa·raʹkle·sis) pụtara n’ụzọ nkịtị “ọkpụkpọ òkù n’akụkụ mmadụ.” Ọ bụrụ na, mgbe ọ dị mkpa, anyị nọ n’akụkụ inyere nwanna anyị nwoke ma ọ bụ nwanna anyị nwanyị aka, ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị onwe anyị ga-enweta otu nkwado ịhụnanya ahụ mgbe anyị nọ ná mkpa.—Eklisiastis 4:9, 10; tụlee Ọrụ 9:36-41.
Nleta ọzụzụ atụrụ nke ndị okenye bakwara oké uru. Ọ bụ ezie na e nwere oge ndị a na-eme nleta iji nye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’okwu chọrọ nlebara anya, ihe ka ọtụtụ ná nleta ọzụzụ atụrụ bụ oge ndị e ji enye agbamume, ‘nkasi obi.’ (Ndị Kọlọsi 2:2) Mgbe ndị nlekọta mere nleta ndị ahụ na-ewusi okwukwe ike, ha na-enye onyinye ime mmụọ n’ezie. Dị ka Pọl, ha ga-ahụta ụdị a pụrụ iche nke inye ihe dị ka ihe na-enye ụgwọ ọrụ, ha ga-azụlitekwa ‘agụụ’ maka ụmụnna ha.—Ndị Rom 1:11.
Nke a bụ eziokwu n’ọnọdụ nke otu okenye na Spain, onye na-akọ ahụmahụ na-esonụ: “Ricardo, nwa okoro gbara afọ 11, yiri ka ọ na-egosi obere mmasị ná nzukọ na n’ọgbakọ n’ozuzu ya. Ya mere anaara m nne na nna Ricardo ikike ileta nwa ha, ha kwekwara ozugbo. Ha bi n’ugwu ebe na-ewe ihe dị ka njem otu hour n’ụgbọala site n’ebe obibi m. O doro anya na Ricardo nwere obi ụtọ ịhụ mmasị m nwere n’ebe ọ nọ, ọ zaghachikwara n’atụfughị oge. Ọ ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptism n’oge na-adịghị anya nakwa onye òtù dị ike nke ọgbakọ. Ọdịdị imesapụ ahụ n’obi ụtọ nọchiri àgwà ime ihere ya. Ọtụtụ n’ọgbakọ jụrụ: ‘Gịnị mere Ricardo?’ O yiri ka ha hụrụ ya na nke mbụ ya. N’ịtụgharị uche ná nleta ọzụzụ atụrụ ahụ dị mkpa, m na-eche na mụ eritewo ihe karịa Ricardo. Mgbe ọ batara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ihu ya na-egbukepụ, ọ na-agbarakwa bịa ikele m. Ọ bụrụwo ihe ọṅụ ịhụ ọganihu ime mmụọ ya.”
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a na-agọzi nleta ọzụzụ atụrụ, ndị dị ka nke a, n’ụba. Nleta ndị dị otú ahụ na-ekwekọ n’arịrịọ Jisọs: “Na-azụ atụrụ m.” (Jọn 21:16) Otú ọ dị, ndị okenye abụghị nanị ha pụrụ inye onyinye ndị dị otú ahụ. Onye ọ bụla n’ọgbakọ pụrụ ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma n’ime ndị ọzọ. (Ndị Hibru 10:23, 24) Dị ka a na-ekekọta ndị na-arị elu bụ́ ndị na-arị ugwu, otú ahụ ka nkekọ ime mmụọ si na-ejikọ anyị ọnụ. N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, ihe anyị na-eme ma na-ekwu na-emetụta ndị ọzọ. Okwu ndị dị njọ ma ọ bụ nkatọ siri ike pụrụ ịdọbi nkekọ ahụ nke na-ejikọ anyị. (Ndị Efesọs 4:29; Jemes 3:8) N’aka nke ọzọ, okwu agbamume a họọrọ nke ọma na enyemaka ịhụnanya pụrụ inyere ụmụnna anyị aka imeri ihe isi ike ha. N’ụzọ dị otú a anyị ga na-ekere òkè n’onyinye ime mmụọ nke nwere uru na-adịgide adịgide.—Ilu 12:25.
Igosipụta Ebube Chineke n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Ka Ukwuu
O doro anya na onye Kraịst ọ bụla nwere otu ọ̀tụ̀tụ̀ nke ikike ndọrọ. E nyewo anyị olileanya dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndụ ebighị ebi. Anyị nwekwara onyinye ime mmụọ nke anyị pụrụ isoro ibe anyị kerịta. Anyị pụkwara ịgbalị ịkpasu ma ọ bụ ịkpali ndị ọzọ ime ihe kwesịrị ekwesị. Ụfọdụ nwere onyinye ndị ọzọ n’ụdị nke ihe ùgwù ije ozi. Onyinye ndị a nile bụ ihe àmà nke ebere Chineke na-erughịrị mmadụ. Ebe ọ bụkwa na onyinye ọ bụla anyị pụrụ inwe bụ ihe anyị nataworo n’aka Chineke, n’ezie anyị enweghị ihe mere anyị ga-eji etu ọnụ.—1 Ndị Kọrint 4:7.
Dị ka ndị Kraịst, ọ dị mma ịjụ onwe anyị, ‘M̀ ga-eji ọ̀tụ̀tụ̀ ọ bụla nke ikike ndọrọ m pụrụ inwe mee ihe iji nye Jehova, bụ́ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè,” otuto? (Jemes 1:17) M̀ ga-eṅomi Jisọs ma jeere ndị ọzọ ozi dị ka ikike na ọnọdụ m si dị?’
Pita onyeozi chịkọtara ibu ọrụ anyị n’akụkụ nke a, sị: “Dị ka unu nile n’otu n’otu natara onyinye amara [khaʹri·sma], werenụ ihe ahụ na-ejerịtara onwe unu ozi, dị ka ndị na-achị ezinụlọ nke ọma n’amara Chineke nke dị n’ụzọ dị iche iche; ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ekwu okwu, ya kwuo dị ka okwu nke si Chineke n’ọnụ pụta; ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eje ozi, ya jee dị ka o sitere n’ike ahụ Chineke na-enyezu: ka e wee nye Chineke otuto n’ihe nile site n’aka Jisọs Kraịst.”—1 Pita 4:10, 11.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ngụkọta mmadụ 913 nwụrụ, tinyere Jim Jones n’onwe ya.
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 23]
Corbis-Bettmann
UPI/Corbis-Bettmann