Ekwela Ka Ikike Gị Ghọọ Adịghị Ike Gị
N’ịbụ nke nwere nkebi 16 ndị mmiri na-apụghị ịbanye n’ime ha, e lere ụgbọ mmiri ndị oké ozu ahụ bụ́ Titanic anya dị ka nke na-apụghị imi emi. Ná nke mbụ o sere na mmiri na 1912, o bu nanị ihe dị ka ọkara nke ọnụ ọgụgụ a chọrọ nke ụgbọ epeepe ndị e ji azọpụta ndụ. Ụgbọ mmiri ahụ kụkaara otu nnukwu ice ma mie, na-ala ndụ nke ihe karịrị mmadụ 1,500 n’iyi.
EZE Ụzaịa nke na-atụ egwu Chineke bụ́ onye Jerusalem oge ochie bụ ọchịagha maara ihe. Site n’enyemaka Jehova, o meriri ndị iro ya n’otu n’otu. “Aha [Ụzaịa] wee pụọ ruo ebe dị anya; n’ihi na e nyeere ya aka n’ụzọ dị ebube, ruo mgbe ọ dị ike.” Ma mgbe ahụ “obi ya dị elu . . . o wee mekpuo emekpu megide Jehova, bụ́ Chineke ya.” N’ihi mpako Ụzaịa, e tiri ya ekpenta.—2 Ihe E Mere 26:15-21; Ilu 16:18.
Ihe ndekọ abụọ a na-akụziri anyị na ikike, ọ bụrụ na e jighị amamihe, imeru ihe n’ókè, na obi umeala sonyere ya n’ụzọ ziri ezi, pụrụ ịghọ adịghị ike ma ọ bụ ibu. Nke a siri ike, n’ihi na n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ikike, ma ọ bụ onyinye ụfọdụ, anyị chọkwara ka ha bụrụ ihe ga-abara anyị na ndị ọzọ uru na ihe ga-enye anyị na ha ọṅụ, karịsịa nye Onye Okike anyị. N’ezie, anyị kwesịrị ijizu onyinye ọ bụla nke Chineke bụ́ nke anyị pụrụ inwe mee ihe ma n’otu oge ahụ na-achịkwa ya ka o wee nọgide na-abụ ihe bara uru.
Dị ka ihe atụ, onye nwere mmasị n’ọrụ ya pụrụ ime ka onyinye a bụrụ adịghị ike site n’ịghọ onye ọrụ riri ahụ. E nwere ike ọ gaghị adị mfe ịghọgbu ma ọ bụ ịghọrị onye dị akọ, ma ọ pụrụ ịdị akọ ruo n’ókè nke emeghị mkpebi ma ọlị. Ịdị nkọ bụkwa àgwà dị mma, ma a dịbiga ya ókè, nke na a naghị echetazi na a bụ mmadụ, ihe ọ ga-arụpụta pụrụ ịbụ gburugburu ebe ahụ na-adịghị eru mmadụ ala bụ́ nke na-akpata enweghị obi ụtọ. Ya mere, were oge ụfọdụ tụgharịa uche n’ikike nke gị onwe gị. Ị̀ na-achịkwa ha nke ọma? Hà bụ ngọzi nye ndị ọzọ? Karịsịa, ị̀ na-eji ha asọpụrụ Jehova, bụ́ Onye “ezi onyinye ọ bụla” sitere n’aka ya? (Jemes 1:17) Iji mezuo nke ahụ, ka anyị lerukwuo anya n’ihe atụ ole na ole ndị ọzọ nke ikike ndị pụrụ ịghọ adịghị ike, ọbụna ibu, ma ọ bụrụ na a chịkwaghị ha achịkwa.
Jiri Ikike Uche Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe
Uche dị mma bụ n’ezie ihe bara ezigbo uru. Ma, ọ pụrụ ịghọ adịghị ike ma ọ bụrụ na o duga n’inwebiga obi ike ókè ma ọ bụ mee ka anyị zụlite echiche gabigara ókè banyere onwe anyị, karịsịa ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-etobiga anyị ókè ma ọ bụ na-agwa anyị okwu ire ụtọ. Ma ọ bụ anyị nwere ike ịmalite ile Okwu Chineke na mbipụta ndị e ji amụ ihe bụ́ ndị dabeere na Bible anya dị ka ihe e ji ọgụgụ isi eso.
Inwebiga obi ike ókè pụrụ igosipụta onwe ya n’ụzọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, mgbe e nyere onye ụbụrụ ya na-aghọ nkọ ihe omume ikwu okwu n’ọgbakọ ndị Kraịst, ikekwe okwu ihu ọha ma ọ bụ okwu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ọ pụrụ ịhapụ ime nkwadebe ruo mgbe oge ruru, ma eleghị anya n’ekpeghịdị ekpere maka ngọzi Jehova. Kama nke ahụ, ọ na-atụkwasị obi n’ihe ọmụma o nwere nakwa n’ikike ya ichepụta ihe n’akwadebeghị ya akwadebe. Ikike o bu pụta ụwa nwere ike izochi ejighị ihe kpọrọ ihe ya ruo oge ụfọdụ, ma e wezụga ngọzi zuru ezu nke Jehova, ọganihu ime mmụọ ya ga-ebelata, ma eleghị anya ọbụna kwụsị. Lee mmebi nke onyinye dị mma nke ahụ bụ!—Ilu 3:5, 6; Jemes 3:1.
Onye nwere uche dị nkọ nwekwara ike ile Bible na ihe ndị na-enye aka ịmụ Bible anya dị ka ihe e ji ọgụgụ isi eso. Otú ọ dị, ihe ọmụma dị otú ahụ pụrụ nanị ‘ịfụli elu,’ ma ọ bụ na-afụli echiche anyị banyere onwe anyị elu dị ka bolombolo; ọ dịghị ‘ewuli mmekọrịta ịhụnanya nke ndị Kraịst elu.’ (1 Ndị Kọrint 8:1; Ndị Galetia 5:26) N’aka nke ọzọ, onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, n’agbanyeghị ókè ọ maruuru ihe, na-ekpe ekpere maka mmụọ Chineke ma na-atụkwasị ya obi mgbe nile. Ikike ya na-aghọkwu ihe bara uru ka ọ na-eto n’ịhụnanya, ịdị umeala n’obi, ihe ọmụma, na n’amamihe—ha nile kwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma.—Ndị Kọlọsi 1:9, 10.
Ikike ga-aghọkwa adịghị ike ma ọ bụrụ na o mee ka anyị malite inwe echiche gabigara ókè banyere onwe anyị, na-egosipụta enweghị obi umeala. Onye nwere onyinye pụrụ iche—na ndị ahụ tobigara ya ókè—pụrụ ichefu na Jehova ‘adịghị ahụ ndị nile obi ha maara ihe,’ ọ bụ ezie na ha pụrụ inwe onyinye pụrụ iche. (Job 37:24) “N’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị,” ka Okwu Chineke na-ekwu. (Ilu 11:2) Ọ bụ ezie na Pọl onyeozi maara ihe nke ukwuu ma gụọ akwụkwọ nke ọma, ọ gwara ndị Kọrint, sị: “Mụ onwe m . . . , ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu, abịaghị m n’ọkà okwu ma ọ bụ n’ọkà amamihe . . . Mụ onwe m nọkwa n’etiti unu n’adịghị ike, na n’egwu, na n’oké ịma jijiji. Okwu m na ihe m kwusara abụghịkwa n’okwu amamihe, ime ka mmadụ kwenye, kama ha bụ ná ngosi nke Mmụọ Nsọ na nke ike: ka okwukwe unu wee ghara ịdị n’amamihe mmadụ, kama n’ike nke Chineke.”—1 Ndị Kọrint 2:1-5.
A dịghị eji otú ụwa si ele ọgụgụ isi anya emegharị ezigbo onye maara ihe anya, ma ọ bụ site n’otú ụwa si akọwa ihe ịga nke ọma. Ya mere, kama iji nkà ya na-eme ka ndị mmadụ nakwere ya ma ọ bụ iji ya na-akpakọba akụ̀ na ụba nke ụwa, ọ na-enye Onye ahụ nyere ya ndụ na ikike ya, ihe kasị mma ọ pụrụ inye ya. (1 Jọn 2:15-17) Iji mezuo nke ahụ, ọ na-ebute ọdịmma Alaeze ụzọ ná ndụ ya, na-adị ka “osisi [na-amị mkpụrụ] a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri.” N’ihi ngọzi Jehova, ọ bụghị n’ihi nkà o bu pụta ụwa, “ihe ọ [bụla] nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.”—Abụ Ọma 1:1-3; Matiu 6:33.
Ka Iso Ụzọ Kraịst Tinye Ihe n’Ikike Gị
N’ọdịdị ya kpọmkwem, Iso Ụzọ Kraịst nwere ikike n’ụba nke na nkà ihe ọmụma ụwa adịghị ike ma e were ya tụnyere ya. Dị ka ihe atụ, ụzọ ndụ ndị Kraịst na-eme ka e nwee di na nwunye ndị kasị mma, ndị agbata obi kasị mma, na ndị ọrụ kasị mma—mmadụ ndị na-akwụwa aka ọtọ, nwere nkwanye ùgwù, na-eme udo, na-adịkwa uchu. (Ndị Kọlọsi 3:18-23) Tụkwasị na nke ahụ, ọzụzụ a na-enye ndị Kraịst n’ikwu okwu na n’izi ihe na-ewulite nkà nkwurịta okwu dị mma. (1 Timoti 4:13-15) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ndị were ndị Kraịst n’ọrụ na-achọkarị ha maka inyekwu ha ibu ọrụ na ibulikwu ha n’ọkwá. Ma a pụrụ iji ikike ndị dị otú ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụrụ na a chịkwaghị ha nke ọma. Mbuli n’ọkwá ma ọ bụ ọrụ na-adọrọ adọrọ e nyere mmadụ pụrụ ịpụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ ịrara onwe ya nye ụlọ ọrụ ahụ, ịhapụ nzukọ ndị Kraịst mgbe mgbe, ma ọ bụ ịchụ oge bara uru mmadụ kwesịrị iji nọnyere ezinụlọ ya n’àjà.
N’Australia, otu onye Kraịst bụ́ okenye ma nwee ezinụlọ, onye bụ́kwa ọchụ ntá ego ihe na-agara nnọọ nke ọma, “nwere ohere nke inweta akụ̀ na ụba na ùgwù.” Ma ọ jụrụ ọnwụnwa nke ịbụ aka ji akụ n’usoro ihe a. “Achọrọ m itinye oge ka ukwuu n’isoro ezinụlọ m na-anọkọ nakwa n’ozi ndị Kraịst,” ka o kwuru. “Ya mere mụ na nwunye m kwekọrịtara na m ga-eji nlezianya belata oge m na-etinye n’ọrụ ego m. N’ihi gịnị ka m kwesịrị iji na-arụ ọrụ ụbọchị ise n’izu ma ọ bụrụ na ọ dịghị m mkpa ime otú ahụ?” ka ọ gbakwụnyere. Site n’ime mgbanwe ole na ole e chebaara echiche nke ọma ná ndụ ya, onye okenye a chọpụtara na ọ ka pụrụ ịdị na-elekọta ezinụlọ ya anya site n’ịrụ ọrụ ụbọchị atọ ma ọ bụ anọ n’izu. Ka oge na-aga, a kpọrọ ya òkù ikere òkè n’ihe ùgwù ndị ọzọ nke ije ozi, dị ka ije ozi na Kọmitii Ụlọ Mgbakọ dị n’ógbè ahụ nakwa n’ilekọta mgbakọ distrikti. N’ịbụ nke e ji mee ihe n’ụzọ amamihe, ikike ya wetaara ya na ezinụlọ ya ọṅụ na afọ ojuju.
Àgwà Ziri Ezi n’Ebe Ihe Ùgwù Dị
A na-agba ndị ikom bụ́ ndị Kraịst ume iru eru maka ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbaso ọnọdụ onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya [ma ọ bụ ohu na-eje ozi], agụụ ọrụ ọma na-agụ ya.” (1 Timoti 3:1) Dị ka ọ dị n’ebe ikike ndị a kpọtụwororịị aha dị, ọ dị mkpa ka e mee ka ịdị njikere ịnakwere ibu ọrụ na ezi uche na-agakọ. Ọ dịghị onye kwesịrị iwere ọrụ dị nnọọ ọtụtụ nke na ọ dịghị enwezi ọṅụ n’ozi Jehova. Ee, mmụọ afọ ofufo dị mma, n’ezie ọ dị mkpa, n’ihi na Jehova adịghị anabata omume mmadụ etinyeghị onwe ya n’ihe; ma ịdị njikere ime ihe aghaghị igosipụtakwa imeru ihe n’ókè na “uche zuru okè.”—Taịtọs 2:12; Mkpughe 3:15, 16.
Ịdị nwayọọ, nghọta, na inwe mmetụta nke Jisọs mere ka ọbụna ndị ọnọdụ ha kasị dị ala nwee ahụ iru ala n’ebe ọ nọ. N’otu aka ahụ taa, ndị mmadụ na-enwe ahụ iru ala n’etiti ndị ikike ha bụ àgwà ọmịiko na nke ichebara ndị ọzọ echiche. N’ọgbakọ ndị Kraịst, ndị okenye dị otú ahụ na-ahụ n’anya, bụ́ ndị ọ na-adị mfe ijekwuru bụ n’ezie “onyinye n’ụdị mmadụ” dị oké ọnụ ahịa. Ha bụ “ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.”—Ndị Efesọs 4:8, NW; Aịsaịa 32:2.
Ma ndị okenye aghaghị ime ka oge ha na-etinye n’inyere ndị ọzọ aka na mkpa nke ha onwe ha maka ọmụmụ ihe onwe onye, ntụgharị uche, ekpere, na ozi ihu ọha bụrụ nke a haziri ahazi. Dị ka o kwesịrị, ọ dịkwa ndị okenye nwere nwunye mkpa iwepụta oge maka ezinụlọ ha, bụ́ ndị ha kwesịrị ime onwe ha ka ọ na-adịrị ha mfe ijekwuru karịsịa.
Nwanyị Ruru Eru —Ngọzi Magburu Onwe Ya
Dị ka ndị okenye ruru eru, ndị inyom ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe bụkwa ihe bara uru nye nzukọ Jehova. N’ozuzu ya, e nyere ndị inyom onyinye nke inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ—àgwà nke Jehova ji kpọrọ ihe ma na-agba ume ka e nwee. Na-elekwasị “anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara unu, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe metụtara ndị ọzọ,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Filipaị 2:4, NW) Ma, “mmasị onwe onye” a nwere ókè, n’ihi na ọ dịghị onye Kraịst ga-achọ ịbụ “onye na-ele ihe na-abụghị nke aka ya anya”; mmadụ ekwesịghịkwa ịbụ onye asịrị.—1 Pita 4:15; 1 Timoti 5:13.
Ndị inyom nwere ọtụtụ onyinye ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst bụ́ nwunye pụrụ inwe onyinye ọgụgụ isi karịa di ya. Ka o sina dị, dị ka “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” bụ́ onye na-atụ egwu Jehova, ọ ga-akwanyere di ya ùgwù ma jiri onyinye ya na-akwado ya, ọ bụghị iso ya na-amarịta aka. Kama inwekwa anyaụfụ ma ọ bụ iweso ya iwe, di maara ihe, nke dị umeala n’obi ga-eji ikike nwunye ya kpọrọ ihe ma nwee ọṅụ n’ihi ha. Ọ ga-agba ya ume iji nkà ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu iji wulite ezinụlọ ya na iji nyere ụmụ ya aka ịdị “na-atụ egwu Jehova,” dị nnọọ ka ya onwe ya na-eme. (Ilu 31:10, 28-30; Jenesis 2:18) Di na nwunye dị otú ahụ bụ́ ndị na-emeru ihe n’ókè ma dị obi umeala na-enwe ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye nke na-ewetara Jehova nsọpụrụ n’ezie.
Ịchịkwa Àgwà Siri Ike
Àgwà siri ike nke hiwere isi n’ezi omume na iji mkpụrụ obi dum na-eme uche Jehova pụrụ ịbụ ihe bara uru mgbe e tinyeere ya imeru ihe n’ókè na ịdị umeala n’obi. Ma, ọ pụrụ ịbụ adịghị ike ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka mmadụ na-achịkwa ma ọ bụ na-emenye ndị ọzọ ụjọ. Nke a dị otú a karịsịa n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Ndị Kraịst kwesịrị inwe ahụ iru ala mgbe ha na ibe ha nọ, gụnyere mgbe ha na ndị okenye ọgbakọ nọ.—Matiu 20:25-27.
N’otu aka ahụ, ndị okenye kwesịrị inwe ahụ iru ala mgbe ha na ndị okenye ibe ha nọ. Mgbe ha zukọtakwara ọnụ, ọ bụ mmụọ nsọ, ọ bụghị àgwà siri ike nke onwe onye, kwesịrị ịchịkwa mkpebi ha. N’ezie, mmụọ nsọ pụrụ imetụta onye okenye ọ bụla nọ n’òtù ndị okenye, gụnyere onye okenye nke a tọchara ma ọ bụ nke na-adịghị ekwucha okwu. Ya mere ndị nwere àgwà ndị ka sie ike, ọbụna mgbe ha chere na echiche ha ziri ezi, kwesịrị ịchịkwa ikike ha site n’ịmụta nkà nke ikwenye n’echiche ndị ọzọ, si otú ahụ ‘na-asọpụrụ’ ndị okenye ibe ha. (Ndị Rom 12:10) Eklisiastis 7:16 ji obiọma na-adọ aka ná ntị, sị: “Abụbigala onye ezi omume ókè; emekwala onwe gị onye mabigara ihe ókè: n’ihi gịnị ka ị ga-emebi onwe gị?”
Jehova, bụ́ Onye “ezi onyinye ọ bụla” sitere n’aka ya, na-achịkwa ikike ya n’ụzọ zuru nnọọ okè. (Jemes 1:17; Deuterọnọmi 32:4) Ọ bụkwa Onye Ozizi anyị! Ya mere ka anyị mụta ihe n’aka ya ma rụsie ọrụ ike, ma n’ịzụlite onyinye, ma ọ bụ ikike anyị bu pụta ụwa, nakwa n’iji amamihe, imeru ihe n’ókè, na ịhụnanya na-achịkwa ha. Lee ngọzi anyị ga-abụziri ndị ọzọ!
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Ọganihu ime mmụọ na-adabere n’iji ekpere na-amụ ihe nakwa n’ịdabere n’ebe Jehova nọ
[Foto dị na peeji nke 29]
Mmasị onwe onye tinyere imeru ihe n’ókè bụ ngọzi
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 26]
Site n’ikike nke The Mariners’ Museum, Newport News, VA