Bible—Akwụkwọ Pụrụ Iche
A kpọwo ya akwụkwọ kasị aga ahịa, nke ahụ zikwara ezi. E ji Bible kpọrọ ihe ma na-agụ ya karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Ruo ugbu a, a na-eme ngụkọ nkesa ya (n’ozuzu ma ọ bụ n’akụkụ ụfọdụ) ịbụ ijeri anọ n’ihe karịrị asụsụ 2,000.
Otú ọ dị, ihe na-akpali mmasị karịa nkesa Bible bụ nzọrọ ọ na-eme na ọ bụ Chineke dere ya. “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta,” ka onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere. (2 Timoti 3:16) Gịnị ka nke a pụtara? Nkebi ahịrịokwu bụ́ “si n’obi Chineke pụta” (Grik, the·oʹpneu·stos) pụtara n’ụzọ nkịtị “Chineke kunyere ume.” Okwu Grik ya na ya nwere njikọ, bụ́ pneuʹma, pụtara “mmụọ.” N’ihi ya, nzọrọ ahụ bụ na mmụọ nsọ Chineke kwaliri ndị edemede bụ́ mmadụ, na-ekunye ha ume, dị ka a pụrụ ikwu ya, nke mere ka e nwee ike n’ezie ịkpọ ihe ọ rụpụtara Okwu Chineke, ọ bụghị nke mmadụ. N’eziokwu, ọtụtụ ndị mụworo Bible na-enwe ijuanya banyere nkwekọ o nwere n’ozuzu ya, izi ezi ya n’ihe banyere sayensị, ikwu eziokwu na ezoghị ọnụ nke ndị dere ya, na nke kasị mkpa, amụma ya ndị mezurunụ—ihe ndị meworo ka ọtụtụ nde ndị na-eche echiche na-agụ ya kwenye na akwụkwọ a sitere n’ebe ka mmadụ elu.a
Ma ruo ókè hà aṅaa ka Chineke duziri odide Bible? Ụfọdụ na-ekwu na o mere Bible a kpọọ e dee. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ nanị echiche ndị dị na Bible, ọ bụghị okwu ya, sitere n’obi ya. Otú ọ dị, n’eziokwu, a pụghị ịkpara nduzi nke mmụọ nsọ ókè ịbụ nanị otu ụzọ, n’ihi na Chineke gwararịị ‘nna anyị ha okwu n’ime ndị amụma na n’ụzọ dị iche iche.’ (Ndị Hibru 1:1; tụlee 1 Ndị Kọrint 12:6.) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-enyocha ụzọ Chineke sigasị gwa ihe dị ka ndị edemede 40 bụ́ mmadụ dere Bible okwu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee peji nke 53-54, na 98-161 nke akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.