“Onye Nta” Aghọwo “Otu Puku”
“Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume.”—AỊSAỊA 60:22.
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ọchịchịrị ji ekpuchi ụwa taa? (b) Olee otú ìhè Jehova siworo na-enwu n’ahụ ndị ya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu?
“ỌCHỊCHỊRỊ na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube Ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị.” (Aịsaịa 60:2) Okwu ndị a na-akọwa ọnọdụ e nwere n’ụwa kemgbe 1919, nke ọma. Krisendọm ajụwo ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jisọs Kraịst dị ka eze, bụ́ “Ìhè nke ụwa.” (Jọn 8:12; Matiu 24:3) N’ihi “oké ọnụma” Setan, bụ́ onyeisi “ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a,” narị afọ nke 20 bụ oge kasị njọ na nke a kasị bibie ihe n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. (Mkpughe 12:12; Ndị Efesọs 6:12) Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ bi n’ọchịchịrị ime mmụọ.
2 Ma, ìhè na-enwu taa. Jehova ‘na-enwu’ n’ahụ ndị ohu ya, ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ, bụ́ ndị nnọchiteanya elu ala nke “nwanyị” eluigwe ya. (Aịsaịa 60:1, NW) Karịsịa kemgbe a tọhapụrụ ha ná ndọrọ n’agha Babilọn na 1919, ndị a egosipụtawo ebube Chineke, ha ‘emewokwa ka ìhè ha na-enwu n’ihu mmadụ.’ (Matiu 5:16) Site na 1919 ruo 1931, ìhè nke Alaeze gbukepụkwuru n’ike n’ike mgbe ndị a wepụrụ ihe mgbochi ndị fọdụrụnụ nke echiche ndị Babilọn. Ha mụbara n’ọnụ ọgụgụ ruo ọtụtụ iri puku ka Jehova mezuru nkwa ya bụ́: “Aghaghị m ịchịkọta ndị Israel fọdụrụ; n’otu ka M ga-edokọ ha dị ka ìgwè ewu na atụrụ nke Bọzra: dị ka ìgwè atụrụ n’etiti ebe ịta nrị ya; ha ga-eme oké mkpọtụ n’ihi ụba mmadụ.” (Maịka 2:12) Na 1931, ebube Jehova n’ahụ ndị ya pụtara ìhè ọbụna karị, mgbe ha nakweere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova.—Aịsaịa 43:10, 12.
3. Ò si aṅaa pụta ìhè na ìhè Jehova ga-enwu n’ahụ ndị ọzọ ma e wezụga ndị ahụ e tere mmanụ?
3 Jehova ọ̀ ga-enwu nanị n’ahụ ihe ahụ fọdụrụnụ ‘n’ìgwè atụrụ nta’ ahụ? (Luk 12:32) Ee e. Mbipụta Ụlọ Nche nke September 1, 1931, rụtụrụ aka n’ebe ìgwè ọzọ nọ. Ná nkọwa mara mma o nyere banyere Ezikiel 9:1-11, o gosipụtara na nwoke ahụ ji mpi ink nke odeakwụkwọ bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’amaokwu ndị ahụ, na-anọchite anya ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ. Olee ndị “nwoke” ahụ na-aka akara n’egedege ihu ha? Ọ bụ “atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Jọn 10:16; Abụ Ọma 37:29) Na 1935, a ghọtara ìgwè “atụrụ ọzọ” a ịbụ “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla” bụ́ ndị Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ. (Mkpughe 7:9-14) Site na 1935 ruo ugbu a, e lekwasịwo anya n’ụzọ dị ukwuu ná nchịkọta nke oké ìgwè mmadụ ahụ.
4. Olee ndị bụ́ “ndị eze” na “mba nile” ahụ e zoro aka na ha n’Aịsaịa 60:3?
4 A na-ezo aka n’ọrụ nchịkọta a n’amụma Aịsaịa mgbe ọ na-ekwu, sị: “Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze ejeruo onwu maramara nke ọwụwa gị.” (Aịsaịa 60:3) Olee ndị bụ́ “ndị eze” a na-ezo aka na ha n’ebe a? Ọ bụ ihe fọdụrụnụ n’ime 144,000 ahụ bụ́ ndị ha na Jisọs Kraịst na-eketakọ ihe n’Alaeze eluigwe, ha ebutewokwa ụzọ n’ọrụ ịgba àmà ahụ. (Ndị Rom 8:17; Mkpughe 12:17; 14:1) Taa, “mba nile,” bụ́ ndị ahụ nwere olileanya elu ala, ndị na-abịakwute Jehova maka ntụziaka ma na-akpọ ndị ọzọ òkù ime otú ahụ, dị ọtụtụ nke ukwuu karịa puku ole na ole fọdụrụ n’ihe ahụ e tere mmanụ.—Aịsaịa 2:3.
Ndị Ohu Jehova Bụ́ Ndị Na-anụ Ọkụ n’Obi
5. (a) Eziokwu ndị dị aṅaa na-egosi na ịnụ ọkụ n’obi nke ndị Jehova ebelatabeghị? (b) Olee mba ndị nwere mmụba ndị dị ịrịba ama na 1999? (Lee chaatị dị na peji nke 17-20.)
5 Lee ịnụ ọkụ n’obi Ndịàmà Jehova nke oge a gosipụtara na narị afọ nke 20 dum! N’agbanyeghịkwa nrụgide ndị na-arị elu, ịnụ ọkụ n’obi ha ebelataghị ka afọ 2000 na-eru nso. Ha ka ji iwu Jisọs bụ́: “Mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m,” kpọrọ ihe. (Matiu 28:19, 20) Ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ bụ́ ndị jechiri ozi anya n’afọ ije ozi ikpeazụ nke narị afọ nke 20 ruru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ 5,912,492. Ha ji ngụkọta dị ịrịba ama nke awa 1,144,566,849 gwa ndị ọzọ banyere Chineke na nzube ya. Ha mere nleteghachi dị 420,047,796 n’ebe ndị nwere mmasị nọ, duziekwa ọmụmụ Bible ebe obibi dị 4,433,884 n’efu. Lee ihe ndekọ magburu onwe ya nke iji ịnụ ọkụ n’obi eje ozi nke a bụ!
6. Olee ndokwa ọhụrụ e mere maka ndị ọsụ ụzọ, oleekwa mmeghachi omume e nwere?
6 Na January gara aga, Òtù Na-achị Isi mara ọkwa nke mgbanwe n’awa ole a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ. Ọtụtụ ndị ji ohere a mee ihe iji banye n’ọrụ ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ nke inyeaka. Dị ka ihe atụ, n’ime ọnwa anọ ndị mbụ nke 1999, alaka ụlọ ọrụ Netherlands natara akwụkwọ ọsụ ụzọ oge nile ji okpukpu anọ karịa nke ha natara n’otu oge ahụ n’afọ bu ụzọ. Ghana na-akọ, sị: “Kemgbe ihe mgbaru ọsọ ọhụrụ nke awa ndị ọsụ ụzọ malitere ịdị irè, ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ anyị anọgidewo na-arị elu n’esepụghị aka.” N’afọ ije ozi 1999, ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ n’ụwa nile ruru 738,343—ihe ngosipụta dị ebube nke ‘ịnụrụ ọrụ ọma ọkụ n’obi.’—Taịtọs 2:14.
7. Olee otú Jehova siworo gọzie ọrụ ndị ohu ya ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ?
7 Jehova ọ̀ gọziwo ọrụ a e ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ? Ee. Ọ na-ekwu site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “Welie anya gị abụọ lee gburugburu, hụ: ha nile achịkọtawo onwe ha, ha abịakwutewo gị: ụmụ gị ndị ikom ga-esi n’ebe dị anya bịa, a ga-ekukwa ụmụ gị ndị inyom n’akụkụ gị.” (Aịsaịa 60:4) ‘Ụmụ ndị ikom’ na ‘ụmụ ndị inyom’ e tere mmanụ bụ́ ndị a chịkọbataworo ka ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi. Ugbu a kwa, a na-achịkọta atụrụ ọzọ nke Jisọs n’akụkụ ‘ụmụ ndị ikom’ na ‘ụmụ ndị inyom’ Jehova e tere mmanụ n’ala 234 na n’àgwàetiti dị iche iche nke oké osimiri.
“Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla”
8. Olee ‘ezi ọrụ’ Ndịàmà Jehova na-arụsi ike?
8 Ndị Kraịst nwere ibu ọrụ nke ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na inyere ndị nwere mmasị aka ịghọ ndị na-eso ụzọ. Ma ‘a na-eme ka ha zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.’ (2 Timoti 3:17) N’ihi ya, ha ji ịhụnanya na-elekọta ezinụlọ ha, na-ele ọbịa, na-eletakwa ndị ọrịa. (1 Timoti 5:8; Ndị Hibru 13:16) Ndị ọrụ afọ ofufo na-ekerekwa òkè n’ọrụ ndị dị ka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze—ọrụ nke na-agbakwa àmà. Na Togo, mgbe e wusịrị otu ụlọ nzukọ, ndị nwere ibu ọrụ na chọọchị charismatic dị n’ógbè ahụ chọrọ ịmata ihe mere Ndịàmà Jehova ji nwee ike iwu ụlọ nzukọ nke ha ebe chọọchị ha na-aghaghị igo ndị mmadụ n’ọrụ n’ihi otu nzube ahụ! Togo na-akọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị bụ́ ịgba na-enwe mmetụta dị nnọọ mma n’ógbè ahụ nke na ụfọdụ ndị na-agbalị ịkwụ ụgwọ ụlọ ma ọ bụ iwu ụlọ n’ógbè ndị a gaje iwu ụlọ nzukọ.
9. Olee otú Ndịàmà Jehova siworo meghachi omume mgbe ọdachi mere?
9 Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ịrụ ụdị ezi ọrụ ọzọ. Ọdachi mere n’ọtụtụ ala n’afọ ije ozi gara aga, ugboro ugboro kwa, Ndịàmà Jehova na-abụ ndị mbụ na-abịa ebe ahụ iji nye aka. Dị ka ihe atụ, Oké Ifufe Mitch mebiri akụkụ ka ukwuu nke Honduras. Ngwa ngwa, alaka mba ahụ guzobere kọmitii na-ahụ maka ọnọdụ mberede iji hazie maka ọrụ enyemaka. Ndịàmà nọ na Honduras nakwa n’ọtụtụ ala ndị ọzọ nyere uwe, ihe oriri, ọgwụ, na ihe ndị ọzọ bụ́ isi. Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ji nkà ha mee ihe iji wughachi ụlọ dị iche iche. N’oge na-adịghị anya, a nọ na-enyere ụmụnna anyị bụ́ ndị ọdachi ahụ metụtara aka ịmaliteghachi ọrụ ha. N’Ecuador, Ndịàmà Jehova gbataara ụmụnna ha ọsọ enyemaka mgbe oké idei mmiri bibiri ụfọdụ ebe obibi. Mgbe otu onye ọrụ gọọmenti kirisịrị ụzọ dị irè ha si mee ihe banyere ọnọdụ ahụ, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na m nwere ìgwè a, aga m eme ihe ndị dị egwu! Ndị dị ka unu kwesịrị ịnọ n’akụkụ nile nke ụwa.” Ezi ọrụ dị otú ahụ na-ewetara Jehova Chineke otuto, ọ na-egosipụtakwa ‘nsọpụrụ Chineke anyị bụ́ nke bara uru nye ihe nile.’—1 Timoti 4:8.
Ha “Na-efe Efe Dị Ka Igwe Ojii”
10. N’agbanyeghị ọnụ ọgụgụ na-ebelata ebelata nke ndị ahụ e tere mmanụ, n’ihi gịnị ka e ji akpọsa aha Jehova dị ka a na-akpọsatụbeghị ya na mbụ?
10 Jehova na-ajụ ugbu a, sị: “Olee ndị bụ́ ndị a nke na-efe efe dị ka igwe ojii, ndị na-efekwa dị ka nduru si eferu windo ha? N’ezie Mụ ka àgwàetiti nile ga-echere, ụgbọ nile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, ime ka ụmụ gị ndị ikom si n’ebe dị anya bịa . . . Ụmụ ala ọzọ ga-ewukwa mgbidi gị nile, ndị eze ha ga-ejekwara gị ozi.” (Aịsaịa 60:8-10) Ndị bu ụzọ meghachi omume ná ‘mgbukepụ’ Jehova bụ ‘ụmụ ya ndị ikom,’ bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ. “Ụmụ ala ọzọ,” bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị ji iguzosi ike n’ihe na-ejere ụmụnna ha e tere mmanụ ozi, na-agbaso idu ndú ha n’ikwusa ozi ọma—sochiziri ha. N’ihi ya, ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ndị ahụ e tere mmanụ na-ebelata ebelata, a na-akpọsa aha Jehova gburugburu ụwa dị ka a na-akpọsatụbeghị ya na mbụ.
11. (a) Olee ihe ka na-aga n’ihu, gịnịkwa si na ya pụta na 1999? (b) Olee mba ndị nwere ọnụ ọgụgụ dị ịrịba ama nke ndị e mere baptism maka afọ 1999? (Lee chaatị dị na peeji nke 17-20.)
11 N’ihi ya, ọtụtụ nde na-enubata “dị ka nduru si eferu windo ha,” na-enweta ebe mgbaba n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. A na-atụkwasị ọtụtụ narị puku kwa afọ, ụzọ ghekwara oghe nye ọtụtụ ndị ọzọ. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ọnụ ụzọ ama gị nile ga-eghekwa oghe mgbe nile; a gaghị emechi ha n’ehihie ma ọ bụ n’abalị; ka mmadụ wee bubatara gị akụ̀ nke mba dị iche iche.” (Aịsaịa 60:11) N’afọ gara aga, e mere mmadụ 323,439 baptism ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Jehova, o mechibeghịkwa ọnụ ụzọ ama ndị ahụ. “Ihe a na-achọsi ike nke mba nile,” bụ́ ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, ka si na ha na-enuba. (Hagaị 2:7) Ọ dịghị onye chọrọ isi n’ọchịchịrị pụta a na-achụghachi azụ. (Jọn 12:46) Ka ndị nile dị otú ahụ ghara ikwe mgbe ọ bụla ka ekele ha na-enwe maka ìhè ahụ dajụọ!
Ndị Na-adịghị Atụ Egwu n’Agbanyeghị Mmegide
12. Olee otú ndị hụrụ ọchịchịrị n’anya siworo gbalịa imenyụ ìhè ahụ?
12 Ndị hụrụ ọchịchịrị n’anya na-akpọ ìhè Jehova asị. (Jọn 3:19) Ụfọdụ na-agbalị ọbụna imenyụ ìhè ahụ. Nke a abụghị ihe a na-atụghị anya ya. Ọbụna ndị obodo Jisọs, bụ́ ‘ezi ìhè ahụ Nke na-enye mmadụ ọ bụla ìhè,’ kwara ya emo, megide ya, mesịakwa gbuo ya. (Jọn 1:9) N’ime narị afọ nke 20 dum, e mekwara Ndịàmà Jehova akaje, tụọ ha mkpọrọ, machibido ha iwu, ọbụna gbuo ha, ka ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-egosipụta ìhè nke Jehova. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị mmegide ahọrọla ịgbasa ụgha n’usoro mgbasa ozi banyere ndị ahụ na-egosipụta ìhè nke Chineke. Ụfọdụ na-achọ ime ka ndị mmadụ kwere na Ndịàmà Jehova dị ize ndụ ma kwesị ịbụ ndị e gbochiri ma ọ bụ machibido iwu. Ndị mmegide dị otú ahụ hà enweela ihe ịga nke ọma?
13. Gịnị ka iji ezi uche na-egosipụta ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ọrụ anyị n’usoro mgbasa ozi rụpụtaworo?
13 Ee e. N’ebe ọ dị mkpa, Ndịàmà Jehova agawo n’usoro mgbasa ozi iji kọwaa ihe ndị bụ́ eziokwu. N’ihi ya, a kpọsaala aha Jehova n’ụzọ sara mbara n’akwụkwọ akụkọ na magazin dị iche iche nakwa na redio na telivishọn. Nke a arụpụtala ihe ndị dị mma n’ọrụ nkwusa ahụ. Dị ka ihe atụ, na Denmark, otu ihe omume e mere na TV nke mba ahụ hiwere isi n’isiokwu bụ́ “Ihe mere okwukwe ndị Denmark ji na-ebelata.” Tinyere ndị ọzọ, a gbara Ndịàmà Jehova ajụjụ ọnụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, otu nwanyị nke kiriri ihe omume ahụ kwuru, sị: “Ndị nwere mmụọ Chineke pụtara nnọọ ìhè.” A maliteere ya ọmụmụ ihe.
14. N’ụzọ ga-ekoropụ ha obi, gịnị ka a ga-amanye ndị mmegide ịghọta n’oge na-adịghị anya?
14 Ndịàmà Jehova maara na ọtụtụ ndị nọ n’ụwa a ga-emegide ha. (Jọn 17:14) Ma, amụma Aịsaịa na-ewusi ha ike: “Ụmụ nke ndị na-eweda gị n’ala ga-ejekwuru gị na-eruda n’ala; ndị nile nke na-elelị gị anya ga-akpọkwa isiala n’ọbọ ụkwụ nke ụkwụ gị abụọ; ha ga-akpọkwa gị, Obodo Jehova, Zaịọn nke Onye Nsọ nke Israel.” (Aịsaịa 60:14) N’ụzọ ga-ekoropụ ha obi, ndị mmegide aghaghị ịghọta n’oge na-adịghị anya na ha anọwo na-alụso Chineke n’onwe ya ọgụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ònye pụrụ imeri n’ọgụ dị otú ahụ?
15. Olee otú Ndịàmà Jehova si ‘aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche,’ oleekwa otú nke a siworo pụta ìhè n’ọrụ izi ihe na izisa ozi ọma ha?
15 Jehova gara n’ihu ikwe nkwa, sị: “M ga-eme gị ka ị ghọọ mbili elu ebighị ebi . . . Ị ga-aṅụkwa mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka ị ga-amị: i wee mara na Mụ onwe m, Jehova, bụ Onye nzọpụta gị.” (Aịsaịa 60:15, 16) Ee, Jehova bụ Onye Nzọpụta nke ndị ya. Ọ bụrụ na ha adabere n’ebe ọ nọ, ha ga-adịru mgbe “ebighị ebi.” Ha “ga-aṅụkwa mmiri ara nke mba dị iche iche,” na-eji ihe ndị e nwere na-eme ihe maka nkwalite nke ezi ofufe. Dị ka ihe atụ, iji kọmputa na nkà na ụzụ mgbasa ozi eme ihe n’ụzọ amamihe na-eme ka ibipụta Ụlọ Nche n’asụsụ 121 nakwa Teta! n’asụsụ 62 n’otu mgbe, dị mfe karị. E mepụtala otu usoro ihe omume kọmputa iji nye aka n’ịsụgharị New World Translation gaa n’asụsụ ndị ọhụrụ, nsụgharị dị otú ahụ na-enyekwa ọṅụ dị ukwuu. Mgbe e wepụtara nsụgharị Croatian nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na 1999, anya mmiri nke ọṅụ gbara ọtụtụ puku mmadụ. Otu nwanna nwoke meworo agadi kwuru, sị: “Ọ dịla nnọọ anya m nọ na-eche Bible a. Ugbu a apụrụ m ịnwụ n’udo!” E kesaala ihe karịrị 100 nde New World Translation, n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, n’asụsụ 34.
Ụkpụrụ Omume Ndị Dị Elu
16, 17. (a) Ọ bụ ezie na o siri ike, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ijigide ụkpụrụ ndị dị elu nke Jehova? (b) Ahụmahụ dị aṅaa na-egosi na ndị na-eto eto pụrụ izere ịbụ ndị ụwa merụrụ?
16 Jisọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme ihe na-adịghị mma na-akpọ Ìhè ahụ asị.” (Jọn 3:20) N’aka nke ọzọ, ndị na-anọgide n’ìhè ahụ na-ahụ ụkpụrụ ndị dị elu nke Jehova n’anya. Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-ekwu, sị: “Ndị gị kwa, ha nile ga-abụ ndị ezi omume.” (Aịsaịa 60:21a) Ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka ịnọgide na-enwe ụkpụrụ ezi omume n’ime ụwa nke mmekọahụ rụrụ arụ, ịgha ụgha, anyaukwu, na nganga jupụtara. Dị ka ihe atụ, n’ala ụfọdụ, ọnọdụ akụ̀ na ụba na-adịwanye mma, ọ dịkwa mfe mmadụ ịbụ onye a dọpụrụ uche ya gaa n’imikpu onwe ya n’ịchụso akụ̀ na ụba. Otú ọ dị, Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi.” (1 Timoti 6:9) Lee ihe ọdachi ọ bụ mgbe mmadụ mikpuru onwe ya nke ukwuu n’achụmnta ego, nke na o chefuru ihe ndị dị mkpa n’ezie, dị ka mkpakọrịta ndị Kraịst, ozi dị nsọ, ụkpụrụ omume ọma, na ibu ọrụ ezinụlọ!
17 Ijigide ụkpụrụ ezi omume pụrụ isi ike karịsịa nye ndị na-eto eto, ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ ha na-etinye aka n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ na n’omume rụrụ arụ. Na Suriname, otu nwa okoro mara mma ile anya bịakwutere otu nwa agbọghọ dị afọ 14 n’ụlọ akwụkwọ ma rịọ ya ka ha nwee mmekọahụ. Nwa agbọghọ ahụ jụrụ, na-akọwa na Bible machibidoro ndị na-abụghị di na nwunye ime ihe ndị dị otú ahụ. Ụmụ agbọghọ ndị ọzọ nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ mere ya akaje ma gbalịa ịrụgide ya ịgbanwe obi ya, na-asị na onye ọ bụla na-achọ ka ya na nwa okoro ahụ nwee mmekọahụ. Ma, nwa agbọghọ ahụ guzosiri ike. Izu ole na ole mgbe e mesịrị, a chọpụtara na nwa okoro ahụ bu nje HIV, ọ dakwara oké ọrịa. Nwa agbọghọ ahụ nwere obi ụtọ na o rubere isi n’iwu Jehova bụ́ ‘ịhapụ ịkwa iko.’ (Ọrụ 15:28, 29) Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ n’ebe ndị na-eto eto nọ n’etiti ha nọ, bụ́ ndị na-eguzosi ike maka ezi ihe. Okwukwe ha, na nke ndị mụrụ ha, na-eme ka aha Jehova Chineke “maa mma”—na-ewetara ya nsọpụrụ.—Aịsaịa 60:21b.
Jehova Emeela Ka A Baa Ụba
18. (a) Olee ihe ukwu Jehova mewooro ndị ya? (b) Olee ihe àmà na-egosi na a ga-anọgide na-enwe uto, oleekwa atụmanya ndị dị ebube na-echere ndị nọ n’ebe ìhè ahụ dị?
18 Ee, Jehova na-amụkwasị ìhè n’ahụ ndị ya, na-agọzi ha, na-eduzi ha, na-ewusikwa ha ike. N’ime narị afọ nke 20, ha hụrụ mmezu nke okwu Aịsaịa bụ́: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” (Aịsaịa 60:22) Site n’ọnụ ọgụgụ ahụ dị nta laa azụ na 1919, “onye nta” aghọwo ihe karịrị “otu puku.” Mmụba ahụ akwụsịbeghịkwa! N’afọ gara aga, 14,088,751 bịara Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs. Ọtụtụ n’ime ndị a abụghị Ndịàmà na-ejechi ozi anya. Anyị nwere obi ụtọ na ha bịara ememe ahụ dị mkpa, anyị na-agbakwa ha ume ịnọgide na-aga n’ebe ìhè ahụ dị. Jehova ka na-egbukepụkwa n’ahụ ndị ya. Ọnụ ụzọ e si abanye ná nzukọ ya ka ghere oghe. Mgbe ahụ, ka mmadụ nile kpebisie ike ịnọgide n’ebe ìhè Jehova dị. Lee ngọzi nke ahụ na-arụpụtara anyị ugbu a! Leekwa ọṅụ nke ahụ ga-eweta n’ọdịnihu mgbe ihe nile e kere eke ga-eto Jehova ma ṅụrịa ná mgbukepụ nke ebube ya!—Mkpughe 5:13, 14.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• Olee ndị gosipụtaworo ebube Jehova na mgbe ikpeazụ ndị a?
• Gịnị na-egosi na ịnụ ọkụ n’obi nke ndị Jehova ebelatabeghị?
• Olee ezi ọrụ ụfọdụ nke Ndịàmà Jehova ji n’aka?
• N’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ, gịnị ka obi siri anyị ike na ya?
[Chaatị dị na peeji nke 17-20]
AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1999 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE
(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ndị mmadụ ka na-enuba ná nzukọ Jehova
[Foto dị na peeji nke 16]
Obi dị anyị ụtọ na Jehova emeghepụworo ndị hụrụ ìhè n’anya ụzọ nke ọma