Isi nke 20
‘Onye Nta Aghọọ Mba Nwere Ume’
1. (a) Gịnị ka Jehoya buru n’amụma banyere ịba ụba nke ndị na-efe Jehova? (b) Ònye n’ezie ga-eme ka nke a mee, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
RUO ogologo oge, ndị ahụ na-efe Jehova na-adị nnọọ ole na ole ma e jiri ha tụnyere ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ma n’oge anyị a, ọnụ ọgụgụ ha na-amụba n’ụzọ na-eme ka ndị nile hụrụ ezi omume n’anya ṅụrịa ọṅụ. Banyere ịdị ukwuu nke ịba ụba ahụ, Jehova n’onwe ya buru n’amụma, sị: Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya. (Aịsaịa 60:22) Dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ kwuru, ọ bụ Jehova ga-emezu nke a. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ime ka ndị ohu ya nwee ọnọdụ nke ga-edo ha nnọọ iche n’ebe ìgwè mba ndị dị ha gburugburu dị, nke na-adọtakwa mmasị nke ndị nwere obi eziokwu.
2. (a) Ònye ka a gwara okwu dị n’Aịsaịa 60:1, 2? (b) Olee otú e si mee ka ebube Jehova wakwasị ya? (ch) Olee otú ihe ahụ fọdụrụ siworo ’mee ka ìhè ha nwuo’?
2 E buru nke a n’amụma n’Aịsaịa 60:1, 2, ebe Jehova na-agwa nwanyị ya okwu, bụ́ nzụkọ ya nke ndị mmụọ e kere eke kwesịrị ntụkwasị obi na ụmụ ndị ikom e ji mmụọ nsọ mụọ, ndị nọ n’ụwa, mejupụtara, na-asị: Bilie, [gị nwanyị,] nwuo; n’ihi na ìhè gị abịawo, ebube Jehova awawokwa n’ahụ gị dị ka anyanwụ. N’ihi na lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị. Ọdị iche nke a dabeere n’ọmụmụ a mụrụ. Alaeze Mesaịa ahụ dị n’aka Jisọs Kraịst na 1914. Ọ bụ mgbe ahụ ka ebube Jehova wakwasịrị nzukọ ya nke eluigwe, bụ́ nke mụpụtararịị Alaeze ahụ. E nwere ihe a ga-eji nwee oké ọṅụ n’etiti ha. (Mkpughe 12:1, 2, 5, 10-12) N’ụwa, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ nke ndị nketa Alaeze ahụ kerekwara òkè n’ọṅụ ahụ. Malite na 1919, ha ‘mere ka ìhè ha nwuo’ mgbe ha malitere mkpọsa zuru ụwa ọnụ nke Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya bụ ezie nke dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ.—1 Pita 2:9; Matiu 5:14-16.
3. (a) N’ihi gịnị, karịsịa kemgbe 1914, ka ’ọchịchịrị kpuchiworo ụwa’? (b) Gịnị bụ nanị ezi ihe ngwọta e nwere?
3 N’aka nke ọzọ, na 1914, ìgwè mba dị iche iche nke ụwa, ndị na-alụ ọgụ ijigide ike ọchịchị ha, banyere n’oge ihe ike na enweghị ntụkwasị obi nke ha na-enwerebeghị onwe ha site na ya. Enweghị ntụkwasị obi e nwere kemgbe ahụ emewo ka ọtụtụ ndị ghọta na, n’agbanyeghị ọganihu e nwere n’ọkà mmụta sayensị, ha enweghị ọdịnihu e ji n’aka nke ha ga-enwe olileanya ya. N’ezie, ’ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa.’ Gịnị mere ha apụghị ịchọta ụzọ mgbapụ? N’ihi na mba nile ajụwo Jehova dị ka Ọkaaka. Ọ bụ nanị ndị ọchịchị ole na ole na-ehota Chineke n’egbụgbere ọnụ efu, bụ́ onye ha na-ejighị aha ya eme ihe. Ha kpebiri ime ihe nile n’ụzọ nke aka ha, ma nsogbu nile chere ha ihu karịrị ihe ikike mmadụ ga-emezi. (Jeremaịa 8:9; Abụ Ọma 146:3-6) Ụwa nke a, ya na anya ukwu na mmerụ ya nile, abanyewo n’ime mgbe ikpeazụ ya. Ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọ pụrụ isi zere mbibi nke chere ya ihu. Ọ bụ nanị ndị nwere okwukwe zuru ezu n’Alaeze Chineke pụrụ iji nchekwube lepụ anya n’ọdịnihu. N’ọnụ ọgụgụ na-aba ụba, ndị nwere ezi obi na-aghọta nke a, wee na-aghọ n’ezie ndị sonyeere Ndịàmà Jehova, ndị ọ na-abụghị nanị na ha na-ekwusa Alaeze ahụ, kamakwa ha na-agbalịsi ike ịdị ndụ kwekọrọ n’ihe ha na-ekwusa.
’ONYE NTA AGHỌỌ OTU PUKU’
4. N’imezu ihe e dere n’Aịsaịa 60:4, ọrụ nchịkọta dị aṅaa ka e bu ụzọ chee ihu?
4 Mgbe Agha Ụwa Mbụ gwụsịrị, a chịkọtachabeghị ndị nketa Alaeze ahụ. A ka chọrọ ụmụ ndị ikom na ndị inyom nke Jerusalem dị n’eluigwe iji mezuo 144,000 ahụ e buru n’amụma, bụ́ ndị ga-eso Kraịst chịa achịa n’eluigwe. Otú ọ dị, Jehova buru amụma banyere ọgwụgwụ nke ọrụ a, na-asị: Welie anya gị abụọ elu gburugburu, hụ: ha nile achịkọtawo onwe ha, ha abịakwutewo gị: Ụmụ gị ndị ikom ga-esị n’ebe dị anya bịa, a ga-ekukwa ụmụ gị ndị inyom n’akụkụ gị. (Aịsaịa 60:4) N’ihi mkpọsa a kpọsara Alaeze ahụ malite na 1919 gaa n’ihụ, ọtụtụ puku ndị mmadụ raara onwe ha nye Jehova, e meekwa ha baptism, werekwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ. Otú ọ dị, Jisọs kwuru okwu banyere ndị nketa Alaeze ahụ dum dị ka nanị ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) Iji mezuo ihe e buru n’amụma n’Aịsaịa 60:22, o doro anya na a ga-enwe ihe karịrị ọnụ ọgụgụ ahụ ndị a ga-achịkọbata n’ezi ofufe. N’ezie, o mewo otú ahụ!
5. Olee otú e si kọwaa ụzọ mmụba ọzọ ga-esi bịa n’Aịsaịa 55:5?
5 E kwuru okwu banyere ha n’Aịsaịa 55:5 n’ụzọ dị otú a: Lee, mba nke ị na-amaghị ka ị ga-akpọ, mba nke na-amaghị gị ga-agbakwutekwa gị, n’ihi Jehova, bụ́ Chineke gị, ọbụna n’ihi Onye Nsọ nke Israel; n’ihi na o mewo ka ị maa mma. Ndị a bụ ndị na-esiteghị n’Israel ime mmụọ. Ha si n’ọtụtụ mba pụta, ma ha na-aghọ ndị dị n’otu, ha nile ji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado Alaeze Chineke. Ha bụ mba nke ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ na-amaghị n’oge ahụ dị ka nghọta ha nwere n’Akwụkwọ nsọ si dị, ndị a ejighịkwa ndị ohu Chineke kpọrọ ihe na mbụ. Ma n’ihi nkwusa ozi ọma ahụ, a na-adọta mmasị ha n’ihi na ha ghọtara na ndị Israel ime mmụọ ndị a na-efe ezi Chineke ahụ, n’ihi na ha hụtakwara ịma mma ime mmụọ nke Israel ime mmuọ ahụ nwere, nke a pụrụ inweta nanị site ná ngọzi Chineke.
6. Ruo n’òkè ha aṅaa ka a na-ezisa ozi Alaeze ahụ, ihe dị aṅaa na-akpali mmasị siwokwara n’ime ya pụta?
6 N’agbanyeghị ihe nile Setan meworo iji gbochie nkwusa nke ozi Alaeze ahụ na iji dọrọ mmasị ndị mmadụ gaa ná nchụso nke ihe ndị ọzọ, ìhè nke eziokwu ahụ nọgidere na-enwu ọbụna ruo n’ebe dịkarịsịrị anya ná nsọtu nile nke ụwa. Ihe si n’ime ya pụta bụ nnọọ kpọmkwem dị ka Chineke si n’ụzọ amụma gwa nwanyị ya n’oge dị anya gara aga, sị: Mgbe ahụ ị ga-ahụ wee nwuo enwuo, obi gị ga-atụkwa oké egwu, saa mbara; n’ihi na a ga-echigharịkwute gị ihe bara ụba nke oké osimiri, akụ nke mba dị iche iche ga-abịakwute gị. . ... Ọ bụkwa ozi ọma otuto Jehova ka ha ga-ezisa. (Aịsaịa 60:5, 6) Ee, oké ìgwẹ mmadụ ndị bụbu akụkụ nke osimiri nke agbụrụ mmadụ, ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, ndị ndụ ha gbara ọchichịrị site n’oké ọchịchirị nke kpuchiri mba nile, esonyeworo Israel ime mmụọ. N’anya Chineke, ndị a bụ n’ezie ndị dị oké ọnụ ahịa sitere ná mba nile.
7. Site n’ụzọ e si buo amụma banyere ịba ụba ahụ, olee otú Jehova si gosi ihe dị oké ọnụ ahịa n’anya ya n’ezie?
7 N’oge a na-ewughachi ụlọ nsọ Jehova na Jerusalem, ọ kpaliri onye amụma ya bụ Hagai ịma ọkwa, sị: M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, m ga-emejukwa ụlọ a n’ebube, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị. (Hagaị 2:7) Ime ka mba nile mee mkpatu, maakwa jijiji ga-eduba ná mbibi ha n’ikpeazu, ma tupu e bibie ha, a ghaghị isi n’etiti ha chịkọta ihe a na-achọsi ike nke mba nile, wee kpọbata ha n’ụlọ ime mmuọ dị ukwuu nke Jehova, bụ́ ụlọ ofufe ya nke eluigwe na ala. N’ebe a ka ha ga-enweta nchedo mgbe e bibiri ụwa. Ọ bụ ndị dị otú ahụ dị ndụ, ndị na-efe ya ofufe dị oké ọnu ahịa n’anya Jehova. Ọ chọghị akụ ha. (Maịka 6:6-8) Ihe kachasị oké ọnụ ahịa ha pụrụ inye Jehova bụ ofufe sitere n’obi ha dum. Ha ji onyinye nke sitere n’ezi obi na ije ozi nke ịnụ ọkụ n’obi na-abịa, ha nile na-ezisa ozi ọma nke otuto Jehova.’ Lee aha ọṅụ nke mpụta ha wetawooro ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ma n’eluigwe ma n’ụwa!
8. Ihe àmà dị aṅaa ka Bible nyere banyere òkè nchịkọta nke ndị na-atụ anya iketa akụkụ elu ụwa nke Alaeze ahụ ga-eru?
8 Òle ka ndị a na-efe Jehova, bụ́ ndị nwere mmasị n’olileanya nke ibi ndụ n’ime Paradaịs elu ala ga-adị? Bible ekwughị ọnụ ọgụgụ ha. Ohere ahụ dịịrị ọnụ ọgụgụ mmadụ ole ọ bụla ga-esi ná mba nile nabata ndokwa ịhụnanya nke Jehova mere. Otú ọ dị, ihe àmà nke na-egosi ihe a pụrụ itụ anya ya, ka a na-ahụ n’Aịsaịa 60:8, ebe a na-akọwa ha dị ka nduru ndị na-efe efe dị ka igwe ojii—igwe ojii nke na-eme ka ala nke dị n’okpuru ya gbaa ọchịchịrị. Nke a na-ezo aka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ bara ụba inubata na nwa oge nta. N’ihi oké nnubata nke a nke ndị na-efe Jehova, e buru n’amụma na onye nta nke bụ Israel ime mmụọ ahụ ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume, Jehova kwukwara na ọ bụ ya ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya. (Aịsaịa 60:22) Nke ahụ ò kwekọrọ n’ihe meworo n’ezie?
9. Ruo òkè ha aṅaa ka ịba ụba ahụ gaworo n’ihu kemgbe 1935?
9 Mgbe agha ụwa mbụ gasịrị, e nwere nanị puku mmadụ ole na ole ndị ji ezi obi na-ekere òkè n’ịgba àmà ihu ọha banyere Alaeze ahụ. Na 1935, ngụkọta ọnụ ọgụgụ ha n’ụwa nile eruchaghị 60,000. Na 1941, ọnụ ọgụgụ ndị mkpọsa Alaeze gafere akara nke 100,000. Na 1953, e nwere ihe karịrị 500,000. Mgbe afọ iri gasịrị, ọnu ọgụgụ ha ruru otu nde. Ná mmalite nke 1984, ha dị 2,652,323. Ná nkezi, ha na-etinye ihe karịrị otu nde awa kwa ụbọchị iji gosi ndị ọzọ ihe mere o ji bụrụ nanị Alaeze Chineke ga-enye ezi olileanya maka ọdịnihu. N’iji ya tụnyere ọnụ ọgụgụ nke ndị nile bụ Ndịàmà Jehova, ndị na-egosipụta na ha nọ n’okpuru Alaeze Jehova dị n’aka Mesaịa, ọ bụ ihe e kwesịrị ịrịba ama na ihe ruru 60 mba dị iche iche dị n’ụwa taa nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ala karịa nke mba nke a na-abawanye ụba. Otú ọ dị, mba nke a pụrụ iche, adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa, kama o nyefere onwe ya kpam kpam n’ijere ezi Chineke ahụ ozi.
10. (a) Ọnọdụ dịgasị aṅaa mere ka uto nke a bụrụ ihe dị ebube n’anya anyị? (b) Gịnị na-egosi na ọtụtụ ndị ka ga-abịa?
10 Nke a ọ̀ bụ nsọtụ nke mmezu amụma nke a? Ihe meworo eme ezuwo ikwekọ ná nkọwa Bible. Ọ bụkwa ihe dị ebube ma ọ bụrụ na anyị atụlee ọnọdụ dị iche iche ndị a rụrụ ọrụ nke a n’okpuru ha—ihe mgbochi nile e meriri, ihe àmà nke nduzi Chineke n’ime ka ọrụ ahụ gaa nke ọma, ikwesị ntụkwasị obi nke ndị na-ekere òkè n’ọrụ ahụ na-egosipụta. Mgbanwe nke ozi ahụ na-eweta ná ndụ ndị mmadụ dịkwa ebube. Ma, ịba ụba nke ndị na-egosipụta n’ihu ọha na ha nọ n’akụkụ Chineke adịghị akwụsị, ọ dịghịkwa ebelata ebelata. N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, e nwewo ná nkezi, ihe karịrị 10,000 kwa ọnwa, bụ́ ndị na-eche onwe ha n’ihu maka imikpu ha ná mmiri, ọnụ ọgụgụ ha na-arịkwa elu kwa afọ. Ndị a nile, site n’ịdị ndụ kwekọrọ n’ihe baptism ha pụtara, pụrụ inwe olileanya e ji n’aka nke ịlanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ ahụ.
11. (a) Olee otú Bible si gosipụta na ọtụtụ nde mmadụ ndị a ga-aghọ akụkụ nke otu nzukọ? (b) Gịnị bụ nzube bụ isi nke nzukọ ahụ?
11 Ọtụtụ nde mmadụ ndị a abụghị nanị ndị mmụta Bible nọọrọ onwe ha, nke onye ọ bụla na-efe Chineke n’ụzọ nke aka ya. Ha bụ mmadụ ndị sitere ná nrube isi ghọọ akụkụ nzukọ Jehova a na-ahụ anya. Dị ka anyị hụworo, e bu ụzọ ’chịkọta’ ndị nketa Alaeze ahụ. Ugbu a, ndị ọzọ sitere ná mba nile, ndị nwere olileanya nke ndụ n’elu ụwa, ’na-abịakwute ha.’ (Aịsaịa 60:4, 5) Ha aghọwo ndị e jikọtara n’otu n’ime otu ìgwẹ̀ atụrụ n’okpuru otu onye ọzụzụ atụrụ, bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 10:16) Pita onye ozi kọwara ndị Kraịst dị ka ’òtù ụmụnna’ n’ụwa nile, Pọl gbakwara ha ume ka ha ghara ikewapụ onwe ha iche, kama ka ha ’na-enwe nzukọ nke onwe ha,’ ka ha na-emekwa otú ahụ karị mgbe ụbọchị imezu ihe Chineke kpere n’ikpe na-abịaru nso. (1 Pita 5:9; Ndị Hibru 10:23-25) N’uzọ dị otú ahụ, a na-agba ha ume, na-akwadebe ha ikere òkè ná nzube ukwu nke ọ bụ n’ihi ya ka e ji guzobe nzukọ a. Gịnịkwa ka nzube ahụ bụ? Ibuli aha Jehova elu.—1 Pita 2:9; Aịsaịa 12:4, 5.
ỌRỤ NKE A NA-AGHAGHỊ ỊRỤ
12. (a) Olee otú Jisọs si gosipụta ọrụ nke anyị nile kwesịrị ịdị na-ekere òkè na ya? (b) Ruo n’ókè ha aṅaa ka ọ dịruru mkpa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
12 Ndị nile na-esonyere nzukọ Jehova na-aghọta ngwa ngwa na ndị nile nọ n’ime ya bụ ndị na-arụ ọrụ. N’iṅomi Jisọs Kraịst, ha nile bụ ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike nke Alaeze Chineke, nke bụ ụzọ a ga-eji wepụ aha Jehova n’ụta. Jisọs n’onwe ya sịrị: Aghaghị m izikwa obodo nile ozi ọma alaeze Chineke: n’ihi na e sitere m ime nke a. (Luk 4:43) O kwusịrị okwu ike banyere mkpa ọ dị ka ndị ọzọ wulite ndụ ha gburugburu ime uche Chineke. Ọ kụziịrị ndị na-eso ụzọ ya ịrụ otu ụdị ọrụ ahụ ọ na-arụ. Banyere oge nke anyị na-ebi n’ime ya, o buru amụma na a ’ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.’ (Matiu 24:14) Nke a bụ ọrụ kachasị mkpa nke onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịrụ taa. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ site n’ịrụ ọrụ ahụ ka anyị si akwado ọkaaka ịchị isi ziri ezi nke Jehova, nke ọ bụ n’elu ya ka ọdịmma nke ihe nile e kere eke dabeere na ya. Site n’iji obi anyị dum kere òkè n’ịrụ ọrụ nke a, anyị na-egosipụta mmasị anyị nwere maka amara na-erughịrị anyị nke Jehova nyere anyị. Anyị na-enyekwara ndị mmadụ ibe anyị aka irite uru site n’ụzọ nke ọ bụ nanị site na ya ka ha pụrụ ịlanarị oké mkpagbu ahụ nke dị nso.—Tụlee 1 Timoti 4:13, 16.
13. (a) N’Aịsaịa 60:17, ọnọdụ dị aṅaa ka e buru n’amụma banyere nzukọ Jehova? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị wee nweta ọnọdụ ahụ n’ụzọ zuru ezu? (ch) Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị nile na-eme otú ahụ?
13 Ọnọdụ dị iche iche ha na-ahụta n’ime nzukọ Jehova na-amasị ha. Dị ka Jehova buru n’amụma site n’ọnụ Aịsaịa: M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, m ga-emekwa ka ndị [na-ekenye gị ọrụ] ghọọ ezi omume. (Aịsaịa 60:17) Udo nke dị n’etiti ha abụghị nanị n’ọnụ efu, kama ọ bụ nke dị adị n’ezie, bụ́ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Nke a apụtaghị na mmadụ ọ bụla n’otu n’otu na-enweta udo ahụ n’ụzọ zuru ezu nanị n’ihi na o so nzukọ ahụ na-emekọ ihe. Onye ọ bụla n’ime ha aghaghị ịmụta ịdị na-agbaso ihe nile dịịrị udo, na ihe nile dịịrị iwulirịta onwe anyị elu dị ka ụlọ. (Ndị Rom 14:19) Ọ dị mkpa ka ọ mụta, gosipụtakwa amamihe nke Chineke n’ịnagide ezughị okè nke ndị ọzọ, gosipụta ogologo ntachi obi na imeru ihe n’òkè, na-agbaghara ndị ọzọ ọbụna dị ka ọ chọrọ ka Chineke gbaghara ya. Ee, ọ ghaghịkwa ịdị ’na-eme udo.’ (Jemes 3:17, 18; Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Kọlọsi 3:12-14) Ndị na-eme otú ahụ na-achọta ọṅụ dị ukwuu n’ịghọ akụkụ nke mba nwere ume nke a na-achịkọta ugbu a, bụ́ mba nyefere onwe ya kpam kpam n’ije ozi Jehova, bụ́ ’Chineke nke obi ụtọ.’ (1 Timoti 1:11) Ọ bụ ndị so ná mba nke a ka a ga-echebe mgbe Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe megide ụwa dum nke doro onwe ya n’okpuru Setan dị ka onye na-achị ya.