Okwu Jehova Dị Ndụ
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Jọn na Jud
AKWỤKWỌ ozi atọ Jọn onyeozi dere so n’akwụkwọ ndị ikpeazụ dị n’Akwụkwọ Nsọ e dere site n’ike mmụọ nsọ, bụ́ ndị ọ ga-abụ na o dere ha n’Efesọs n’ihe dị ka n’afọ 98 O.A. Akwụkwọ ozi abụọ ndị mbụ gbara Ndị Kraịst ume ka ha nọgide na-eje ije n’ìhè ahụ nakwa ka ha ghara ikwe ka ndị si n’ezi ofufe dapụ nwata ha. Ọ bụghị naanị banyere ije ije n’eziokwu ahụ ka Jọn kwuru okwu ya n’akwụkwọ ozi ya nke atọ kama ọ gbakwara Ndị Kraịst ume ka ha na-emekọ ihe ọnụ.
N’akwụkwọ ozi Jud, bụ́ onye otu nne ji ya na Jizọs, nọ na Palestine dee n’ihe dị ka n’afọ 65 O.A., ọ dọrọ Ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị banyere ndị ọjọọ gbebatara n’ọgbakọ, nyekwa ha ndụmọdụ otú ha ga-esi zere ndị na-akpa àgwà ọjọọ. Ime ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ ozi atọ Jọn dere na nke Jud, nwere ike inyere anyị aka ịnọgidesi ike n’okwukwe n’agbanyeghị ihe ndị ga-achọ igbochi anyị ime otú ahụ.—Hib. 4:12.
NỌGIDE NA-EJE IJE N’ÌHÈ AHỤ, N’ỊHỤNANYA NAKWA N’OKWUKWE
Ndị e bu n’obi dee akwụkwọ ozi mbụ Jọn bụ ndị niile ha na Kraịst dị n’otu. Akwụkwọ ozi ahụ nwere ndụmọdụ ndị bụ́ ịgba, ndị e dere iji nyere Ndị Kraịst aka ịghara ikwe ka ndị si n’ezi ofufe dapụ nwata ha, nakwa iji mee ka ha nọgidesie ike n’eziokwu ahụ ma na-eme ihe ziri ezi. Jọn kwusiri okwu ike banyere mkpa ọ dị ka anyị nọgide na-eje ije n’ìhè ahụ, n’ịhụnanya, na n’okwukwe.
Jọn dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị na-eje ije n’ìhè ahụ, dị ka [Chineke] onwe ya nọ n’ìhè ahụ, anyị na ibe anyị na-emekọrịta ihe.” Ebe ọ bụkwanụ na ịhụnanya si n’aka Chineke, onyeozi ahụ kwuru, sị: “Ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya.” Ọ bụ ezie na “ịhụ Chineke n’anya” na-akpali anyị ịdị “na-edebe ihe o nyere n’iwu,” ọ bụ okwukwe anyị nwere na Jehova Chineke, n’Okwu ya, na n’Ọkpara ya ka anyị ji emeri ụwa.—1 Jọn 1:7; 4:7; 5:3, 4.
Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:
2:2; 4:10—Olee otú o si bụrụ na Jizọs bụ “àjà ime udo”? Ime udo pụtara ime ka iwe “dajụọ,” ma ọ bụ ime ka obi “jụrụ.” Jizọs nyere ndụ ya ka àjà ime udo n’echiche bụ́ na site n’ime nke a, ọ ga-emezu ihe iwu zuru okè chọrọ. Dabere n’àjà ahụ ọ chụrụ, Chineke nwere ike imere anyị ebere, nweekwa ike ịgbaghara ndị nwere okwukwe na Jizọs mmehie ha.—Jọn 3:16; Rom 6:23.
2:7, 8—Olee iwu Jọn na-ekwu na ọ bụ iwu “ochie” nakwa iwu “ọhụrụ”? Jọn na-ekwu banyere iwu ahụ e nyere ka anyị gosi ụmụnna anyị ụdị ịhụnanya nwere ike ime ka anyị dị njikere ịnwụ n’ihi ha. (Jọn 13:34) Ọ kpọrọ ya nke “ochie” n’ihi na Jizọs nyere ya ihe karịrị iri afọ isii tupu Jọn edee akwụkwọ ozi ya mbụ o dere n’ike mmụọ nsọ. N’ihi ya, ndị kwere ekwe nụrụ ya n’oge ha ‘malitere’ ịghọ Ndị Kraịst. Ihe mekwara e ji kpọọ iwu ahụ nke “ọhụrụ” bụ na ihe e kwuru n’ime ya abụghị naanị ‘mmadụ ịhụ mmadụ ibe ya n’anya dị ka onwe ya,’ kama ọ chọkwara ka mmadụ nwee ụdị ịhụnanya nwere ike ime ka ọ dị njikere ịnwụ n’ihi onye ọzọ.—Lev. 19:18; Jọn 15:12, 13.
3:2—Olee ihe ‘a na-emebeghị’ ka Ndị Kraịst e tere mmanụ mara, ònyekwa ka ha ‘ga-ahụ otú ọ dị’? Ihe a na-emebeghị ka ha mara bụ otú ha ga-adị mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ ha agaa eluigwe dị ka ndị bụ́ mmụọ. (Fil. 3:20, 21) Ma, ihe ha maara bụ na “mgbe ọ bụla e mere ka [Chineke] pụta ìhè [ha] ga-adị ka ya, n’ihi na [ha] ga-ahụ ya otú ọ dị,” ya bụ, dị ka “Mmụọ ahụ.”—2 Kọr. 3:17, 18.
5:5-8—Olee otú mmiri, ọbara, na mmụọ nsọ si gbaa àmà n’eziokwu ahụ bụ́ na “Jizọs bụ Ọkpara Chineke”? Mmiri gbara àmà n’ihi na mgbe e mere Jizọs baptizim, Jehova n’onwe ya kwuru na ọ bụ Ọkpara ya. (Mat. 3:17) Ọbara ma ọ bụ ndụ Jizọs, bụ́ nke o nyere ka “ọ bụrụ ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ niile,” gosikwara na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. (1 Tim. 2:5, 6) Mmụọ nsọ gbakwara àmà na Jizọs bụ Ọkpara Chineke mgbe ọ nọkwasịrị Jizọs n’isi oge a na-eme ya baptizim, bụ́ nke mere ka o nwee ike ‘ịgazu ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ.’—Jọn 1:29-34; Ọrụ 10:38.
Ihe Ndị Anyị Mụtara:
2:9-11; 3:15. Ọ bụrụ na Onye Kraịst ekwere ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla mee ka ọ kwụsị ịhụ ụmụnna ya n’anya, ọ na-ejegharị n’ọchịchịrị, ọ maghịkwa ebe ọ na-aga.
NỌGIDE “NA-EJE IJE N’EZIOKWU AHỤ”
Jọn malitere akwụkwọ ozi ya nke abụọ site n’ikwu, sị: “Mụ onwe m bụ́ okenye na-edegara nwaanyị ahụ a họọrọ akwụkwọ, tinyere ụmụ ya.” O nwere obi ụtọ mgbe ọ hụrụ “ụfọdụ n’ime ụmụ [nwaanyị ahụ] ka ha na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—2 Jọn 1, 4.
Mgbe Jọn gbachara ume ka e nwee ịhụnanya, o dere, sị: “Nke a bụkwa ihe ịhụnanya pụtara, ka anyị na-eje ije dị ka ihe ndị o nyere n’iwu si dị.” Jọn dọkwara aka ná ntị banyere “onye nduhie ahụ na onye ahụ na-emegide Kraịst.”—2 Jọn 5-7.
Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:
1, 13—Ònye bụ “nwaanyị ahụ a họọrọ”? Ọ ga-abụ na Jọn na-ekwu banyere otu nwaanyị a kpọrọ Kyria, bụ́ ihe ndị Grik na-akpọ “nwaanyị.” Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na o ji ya na-anọchi anya otu ọgbakọ ọ na-agwa okwu, iji mee ka ndị mmegide ghara ịghọta ihe ọ na-ekwu. Ya bụrụ na ọ bụ nke a ka o bu n’uche, ụmụ ya ga-abụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ọ na-agwa okwu, “ụmụ nwanne [nwaanyị ahụ]” ga-abụkwa ndị nọ n’ọgbakọ ọzọ.
7—Olee ‘ọbịbịa’ Jizọs nke Jọn na-ekwu okwu ya ebe a, oleekwa otú o si bụrụ na ndị nduhie ‘adịghị ekwupụta’ ya? ‘Ọbịbịa’ a abụghị ọbịbịa Jizọs gaje ịbịa n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya. Kama, ọ bụ ọbịbịa Jizọs n’anụ ahụ́ nakwa otite a ga-ete ya mmanụ dị ka Kraịst. (1 Jọn 4:2) Ndị nduhie ekwetaghị na Jizọs bịara n’anụ ahụ́. Ikekwe ha ekweghị na e nwetụla mgbe e nwere onye dị ka Jizọs ma ọ bụ ha ekweghị na e jiri mmụọ nsọ tee ya mmanụ.
Ihe Ndị Anyị Mụtara:
2, 4. Mmata anyị matara “eziokwu ahụ,” nke bụ́ ozizi niile nke Ndị Kraịst, bụ́ nke dị na Baịbụl, ma na-eme ha, dị nnọọ mkpa maka nzọpụta anyị.—3 Jọn 3, 4.
8-11. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-enwe “obiọma na-erughịrị mmadụ na ebere na udo nke si n’aka Chineke bụ́ Nna nakwa n’aka Jizọs Kraịst,” nakwa mkpakọrịta ịhụnanya na-adị n’etiti anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị, anyị kwesịrị ‘ilezi onwe anyị anya’ iji hụ na anyị nọgidere n’ozizi nke Kraịst ma zere ndị ‘na-anọgideghị na ya.’—2 Jọn 3.
GHỌỌNỤ ‘NDỊ NA-ARỤKỌ ỌRỤ N’EZIOKWU AHỤ’
Onye Jọn degaara akwụkwọ ozi ya nke atọ bụ enyi ya bụ́ Geyọs. O dere, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 4.
Jọn jara Geyọs mma n’ihi ịrụ “ọrụ kwesịrị ntụkwasị obi” n’inyere ụmụnna si esi bịa aka. Onyeozi ahụ kwuru sị: “Anyị ji ụgwọ ịnabata ndị dị otú ahụ nke ọma, ka anyị wee ghọọ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 5-8.
Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:
11—Gịnị mere ụfọdụ ji akpa àgwà ọjọọ? N’ihi ejighị ihe gbasara Chineke kpọrọ ihe, ụfọdụ adịghị ahụ Chineke, n’ụdị na ha adịghị aghọta na ọ dị. Ebe ọ bụ na ha enweghị ike iji anya nkịtị hụ Chineke, ha na-akpa àgwà ka à ga-asị na ọ dịghị ahụ ha.—Ezik. 9:9.
14—Olee ndị ka a kpọrọ “ndị enyị”? “Ndị enyi” e kwuru okwu ha n’ebe a abụghị naanị ndị ha na mmadụ dị n’ezigbo mma. Ndị Jọn na-ekwu okwu ha ebe a bụ ndị kwere ekwe ibe anyị niile.
Ihe Ndị Anyị Mụtara:
4. Ndị nọterela aka n’ọgbakọ na-enwe obi ụtọ dị ukwuu ma ha hụ ka ndị batara ọhụrụ “na-eje ije n’eziokwu ahụ.” Ndị nne na nna na-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu ma ha nwelie ike inyere ụmụ ha aka ịghọ ndị ohu Jehova!
5-8. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ozi ala ọzọ, ndị na-eje ozi na Betel, na ndị ọsụ ụzọ socha ná ndị na-arụsi ọrụ ike maka ụmụnna ha n’ihi na ha hụrụ ụmụnna ha na Jehova n’anya. Anyị kwesịrị iṅomi okwukwe ha, kwesịkwa iji ịhụnanya na-akwado ha.
9-12. Anyị kwesịrị iṅomi Dimitriọs, bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụghị onye ekwurekwu bụ́ Dayọtrefis, nke na-ekwutọkarị ndị ọzọ.
“NỌRỌNỤ N’ỊHỤNANYA CHINEKE”
(Jud 1-25)
Jud kọwara ndị gbebatara n’ọgbakọ dị ka “ndị na-atamu ntamu, ndị na-eme mkpesa banyere ọnọdụ ha ná ndụ, ndị na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha.” Ha ‘na-etu ọnụ, ebe ha na-enwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ n’ihi uru ha ga-erite.’—Jud 4, 16.
Olee otú Ndị Kraịst ga-esi zere ndị na-akpa àgwà ọjọọ? Jud dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, chetanụ okwu e kwuru na mbụ site n’ọnụ ndịozi Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” O kwukwara sị: “Nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke.”—Jud 17-21.
Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:
3, 4—Gịnị mere Jud ji gwa Ndị Kraịst ka ha “lụsie ọgụ ike maka okwukwe ahụ”? Ọ bụ n’ihi na ‘ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke egbebatala n’ọgbakọ.’ Ha ‘na-eme ka obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ bụrụ ihe ngọpụ maka omume rụrụ arụ.’
20, 21—Olee otú anyị nwere ike isi “nọrọ n’ịhụnanya Chineke”? Ọ dị ụzọ atọ anyị nwere ike isi mee nke a: (1) site n’iwuli onwe anyị elu ‘n’okwukwe anyị kasị nsọ,’ bụ́ nke anyị na-eme site n’ịmụchi Okwu Chineke anya nakwa ịgachi ozi ọma anya; (2) site n’ikpe ekpere “site na mmụọ nsọ,” ma ọ bụ n’ụzọ kwekọrọ n’otú o si arụ ọrụ; na (3) site n’inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst, bụ́ ihe ahụ mere ọ ga-eji kwe anyị omume inweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16, 36.
Ihe Ndị Anyị Mụtara:
5-7. Ndị ajọ omume, hà nwere ike ịgbanahụ ikpe Jehova? Ihe atụ atọ ndị ahụ Jud ji dọọ anyị aka ná ntị gosiri na ọ gaghị ekwe omume.
8-10. Anyị kwesịrị iṅomi Maịkel, bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi, ma kwanyere ndị Jehova nyere ikike ùgwù.
12. Ndị si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị na-eme ka à ga-asị na ha hụrụ anyị n’anya, nwere ike ịla okwukwe anyị n’iyi dị nnọọ ka okwute nọ n’ala ala mmiri nwere ike isi gbawaa ụgbọ mmiri ma ọ bụ merụọ onye na-egwu mmiri ahụ́. Ndị nkụzi ụgha nwere ike ịdị na-eme ka hà na-emesapụ aka, ma ha dị ka ígwé ojii nke mmiri na-adịghị, n’ụdị na ha enweghị eziokwu ọ bụla ha ga-akụzi. Ndị dị otú a amịghị mkpụrụ ọ bụla, ha dị ka osisi kpọnwụrụ akpọnwụ nke na-amịghị mkpụrụ n’oge ya. A ga-ala ha n’iyi dị ka osisi ndị a bụturu abụtu. Anyị ga-egosi na anyị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị ajụ ndị si n’ezi ofufe dapụ.
22, 23. Ezi Ndị Kraịst kpọrọ ihe ọjọọ asị. Iji chebe “ụfọdụ ndị nwere obi abụọ” pụọ n’ọkụ nke na-anọchi anya mbibi ebighị ebi, ndị tozuru okè n’ọgbakọ—karịsịa ndị okenye—na-enyere ha aka eme ka ha na Jehova dịkwuo ná mma.
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Mmiri, mmụọ nsọ, na ọbara na-agba àmà na “Jizọs bụ Ọkpara Chineke”