Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 6/15 p. 4-7
  • Gịnị Ka Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ige Ntị Dị Mma Karịa Ịchụ Àjà”
  • Iso Chineke Nwee Mmekọrịta Chiri Anya Ga-ekwe Omume
  • Iṅomi Chineke nke Ịhụnanya
  • Ụmụnne Ndị Zụlitere Àgwà Dịrịtara Iche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ịchụrụ Jehova Àjà Ndị Ọ Na-anakwere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 6/15 p. 4-7

Gịnị Ka Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara

IHE dị ka puku afọ isii gara aga, a mụrụ nwa ọhụrụ mbụ bụ́ mmadụ. Mgbe a mụsịrị ya, nne ya, bụ́ Iv, kwuru, sị: “Enwetawo m nwoke site n’inyeaka Jehova.” (Jenesis 4:1) Okwu ya na-egosi na, ọ bụ ezie na a maworị ha ikpe ọnwụ n’ihi nnupụisi ha, Iv na di ya, bụ́ Adam, ka maara banyere ịbụ Chineke nke Jehova. Ka e mesịrị ha mụrụ nwa nwoke nke abụọ. A kpọrọ ụmụaka ndị ikom ahụ Ken na Ebel.

Ka ụmụaka ndị ikom ahụ na-etolite, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha mụtara ihe dị ukwuu banyere ịhụnanya Jehova nanị site n’inyocha ihe ndị o kere. Ha nwere mmasị n’àgwà ndị mara mma nke ihe ndị e kere eke na ụdị anụmanụ na ihe ọkụkụ dị iche iche. Ọ bụghị nanị na Chineke nyere ha ndụ kama o nyekwara ha ikike nke ịchọta obi ụtọ ná ndụ.

Ha nụrụ na e kere ndị mụrụ ha dị ka ndị zuru okè nakwa na nzube mbụ nke Jehova bụ ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma eleghị anya Adam na Iv kọwaara ha ogige Iden ahụ mara mma, ha aghaghịkwa ịkọwa n’ụzọ ụfọdụ ihe mere e ji chụpụ ha n’ụdị ebe obibi paradaịs ahụ. Ken na Ebel pụkwara ịmaworị banyere amụma Chineke nke e dekọrọ na Jenesis 3:15. Site n’amụma ahụ Jehova kwupụtara nzube ya idozi ihe nile mgbe oge ya ruru maka abamuru nke ndị hụrụ ya n’anya, ndị guzosikwara ike n’ihe nye ya.

Ịnụ banyere Jehova na àgwà ya nile aghaghị ịkpaliworị ọchịchọ inweta ihu ọma Chineke n’ime Ken na Ebel. Ya mere ha bịakwutere Jehova site n’inye ya onyinye ịnata ihu ọma. Ihe ndekọ Bible na-asị: “O ruo, n’ọgwụgwụ ụbọchị ụfọdụ, na Ken wetara ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala ịbụ onyinye ịnata ihu ọma e nyere Jehova. Ebel kwa, ya onwe ya wetakwara ụfọdụ n’ime ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya, na ụfọdụ n’ime iberibe ha mara abụba.”—Jenesis 4:3, 4.

Ọchịchọ ha nwere inweta ihu ọma Chineke ghọrọ ihe mgbakwasị ụkwụ maka isoro ya nwee mmekọrịta. Ken mesịrị n’ikpeazụ nupụ isi megide Chineke, ebe ịhụnanya maka Chineke nọgidere na-akpali Ebel. Ebel agaghị enweworị ike ịzụlite mmekọrịta dị otú ahụ n’ebe Chineke nọ nanị ma o bu ụzọ nweta ihe ọmụma banyere ụdị onye Jehova bụ na banyere nzube ya dị iche iche.

Gị onwe gị kwa pụrụ ịbịa mata Jehova. Dị ka ihe atụ, n’ime Bible ị pụrụ ịmụta na Chineke bụ onye dị adị n’ezie, ọ bụghị nanị ikike na-adịghị ndụ nke na-eke nnọọ ihe nanị ná ndabara. (Tụlee Jọn 7:28; Ndị Hibru 9:24; Mkpughe 4:11.) Bible na-akụzikwa na Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.”—Ọpụpụ 34:6.

“Ige Ntị Dị Mma Karịa Ịchụ Àjà”

Dị ka e gosiri n’akụkọ banyere Ken na Ebel, inwe ihe ọmụma banyere Chineke na ọchịchọ iso ya nwee mmekọrịta chiri anya ezughị ezu. N’eziokwu, ụmụnne abụọ ahụ ji onyinye ịnata ihu ọma bịakwute Chineke. Ma, “Jehova wee lee Ebel, leekwa onyinye ịnata ihu ọma ya, anya ọma: ma Ken na onyinye ịnata ihu ọma ya, O leghị ha anya ọma. Ken wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu, ihu ya wee gbarụọ.”—Jenesis 4:3-5.

N’ihi gịnị ka Jehova ji jụ àjà Ken? Ọ̀ dị ihe dị njọ n’otú onyinye ịnata ihu ọma ya dịruru ná mma? Iwe ò were Jehova n’ihi na Ken nyere “mkpụrụ ala” kama ịbụ àjà anụmanụ? Ọ bụchaghị. Ka e mesịrị, Chineke ji obi ụtọ nakwere site n’aka ọtụtụ ndị na-efe ya ofufe onyinye mkpụrụ ihe ọkụkụ na mkpụrụ osisi nke ala. (Levitikọs 2:1-16) Ya bụrụ otú ahụ, dị ka ihe àmà gosiri, e nwere ihe dị njọ banyere obi Ken. Jehova pụrụ ịma ihe dị n’obi Ken ma dọọ ya aka ná ntị, sị: “N’ihi gịnị ka ị na-ewe iwe dị ọkụ? ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihu gị gbarụrụ? Ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma, ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe? ọ bụrụkwa na i meghị nke ọma, n’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị.”—Jenesis 4:6, 7.

Ezi ịhụnanya maka Chineke gụnyere ihe karịrị nanị ịchụ àjà. Ọ bụ ya mere Jehova ji gbaa Ken ume ka ọ “na-eme nke ọma.” Chineke chọrọ nrubeisi. Nrubeisi dị otú ahụ nye Chineke gaara enyewororị Ken aka ịtọ ezigbo ntọala maka iso Onye Okike nwee mmekọrịta ịhụnanya. Bible ji okwu ndị a mesie uru nke nrubeisi ike, sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà ọzọ, hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka ige ntị olu Jehova? Lee, ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà, ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebulu.”—1 Samuel 15:22.

Ka e mesịrị, e mesiri echiche a ike site n’okwu ndị dị na 1 Jọn 5:3: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” Ọ dịghị ụzọ ka mma isi gosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ karịa site n’ido onwe anyị n’okpuru ịbụisi ya. Nke a pụtara nrubeisi n’ụkpụrụ omume ndị dị na Bible. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ pụtara ịhụ ezi ihe n’anya na ịkpọ ihe ọjọọ asị.—Abụ Ọma 97:10; 101:3; Ilu 8:13.

Otu ụzọ dị mkpa nke ịhụnanya anyị nwere maka Chineke si apụta ìhè bụ ịhụnanya anyị maka ndị agbata obi. Bible na-agwa anyị, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-asị, Ana m ahụ Chineke n’anya, ma ọ na-akpọ nwanne ya asị, ọ bụ onye ụgha: n’ihi na onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, ọ pụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ Onye ọ na-ahụghị mgbe ọ bụla.”—1 Jọn 4:20.

Iso Chineke Nwee Mmekọrịta Chiri Anya Ga-ekwe Omume

Ụfọdụ pụrụ ikwu, sị, ‘Ana m efe Jehova. Ana m erubere iwu ya nile isi. Ana m emeso mmadụ ibe m n’ụzọ dị mma. Ana m eme ha nile. Ma, adịghị m enwe mmetụta nke ịnọdebe Chineke nso n’ezie. Adịghị m enwe ịhụnanya siri ike maka ya, nke ahụ na-emekwa ka m nwee obi amamikpe.’ Ụfọdụ pụrụ iche na ha erughị eru isoro Jehova nwee ụdị mmekọrịta dị otú ahụ chiri anya.

Mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 37 afọ nke ozi a raara nye Jehova gasịrị, otu onye Kraịst dere, sị: “Ọtụtụ mgbe ná ndụ m enwewo m mmetụta na m na-emezu nanị iwu n’ozi m na-ejere Jehova, na obi m adịdịghị na ya ma eleghị anya. Ma amaara m na ijere Jehova ozi bụ ihe ziri ezi ime, agaghịkwa m akwụsị. Otú ọ dị, mgbe ọ bụla m gụtara ka mmadụ na-asị na ‘obi ya jupụtara n’ịhụnanya maka Jehova,’ m ga-eche, sị, ‘Gịnị na-eme m, ebe ọ bụ na ọ dịtụbeghị m otú ahụ?’” Olee otú anyị na Chineke pụrụ isi nwee mmekọrịta chiri anya?

Mgbe ị hụrụ mmadụ n’anya n’eziokwu, ị na-eche banyere onye ahụ ọtụtụ mgbe. Ị na-enwe ọchịchọ siri ike ịnọdebe ya n’ihi na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ka ị na-ahụkwu ya anya, na-agwa ya okwu, ma na-eche banyere ya, otú a ka ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ ga na-etowanye. Ụkpụrụ a metụtakwara gị ịzụlite ịhụnanya n’ebe Chineke nọ.

N’Abụ Ọma 77:12, onye ahụ ji ike mmụọ nsọ dee ihe na-ekwu, sị: “M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.” Ntụgharị uche dị mkpa n’ịzụlite ịhụnanya maka Chineke. Nke a bụ eziokwu karịsịa n’ihi eziokwu ahụ bụ na a pụghị ịhụ ya anya. Ma ka ị na-echekwu echiche banyere ya, otú a ka ọ ga-aghọkwu onye dị adị n’ezie nye gị. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ị pụrụ ịzụlite mmekọrịta si n’obi na nke mmetụta ịhụnanya n’ebe ọ nọ—n’ihi na ọ dị adị n’ezie nye gị.

Ọchịchọ gị ịtụgharị uche mgbe nile n’ụzọ nile nke Jehova na mmeso ya ga-adabere n’ugboro ole ị na-ege ya ntị. Ị na-ege ntị site n’ịgụchi na ịmụchi Okwu ya, bụ́ Bible, anya. Onye ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere nwoke ihe na-agara nke ọma dị ka onye ọ bụ “n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.”—Abụ Ọma 1:1, 2.

Ihe ọzọ dị mkpa bụ ekpere. Ọ bụ ya mere Bible ji na-agba anyị ume ugboro ugboro ikpe ekpere—“n’oge nile,” ‘na-ewepụta oge ikpe ekpere,’ ‘na-anọgidesi ike n’ekpere,’ na ‘ikpe ekpere n’ewepụghị aka.’ (Ndị Efesọs 6:18; 1 Ndị Kọrint 7:5; Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Ekpere anyị na-ekpegara Jehova n’ewepụghị aka ga-eme ka ọ hụ anyị n’anya, mmesi obi ike ahụ bụ na ọ na-ege ntị ga-adọtakwa anyị nso n’ebe ọ nọ. Onye ọbụ abụ ahụ kwadoro nke a, mgbe o kwuru, sị: “Ahụrụ m Jehova n’anya, n’ihi na Ọ na-anụ olu m, bụ́ arịrịọ amara m nile. N’ihi na Ọ tọwo ntị Ya n’ala n’ebe m nọ, ogologo ụbọchị nile nke ndụ m ka m ga-akpọkukwa Ya.”—Abụ Ọma 116:1, 2.

Iṅomi Chineke nke Ịhụnanya

Jehova na-emere anyị ihe ọma. Ebe ọ bụ Onye Okike nke eluigwe na ala, n’ezie o nwere ọtụtụ ihe ọ ga-eburu n’uche na ndị ọ ga-eme ihe maka ha. Ma, Bible na-agwa anyị na n’agbanyeghị otú ọ dịruru ebube, ọ ka na-elekọta ụmụ mmadụ o kere eke. Ọ hụrụ anyị n’anya. (1 Pita 5:6, 7) Onye ọbụ abụ ahụ na-akwado nke a site n’okwu ya bụ́: “Jehova, Onyenwe anyị, lee otú aha Gị dị ebube n’ụwa nile! Gị Onye tinyeworo ebube Gị n’eluigwe. Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ, na Ị na-echeta ya; na nwa nke mmadụ, na Ị na-eleta ya?”—Abụ Ọma 8:1, 3, 4.

Olee otú Jehova siworo na-echeta ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ? Bible na-aza, sị: “N’ime nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ime anyị, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya zite n’ụwa, ka anyị wee dị ndụ site n’aka Ya. N’ime nke a ka ịhụnanya dị, ọ bụghị na anyị onwe anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ na Ya onwe Ya hụrụ anyị n’anya, wee zite Ọkpara Ya ka Ọ bụrụ ihe ịjụrụ Ya obi banyere mmehie anyị.”—1 Jọn 4:9, 10.

Olee otú àjà ịjụrụ obi a si bụrụ ihe àmà kachasịnụ nke ịhụnanya Chineke? Ka anyị tụlee ihe mere n’ogige Iden. Mkpebi nke ido onwe ha n’okpuru iwu Jehova n’olileanya nke ndụ zuru okè ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụ inupụrụ Jehova isi wee nweta ọnwụ dị ka ihe si na ya pụta chere Adam na Iv ihu. Ha họọrọ inupụ isi. (Jenesis 3:1-6) N’ime otú ahụ ha makwara ihe nile a kpọrọ mmadụ ikpe ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Ha ji mpako napụ anyị ohere nke imere onwe anyị mkpebi. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị ọnụ ya ruru n’okwu ahụ.

Otú ọ dị, Jehova ejiriwo ịhụnanya na-echeta mmadụ na-anwụ anwụ, na-amata ọnọdụ ọjọọ ya. Site n’ọnwụ ịchụ àjà nke Ọkpara Ya, bụ́ Jisọs Kraịst, Jehova enyewo onye ọ bụla n’ime anyị ihe mgbakwasị ụkwụ iwu kwadoro iji aka ya họrọ ndụ ma ọ bụ ọnwụ, nrubeisi ma ọ bụ nnupụisi. (Jọn 3:16) O yiri ka a ga-asị na Jehova nyere anyị ohere ịzara ọnụ anyị n’ụlọikpe—ohere ịlaghachi n’Iden, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na imere onwe anyị mkpebi. Nke a bụ ngosipụta ịhụnanya kachasịnụ nke e metụworo.

Cheedị banyere ihe mgbu nke Jehova tachiri obi na ya ka ọ hụrụ ka a na-akparị nwa mbụ ya, na-ata ya ahụhụ, na-akpọgbu ya dị ka onye omekome. Chineke tachikwara obi na nke ahụ n’ihi anyị. Anyị ịmara ihe Jehova mere n’ibu ụzọ hụ anyị n’anya kwesịrị, n’otu aka ahụ, ịkwali anyị ịhụ ya n’anya na ịkpali anyị ịchọ ya. (Jemes 1:17; 1 Jọn 4:19) Bible na-akpọ anyị òkù ‘ịchọ Jehova na ike Ya; chọọ ihu Ya mgbe nile. Cheta oké ọrụ Ya nile nke Ọ rụworo; ihe ebube Ya nile, na ikpe nile nke ọnụ Ya.’—Abụ Ọma 105:4, 5.

Isoro Chineke nwee mmekọrịta onwe onye chiri anya na mmekọrịta ịhụnanya, ịbụ enyi ya, abụghị ihe ezi uche na-adịghị na ya. A pụrụ inweta ya. N’eziokwu, anyị apụghị iji ịhụnanya anyị nwere maka Chineke tụnyere kpọmkwem mmekọrịta ụmụ mmadụ. Ịhụnanya anyị na-enwe maka di ma ọ bụ nwunye anyị, ndị mụrụ anyị, ụmụnne anyị, ụmụ anyị, ma ọ bụ ndị enyi anyị, dị iche n’ịhụnanya anyị nwere maka Chineke. (Matiu 10:37; 19:29) Ịhụ Jehova n’anya metụtara nnyefe onwe anyị, ofufe anyị, na nraranye anyị a na-akparaghị ókè. (Deuterọnọmi 4:24) Ọ dịghị mmekọrịta ọzọ gụnyere ihe ndị dị otú ahụ. Ma, anyị ka pụrụ ịzụlite mmetụta uche siri ike, nke dịkwa omimi maka Chineke n’ụzọ nsọpụrụ, n’egwu.—Abụ Ọma 89:7.

Ọ bụ ezie na i zughị okè, dị ka Ken na Ebel i nwere ikike maka ịhụ Onye Okike gị n’anya. Ken meere onwe ya nhọrọ, sonyere Setan, wee ghọọ mmadụ mbụ gburu ọchụ. (1 Jọn 3:12) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Jehova ga-echeta Ebel dị ka nwoke nwere okwukwe na onye ezi omume, a ga-ejikwa ndụ nyeghachi ya ụgwọ ọrụ na Paradaịs ahụ na-abịanụ.—Ndị Hibru 11:4.

Gị onwe gị kwa pụrụ ime nhọrọ. Site n’enyemaka nke mmụọ Chineke na Okwu ya, ị pụrụ n’ezie ịbịa were “obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile werekwa ike gị nile” hụ Chineke n’anya. (Deuterọnọmi 6:5) N’aka nke ya, Jehova ga-anọgide na-ahụ gị n’anya, n’ihi na ọ bụ “Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.

[Foto dị na peeji nke 7]

Chineke nakweere àjà Ebel

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya