Isi 4
“Babilọn” Na-anọghị ná Ntụkwasị Obi Na-eche Mbibi Ihu
1. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ “babilọn” pụtara, ọ̀ bụkwa onye guzobere obodo nwe aha ahụ? (b) Ọrụ owuwu ihe dị aṅaa ka Nimrọd ahụ nwere oké ọchịchọ malitere, gịnịkwa si n’ime ya pụta?
ỌGBA aghara bụ ihe e ji mara ụwa taa—n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n’etiti ọha mmadụ, na n’ụzọ okpukpe. Nsụgharị Bekee nke okwu Hibru nke Bible maka ọgba aghara bụ “babilọn.” Na Jenesis, e kwuru okwu banyere Babilọn dị ka Bebel, aha pụtakwara “ọgba aghara.” Ọ bụ Nimrọd, onye nnupụisi megide Jehova guzobere obodo ahụ nke a kpọrọ aha ahụ. (Jenesis 10:8-10) N’ebe ahụ, n’okpuru idu ndú nke Nimrọd ahụ nwere oké ọchịchọ, ndị ikom malitere iwu ụlọ elu nke ga-etoru n’eluigwe iji nupụ isi megide Jehova. Jehova meriri atụmatụ nke a na-adịghị asọpụrụ Chineke site n’ịghagbu otu asụsụ nke ndị ahụ na-ewu ihe owuwu ahụ na-asụ, ka ha wee ghara inwe ike ịghọta ibe ha mgbe ha na-agbalị ịrụkọ ọrụ.—Jenesis 11:1-9.
2. (a) Gịnị mere ike ụwa bụ Babilọn na 539 T.O.A., ma nke ahụ ọ̀ kara ọgwụgwụ nke obodo ahụ nwe aha ahụ akara? (b) Gịnị ka obodo oge ochie ahụ bụ Babilọn na-abụghị?
2 Ogologo oge mgbe nke a gasịrị, e dekọrọ na ọ dị obodo ọhụrụ nke aha ya bụ Babilọn nke dị n’ebe ahụ n’akụkụ Osimiri Yufretis. (2 Ndị Eze 17:24; 1 Ihe Emere 9:1) Na 539 T.O.A., Saịrọs Onye Ukwu, bụ́ onye ọchịchị alaeze ukwu nke Midia na Peasia kwaturu Ike Ụwa nke Babilọn ná mmezu amụma nke Jehova nke dị n’Aịsaịa 45:1-6. Ọ bụ ezie na Babilọn adawo n’ụzọ buru ibu, e kwere ka ọ dịgide dị ka obodo. A kọrọ na ọ dịgidere ọbụna ruo ọkara nke ikpeazụ nke narị afọ mbụ nke Oge Anyị. (1 Pita 5:13) Otú ọ dị, obodo ochie ahụ abụghị “Babilọn Ukwu ahụ,” nke Jọn onyeozi dere banyere ya n’akwụkwọ Mkpughe isi nke 17.
3. Gịnị n’ezie bụ Babilọn Ukwu ahụ?
3 “Babilọn Ukwu ahụ” nke Apọkalips, nke e ji nwanyị na-akwa iko nke “na-anọkwasị n’anụ ọhịa na-acha uhie uhie” see onyinyo ya, na-anọchite anya alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, tinyere okpukpe nile nke ihe a sị na ọ bụ Krisendọm.a (Mkpughe 17:3-5) Dị ka ihe Jọn onyeozi hụrụ banyere ya si dị, nzukọ ihe atụ nke a esorowo ndị ọchịchị ndọrọ ndọrọ nile nke ụwa kwaa iko ime mmụọ. Alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, ka na-akpakwa ike dị ukwuu.
“Enyi nke Ụwa”—Ọ Bụghị nke Chineke
4. N’oge Agha Ụwa Mbụ, olee otú Babilọn Ukwu ahụ si tụkwasị ihe ná mpụ ya nile megide ezinụlọ nke mmadụ?
4 Otú ọ dị, ọnọdụ nke Babilọn Ukwu ahụ anọghị ná ntụkwasị obi ma ọlị, nke ahụ abụwo otú ọ dị karịsịa kemgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị. N’oge mburịta agha ahụ, o tinyere ihe ná mpụ o mere megide ezinụlọ nke mmadụ. Ndị ụkọchukwu nke Krisendọm, bụ́ ndị na-ekwu na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst, gbara ụmụ okorobia ume ije n’ọgbọ agha. Harry Emerson Fosdick nwụworo anwụ, bụ́ onye ụkọchukwu ndị Protestant a ma ama, kwadoro mgbalị agha e mere ma mesịa kweta na: “Ọbụna n’ime ụlọ chọọchị nile anyị, anyị tinyere ọkọlọtọ nke agha . . . Anyị ji otu akụkụ nke ọnụ anyị wee na-eto Onyeisi Udo, werekwa akụkụ nke ọzọ na-enye agha otuto.” Ndị ụkọchukwu na ndị ndú ndị ọzọ nke Krisendọm nọ ná mgbakọ okpukpe dị iche iche kpee ekpere maka ndị ahụ na-alụ agha, ha jekwara ozi dị ka ndị chaplen maka ndị agha, ndị agha ime mmiri, na ndị ji ụgbọ elu alụ agha.b
5. (a) Okwu ndị dị aṅaa nke Jemes 4:4 ka Krisendọm na-ejibeghị mee ihe? (b) Olee ihe na-aghaghị ịbụ ikpe Chineke megide ya?
5 Krisendọm, n’okpuru nduzi nke ndị ndú okpukpe ndị a, ejibeghị okwu ndị dị na Jemes 4:4 mee ihe: “Unu ndị na-akwa iko, ùnu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.” N’ihi ya Krisendọm na-anọgide dị ka onye iro nke Chineke Onye Kachasị Ihe Nile Elu ruo kpọmkwem n’oge a. N’ezie, o nweghị nchebe nke Chineke, n’ihi ihe nke a dịkwa mkpa, ịdị adị ya anọgidewo bụrụ nke na-anọghị ná ntụkwasị obi. Ndị enyi ya bụ́ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ndị a na-apụghị ịtụkwasị obi, ọnọdụ na-agakwa n’ihu maka imegide okpukpe anọgịdewo na-esiwanye ike. Ọ bụghị n’ihi ya ka Chineke ji kwuo, sị: “Unu emetụla ndị m e tere mmanụ aka.”—1 Ihe Emere 16:22.
“Ndị Nke M, Sinụ n’Ime Ya Pụta”
6, 7. (a) Òkù dị aṅaa nke chọrọ ime ihe ọsọ ọsọ ka a kpọrọ ná Mkpughe 18:4, olee ndị kwa ka a kpọrọ òkù ahụ? (b) Olee mgbe òkù yiri nke a bú nke a kpọrọ ná mbụ malitere imezu n’ebe ndị Juu ahụ na-ata ahụhụ na Babilọn oge ochie nọ?
6 Nye ndị a e tere mmanụ na ndị na-esonyere ha n’ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, ọkpụkpọ òkù Chineke na-achọ ime ihe ọsọ ọsọ: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile.” (Mkpughe 18:4) Ee, si n’ime alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, Babilọn Ukwu ahụ, pụta.
7 Òkù nke a na-ekwughachi okwu ndị ahụ nke Jeremaịa 50:8 na 51:6, 45, bụ́ ndị a gwara ihe fọdụrụ ná ndị Juu ahụ Jehova mara ikpe ịnọ 70 afọ ná ndọta n’agha na n’ala ọzọ na Babylonia. Okwu ndị ahụ malitere imezu n’ahụ ndị Juu ahụ na-ata ahụhụ na Babylonia na 537 T.O.A., mgbe Saịrọs Onye Ukwu ahụ e buru n’amụma kpọọrọ ndị agha Midia na Peasia ya zọnye ụkwụ n’ala mmiri nke Osimiri Yufretis ahụ fọrọ nke nta ka ọ takọrọsịa ma banye n’ime obodo Babilọn.
8. (a) Olee otú Saịrọs Onye Ukwu si mezuo Aịsaịa 45:1-6? (b) N’ihi gịnị ka o ji dịrị mkpa na onye ahụ Saịrọs Onye Ukwu sere onyinyo ya ga-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe atụ amụma nke a metụtara ihe dị iche iche?
8 N’afọ mbụ nke ọchịchị ya, Saịrọs Onye Ukwu mere ihe iji mezuo amụma dị n’Aịsaịa 45:1-6. N’otu aka ahụ, onye ahụ nke Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ Saịrọs sere onyinyo ya, ma bụrụ onye dị nnọọ ukwuu karị, bụ́ Jisọs Kraịst, mere ihe kwekọrọ n’ihe atụ amụma nke a metụtara ihe dị iche iche. Nke a bụ mgbe oge ya ruru mgbe ọ banyesịrị n’ọchịchị eze ya n’eluigwe n’aka nri Jehova Chineke, mgbe “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị n’October 1914. (Luk 21:24) N’oge Agha Ụwa Mbụ nke 1914-1918, ihe fọdụrụ nke ndị Israel ime mmụọ nwere ahụmahụ nke ịbụ ndị a dọtara n’agha n’aka Babilọn Ukwu ahụ na ndị enyi ya nke ya na ha na-akwa iko bụ́ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
9, 10. (a) Omume dị aṅaa ka e mesoro mmadụ asatọ so ná ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ nke Society? (b) Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na Babilọn Ukwu ahụ nọ n’azụ ihe ahụ e mere iji kwụsị ọrụ nke ndị Jehova?
9 Dị ka ihe atụ, na United States a machibidoro akwụkwọ kasị ọhụrụ nke Watch Tower Society bipụtara n’oge ahụ, bụ́ The Finished Mystery iwu, dị ka nke na-akwado ndị mmadụ inupụrụ ọchịchị isi. A kpọtara mmadụ abụọ dere akwụkwọ ahụ n’ụlọ ikpe mba ahụ dị na Brooklyn, New York, ma bụrụ ndị e ji ikpe na-ezighị ezi tụọ mkpọrọ 20 afọ n’ụlọ mkpọrọ etiti dị n’Atlanta, Georgia. Otú ahụ ka a tụkwara onye isi oche nke òtù ahụ na-ebi akwụkwọ, odeakwụkwọ na-edebe ego, na mmadụ atọ ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ahụ mkpọrọ. A tụkwara onye nsụgharị okwu ha na ya na-arụkọ ọrụ mkpọrọ ịnọ n’ụlọ mkpọrọ etiti ahụ ọkara ogologo oge ahụ ndị ọzọ ga-anọ.
10 Otú a na July 4, 1918, e tinyere mmadụ asatọ a bụ ndị Kraịst raara onwe ha nye n’ụgbọ okporo ígwè ibuga ha Atlanta, Georgia, bụ́ ebe a ga-anapụ ha nnwere onwe ha. Ndị òtù nke isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Brooklyn n’oge ahụ aghaghị ilekọta ihe nile anya ruo otú ike ha hà. Ònye ka ụta dịịrị maka ọnọdụ nke a? Akwụkwọ bụ́ Preachers Present Arms na-aza, sị: “Ọ bụrụ na a tụlee eziokwu ahụ nke ọma, ọ na-eduje ná nkwubi okwu ahụ bụ́ na chọọchị dị iche iche na ndị ụkọchukwu ha bụ ndị bụ isi na-akwado mgbalị ahụ e mere ikpochapụ ndị òtù Russell [Ndịàmà]. . . . Mgbe ndị editọ nke akwụkwọ akụkọ okpukpe dị iche iche natara ozi banyere mkpọrọ iri afọ abụọ a tụrụ ha, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ndị a, ma nke ukwu ma nke nta, ṅụrịrị ọṅụ banyere ya. Enwebeghị m ike ịhụta okwu ọ bụla gosiri ọmịiko n’akwụkwọ ọ bụla nke ndị okpukpe bụ isi.”—Ray H. Abrams, peji nke 183, 184.
Ọdịda—Ma Ọ Bụghị Banye ná Mbibi
11, 12. (a) Gịnị ka Babilọn Ukwu ahụ zubeworo ime? (b) Olee otú o si daa ọdịda dị ukwuu, ọ bụ ezie na ọ bụghị banye ná mbibi? (ch) Mmetụta dị aṅaa ka o nwere n’ahụ ndị Jehova e mere ka ha nwere onwe ha?
11 Ma nṅụrị ọṅụ nke a dị na Babilọn Ukwu ahụ agaghị adịru ogologo oge. N’oge opupu ihe ubi nke 1919, Babilọn Ukwu ahụ dara n’ụzọ buru ibu, nke ihe ga-esochi ya bụ ụfọdụ ihe metụtara okpukpe nke ga-ewere ọnọdụ tupu e bibie ya kpam kpam. Babilọn Ukwu ahụ chere n’echiche idebe ndị Jehova n’ọnọdụ ndị a na-akpagbu akpagbu na nke ndọta n’agha ruo mgbe ebighị ebi. Ma na March 1919 a kwapeere ndị nnọchianya asatọ ahụ nke Watch Tower Society ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ n’ike, a nara ha n’ibé, ha wee pụta. N’ikpeazụ, a tọhapụrụ ha kpam kpam n’ebubo nile.
12 Nṅụrị ọṅụ nke Babilọn Ukwu ahụ agafewo! Banyere mkpebi nke ụlọ ikpe ahụ ịtọhapụ Ndịàmà ahụ, akwụkwọ bụ́ Preachers Present Arms kwuru, sị: “Ihe sochiri mkpebi ikpe nke a bụ ịda jụụ na chọọchị dị iche iche.” Ma ọṅụ nke ndị Jehova dị ukwuu. E wughachiri nzukọ ha zuru ụwa ọnụ. Ná mgbakọ ukwu ha mere na 1919 na Cedar Point, Ohio, onye isi oche nke Society kpaliri ọtụtụ puku ndị bịaranụ ịrụ ọrụ site n’okwu ya bụ́ “Ikwupụta Alaeze Ahụ.” Ndịàmà Jehova nweere onwe ha ọzọ, jiri obi ike na-ekwusa Alaeze Chineke n’ihu ọha! Babilọn Ukwu ahụ adawo, ma ọ bụghị banye ná mbibi. Saịrọs ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, emeriwo ya ma tọhapụ ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi.
13. Mgbe òtù League of Nations pụtara, gịnị ka Babilọn Ukwu ahụ mere?
13 Otú a, e kwere ka Babilọn Ukwu ahụ lanarị banye n’oge dị mgbe agha ahụ gasịrị. Mgbe a tụpụtara òtù League of Nations dị ka òtù ga-eme ka e nwee udo n’ụwa, òtù Federal Council of the Churches of Christ in America pụtara ịkwado ya, na-ekwupụta n’ihu ọha na òtù League of Nations ahụ bụ “ngosipụta ọchịchị Alaeze Chineke n’elu ala.” N’ikpeazụ mgbe e guzobere òtù League ahụ e mere atụmatụ ya, Babilọn Ukwu ahụ nọkwasịrị ya n’azụ wee malite ọgbụgba nke a ọ na-agba ‘anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie’ nke ihe atụ.—Mkpughe 17:3.
14. (a) N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, olee ụzọ omume nke Babilọn Ukwu ahụ gbasoro? (b) Mgbe òtù ahụ na-eme udo nke mmadụ mere siri n’abyss rịgopụta mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, gịnị ka Babilọn Ukwu ahụ mere?
14 Mgbe òtù ime udo nke a na-adịghị ìrè banyere n’abyss nke arụghị ọrụ mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ, Babilọn Ukwu ahụ nọrọ n’enweghị ihe ọ ga-anọkwasị n’elu. (Mkpughe 17:8) Ma ọ nọ kpọmkwem n’ebe ahụ ya na 57 mba dị iche iche tinyere aka n’Agha Ụwa nke Abụọ ahụ. Ya ịdịnyere akụkụ dị iche iche ndị ahụ na-eburịta agha enyeghị ya nsogbu ọ bụla, ọbụna dị ka nkewa e kewara ya gaa n’ọtụtụ narị ịrọ òtù okpukpe na òtù nta okpukpe dị iche iche nọ n’ọgba aghara na-adịghị enye ya nsogbu. Mgbe òtù ime udo ahụ mmadụ mere rịgopụtara site n’abyss nke arụghị ọrụ mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, dị ka òtù United Nations, Babilọn Ukwu ahụ nọkwasịrị n’azụ ya ozugbo ahụ ma malite inwe ikike n’ahụ ya.
Ike Ọchịchị Nile Ichigharị Megide Babilọn
15, 16. (a) Ihe omume dị aṅaa na-atụ egwu ka ihe a kpọrọ mmadụ na-eche ihu ugbu a? (b) Gịnị ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile kpebiworo, n’ikwekọ ná Mkpughe 17:15-18?
15 Ụwa dum nke ihe a kpọrọ mmadụ fọrọ nke nta ugbu a ka o chee ihe omume na-atụ egwu ihu. Nke a ga-abụ nchigharị nke ike ọchịchị nile megide Babilọn Ukwu ahụ, na-enwe nzube nke ikpochapụ ya ka ọ ghara ịdịkwa adị. Nke a pụrụ ịda ka ihe na-eme ka obi daa mbà nye ndị mmadụ ji ezi obi kwere na okpukpe nile dị mma. Ma Ọkaaka nke Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova Chineke, ekpebiwo na Babilọn Ukwu ahụ enweghị ọnọdụ ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa nile, na o metọwokwa ógbè a nke ihe okike ruo ogologo oge. A ghaghị iji ime ihe ike weda ya ruo mbibi zuru ezu.
16 E nweworị òtù ndị dị ike Chineke pụrụ inye ohere iweta mbibi ya, ya bụ, ike ọchịchị ndọrọ ndọrọ nile nke ụwa. Akwụkwọ Mkpughe nke Chineke kpaliri odide ya na-ebu amụma na Jehova ga-echigharị ndị na-ahụ ya n’anya megide ya, ha ga-agbakwa ya ọtọ, na-ekpughe ihe ọ bụ n’ezie—onye ụgha nke ndị mmụọ ọjọọ na-achị! Mgbe ahụ kwa, dị ka a pụrụ ikwu ya, ha ga-esure ya n’ọkụ ma mee ka ọ bụrụ mkpokọta ntụ. Ha ga-emeso ya dị ka o mesoro ndị ahụ na-efe ezi Chineke, bụ́ ndị jụrụ imebi okwukwe ha.—Mkpughe 17:15-18; 18:24.
17. Mmeri ndị ike ọchịchị nile nwere n’imegide Babilọn ọ̀ na-echigharị ha ife Jehova Chineke ofufe, ànyị sikwa aṅaa mara?
17 Omume ihe ike nke a megide okpukpe n’akụkụ nke ike ọchịchị nile apụtaghị na mgbe e mesịrị ha ga-echigharịkwuru ofufe nke Jehova Chineke. Omume dị ike ha megide Babilọn apụtaghị na ha ga-abụzi ugbu a ndị enyi nke Chineke. Ma ọ́ bụghị otú ahụ ha agaghị eme ihe ahụ ha ga-emesịa mee, bụ́ nke akwụkwọ Mkpughe na-egosi na ha ga-eme. (Mkpughe 17:12-14) Ha pụrụ ịṅụrị ọṅụ dị ukwuu n’ihi mmeri ha nwere n’imegide okpukpe bụ́ nke Jehova Chineke kwere ka ha mezuo, ma ha ka ga-anọgide bụrụ ndị “chi nke oge a,” bụ́ Setan bụ Ekwensu na-eduhie, onye ji ike ya nile pụta imegide Jehova Chineke n’enweghị ike ọgwụgwụ ọ bụla.—2 Ndị Kọrint 4:4.
18, 19. (a) Olee onye na-agaghị alanarị ịhụ mwepụ a ga-ewepụ ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova n’ụta site n’aka “Onyeisi Udo” ahụ? (b) Ma olee ndị ga-abụ ndị akaebe na-adịru ebighị ebi maka mwepụ e wepụrụ Jehova n’ụta n’ebe Babilọn Ukwu ahụ nọ?
18 Babilọn Ukwu ahụ agaghị alanarị ịhụ ngwụsị ahụ dị ebube, nke bụ iwepụ ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova n’ụta site n’aka “Onyeisi Udo” ahụ, onye bụ ugbu a “Chineke nke Bụ Dike” n’aka nri nke Otu Chi ahụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile na nke Kasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova.—Aịsaịa 9:6.
19 N’akụkụ ka Ndịàmà Jehova ga-anọ, n’okpuru nchebe a na-apụghị imebi emebi nke Chineke. (Aịsaịa 43:10, 12) Ha ga-ejiworị nrubeisi pụta na Babilọn Ukwu ahụ n’ihi iwu nke sitere n’eluigwe ezi omume. (Mkpughe 18:4) Obi ụtọ ha nke ezi omume ga-adị ukwuu n’ihi ihe ha jiri anya ha hụ. Mgbe nke a gasịrị, ha ga-abụ ndị àmà nke Jehova ruo ebighị ebi, ruokwa mgbe ebighị ebi ha ga-enwe ike ịgba akaebe nye mwepụ o wepụrụ onwe ya n’ụta n’ebe Babilọn Ukwu ahụ nọ.—Mkpughe 19:1-3.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji mata ya n’ụzọ zuru ezu, lee akwụkwọ ahụ bụ́ “Babylon the Great Has Fallen!” God’s Kingdom Rules!, peji nke 468-500, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b E nyere nkọwa zuru ezu nke nkwado ndị ụkọchukwu kwadoro Agha Ụwa Mbụ n’akwụkwọ bụ́ Preachers Present Arms, nke Ray H. Abrams dere (New York, 1933). Akwụkwọ ahụ na-asị: “Ndị ụkọchukwu nyere agha ahụ iko ọkụ ya dị mkpa nke ime mmụọ na nkwali. . . . Agha ahụ n’onwe ya bụ agha dị nsọ maka ịkwalite Alaeze Chineke n’elu ụwa. Mmadụ inye ndụ ya maka mba ya bụ inye ya Chineke na Alaeze Ya. Chineke na mba ghọrọ otu ihe ahụ. . . . Ndị Germany na Njikọ Britain na Ndị Òtù Ya dị n’otu n’akụkụ nke a. Akụkụ nke ọ bụla kwere na Chineke nọnyeere nanị ha . . . Ihe ka ná ndị ọkà mmụta okpukpe enweghị ihe isi ike ọ bụla idebe Jisọs n’ihu ihu nke ebe agha kasị kpụrụ ọkụ n’ọnụ iduru ndị agha ya ruo ná mmeri. . . . Chọọchị si otú a bụrụ akụkụ siri ike nke usoro agha ahụ. . . . Ndị ndú [chọọchị] egbughị oge ọ bụla n’ịhazisị onwe ha nke ọma n’ihe banyere oge agha. N’ime iri hour abụọ na anọ ahụ a kpọsasịrị mmalite nke agha, òtù Federal Council of the Churches of Christ in America mere atụmatụ maka inye nkwado kasị zuo ezu. . . . Ọtụtụ chọọchị mere karịa otú a sịrị ha mee. Ha ghọrọ ebe a na-edebanye aha ndị ga-eje agha.”—Peji nke 53, 57, 59, 63, 74, 80, 82.