Ikpe Chineke Megide “Onye Ahụ Na-emebi Iwu”
“A na-egbutu osisi ọ bula nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ.”—MATIU 7:19.
1, 2. Gịnị ka onye ahụ na-emebi iwu bụ, oleekwa otú o si bilite?
MGBE Chineke nyere Pọl onyeozi mmụọ ibu amụma banyere ọbịbịa nke otu ‘onye nke na-emebi iwu,’ o kwuru na ọ maliteworị ịpụta ọbụna n’oge ya. Dị ka isiokwu bu ụzọ kọwara, Pọl na-ekwu banyere otu òtù nke ndị mmadụ, bụ́ ndị ga-ebute ụzọ n’iwezuga onwe ha pụọ n’ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ndapụ ahụ e si n’eziokwu dapụ malitere n’oge narị afọ mbụ na-agwụsị, karịsịa mgbe ndị ozi ikpeazụ nwụsịrị. Òtù mmebi iwu ahụ webatara ozizi na omume ndị na-emegide Okwu Chineke.—2 Ndị Tesalonaịka 2:3, 7; Ọrụ 20:29, 30; 2 Timoti 3:16, 17; 4:3, 4.
2 Ka oge na-aga, òtù mmebi iwu nke a topụtara ịghọ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. E mere ka ikike ya siwanye ike site n’aka onye ọchịchị ndị Rom bụ Constantine na narị afọ nke anọ mgbe e jikọtara chọọchị ndị si n’ezi ofufe dapụ na Ochịchị ndị ọgọ mmụọ. Ka Krisendọm nọgidere na-etisa gaa n’ọtụtụ ịrọ òtù, ndị ụkọchukwu nọgidere na-ebuli onwe ha elu karịa ndị aghasa chọọchị nakwa n’ọtụtụ mgbe karịakwa ndị ọchịchị ụwa dị iche iche.—2 Ndị Tesalonaịka 2:4.
3. Gini ga-abu odinihu di njo nke onye mmebi iwu ahụ?’
3 Gịnị ga-abụ ọdịnihu dị njọ nke onye ahụ na-emebi iwu? Pọl buru n’amụma, sị: “A ga-ekpughekwa onye ahụ na-emebi iwu, onye Onyenwe anyị Jisọs [ga-egbu] . . . werekwa ngosi nke [ọnụnọ, NW] ya mee ka ọ ghara ịdị irè.” (2 Ndị Tesalonaịka 2:8) Nke a pụtara na mbibi nke ndị ndú okpukpe ga-ewere ọnọdụ mgbe Chineke wetara usoro ihe nile nke Setan ná ngwụsị ya. Chineke ga-eji Eze eluigwe ya, bụ́ Kraịst Jisọs mee ihe, iduru ndị agha ahụ bụ ndị mmụọ ozi. (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9; Mkpughe 19:11-21) Ọdịnihu dị njọ nke a na-echere ndị ụkọchukwu n’ihi na ha emebiwo aha Chineke na Kraịst, ha edupụwokwa ọtụtụ nde ndị mmadụ pụọ n’ebe ezi ofufe dị.
4. Site n’ukpụrụ dị aṅaa ka a ga-eji kpee onye mmebi iwu ahụ ikpe?
4 Jisọs nyere ụkpụrụ nke a ga-esite na ya kpee onye mmebi iwu ahụ ikpe, na-asị: “Na-ezenụ ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, ma n’ime ha bụ agụ na-apụnara atụrụ. Unu ga-esite ná mkpuru ha mazuo ha. Mmadụ [hà] na-ekpopụta mkpụrụ vine n’ọgwụ, ma ọ bụ fig n’uke? Otú a ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ. Ezi osisi apụghị ịmị ajọ mkpụrụ, osisi na-abaghị n’ihe apụghịkwa ịmị mkpụrụ ọma. A na-egbutu osisi o bula nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ. . . . Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m nke bi n’eluigwe na-achọ.”—Matiu 7:15-21; leekwa Taịtọs 1:16; 1 Jọn 2:17.
Mkpụrụ Ọma Ndị Kraịst
5. Gịnị bụ ntọala e nwere maka mkpụrụ ọma nke ndị Kraịst, oleekwa iwu bụ isi e nwere?
5 Ntọala maka mkpụrụ ọma ndị Kraịst bụ nke a na-achọta na 1 Jọn 5:3, nke na-asị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile o nyere n’iwu.” Otu iwu bụkwa isi bụ nke a: “I ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Otú a, ezi ndị ozi Chineke aghaghị inwe ịhụnanya maka ndị agbata obi ha n’agbanyeghị agbụrụ ha ma ọ bụ ebe a mụrụ ha.—Matiu 5:43-48; Ndị Rom 12:17-21.
6. N’ebe ole ndị nọ karịsịa ka ndị Kraịst na-aghaghị igosi ịhụnanya?
6 Ndị ohu Chineke karịsịa aghaghị inwe ịhụnanya maka ndị ahụ bụ ụmụnna ime mmụọ ha. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-asị, Ana m ahụ Chineke n’anya, ma ọ na-akpọ nwanne ya asị, ọ bụ onye ụgha: n’ihi na onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, ọ pụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụghị mgbe ọ bụla. Ihe a e nyere n’iwu ka anyị nwekwara site n’ebe ọ nọ, ka onye na-ahụ Chineke n’anya, ka ọ hụkwa nwanna ya n’anya.” (1 Jọn 4:20, 21) Ihụnanya ahụ, dị ka Jisọs kwuru, ga-abụ akara e ji amata ezi ndị Kraịst. “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:35; leekwa Ndị Rom 14: 19; Ndị Galetia 6:10; 1 Jọn 3:10-12.
7. Olee otú e si jikọta ezi ndị Kraịst ọnụ n’ụwa nile?
7 Ịhụnanya ụmụnna bụ “ihe nnyado” nke na-ejikọ ndị ohu Chineke n’ịdị n’otu: “Yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Ezi ndị Kraịst aghaghịkwa isoro ụmụnna ha n’ụwa nile dị n’otu, n’ihi na Okwu Chineke nyere iwu, sị: “Ka unu nile na-ekwu otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu . . . ka e mee unu ka unu zuo okè n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.” (1 Ndị Kọrint 1:10) Iji jigide ịhụnanya na ịdị n’otu nke a gburugburu ụwa, ndị ohu Chineke aghaghị ịnọpụ iche n’ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa nke a. Jisọs sịrị: “Ha abụghị akụkụ ụwa nke a, dị nnọọ ka mụ onwe m na-abụghị akụkụ ụwa nke a.”—Jọn 17:16, NW.
8. Olee otú Jisọs si gosipụta ihe ndị Kraịst na-aghaghị ime?
8 Jisọs gosipụtara ókè nke ihe o bu n’uche ruru mgbe Pita ji mma agha bepụ ntị nke otu n’ime ndị ikom ndị ahụ bịara ijide Jisọs. Jisọs ọ̀ gbara ume ka e jiri aka ike dị otú ahụ na-eme ihe ọbụna iji chebe Ọkpara Chineke megide ndị iro? Ee e, kama ọ gwara Pita: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya.” (Matiu 26:52) Otú a, ezi ndị Kraịst adịghị etinye aka n’agha nile nke mba dị iche iche ma ọ bụ ná mwụsi ọ bụla ọzọ nke ọbara mmadụ ọbụna ma ọ bụrụ na ọjụjụ ha jụrụ ga-akpata ogbugbu ha n’ihi ọnọdụ nnọpụiche ha, dị ka e gbuworo ọtụtụ eri ọtụtụ narị afọ nakwa ọbụna n’oge anyị a. Ha matara na ọ bụ nanị Alaeze Chineke n’okpuru Kraịst ga-ewepụ agha na mwụsi ọbara ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 46:9; Matiu 6: 9, 10; 2 Pita 2:11-13.
9. (a) Gịnị ka akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị banyere ndị Kraịst oge mbụ? (b) Olee otú nke a si dị iche n’ebe okpukpe nile nke Krisendọm dị?
9 Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ndị Kraịst narị afọ mbụ jụrụ ịwụsi ọbara mmadụ. Onye bụbu onye prọfesọ nke ọkà mmụta okpukpe sitere England, bụ́ Peter De Rosa, dere, sị: “Ịwụsi ọbara bụ mmehie dị oké njọ. O bụ ya mere ndị Kraịst ji megide egwuregwu ndị na-etinye mmadụ n’ihe ize ndụ. . . . Ọ bụ ezie na agha na iji aka ike na-eme ihe dị mkpa iji chebe Rom, ndị Kraịst ekweghị isonye. . . . Ndị Kraịst weere onwe ha, dị ka Jisọs, ịbụ ndị ozi nke udo; ọ dịghị ọnọdụ ọ bụla pụrụ ime ka ha bụrụ ndị na-egbu mmadụ.” N’aka nke ọzọ, okpukpe ndị Krisendọm na-adịghị n’otu emebiwo iwu nke ịhụnanya ma wụsiekwa ọbara dị ukwuu. O dịbeghị mgbe ha bụ ndị ozi nke udo kama ha anọwo na-abụ ndị na-egbu mmadụ.
Babilọn Ukwu ahụ Ikpe Ọbara Mara
10. Gịnị ka Babilọn Ukwu ahụ bụ, gịnịkwa mere e ji na-akpọ ya aha ahụ?
10 Setan bụ “onyeisi ụwa nke a,” “chi nke oge a.” (Jọn 12:31; 2 Ndị Kọrint 4:4) Otu akụkụ nke ụwa Setan bụ usoro okpukpe ụgha zuru ụwa ọnụ o wuliteworo ruo ọtụtụ narị afọ, tinyere Krisendọm na ndị ụkọchukwu ya. Bible na-akpọ usoro okpukpe ụgha nke a zuru ụwa ọnụ, “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko [ime mmụọ] na nke ihe arụ nile nke ụwa.” (Mkpughe 17:5) Ntọala nke okpukpe ụgha nile ndị dị n’oge a malitere laa azụ n’obodo Babilọn oge oche, bú nke mikpuru onwe ya n’okpukpe ụgha nakwa n’ozizi na omume ndị na-adịghị enye Chineke otuto. Ọ bụ ya mere na a kpọrọ ihe ahụ yiri Babilọn oge ochie Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha.
11. Gịnị ka Bible kwuru banyere Babilọn Ukwu ahụ, n’ihi gịnịkwa?
11 Banyere Babilọn nke okpukpe, Okwu Chineke sịrị: “N’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.” (Mkpughe 18:24) Olee otú o si bụrụ na aka okpukpe nile nke ụwa dị n’ọbara nke ndị ahụ nile e gbuworo egbu? Ọ bụ n’ihi na okpukpe ndị a nile—chọọchị nile nke Krisendọm nakwa okpukpe nile na-abụghị ndị Kristian—akwadowo, nabata, ma ọ bụ ọbụna na-ebute ụzọ n’agha nile nke mba dị iche iche; ha akpagbuwo ma gbuo ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị na-ekweghị n’ihe ha kwuru.
Ihe Ndekọ Na-adịghị Enye Chineke Otuto
12. Gịnị mere ndị ụkpchukwu Krisendọm ji kwesị ịtakarịsị ụta karịa ndị ndú okpukpe ndị ọzọ?
12 Ndị ụkọchukwu Krisendọm bụ ndị ụta kasị dịịrị n’ịkwafu ọbara karịa ndị ndú okpukpe ndị ọzọ. N’ihi gịnị? N’ihi na tụkwasị n’ịkpọkwasị onwe ha aha Chineke, ha akpọkwasịwokwa onwe ha aha Kraịst. Ha si otú a nwee ibu ọrụ nke ịgbaso ozizi nile nke Kraịst. (Jọn 15:10-14) Ma ha agbasobeghị ozizi ndị ahụ, wee si otú a na-ewetara ma Chineke ma Kraịst oké nkọcha. Aka ndị ụkọchukwu tinyeworo ná mwụsi ọbara abụwo nke e gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè, n’Agha Ntụte, n’agha okpukpe ndị ọzọ, njụta okwukwe dị iche iche, na mkpagbu dị iche iche, nakwa n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè, site n’ịkwado agha ndị ndị òtù chọọchị dị iche iche nọ n’ime ha gburu mmadụ ibe ha ndị bi n’ala ọzọ.
13. Gịnị ka ndị ụkọchukwu hụrụ maka ya malite na narị afọ nke iri na otu ruo na nke iri na atọ?
13 Dị ka ihe atụ, malite na narị afọ nke iri na otu ruo na nke iri na atọ, ndị ụkọchukwu Krisendọm malitere Agha Ntụte. Nke a kpatara oké mwụfu ọbara na ịkwakọrọ ngwo ngwo ụmụ mmadụ n’aha Chineke na nke Kraịst. E gburu ọtụtụ narị puku ndị mmadụ. Agha Ntụte ahụ gụnyere ogbugbu na-enweghị isi nke e gburu ọtụtụ puku ụmụaka ndị a rafuru ikere òkè n’Agha Ntụte Umụaka nke afọ 1212.
14, 15. Olee otú onye Katọlik na-ede akwụkwọ si kwuo okwu banyere ihe Choochị Katọlik malitere na narị afọ nke iri na atọ?
14 N’ime narị afọ nke iri na atọ, Chọọchị Roman Katọlik kwadoro ihe egwu ọzọ na-adịghị enye Chineke otuto n’ụzọ pụtara ìhè—Njụta Okwukwe. Ọ malitere na Europe ma gbasaa ruo America, na-adịru ihe karịrị narị afọ isii. N’ịbụ nke usoro popu malitere ma kwadoo, ọ bụ mgbalị na-ala ndụ n’iyi nke e mere iji mekpọọ ndị nile na-ekwenyeghị n’ihe chọọchị na-eme ọnụ ma kpọchapụ ha. Ọ bụ ezie na chọọchị akpagbuwo ndị na-abụghị ndị Katọlik na mbụ, Njụta Okwukwe ahụ dị ike nke ukwuu karị.
15 Peter De Rosa, bụ́ onye sịrị na ya bụ “onye hụrụ Katọlik n’anya,” kwuru n’akwụkwọ ya kasị ọhụrụ bụ́ Vicars of Christ—The Dark Side of the Papacy, sị: “Ọ bụ chọọchị hụrụ maka ịkpagbu ndị Juu, maka Njụta Okwukwe ahụ, maka ogbugbu nke ọtụtụ puku ndị na-ekweghị n’ozizi ha, maka ịmaliteghachi mmekpọ ọnụ na Europe dị ka akụkụ nke usoro ikpe ikpe. . . . Ndị popu họpụtara ma chụpụ ọbụna ndị ọchịchị n’ọkwá, na-enye iwu ka ha manye ndị ha na-achị ịbụ ndị Kristian n’okpuru iyi egwu nke mmekpọ ọnụ na ọnwụ. . . . Ihe Ọziọma ahụ furu jọrọ oké njọ.” Nanị “iwu” nke ụfọdụ ndị e gburu dara bụ na ha nwere Bible.
16, 17. Okwu dịgasị aṅaa ka e kwuru banyere Njụta Okwukwe ahụ?
16 Banyere Pope Innocent nke Atọ nke mmalite narị afọ nke iri na atọ, De Rosa kwuru, sị: “A chọpụtawo na ná mkpagbu ikpeazụ na nke kasị dị oké njọ e mere n’okpuru ọchịchị nke Eze Diocletian [onye Rom] nke [narị afọ nke atọ] ihe dị ka puku ndị Kraịst abụọ nwụrụ, n’ụwa nile. Ná mwakpo mbụ dị ilu nke Agha Ntụte Pope Innocent [megide “ndị jụrụ ozizi” na France] e gburu ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ ji okpukpu iri karịa nke ahụ. . . . Ọ bụ ihe ijuanya ịchọpụta na, n’otu ọgụ, otu popu gburu ọtụtụ ndị Kraịst karịa Diocletian. . . . [Innocent] enweghịkwa obi ọmụma ikpe ọ bụla banyere iji aha Kraịst na-eme ihe nile Kraịst megidere.”
17 De Rosa kwuru na “n’aha popu, [ndị njụta okwukwe ahụ] bụ ndị hụrụ maka ogbugbu kasị oké njọ na nke were ogologo oge e gburu àgwà ọma nke ụmụ mmadụ n’akụkọ mere eme banyere mmadụ.” Banyere onye njụta okwukwe òtù Dominican bụ Torquemada na Spain, o kwuru, sị: “N’ịbụ onye a họpụtara na 1483, ọ chịrị ọchịchị aka ike ruo afọ iri na ise. Ọnụ ọgụgụ ndị o gburu karịrị 114,000 nke 10,220 n’ime ha bụ ndị e suru gbara ọkụ.”
18. Olee otú otu onye na-ede akwụkwọ si kọwaa Njụta Okwukwe, gịnịkwa bụ ihe o kwuru na ọ bụ ya mere o ji nọgide ruo ihe karịrị narị afọ isii?
18 Onye a na-ede ihe kwubiri, sị: “Ihe ndekọ nke Njụta Okwukwe ga-abụ ihe na-emechu ihu nye nzukọ ọ bụla; nye chọọchi ndị Katọlik, ọ bụ ihe jọgburu onwe ya. . . . Ihe akụkọ mere eme na-egosi bụ na, ruo ihe karirị narị afọ isii n’enweghị nkwụsị, usoro ndị popu bụ ndị iro ṅụrụ iyi megide ikpe ziri ezi ndị bụ isi. N’ime popu iri asatọ ndị rụworo ọrụ malite na narị afọ nke iri na atọ gaa n’ihu, ọ dịghị otu n’ime ha megidere ọkà mmụta okpukpe na ngwá ọrụ nke Njụta Okwukwe. N’ụzọ megidere nke ahụ, nke ọ bụla n’ime ha tinyere obi ilu nke ya n’ọrụ nile nke ngwá ọrụ nke a jọgburu onwe ya. Ihe omimi ahụ bụ: Ọlee otú ndị popu ga-esi nọgide n’omume ọjọọ nke a site n’ọgbọ ruo ọgbọ? Ọlee otú ha pụrụ isi jụ Oziọma nke Jisọs n’oge ọ bụla?” Ọ zara, sị: “Ndị popu họọrọ imegide Oziọma ahụ karịa onye bu ha ụzọ ‘nke na-adịghị emehie emehie,’ n’ihi na nke ahụ ga-eweda ùgwù usoro ndị popu n’onwe ya ala.”
19. Omume mmebi iwu ọzọ dị aṅaa ka ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ndú okpukpe kwadoworo?
19 Aka ndị ụkọchukwu tinyere n’ịgba ohu n’aka ike bụkwa mmebi iwu. Mba nile nke Krisendọm tọọrọ ọtụtụ puku ndị Africa, kpọrọ ha gaa n’ebe dị anya pụọ n’ala ha, ruokwa ọtụtụ narị afọ ha mekpọrọ ha ọnụ n’anụ ahụ na n’uche dị ka ndị ohu. Ọ bụ nanị òtù ndị ụkọchukwu ole na ole megidesiri nke ahụ ike. Obụna ụfọdụ n’ime ha kwuru na nke ahụ bụ uche Chineke.—Lee Matiu 7:12.
Ikpe Ọmụma Ọbara n’Ime Narị Afọ nke Iri Abụọ
20. Olee otú ikpe ọmụma ọbara nke onye mmebi iwu ahụ siworo ruo ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’ime narị afọ nke a?
20 Ikpe ọmụma ọbara nke onye mmebi iwu ahụ ruru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’ime narị afọ nke anyị a. Ndị ndú okpukpe akwadowo agha ndị werewooro ndụ nke ọtụtụ iri nde ndị mmadụ, bụ́ agha ndị kasị dị njọ a lụworo n’akụkọ ihe mere eme nile. Ha kwadoro òtù abụọ ahụ n’agha ụwa abụọ ahụ, bụ́ ebe ndị nọ n’otu okpukpe, “ụmụnna,” gburịtara ibe ha. Dị ka ihe atụ, n’Agha Ụwa nke Abụọ, ndị Katọlik nke France na America gburu ndị Katọlik nke Germany na Italy; ndị Protestant nke Britain na America gburu ndị Protestant nke Germany. N’oge ụfọdụ, ha gburu ndị ọzọ bụ́ ndị ọ na-abụghị nanị na ha nọ n’otu okpukpe kamakwa ndị ha na ha sitere n’otu mba. Agha ụwa abụọ ndị ahụ malitere n’ebe Krisendọm gbara mkpọrọgbụ, ọ gaghị ekwewokwarị omume ma ọ bụrụ na ndị ụkọchukwu rubere isi n’iwu ahụ nke inwe ịhụnanya, ziekwa ndị na-eso ha ka ha mee otú ahụ.
21. Gịnị ka ndị mmadụ na-ekwu banyere aka ndị ụkọchukwu na-etinye n’agha?
21 Akwụkwọ bụ The New York Times kọwara, sị: “N’oge gara aga òtù ndị ụkọchukwu Katọlik nọ n’ebe dị iche iche anọgidewo na-akwado ihe ka ọtụtụ n’agha nile nke mba ha, na-agọzi ndị agha ma na-ekpe ekpere maka inwe mmeri, ebe òtù ndị bishọp nọ n’akụkụ nke ọzọ kpeworo ekpere n’ihu ọha ka nke ahụ ghara ime. . . . Mmegiderịta dị n’etiti mmụọ ndị Kraịst na omume ibu agha . . . yiri ka ọ na-edowanye ọtụtụ ndị anya, ka ngwá agha dị iche iche na-adịwanye oké njọ.” Akwụkwọ akụkọ bụ U.S. News & World Report kwukwara, sị: “Ùgwù nke Iso Ụzọ Kraịst n’ime ụwa abụwo nke e wedara ala hie nne site n’ojiji mba ndị kpọrọ onwe ha ndị Kristian jiworo aka ike wee na-eme ihe mgbe nile.”
22. Gịnị ọzọ meworo n’oge anyị ka aka ndị ndú okpukpe dị na ya?
22 Ọzọ, ọ bụ ezie na e nweghị Njụta Okwukwe nke dị n’iwu n’oge a, ndị ndú okpukpe ejiriwo ikike nke Ochịchị mee ihe iji kpagbuo “ndị amụma” na “ndị nsọ” bụ́ ndị dị iche n’ebe ha nọ. Ha arụgidewo ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ha ‘tụpụta atụmatụ arụrụala n’aha iwu.’ N’ụzọ dị otú a, ha akpatawo ma ọ bụ kwadoo mmachibido, ịtụ mkpọrọ, iti ihe, mmekpọ ọnụ, na ọbụna ọnwụ nke ndị na-atụ egwu Chineke n’ime narị afọ anyị a.—Mkpu-ghe 17:6; Abụ Ọma 94:20, The New English Bible.
A Kpọrọ Ha Ịkọ Ihe Ha Mere
23. N’ihi gịnị ka Chineke ga-eji kpọọ onye mmebi iwu ahụ ka ọ kọọ ihe o mere?
23 N’eziokwu, n’ime okpukpe ụgha a hụrụ ọbara nke ndị amụma, na nke ndị nsọ, na nke ndị ahụ nile bú ndị e gbuworo n’elu ala. (Mkpughe 18:24) Ebe ọ bụ na mwụsi ọbara kasị njọ ebilitewo na Krisendọm, ikpe ọmụma nke ndị ụkọchukwu bụ nke kasị ukwuu. Lee ka o si kwesị ekwesị na Bible kpọrọ ha ‘onye mmebi iwu’! Ma Okwu Chineke kwukwara, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.” (Ndị Galetia 6:7) Ya mere Chineke ga-akpọ ndị ụkọchukwu na-emebi iwu ka ha kọọ ihe ha mere.
24. Ihe omume dị aṅaa nke ga-eme ka ụwa mee mkpatụ ga-ewere ọnọdụ n’oge na-adịghị anya?
24 Jisọs sịrị: “Si n’ebe m nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.” (Matiu 7:23) O kwukwara, sị: “A na-egbutu osisi ọ bụla nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ.” (Matiu 7:19) Oge ahụ ji ọsọ na-abịaru nso maka iweta onye mmebi iwu ahụ ná ngwụsị nke yiri ọkụ na-ere ere, tinyere okpukpe ụgha nile, mgbe ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya na ha kwakọworo iko ga-awakwasị ha: “Ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:16) Ebe ọ bụ na ihe omume dị otú ahụ nke ga-eme ka ụwa mee mkpatụ gaje iwere ọnọdụ n’oge na-adịghị anya, ndị ohu Chineke aghaghị ime ka ndị ọzọ mara ha. Isiokwu na-esonụ ga-enyocha ụzọ ha siworo na-eme nke a.
Ajụjụ maka Ntụleghachi
◻ Gịnị ka onye mmebi iwu ahụ bụ, oleekwa otú o si bilite?
◻ Mkpụrụ oma dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst na-aghaghị ịmịpụta?
◻ Ònye bụ Babilọn Ukwu ahụ, ruokwa ókè hà aṅaa ka ikpe ọbara mara ya?
◻ Ihe ndekọ dị aṅaa nke na-adịghị enye Chineke otuto ka onye mmebi iwu ahụ nweworo?
◻ Olee otú Chineke ga-esi kpọọ onye mmebi iwu ahụ ka ọ kọọ ihe o meworo?
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Agha Ntụte dị iche iche kpatara mwụsi ọbara ndị dị oké njọ ndị e ji aha Chineke na Kraịst mee
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke]
By courtesy of The British Library
[Foto ndị dị na peeji nke 19]
“Òtù ndị ụkọchukwu Katọlik nọ n’ebe dị iche iche anọgidewo na-akwado ihe ka ọtụtụ n’agha nile nke mba ha”
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke]
U.S. Army