Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 1/15 p. 24-25
  • Mosis na Erọn—Ndị Nkwusa Nwere Obi Ike nke Okwu Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mosis na Erọn—Ndị Nkwusa Nwere Obi Ike nke Okwu Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Ọrụ Ebube Ewere Ọnọdụ
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ahụhụ Atọ Mbụ A Tara Ndị Ijipt
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ịmata Ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ònye Bụ Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 1/15 p. 24-25

Ha Mere Uche Jehova

Mosis na Erọn—Ndị Nkwusa Nwere Obi Ike nke Okwu Chineke

CHEEDỊ echiche banyere ọnọdụ ahụ: Mosis dị 80 afọ na nwanne ya nwoke, bụ́ Erọn, guzo n’ihu nwoke kasị ike n’ụwa—Fero nke Ijipt. Nye ndị Ijipt nwoke a abụghị nanị onye nnọchiteanya nke chi dị iche iche. Ha kwetara na ọ bụ chi n’onwe ya. A na-ele ya anya dị ka Horus lọrọ ụwa, bụ́ chi nwere isi agụ nkwọ. Tinyere Isis na Osiris, Horus ghọrọ atọ n’ime otu bụ́ isi n’etiti chi nwoke na chi nwanyị dị iche iche nke Ijipt.

Onye ọ bụla na-abịakwute Fero ga-ahụrịrị ihe oyiyi ahụ na-atụ ụjọ nke isi agwọ ọjọọ si n’etiti okpueze ya mipụta. Dị ka e chere, agwọ a pụrụ ịgbọkwasị onye ọ bụla bụ onye iro Fero ọkụ na mbibi. Ugbu a Mosis na Erọn ejiriwo arịrịọ a na-arịọtụbeghị mbụ bịa n’ihu eze a bụ chi—ka o zipụ ndị Israel o ji mere ohu ka ha wee nwee ike imere Chineke ha, bụ́ Jehova, ememe.—Ọpụpụ 5:1.

Jehova eburularị ụzọ kwuo na obi Fero ga-adị ike. Ya mere, azịza nnupụisi ya ejughị Mosis na Erọn anya: “Ònye bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu Ya izipụ Israel? amaghị m Jehova, ọzọkwa, m gaghị ezipụ Israel.” (Ọpụpụ 4:21; 5:2) Ya mere, e mere nkwadebe maka nkwata dị ịrịba ama. N’oge nzute ọzọ na-esonụ, Mosis na Erọn gosiri Fero ihe àmà na-atụ n’anya na ha na-anọchite anya ezi Chineke ahụ nke pụkwara ime ihe nile.

Otu Ọrụ Ebube Ewere Ọnọdụ

Dị ka Jehova tụziri, Erọn rụrụ otu ọrụ ebube nke gosiri nkarị Jehova karịrị chi nile nke Ijipt. Ọ tụdara mkpanaka ya n’ala n’ihu Fero, ozugbo ahụkwa ọ ghọrọ otu nnukwute agwọ! N’ịbụ onye ọrụ ebube a gbagwojuru anya, Fero kpọkọtara ndị odeakwụkwọ dị nsọ ya nile.a Site n’enyemaka nke ike ndị mmụọ ọjọọ, ndị ikom a nwere ike iji mkpanaka nke ha mee ihe yiri ya.

Ọ bụrụ na Fero na ndị nchụàjà ya ṅụrịrị ọṅụ, ọ bụ nanị ruo nwa mkpirikpi oge. Lee ihu ha mgbe agwọ Erọn loro agwọ ha, otu otu! Ndị nile nọ n’ebe ahụ pụrụ ịhụ na chi nile nke Ijipt na ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ahaghị ma ọlị.—Ọpụpụ 7:8-13.

Otú ọ dị, ọbụna mgbe nke a gasịrị, obi Fero ka nọgidere dị ike. Ọ bụ nanị mgbe Chineke tisịrị Ijipt ihe otiti iri ndị na-ebibi ihe ka Fero gwara Mosis na Erọn n’ikpeazụ, sị: “Bilienụ, si n’etiti ndị m pụọ, ma unu onwe unu ma ụmụ Israel; jeekwanụ, fee Jehova, dị ka unu kwuru.”—Ọpụpụ 12:31.

Ihe Mmụta Nye Anyị

Gịnị mere ka Mosis na Erọn nwee ike ịbịakwute Fero ahụ dị ike nke Ijipt? Ná mmalite, Mosis gosipụtara enweghị obi ike n’ikike o nwere, na-azọrọ na ya bụ “onye ọnụ ya dị arọ, nke ire ya dịkwa arọ.” Ọbụna mgbe e mesisịrị ya obi ike banyere nkwado Jehova, ọ rịọrọ, sị: “Biko, Onyenwe anyị, biko, zie n’aka onye Ị ga-eziga.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Mosis rịọrọ ka Chineke ziga onye ọzọ. (Ọpụpụ 4:10‚ 13) Ka o sina dị, Jehova jiri Mosis dị obi umeala mee ihe, na-enye ya amamihe na ike ahụ dị mkpa iji rụzuo ọrụ ya.—Ọnụ Ọgụgụ 12:3.

Taa, ndị ohu Jehova Chineke na Jisọs Kraịst na-edebe iwu nke ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Matiu 28:19‚ 20) Iji mee òkè nke anyị ná nrụzu nke ọrụ a, anyị kwesịrị iji ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ na ikike ọ bụla anyị pụrụ inwe mee ihe n’ụzọ kasị mma. (1 Timoti 4:13-16) Kama ilekwasị anya n’erughị eru anyị nile, ka anyị jiri okwukwe nakwere ọrụ ọ bụla nke Chineke nyeworo anyị. Ọ pụrụ ime ka anyị ruo eru ma nye anyị ume iji mee uche ya.—2 Ndị Kọrint 3:5‚ 6; Ndị Filipaị 4:13.

Ebe Mosis na-eche mmegide ụmụ mmadụ na nke ndị mmụọ ọjọọ ihu, n’ezie enyemaka karịrị ike mmadụ dị ya mkpa. N’ihi ya, Jehova mesiri ya obi ike, sị: “Lee, emewo m gị ka ị ghọọrọ Fero chi.” (Ọpụpụ 7:1) Ee, Mosis nwere nkwado na ikike Chineke. Ebe mmụọ Jehova dịkwasịrị ya, Mosis enweghị ihe ọ bụla mere ọ ga-eji tụọ Fero ma ọ bụ ndị òtù nke onye ọchịchị ahụ dị mpako egwu.

Anyị onwe anyị kwa aghaghị ịdabere na mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Jehova, iji jezuo ozi anyị. (Jọn 14:26; 15:26, 27) Site ná nkwado Chineke anyị pụrụ ikwughachi okwu Devid, bụ́ onye bụrụ, sị: “Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịworo obi, m gaghị atụ egwu; gịnị ka anụ ahụ, bụ́ mmadụ, ga-eme m?”—Abụ Ọma 56:11.

N’ọmịiko ya, Jehova ahapụghị nanị Mosis n’ọrụ ya. Kama nke ahụ, Chineke kwuru, sị: “Erọn, bụ́ nwanne gị, ga-abụkwa onye amụma gị. Gị onwe gị ga-ekwu ihe nile nke M na-enye gị n’iwu: Erọn nwanne gị ga-agwakwa Fero okwu.” (Ọpụpụ 7:1, 2) Lee ka o si bụrụ ihe ịhụnanya n’akụkụ nke Jehova ịrụ ọrụ n’agabigaghị ihe ndị Mosis pụrụ imeli n’ụzọ ezi uche dị na ya!

Chineke na-enye anyị mkpakọrịta nke ndị Kraịst ibe anyị ndị na-anakwere ihe ịma aka nke ịbụ Ndịàmà nke Jehova, bụ́ Onye Kachasị Ihe Nile Elu. (1 Pita 5:9) Ya mere, n’agbanyeghị ihe mgbochi ndị anyị pụrụ izute, ka anyị yie Mosis na Erọn—ndị nkwusa nwere obi ike nke okwu Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ndị odeakwụkwọ dị nsọ” na-ezo aka n’ìgwè ndị mgbaasị ndị na-azọrọ na ha nwere ike karịrị nke ndị mmụọ ọjọọ. E kwenyere na ndị ikom a pụrụ ime ka ndị mmụọ ọjọọ rube isi nakwa na ndị mmụọ ọjọọ enweghị ike ọ bụla n’ebe ndị mgbaasị a nọ.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mosis na Erọn ji obi ike nọchite anya Jehova n’ihu Fero

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya