Agụụ Gị Na-agụ Ndị Ọzọ!
1 Site n’oge ruo n’oge, anyị pụrụ ịhapụ ịga otu nzukọ ọgbakọ ma ọ bụ karịa, na-eche na ‘o nweghị onye agụụ m ga-agụ; ha agadịghị ama na mụ anọghị ya.’ Nke ahụ abụghị eziokwu! Dị ka akụkụ ọ bụla nke ahụ anyị nkịtị, onye ọ bụla n’ime anyị na-ekere òkè dị mkpa n’ịrụ ọrụ nke ọgbakọ. (1 Kọr. 12:12) Ọnụnọ anyị na-anọghị n’otu nzukọ izu pụrụ imetụta ọdịmma ime mmụọ ndị ọzọ bịara. Ọ bụrụ na ị nọghị ebe ahụ, jide n’aka—agụụ gị na-agụ ndị ọzọ!
2 Òkè Dị Mkpa Ị Na-ekere: Ọ gụsiri Pọl agụụ ike iso ụmụnna ya kpakọrịta. Ndị Rom 1:11, 12 na-akọwa ihe kpatara ya, sị: “Ka m wee mee ka unu keta onyinye amara ụfọdụ nke Mmụọ Nsọ . . . ka e wee kasie mụ na unu obi n’etiti unu, site n’okwukwe anyị kwekọrọ, ma nke unu ma nke mụ onwe m.” N’otu aka ahụ, site n’okwu anyị, òkè anyị ná nzukọ, na ọnụnọ anyị kpọmkwem, anyị na-eme nnukwu ihe iwulite ibe anyị elu ịnọgide n’ụzọ ikwesị ntụkwasị obi.—1 Tesa. 5:11.
3 Ị́ dịghị elepụ anya ịhụ ndị ọzọ ná nzukọ ọgbakọ? Ị na-ege ntị nke ọma n’okwu ha ma nwee ekele maka nkwupụta nke okwukwe ha. Onyinye ime mmụọ ha na-atụnye ụtụ n’iwuli gị elu. Ọ bụrụ na ha anọghị ná nzukọ, ọ ga-adị gị ka e nwere ihe dị mkpa na-adịghị ya. Ụmụnna gị nwoke na nwanyị na-eche otú ahụ banyere gị ma ọ bụrụ na ị nọghị ya.
4 Òkè Dị Mkpa Nzukọ Na-ekere: Ụlọ Nche kwuru n’otu oge otú nzukọ si dị mkpa maka nlanarị ime mmụọ anyị, na-asị: “N’ime ụwa nke a ọgba aghara na-etisa, nke rụrụ arụ, ọgbakọ ndị Kraịst bụ n’ezie ebe mgbaba ime mmụọ . . . , ebe e nwere udo na ịhụnanya. Ya mere, bụrụ onye na-abịachi anya ná nzukọ ya nile.” (w93-IB 8/15 11) Ụbọchị ọ bụla, anyị na-ezute ọnọdụ ndị na-eme ka ike gwụ anyị n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike imikpu nnọọ n’ime nchegbu anyị nke na anyị pụrụ ichefu ihe ime mmụọ ka mkpa. Anyị nile na-adabere n’ibe anyị maka agbamume dị anyị mkpa iji nọgide na-adị n’otu, na-anụkwa ọkụ n’obi n’ije ozi Chineke.—Hib. 10:24, 25.
5 Anyị ịbịa nzukọ dị mkpa. Nrịanrịa ma ọ bụ ihe ndapụta pụrụ igbochi anyị mgbe ụfọdụ. Ma ọ bụghị ya, ka anyị kpebie mgbe nile ịbụ ndị a ga-agụnye ná mkpọkọta nke ndị na-etokọ Jehova ọnụ!—Abụ Ọma 26:12.