Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/02 p. 1
  • Inyere Ndị Ọzọ Aka Inye Jehova Otuto

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inyere Ndị Ọzọ Aka Inye Jehova Otuto
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-akpọ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Tụọ Egwu Jehova, Nyekwa Aha Nsọ Ya Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 9/02 p. 1

Inyere Ndị Ọzọ Aka Inye Jehova Otuto

1 A na-akpọsara ndị mmadụ ozi dị oké mkpa n’ụwa nile: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka ya abịawo, n’ihi ya kwa, na-efenụ Onye ahụ nke mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri dị iche iche.” (Mkpu. 14:6, 7) Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù ikere òkè ná mkpọsa ahụ. Gịnị ka ọ dị ndị mmadụ mkpa ịmata banyere Jehova ka ha wee tụọ ya egwu ma fee ya ofufe?

2 Aha Ya: Ọ dị ndị mmadụ mkpa ịmata ihe dị iche dị n’etiti onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ na ọtụtụ chi ụgha dị iche iche a na-efe ofufe taa site n’ịmata aha ya. (Deut. 4:35; 1 Kọr. 8:5, 6) N’eziokwu, ndị so dee Bible ji aha dị ebube nke Jehova mee ihe ihe karịrị ugboro 7,000. Ọ bụ ezie na anyị ga-eji nghọta na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ihe banyere mgbe anyị ga-eji aha Chineke eme ihe, anyị ekwesịghị izochi ya ma ọ bụ ịhapụ iji ya na-eme ihe. Uche Chineke bụ ka ihe nile a kpọrọ mmadụ mata aha ya.—Ọma 83:18.

3 Ụdị Onye Ọ Bụ: Iji nye Chineke otuto, ọ dị ndị mmadụ mkpa ịmata ụdị Chineke ọ bụ. Anyị aghaghị ime ka ha mata ịhụnanya ya pụtara ìhè, amamihe ya kasịnụ, ikpe ya ziri ezi n’ụzọ nile na ike o nwere ime ihe nile, tinyere ebere ya, obiọma ya sitere n’ịhụnanya, na àgwà ndị ọzọ magburu onwe ha. (Ọpụ. 34:6, 7) Ha aghaghịkwa ịmụta ịdị na-atụ Chineke egwu n’ụzọ ziri ezi, ịdị na-asọpụrụ ya, na-amata na ndụ ha dabeere na ha inwe ihu ọma Jehova.—Ọma 89:7.

4 Ịbịaru Chineke Nso: Iji bụrụ ndị a ga-azọpụta n’ikpe Chineke nke na-abịanụ, ndị mmadụ aghaghị iji okwukwe na-akpọku Jehova. (Rom 10:13, 14; 2 Tesa. 1:8) Nke a na-agụnye ihe karịrị nanị ịmata aha Chineke na àgwà ya dị iche iche. Anyị aghaghị inyere ndị mmadụ aka iso Jehova nwee mmekọrịta onwe onye, na-atụkwasị ya obi ha nile. (Ilu 3:5, 6) Ka ha na-etinye ihe ha na-amụta n’ọrụ, na-ekpegara Chineke ekpere n’ụzọ siri ike, na-ahụkwa enyemaka ya ná ndụ ha, okwukwe ha ga-ebukwu ibu, na-enyere ha aka ịbịaru Jehova nso.—Ọma 34:8.

5 Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa aha Chineke ma na-enyere ndị ọzọ aka ịtụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu na ịtụ ya egwu. Anyị ka nwere ike inyekwuru ọtụtụ ndị ọzọ aka ịbịa mata Jehova na inye ya otuto dị ka “Chineke nke nzọpụta” ha.—Ọma 25:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya