Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 23
    Ozi Alaeze—2011 | Mee
    • Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 23

      IZU NA-AMALITE NA MEE 23

      Abụ nke 39 na Ekpere

      □ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:

      bt isi nke 4, igbe dị na peeji nke 33 (Nkeji 25)

      □ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:

      Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 19-25 (Nkeji 10)

      Nke 1: Abụ Ọma 23:1–24:10 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

      Nke 2: Baịbụl Bụ Akwụkwọ E Dere Maka Mmadụ Niile—td 7CH (Nkeji 5)

      Nke 3: Olee Otú A Ga-esi Mezuo Ihe E Kwuru ná Ndị Rom 8:21, Oleekwa Mgbe A Ga-emezu Ya? (Nkeji 5)

      □ Nzukọ Ije Ozi:

      Abụ nke 78

      Nkeji 10: Ịma ọkwa. “Mgbe E Kwesịrị Idejupụta Fọm Please Follow Up (S-43).” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

      Nkeji 10: Ihe Atọ Ga-enyere Anyị Aka Ịmalite Nkwurịta Okwu n’Ozi Ọma. Okwu ga-esi n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 2, paragraf nke 1. Unu tụlechaa ihe e dere ebe ahụ, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ akwụkwọ a na-enye n’ọnwa Jun.

      Nkeji 15: Ị̀ Gbalịala Ime Ya? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Onye nwe ihe omume a ga-ekwu ná nkenke isi ihe ndị dị n’isiokwu ndị a e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị na nso nso a. Ha bụ: “Ihe Ọhụrụ nke Ga-enyere Anyị Aka Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl” (km 12/10) na “Ihe Ga-enyere Ezinụlọ Ọ Bụla Aka” (km 1/11). Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha sirila mee ihe ndị ahụ e kwuru n’isiokwu ndị ahụ nakwa uru ndị ha riterela.

      Abụ nke 56 na Ekpere

  • Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 30
    Ozi Alaeze—2011 | Mee
    • Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 30

      IZU NA-AMALITE NA MEE 30

      Abụ nke 33 na Ekpere

      □ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:

      bt isi nke 4 ¶5-12 (Nkeji 25)

      □ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:

      Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 26-33 (Nkeji 10)

      Nke 1: Abụ Ọma 31:9-24 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

      Nke 2: Ihe Atụ nke Ndị Gosiri Ezigbo Umeala n’Obi n’Oge Baịbụl (Nkeji 5)

      Nke 3: Mmịnye Ọbara Na-emebi Ịdị Nsọ nke Ọbara—td 38A (Nkeji 5)

      □ Nzukọ Ije Ozi:

      Abụ nke 38

      Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” bụ́ nke dị na peeji nke 4, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malite ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Jun. Gbaa mmadụ niile ume ka ha bịa ozi ọma n’ụbọchị ahụ.

      Nkeji 15: Otú E Si Eme Nchọnchọ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, bụ́ nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 33-38. Mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na-eme nchọnchọ iji zaa ajụjụ a jụrụ ya n’ozi ọma. Ọ ga na-ekwupụta ihe ọ na-atụgharị n’obi ya.

      Nkeji 10: Jikere Inye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Jun. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo ihe ndị dị na magazin ndị ahụ. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ha ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ ma ha chọọ iji otu n’ime isiokwu ahụ nye mmadụ magazin ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ onye ahụ. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ magazin nke ọ bụla.

      Abụ nke 113 na Ekpere

  • Mgbe E Kwesịrị Idejupụta Fọm Please Follow Up (S-43)
    Ozi Alaeze—2011 | Mee
    • Mgbe E Kwesịrị Idejupụta Fọm Please Follow Up (S-43)

      Anyị kwesịrị idejupụta fọm a ma anyị hụ onye na-ebighị n’ókèala anyị, bụ́ onye nwere mmasị ịmụ Baịbụl, ma ọ bụkwanụ ma anyị hụ onye na-anaghị asụ asụsụ anyị (ma ọ̀ bụ nke mba ọzọ na-asụ ma ọ̀ bụkwanụ nke a na-asụ n’obodo anyị). Mgbe mbụ, anyị na-edejupụta ya ma anyị hụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ n’ozi ọma, ma hà nwere mmasị ịmụ Baịbụl ma ọ̀ bụ na ha enweghị. Ma ugbu a, anyị ga na-edejupụta ya naanị mgbe anyị hụrụ onye nwere mmasị ịmụ Baịbụl. Mgbe anyị na-agaghị elewe ma onye ahụ ò nwere mmasị ịmụ Baịbụl bụ ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye ogbi. Anyị nweta onye ogbi ọ bụla n’ozi ọma, anyị kwesịrị idejupụta fọm S-43.

      Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị dejupụtachaa fọm ahụ? Anyị kwesịrị inye ya odeakwụkwọ ọgbakọ anyị. Ọ bụrụ na ọ ma ọgbakọ dị nso na-eji asụsụ ahụ amụ ihe, ọ ga-ezigara ya ndị okenye ọgbakọ ahụ ka ha nwee ike ziga onye ga-aga na-eduziri onye ahụ nwere mmasị ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụrụ na ọ maghị ọgbakọ o kwesịrị izigara ya, ọ ga-ezigara ya alaka ụlọ ọrụ.

      Ọ bụrụ na onye ahụ nke gosiri mmasị na-asụ asụsụ ọzọ (ma ọ̀ bụ nke mba ọzọ na-asụ ma ọ̀ bụkwanụ nke a na-asụ n’obodo anyị) ma biri n’ókèala anyị, anyị nwere ike ka na-agara ya nletaghachi ruo mgbe nwanna nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ahụ ọ na-asụ amụ ihe ga-abịawa na nke ya ịmụrụ ya ihe. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na e nweghị ọgbakọ dị nso nke na-eji asụsụ onye ahụ na-asụ amụ ihe. Ya dị otú ahụ, anyị kwesịrị iji akwụkwọ anyị ọ bụla e dere n’asụsụ ya na-aga eleta ya. Ọ bụrụkwa na o kwe mee, anyị nwere ike malitere onye ahụ ọmụmụ Baịbụl.—Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa November 2009, peeji nke 4.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya