Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 3/1 p. 15-19
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Udo n’Ebe Chineke Nọ—Ụzọ E Si Tụfuo Ya
  • Ịnọ n’Udo n’Ime Ụwa nke Na-ebu Iro
  • Ihe Ndabere Ka Mma maka Udo
  • Ọgbụgba Ndụ nke Udo
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • “Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Udo, Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ya?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 3/1 p. 15-19

Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche

“Jehova bulie ihu ya n’ahụ gị, nye gị udo.”—ỌNỤ ỌGỤGỤ 6:26.

1. N’oge na-adịghị anya tupu ọ nwụọ, gịnị ka Pọl degaara Timoti, na-ekpughe gịnị?

N’AFỌ 65 O.A., Pọl onyeozi nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom. Ọ bụ ezie na ọ gaje ịnwụ ọnwụ ike n’isi nso n’aka onye ogbu mmadụ nke ndị Rom, Pọl nọ n’udo. A na-ahụta nke a site n’okwu ndị o degaara enyi ya nwa okorobịa, bụ́ Timoti, mgbe ọ sịrị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ: nke fọdụrụ bụ na e debeworo m okpueze nke ezi omume ahụ, nke Onyenwe anyị, bụ onye ezi omume n’ikpe ikpe, ga-enyeghachi m n’ụbọchị ahụ.”—2 Timoti 4:7, 8.

2. Gịnị cheworo obi Pọl nche n’ogologo ndụ ya nile nke jupụtara n’oké ihe omume, ruokwa ọnwụ ya?

2 Olee ụzọ Pọl pụrụ isi nọgide jụụ otú a mgbe ọ na-eche ọnwụ ihu? Ọ bụ n’ihi na “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile” na-eche obi ya nche. (Ndị Filipaị 4:7) Otu udo nke a chebekwara ya n’afọ oké ihe omume ndị ahụ malite na mgbe mbụ ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Kraịst. Ọ kwadoro ya gabiga iti ihe, ịtụ mkpọrọ, ịpịa ụtarị, na ịtụ nkume. O nyere ya ike mgbe ọ na-ebu agha megide ndapụ n’ezi ofufe na mmetụta dị iche iche nke ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu. O nyekwaara ya aka ịgba mgba megide ike ndị mmụọ ọjọọ a na-adịghị ahụ anya. Ihe àmà gosikwara na o nyere ya ike ruokwa ọgwụgwụ.—2 Ndị Kọrint 10:4, 5; 11:21-27; Ndị Efesọs 6:11, 12.

3. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka a na-ewelite banyere udo nke Chineke?

3 Lee nnọọ ihe dị ike Pọl chọpụtara na udo nke a bụ! Ànyị pụrụ ịmụta ihe ọ bụ taa? Ọ̀ ga-enye aka iche obi anyị nche, wusiekwa anyị ike ka anyị ‘na-agba mgba ọma nke okwukwe ahụ’ n’oge ihe isi ike ndị a “dị oké egwu”?—1 Timoti 6:12; 2 Timoti 3:1.

Udo n’Ebe Chineke Nọ—Ụzọ E Si Tụfuo Ya

4. Olee ihe ụfọdụ okwu ahụ bụ “udo” pụtara n’ime Bible?

4 N’ime Bible, okwu ahụ bụ “udo” nwere ọtụtụ ihe ọ pụtara. Ndị a bụ ole na ole n’ime ha dị ka e depụtara ha n’akwụkwọ bụ The New International Dictionary of New Testament Theology: “N’ime A[gba] O[chie] dum, [sha·lohmʹ] (udo) metụtara ahụ ịdị mma n’echiche kasị saa mbara nke okwu ahụ (Ndị Ikpe 19:20); ihe ịga nke ọma (Abụ Ọma 73:3), ọbụna n’ikwu okwu banyere ndị na-adịghị efe Chineke; ahụ ike nke anụ ahụ (Aịsa. 57:18[, 19]; Abụ Ọma 38:3); inwe afọ ojuju . . . (Jen. 15:15 na ndị ọzọ); ezi mmekọrịta n’etiti mba na ndị mmadụ dị iche iche ( . . . Ndị Ikpe 4:17; 1 Ihe Eme. 12:17, 18); nzọpụta ( . . . Jer. 29:11; tụlee Jer. 14:13).” Ihe kasị mkpa bụ inwe mmekọrịta udo n’ebe Jehova nọ, nke, ọ bụrụ na e nweghị ya, udo ọ bụla ọzọ bụ nanị ihe na-adị nwa oge na ihe a kpaara ókè.—2 Ndị Kọrint 13:11.

5. N’ụzọ dị aṅaa ka e si mebie udo nke ihe Chineke kere eke ná mmalite?

5 Ná mmalite, ihe nile e kere eke na Jehova nọ n’udo zuru ezu. E nwere ezi ihe mere Chineke ji kwuo na ihe nile o kere eke dị mma nke ukwuu. N’eziokwu, ndị mmụọ ozi bi n’eluigwe tiri mkpu ọṅụ mgbe mbụ ha hụrụ ihe ndị a. (Jenesis 1:31; Job 38:4-7) Ma, n’ụzọ na-adịghị enye obi ụtọ, udo ahụ nke zuru eluigwe na ala anọghị ogologo oge. E bibiri ya mgbe mmụọ ahụ e kere eke nke a maara ugbu a dị ka Setan rafuru nke kasị ọhụrụ n’ihe ndị nwere ọgụgụ isi Chineke kere, bụ́ Iv, pụọ n’irubere Chineke isi. Di Iv, bụ́ Adam, gbasoro ya, n’inwekwa ndị nnupụisi atọ na-akpagharịrị onwe ha, e nwere ọgba aghara n’eluigwe na ala.—Jenesis 3:1-6.

6. Gịnị ka ntụfu nke udo n’ebe Chineke nọ wetaara ihe a kpọrọ mmadụ?

6 Ntụfu nke udo ha na Chineke bụ oké ihe ọdachi nye Adam na Iv, bụ́ ndị malitere iji nwayọọ nwayọọ na-adakpọ n’anụ ahụ, bụ́ ndakpọ nke jedebere n’ọnwụ ha. Kama inwe udo n’ime Paradaịs, ọ dịrị mkpa ka Adam dọgbuo onwe ya n’ọrụ n’ala nke a na-emezighị emezi nke dị n’èzí nke Iden iji wee zụọ ezinụlọ ya nke na-amụba amụba. Kama iji afọ ojuju bụrụ nne nke agbụrụ mmadụ zuru okè, Iv mụpụtara ụmụ na-ezughị okè n’ihe mgbu na ịta ahụhụ. Ntụfu a tụfuru udo n’ebe Chineke nọ dugara n’ekworo na ime ihe ike n’etiti ụmụ mmadụ. Ken gburu nwanne ya bụ Ebel, ka ọ na-erule oge Iju Mmiri ahụ, ụwa dum ejupụtawokwa n’ime ihe ike. (Jenesis 3:7–4:16; 5:5; 6:11, 12) Mgbe nne na nna mbụ anyị nwụrụ, o doro anya na ha ejeghị n’ili ha n’afọ ojuju, “n’udo,” dị ka Abraham mere mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị.—Jenesis 15:15.

7. (a) Olee amụma Chineke buru nke zoro aka ná mweghachi nke udo zuru okè? (b) N’ọ̀tụ̀tụ̀ dị aṅaa ka ike mmetụta Setan ruru?

7 Mgbe Adam na Iv tụfusịrị udo, anyị na-ahụ nhota mbụ nke ibuiro n’ime Bible. Chineke gwara Setan okwu, sị: “Iro ka m ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echipịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echipịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Mgbe oge na-agafe, mmetụta Setan mụbara ruo n’ókè nke na Jọn onyeozi pụrụ ide, sị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) O doro anya na ụwa nke nọ n’okpuru Setan esoghị Chineke dịrị n’udo. Ya mere, Jemes onye na-eso ụzọ dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ùnu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onyeiro nke Chineke?”—Jemes 4:4.

Ịnọ n’Udo n’Ime Ụwa nke Na-ebu Iro

8, 9. Mgbe Adam mehiesịrị, olee ụzọ ụmụ mmadụ pụrụ isi soro Chineke dịrị n’udo?

8 Laa azụ ebe ahụ n’Iden, mgbe mbụ Chineke kwuru okwu banyere ‘ibuiro,’ o bukwara amụma banyere ụzọ a ga-esi weghachiri ihe nile e kere eke udo n’ụzọ zuru okè. Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa nke nwanyị Chineke ga-echipịa isi nke onye mbụ ahụ mebiri udo. Site n’Iden gaa n’ihu, ndị ahụ tinyere okwukwe ná nkwa ahụ nwetara mmekọrịta udo nke ha na Chineke. Nye Abraham, nke a dugara n’ọbụbụenyi.—2 Ihe Emere 20:7; Jemes 2:23.

9 N’oge Mosis, Jehova mere ka nwa nwa Abraham, bụ́ Israel, ghọọ otu mba. O nyere mba nke a udo ya, dị ka a na-ahụ n’otu ngọzi nke Erọn, bụ́ onyeisi nchụaja, kwupụtara n’isi ha: “Jehova gọzie gị, debe gị: Jehova mee ihu ya ka ọ mụkwasị gị, Jehova meekwara gị amara: Jehova bulie ihu ya n’ahụ gị, nye gị udo.” (Ọnụ Ọgụgụ 6:24-26) Udo Jehova ga-eweta nkwụghachi ụgwọ n’ụba, ma e nwere ihe a na-aghaghị ime iji nweta ya.

10, 11. Nye Israel, na gịnị ka udo nke ha na Chineke dabeere, gịnịkwa ka ọ pụrụ ịrụpụta?

10 Jehova gwara mba ahụ, sị: “Ọ bụrụ na unu ejegharịa n’ụkpụrụ m nile, ọ bụrụkwa na unu edebe ihe nile m nyere n’iwu, wee mee ha; m ga-enyekwa mmiri ozuzo unu na mgbe ha, ala ga-amịkwa ihe omume ya, osisi nke ọhịa ga-amịkwa mkpụrụ ha. M ga-enye udo n’ala, unu ga-edinakwa ala, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka unu maa jijiji: m ga-emekwa ka ajọ anụ ọhịa kwụsị n’ala, mma agha agaghị agabigakwa n’ala unu. M ga na-ejegharị n’etiti unu, m ga-abụkwara unu Chineke, unu onwe unu ga-abụkwara m otu ndị.” (Levitikọs 26:3, 4, 6, 12) Israel pụrụ inweta udo n’ihi na ha nwere nchebe pụọ n’aka ndị iro ha, ha nwere ihe onwunwe n’ụba, nweekwa mmekọrịta chiri anya nke ha na Jehova. Ma nke a ga-adabere na ha ịrapara n’Iwu Jehova.—Abụ Ọma 119:165.

11 N’akụkọ ihe mere eme nile nke mba ahụ, ndị Israel ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-edebe ihe nile Jehova nyere n’iwu nwetara udo nke ha na ya, ọtụtụ mgbe, nke ahụ wetakwara ọtụtụ ngọzi ndị ọzọ. N’afọ ndị mbụ nke ọchịchị Eze Solomọn, udo nke ha na Chineke wetaara Israel ihe ịga nke ọma nakwa izu ike site n’agha dị iche iche nke ha na ndị agbata obi ha. N’ịkọwa oge ahụ, Bible na-asị: “Juda na Israel wee biri ná ntụkwasi obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya, site na Dan wee ruo na Biasheba, ụbọchị nile nke Solomọn.” (1 Ndị Eze 4:25) Ọbụna mgbe agha dara n’etiti ha na mba ndị agbata obi ha, ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi ka nwekwara udo ahụ nke dị mkpa n’ezie, bụ́ udo nke ha na Chineke. Otú a, Eze Devid, bụ́ onye a ma ama n’ịlụ agha, dere, sị: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dinaa ala, rahụ ụra: n’ihi na gị onwe gị, Jehova, nanị gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.”—Abụ Ọma 4:8.

Ihe Ndabere Ka Mma maka Udo

12. Olee ụzọ Israel si mesịa jụ udo nke ha na Chineke?

12 N’ikpeazụ, Jisọs ghọrọ Mkpụrụ ahụ nke ga-eweta udo zuru okè, mgbe a mụrụ ya, ndị mmụọ ozi bụkwara abụ, sị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị ya ezi mma.” (Luk 2:14) Jisọs bịara n’Israel, ma n’agbanyeghị na ha nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Chineke, mba ahụ dum jụrụ ya, ranyekwa ya n’aka ndị Rom ka e gbuo ya. Nwa mgbe nta tupu ọnwụ ya, Jisọs kwaara Jerusalem ákwá, sị: “Ọ bụrụ na ị maara n’ụbọchị a, ọbụna gị onwe gị, ihe ga-eweta udo! ma ugbu a e zonarịrị ha n’anya gị.” (Luk 19:42; Jọn 1:11) N’ihi ịjụ Jisọs, Israel tụfuru udo ya na Chineke nwere kpam kpam.

13. Ụzọ ọhụrụ dị aṅaa ka Jehova guzobere maka ụmụ mmadụ ịchọta udo nke ha na Ya?

13 Otú o sina dị, e mebighị nzube Chineke. A kpọlitere Jisọs site n’ọnwụ, o wee chee n’ihu Chineke uru nke ndụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta maka ụmụ mmadụ ndị obi ha ziri ezi. (Ndị Hibru 9:11-14) Àjà Jisọs ghọrọ ụzọ ọhụrụ, nke dịkwa mma karị maka ụmụ mmadụ—ma ndị Israel anụ ahụ ma ndị Jentaịl—ịchọta udo n’etiti ha na Chineke. Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst nọ na Rom, sị: “Mgbe anyị bụ ndị iro, e sitere n’ọnwụ Ọkpara ya mee ka anyị na Chineke dị n’otu.” (Ndị Rom 5:10) N’ime narị afọ mbụ, e ji mmụọ nsọ tee ndị si n’ụzọ dị otú ahụ mee udo mmanụ ịbụ ndị a nabatara dị ka ụmụ Chineke na ndị òtù nke mba ime mmụọ ọhụrụ ahụ nke a kpọrọ “Israel nke Chineke.”—Ndị Galetia 6:16; Jọn 1:12, 13; 2 Ndị Kọrint 1:21, 22; 1 Pita 2:9.

14, 15. Kọwaa ihe bụ udo nke Chineke, kọwaakwa ụzọ ọ na-esi echebe ndị Kraịst ọbụna mgbe ha na-eche ibuiro nke Setan ihu.

14 Ndị Israel ime mmụọ ọhụrụ nke a ga-abụ ebe Setan na ụwa ya lekwasịrị ịkpọasị ha anya. (Jọn 17:14) Otú ọ dị, ha ga-enwe ‘udo nke sitere n’aka Chineke, bụ́ Nna anyị, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.’ (2 Timoti 1:2) Jisọs gwara ha, sị: “Okwu ndị a ka m gwaworo unu, ka unu wee nwee udo n’ime m. N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.”—Jọn 16:33.

15 Ọ bụ udo nke a nyeere Pọl na ndị Kraịst ibe ya aka inwe ntachi obi n’agbanyeghị ihe isi ike nile ha chere ihu. Ọ na-egosipụta mmekọrịta dị n’udo, nke na-agakwa were were n’etiti ha na Chineke nke e mere ka o kwe omume site n’àjà Jisọs. Ọ na-enye onye nwere ya udo nke uche dị jụụ ka ọ na-amata na Jehova na-echegbu onwe ya n’ihi ya. Nwa nke nọ ná mmakụ obi nke nna nke na-ahụ ya n’anya na-enwe otu ụdị mmetụta ahụ nke ịnọ n’udo, obi ike nke ihe ịrụ ụka ọ bụla na-adịghị ya na onye hụrụ ya n’anya na-elekọta ya. Pọl gbara ndị Filipaị ume, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

16. Olee ụzọ udo nke ha na Chineke si metụta mmekọrịta nke ndị Kraịst nke narị afọ mbụ na ibe ha?

16 Otu ihe sitere ná ntụfu mmadụ tụfuru udo nke ya na Chineke bụ ịkpọasị na adịghị n’otu. Nye ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ịchọta udo nke ha na Chineke rụpụtara kpọmkwem ihe dị iche na nke ahụ: udo na ịdị n’otu n’etiti onwe ha, ihe Pọl kpọrọ “ihe okike nke bụ udo.” (Ndị Efesọs 4:3) Ha ‘chere otu ihe, dịakwa ndụ n’udo, Chineke nke ịhụnanya na udo nọnyekwaara ha.’ Karịsịa, ha kwusara “ozi ọma nke udo,” nke bụ, n’ụzọ bụ isi, ozi ọma nke nzọpụta nye ‘ndị enyi nke udo,’ bụ́ ndị ahụ nakweere ozi ọma ahụ.—2 Ndị Kọrint 13:11; Ọrụ 10:36; Luk 10:5, 6.

Ọgbụgba Ndụ nke Udo

17. Gịnị ka Chineke soroworo ndị ya mee n’oge anyị a?

17 À pụrụ ịchọta udo dị otú ahụ taa? Ee, a pụrụ ịchọta ya. Kemgbe e guzobere Alaeze Chineke nke dị n’okpuru Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube na 1914, Jehova achịkọpụtawo ihe fọdụrụ n’Israel nke Chineke site n’ụwa nke a wee soro ha banye n’ọgbụgba ndụ nke udo. O si otú a mezuo nkwa ahụ o kwere site n’ọnụ Ezikiel onye amụma, sị: “Mụ na ha ga-agbakwa ọgbụgba ndụ udo: ọgbụgba ndụ ebighị ebi ka ọ ga-abụ n’ebe ha nọ: m ga-edokwa ha, mee ka ha baa ụba, m ga-etinyekwa ebe nsọ m n’etiti ha ruo mgbe ebighị ebi.” (Ezikiel 37:26) Jehova sooro ndị Kraịst e tere mmanụ banye n’ọgbụgba ndụ nke a, bụ́ ndị, dị ka ụmụnna ha ndị biri na narị afọ mbụ, na-etinye okwukwe n’àjà Jisọs. N’ịbụ ndị e meworo ka ha dị ọcha pụọ ná mmetọ nile nke ime mmụọ, ha ararawo onwe ha nye Nna ha nke eluigwe, na-agbalịsi ike ịgbaso ihe nile o nyere n’iwu, nke kasịnụ site n’ibute ụzọ n’ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ zuru ụwa ọnụ banyere Alaeze Chineke nke e guzobeworo eguzobe.—Matiu 24:14.

18. Olee ụzọ ụfọdụ ndị si ná mba nile siworo zaghachi mgbe ha hụtara na aha Chineke dịkwasịrị Israel nke Chineke?

18 Amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Ebe obibi m ga-adịkwa n’elu ha, m ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga-abụkwara m otu ndị. Mba nile ga-amakwa na mụ onwe m bụ Jehova, onye na-edo Israel nsọ.” (Ezikiel 37:27, 28) N’ikwekọ na nke a, ọtụtụ narị puku, ee, ọtụtụ nde ndị si ná “mba nile” amatawo na a kpọkwasịrị Israel nke Chineke aha Jehova. (Zekaraịa 8:23) Site ná mba nile, ha ezukọtawo iso mba ime mmụọ ahụ na-ejere Jehova ozi, na-emejupụta “oké ìgwè mmadụ” ahụ a hụrụ ọhụụ ha ná Mkpughe. N’ịbụ ‘ndị saworo uwe mwụda ha meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ,’ ha ga-alanarị oké mkpagbu ahụ wee banye n’ime ụwa ọhụrụ nke udo.—Mkpughe 7:9, 14.

19. Udo dị aṅaa ka ndị Chineke na-enwe taa?

19 N’ịdị n’otu, Israel nke Chineke na oké ìgwè mmadụ ahụ na-enweta udo ime mmụọ nke a pụrụ iji tụnyere udo nke Israel nwere n’okpuru Eze Solomọn. N’ihe banyere ha, Maịka buru amụma, sị: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ. Ma ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:3, 4; Aịsaịa 2:2-4) N’ikwekọ na nke a, ha agbakụtawo agha na esemokwu azụ, n’ụzọ ihe atụ na-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. Otú a, ha nọ n’òtù ụmụnna nke dị n’udo ná mba nile ebe ha nọ, n’agbanyeghị ihe bụ mba ha si na ya, asụsụ ha, agbụrụ ha, ma ọ bụ ọnọdụ ha nọ na ya ná ndụ. Ha na-enwekwa obi ụtọ n’ijide n’aka na Jehova na-elekọta ha, na-echebekwa ha. ‘Ọ dịghị onye na-eme ka ha maa jijiji.’ N’ezie, ‘Jehova n’onwe ya enyewo ndị ya ike. Jehova n’onwe ya ejiwo udo gọzie ndị ya.’—Abụ Ọma 29:11.

20, 21. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị ịrụ ọrụ iji chebe udo nke anyị na Chineke? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ikwu banyere mgbalị nile Setan na-eme iji mebie udo nke ndị Chineke?

20 Otú ọ dị, dị ka ọ dị na narị afọ nke mbụ, udo nke ndị ohu Chineke akpaliwo ibuiro nke Setan. N’ịbụ onye a chụpụrụ site n’eluigwe mgbe e guzobesịrị Alaeze Chineke na 1914, Setan anọwo kemgbe ahụ na-ebuso “mkpụrụ [nwanyị ahụ] fọdụrụ” agha. (Mkpughe 12:17) Ọbụna n’oge nke ya, Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ịgba mgba anyị abụghị imegide anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ imegide . . . ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Ebe e mechibidoworo Setan ugbu a na gburugburu ụwa, ịdọ aka ná ntị ahụ dị oké ngwa.

21 Setan ejiwo ụzọ akọ nile aka ya pụrụ iru mee ihe ná mgbalị ya ibibi udo nke ndị Chineke, ma atụmatụ ya nile akụwo afọ n’ala. Laa azụ na 1919, e nweghị ọbụna 10,000 ndị gbalịsiri ike ijere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Taa, e nwere ihe karịrị nde mmadụ anọ ndị ji okwukwe ha na-emeri ụwa. (1 Jọn 5:4) Nye ndị a, udo nke ha na Chineke na nke ha na mmadụ ibe ha bụ ihe dị adị n’ezie, ọbụna ka ha nọ na-atachi obi n’ibuiro nke Setan na mkpụrụ ya. Ma, n’iburu ibuiro nke a n’uche, n’ịtụlekwa ezughị okè nke anyị na “oge dị oké egwu” anyị na-ebi n’ime ha, anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji chebe udo anyị. (2 Timoti 3:1) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ ihe nke a gụnyere.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ N’ihi gịnị ka mmadụ ji tụfuo udo nke ya na Chineke ná mmalite?

◻ Nye Israel, na gịnị ka udo nke ha na Chineke dabeere?

◻ Na gịnị ka udo n’ebe Chineke nọ dabeere taa?

◻ Gịnị bụ “udo nke Chineke” nke na-eche obi anyị nche?

◻ Ngọzi ndị ọzọ dị aṅaa ka anyị na-enwe ma ọ bụrụ na anyị na Chineke adịrị n’udo?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya